Posts

Showing posts from April, 2021

Nnabuife ebuputala akwụkwọ atọ o dere ọhụrụ

Image
Izunna Okafor, Chinwendu Uzoatu na Charity Achebe ONYEISI ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka ndị na-ebiputa akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra bụ  Chuka Nnabuife nọ na Satọdee gara aga buputa akwụkwọ atọ o dere ọhụrụ. Nnukwu mmemme ahụ kpọkọtara ndị oke mmụta bụ ndị si ebe dị iche iche wee wụchaa n’ụlọ ezumezu National Light, bụ ebe ọ nọrọ kpọtụọ.   A nọrọ na mmemme ahụ gbaa akwụkwọ ndị ahụ n’anwụ ma kpupee ha, ka ụwa hụrụ.   Akụkwọ atọ ahụ bụ “Homeland Catalysis: More than Just Anambra Narratives”; Mbize: Rage of Red Earth in Igbo Land” and “Nigeria Civil War (1967-1970): Holes in Our Bubbles”, gosipụtara ọgụgụ isi, mmụta na nghọta nke onye dere ha banyere Anambra, ndị Igbo na ala anyị bụ Nigeria gbaa gburugburu.   N’okwu ya na mmemme ahụ, kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkuziri ọhaneze ihe ha kwesịrị ịma na steeti Anambra bụ Maazị C. Don Adinuba kwuru na site n’ụtụ ndị mmadụ na-atụnye n’ihe iche aka mgba dị iche iche na Niger

Anụụlọ na uru ha bara

ANỤỤLỌ bụ anụmanụ ndị bi n’ụlọ. Dịka anyị maara, e nwekwara anụmanụ ndị bi n’ime ọhịa.  Anụụlọ gụnyere ehi, ewu, atụrụ, ọkụkọ, nkịta, nwamba w.d.g. Anụmanụ ndị a na mmadụ na-ebi n’ụlọ n’enweghị nsogbu ọ bụla.Ụfọdụ ka a na-aba aha, ị kpọọ ha, ha aza.Ịzụ anụụlọ bara nnukwu uru na ndụ mmadụ.   E wepu iji ha akpata ego na ihe oriri, tinyere uru ndị ọzọ, ụfọdụ mmadụ na-ewere ha dịka ihe na-enye ha obi aṅụrị nke bekee kpọrọ pet. Otu nwaanyị onye ọcha nwere ọtụtụ nwamba kwuru n’akwụkwọ ọgụgụ na o nweghị ihe dịka nwamba, na ọ ka mmadụ mma. Nke a pụtara na o nwere ntụkwasa obi na nwamba karịa ebe mmadụ nọ.   Ya mere, ndị Igbo kemgbe ụwa ji bido, na-azụ anụụlọ. Mgbe gboo, ndị Igbo nwere nkwenye na ọnwụ bata na be mmadụ ọ hụghị anụmanụ ọ ga-egbu, o gbuo mmadụ. Ya mere, ha anaghị ekwe ka anụụlọ kọ n’ụlọ ha.   Otu nwaanyị aha ya bụ Ọriakụ Rosa Nwandụ onye na-azụ ewu kwuru sị; “Ana m azụ ewu ka ọ ga-abụ ihe ike bata n’ụlọ m, kama ọ ga-eti m, o tie ewu.Nke ọzọ bụ na ewu na-enye m ego n’ihi na ọ bụrụ

