Posts

Showing posts from July, 2022

N'Awka, ndị ụlọụka ACORA enweela ukwe njirimara ọhụrụ

Ọ KPỌTỤ̀RỤ̀ akpọtụ n’ụlọuka ‘Anglican Church of Redemption’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị ụka, dịka ndị ụlọụka ahụ jiri obiụtọ na wee mụ̀ọ́ ma nabata ukwe njirimara ọhụrụ nke ụlọụka ahụ.   Ukwe ahụ, nke a kpọrọ “Redemption Ground” bụ nke mbụ na mbụ ụlọụka ahụ nwegoro kemgbe ntọala ya, ma bụrụkwa nke ọ bụ Ọ̀kàmmụta Alvan-Ikoku Nwamara nke Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka, dere ya, wepụta ya, ma kụziere ya ndị mmadụ ụbọchị ụka gara aga.   Ọkammụta Nwamara, ónyé kọwara ma gụpụtakwara ederede nke ukwe ahụ, kụzikwààrà ndị mmadụ etu e si agụ ya dịka egwu, bụ́kwá nke ndị ọbụabụ na ndị otiegwu nke ụlọuka jiri olu ọma na ngwaegwu wee hazie, o wee tọọ ka mmanụañụ.   N’okwu ya banyere ukwe ahụ, onyeisi nchụaja n’ụlọụka ahụ, bụ, Ven. Dkt. Obiora Alokwu fọrọ ekele n’ụkpa wee bunye nwa amadi ahụ dere ya bụ ukwe, bụ Ọ̀kàmmụta Nwamara, nà ndị ọbụabụ na ndị otiegwu ụlọuka ahụ, nàkwà ndị ọzọ nyere aka n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ n’iwepụ̀ta ya bụ ọmarịcha ukwe njirimara.   Dịka ọ na-enyekwu nk

A chịkọ̀barala ụmụakwụkwọ Anambra asọmpi ajụọazaa sayensị n'Awka

ÀGBÀ nke ahọ 2022 nke asọmpi ajụọazaa ihe ọmụmụ Sayensị maka ụmụakwụkwọ steeti Anambra abịala na njedobe n’Awka n’ụzọ pụrụ iche.   Ya bụ asọmpi bụ nke a na-achịkọ̀ba site na njikọaka òtù a maara dịka ‘Dr. Chinedu Umeadi Foundation’, na ụlọọrụ ‘Post Primary School Service Commission (PPSSC) Awka’, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ na nsonso a n’ogige ụlọezumezu isi ụlọọrụ ‘Anambra State Universal Basic Education Board (ASUBEB)’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.   N’okwu ya n’ebe ahụ, onye ji ọkwa ‘Director, Science and Technology Department, PPSSC Awka’, bụ Lady Ebele Okudo kọwàrà na ótù n’ime ebumnobi mmemme ahụ bụ iji kpalie ụmụakwụkwọ nọ na ngalaba ihe ọmụmụ Sayensị maọbụ ndị nwere mmasị na ya, ka ha wee ghọta ma nwee ike isonyesi ike na mgbanwe dị icheiche na-ewere ọnọdụ na ngalaba ahụ, ma bụrụkwa ndị ga-agbanyesi mgbọrọgwụ ike na ngalaba ahụ, mekwa nke ọma n’agụmakwụkwọ ha.   Ọ kọwàkwàrà na nke ahụ dabara nke ọma n’ezi agbambọ ahụ ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ na-agba n’ịkwalite ọnọ

