Posts

Showing posts from February, 2022

Apịara m nwata ahụ ụtalị dịka o kwesịrị – Onyenkuzi pịagburu obere nwa na Delta

EMEKA Nwogbo, bụ onyenkuzi n’ụlọakwụkwọ Arise and Shine Nursery and Primary School, Asaba, onye ndị uweojii nwụchikọrọ maka iji ụtalị pịagbuo  obere nwatakịrị, Obinna Udeze dị ọnwa iri na iteghete (19 months), agọọla agụgọ na ọbụghị ụtalị ọ pịara nwata ahụ mere o jiri nwụ.  N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na Tuzdee, Nwogbo kwuru na ọ ga-enwerịrị ihe ọzọ mere nwata ahụ jiri nwụ, dịka ọ na-akọwa na ọ nwụghị oge ọ na-apịa ya ụtalị. O kwuru na ya pịara ya ụtalị dịka e kwesịrị isi pịa obere nwa, na ya nyere ya ntaramahụhụ n’ihi na ọ kwara nwata ọzọ aka.  Onyenkuzi ahụ kwuru sị: “Apịaghị m nwata ahụ ụtalị ganye n’ọnwụ.Apịara m ya ụtalị otu m kwesịrị isi pịa obere nwa ụtalị. Apịara m ya obere ụtalị, ole m nwere ike, egbughị m nwata ahụ. Ọbụghị m kpatara ọnwụ ya. Ha gaa nyochaa ihe a nke ọma. Apịara m ya ụtalị maka na ọ kwara otu nwata aka ma kụọ nke ọzọ ihe n’isi.”  Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ, Ari Muhammed Ali kwuru na a ga-eme nnyocha a na-eme onye nwụrụ

Anambra edozierela Ogidi, Abatete okwu ala ha zọrọ ahọ iri ise

Image
Ọ NAGHỊ adị mma nne nkịta ịnọ n’ụlọ, ụmụ ya ana-azọ ọkpụkpụ.   Ka ọ dị taa, ọchịchị steeti Anambra awụbatala ma kpezie okwu ahụ dị n’etiti obodo Ogidi na ndị Abatete, n’okpuruọchịchị ime obodo ‘Idemili North’, banyere ókè ala obodo abụọ ahụ na-azọ, bụkwa nke ha zọgoro ruo ahọ iri ise zuru èzù.   Ya bụ nsogbu ókè ala bụ nke dị kpọnkwem n’etiti ndị Ụmụezeobodo Ajịlịja Ogidi na ndị Ụmụdunu Agbaja Abatete, ma bụrụkwa nke e kpeziri na nsonso a site n’aka ndị òtù na-ahụ maka ókè ala na steeti ahụ a maara dịka ‘Anambra State Boundary Commission’ dị n’okpuru ụlọọrụ osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke.   Ndị obodo abụọ ahụ jìkwàzịrị ọñụ nupụta n’ìgwè, wee merùbe mkpezi ahụ e kpeziiri ha nàkwà udo batagoro n’etiti ha.   N’okwu ya na mmemme ahụ, bụkwa nke ndị òtù ‘Anambra State Boundary Commission’ sònyèrè na ya, osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke katọ̀rọ̀ etu nsogbu banyere oke ala si arị ibe ya elu na mpaghra ebe dị icheiche n’ala Nigeria, ma bụrụkwa nke na-eb

Bishọp Okoye ewerela ọnọdụ dịka onyeisi ụka Katọlik, dayọsis Nnewi

BISHỌP Jonas Benson Okoye bụ onye jibu ọkwa  ‘Auxillary Bishọp’ nke Dayọsis Awka buzi Bishọp Dayọsis Nnewi, ka Bishọp Hillary Paul Odịli Okeke bụ Bishọp izizi dayọsis ahụ lara ezumike.  A mụrụ Bishọp Jonas Benson Okoye n’ezinaụlọ Maazị Patrick na Oriakụ Theresa Okoye, ndị Adazi Nnukwu. Ọ bụ na Kaduna ka a mụrụ ya ka ọnwa Jenụwarị dị n’abalị iri abụọ na ise, n’afọ 1963.   O nwere ọkpụkpọoku ichi ụkọchukwu oge ọ na-agba odibọ maasị n’okpuru Fada Miniham, n’obichukw St Joseph’s Cathedral, Kaduna.  Ọ malitere agụmakwụkwọ ukọchukwu na St Paul’s Seminary, Ukpor, n’afọ 1976/77, si ya gaa All Hallows Seminary, Onitsha.  Ebe ndị ọzọ ọ gụrụ akwụkwọ tupu o chie ụkọchukwu gụnyere Bigard Memorial Seminary, Ikot- Ekpene bụ nke mechara bụrụzie St Joseph’s Major Seminary na Bigard Memorial Seminary, Enugu.  Achịbishọp A.K.Obiefuna ji ọkwa dịka Bishọp Dayọsis Awka oge ahụ chiri ya ukọchukwu n’afọ 1992 na St Andrew’s Catholic Church, Adazi – Nnukwu.  Dịka ụkọchukwu, ọ kọrọ n’ugbo Chineke n’ebe ọ dị ukwu

Achbishọp Okeke adụọla ndị ụka ka ha kwe ka Mụọ Nsọ na-edu ha

ONYE ji ọkwa Metropolitan Achbishọp nke ‘Onitsha Ecclesiastical Province’, bụ ‘His Grace, Most Reverend’ Valerian Okeke akpọkuola ma dụọ ndị ụka ọdụ ka ha nyefèé onwe ha, kwe ka mụọ Chukwu na-edu ha, ma bụrụkwa ezi ndị agha nke Kraịst.   Ya bụ Achbishọp kpọrọ òkù a n’okwuchukwu ya n’ụlọụka ‘St. Charles Lwanga Catholic Church’ dị n’Okpoko, n’okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru na steeti Anambra oge ọ gara njem nleta n’ebe ahụ.   N’okwuchukwu ya n’ebe ahụ, Achbishọp Okeke, onye okwuchukwu ya gbadoro ụkwụ n’isiokwu na-asị “Kwe ka Mụọ Nsọ biri n’ime gị”, kọwàrà na Mụọ Nsọ enweghị mmalite na njedobe, n’ihi na Chineke enweghị mmalite na njedobe.   Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha onye ọbụla n’ime ha nabata Mụọ Nsọ ma na-ebikwa ezi ndụ ga-eme ka Mụọ Nsọ ahụ nọgide n’ime ya mgbe niile, ọbụladị dịka o chètààrà ha na Chineke bụ ụzọ, eziokwu na ndụ, ma nyekwazie ha ndụmọdụ ka ha bụrụ ezi ndị agha nke Kraịst ga-egùzosi ike ma jigidesie okwukwe ha ike dịka ezi ndị otu Kraịst.   O jikwazịrị ohere ahụ kelee onyeisi nc

