Gọọmenti Anambra agaala n'ihu ịkụtùsì ihe a rụrụ ebe e kwesighị ekwesi n'Awka
Gọọmenti steeti Anambra nọrọ na nsonso wee bagide n’ọrụ ịkụtùsì ụlọahịa, ọdụ ahịa nà ihe ndị ọzọ dị icheiche a rụrụ n’ebe ekwesighị ekwesi na steeti ahụ, ka ọ dọchara aka na ntị ọtụtụ oge bànyere nke ahụ. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ a kụtùrù bụ nke a rụnyere n’okpuru ebe eriri ọkụ latiriki (bụ ‘High Tension Wire’ n’asụsụ bekee) siri gaa; ebe ndị ọzọ bụkwa ndị a rụchiri n’elu ọwà mmiri, bụ ebe idè mmiri si agafè, nà n’ebe ndị ọzọ ekwesighị ekwesi n’akụkụ okporoụzọ. Atụmatụ ọrụ ịkụtùsi ihe ndị ahụ bụ nke a bàgidere na mpaghara ‘Club Road’ bụ nke a ma n’oge mbụ dịka ‘Abakaliki Street’ dị n’Akwa bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ọ bụ ụlọọrụ ‘Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)’ nọ n’isi ya, site na njikọaka ndị ọrụ nchekwa dị iche iche. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ACTDA oge ahụ, bụ Maazị Amaechi Okwuosa kwuru na ha adọọla ndị ahụ aka na ntị ọtụtụ ugboro megide udi ihe dị otu ahụ, n’ihi ọtụtụ ihe égwù na ihe ize ndụ dị na ya; mana ha