EFCC ejidela mmadụ 15 maka 'Yahoo Yahoo' n'Edo

  




 

Izunna Okafor dere akuko a


ONYE kpọọ onwe ya oke, buusu esu ya ọnụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụ̀ọ́ aja, e bute ozu ya n'ofe nke ọzọ.

  N'ịgbaso nke a, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)' anwụchiela mmadụ iri na ise a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n'usoro nzikọrịtaozi ọgbara ọhụrụ ịntanetị, bụ ndị a maara dịka ndị 'Yahoo Yahoo'.

  Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a site n'akara nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ Twitter ụlọọrụ EFCC na nsonso a siri kọwaa, mmadụ iri na ise ahụ bụchà ndị ntorobịa, ma bụrụ ndị a nwụchiri n'ebe nzuzo ha nọ arụ ọrụ igwu ojoro ha dị na Benin, bụ isi obodo steeti Edo.

  Ụlọọrụ ahụ nyèkwàrà aha ndị ahụ dịka: Lucky Igbinosa, Godwin Destiny, Sylvanus God'sgift, Davidson Enabulele, Anuge Michael, Favour Uwaifo, Osemwingie Osarenmwinda, Prince Chukwuka na Liroy Nwanochie.

  Ndị ọzọ gụnyèrè: Uwaifo Osamudiamen, Christopher Dickson, Ehis Samson, Wisdom Peter, Akenuwa Kelvin na Godstime Okolie.

  Ozi ahụ kwukwara na ihe enwetesiri n'aka ndị ahụ gunyèrè otu ụgbọala Mercedes Benz C350, otu ụgbọala Lexus ES 300, otu ụgbọala Lexus ES 300, na ọtụtụ ekwentị, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  Ozi ahụ a kụpụrụ na-akọwakwa na nnyocha e megoro na-egosi na ndị ahụ bụ ndị na-etinye aka n'ụdị igwu ojoro ịntanetị dị icheiche, bụkwa nke ha sitere na ya wee na-anapụ̀sị ọtụtụ  ụmụ mmadụ ego, okachasị ndị ọcha na ndị ọzọ bi na mba ofesi.

  Ya bụ ozi kọ̀wàkwàrà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ebe a ga-eji usoro iwu wee lee ha ọrụ, ma ọ bụrụ na e mechaa nnyocha miri emi banyere ihe ahụ e mere.

Comments

Popular posts from this blog

Soludo agbapeela ọrụ okporoụzọ n'Ihiala na Aguata, kpọọ òkù ka a kwàdó APGA

Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC sị na Indomie dị na Naịjirịa dị mma maka oriri

Ndị Odozi Obodo emeela ụka nne n'Awka