Ụwa agbaala akaebe maka ezi ọrụ Soludo n'ọgbụgba otu afọ ya n'ọkwa

Onyeisiala Nigeria n'oge mbụ, Maazị Olusegun Obasanjo (nke abụọ n'aka ekpe); Ọkammụta Chukwuma Soludo (nke atọ n'aka ekpe) Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, Maazị Uchenna Okafor (nke mbụ n'aka ekpe); Osote Gọvanọ Anambra, Dọkịta Onyekachukwu Ibezim (nke mbụ n'aka nri) na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ weere ọnọdụ n'Awka. Izunna Okafor dere akuko a Ọ BỤ ka onye si eme ka ekwe si akpọ ya. Ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu n'ime steeti Anambra nà mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria etoola ma gbaa akaebe banyere ezi ọrụ aka na-achị steeti ahụ bụ Okammụta Chukwuma Soludo n'ime ya bụ steeti kemgbe otu afọ gara aga. Otuto a bụ nke a fọrọ n'ụkpa wee bunye Gọvanọ Soludo nà mmemme ọgbụgba otu afọ o jiri banye n'ọkwa dịka aka na-achị steeti ahụ, n'ihi na ọ bụ n'ọnwa Maachị afọ gara aga ka e duru ya n'iyi ọrụ ka ọ nọrọ n'isi ọchịchị steeti ahụ. Mmemme ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị sitere ebe dị icheiche wee bịa, nke