Ọnọdụ nwaanyị ajadụ n'ala Igbo

ỌNWỤ bụ ézè a ma na onye ọbụla ga-echirịrị n’ụwa. Ụfọdụ na-anwụ na nwata, ụfọdụ na-anwụ n’okenyè, maka na onye ụwa ga-azarịrị chi ya òkù mgbe ọbụla o jiri kpọọ ya.   Ọnwụ niile a na-ewute nke ukwuu, ọ sọgodi ya bụrụ na onye ahụ nọrọ ogologo ndụ ka Methuselah nke akwụkwọ nsọ tupu ọ laa mmụọ; maka na ndị nke onye ahụ agaghị ahụzịkwa ya anya ọzọ n’ụwa a.   Nke kacha nke bụ na ọnwụ ọbụla na-ewèta oghere n’ezinụlọ ma na-ewètekwa mgbanwè ihe ụfọdụ n’ezinụlọ ahụ, n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ. Ọnwụ ọbụla na-emetụtakwa ndị ezinụlọ onye ahụ n’ụdị dị iche iche.   Kaosiladị, n’ime ọnwụ niile a nà mmetụta ha na-enwe n’ebe ndị ezinụlọ ya nọ, nke kacha njọ bụ mmetụta ọnwụ nwoke na-enwe n’ebe nwunye ya nọ, nà ihe dị iche iche na-eso ya, ọkachasị n’ilegara anya etu nwaanyị si eru uju ọnwụ di ya, na ihe dị iche iche nwaanyị na-agabiga ma di ya nwụọ.   A bịa na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria, iji maa atụ, e nwere usoro dị iche iche ụmụnwaanyị si eru uju ọnwụ di ha. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ obodo na-emez

N'Anambra, ndị ntorobịa ejidela onye ojiegbe ezu ohi, gbàá ya ọtọ n'ahịa

ỤMỤ mmadụ ji anya ha gbara ekeresimesi n’ahịa Nkwọ Ụga dị n’obodo Uga, n’okpuruọchịchị ime obodo Aguata nke Steeti Anambra na nsonso a, oge ndị obodo ahụ jikọrọ aka wee nwụchie otu n’ime ndị ojiegbe na-eyi ndị mmadụ égwù na mpaghara ahụ, ma gbàá ya ọtọ.   Akụkọ kọrọ na ndị ojiegbe ahụ bù ụgbọala wụ̀cháá n’ahịa ahụ, wee malite ọrụ ozigbo, bido ịwakpo ndị mmadụ, bidokwa ịgbalisi egbe elu iji chụsàsịa ndị nọ ebe ahụ, ọbụladị dịka ha napụrụkwa ụfọdụ ndị na-agba Ọkada ọgbatumtum ha.   Otu onye ọnọmgbeomere kwuru na ozigbo ụfọdụ ndị ojiegbe ahụ buru ọgbatumtum ahụ ha zutere wee gbafuo, dịka ndị ntorobịa na-apụ̀ta ịwakpo ha; onye nke na-anya ụgbọala ha ahụ bụzị̀ onye e kweere ọnya site n’iji ígwè wee dochisie okporoụzọ ebe ụgbọala ya ga-esi pụọ, o wee tọ ebe ahụ, nke mezịrị ka ọ matuo n’ike, ma chọọ ka o tinye isi n’ọhịa dị nso n’ebe ahụ, ụmụokorobịa ahụ wee nwụchikọọ ya ozigbo.   Ọtụtụ ihe ngosi vidio e mèkwàrà n’ebe ahụ bụkwazị nke gbasàgoro ka mkpụrụ ụkpaka ugbua n’usoro nzikọrịtaozi ọgbar