Ndị ụka 'Anglican Church of Redemption' akàála ụka ọgbụgba ndụ, wepụta isiokwu ọhụrụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ n’ụlọụka ‘Anglican Church of Redemption’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra’ dịka ya bụ ụlọụka kàrà ụka ọgbagba ndụ pụrụ iche, bụ nke a kpọrọ ‘Covenant Sunday’, ma wepụtakwa isiokwu ọhụrụ maka ahọ a bụ 2022.   Ya bụ mmemme isiokwu ya bụ “Ọgbụgbandụ Nke Ịba Ụba” (Covenant of Abundance), nke a malitere n’ụtụtụ ụbọchị ụka, bị̀àrà na njedobe na mgbede ụbọchị Tuzdee, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ na-akà ụka n’ebe ahụ nà ụfọdụ ndị sitere ebe ndị ọzọ wee bịa.   N’okwuchukwu ya, onye Chineke jiri kwara ngwaọrụ n’ụzọ pụrụ iche na mmemme ahụ, bụ ‘Evangelist’ Onyeka Arinze, nke ụlọụka ‘Christ Anglican Church, Nkwelle-Ogidi’ kọwàrà ọgbụgba ndụ dịka mmadụ na ibe ya inwe nkwekọrịta n’otu ihe maọbụ karịa.   Ọ gbadòrò ụkwụ N’Akwụkwọ Nsọ Deuteronomy 5:2-3 wee kọwaa, n’ebe o dòrò anya, ihe ọ pụtara, bụ mmadụ na Chineke ịbà n’ọgbụgba ndụ, ma chetekwaziere ndị ụka na Chineke anaghị agharịpụ onye Ya na ya gbara ọgbụgba ndụ, n’ihi na Ọ bụ Chineke na-edebe ọgbụgba ndụ.

Ụmụnwoke anọ ji ọgbatumtum site Enugu gaa ịgba nkwụ nwaanyị na Benue efuola

Ọ GBAGWOJURU ndị mmadụ anya ka ụmụnwoke anọ si fuo ka ha si steeti Ebonyi aga Benue.   Ogonna Chukwu, 33; na nwanne ya, Sunday Chukwu 31; ọga ha, Chinedu Nwaite, 30, na enyi ha nwoke, Tochukwu Ekuma, 30, bụcha ndị Isiama Onitcha Igboeze dị n’okpuru ọchịchị Onicha na steeti Ebonyi bụ ndị ahụbeghị anya ọzọ kemgbe Disemba 26, 2021, dịka ha pụrụ ma gaba emume ịgba nkwụ nwaanyị nwanne (cousin) ha n’Okpa-Ogene nke dị n’okpuru ọchịchị Oju, steeti Benue. Nne ụmụ nwoke abụọ ahụ na-efu efu, Oriakụ Lydia Chukwu bụ onye Oju,kwuru ha ji ọgbatumtum agbụọ aga ebe ahụ.   Ezinaụlọ ahụ, gụnyere nne na nwunye ha akwaala arịrị ụdị ahụhụ ha na-agabiga kemgbe ụmụnwoke ahụ furu.   Oriakụ Goodness Chukwu, nwunye Ogonna gwara ndị ntaakụkọ na kemgbe ahụ na ụmụ ya dị atọ n’ọnụọgụ na-ajụ ajụjụ banyere nna ha.   Ya mere, nwaanyị ahụ dị afọ iri abụọ na iteghete, ma dịrịkwa ime kpọkuru gọọmenti ka ọ gbata ọsọ enyemaka na ya bụ okwu ka ha ghara ịghọ ajadu na nwata.   N’akụkụ nke ya, Success Chukwu onye dị ya bụ Sunda

Ịhụ ụbọchị ịhụnanya (Valentine Day) ka emume ụwa niile na-eme

EMUME ụbọchị ịhụnanya (Valentine Day) bụ ozuru mba ọnụ, n’ihi na ụwa niile na-eme ya. Ọ bụ oke emume na-ada ụda, nke a na-eme afọ ọbụla ma ọnwa Febụwarị dị na 14.   Akụkọ kọrọ na Valentine dị asọ bụ ụkọchukwu Katọlik nwụrụ n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe mmadụ ibe ya nọ. E gburu ya n’ihi ịhụnanya. N’ihi nke a, ụwa niile na-echeta ya ma were ụbọchị ya na-egosịrịta onwe ha ịhụnanya.   Ọtụtụ ndị na-eme emume a n’ụzọ ziri ezi dịka o kwesịrị site n’inyere ndị ha ka mma aka n’ụzọ dị iche iche. Ezinaụlọ na-anọkọta ọnụ, rie, ńụọ n’ịhụnanya. Otu ahụ ka ọ dị n’ebe ndị ikwunaibe na ndị enyi nọ. Ụfọdụ na-aga n’ogige ndị enwe nne na nna, ụlọnga gosi ha ịhụnanya site n’ịzụkọtara ha ihe oriri dịka osikapa, ji, azụ, anụ tinyere akwa na ihe ndị ọzọ dị iche iche.   N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị ọzọ ma ndị ntorobịa ma ndị okenye ji emume ịhụnanya a akpa arụ dị iche iche gụnyere akwamio. A laala ọtụtụ ụmụnwaanyị n’iyi n’ihi emume a. Ụfọdụ ka a napụrụ ihe ha nwere n’ike, ebe ụfọdụ tufuru ndụ ha dịka nwoke duru ha

Idu Obì n'ala Igbo: Oge mbụ na oge ugbua

IDU obì bụ otu n’ime ihe zuru Igbo ọnụ, ma bụrụkwa oge e ji asị nwata nwoke ”Lee nke a jide” n’ezinaụlọ a mụrụ ya.   Na nkọwa, idu obì pụtara nna ịkpọ ụmụ ya ndị nwoke, keere maọbụ nye onye ọbụla n’ime ha ala ebe ọ ga arụ ụlọ nke ya, maka na a sị na nwata toruo obi ọ pụọ obì. Ndị mba ọzọ dị iche iche na agbụrụ ụfọdụ na-emekwa omenala idu obì n’ụdị nke ha n’ihi na ama onye na-adị ka o siri chọọ ya.   N’ala Igbo, idu obi abụghị naanị omenala, kama ọ bụkwa ihe ziri ezi, n’ihi na a sị na ihe onye ruru ogo ya wee rie ya, ọ bụghị akpịrị. Ọ bụ kwa ihe a ma ama na ọ bụrụ na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mere anụ n’ọkọchị na n’udummiri. Nke a mere na ndị Igbo ejighị idu obi egwu egwu, ọ kachasị n’oge gboo, maka na ha ghọtara na ọ bụrụ na nwoke edozighị ngwuru be ya n’oge, nsogbu ụwa edulaa ya mmụọ.   N’oge gboo n’ala Igbo, nwoke ọbụla lụrụ nwaanyị na-ebu ụzọ gbàkọcháá ala ya na ihe o nwere, tupu o mara etu ya na nwunye ya ga-esi debe ọkpà wee gba egwu n’elu àkw

