Oke Dibịa Mgbọrọgwụ na Mkpakwụkwọ, Fada Arazụ Anwụọla
Izunna Okafor dere akụkọ a Ótù nnukwu onye ụkọchukwu ụka Katọliik ahụ na-ewu èwù, ma bụrụkwa oke dibịa mgbọrọgwụ na mkpakwụkwọ, bụ Rev. Fr. Dr. Raymond Chukwunyereugwu Arazu anwụọla ka ọ gbàchàrà ahọ iri asatọ na abụọ (82). Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ọnụ Fr. Vitalis Anusionwu, bụ onye odeakwụkwọ òtù ‘Congregation of the Holy Spirit (C.S.Sp.)’, bụ òtù jikọtara ndị ụkọchukwu a maara dịka ‘Holy Ghost Fathers’, bụ onye kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ozi na nsonso a banyere ọnwụ ya bụ agụ nwoke. Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, Fr. Arazụ nwụrụ n’ụlọọgwụ ‘Parklane Hospital’ dị na steeti Enugu, n’ụtụtụ ụbọchị ụka, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Desimba ahọ 2021, ka ọ gachara ogologo oge ọ nọrọ n’àkwà ọrịa, bụgasị ọrịa sitere na nkā, n’ihi na o teela ọ lakpuru. Ka ọ na-ekpe ka mkpụrụobi nwa amadi ahụ zuo ike na ndokwa, o kwukwazịrị na a ga-eme ka ụwa mara banyere mmemme akwamozu ya ngwangwa a hazichara ya. Fada Arazu, onye a mụrụ n’abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Méè, afọ 1939, bụ nwa afọ Ihembọs