Posts

Showing posts from May, 2021

West African Students Union Parliament emeela Nnabuife ‘Vanguard of Nation Building in Nigeria’

OTU a kpọrọ West African Students Union Parliament (WASUP), agaala njem n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation bụ ndị na-ebipụta akwụkwọa akụkọ National Light, Ka O Di Taa nakwa SportslightXTRA nke onyeisi ha bụ Sir Chuka Nnabuife wee nye ya onyinye awọọdụ ‘Vanguard of Nation Building in Nigeria’ n’isi ụlọọrụ ha dị n’Awka.   Onye na-elekọta anya lọjịstịkị nke otu ahụ bụ Comr. Ismail Adawale kọwara na ọ bụ otu jikọrọ ụmụakwụkwọ na ndị ntorobịa n’ụwa nịịle gbara gburugburu ma kwue na ebumnobi ha maka njem a bụ iji nye nkụzi ma kwalite ọtụtụ ezigbo ndi ndu e nwere na mpaghara ala Africa. Ọ gara n’ihụ ma katọọ ajọ agwa dị ịche ịche dịka ọgbaaghara na-adị n’ime etiti mmadu na ibe ya, otu nzuzo, ahịa iwu, ikwa iko na ndị ọzọgasị ma too ezigbo ndị ọchịchị nakwa ihe mmụta ọrụ aka dị iche iche dịka o si metụta ọnọdụ ala anyị bụ Nigeria.   N’okwu ya, ọ sịrị, “Anyị na-ahọpụta ndị e kwesịrị iṅomi eṅomi, ndị amaara n’ihị mbọ pụrụ iche ha na-agba, tinyere ụlọ akwụkwọga. O doro anyị any

Bishọp Ezeokafor agaala njem oziọma na St Patrick, Awka

KATỌLIK bishọp dayọsisi nke Awka, ‘Most Rev.’ Paulinus Ezeokafor agaala njem oziọma na St. Patrick’s Cathedral, Awka.   Bishọp Ezeokafor mere njem a n’ụbọchị ụka ncheta ọbịbịa Mmụọ Nsọ, ma kwuo na mmadụ ruru otu narị na iri na abuọ ka a  ga-akwọ aka n’isi dịka ọ chọpụtara na ha mụtara nkụzi nke katịkịzịm ha mere.   N’okwuchukwu ya, Bishọp Ezeokafor kọwara na Pentikọsụ bụ ụbọchị Muọnsọ dakwasịrị ụmụazụ Jeso ma bụrụ nke mere ha ji kwụsaa ọrụ ọma Chineke ma gbasaa oziọma ya n’ụwa niile.   Ọ sịrị; “oge anyị natara sakaramentị nke baptizim nakwa sakaramentị nke kọnfameshọn, anyị na-anata onyịnye nke Mụọnsọ dịka ndị otu Kristi. Ihe dịka afọ atọ ọbụla, ndị bishọp na-aga njem oziọma iji hụ na enweghị oke nsogbu n’etiti ndị ụka dịka o si bụrụ oke na ọrụ ha nakwa ịhụ na ụlọụka ahụ nwekwara agamnihụ. Anyị na-arịọ Chineke ka onyịnye nke Mụọnsọ ya nọdụsie ike n’ime anyị mgbe ọbụla”.   Bishọp Ezeokafor gara n’ihụ wee kelee onye nlekọta ‘Cathedral’ ahụ bụ Fada Mathew Atansi maka ezigbo mbọ ọ na-agba

Nri ndị Igbo: Ofe ọkwụrụ

OFE ọkwụrụ dị mma, ọ bụkwa otu n’ime akwụkwọ nri na-enye ma na-edozi ahụ nke ọma.   Ofe ọkwụrụ adịghị ahịa ahụ n’osisi. Ọ bụrụ na ọbara kọrọ mmadụ n’ahụ, o rie ofe ọkwụrụ na ụgụ otu izuụka onye ahụ enweta onwe ya nke ọma.   Ihe ndị a ka e ji esi ofe ọkwụrụ nakwa otu e si esi ya. Ị weta ọkwụrụ ole ị chọrọ isi, sachaa ya wunye na nyọ, ị bee ya otu na-amasi gị, ị bechaa ya I debe. I sikọọ anụ na kanda ị ga-eji sie ofe, ị gbanye mmiri ofe sinye n’ọkụ, wunye okporoko, o ghee, wunye azụ mkpọ maọbụ azụ a mịrị amị, tinye nnu, o ghee I tinye mmanụ, ose, okpenyi, magi, ira, nnu. Ọ bụrụ na yabaasi na-amasi gị I suo ya maọbụ I bee ya tinye. I kpuchie ya, o ghee I lee ma nnụ ọ tụrụ ya, I wunyezie ọkwụrụ ahụ I bere, tinye akwụkwọ ụgụ maọbụ akwụkwọ ụzịza I bere kịrịkịrị kuchie ya. Ọ gaa nkeji ise fọtuo ofe ọkwụrụ gị werezie nri akpụ, nri ede, garị, nri ji maọbụ nri e sere ese ọbụla ribezie ya. Ị richaa ofe ọkwụrụ, ụra eburu gị ozigbo.

Egwu ndị Igbo: Egwu ụmụada

ỤMỤADA maọbụ ụmụọkpụ bụ ụmụnwaanyị a mụrụ n’otu ezinaụlọ, ụmụnna, ogbe, obodo wdg. Ụmada n’ogo ọbụla na-anọ n’otu. Ha na-eji otu obi eme ihe ma were otu olu na-ekwu.   Ya mere, ụmụada dịka ndị Igbo bụ agbụrụ na-agụ egwu na-eji egwu egosipụta ebumnuche ha. Obi dị ha mma ha na-eji egwu egosiputa ya, otu ahụ ka ha na-emekwa ma obi dị ha njọ. Ya mere, ihe dịka mgbe ọbụla e nyere ha ihe onyinye ha na-eji egwu gosipta afọ ojuju ha nwere. Ọmụmaatụ egwu ha na-agụ n’oge dị otu ahụ bụ: Okeke eee – Dị ebube Okeke eee- Dị ebube Anyị ga-amagharị akwa n’ụdị ọzọ- O nwere ihe ọ bụ?