Ịkwa ozu n'ala Igbo, oge gboo na oge ugbu a

NA mgbe gboo, ịkwaozu dị nfe n’ala Igbo. Mmadụ nwụọ ndị ezinaụlọ ya na eme mmemme akwamaozu ya oke aka ha ra. Oge ụfọdụ, onye nwụrụ enweghị ihe o debere, ụmụ ya enweghị ihe ha nwere, e gwuo ala lie ya ozigbo, ụmụnna agbaa izu mekọlata akwamozu ya makana onye ọzọ nwụọ, agaghị eme mmemme ọbụla.   N’ezie, Igbo na-asụ n’olu n’olu ma ha kwaa ụkwara ọbụrụ ofu. Igbo kwenyere na onye nwụọ, ọ bụrụ na akwaghị ya, onye ọzọ nwụọ agaghị akwa onye nke abụọ nwụrụnụ.   Ọ bụ ezie  na ihe e ji akwa ozu dị ukwu ma na ọbụ ka ndị si chọ ịkwa ozu ka ha ga- eji kwaa ozu ha maka Igbo kwuru sị na ọ bụ ka aka ha nwaanyị ka ọ na-atụkwasa di ya.   Ụfọdụ obodo na steeti Anambra emeela ya ka ọ dị mfe site n’ibelata abalị olemole ha ga akwa ozu. Ụfọdụ mechiri isi nri. Ọ bụrụ na mmadụ kpatara ego, chọọ ịkwa nne, nna maọbụ nwanne ya, nke ahụ dị iche mana o kwesịrị ịbụ mgbe nne, nna na nwanne ya ahụ dizuru ụbọchị ndụ nke bụ nke ndị Igbo na-akpọ ozu oriri.   Ọka mma mmadụ nwụọ, ụmụ ya na ụmụnne ya ghara ime dịka onye nk

Aka NDLEA akparala nwoke India bubatara ọgwụike na Nigeria

ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịkpọ, ịñụ, maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela otu nwoke bụ onye mba India maka ibubàtà karama ọgwụike Codeine ruru otu narị puku na iri atọ na anọ na narị asaa (134, 700) n’ọnụọgụgụ n’ala Nigeria site na nzuzo.   Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n’isi ụlọọrụ NDLEA n’ala Nigeria, bụ Maazị Femi Babafemi siri kọwaa, nwoke India ahụ aha ya bụ Vyapak Nutal, bubàtàrà ọgwụike ahụ na nzuzo site n’ebe ala Nigeria na mba Niger Republic gbara agbataobi, dị na steeti Sokoto.   Ọ kọwara na nwoke ahụ bụ onye na-azụ ahịa, ma bụrụkwa onye kwajubere ọgwụike ahụ n’ime ọtụtụ ụgbọala gwongworo na Cotonou dị na mba Benin Republic, e wee si ebe ahụ bukọrọ ha gafee mba Nigeri Republic, wee bata steeti Sokoto site n’ókè ala ebe iwu akwadòghị.   Ọ kọwara na nwoke ahụ nọzị n’otu ụlọ nkwariakụ dị na Sokoto ebe ọ na-ezuru onwe ya ike wee na-achọkwa ndị ga-azụrụ ya bụ ọgwụike, tupu

Nri ndị Igbo: Unejoko a hụrụ n'ọkụ

 OJOKO bụ nri ọtụtụ mmadụ n’enwe mmasi iri mana nri dị n’ime ojoko ma azụ ya bụ ọgwụ. Onye afọ na asa ọ na-enwe ike ọgwụgwụ, o rie ojoko a hụrụ n’ọkụ, nwa oge, o nweta ike na ume. E ji ojoko chara acha e si agwa, e jikwa ojoko chara acha eri osikapa ma e ghee ya eghe.   Taa, anyị ga ekwu maka ojoko a hụrụ n’oku na otu e si eri ya. Ugbua, akụkụ ụzọ niile dị na obodo mepere emepe maọbụ n’ime obodo, ị ga-ahụ ndị n’azụ ahịa ojoko a hụrụ n’ọkụ. E ji izụ ahịa ojoko a hụrụ n’ọkụ azụ ụmụaka, e jikwa ya akwụ ụgwọ ụlọ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.   Otu a ka ndị ji ya atụ mgbere si akwado ya. Ha sie agwa, o ghee nke ọma, ha ekponye unyi n’ihe e ji esi unyi, ha etinye ya ọkụ were ihe e ji amị anụ tụkwasi n’elu ọkụ ahụ, wụkwasa ojoko chara acha na nke achaghị n’ọkụ ahụ na-atụgharị ya ka ọ ghara ire ọkụ. O ghee, I wepụcha azụ ya, I bericha ojoko ahụ kịrịkịrị, kunye agwa na ya, tinye mmanụ, yabasi, nnu, ose, ị gwọkọọ ya nke ọma, wukwasi ya ụtazi I bere kịrịkịrị n’elu ya, ọ bụrụzie oriri.   Ọ bụrụ na ịchọghị

Ọgwụ ego: Ndị iwe juru obi agbaala mmadụ abụọ ọkụ n'Ogun

IGBO sị na ọ bụrụ na a gbaghị ụzọ oweri mgba ọ naghị echi.   N’ihi nke a, ndị ntorobịa iwe juru obi nọrọ na nsonso a wee mụọ mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ onye ọgwụ ego ọkụ na steeti Ogun. Ya bụ nnukwu ihe nkiri bụ nke mere n’obodo Oja-Odan dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Yewa-North’ nke steeti ahụ.   Dịka akụkọ siri kọọ, mmadụ abụọ ahụ a mụrụ ọkụ, bụ Idowu Afolabi na Johnson Adebiyi bụ ndị ụmụokorobịa jidere na mpaghara ahụ ka ha jigasị ákụ̀kụ̀ ahụ mmadụ e gburu ọhụrụ, wee kpụrụ ha nyefèé ha n’aka ndị uweojii, a kpọchie ha.   Kaosiladị, égwú dàghàrịzịrị oge ọtụtụ ndị ntorobịa jìrì iwe wee wụchaa n’ogige ndị uweojii ahụ, wakpò ndị uweojii nọ n’ọrụ ebe ahụ, ma bàá n’ime ebe ahụ a kpọchiri ndị ahụ, dọpụta ha, tie ha gwoogwoo, ma gbaa ha ọkụ ozigbo n’ihu ogigè ndị uweojii ahụ, ma gbaa ha ọkụ ozigbo, ha wee ghọọ ntụ. \  N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ katọrọ akparamagwa ahụ ụmụnwoke ahụ kpara, kọwaa ya dịka nke kọgburu onwe ya, ma mekwa ka a mara na ya agag