N'Ekiti, ndị uweojii ejidela ụmụnne abụọ bụ ndị ntọ

KỌMISHỌNA uweojii na steeti Ekiti, Moronkeji Adesina ekwuputala na ndị uweojii anwụchikọọla mmadụ atọ bụ ndị ntọ̀ na steeti ahụ.   Dịka o siri kwuo, ndị ahụ a nwụchikọrọ bụ Abdullahi Musa gbara ahọ iri atọ na asatọ, Abdullahi Ali, ahọ iri abụọ na ise, na Abdullahi Suleiman dị ahọ iri na iteghete.  Ali na Suleiman ka e kwuru na ọ bụ otu nne na nna mụrụ ha, ebe Musa nke kacha okenye na ndị ntọ ahụ si n’afọ nne na nna ọzọ.   Kọmishọna uweojii ahụ kwuru na a nwụchikọrọ ndị ntọ̀ ahụ n’ime otu nnukwu ọhịa dị n’Ijan-Ekiti n’okpuruọchịchị Gbonyin na steeti ahụ. Ọ kọwara na ọ bụ site na njikọ aka nke ndị Rapid Response Squad (RRS) na ndị ọrụ nchekwa ogbe, ka e jiri nwụchikọ ha.   Adesina, n’ozi nke sitere n’aka okwuputa okwu ndị uweojii na steeti ahụ, DSP Abutu Sunday n’Ado-Ekiti, kwuru na ndị ntọ ahụ ji ọnụ ha kwuputa, ka a na-ajụ ha ajụjụ na ha atọọl ọtụtụ mmadụ na steeti ahụ. Ọ sị: “Dịka otu n’ime mbọ ụlọọrụ uweojii steeti a na-agba iji kpochapụ ndị ntọ na ndị omekome ndị ọzọ na steeti a, Ra

Ezinaụlọ ndị a tọọrọ n'ụgbọoloko Kaduna emeela ngagharịiwe ka o mere abalị 100

O MEELA otu narị ụbọchị ndị omekome ji wakpo ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja ma tọrọ ọtụtụ ndị nọ n’ime ya. Ndị ha tọọrọ atọrọ nọ n’aka ha kemgbe ahụ, o nwebeghị onye hụrụ ha anya. Njem kaara iwe awa abụọ abụrụla nke ha nọrọ otu narị ụbọchị, mana ha alọtabeghị.   A tọọrọ ndị njem ahụ ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ na asatọ, n’ahọ a bụ 2022. A tọhapụrụ mmadụ iri na otu na nsonso a ma jidesie mmadụ iri ise ndị ọzọ ike.  Ọnọdụ ọjọọ ahụ bụnnọọ nke na-ekponyere ezinaụlọ ha aja na garị, ọkachasị ebe ndị ntọrị ahụ jụrụ ikwu ihe ha chọrọ.  Ezinaụlọ ndị ahụ sị: “Ha na-arahụ n’ezi, n’okpuru anwụ na mmiri, ma bụrụ ndị a hapụrụ n’ihe iche aka mgba dị icheiche na-esite na gburugburu tinyere nsogbu metụtara ahụike.”  Ya mere, n’ihi ọnọdụ a, ezinaụlọ na ndị enyi ndị ahụ e ji eji mere ngagharịiwe n’ụzọ udo ma kpagharịa n’ọtụtụ okporoụzọ a maara nke ọma na Kaduna, wee rịọ ndị ọrụ nchekwa na Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ha gbaa mbọ hụ na a tọhapụrụ ndị nke ha e ji eji. N’agbanyeghị na a tọhapụla mma

E nyela ndị ntorobịa ruru narị ise ọzụzụ na ego nkwàdó n'Anambra

 NDỊ ntorobịa ruru narị ise nọrọ na nsonso a wee nweta ọzụzụ maka ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha na steeti Anambra.   Ya bụ mmemme inye ọzụzụ bụ nke a chịkọbara n’okpuru atụmatụ ‘Anambra COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (AN-CARES)’ site n’aka ngalaba ‘Anambra State Cash Transfer Unit’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke e mere site na njikọaka ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ akụnụba na amụma ego ọrụ (Ministry of Economic Planning and Budget) na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze n’Anambra (Ministry of Women and Social Welfare).   Ọzụzụ ahụ were mkpụrụ ụbọchị anọ bụ nke a chịkọtara n’obodo Isuanịọcha dị n’okpuruọchịchị obodo Awka North.   Atụmatụ ‘Anambra COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (AN-CARES)’ bụ otu n’ime atụmatụ nkwàdo dị n’okpuru atụmatụ ‘Nigeria COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (N-CARES)’, bụkwa nke na-enweta nkwàdo site n’aka ụlọ ọba ego mba ụwa (World Bank), ma bụrụkwa nke a na-ekesà nkwàdo ya n’ime steeti dị icheiche dị n’

