Ụka Nne: Ọrụ nne na-arụ n'ezinaụlọ ehika
Chinwendu Uzoatu dere akuko a
ỤKA nne, emume ome n'afọ e mere nsonso a ka bụkwa okwu a kpụ n'ọnụ ugbu a. Ka ndị ụka Anglịkan mechara, ndị ụka Katọlik mere nke ha ụbọchị ụka gara aga.
Emume ụka nne bụ ụbọchị ndị nne ji emere ụmụ ha oriri bịambịam n'ọnụ. Oriri na ọṅụṅụ na-abụ onye richaa, o righarịa. Ndị bụ ụmụ tolite, ha na-ejikwa ohere ahụ lete nne ha, site n'inye ya onyinye dị iche iche iji kele ya maka ọrụ ọma ya niile.
Ka a na-ekwu maka ụka nne, ka a na-ajụ sị: "Olee ọrụ dịịrị ndị nne n'ezinaụlọ?"
Ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu, kọwaa ndị nne dịka ndị na-aghọ nkọ ka agụba n'ọrụ ezinaụlọ.
Maazị Ike: Ndị nne bụ egwu e ji n'ezinaụlọ. Ọ bụ eziokwu na ha bụ osota ide ji ụlọ n'hi na ndị nna werechaa, ha ewere; ma e wepụ ha, nsogbu ga-adị maka na o nweghị onye ga-arụ ọrụ ha na-arụ n'ezinaụlọ.
Ọ bụ nne na-ahụ na ezinaụlọ na-emekọta ihe ọnụ. Ọ bụ ya na-ahụ na onye ọbụla riri nri oge o kwesịrị. Ọ bụghị sọọsọ ụmụaka ka ha na-elekọta, kama ha na-elekọtakwa ma di ha, yaabụ ndị nna ezinaụlọ.
Ọ bụ nne na-eleru anya ala, chọpụta mgbe ihe adịghị ka o kwesịrị ịdị. Ahụ rịaba mmadụ, ọ bụ nne na-agbagharịkarị, ọ pụtaghị na nna a naghị eleru anya kama ọ bụ ndị nne anya ruru ala na-ebu ya n'isi.
Ọ bụrụ na nna anaghị akwado dịka o kwesịrị, ọ bụ nne ga-agbaziri ya, ka o were na-adị ọgọ n'anya. Ọ bụ n'ihi ọrụ nne ka ezinaụlọ ọbụla nwa ha onye ikorobia na-eme ofogori ji agba mbọ lụtara ya nwaanyị, ka anya were ruo ya ala. Nwoke dị otu ahụ, ozigbo a lụtaara ya nwaanyị, ọ gbanwee, bụrụ onye e ji okwu ya agba izu. N'ezie, ọrụ ndị nne na-arụ n'ezinaụlọ bụ a gụkata agba awaa.
Nwaada Ngozi: Ndị nne na-esi nri ezinaụlọ niile na-eri. Ọ bụ oke na ọrụ ha ilekọta ezinaụlọ ha. Ọ bụ nne na-anọkarị n'ụlọ na-azụlite ụmụaka dịka o kwesịrị, na-akụnye mkpụrụ ọma n'ime ha. Nke a na-emekarị na nwata onye nne esoghị zụọ, akpachaghị anya, ọ laa n'iyi. Nsogbu dapụta n'ezinaụlọ, ọ bụ onye nne na-emenyụ ya ka e menyụrụ ọkụ. Ịmaatụ, nghọtahie dapụtara n'etiti otu nwoke na nwanne ya, ọ bụ otu n'ime ndị nwunye ha, dịka onye nne anya ruru ala kwụsịrị esemokwu ahụ, site n'iji anyammiri kpọkuo ikwunaibe, ndị bịara gbata ọsọ dozie ya. Ọ bụghị onye nne ọbụla ga-eme ihe nwaanyị ahụ mere. Ejizi m ohere a akpọku ndị nne niile ka ha soro ụkpụrụ nwaanyị ahụ tụrụ, ka ezinaụlọ wee bụrụ ebe udo na ọṅụ ga-atụ ụlọ biri.Oriakụ Ibe: Abụ m onye nne. Ọrụ anyị ebuka, onye ọbụla na-arụ ọrụ dịka o siri dịrị ya. Ana m esi nri, na-aza ụlọ, na-akpata nkụ. Ma nke dịịrị okenye ma nke nwata, ana m arụ ha niile.
Ana m eme ihe ndị a iji gosi ụmụ m na ụmụ ụmụ m na onweghị onye ozi dịịrị iche. N'ihi nke a, ị bịa na be m, onye ọbụla na-eje ozi aghara aghara, n'elebeghị anya ma onye ọzọ ọ na-ejekwa. Ọbụladị di m, ọ naghị ele anya n'azụ n'ije ozi, anyị na-emekọta ihe ọnụ n'enweghị nkewa.
Eji m ohere a akpọku ndị nne ibe m, ka ha kee ajị n'ume rụọ ọrụ dịịrị ha. Ọzọ dịka ibe ya bụ ekpere, ọ dị oke mkpa n'ịzụlite ụmụaka. Onye nne ọbụla ga-abụrịrị onye ekpere, ka ezinaụlọ ya wee dị mma.
Comments
Post a Comment