Mmemme ịtụ ndo

NDỊ Igbo so n’agbụrụ na-eme mmemme dị iche iche. Mmemme ndị ahụ gụnyere ichi echichi dịka nze na ọzọ, ịgba nkwụ nwaanyị, akwamozu, ọńụ nwa w.d.g.   A na-akwado nke ọma tupu e mee emume ndị ahụ, site n’iwekọta ihe ndị a ga-eji mee ya.   Ya mere n’izu a, anyị ga-etụle otu ha si eme ka ndo dị ebe a na-eme mmemme. Ndo na-echekwa ndị mmadụ ka mmiri ozuzo maọbụ anwụ ghara imekpa ha ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ emeghị ka ndo dị ebe ọ na-eme emume ọbụla, ị mara na emume ahụ akwụsịghị ike. Nke bụ ezi okwu bụ na ọ bụ ihe ndị ahụ a na-arụ ka e wee nwee ezi nchekwa banyere ndo na-ezipụta na e nwere mmemme n’ezinaụlọ ahụ.   N’oge gboo, ihe e ji eche ndo ebe a na-eme mmemme bụ igu nkwụ. N’oge ahụ n’ụtụtụ ụbọchị a ga-eme mmemme maọbụ na mgbede ụnyaahụ ya, a ga-eji igu nkwụ rụọ ụlọ ole a chọrọ n’ezinaụlọ ahụ. A ga-arụ ya nke na ọ ga-enye ndị mmadụ ezi nchekwa.   N’oge ahụ, ọ bụ ikwunaibe, tinyere ndị agbataobi na-aga gbutechaa igu nkwụ ma jiri ya rụọ ụlọ maka ndo n’anaghị onye ahụ na-eme mmemme ego. Ọ bụ ụmụi

Udeze akpọkuola ndị Igbo ka ha na-eri nri e jiri mara ha

A KPỌKUOLA ndị Igbo ka ha ná-eri nri dị icheiche e ji mara ndị Igbo, iji nye aka kwalite nchekwa ọnọdụ ahụike ha ma nyekwara ha aka ịgbanahị ụfọdụ ọrịa dị icheiche a na-arịagasịzị n’oge ugbua.   Onyeisi Ọba Akwụkwọ Steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze bụ ya kpọrọ oku a n’okwu ya na mmemme ọba akwụkwọ ahụ chịkọbàrà iji merùbe mmemme ụbọchị ọrịa kansa na mba ụwa, nke ahọ 2022.   Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ steeti ahụ dị n’Ozubulu, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo, ma bụrụkwa nke dọtara ndị nne, ndị nna, ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ ọba akwụkwọ dị icheiche.   N’okwu ya n’ebe ahụ, ya bụ onyeisi ọba akwụkwọ, Dọkịta Udeze kọwara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji gbasàá ozi, ma kụziere ọhaneze ihe ha kwesiri ịma banyere ọrịa kansa, ma gwakwa ha etu ha pụrụ isi wee gbanahị maọbụ gbòchie ya bụ ajọ ọrịa.   Ka ọ na-akọwa isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a, nke pụtara “Imechi Oghere Nlekọta Ahụ” (Closing the Care Gap), Dọkịta Udeze dụrụ ndị bịara mmemme ahụ ọdụ ka ha na-elekọta ndị

Ọńụ dara ka Achịbishọp Okeke mere ncheta afọ iri abụọ o chiri nnukwu ụkọchukwu

ONYE nnọchianya Pope n’ala anyị (The Apostolic Nuncio of the Holy See to Nigeria) ma bụrụkwa ‘Permanent Observer Economic Community of West African States (ECOWAS), Achịbishọp Antonio Guido Filipazzi, ndị bishọp iri atọ na isii na ihe karịrị ndị fada dị narị anọ n’ọnụọgụ zukọtara n’obi Chukwu, Basilica Square of the Most Holy Trinity, Onitsha, maka emume afọ iri abụọ (20th anniversary) Achịbishọp Onitsha, Valerian Okeke ji chie nnukwu ụkọchukwu.   Ebe ndị nnọchite nọchitere anya Achịbishop na bishọp iri atọ.   Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano, gọvanọ a họpụtara ọhụrụ bụ Chukwuma Soludo, Sinetọ Uche Ekwunife tinyere onye ji otu ndọrọndọrọ P.D.P zọọ ọkwa gọvanọ, Valentine Ozigbo bịarakwara soro wee ńụrịa.   Achịbishọp Fillipazi Nuncio ahụ, oge ọ na-enye Achịbishọp Okeke ngọzi emume ahụ toro ịtụmmamma (Eucharistic thanksgiving) ahụ ma kọwaa ‘Eucharist’ dịka ụka ịtụ mmamma maka Jesu Kristi, maka ekpere na arịrịọ maka mgbaghara.   N’okwuchukwu ya, Bishọp Dayọsis Nsukka, Mo

Ndị ndu ọhụrụ NUJ, Anambra akpọtụrụla onyeisi ANPC

. ..Hibe amụma ime afa Nnabuife ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ NDỊ ndu ọhụrụ a họpụtara ka ha kpara ụgbọ Nigeria Union of Jounalist  (NUJ), ngalaba steeti Anambra na-aga n’ihu nke Dọkịnta Odogwu Emeka Odogwu nọ n’isi ya awụchaala n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, Sports LightXTRA na Homeland, maka ụkpa ekele na oku ịkwado ha na-aga n’ihu.   Onyeisi ANPC, Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya nabatara ha nkeọma.  N’okwu ya, Dọkịnta Odogwu gosipụtara afọ ojuju ya na ndị ọrụ ya nwere banyere nkwado ụlọọrụ ANPC nyere ha mgbe e mere nhọpụta ahụ nke ha ji turu ugo.  O kwuru sị na ọ dị ihe ise ha ji bagide njem ahụ. Ya mere o kwuru sị: “Anyị bịara ebe a taa ikele ụnụ otu ụnụ si nye anyị nkwado oge a họpụtara anyị, n’akpaghị oke ọbụla. Anyị na-akpọkwa oku ka ụnụ nọgide n’akwado ọchịchị ọhụrụ nke NUJ.”   Ọ gara nihu jaa Nnabuife ike maka ọrụ ọma ya n’ụlọọrụ ANPC nke gụnyere ihibe ọmarịcha ụlọọrụ ICT, agadaga ụlọezumez