N'Ebonyi, agbaala ụlọikpe ukwu Abakaliki ọkụ

NDỊ ojiegbe agbaala ụlọikpe ukwu (Federal High Court), Abakaliki nke steeti Ebonyi ọkụ.   Ụlọikpe ahụ dị n’ụzọ awaraawara Enugu/Abakaliki na ncherịta ihu offiisi Peoples Democratic Party nke steeti ahụ.   E kwuru na ọ bụ na Tuzdee ka ya bụ ihe mere ma bụrụkwa nke ndị omekome ji ogbunigwe (petrol bombs) wee mee.   Ọkụ ọgbụgba ahụ nke bidoro n’ụzọ ụzọ ụtụtụ wee gbaba metụtara ọba akwụkwọ na mpaghara ndị nche nke ụlọikpe ahụ.   Otu o sila dị, a gbatara ọsọ wee menyọọ ọkụ ahụ tupu ihe riri ụtara arachapụ ofe.   Onweghị onye tụfuru ndụ ya na ya bụ ihe bụ nke mebiri ihe ndị (records) ụlọikpe ahụ chekwara n’ọba akwụkwọ.   Onye okwuputa okwu ndị uweojii na steeti ahụ, Loveth Odah kwuru na ya bụ ihe mere n’ezie. Ọ kọwara na ndị ahụ kpara mkpamkpa ahụ bịara n’igwe wee kpaa arụ ahụ.   Ka anyị cheta na ọtụtụ steeti agabigala mwakpo n’ebe ndị ọrụ nchekwa nọ.   Na steeti Imo, ndị oji egbe wakporo gbaa ụlọ gọvanọ steeti ahụ bụ Hope Uzodimma ọkụ na nso nso a ma gbuo ndị nche nọ na ya.   Ọtụtụ ndị mmad

Egwu ndị Igbo: Egwu ifo

EGWU Ifo (folk music) so n’egwu ndị Igbo nwere. Ọ bụ egwu a na-agụ nke na-adị n’ime akụkọ ifo.   Dịka anyị maara, akụkọ ifo dị ọkpụtọrọkpụ n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ ha omenala,otu ha si hụta ụwa,nsọ dị iche iche ha na-asọ,nkwenye ha na ihe ndị ọzọ banyere obibi ndụ ha.Akụkọ Ifo bụ usoro mmụta bụ ịgba nke na-esi n’aka fere aka wee na-aga.   A na-akọkarị akụkọ ifo na mgbede abalị, n’oge egwu ọnwa tinyekwara oge ezumike.   Ọtụtụ akụkọ ifo na-enwe egwu.Egwu ifo na-atọ ụtọ. Ọkọakụkọ na-agụpụta, ndị ọ na-akọrọ a na-ekwe. Ọmụmaatụ egwu ifo: Mbe agaba ……… Ajambene Mbe agaba ………. Ajambene Gaagaagaagaa … Ajambene   Otu o sila dị, o nwere otu nwaanyị haziri Egwu Ifo, mee ka ụwa mata na ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ. O ji olu ya na-ada ka ogene wee mee ka Egwu Ifo gazuo ụwa niile.   Onye m na-ekwu maka ya bụ Nelly Uchendu MON.Ọ bụ onye Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.Site n’ịgụ Egwu Ifo, ala Nigeria nyere ya nkwanye ugwu ‘Member of the Order of Niger ‘(MON).  

Nri ndị Igbo: Osikapa nchanwụ

IHE oriri dị mma bụrụkwa ihe na-enyere ndụ aka ọkachasi mgbe onye na-esi nri ahụ ma ka e si esi nrị ọma.   Na nri nke izu a, anyị ga-esi nri onye ọbụla na-enwe mmasi na ya mana ọ ga-abụ n’ụdị dị iche. Ihe oriri a bụ osikapa.   Osikapa bụ nri dịbara gboo. Ọ bụnadị mgbe igwe e ji esucha osikapa adịghị ndị Igbo na-eji ikwe esucha osikapa.   Anyị ga-eleba anya n’otu e si esi osikapa mgbe ahụ. Mgbe ahụ e sinye osikapa agbata obi niile ga-ama na a na-esi osikapa.   Otu a ka e si esi osikapa nchụanwụ: ị mata iko ole ị chọrọ isi fụchaa ya họpụ aja dị na ya, sinye ite n’ọkụ gbanye mmiri, ọ gbọọ wunye osikapa ahụ ị fụchara, ọ gaa nkeji iri wụpụ ya na nyọ, sachaa ya nke ọma wunye osikapa ahụ na nyọ. Gbanyezie mmiri ị ga-eji sie osikapa ahụ, ọ gbọọ ị gbanye mmanụ, azụ ọkpọ, ira, nnu, okpenyi, ose, magị, yabasi, kpuchie ite ka ihe ndị ahụ I wunyere ghee. I lee ma nnụ ọ dịkwa ya, ị wunye osikapa ahụ, o ghee I were ngaji kpagharịa ya, wụkwasi nchụanwụ I bere kịrịkịrị, ọ bụrụzie oriri.