Be m ka a nọrọ kpaa ibido BBC Igbo – Ejiofor,onyeisi Otu Sụwakwa Igbo

Ọkammụta Pita Ejiofor bụ onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi Otu Sụwakwa Igbo, bụ otu so n’ezi ihu na mbọ ahụ a na-agba ịkwalite asụsụ Igbo, ma n’ala Nigeria, ma n’ụwa gbaa gburugburu. N’ajụjụọnụ a onye ntaakụkọ Ka Ọ Dị Taa, bụ IZUNNA OKAFOR gbara ya na nsonso a, Ọkammụta Ejiofor kọwàpụtasịrị ụzọ dị iche iche Otu Sụwakwa Igbo sigoro gbaa mbọ maka ịkwàlite asụsụ Igbo, ma kọwakwa etu atụmatụ ibido mgbasaozi BBC Igbo siri wee malite n’okpuru mango dị na be ya. GỊNỊ bụ Otu Sụwakwa Igbo?   Otu Sụwakwa Igbo bụ otu na-agba mbọ maka ichekwaba na ịkwalite asụsụ Igbo, ma na-akpọkwa òkù ka onye ọbụla bụ nwaafọ Igbo na-asụ asụsụ Igbo. Kedụ ụbọchị i hibere Otu Sụwakwa Igbo?  Ehibere m ya ka ọnwa Febụwarị dị n’abalị iri na anọ, n’ahọ 2006. Otu Sụwakwa Igbo a, ọ bụ sọ n’Anambra ka ọ dị, ka ọ dịkwa na steeti ndị ọzọ?   Ezigbo ajụjụ! Nke bụ eziokwu bụ na òtù a ị hụrụ kwèsìrì ịdị na steeti niile dị n’ala Nigeria, maka na o nweghị ebe ndị Igbo anọghị. Ị bịa n’akwụkwọ iwu anyị, onye Anambra, onye Abịa, onye

Arụ n'ala Igbo (II)

N’IZUỤKA gara aga ka anyị malitere ileba anya n’isiokwu a, ma bụrụkwa nke m sitegoro na ya wee nye nkọwa ihe gbasaara arụ, ihe dị iche n’etiti ya na nsọala, ma nyekwa ọmụmaatụ arụ na nsọala.   Ka ọ dị taa, ihe anyị ga-elebà anya n’ihe olenaole fọrọ banyere isiokwu ahụ, wee mazie ya ákpụ. Ọkụ anyị nyụrụ n’izuụka gara aga oge anyị kpọpụtachara ụfọdụ ọmụmaatụ arụ na nsọala; anyị wee wụsa ọwa n’ebe ahụ.   N’ibidokwa n’ebe anyị kwụsịrị, ọ dị mkpà ịkọwapụta na e nwere etu e si emeso onye mere nsọala n’ala Igbo, ma nwekwa etu e si emeso onye mere arụ. N’ala Igbo, ọ bụrụ na mmadụ mee nsọala n’obodo, (ya bụ, ọ bụrụ na mmadụ mee ótù n’ime ihe ndị ahụ anyị kpọptasịrị n’izuụka gara aga dịka ọmụmaatụ nsọala), obodo nwèrè usoro dị iche iche ha ga-esi mesò onye ahụ, dịka o siri metụta ntaramahụhụ a ga-enye onye ahụ, bụkwa nke dabeere n’ihe onye ahụ mere kpọmkem.   Iji maa atụ, ụfọdụ nsọala nwèrè ike ịdọtara onye mere ya ntaramahụhụ dị iche iche ndị obodo maọbụ onye o mere ihe ahụ ga-enye ya, nwéé ike

Mmadụ abụọ emerụọla ahụ ka ụgbọala abụọ kwọkọrọ isi ọnụ n'Awka

Ọ BỤNNỌ ihe ịtụnanya na ihe ịtụ mmamma, dịka mmadụ abụọ gbanịhịrị ọnwụ ha, oge ụgbọala abụọ kwòkọsịrị isi ọnụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.   Ya bụ ihe mberede dapụtara na mpaghara ebe ahụ ụgbọala na-agba n’elu na n’ala dị n’Amawbia, n’ogologo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha; ma bụrụkwa nke dapụtara n’etiti ụgbọala Sienna abụọ, bụkwazị nke ótù n’ime ha màgòòrò ibe ya n’elu ozigbo ya bụ ihe mberede dapụtara.   Dịka onye ọnọmgbeomere siri kọwaa, ihe kpatara ihe mberede ahụ bụ ihe mgbochiụzọ ndị na-arụ ụzọ ahụ dọbara n’otu akụkụ okporoụzọ ahụ, n’enweghị ihe ọbụla ha tinyere n’ihu ga na-egosi ndị na-anyà ụgbọala na ndị ọzọ na-agba n’okporoụzọ ahụ na e nwere ihe mgbochiụzọ dị n’ebe ahụ, ka ha wee zèére ha.   N’okwu ya banyere ihe mberede okporoụzọ ahụ oge ọ gara n’ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ijè awele okporoụzọ, bụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’, ngalaba steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi mèrè ka a mara na ọ bụ n’ihe dịka elekere anọ nke ọnụ ụtụtụ ka ihe

Ide uri n'oge gboo (II)

OTU nwaanyị aha ya bụ Mma Ojiugo kwuru sị n’oge gboo ahụ na ọ bụ ndi ọgọ mmụọ, yaabụ ndị ụka omenala na-edekarị uri. Ọ kọwara na ha ji ya achọ mma n’ahụ ha n’ụzọ di iche iche. Ha na-eme nke a oge ọbụla mana ha na-akacha eme ya n’oge emume obodo na-eme dịka iri ji ohụrụ, oge ha na-eme emume nke aka mkpa ha tinyere emume banyere mmụọ na arụsị dị iche iche na na-efe. N’oge dị otu ahụ, ha na-ede uri n’ụzọ dị egwu iji fee chi ha na-efe. Ụmụnwaanyị ejighi oge dịka oge ahụ egw egwuregwu. Ha na-ebido n’oge na-akwado maka ide uri n’ahụ ha.   Ojiugo gakwara n’ihu kwuo na uri ahụ ha na-ede na-ama ha mma nke ukwu, tinyere uhie ha na-ete nke na-eme ka ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ.   Otu o sila dị, dịka e ji uri achọ mma, jiri ya na-agwọ ọrịa tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, o nwekwara njirimara uri nwere nke na-eme ka ndị mmadụ ma n’ọnya. Uri dịka anyị maara na-abụ ebe ọbụla o metụrụ, ọ nọtụ obere oge o jibe oji. Nke a pụtara na mgbe ọbụla mmadụ dere uri onye ọzọ agaghị emetụ ya ahụ. O wee bụrụ ya, otu nwoke