Nri ndị Igbo: Otu e si esi ụkpaka na otu e si eri ya

NDỊ Igbo nwere ọtụtụ nri dị iche iche nakwa ihe ndị nọchiri anya magi n’oge gboo dịka ndị a: ụkpaka, okpeyi, ogiri, dawadawa, efu, mkpụrụ ụzịza w.d.g. Ihe ndị a niile nwere ọrụ na ụtọ ha na-enye na nri.   Anyị ga-amara ka e si esi ụkpaka nakwa otu e si eri ya. Ọbụghị naanị ụtọ ka ụkpaka na-atọ na nri kama ụkpata bụ ọgwụ. N’ezie, Chukwu ji ọtụtụ ihe oriri ọma chọ ndị Igbo mma.   Otu a ka e si akwado ụkpaka tupu eribe ya: ị kpota mkpụrụ ụkpaka, ị sinye ya n’ọkụ, ị ga-esi ya ka o ghee. Ka ị ga-esi mara na o gheela bụ na ị pịa ya aka, ọ pụta n’okpuru ya, I wepụtachaa ya n’okpokoro ya, bee ya kịrịkịrị sinye ya ọzọ n’ọkụ. Ị ga-esi ya ihe dịka awa atọ tupu ị wụpụ ya na nyọ. Denye/banye ya na mmiri, chi foo, sapụ ya na mmiri ahụ, ńaa akwụkwọ unere n’ọkụ, tinye akwụkwọ ahụ na nyọ, wụnye ụkpaka ahụ n’ime ya, werekwa akwụkwọ ahụ kpuchie ya, ekwekwala ka ijiji be na ya ka ọ ghara ịgba ikpuru. Ọ gaa abalị anọ, ọ bụrụ oriri.   Otu e si eri ụkpaka: E ji ụkpaka agwọ abacha, e ji ya na akwụkwọ ańara em

Ichekwa mmiri ọńụńụ: Udu na akpati njuoyi, kedụ nke ka mma?

MMIRI ọńụńụ dị nnukwu mkpa na ndụ mmadụ. Ya mere ichekwa ya nke ọma dịkwazị mkpa ka o were nye ihe a chọrọ.   N’oge gboo, udu ka e ji echekwa mmiri ọńụńụ. Ọ na-eme ka mmiri jụọ oyi dịka o kwesịrị. Mmiri ọbụla e si n’ime udu kupute na-adị jụụ n’ahụ. Onye ńụchaa ya, o nwee ọńụ na afọ ojuju na ọ ńụrụ mmiri n’ihi na ọ na-adị ka chi siri ke ya.   Ma n’oge ugbu a, a nọzi n’ụwa ọhụrụ, ihe agbanweela; ndị mmadụ agbasorola ụzọ ọhụrụ. Ihe e ji echekwazi mmiri ọńụńụ bụ akpati nyụoyi/friiji (refrigerator).   Nke a na-echekwakwu mmiri n’ụzọ nke ya. Ọ na-ajụ mmiri oyi karịa udu. Otu o sila dị, ihe nwere uru nwere ọghọm tinyere na onye ọbụla bụ mmadụ nwere ihe ọ chọrọ. N’ihi ya, ọtụtụ mmadụ tinyere ọnụ n’okwu a were kwuputa echiche ha. Ugochukwu Ezeh – Mmiri a gbanyere n’udu na-ajụ oyi ma na-adịkwa mma n’ahụ. Mmiri a na-agbanye n’udu bụ mmiri e si na mmiri kute. Mmiri iyi, yaabụ mmiri e si na mmiri kute bụ mmiri dị ka chi siri ke ya. Mmiri e chutere echute na-enwe isi nke bụ ihe gosịrị na ọ dị ka chi

Na Lagos, Ụka Katọlik enyela fada machiri ukwe Igbo n'ụlọụka ya ocheazụ

 ỤKA Katọlik, Achịdayọsis Lagos, enyela ụkọchukwu parish nke Holy Trinity Catholic Church, Ewu-Owa Gerigbe Ikorodu Lagos, Fada James Anelu ocheazụ maka ịmachi egwu Igbo na egwu olu dị iche iche (choruses) na parish ya.   Achịbishọp Lagos, Most Rev Dr Alfred Martins, n’ozi nkatọ ‘disclaimer’ nyere ụkọchukwu ahụ iwu ka ọ nyegodu ohere ‘an indefinite leave of absence’.   Fada Anelu ka e kwuru na ọ machịrị egwu Igbo na abụ olu dị iche iche na parish ya, ma kwuo na a ga-egbochilata otu ‘Ndigbo’ si awa anya.   A chọpụtara na o ji iwe kwụsị ukwe/abụ na-akpalite mmụọ oge a na-enye onyinye nke ugboro abụọ, ma kwuo na ndị Igbo agaghị anọgide n’ịwakpo ndị ọzọ anya na parish ya.   E kwukwara na ụkọchukwu ahụ gara n’ihu rụtụ aka na dayọsis Benin, ebe ndị Igbo wagidere anya wee ruo na nke ịbụ bishọp.   Otu o sila dị, o kwuru na mmụọ nke Chineke maara sọọsọ asụsụ ndị gbara parish ahụ gburugburu.   Dịka ọ na-ekwuputa ozi inye ocheazụ ahụ, Achịbishọp Martins na leta o dere na Febụwarị 7, kwuru sị: “Ozi

A kpụpụla ajadu ụlọikpe maka iji agụba bekasịa nwa oje ozi ya gụrụ anụ n'ite ofe

NDỊ uweojii anwụchịkọọla otu nwaanyị ajadu, Oriakụ Opeyemi Omoyemi maka ịńyụ nwata nwoke oje ozi ya gbara afọ iri na abụọ ịkpakwụ, site n’imerụ ya ahụ n’ụzọ dị oke egwu. Ọ bụ n’Akure, isi obodo steeti Ondo, ka ya bụ nwaanyị mụtara ụmụ anọ nọ wee yie nwa oje ozi ahụ, Joel Sunday, egwu.   E kwuru na o ji osisi na agụba (razor blade) wee merụọ ya ahụ n’ebe dị iche iche n’ahụ ya, dịka o kwuru sị na ọ gụụrụ anụ na nri ụbọchị ụka.   Ya mere, a kpụpụrụ Omoyemi ụlọikpe majie dị na isi obodo steeti Ondo, n’ime ụzọ ihe ise gụnyere ịgbụ ọchụ, mmegbu ụmụaka, ibuso agha megide mmadụ, w.d.g.   Onye uweojii okwu dị n’aka, Emmanuel Tanimowo kwuru na ọ kpara arụ ahụ na Febụwarị 6, 2022, n’ụlọ ya n’Idimango dị na mpaghara Adewale, okporoụzọ Ondo, Akure.   Tanimowo gwara ụlọikpe ahụ na ọ bụ otu nwaanyị onye ọrụ ahụike ọha na eze aha ya bụ Alice Ayedun wetara mkpesa ahụ dịka ọ hụchara nwata ahụ ka ọ nọ n’ihe mgbu, ebe ọbara na-agba ya site n’akụkụ ahụ ya dị iche iche.   O kwuru sị: “Oriakụ Ayedun Alice na