Mmadụ 98 anatala oririnsọ n'Ekwulọbịa

MMADỤ ruru iri iteghete na asatọ n’ọnụọgụgụ nọrọ ụbọchị ụka gara aka wee nata oririnsọ nke mbụ ma bụrụ ndị e bikwàsàrà aka n’isi n’ụlọụka ‘All Saints Seminary, Ekwulobia’ dị n’okpuruọchịchị ime obodo Aguata nke steeti Anambra.   Ya bụ ụka ịkwọ aka n’isi bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ sonyere na ya, ma bụrụkwa nke onyeisi nchụaja na Dayọsis Aguata, bụ Bishọp Samuel Ezeofor nọ n’isi ya.   N’okwuchukwu ya n’ebe ahụ, Bishọp Ezeofor kpọrọ oku ka mmadụ ọbụla dị ndụ nabata ma gbabà n’ime Ọkpara Chineke bụ Kraịst dịka onye nwe ya na onye nzọpụta ya, ma kọwaa na o nweghịkwa mmadụ ọbụla pụrụ inwete Mmụọnsọ maọbụ ike nke Mmụọnsọ n’ebughị ụzọ nabata Kraịst.   O kwukwara na o nweghị onwe pụrụ inwete ndụ ebighịebi n’ebughị ụzọ nyefee ndụ ya n’aka Kraịst ma kewepụ onwe ya n’ihe ọjọọ; ma mekwa ka a mara na ọ bụ Mmụnsọ na-enyere mmadụ aka ịjụ mmehie na agụụ ihe ọjọọ nke ụwa.   Bishọp Ezeofor jikwazịrị ohere ahụ kpọkuo ndị otu Kraịst ka ha jigidesie okwukwe ha ike ma ghara ikwe ka ajọ ọnọdụ ala Nigeria maọbụ ih

Ndọrọndọrọ ndị ASUU: Ụfọdụ ụmụnwaanyị mahadum asila akwụkwọ gbakwaa ọkụ, lụrụ di

ỌNỌDỤ abụbụ ọrụ nke ndị nkuzi mahadum n’ala anyị, Academic Staff Union of Universities (ASUU) na-aga n’ihu ugbu a, ọtụtụ ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị ekpebiela ịchọ di aghara aghara, karịa ịnọ nkịtị na-eri nri n’ụlọ nne na nna ha.   Otu n’ime ha achọghị ka a kpọọ aha ya, onye nọ n’ogo nke atọ (300 level) ma na-amụ ihe ọmụmụ nkuzi ekwuola hoo haa na ike agwụla ya, tinyekwara na ya enwezighị mmasị ịlaghachị azụ n’ụlọakwụkwọ ma e bidokwa akwụkwọ.   Dịka o siri kwu, uche ya apụọla kpamkpam n’ihe gbasara agụmakwụkwọ, n’ihi na enyi ya, onye ya na ya bi n’otu ụlọ na mahadum alụọla dị ka a nọ ọnọdụ abụbụ ọrụ ndị nkuzi mahadum. Ọ kọwara na enyi ya nwaanyị ahụ dịzi ime ọnwa atọ nke pụtara na ọ gaghị alaghachikwa azụ ma akwụkwọ bido. Ya mere, kemgbe ahụ enyi ya nwaanyị ahụ lụrụ di ma tụrụkwa ime na ọ bụzi sọọsọ ịlụ di na-aguzi ya. Ọ gara n’ihu kwuo na ya na-elegharị anya ịma ma o nwere nwoke ga-eghe ya ọnụ, ka o soro ya ka ọ lụba ya.   Gbasara akwụkwọ ya nke ọ gbarala mbọ ma bụrụkwa nke nne na nna ya t