Christ Ascension Church, Awka emeela ụka nne

NDỊ nne nke Christ Ascention Church (C.A.C) ewetala izuụka nke ndị nne ha na njedebe bụ nke ha malitere n’abalị iri na asaa rue iri abụọ na atọ nke ọnwa ise afọ 2021. Mmemme nke afọ a bụ nnọọ ọ pụrụ iche site n’otu ha siri hazie ya nakwa ụfọdụ ndị ọnụ ruru n’okwu na ngalaba ụmụnwaanyị bịara ha mmemme ahụ.   Ndị a bụkwa ụfọdụ ndị mere ka mmemme ahụ bụrụ ọ pụrụ iche, Pastọ Oriakụ Indiana Nwaokike na di ya, nwaanyị a na-eje ozi na ngalaba dị elu n’ọgbakọ C.A.C, onye nke abụọ bụ Mother Theodora Egeonu, onye nke si Owerre bịa, ndị ọzọ bụ Pastọ na Odoziakụ Jonhson Nwanya na onye isi na-ahụ maka ụmụnwaanyị n’ọgbakọ Bethel Grace Assembly, Ifite Awka nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.   Ụmụnwaanyị C.A.C Ifite ji nọọ ọtụtụ abụ na ihe egwuregwu dị iche iche mee ka e nwee mkpọlite mmụọ n’ọgbakọ ahụ.   Onye ọbịa pụrụ iche bụ Pastọ Oriakụ Indiana bụ ya kwuru okwuchukwu site n’okwu ahụ a kpụ n’ọnụ n’izu ndị nne nke afọ a bụ nke sị: “Chineke enyewo gị ikike’ (God Almighty has given you authority and power).”   N’ok

Ndị na-azụ añụ n’Anambra emeela ụbọchị añụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ dịka ndị na-azụ añụ (bụ ndị na-emepụta mmanụañụ) nọrọ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra wee merùbe mmemme ụbọchị añụ na mba ụwa, nke ahọ 2021.   Mmemme imerùbè óké ụbọchị ahụ bụ nke a chịkọbàrà site n’aka ụlọọrụ ‘Gist AGRICA’ na ụlọọrụ ‘Medical Honey Bees Farm Nigeria’, ma bụrụkwa nke e jiri inye ọzụzụ na nkụzi wéré mkpụrụ ụbọchị atọ (banyere ịzụ añụ na imepụta mmanụañụ) wee merùbe.   N’okwu ya na mmalite mmemme ahụ, onyeisi ụlọọrụ ‘Gist Africa’ bụ Nwaada Ekwi Ajide kọwàra na ebumnobi mmemme ahụ na ọgbakọ nkụzi ahụ bụ iji gbasàá ozi banyere mmanụañụ, imepụta mmanụañụ, usoro mmepụta ya, na ihe ndị ọzọ na-enye aka n’imepụta ya, tinyere mkpà ihe niile ahụ nà nchekwa ha dịgàsị na gburugburu.   Ọ kọwara ụbọchị ahụ dịka nke dị oke mkpà, bụ nke mezịrị òtù mba ụwa ‘United Nations (UN)’ jiri wee wepụta ya iji merùbe añụ; ma kọwakwa añụ na ịzụ añụ dịka ihe bara oke uru n’ịkwalite ọnọdụ ahụike, ọnọdụ gburugburu, na ọnọdụ akụnụba, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ ha bàrà.  

Aka akparala nwaanyị ọtụ mgbere ụmụaka ebe o ku nwa abalị ise

NDỊ ngalaba na-ebu agha megide itumgbere na ịta ụmụaka ahụhụ (Anti-Human Trafficking Child Labour Unit) nke ụlọ Nigeria Immigration Service (NIS) na steeti (Cross River, anwuchikọọla otu nwaanyị na-atu mbgere ụmụaka, Imabong Aniefiok-Samuel ka ku nwa ọhụrụ di abali ise.   Ndị ọrụ NIS nwụchikọrọ nwaanyị ahụ na Peace Park dị n’okirikiri Etta Agbor na Calabar.   N’ozi nke okwuputa okwu NIS steeti ahụ Supt. Amor Austin tinyere aka na ya site na Calabar kọwara na nnyocha gbara ama na ya bu okwu gbasatara ịtụ nwata.   Osote onyeisi (Assistant Comptroller-General), NIS na steeti Cross River, Oriaku Ijeoma Emenike enyela ntụziaka ka a hafee nwaanyị na nwa ọhụrụ ahụ n’aka ndị ọ dị n’aka, National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) maka ime nnyọcha gaa n’ihu ma wepu okwu ụlọikpe.   Maazi Oba Jacob, onyeisi ọrụ (Head of Operations) NAPTIP na steeti ahụ onye nabatara nwaanyi na nwa ọhụrụ ahụ kwuru na a ga-eji nwaanyị ahụ were jide ndị ọzọ gbara ọsọ bụ ndị di na mbụ nye i

Eze ọdịnala akatọọla ọnwụ nwa izuụka abụọ nne na nna ya gburu ka ha na-alụ ọgụ

EZE ọdịnala Eleyowo nke dị n’okpuru ochịchi Akure North na steeti Ondo bu Chiifu Eso Ojo akatọọla ọnwụ nwa izuụka abụọ nke nne na nna ya e nyere aha ha dịka Ekene na Rose Ijokun gburu ka ha na-ahụ ọgụ.   Eze odịnala ahụ kowari ya bu ihe nke mere n’obodo ya bụ Eleyowo dịka ihe mwute na ihe ekwesịghi ekwesị. O kwuru sị: “ụdị ihe di otu ahụ adaputabeghị n’obodo anyị mbụ. Ọtụtụ oge ka a na-ekwu na esemokwu na-adaputakarị n’etiti di na nwunye ahụ, ọ dị njọ na ọ dapụtara n’ụzọ dị otu a, n’ikpeazụ.”   Otu onye ogbe ahụ kọwara na alumdina-nwunye mmadu abụọ ahụ juputara n’esemokwu. Ọ kwuru sị: “Rose kwọ nwa ahụ n’azu oge ya na di ya bụ Ekene malitere ịkọ ọnụ, tupu ha site na ya lụba ọgụ nke kpataziri ọnwụ nwata ahụ.   Ọ gara n’ihụ kọwaa na nwata ahụ nọ n’ezi ahụike tupu ya bụ ọdachi adaputa. Na oge e kuputere ya n’azụ nne ya ma n’be ya n’elu ákwá ka a chọpụtara na ọ nagh ekuzi ume.   Mbọ niile a gbara ka a zọta ndụ nwata ahụ lara n’iyi dika a kọwara na ọ nwụọla mgba e kuru ya gaa n’ụlọahuike ‘h