Aka NDLEA akparala DPO ndị uweojii, ndị ọzọ maka ịtụ mgbere ọgwụike

ỤLỌỌRỤ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchikọọla otu nwoke aha ya bụ Monday George, jibu ọkwa dịka ‘Divisional Police Station (DPO)’ nke Idanre ‘Police station’, steeti Ondo, maka ịtụ mgbere ọgwụike.   Okwuputa okwu NDLEA, Femi Babafemi, n’okwu ya n’Abuja, kwuru na a chụrụ ya bụ nwoke n’ọrụ n’ihi ịdaga iwu n’ihe gbasara ọgwụike.   O kwuru na a nwụchikọrọ ya na onye otu ya, Emmanuel Eniola, gbara afọ iri anọ ka ha ji ọgwụike ‘280 blocks of compressed cannabis weighing 168kg’.   O kwuru sị: “A nwụchikọro ha ụbọchị ụka ọnwa Jenụwarị dị n’abalị iri atọ na Mokwa, steeti Niger, ka e jidere ụgbọala Toyota Avalon ha nke akara ya bụ EKY 429 BZ (Lagos) ka ọ bụ ihe ndị ahụ n’Idanre, ma na-aga Kanji, mpaghara Borgu dị na steeti ahụ.   N’akụkụ ọzọ, Babafemi kwukwara na ndị ọrụ (Narcotic officers) n’ọdụ ụgbọelu Murtala Muhammed International Airport (MMIA), Ikeja, Lagos, kụsara mbọ ụfọdụ ndị na-atụ mgbere ọgwụike chọrọ ibufe ‘methamphetamine Brazil na UK, nke e jidere ha ugboro ugbor

Onye na-anya ọgbatumtum agbagbuola onye otu ya maka efere osikapa

NJINJI jiri n’Aba, nke dị na steeti Abia, dịka otu onye ji ọgbatumtum achụ nta ego (ọkada) ji egbe gbagbuo onye otu ya n’ihi efere osikapa.   Ya bụ ihe ka e kwuru na o mere n’otu ebe a na-ere ihe oriri chere were (mama-put) dị n’Uzomkpa ‘Street’ Owerri-Aba, n’okpuru ọchịchị Ugwunagba.   Otu onye nọ ebe ya bụ ebelebe gburu gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ abụọ ahụ na-anya ọgbatumtum, tinyere ndị otu ha ndị ọzọ bịara n’ebe ahụ a na-ere nri nke a maara ka ‘Nwayi-Mmogbo Spot’, ka ha rie nri, ka ha nọ n-eche ka e nye ha nri, otu onye ọzọ na-anya ọgbatumtum aha ya bụ Chinenye batara ebe ahụ ma kwuo ka e nye ya nri. N’ihi ya, otu onye a maara dịka Obereagu, onye ya na ndị otu ha ndị ọzọ nobu ebe ahụ na-eche ka e nye ha nri tupu Chinenye abata gwara ya na ha nọ ebe ahụ tupu ọ bata, ya mere na onweghị mgbe a ga-ebu ụzọ nye ya nri, tupu e nye ha.   Dịka ya bụ onye si kwu, ka ha na-arụ ụka banyere nke ahụ, onye na-ere nri malitere nyebe ndị buru Chinenye ụzọ bịa nri, nke mere ka iwe wee ya.   Ya mere,

N'Aguluezechukwu, Oyinatumba ahanyela Chinenyenwa n'aka Ikenna, ka ọ bụrụ nwunye ya

AGBAMAKWỤKWỌ bụ ihe omimi nke Chineke hibere site n’okike ụwa, dịka o kwuru sị na nwaanyị ga-ahapụ nne na nna ya gaa binyere di ya, ha abụọ abụrụ otu.   Nke ahụ pụtara ihe n’Aguluezechukwu ka Ichie Godwin Ezeuko (Oyinatumba n’Aguluezevhukwu) hafere nwa ya nwaanyị, Bethel Chinenyenwa Ezeuko n’aka Cyril Ikenna Izundu ka ha abụọ bụrụzie dinanwunye.  Oke emume ahụ nke jikọtara ezinaụlọ Ichie na Lolo Godwin Ezeuko na Maazị na Oriaku Cyril Ubadili Izundu (Lord Marshal), bụkwa ndị Aguluezechukwu, okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra, ọnụ dara ụda dịka ndị mmadụ si n’ugwu na ndịdị wee bịa gbaa aka ebe n’alụmalụ ahụ.  N’okwuchukwu ya n’aja Maasị dị asọ e ji wee jikọọ di na nwunye ahụ, nke ọtụtụ ndị ụkọchukwu sonyere na ya n’ụlọụka, St Peter’s Catholic Church, Agulezechikwu, Fada Efobi kpọkuru di na nwunye ahụ ka ha na-echeta Chineke oge niile n’ihe ọbụla ha na-eme na ndụ.Ọ gara n’ihu dọọ ha aka na ntị ka ha na-enwere onwe ha ndidi, ma na-eleghara ihe ụfọdụ anya, iji were nwee udo na agamnihu

Otu a ga-esi gbochie mpụ na ụrụala

MPỤ na arụrụala bụ okwu akpụ n’ọnụ n’oge dị ugbu a. Ihe akwụkwọ nsọ kwuru n’akwụkwọ Timoti nke abụọ isi nke atọ, amaokwu nke mbụ wee ruo na nke ise (2 Timothy chapter 3: 1-5) mgbe ikpeazụ ahụ bụkwa ugbu a. Ihe arụ dị iche iche dịka nwanne igbu nwanne ya, nwa igbu nne na nna ya, izu ohi, nna idina nwa ya, igbu mmadụ, ịtọrọ mmadụ nara ego ma gbuo onye ahụ, iji mmadụ chụọ aja dị iche iche, ịmago nwaanyị elu n’ike, iji aghụghọ nara mmadụ ihe ya, ego maọbụ ala nakwa ihe ndi ọzọ, nwoke ime onwe ya ka nwaanyị.   Oge ụfọdụ ị nụ maka ndị na-akpa nsị na ndị na-ata amosu na-egbochi ọganihu ndị mmadụ. Ihe arụ ndị a na ndị ọzọ akpọghị aha ha ebe a bụkwa ihe na-eme n’oge a.   E kwuchaa ihe ndị a niile ma ekwughị otu a ga-esi gbochie ya, ị mara na ihe e kwuru ezughị oke. Mbụ, ndị ọrụ nchekwa niile dị n’ala anyị ga-ebili tinye anya na mmiri, ma kee ajị n’ume ka ihe ọjọọ ndị a kwụsị. Ha kwesịrị ịdị na-agagharị n’ogbe niile ka anya ha na-eru n’ebe ndị ntorobịa nọ maka na ha na-adị anọ n’ọhịa maọbụ ụlọ a

