Ụwa agbaala akaebe maka ezi ọrụ Soludo n'ọgbụgba otu afọ ya n'ọkwa

Onyeisiala Nigeria n'oge mbụ, Maazị Olusegun Obasanjo (nke abụọ n'aka ekpe); Ọkammụta Chukwuma Soludo (nke atọ n'aka ekpe) Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, Maazị Uchenna Okafor (nke mbụ n'aka ekpe); Osote Gọvanọ Anambra, Dọkịta Onyekachukwu Ibezim (nke mbụ n'aka nri) na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ weere ọnọdụ n'Awka.
 


Izunna Okafor dere akuko a

Ọ BỤ ka onye si eme ka ekwe si akpọ ya.

  Ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu n'ime steeti Anambra nà mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria etoola ma gbaa akaebe banyere ezi ọrụ aka na-achị steeti ahụ bụ Okammụta Chukwuma Soludo n'ime ya bụ steeti kemgbe otu afọ gara aga.

  Otuto a bụ nke a fọrọ n'ụkpa wee bunye Gọvanọ Soludo nà mmemme ọgbụgba otu afọ o jiri banye n'ọkwa dịka aka na-achị steeti ahụ, n'ihi na ọ bụ n'ọnwa Maachị afọ gara aga ka e duru ya n'iyi ọrụ ka ọ nọrọ n'isi ọchịchị steeti ahụ.

  Mmemme ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị sitere ebe dị icheiche wee bịa, nke gụnyere Onyeisiala Nigeria n'oge mbụ, bụ Maazị Olusegun Obasanjo.

  N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Soludo nyèrè nkọwa banyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ na steeti ahụ, kpọpụ̀tasịa ihe o mepụtagoro na ngalaba dị icheiche, ọkachasị dịka o siri metụta iweghàchite ezi nchekwa tọrọ àtọ̀ na steeti ahụ ịkwalite, inwogharị ọnọdụ akụnụba steeti ahụ, inwogharị ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ, ibulitekwa ọnụ ego na-abata na steeti kwà ọnwa ọbụla, ịkwalite ezi ọnọdụ okporoụzọ, ngalaba ahụike, ahụike ya na ịkwalite ezi ọnọdụ mmepe tọrọ àtọ̀ n'izugbe n'ime steeti ahụ.

  Dịka ọ na-ekwupụ̀ta ebumnobi ya banyere ebe ọchịchị ya na-elegara anya n'ime afọ nke abụọ a, Gọvanọ kelekwara ndị Anambra na ụlọọrụ dị icheiche dị na steeti ahụ maka nkwàdó, ma kpọkuo ọtụtụ ndị Anambra bigasị ebe dị dị icheiche ka ha welataruo akụnụba ha ụlọ n'ihi na ntụnye ụtụ ha ga-esokwa nye aka n'imezupụ̀ta ebumnobi nke ọchịchị ya. O kwekwara ndị Anambra nkwà na ọchịchị ya agaghị agharịpụ ha, ọbụna dịka ọ kpọpụ̀tàsị̀rị̀ atụmatụ dị icheiche gọọmenti ya ji n'aka ugbua na nzọpụ-ụkwụ ya ime ka steeti ahụ bụrụ ejiamaatụ.

  Na ntụnye nke ya n'ebe ahụ Onyeisiala Nigeria n'oge mbụ, bụ Maazị Obasanjo kọ̀wàrà Ọkammụta Soludo dịka onye ma nke ekwe na-akụ n'ịhazi ọnọdụ akụnụba, ma kwukwa na ya bụ nwa amadi sò n'otu n'ime ndị kacha mma ọ kpọlitere n'ọkwa oge ọ bụ Onyeisiala Nigeria. Ọ jakwara ya ike maka ihe dị icheiche ọchịchị ya mepụtagoro, gwa ya jisie ike n'ọrụ, ma kwe nkwà na ọ gaghị ada mbà inye ya ezi ndụmọdụ nà nkwàdó kwesiri ekwesi dịka nna, oge ọbụla ọ chọrọ enyemaka maọbụ ndụmọdụ ya.

  Obasanjo kpọkùkwazị̀rị̀ ndị Anambra ka ha jisie ike na-enye Gọvanọ ahụ nkwado, maka na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahigeaja.

  Ọtụtụ ndị ọzọ kwuru okwu n'ebe ahụ nà ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere onye ahụ jiri aha otu ndọrọndọrọ 'Labour Party' wee zọọ ọkwa Onyeisiala na nhọpụ̀ta izugbe ahụ e nwere n'ala Nigeria n'afọ a, bụ Maazị Peter Obi; aka chịbụrụ steeti Anambra n'oge mbụ, Maazị Chukwuemeka Ezeife; aka chịbụrụ steeti Rivers n'oge mbụ, Maazị Donald Duke; Osote Gọvanọ steeti Anambra, Maazị Onyekachukwu Ibezim; Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, Maazị Uchenna Okafor; Ọkaikpe steeti Anambra, Ọkaikpe Onochie Anyachebelu; Odeakwụkwọ Izugbe Steeti Anambra, Ọkammụta Solo Chukwulobelu; tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

  Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'isi ngwụcha izuụka gara aga, n'ogige Ụlọ Ezumezu Mba Ụwa (International Convention Anambra, ICC) dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

 

 

 

 

 

 

 

 

Comments

Popular posts from this blog

Soludo agbapeela ọrụ okporoụzọ n'Ihiala na Aguata, kpọọ òkù ka a kwàdó APGA

Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC sị na Indomie dị na Naịjirịa dị mma maka oriri

Ndị Odozi Obodo emeela ụka nne n'Awka