Fada Nwosu arịọla Bishọp Ezeokafor mgbaghara n'ihu ọha

Rose Oranye, Nkechi Ikenwoke, Blessing Nnabuife na Chinwendu Uzoatu AKPATAOYI wụrụ ndị ụka na St Patrick’s Cathedral Awka, ụbọchị ụka ka Fada Oliver Ekene Nwosu, onye e chiri ụkọchukwu na katọlịk Dayọsis nke Morogoro dị na Tanzania dịka nwa lara akụ nna ya n’iyi nke e dere n’akwụkwọ nsọ bịara n’ụlọụka ahụ gosipụta ezi nchegharị site n’irịọ bishọp katọlik a ụzọ dị iche iche o siri mejọọ ụka.   Fada Nwosu, onye ya na nne ya bụ ajadu nwaanyị batara n’ụlọụka ka a natachara oriri nsọ kwetara na ya emehiela ụka ma rịọ onyeisi ọzụzụ atụrụ dayọsis ahụ ka ọ gbahara ya, dịka o kwuru na bishọp ahụ nwere ikike ịgbaghara ya.   Dịka o sekpu ala n’alta o kwuru: “Anọ m ebe a n’ihu Jesu nọ na Sakaramenti dị Ngọzị, tinyere n’aha nne anyị Maria, taa, anyị na-eme emume ọbịbịa Mụọ Nsọ. Mụ na nne m onye bụ ajadu nwaanyị nọ n’akụkụ m, so bịa. Nna m kaara ịnọ ebe a taa, mana dịka o siri masị Chineke, ọ nọ n’ọbaozu. Anọ m ebe a ịrịọ gị mgbaghara ụzọ ọbụla m siri mejọọ gị.   Etosịghị m ịnọ ebe a. Nabata m dịka

N'Anambra, Obiano, Owolabi agaala leta ụlọọrụ INEC, B Division a wakpòrò

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ etòóla ndị uweojii steeti ahụ maka nkwụdosiike ha nà ịlụ ọgụ dịka nwoke, bụ nke ha gosipụtara n’abalị ụbọchị ụka oge ndị ojiegbeezu amaghị ndị ha bụ wakpòrò ụlọọrụ uweojii ‘B Division’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ya na isi ụlọọrụ ‘Independent National Election Commission (INEC)’ dịkwa n’Awka ahụ.   Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a oge ọ gara n’ụlọọrụ uweojii ‘B Division’ ahụ ịga jiri anya ya wee hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ, bụkwazị ebe ọ nọrọ wee gbaa akaebe na ndị uweojii ahụ gbàrà mbọ nke ukwuu site n’igbòchì ndị omekoome ahụ ịwakpò ya bụ ụlọọrụ uweojii, ya na site n’etu ha siri gbochie ha bụ ndị ọjọọ imebi ọtụtụ ihe n’ụlọọrụ INEC ahụ.   Ọ gbarụrụ ihu banyere etu ndị omekoome si awakpò ebe dị iche iche, na-ebibìsi ihe gọọmentị ma na-emekwa mkpamkpa n’ụdị dị iche iche na mpaghara ndịda anyanwụ ala Nigeria na n’ebe ọzọ, nke mezịrị ka ọnọdụ nchekwa ala Nigeria kawanyezie njọ dịka ọ dị taa.   Ya bụ Gọvanọ chètàkwazịịrị nd

Obianọ agaala leta ebe a na-arụ ụlọ ezumeezu mba ụwa n'Awka

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwupụtala ma gosipụta obi ụtọ ya banyere etu ọrụ si aga n’ebe ahụ ọchịchị ya na-arụ nnukwu ụlọ ezumeezu mba ụwa na steeti ahụ.   Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a oge ọ gara njem nleta n’ebe ahụ a na-arụ ya bụ agadaga ụlọ ezumeezu dị n’Agụ Awka, n’isi obodo steeti ahụ, bụ nke ọ nọrọ na ya wee gagharịa n’ebe ahụ iji hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ na etu ya bụ ọrụ si aga.   Dịka ọ na-akpọpụtasị uru dị iche iche ya bụ ogige ga-ewebàta na steeti ahụ ma a rụchaa ya, ọ gara n’ihu mee ka a mara na nke ahụ ga-enyekwa aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe na steeti ahụ, kewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ ọtụtụ ohere ọrụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-eweta.   Ọ kọwara na ya bụ ogige ga-eme ka Anambra soro n’ọnụọgụgụ steeti olenaole nwere ụdị ụlọ ezumeezu mba ụwa dị etu ahụ n’ala Nigeria, ma mekwazie ka e nwee ike ịchịkọba ụdị nnukwu ọgbakọ dị iche iche n’ime steeti ahụ.   O kelekwazịrị ngalaba ụlọọrụ na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, ma kelekwazie ụlọọ

Na Kaduna, nwa akwụkwọ na-etinye ike n'ekwenti ya n'ọdụ mmanụ emesuola ọkụ, ọ gbaa ya

ỤLỌAKWỤKWỌ, Kaduna State College of Nursing and Midwifery ekwuputala ọnwụ nke otu nwaakwụkwọ ha, Lydia Dantata onye nke zutere ọnwụ ya site n’ọkụ ọgbụgba nke malitere n’ọdụmmanụ petroolu dị na ncherita ihu ụlọakwụkwọ ahụ, ngalaba (campus) Kafanchan.   Ụmụakwụkwọ iri ka ọkụ ọgbụgba ahụ metụtara dịka ha gara n’ọdụ mmanụ ahụ itinye ike (charge) n’ekwenti ha.   Ụmụakwụkwọ ahụ ka e kwuru na ha gara n’ọdụ mmanụ ahụ itinye ike n’ekwentị ha n’ihi abụbụ ọrụ nke ịdọ aka na ntị ‘Nigeria Labour Congress’, abalị ise nke mere na ọkụ adịghị na steeti ahụ niile.   E kwuru na ọkụ malitere gbawa oge akọrọngwa e ji akwụnye ihe n’ọkụ (extension box) nke ụmụakwụkwọ ahụ mụkere ọkụ dịka ụgbọala tanka na-agbapụta mmanụ petroolu.   Onye na-elekọta (overseer) maka ụlọakwụkwọ ahụ, Ephraim Dyages kwuru site na Kafanchan na Dantata nwụrụ n’elekere atọ nke ụtụtụ Monde.   Nwaakwụkwọ ahụ nwụrụ n’ụlọọgwụ Jos University Teaching Hospital (JUTH) ebe ya na otu nwaakwụkwọ ọzọ na-anara ọgwụgwọ.   Dyages kọwara na ụmụakwụkw