Ndị uweojii azọpụtala mmadụ atọ ndị ntọ zoro n'ime ọhịa Zamfara

MMADỤ atọ ndị ntọ jidere ma zoo n’ime ọhịa Kunchin Kalgo dị na steeti Zamfara abụrụla ndị nweere onwe ha, dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ zọpụtàrà ha n’ebe e zoro ha.  Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Mohammed Shehu bụ ya kwupụtara nke a n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, bụkwa nke o sitere na ya kọwaa na ọ bụ oge ndị uweojii ahụ na-awagharị n’ime ọhịa ahụ na-achọ ndị omekoome na ndị e ji eji ka ha hụrụ ma zọpụta mmadụ ise ahụ, bụcha ụmụnwoke.   Dịka ọ na-akọwa na ọ bụ n’okpuru ọchịchị ime obodo Tsafe ka ime ọhịa ahụ dị, o mèkwàrà ka a mara na mmadụ anọ n’ime ndị ahụ a zọpụtàrà bụ ndị sitere okpuru ọchịchị ime obodo Zuru, nke steeti Kebbi, ma bụrụkwa ndị a tọọrọ n’ogologo ụzọ awara awara ahụ siri Yankara gaa Tsafe. O kwukwazịrị na otu onye nke ọzọ bụ onye a tọọrọ na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Kontagora nke steeti Niger.   Maazị Shehu gàkwàzịrị n’ihu kwuo na ndị ahụ nọrọ mkpụrụ ụbọchị iri na otu n’ime ọhịa ahụ n’aka ndị ahụ tọọrọ ha.

Mmadụ atọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Anambra

OZI si n’aka ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’, ngalaba steeti Anambra na-akọwa na mmadụ atọ anwụọla, ebe mmadụ atọ ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n’ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.   Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka mgbasaozi nà ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n’ụlọọrụ FRSC n’ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ na nsonso a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na ncherịtaihu ugbo ‘Austin Farm’ dị na mpaghara okporoụzọ awara-awara ahụ siri Ayamelum gaa Onitsha.   O kwuru na ihe mberede ahụ metụtàrà mmadụ isii (bụcha ụmụnwoke), otu ụgbọala ‘Toyota Sienna’ ọcha (nwere ákàrà ABN504SZ) na otu ọgbatumtum.   O kwukwàrà nà ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ihe mberede ahụ mèrè n’oge ehihie, ma bụrụkwa nke dapụtàrà n’ihi ịgba oke ọsọ nke onye ọkwọ ụgbọala ahụ.   Ọ kọwàrà na ọkwọ ụg

N'Anambra, NSCDC na Red Cross ejikerela ịkwàlitè mgbataọsọ n'oge ihe mberede

ỤLỌỌRỤ nchekwa ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps’ a maara dịka NSCDC n’aha mkpìrìsì (ngalaba nke steeti Anambra) ekwela nkwà ijikọ aka ọnụ, ya na ụlọọrụ ‘Red Cross Society of Nigeria’ iji kwàlite mgbataọsọ enyemaka n’ebe e nwere ọgbaaghara, ihe mberede maọbụ ụdị ọnọdụ ntụmadị ndị ọzọ.   Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi nà mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ NSCDC n’ime steeti Anambra, bụ DSC Okadigbo Edwin siri kọwaa, ọ bụ onyeisi ụlọọrụ NSCDC na steeti ahụ, bụ Maazị Everestus C. Obiyo, JP+, kwupụtàrà nke a oge ndị sitere ụlọọrụ ‘Red Cross Society of Nigeria’ (ngalaba steeti Anambra), gara kpọtụrụ ya n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Wenezdee.   O chètààrà ha mkpà ọ dị ka ụlọọrụ abụọ ahụ nwee ezi mmekọrịta na njikọaka n’ọrụ, ọkachasị dịka o siri metụta ịgbaje ọsọ enyemaka, ịzọpụta ụmụ mmadụ na iwètà udo n’ebe ọbụla ọgbaaghara maọbụ ihe mberede na ọnọdụ ntụmadị dapụtara n’ime steeti ahụ, n’ihi ọrụ dịịrị ha n’ebe e nwere ụdị ọnọdụ dị etu

Òtù atọ emeela mmemme ụbọchị ọrịa kansà n'Onitsha

ÒTÙ nnọrọonwe atọ, bụ òtù ‘Justice Development and Peace Commission (JDPC),’ ngalaba Onitsha; òtù ‘Development Initiative for Technology and Empowerment (DITEm)’, nà òtù ‘Pink Health Foundation’ emeela ụmụnwaanyị ruru iri ise na anọ nnyòcha ahụike n’efù, dịka otu n’ime mmemme dị icheiche ha ji wee merùbe mmemme ụbọchị ọrịa kansa na mba ụwa (World Cancer Day), nke ahọ 2022.   Mmemme ahụ, nke isiokwu ya bụ ‘Mechie Ohere Nlekọta Ahụ’ (#CloseTheCareGap), bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St. Jude Parish, Fegge, Onitsha,’ dị na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụnwaanyị karịrị otu narị na iri ise n’ọnụọgụgụ.   N’okwu ya na mmemme ahụ, otu onye n’ime ndị so wee kwàdó ma hazie ya bụ ọgbakọ ma bụrụkwa onye hibere òtù ‘Development Initiative for Technology and Empowerment (DITEm)’, bụ Dọkịta Ngozi Perpetua Osuchukwu kọwàrà na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji gbasàá ozi ma kụziere ndị mmadụ ihe ha kwesiri ịma banyere ọrịa kansà, ya na usoro kacha mma a pụrụ isi gbochie ya.   Ka ọ na-ekèle ndị ha na y

N’Awka, Anglikan echela ụmụnwaanyị n'ihu Chineke, doo ha nsọ

O KWÒRÒ ekwò ma hịọ ahịọ n’ụlọụka ‘Chapel of Redemption’ dị n’ime Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka mèrè mmemme idogharị ụmụnwaanyị dayọsiisi ahụ nsọ na ichenwò ha n’ihu Chineke ọzọ, ya na ịtụ mmamma.   N’okwuchukwu ya n’òfùfè nrò ahụ, Achịbishọọpụ nke mpaghara Niger, ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ ‘Most Reverend’ Alexander Ibezim kpọkùrù ụmụnwaanyị ka ha gbàá ndụ ịbụ ndị na-ekpere Chineke n’ime mmụọ nà eziokwu, ya na ịbụ ndị ga na-ahụta ma na-ewètakwa ihe ọma n’ebe ọbụla ha hụtàrà onwe ha.   O mèrè ka a mara na Chineke nyèrè nwaanyị ọbụla bụ onye ezi omume anya nke ime mmụọ iji na-ahụ ihe na-eme n’ezinaụlọ ya, n’ụlọụka, n’obodo ya, nakwa gburugburu ya n’izugbe, ya na akọnuche iji chepụta ụzọ kachasị mma a ga-esi sò ihe ndị ahụ.   Ọ kpọkùzịrị ha ka ha dị ike n’ekpere, na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ya na ọgbụgba ndụ alumdi na nwunye ha, ma na-egosipụtakwa akparamaagwa niile e jiri mara ezi