Aka NDLEA akparala ndị zoro ọgwụ ike n'ime ihe ọkpụkpụ Maria

NDỊ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchikọọla ndị ji ihe a kpụrụ akpụ (statue) nke Virgin Mary, nne Jesu wee bubata ọgwụ ọjọọ n’ala anyị.   Ha tinyere ọgwụ ike ndị ahụ n’ime ihe ọkpụkpụ ahụ iji kpuchie arụrụala ha, ka a ghara ịchọpụta maọbụ jide ha, ka e chee na ọ bụ ihe a kpụrụ akpụ ka ha bu.   Ọ bụ na Lagos ka ndị NDLEA jidere kọmpịnị abụọ ‘Narcotic Couriers’, ndị tinyere ụfọdụ ọgwụ ike n’ime ihe a kpụrụ akpụ Virgin Mary, ma tinye ụfọdụ n’akọrọngwa ụgbọala bụ ndị nke a ga-ebufe Canada na United Arab Emirates (UAE).   Onyeisi mgbasaozi (Media and Advocacy) NDLEA Maazị Femi Babafemi kwuru site n’Abuja na ọgwụ ndị e tinyere n’ihe a kpụrụ akpụ bụ nke e nwetara n’aka otu kọmpịnị ma bụrụ nke ha chọrọ ibufe mba Philippine, ebe ọgwụ ndị e tinyere n’akorongwa ụgbọala ka e nwetara n’aka kọmpịnị ọzọ, ma bụrụ ndị a ga-ebufe Canada. E nwetakwara ọgw ọjọọ ndị ọzọ n’aka ndị ahụ bụ ndị a ga-ebufe mba ọzọ.   Otu o sila dị, NDLEA na-agba mbọ dị egwu na steeti dị iche iche n’ala any

N'Anambra, ndị omekoome akpaala mkpamkpa n’obi Igwe Ifitedunu

OPEKATAMPE, mmadụ atọ (gụnyere ụmụaka abụọ na otu agadi nwaanyị) gbanahịrị ọnwụ ike káárá ịdakwasị ha na nsonso a, dịka ndị omekoome a maghị ndị ha bụ wakpòrò be eze ọdịnala obodo Ifitedunu dị n’okpuru ọchịchị obodo Dunukọfịa nke steeti Anambra.   Mwakpò ahụ bụ nke ndị omekoome ahụ mere ụbọchị Mọnde, ma bụrụkwa nke ha nọrọ na ya wee bibie ọtụtụ ihe n’obi eze ọdịnala ahụ, ma gbakwa ọtụtụ ihe ọkụ tupu ha rie mbọmbọ.   N’okwu ya oge ọ na-akọwara ndị ntaakụkọ banyere mwakpò ahụ, Igwe Chukwuemeka Ilunọ kwupụtara obi mwute ya banyere mwakpo ahụ na ajọ ọdachi ahụ. Ọ kọwara ihe ahụ dịka ihe arụ, bụ mwakpo ahụ a wakporo ya bụ obi eze, ma mee ka a mara na ndị omekoome ahụ sitere na mwakpo ahụ wee bibie ọtụtụ ihe ọkpụ, ihe ochie, na akwụkwọ dị iche iche iche dị mkpa banyere ọchịchị obodo, wee suo ha niile ọkụ, ha gbaa pịàtàà.   Dịka ọ na-ekwupụta na ọ bụ ezi e na o nweghị ndị a na-enyo ènyo na ọ bụ ha mere ihe ahụ, Igwe Ilunọ gbara akaebe na e nwere nsogbu ọchịchị obodo n’Ifitedunu, bụ nọgoro ọtụ

