Soludo eduola mmadụ anọ ọzọ n'iyi ọrụ
GỌVANỌ steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo nọrọ ụbọchị Mọnde wee duo mmadụ atọ ọzọ n’iyi ọrụ iji ọkwa dị icheiche n’ọchịchị ya na steeti. Mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumeezu ‘International Convention Centre’ dị n’Awka, ma bụrụkwa ebe ọ nọrọ wee duo otu onye n’iyi ọrụ dịka Kọmishọna, dukwa mmadụ atọ ndị ọzọ n’iyi ọrụ dịka ndị ndụmọdụ pụrụiche na ngalaba dị icheiche. Ndị ahụ o duru n’iyi ọrụ ọhụrụ gụnyèrè Ọkaiwu Sly Ezeokenwa, bụ onye o duru dịka Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ pụrụiche na steeti ahụ; Dọkịta Nelson Omenugha (onye ọ kpọlitere n’ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche n’ihe gbasaara nkwàlite ndị ntorobịa); Maazị Bob-Manuel Udokwu (onye ọ kpọlitere n’ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche n’ihe gbasaara ime obi añụrị, mmesapụahụ na njem nlegharịanya); na Ọkaiwu Tobechukwu Nweke (onye ọ kpọlitere n’ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụiche nye Gọvanọ n’ihe gbasara iwu). Ka ọ na-agwa ndị ahụ okwu oge ọ na-edu ha n’iyi ọrụ ahụ, Gọvanọ Soludo gbàrà hà ume ka ha gbasie mb