Anambra anaghị akụtù ụlọ ka e megide onye ọbụla – Soludo

GỌỌMENTI steeti Anambra emeela ka o doo anya na nkụtusi ụlọ ahụ a malitere ime na nsonso a n’ime steeti ahụ bụ maka ọdịmma steeti ahụ na ụmụafọ ya, ma kwuo na ọ bụghị maka iji megide mmadụ ọbụla, dịka ụfọdụ si ahụta ya.   Ọ bụ aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo kwpụtara nke a n’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n’ebe obibi Gọvanọ dị n’Amawbịa, bụkwa ebe ọ nọrọ kwuo na ọchịchị steeti ahụ wàtàrà ọgọdọ ma dịkwa ezi njikere ịkwàlite ezi ọnọdụ mmepe steeti ahụ na ime Anambra ka ọ bụrụ Ìhè nke ala Nigeria n’eziokwu.   O kwuru na ụlọ ahụ gọọmenti bidoro ịkụtusi n’Onitsha na nsonso a bụ iji weghàchite atụmatụ ewumewu nke Onitsha, ya na iji sụghesie ọwammiri dị icheiche sụchisiri asụchi na gburugburu ebe ahụ n’ihi etu ndị mmadụ siri rụchisie ụlọ n’ọwammiri nà ebe ndị ọzọ ekwesighị ekwesi.   Gọvanọ Soludo kọwàkwara na gọọmenti buru ụzọ nye ndị nwe ụlọ ahụ a na-akụtusi ozi ma dọọ ha aka na ntị kemgbe ọtụtụ ọnwa olenole gara aga, gwa ha ka ha jiri aka ha wepụ ụlọ ha n’ọwàmmiri, mana ha añagh

N’Anambra, ndị isi òtù mba ụwa dị iche-iche anọkọọla, kpaa ohere njikọaka

NDỊ òtù na ndị nnọchiteanya mba ụwa dị icheiche n’ala Nigeria nọrọ na nsonso a wee wụ̀chaa na steeti Anambra maka ịmara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ, na ịchọ ụzọ mmekọrịta na njikọaka ha na gọọmenti steeti ahụ, dịka o siri metụta ngalaba ebe ha nwere ike inye aka maọbụ itinye akụnụba.   Njem ahụ bụ nke e jiri nzukọ pụrụ iche wee malite n’ebe obibi Gọvanọ dị n’Amawbia, nke mgbe e mechàzierè ya, aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo, wee dugharịa ha na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, maka na a ọ na-adị mma a na-egosi nwata awọ n’ikpo okwute, a na-arụba ya aka.   Ka ha na-enwe mkparịtaụka banyere njem ahụ ha bịara nà ebumnobi ha, Gọvanọ Soludo gwara ndị ahụ na e nwegasịrị ọtụtụ ngabala dị icheiche na ohere ọma jupụtara na steeti ahụ, ebe ndị oji ego achụ ego nwere ike itinye ego ha, ma nwekwa ọtụtụ ohere njikọaka dị icheiche jupụtara na gọọmenti ya, ọbụladị dịka ọ kọtàkwàrà ha ebe dị icheiche steeti ahụ nwere mkpà ma chọkwa enyemaka.   Ọ gakwara n’ihu kpọpụtasikwa ọtụtụ ih