Emeela mmemme Ụbọchị Akwụkwọ n’Anambra

A KPỌKUOLA ma dụọ ụmụakwụkwọ ọdụ ka na-ahụta akwụkwọ na ịgụ akwụkwọ dịka ihe dị oke mkpà maka ha iji mee nke ọma n’agụmakwụkwọ ha, nwee ezi ọgụgụisi ma bụrụkwa ndị maara nke ekwe na-akụ n’ihe bànyere mmụta.   Ndụmọdụ a bụ nke e nyere site n’ọnụ onyeisi ọba akwụkwọ Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze, n’okwu ya na mmemme imerube ụbọchị akwụkwọ na mba ụwa, bụ nke a chịkọbara site n’aka ọba akwụkwọ ahụ. Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige ọba akwụkwọ steeti Anambra dị n’Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ dị iche iche dị na gburugburu Awka, ndị nkụzi, ndị ọrụ ọba akwụkwọ, na ọtụtụ ndị ọzọ, ndị bịara ịkwanyere óké ụbọchị ahụ ùgwù.   Dọkịta Udeze mere ka a mara na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị òtù mba ụwa ‘United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization (UNESCO)’ wepụtara iji kwanyere akwụkwọ ùgwù na mba ụwa, kọwaa uru akwụkwọ bara, ma kwalitekwa ịgụ akwụkwọ. Ọ kọwara akwụkwọ dịka ihe bara ọtụtụ uru a pụghị ịgụta ọnụ, ma kpọkuzie ụmụakwụkwọ ka ha na-agụsi akwụkwọ

Nchekwa obodo: Ndị uweojii ejidela ndị omekome asatọ n'Anambra

N’ỊGBASI mbọ ha ike iji weghàchi ezi ọnọdụ nchekwa na steeti Anambra, ndị uweoji steeti ahụ nọrọ na nsonso a wee jide mmadụ asatọ a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n’ihe dị iche iche na-eweta ala adịghị mma na ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.   DSP Ikenga Toochukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Anambra gbàrà nke a n’anwụ site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n’Awka. O kwuru na ọ bụ site na njikọaka ha na ndị ọrụ nchekwa obodo ka ha jiri nwụchikọọ ndị ahụ.  N’ịkọwa nke ahụ, o mere ka a mara na ọ bụ n’abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Epure a ka ndị uweojii nọ na mpaghara Awada nwụchikọrọ Maazị Ifeanyị Eze (gbara ahọ iri abọụ na abụọ), Maazị Arinze Okeke (gbara ahọ iri abụọ na abụọ), na Maazị Ezeugo Friday (gbara ahọ iri abụọ na ise).   O kwuru na a nwụchikọrọ ndị ahụ oge ha jiri ụgbọala enweghị akàrà wee gafèé n’usoro a na-enyo ènyò, bụzị nke mere ndị ọrụ nchekwa jiri chụsòó ma nwụchikọọ ha. Ọ kọwara na nnyocha ha mere oge ha nwụchikọchara ndị ahụ kọwara na ha bụ ndị ohi, dịka ha j