Na Zimbabwe, ndị akwụnakwụna na-anazi ọka na agwa

ỤMỤNWAANYỊ ji ahụ ha akpa ego (ndị ashawo) na Dema Growth Point bụ obodo dị na Zimbabwe na-anabatazi ihe nri (foodstuff) dịka bokeeti ọka, na iko agwa dịka ụgwọ ọrụ ha site n’aka ụmụnwoke na-atụnyere ha.   N’oge ugbu a, ụkọ ego ji ndị mmadụ aka, ọtụtụ na-emezi ihe ọbụla iji dị ndụ. Ụfọdụ ndị ashawo na Zimbabwe ekwuola na ha na-anabatazị ihe oriri dịka ụgwọ ọrụ ha, ma ha nyechaa ndị na-atụnyere ha ihe na chọrọ.   Ụfọdụ ndị ashawo ahụ kpọkuru gọọmenti mba ahụ na ndị nnọrọonwe ka ha gbazinye ha ego nke ọmụrụnwa ya agaghị ebu ibu ka ha were malite ihe (business) ha chọrọ ime, iji wee nyere ezinaụlọ ha aka wee nwee ike hapụ iji ahụ ha akpa ego maọbụ agba ashawo.   Otu n’ime ha aha ya bụ Alice kwuru sị: “Oge agaala oge anyị na-ana ọnụego US $5 maka abalị niile. Ugbu a anyị na-anabata ọbụladị otu dọla iji nwee ike gote akwụkwọ nri na tomato were siere ụmụ gị agụụ na-agụ ihe.”   Onye ashawo ahụ Alice gwara ndị ntaakụkọ na ya na-agba ashawo n’ihi na ya ga-elekọta ezinaụlọ tinyere ụmụ atọ ya any

Ndị ntaakụkọ si Nsukka enyela Obiano onyinye nkwanyeugwù

Izunna Okafor dere akuko a N’izuụka gara aga ka anyị malitere ileba anya n’isiokwu a, ma bụrụkwa nke m sitegoro na ya wee nye nkọwa ihe gbasaara arụ, ihe dị iche n’etiti ya na nsọala, ma nyekwa ọmụmaatụ arụ na nsọala. Ka ọ dị taa, ihe anyị ga-elebà anya n’ihe olenaole fọrọ banyere isiokwu ahụ, wee mazie ya ákpụ. Ọkụ anyị nyụrụ n’izuụka gara aga oge anyị kpọpụtachara ụfọdụ ọmụmaatụ arụ na nsọala; anyị wee wụsa ọwa n’ebe ahụ. N’ibidokwa n’ebe anyị kwụsịrị, ọ dị mkpà ịkọwapụta na e nwere etu e si emeso onye mere nsọala n’ala Igbo, ma nwekwa etu e si emeso onye mere arụ. N’ala Igbo, ọ bụrụ na mmadụ mee nsọala n’obodo, (ya bụ, ọ bụrụ na mmadụ mee ótù n’ime ihe ndị ahụ anyị kpọptasịrị n’izuụka gara aga dịka ọmụmaatụ nsọala), obodo nwèrè usoro dị iche iche ha ga-esi mesò onye ahụ, dịka o siri metụta ntaramahụhụ a ga-enye onye ahụ, bụkwa nke dabeere n’ihe onye ahụ mere kpọmkem. Iji maa atụ, ụfọdụ nsọala nwèrè ike ịdọtara onye mere ya ntaramahụhụ dị iche iche ndị obodo maọbụ onye o mere ihe ahụ

A kpọkuola ndị ntorobịa ka ha na-esonyesi ike na ndọrọndọrọ ọchịchị

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị ntorobịa ọdụ ka ha na-esonyesi ike n’ihe gbasaara ndọrọndọrọ ọchịchị na steeti ha dị iche iche na n’ala Nigeria n’izugbe, n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-ewèta, ọkachasị site n’ime ka ha sonye n’ihe a na-eme n’ọchịchị obodo, na n’ịhọpụta ezi onye ndu.   Òkù a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ onye ahụ jibụrụ ọkwa dịka onyeisi ọba ego ala Nigeria (Central Bank of Nigeria, CBN), bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo, n’okwu ya oge ọ na-anabàta ma na-ekèle ndị òtù nkwàdo a maara dịka ‘Youths Earnestly Seek Soludo’ (YESS), bụ ndị jiri nnukwu ọkpụrụkpụ ego wee kwàdo ya n’achụmta ịzọ ọkwa Gọvanọ steeti Anambra.   N’okwu ọ gwara ndị òtù ahụ (bụ ndị ntorobịa) n’obodo ya dị n’Isuọfịa, n’okpuru ọchịchị Agụata, nke steeti Anambra, Ọkammụta Soludo, onye ji aha òtù ndọrọndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) were apụta maka ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme na steeti ahụ n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, kọwàrà ndị ntorobịa dịka ndị dị óké mkpà n’obodo ọbụla, ma kpọkuo ha k

Minista, NFF agọọrọla Okala ọfọ ọma ka ọ gbara afọ iri asaa

MINISTA na-ahụ maka ndịntorobịa na ịkwalite egwuregwu n’ala anyị, Maazị Sunday Dare, etoola onye jibu ọkwa dịka oche goolu (goalkeeper) otu egwu bọọlụ Green Eagles bụ Emmanuel Okala, bụ onye gbara afọ iri asaa na Monde ọnwa Mee a dị n’abalị iri na asaa.   Minista ahụ ziri ozi ekele ọgbụgba afọ ahụ ma kwuo na nwaamadị ahụ tuuru ugo mmeri na  1980 Cup of Nation bụ otu n’ime oche goolu Nigeria tinyere mba Africa zụpụtarala.   O kwuru sị: “N’aha ezinaụlọ otu egwu bọọlụ ụkwụ Nigeria, ka m jiri obi m niile kelee Emmanuel Okala dịka ọ gbara afọ iri asaa. N’ụbọchị taa pụrụ iche, ana m agọrọ gị ọfọ nchekwa, ebere, uju amara na ahụike. Ọgbụgba  afọ ọma, ị bụ nnọọ onye obodo jiri biri n’ezie, onye nke mmiri agaghị amachi nzọ ụkwụ ya n’egwuregwu bọọlụ ụkwụ nke Nigeria na Africa. Ụtụ ị tụnyere na nturu ugo 1980 Nations Cup na ọtụtụ ndị ọzọ bụ ihe ndị agaghị echefu echefu. Anyị ga-aga n’ihu na-ańụrịrị gị ma nara ekele maka ihe ikwu niile I mere, nke ndị anyị na-echetazị.”  Òtù Nigeria Football Feder

Egwu ndị Igbo: Egwu ụmụikorobịa

ỤMỤIKOROBIA bụ ụmụnwoke na-etolite etolite. N’ala Igbo ihe e ji mara ha bụ ime ihe n’ike n’ike n’ihi na ọbara ha ka na-anụ ọkụ. Ụmụikorobịa na-agba egwu dị iche iche dịka, njima, etiliọgwụ, egwu ịgba, egwu mmọnwụ w.d.g. Mgbe ọ bụla ha na-agba egwu mmọnwụ, ha na-eji ya ada ego dị egwu. Egwu ha na-ada ụda ike ike dịka ha na-eme ya n’ọkụ n’ọkụ. Ha na-agba egwu gazuo obodo dị iche iche.