N'Anambra, ndị Achalla emeela emume Amanwulu

OKE ọṅụ dara n’obodo Achalla dị n’okpuruọchịchị ime obodo Awka North nke steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ mere otu n’ime emume e jiri mara ha, bụ emume Amanwulu, nke ahọ 2022 n’udi pụrụ iche.   Ya bụ nnukwu emume bụ nke ndị obodo ahụ na-eme n’ọnwa nke isii kwa afọ ọbụla tupu ndi ọrụ ugbo ebido igwupụ̀tà ihe ha kọrọ n’ugbo.   Mmemme ahụ bụkwa nke imirikiti ụmụafọ obodo ahụ na-esonye na ya, ma  ndị nọ n’ụlọ ma ndị bi na mba ofesi. Ọ bụkwa iwu n’obodo ahụ na onye ọbụla ga-esonye na mmemme Amanwulu ahụ agaghị eme maọbụ tinye aka n’ihe ọbụla bụ ihe ọjọọ, nke pụtara na onye ahụ ga-adịrịrị ọcha n’omume ma bụrụkwa onye tozuru okè isonye na ya bụ mmemme. Nke a ga-egbochi iji ehi maọbụ ihe karịrị ya chuọrọ Arụsị Amanwulu aja.   N’oge a na-agba ya ajụjụọnụ na mmemme ahụ, onye Dibia ọgwụ nkpọrọgwụ na mkpa akwụkwọ ma bụrụkwa onye jigoro ọkwa dịka onyeisi ọchịchị ‘Achalla Developumenti Union’ n’oge mbụ, bụ Dọkinta Charles Okadigbo Okanumee kọwàrà mmemme ahu dịka mmemme e ji enwogharị ma na-ajụ̀cha

Ndị Ifitedunu ekeleela Soludo maka iwètara ha udo

NDỊ obodo Ifitedunu, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Dunukọfịa nke steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo, maka iweghàchite ọnọdụ udo n’obodo ahụ ka ọ gachara ahọ olenaole ha jiri nwebe nsogbu banyere ọchịchị obodo ahụ.   Eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Emeka Ilouno bụ ya kwupụtara nke a oge o duru ụmụafọ obodo ahụ wee wụchaa n’obi gọọmenti dị n’Awka, bịa ịsị Gọvanọ Soludo daalụ maka ịzọbata ụkwụ na nsogbu ọchịchị obodo ahụ dịbara kemgbe, wee weta udo tọrọ àtọ n’obodo ahụ, site n’iweghàchi na iguzobegharị onyeisi ọchịchị (President-General) ndị obodo ahụ jiri aka ha họpụta.   Ndị ahụ bugasị akwụkwọ e degasịrị ihe dị icheiche na ha, dịka ‘Daalụ Soludo’, ‘Soludo, I Mere Nke Ọma’, ‘Soludo, Onyeisi Udo’, na ụfọdụ ederede ndị ọzọ wee bịa n’ebe ahụ.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Igwe Ilouno kwuru na ọbịbịa ha ebe ahụ bụ otu n’ime ụzọ ha siri chọọ igosipụta obiụtọ ha banyere ihe ahụ Gọvanọ Soludo meere obodo ahụ, ma sịkwa ya jisie ike n’ọrụ.   O mere ka a mara na nsogbu b

N'Anambra, ndị Okpuno ebidola ọrụ mmetụaka n'okporoụzọ ha

Ọ NA-ABỤ e jikọọ aka buo ozu enyi, ọ dị mfe; maka na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahige aja.   Ka ọ dị taa, ndị obodo Okpuno dị n’okpuruọchịchị Awka South nke steeti Anambra ebidola ọrụ mmetụaka n’ụfọdụ okporoụzọ dị n’obodo ahụ nwegasịrị nsogbu.   Ya bụ ọrụ okporoụzọ bụ nke ha na-arụ na mpaghara njikọụzọ Y-Junction, mpaghara njikọụzọ Goodwill, ya na mpaghara okporoụzọ ahụ siri Goodwill gaa Isuaniọcha na Mgbakwụ, ma bụrụkwa nke a na-arụ site na nkwàdo ndị òtù ‘Okpuno Town Union’.   Ndị obodo ahụ malitere ịrụ ka ọ gachara ihe dị ka otu izuụka aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Soludo kpọkuru ma dụọ ndị obodo dị icheiche na steeti ọdụ ka ha ghọta mkpa ọ dị inyere gọọmenti aka n’ịkwalite mmepe obodo, site n’iji aka ha rụọ okporoụzọ na ụfọdụ ndị ọzọ adịchaghị etu ha siri kwesi n’obodo ha dị icheiche, maka na ọrụ chere gọọmenti n’ihu dị ọtụtụ.   N’okwu ya n’ebe ahụ, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ignatius Okoye kwuru na ha kpebiri ịrụ ya bụ okporoụzọ n’ihi ajọ ọnọdụ ọ nọ na ya maka