Korona: N'India, a na-azọzi ndụ ndị ọrịa n'ụlọ n'ihi na ụlọọgwụ ejula

KA Ọ dị ugbu a, nje korona na-akpazi mkpamkpa na mba India, nke mere na ọtụtụ ndị ọrịa na-anọzi n’ụlọ ebe a na-azọ ndụ ha n’ihi na ụlọọgwụ niile ejula.   Dịka ụlọọgwụ niile dị na Delhi na ọtụtụ obodo ndị ọzọ dị n’India enweghịzi ohere àkwà (bed), ndị mmadụ amaghịkwa ihe ha ga-eme karịa ịkpọ ndị nke ha na-arịa ọrịa korona laa n’ụlọ, ma na-achọzi ọgwụgwọ n’ụzọ ọbụla ha nwere ike.   Ọtụtụ n’ime ha ka e kwuru na ha họrọziri ụzọ akụkụ (black market) ebe ihe niile adịchaghị ka o kwesịrị dịka ọgwụ, ihe okuku ume (oxygen clinders) na ndị ọzọ galara oke ọnụ, tinyere na ọgwụ ndị ahụ edochaghị anya. Ihe na-agala ọnụ nke ukwu n’ụzọ ahụ nke mere na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị emeli ihe dị na ya.   N’ihi ọnọdụ a, ọtụtụ ndị mmadụ na-anwụ n’ọnụụzọ ụlọọgwụ n’ihi na ha agaghị azụtali ọgwụ na ihe okuku ume ‘oxygen’ n’ebe ndị ahụ abụghị ụlọọgwụ.   Ụfọdụ ndị ahụ na-ere ihe okuku ume ‘oxygen’ ka e kwuru na ha na-ere ya okpukpu iri ihe e kwesịrị ire ya.   N’akụkụ nke ọzọ, ezinaụlọ ndị ji ego iso ụzọ ahụ na-agbazi

Etoola Pope Francis maka onye Igbo e chiri fada n'ụlọọgwụ na Rome

Onye nwụrụ izuụka olemole e chichara ya fada ỌTỤTỤ ndị mmadụ ekwuputala afọ ojuju ha nwere banyere onye Igbo e chiri ụkọchukwu ka ọ nọ n’ọrịa na Rome.   E chiri ya ụkọchukwu ka ọnwa April dị n’abalị nke mbụ.   Fada Livinus Esomchi Nnamani gbara afọ iri atọ na otu nọ na-arịa ọrịa ọbara ‘leukemia’ nke mere ka ọ nọrọ n’ọnọdụ so nsogbu ọrịa.   Fada Livinus mere mkpebi ma degara Pope Francis edemede, rịọ ya ka e chie ya ụkọchukwu nsonso. Ya mere, ọsịsa ozi ahụ bịara site n’aka Pope Francis ka ọnwa March dị n’abalị iri atọ na otu, ebe ọ nọ nye nkwado ka e chie ya ụkọchukwu ozigbo.   N’echi ya, April 1, bishọp enyemaka ‘auxilliary bishop’ nke Rome, Most Rev. Daniela Libanori chiri ya ụkọchukwu. Ọ bụ n’ụlọọgwụ Presidio Sanitario Medica Group Casilino Hospital, Rome, ka a nọ chie ya ụkọchukwu.   Ka ọ gachara izuụka olemole e chiri ya ụkọchukwu, Fada Livinus Esomchi Nnamani zara Chukwu kere ya oku.   N’ihi nke ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ toro onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis maka ịhụnanya o gosiri F

Ụgbọelu ndị Air Force ejirila ogbunigwe tugbuo ndị Army karịrị iri abụọ, n'amaghị ama

ỤGBỌELU Nigerian Air Force (NAF) ji alụ agha ejirila ogbunigwe (bomb) tụgbuo ndị agha Nigeria n’amaghị ama ka ha na-achọ igbu ndị ọ lụọ ọ laa ‘Boko Haram’. Ndị agha nwụrụ anwụ karịrị iri abụọ n’ọnụọgụ.   Ndị agha ahụ bụ ndị e kwuru na ha na-aga Ngandu hazie ka e kwuru na ha na-aga Mainok nke bụ isiobodo okpuru ọchịchị Kaga, steeti Borno bụ nke ndị Islamic State West Africa Province (ISWAP) wakporo.   E kwuru na ndị agha ọ lụọ ọ laa ahụ bụ ndị bu o pekata mpe tụrọọkụ iri na ise e ji agba egbe, gbakwuru ọnọdụ ndị agha (military base) ọkụ.   Otu ihe siri gbata kwụrụ, mkpamkpa kpara dịka ụgbọelu ndị agha bịara ibuso ndị ọ lụọ ọlaa ahụ agha tụziri ndị agha ibe ha ogbunigwe n’amaghị ama.   Ndị Boko Haram ahụ ka e kwuru na ha ji uwe ndị agha (military uniform) wee meghaa ndị mmadụ anya nke mere ka ha wee banwuo na kampụ ahụ, ma bụrụ ndị bịara n’òtù n’òtù dị iche iche nke agaghị agụta ọnụ. Oge ndị agha chọpụtara ihe na-eme, ha kpọrọ oku enyemaka ma ihe tugharịrị, dịka ogbunigwe gbariri ndị agh