Nri ndị Igbo: Ji na akịdị

JI bụ otu nri ndị Igbo na-eri nke ọma. E nwere ụzọ dị iche iche e si esi ji.  A na-esi ji mmiri ọkụ, ji na agwa, ji na akwụkwọ nri, e jikwa mmanụ esuru ji.   N’izu a, anyị ga-esi ji na akịdị. Akịdị dịkwa ka agwa mana ihe dị iche bụ na a na-esikọ akịdị na azụ ya.   Otu a ka e si akwado akịdị tutu e sie ya: Ị gbajie akịdị, iwepụchaa ndị adịghị mma na ndị ọtị dị. Akịdị ndị chara acha ị gbawaa ya wepụta mkpụrụ ya, ị sacha ya nke ọma maka aja, ị wụnye ya na nyọ.   Ị bachaa ji waa ya kịrịkịrị, ị sachaa ya debe. I sinye mmiri, ọ gbọọ ị wụnye akịdị kpuchie ya. I ga-esi ya ka o ghee nke ọma. I wụnye ji n’ime akịdị ahụ ji ghee ị wụpụ ya na nyọ, i sinye mmanụ, ọ dị ọkụ ị wụnye yabasị, o ghee ị wụnye ose, nnụ na ụkpaka kpagharịa ya nwa oge, wụnye ji na akịdị ahụ ị gwọkọọ ha; ọ bụrụ oriri.

Otu ndị Igbo si egbu, kee anụ okụkọ n'ezinaụlọ

OTU n’ime njirimara ndị Igbo bụ irikọ nri ọnụ. Onye o dịịrị ịhu na e siri nri ma kekwaa ya bụ nne. Ihe kpataara e ji erịkọ nrị ọnụ bu iji gosi na ha niile bụ ụmụnne na onweghi onye na-asọ ibe ya asọ. Ọzọ dị ka ibe ya bụ nne ọbụla maara ole nri onye ọbula nọ n’ezinaụlọ ya ga-ericha.   Mgbe ọbụla e nwere nnukwu mmemme a na-eme n’obodo, dika iri ji ọhụrụ, ịgba ofala w.d.g ezinaụlọ dị iche iche na-egbu ọkụkọ. Mgbe ọbụla e gburu ọkụkọ, onye ọbụla nwere oke nke ya, bido na nna nke bụ isi ezinaụlọ ruo n’obere. O bụ nna maọbụ diokpara, ma ọ bụrụ na nna anoghịzị ya na-ata eko ọkụkọ na obi ya. Eko ọkụkọ na obi ya na-egosị ndụ n’uju ya. Ọ bụ n’ihi nke a ka o jiri bụrụ onyeisi ezinaụlọ ga-ata ya iji gosi ọrụ ya dikaonye nọ n’isi. Nke a na eziputakwa na ọ bụ ya ka ọ dịịri ichekwa ndu ndị ezinaụlọ ya.   Ihe onye nne na-ekete n’okụkọ bụ olu ya. Nke a na-egosiputa ọrụ ya na ike o nwere dika onye nne n’ezinaụlọ. Ọ bụ olu okụkọ na-eme ka ọkụkọ tugharia isi ya were lee anya ebe ọ chọrọ ile anya ma mekwaa

Ihe mbigbo mere n'ụlọ oriri egbuola mmadụ abụọ n'Ogun

OKE ihe ọdachi dapụtara ụbọchị Tuzdee, dịka mmadụ abụọ nwụrụ ọnwụ mberede, n’ihi ihe mbigbo bigboro n’otu ụlọ nkwariakụ dị n’Abeokuta, bụ isi obodo steeti Ogun.   Ihe mbigbo ahụ bụ nke mere n’otu nnukwu ụlọ nkwariakụ na-ewu ewu na steeti ahụ a maara dịka ‘Conference Hotel’, bụkwa ụlọ nkwariakụ nke Gọvanọ chịbụrụ steeti ahụ n’oge mbụ, bụ Maazị Gbenga Daniel.   Dịka ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, mmadụ atọ nwètàkwàrà mmerụahụ ma bụrụkwa ndị nọ n’ụlọọgwụ anara ọgwụgwọ ugbua n’ihi ihe mbigbo ahụ, bụ nke a na-enyo ényò na ọ bụ mbigbo ikuku mmụọ (gas).   N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi nhazi ụlọ nkwariakụ ahụ, bụ Maazị Tunde Osinubi mèrè ka a mara na ya bụ ihe mbigbo dapụtàrà n’ezie, ma kọwaa na ọ bụ ihe mbigbo sitere n’ikuku mmụọ, n’ihi ìtè silinda adịgboloja e jiri gbanye ikuku mmụọ, bụ nke onye na-arụrụ ha ọrụ n’ọnụụzọ mbata ụlọ nkwariakụ ahụ bùrù wee bịa ọrụ; ma bụrụkwa nke gbawara oge onye ahụ ji ya arụ ọrụ ahụ, bụ ọrụ ịgba ihe ọkụ.   O mere ka a mara na ya bụ ihe mbigbo gbàgburu nwa a

Ide uri n'oge gboo (I)

URI bụ mkpụrụ nke osisi uri na-amị. Ọ bụ mmiri dị n’ime ya ka ndị Igbo na-ete n’ahụ, nke a na-akpọ ide uri.Mmiri ya na-eji oji ma ọ kọọ.   Uri dị nnukwu mkpa na ndụ ndị Igbo n’ihi na ha ji ya eme ọtụtụ ihe. A ghọta uri, e gbuwaa ya, were mmiri ya malite ọrụ. Otu n’ihe ndị Igbo ji uri eme bụ ịchọ mma. Dịka anyị maara, ndị Igbo so n’agbụrụ na-achọ mma. Ha na-eji uri aka akara dị iche iche n’ahụ. Onye ọbụla nwere ike ide mmadụ uri, nne na-ede nwa uri mana o nwere ụmụnwaanyị ọ bụ ọrụ ha n’ụzọ dị iche mgbe ọbụla a chọrọ ide uri n’ụzọ pụrụ iche. Ndị dị otu ahụ bụ ndị a na-akpọ ka ha gosipụta akaọrụ ha mgbe ọbụla a chọrọ ha. Mgbe ụfọdụ e nwere ike isi obodo ọzọ kpọta mmadụ maka ide uri, dịka ọnọdụ siri dị.   Otu o sila dị, e tee mmadụ mmiri uri n’ahụ onye ahụ agaghị emetụ ahụ ya n’ihe ọzọ tutuu ọ kọọ jibezie oji makana ọ bụrụ na o meghị otu ahụ uri ga-abakachi ya ahụ nke ga-eme ka ebe ahụ niile ọ bakọrọ jibezie oji. N’ụzọ dị otu ahụ, uri e dere ya agaghị enwekwa isi,  akara ndị ahụ a kara ya