Soludo arịọla njikọaka, nkwàdo ndị otu mba ụwa, UN

GỌVANỌ Chukwuma Soludo akpọkuola ndị otu mba ụwa United Nations(UN) ka ha na-adọnyere steeti Anambra úkwù n’ihe gbasaara mmepe obodo na ịkwàdò atụmatụ dị icheiche ga-enye aka n’iwulite ọdịmma steeti ahụ na ụmụafọ ya.   Gọvanọ Soludo kpọrọ oku a n’okwu ya oge ndị òtù sitere ụlọọrụ United Nations bịara kpọtụrụ ya n’ebe obibi ya dị n’Amawbia, bụ ndị ọ bụ onye ji ọkwa dịka onye nlekọta ‘Resident and Humanitarian Cordinator’ n’ala Nigeria bụ Maazị Mathias Schamel duru ha wee bịa.   Dịka gọvanọ siri kwuo n’ebe ahụ, ọbịbịa mkpọtụrụ ahụ ndị ahụ biara bụ nnukwu ihe àtụ̀ na steeti ahụ, ọbụladị dịka ọ kọwàkwàrà na ụlọọrụ UN enweghị ụlọọrụ ọbụla na mpaghara ala ahu, wee ruo ugbua ọchịchị ya banyere n’ọkwa.   Ọ gara n’ihu kpọpụtasịa ihe dị icheiche ọchịchị ya mepụtagoro na ngalaba dị icheiche kemgbe ọ malitere ọrụ, ọkachasị na ngalaba nchekwa, ngalaba ịkwalite ezi ọnọdụ gburugburu, ngalaba agụmakwụkwọ, na ngalaba inwogharị ọnọdụ akụnụba steeti ahụ, tinyere ịkwàlite ọdịmma ụmụafọ steeti ahụ na iwèta

Gọọmenti ahazigharịala usoro ịkwụ ụtụ isi n'Anambra

Ọ NA-ADỊ mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ.   N’ịgbaso nke a, ọchịchị steeti Anambra ekwupụtala na ya ahazigharịala ihe ụfọdụ banyere usoro e si atụ ụtụ isi na ụtụ ndị ọzọ a na-atụ atụ na steeti ahụ, ma mee ya ka ọ bụrụzie nke a ga na-ebe n’usoro ọgbaraọhụrụ dijitaal.   Gọvanọ Chukwuma Soludo kwupụtara nke a oge ya na ndị ndu na ndị òtù jikọtara ndị ahịa na ndị na-anya ụgbọala e ji akpa ego n’ime steeti ahụ nwere ọgbakọ mkparịtaụka n’Awka na nsonso a.   Ọ kọwara na usoro ọhụrụ ahụ a hazigharịrị bụzị nke ga-eme ka onye ọbụla chọrọ ịkwụ ụtụ isi maọbụ ụtụ ndị ọzọ a na-akwụ gọọmenti na-emezị nke ahụ naanị site n’akara ọba ego gọọmenti, site n’ụlọakụ maọbụ site n’usoro ịntanetị, n’abụghịzị ịkwụnye ya n’aka mmadụ maọbụ inye mmadụ ọbụla ego n’aka n’ụdị na ọ bụ onye ọrụ gọọmenti.  Ọ dụrụ onye ọbụla kwụrụ ụtụ isi maọbụ ụgwọ ọbụla n’aka gọọmenti ọdụ ka ọ gbaa mbọ nata akwụkwọ ikike na-egosi na ọ kwụọla ụgwọ ahụ, n’ihi na ọ bụ site na ya ka a ga-eji mara na onye dị etu ahụ akwụọla ya bụ ụgwọ.