Onye nkuzi mahadum na ezinụlọ ya anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ

MMADỤ anọ si n’otu ezinaụlọ, nna, nne na ụmụaka abụọ anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ. Ihe mberede ahụ kpọrụrụ n’okpuru ọchịchị Maru nke dị na steeti Zamfara.   Ndị ahụ lara mmụọ bụ onye nkuzi nke ngalaba ihe ọmụmụ nọọsụ (Nursing Science) na mahadum Malam Usman Danfodiyo University, Sokoto aha ya bụ Malam Tajuddeen Musawa, na nwunye ya na ụmụ ya abụọ.   Musawa na ezinaụlọ ya ka e kwuru na ha si Sokoto na-ala obodo ha  maka emume akwamozu nnukwu nna ya oge ihe mberede ahụ ji wee mee.   Ndị nlekọta mahadum ahụ ezipụtala ozi iji kwuo na ihe mberede ahụ mere n’ezie.   Ozi ahụ gụnyere ihe ndị ọzọ kwuru sị: “Ọnwụ adapụtala n’ebe Malam Tajuddeen S. Musawa nke ngalaba ihe ọmụmụ nọọsụ na ‘faculty’ Allied Health Usman Danfodio University Teaching Hospital (UDUTH), Sokoto. O nwere ihe mberede okporoụzọ nke butere ọnwụ ya n’okpouru ọchịchị Maru na steeti Zamfara. Ya na nwunye ya na ụmụ ya abụọ nwụrụ n’ihe mberede ahụ.   Ganye n’ọnwụ ya, ọ bụ onye ọrụ ọkwa ya dị elu ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka on

Ụmụnwaanyị Igbo akpọọla oku, rịọ ka a kwụsị ịkwafu ọbara n'ala anyị

N’IHI oke ịghafu ọbara na ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị n’ala anyị ugbu a, otu ndị okenye ụmụnwaanyị n’ala Igbo akpọọla oku ka obodo jụrụ oyi, ka ibu agha na igbu mmadụ dere duu ka udo tọrọ atọ dị, ma na mpaghara ‘Southeast’ na n’ala Nigeria niile gbaa gburugburu.   Òtù ahụ, bụ nke bụ ngalaba (apex) Ọhaneze Ndigbo ji ohere ahụ katọọ ogbugbu e gburu ndị mmadu n’Awukuzu dị n’okpuru ọchịchị Oyi na steeti Anambra; nke ndị amaghị ndị ha bụ gburu; tinyekwara ọtụtụ ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị n’akụkụ ala Igbo dị iche iche n’ala Igbo tinyere ala Nigeria niile.   N’okwu ya na mmemme ahụ, onye hibere Centre for Psychic and Healing Administration, Dọkịnta (Oriakụ) Flora Ifeanyichukwu Ilonzo (Anyafulugo) kwuputara na igbu mmadụ na ọnọdụ enweghị ezi nchekwa nke a na-ahụtakarị n’oge mbụ na mgbago ugwu (North) agazuola ala anyị niile ugbu a.   Ọ kọwara na ya dị na mbụ hụta ma bido na-adọ aka na ntị, na-eti mkpu banyere otu ọnọdụ enweghị ezi nchekwa si arị elu n’ike n’ike na ihe ọjọọ si na ya apụta. D