N'Delta, ndị uweojii ejidela okorobịa ise maka izuru okporoigwe ugbọoloko si aga

NDỊ uweojii anwụchikọọla ụmụnwoke ise maka imebi ma zuru okporoụzọ ugbọoloko (rail track), nke ụlọọrụ na-ahụ maka njem ugbọoloko, Nigeria Railway Corporation dezichara ohụrụ, ma buru nke di n’uzọ Warra-Itakpe. Ndị uweojii kwuru na ndị omekome ahụ bepụtara ọtụtụ nkeji (sections) nke okporoigwe ugbọoloko ahu, ihe dịka kilometa iri atọ, na mpaghara Adogo (steeti Kogi), nke okporoụzọ ụgbọoloko ahu.   Otu ọ sila dị, ndịisi NRC chọputara ya bu mbibi ma mee mkpesa, dika o kwesịrị.   Ka anyi cheta na amụma ọrụ okporoụzo ugbọoloku ahu bụ nke gọọmenti etiti hibere n’onwa Septemba 2020. Okporoụzọ ụgbọoloko Itakpe-Warri ahụ jikọtara Warri nke di na steeti Delta na Ajaokuta dị na steeti Kogi.  E wepusikwara ụfọdụ ihe e ji hiochisi okporoigwe ahu dika ‘bolts’ na ‘knots’ nke ziputara njikere ha di, iburu okporoigwe ahụ gbalaga.   Onyeisi ụlọọru Nigeria Railway Corporation (NRC), bu Fidet Okhiria gwara ndị ntaakụkọ na ya bu ihe mere eme n’ezie. Okwuru na o mere na kilometa iri atọ, Adogo, mpaghara ste

Ndị omekoome agbaala ụlọọrụ INEC abụọ ọkụ n'Ebonyi

N’IJI gbakwụnyekwuo na nsogbu na ihe ọdachi dị iche iche na-adapụtasị na mpaghara ebe dị iche iche na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ndị omekoome ámághị ndị ha bụ, nọrọ na nsonso a wee mụnye ọkụ n’ụlọọrụ abụọ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission’ (INEC), na steeti Ebonyi; ọkụ wee gbarikọọ ụlọ abụọ ahụ na ihe dị n’ime ya.   Ụlọọrụ abụọ ahụ a gbara ọkụ n’abalị ụbọchị Tuzdee dị na mpaghara okpuru ọchịchị ‘Ezza North’ nke steeti ahụ, ma bụrụkwa nke mere ka ọ fọdụrụ awà olenaole ka a malite ọgbakọ ndịisi ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ nchekwa chọrọ inwe ụbọchị Wenezdee banyere mwakpo ndị omekoome na-awakpò ụlọọrụ INEC.   Ndị ọnọmgbeomere mèrè ka a mara na ọkụ ahụ gbarikọrọ ụlọọrụ abụọ ahụ gwoogwoo, ma gbapịa akwụkwọ dị iche iche dị oke mkpa na akụrụngwa e ji arụ ọrụ ebe ahụ.   N’okwu nke ya banyere nke ahụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ INEC na steeti Ebonyi, bụ Maazị Cornelius Ali, gbàrà akaebe na ndị omekoome gbara ụlọọrụ ha ọkụ

Arụ n'ala Igbo (I)

Ọ BỤ ezie na Igbo na-sị na ọ na-abụ arụ gbàá ahọ, ọ bụrụ omenala; mana ọtụtụ aghọtaghị ihe nke ahụ pụtara.   Tupu mmadụ ọbụla aghọta ihe okwu a pụtara, ọ ga-ebu ụzọ ghọta ihe bụ arụ na ihe bụ omenala, nà ihe dị iche na ha abụọ, maka na onye amaghị ọfọ nna ya na-akpọ ya mkpìrìsì osisi. Onye amaghị azụ mmà anaghị ihu ya.   Na nkọwa m ebe a, aga m asị na omenala na arụ bụ akanri na akaekpe ndị Igbo. Ihe nke ahụ pụtara bụ na, a bịa n’ala Igbo, Omenala bụ akparamagwa, omume na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ndị Igbo nabàtàrà nke ọma, na-emesi ya ike oge niile maọbụ na mgbe na mgbe, ma werekwazie ya dịka usoro obibindụ ha. Dịka aha ya siri dị, Omenala (Òmé n’ala) pụtara na ala na-anabata ihe ndị ahụ ma e mee ha, nke gosiri na ha bụ ezi ihe, maka na ala Igbo anaghị akwàdo maọbụ kwụdóró ihe ọjọọ. Ugbua ị ma nke a, ị ma nke ọzọ? Gịnị bụ arụ?   Arụ na nwanne ya Nsọala bụ ndịiche Omenala. Ihe nke a pụtara bụ na, dịka Omenala bụ ihe ala nabatàrà, Arụ na Nsọala bụ ihe rụrụ arụ na ihe ala na-asọ nsọ. Ya bụ na Ar

Bishọọpụ Ezeofor agbapeela ogige ụlọekpere a rụrụọhụrụ n'Umuchu

BISHỌỌPỤ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Agụata, bụ Bishọọpụ Samuel Ezeofor emeela mmemme ịgbapegharị ótù ogige ụlọekpere a rụzigharịrị ọhụrụ na dayọsiisi ahụ.   Ya bụ ogige bụ nke a maara dịka ‘Catechist Gabriel Ezekwo Memorial Chapel And Umuchu Unity Centre’ ma bụrụkwa nke dị n’ụlọụka ‘St. Thomas Anglican Church, Umuchu’, n’okpuru ọchịchị ime obodo Agụata, nke steeti Anambra.   N’okwuchukwu ya n’ofufè nrò pụrụ iche e jiri malite mmemme ahụ, Bishọọpụ Ezeofor, ónyé nyere nkọwa banyere ògigè ahụ, chetaara ndị sonyere na mmemme ahụ mkpà ọ dị mmadụ ịmara Chineke na mmadụ iji ndụ ya na obi ya niile jeere Chineke ozi n’ụwa, ka aha ya wee bàá n’akwụkwọ nke ndụ, nke na  eluigwe na ụwa ga na-agbara ya akaebe maka ezi ndụ o biri, ọbụladị oge onye ahụ hapụrụ ụwa.   Dịka ọ na-eme ka a mara na ogige ahụ bụ nke a rụrụ n’aha onyenkụzi ụka/Katikiisti mbụ nọrọ n’ụlọụka ahụ, bụ Maazị Gabriel Ezekwo, iji kwanyere ya ùgwù ma mekwa ka aha ya dị ọkpụtọrọkpụ; Bishọọpụ Ezeọfọr kpọkukwàzịrị ọhaneze bịara mmemme ah

