Ị kwalite asụsụ, omenala Igbo n'ụlọ akwụkwọ
ASỤSỤ na omenala ka e ji ama obodo ọbụla nakwa ụmụ afọ obodo ahụ. Ndị ọbụla na- asụ otu asụsụ ma nwee otu omenala na emekọ ihe ọnụ. Ọ bụ nke a mere ndị Igbo ọbụla maara ihe jiri na eti mkpu ka anyị nile bụ ndị Igbo were asụsụ anyị kpọrọ ihe maka na okwu Igbo kwuru na onye gba nkịtị, ndị iro ewere ọba ya kpoo ntụ. Kedu ka anyị nile bụ ndị Igbo ga-esi nye aka ka asụsụ na omenala anyị ghara ịda ma ọ bụ nwụọ? Ọlụ a dị mkpa ga-amalite na ezinaụlọ ọbụla. N’ezie, ị bata na ezinaụlọ ụfọdụ, ha adịghị asụ Igbo n’ụlọ ha ma nne, nna na ụmụaka ha bụ oyibo ka ha na- asụ. Ụfọdụ n’ime ndị na-eme ihe ndị a bụ ndị a mụrụ n’ime obodo. Ha gụsịa akwụkwọ ma ọ bụ ha baa n’azụmahịa ma ọ bụ ọlụ na obodo ọzọ na-asụ asụsụ na abụrọ nke ha, ha echezọọ asụsụ ha. Ndị bi na mgbago ugwu na-asụzị asụsụ ebe ahụ. Otu a ka ọ dị ndị Igbo bi na mkpaghara ọzọ dị iche iche n’ala anyị. Dịka ha na-echezọ asụsụ ka ha na echezọ omenala Igbo. Ha a na-emezi ka ndị ahụ ha bi na be ha. Ụfọdụ n’ime ndị nne na nna na-edeba aha ha na