NSCDC, NICO ejikọọla aka ịkụziri ndị ọrụ ha asụsụ, ọdịnala

ỤLỌỌRỤ ‘National Institute for Cultural Orientation (NICO)’ amalitela ịkụziri ndị ọrụ nchekwa ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC)’ asụsụ Igbo na asụsụ ọdịnala ndị ọzọ dị icheiche dị n’ala Nigeria, nke gụnyere asụsụ Hausa na asụsụ Yoruba.   N’okwu ya oge ọ na-agbape atụmatụ nkuzi ahụ n’Abuja, ụbọchị Tuzdee, onyeisi ụlọọrụ NSCDC n’ala Nigeria, bụ CG Ahmed Abubakar Audi, PhD, mni, kọwàrà nke ahụ dịka otu n’ime ụzọ isi kwàlite arụmọrụ ndị ọrụ nchekwa ahụ, ya na mmekọrịta ha na nkwukọrịtaokwu ha na ndị bi n’ime-ime obodo dị icheiche na mpaghara ebe ọbụla e zigara ha ịrụ ọrụ.   Ọ kọwàkwara nkụzi asụsụ ọdịnala ahụ dịka ihe dị oke mkpa ma bàkwa oke úrù n’ịkwàlite nnweta nà mgbasaozi n’etiti ndị ọrụ nchekwa ahụ na ndị obodo, iji rụọ nnukwu ọrụ ahụ chere ha n’ihu nke ọma.   O mere ka a mara na ozi nà inweta ozi kwesiri ékwesi n’ogè dị̀ mkpà nke ukwuu n’ọrụ nchekwa, ma mekwa ka a mara na oge ụfọdụ, aghọtaghị maọbụ amaghị asụsụ ọdịnala nà-àbụ ihe ogbochi maọbụ ihe ndọghachiazụ n’ebe

Ụmụnwaanyị Anambra enyela Oriakụ Obiano onyinye nkwanyeùgwù

IGBO sị na okpueze na-adị mma n’isi onye o ruru.   Nịgbasò nke a, òtù ụmụnwaanyị Anambra a maara dịka ‘Anambra Women of Peace and Growth Initiative’ ènyéla nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano onyinye nkwanyeùgwù pụrụ iche.  Ndị òtù ahụ bụ ndị jupụtàrà n’ime okpuru ọchịchị iri abụọ na otu dị na steeti Anambra, ma bụrụkwa ndị nyere nwunye Gọvanọ onyinye nkwanyeùgwù ahụ n’isi ụlọọrụ ya dị n’obi gọọmenti, n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.   N’okwu ya oge ọ na-enye ya onyinye nkwanyeùgwù ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Oriakụ Ngozi Orjiakor kọwàrà na nke ahụ bụ nke kwesiri ekwesi n’ihi ọtụtụ ọrụ ọma dị icheich ya bụ agụ nwaanyị rụrụ, ọkachasị site n’okpuru atụmatụ ọrụ obiebere ya bụ ‘Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)’, site n’ịkwalite ọnọdụ obibindụ ụmụnwaanyị, ụmụaka na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, tinyere ọtụtụ ihe ọma ndị ọzọ ọ na-emegasị.   O mere ka a mara na ha gbasòrò ntụziaka Oriakụ Obianọ nyere ha wee kwàdó ma tụnyere otu ndọrọndọrọ ‘All Progressive G

Achọọla ndị uweojii 83 e buliri n'ọkwa mma n’Anambra

 IGBO sị na ezi ọrụ nwèrè ezi ụgwọ; ma sịkwa ọ na-abụ onye e nyèrè mara jide, e nyekwuo ya nke ka nkè.   N’ịgbaso nke a, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echeng ejiela ndị uwe ojii ruru mmadụ iri asatọ na atọ (83) n’ọnụọgụgụ ejiji ọhụrụ ma chọkwa ha mma, bụ ndị e buliri ha n’ọkwa ọhụrụ dị icheiche.   Mmemme iji ndị ahụ ejiji ọhụrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n’Amawbịa, ma bụrụkwa nke e mere n’ịgbasò ntụliaka ahụ onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Alkali Baba Usman nyere ka e bulie ụfọdụ ndị uweojii n’ọkwa na nsonso a, bụkwa nke e mèrè site n’aka ụlọọrụ ‘Police Service Commission (PSC)’.   Mbuli n’ọkwa ọhụrụ ahụ, dịka o siri dòó anya, bụ otu n’ime ụzọ isi ọchịchị ụlọọrụ ndị uweojii n’ala Nigeria si ágbà ndị uweojii ume ka ha na-arụsi ọrụ ike; ma bụrụkwa nke a na-agbaso usoro kwesiri ekwesi na usoro ntozùòkè wee na-eme.   N’okwu ya oge ọ na-eji ha ejiji ọhụrụ ahụ, Maazị Echeng tòrò ndị ahụ e buliri n’ọkwa ọhụrụ, ma chètara ha na

N'Anambra, nwoke egbuola nwanne ya kpuru ìsì maka àlà ha na-azọ

NDỊ òtù ahụ jikọtara ndị nwere ọlụsị (bụkwa ndị ikedịnobi) n’ala Nigeria, bụ ‘Joint National Association of Persons with Disability (JONAPWD)’, ngalaba ya nke steeti Anambra akpọọla ka e nwee ikpe nkwụmọtọ maka onye òtù ha kpuru ìsì, bụ Maazị Maazị Mmaduabuchi Nnofu (gbara ahọ iri anọ na asaa), onye nwanne ya nwoke gburu na nsonso a.   Nke a bụ nke e kwupụtara n’ozi a kụpụrụ site n’aka ndị òtù ahụ, bụkwa nke onyeisioche òtù ahụ n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Ugochukwu Okeke E.C.; onye na-ahụ maka mgbasaozi òtù ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Igwegbe; na onye ndụmọdụ ndị òtù ahụ n’ihe gbasaara iwu, bụ Ọkaiwu Peter Muoneke bìnyèrè aka na ya.   Ha kọwàrà na Maazị Nnofu ahụ e gburu egbu bụ onye obodo Eziagulu dị n’Ekwulobia, n’okpuruọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onyeisi òtù JONAPWD n’ime okpuruọchịchị Aguata. Ha mekwara ka a mara na ọ bụ ụbọchị ụka gara aga ka nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, bụ Maazị Onyedika Nnofu bàtàrà n’ụlọ be ya ebe ọ na-ezùrú onwe ya ike, wee gbuo ya n’ih