Umoren: Eliela nwaagbọghọ ahụ na-achọ ọrụ egburu n'Akwa Ibom, kpụgharịa onye gburu ya

ELIELA nwaagbọghọ ahụ nke onye kwere ya nkwa ọrụ mara elu n’ike ma gbukwaa ya. Iniubog Umoren gbara afọ iri abụọ na isii ma bụrụ onye tuuru ugo n’ihe ọmụmụ philosophy na mahadum, University of Uyo na steeti Akwa-Ibom. ka anyị cheta na Uduak Frank Akpan  ji ụzọ aghụghọ were rata ya, gbuo ya n’ike.   Mgbe o dina n’ebe a kwaziirị ya (lying-in-state), tinyekwara n’ụka elimozu ya nke weere ọnọdụ n’ụlọụka Faith Tabernacle Ikot Ibritam, ọtụtụ ndị enyi na ikwunaibe ji anya mmiri were sị ya gaa ije ya n’udo ma gọọ ọfọ ka Chineke bọọ ọbọ banyere ọnwụ ya.   Nwanne ya nwaanyị, Iffy Ephraimite kọwara obere nwanne ya lara mmụọ dịka ezi enyi kacha enyi o nwere, ma bụrụkwa onye kwesịrị ntụkwasa obi, na-agba mbọ, bụrụ onye eziokwu na onye na-ekwupụta okwu.   O kwuru sị: “Mụ na Iniubong na-enwe ezi mmekọrịta dịka nwanne na nwanne. Obi dị m mwute dịka e gburu ya n’uju nke ndụ ya. Obi na-agbawa m na ọ laala taa. Ọ maara otu e si ahazi ma na-achịkọba ihe nke ọma. Ekpere m bụ ka Chineke wetara ya ikpemkwụmọ

FRSC Anambra emeela ụbọchị nchekwa okporoụzọ

ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ, bụ ‘Federal Road Safety Corps’ (FRSC) ngalaba steeti Anambra, arịọla njikọaka ụmụafọ steeti ahụ, ndị e ji okwu ha agba ìzù, na ndị òtù dị iche iche, iji kwàlite arụmọrụ ha, njem awele na nchekwa okporoụzọ na steeti ahụ.   Onyeisi ọhụrụ nke ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi kpọrọ òkù a na mmemme imerùbè izuụka nchekwa okporoụzọ na mba ụwa, nke ahọ 2021, bụ nke e merùbèrè emume mgbape ya n’isi ụlọọrụ ahụ dị n’Awka, bụ isi ụlọọrụ steeti ahụ.   Dịka o siri kọwaa oge ọ na-agbape mmemme ahụ, CC Irelewuyi mèrè ka a mara na mmemme ahụ bụ mmemme pụrụ iche e wepụtara iji kwàlitekwuo ọrụ maka inwe njem awele okporoụzọ, ibelata ihe mberede okporoụzọ, na ịhụ na e nwere ezi nchekwa okporoụzọ, ma kọwakwa na a na-eme ya bụ mmemme otu izuụka, ma bụrụkwa nke ha ga-anọ na ya wee megasịa ihe dị iche iche, dịka inye nkụzi, ime mgbasaozi banyere njem awele okporoụzọ, ime mkpọtụrụ, ikpe ekpere pụrụ iche, tinyere ihe ndị ọzọ ga-enye aka ịkwàlite

Anambra amalitela inye ndị na-ana nwa ọzụzụ iji belata ọnwụ nne na nwa

IGBO sị na ọ na-adị mma nwaanyị bàta ọhụrụ na ngwùrù, a kọwaara ya ka e siri biri, maka adịghị ama ama.   N’ịgbaso nke a, gọọmentị steeti Anambra amalitela inye ndị ọrụ nọọsụ na-ana nwa e were n’ọrụ ọhụrụ na steeti ahụ ọzụzụ ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma dịka a tụrụ anya n’aka ha ma ha mechaa malite ọrụ.   Ndị nọọsụ ahụ bụ ndị e were n’ọrụ ọhụrụ n’okpuru atụmatụ ‘Basic Health Care Provision Fund’ na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị ọzụzụ inye nkụzi ha gá-éwè mkpụrụ ụbọchị ise nà-ewère ọnọdụ ugbua n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   Ọgbakọ inye ọzụzụ ahụ bụ nke a na-eme site n’aka ụlọọrụ ‘Anambra State Primary Health Care Development Agency’ na njikọaka ụlọọrụ gọọmenti etiti, bụ ‘National Primary Health Care Development Agency’, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị dị iche iche selitere isi na ngalaba ahụike steeti ahụ sonyèrè na mmemme mgbape ya.   N’okwu ya oge ọ na-anabàta ndị nọọsụ ahụ, onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Primary Health Care Development Agency’, bụ Dọkịta Chioma Ezeyimụlụ kọwara na mpa

Di na nwunye akpọchiela nwata nwaanyi afọ iri na abụọ na ngịga, ọnwa asatọ

NDỊ uweojii kọmandị Sokoto atọpụtala otu nwata nwaanyị gbara afọ iri na abụọ aha ya bụ Joy Emmanuel n’ebe a kpọchidoro ya, kemgbe onwa asatọ. Nwata nwaanyi ahụ ka e kwuru na ọ bụ ndị nlekọta (guardians) ya e nyere aha ha dịka Emmanuel Bassey na nwunye ya bụ Esther Emmanuel kpọchiri ya ogologo oge niile ahụ.   Di na nwunye ahụ nyere nkowa na nwata ahụ nwere nsogbu isi ezughi oke. Mana ndị uweojii chọpụtara na nke ahụ abụghi eziokwu.  Okwuputa  okwu ndị uweojii kọmandị Sokoto bụ Sanusi Abubakar kọwara oge akụkọ ruru anyi aka na a zopụtala nwata nwaanyị ahụ na ngiga n’ezinaụlọ ha ebe a kwụrụ ya agụụ (enyeghi ya ihe oriri), onwa asato. O kwuru sị,”Oge ndi ọrụ anyi kpakara onụụzọ ngiga ahụ, ume adighi nwata nwaanyi ahu iga ije n’ihi na ọ tachara ahụ, anyi hụrụ ya n’ọnọdu di oke njọ, ọ nọ na anyu ma mamiri ma nsị n’ime ngiga ahụ.   A kpọgara ya n’ulọogwu ‘Specialists Hospital, maka ogwụgwọ.” Otu o sila dị, o kwuru na a ga-ahafe ma nwata ahụ ma di na nwunye ahụ kpara arụ n’aka ndị ọ dị n’aka,