Gọvanọ Obiano akatọọla ogbugbu ahụ e gburu ụfọdụ ndị mmadụ n'Awkuzu

IGBO sị na ọ na-abụ onye nụchaa, gba nkịtị, ọ dị ka o nwere ihe o kechiri n’azụ obi.   N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra akatọọla kpamkpam ma gbarụọ ihu bànyere ogbugbu ahụ ndị omekoome gburu ụfọdụ ndị mmadụ na nsonso a n’Awkuzu, dị n’okpuru ọchịchị Oyi nke steeti ahụ.   Nkatọ a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, n’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na be ya dị n’Agụleri, n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’.   Dịka o siri kọwaa, ogbugbu ahụ e gburu ndị ahụ ụbọchị Mọnde bụ nke na-agba anyammiri, ma bụrụkwa nke ekwesighị ekwesi n’ụdị n’ụdị ọbụla, n’agbanyèghị ihe ọ sọrọ ya bụrụ, bụ iwe maọbụ ebumnobi ndị ahụ jiri wee kpaa ụdị àgwà nkwafu ọbara ahụ.   Gọvanọ Obianọ, onye nọgoro na mbụ wee nye ntụziaka ka e nwee ‘onye apụtakwala iro’ (curfew) n’obodo Ịgbarịam, Awkụzụ, Nteje, Ụmụnya, Ụmụeri na Agụleri malite n’elekere asatọ nke anyasị wee ruo n’elekere isii nke ụtụtụ, gàrà n’ihu kọwaa na ebumnobi nke ahụ bụ iji weghachi ọnọdụ udo na ịdị jụụ na

UTME: JAMB ebugharịala ule nnwale mbụ

JOINT Admission and Matriculation Board (JAMB) ekwuputala maka mbugharị ha bugharịrị ule nnwale mbụ (mock) nke e kwesịrị ile n’ime izuụka a  bụ Satọdee, Epure 30.   Onye na-ekwuchitara JAMB bụ Fabian Benjamin, oge ọ na-ekwu okwu n’Abuja kwuru na ule nnwale mbụ ahụ ga-adịzi na Tọọzdee, Mee 20.   JAMB wepụtara ule nnwale  ọtụtụ afọ gara aga iji nye ndị ga-ele ule JAMB ohere ịmụta otu ha ga-esi eji kọmputa lee ule JAMB.   Benjamin kwukwara na mbugharị e bugharịrị ule ahụ bụ n’ihi obere mgbanwe e nwere n’usoro òtù bọọdụ ahụ sị arụ ọrụ, wee sị na ọ gaghị emebi ihe ndị ọzọ, tinyere ụbọchị (date) maka ule ‘Unified Tertiary Matriculation’ nke e tinyere Juunu 5 na 19.   Ọ gwara ndị ga-ele ule ahụ, bụ ndị debanyegoro aha maka ule nnwale mbụ nakwa ihe ndị ọzọ ka ha buru n’obi ụbọchị ha ga-ele ule ahụ ma gbalisie ike ihụ na ohere ahụ agabigaghị ha.

CAFÉ enwetela akụrụngwa ahụike ọhụrụ sitere mba USA

ÒTÙ ọrụ obi ebere ahụ a maara dịka ‘Caring Family Enhancement Initiative (CAFE) nọrọ na nsonso a wee nweta nnukwu akụrụngwa pụrụ iche a na-ebugharị ebugharị, bụ nke e ji elekọta ma na-agwọ ndị nwere eze mgbu na ọrịa eze ndị ọzọ.   Kpọchakpọcha akụrụngwa ọhụrụ ahụ bụ nke a rụrụ n’ụdị ụgbọala, ma bụrụkwa nke e bunyere òtù ọrụ obi ebere ahụ n’efu site n’aka ‘Wesleyan Church Of Denver’, dị na mpaghara ‘North Carolina’ nke mba USA, site na njikọaka onye ahụ chịchara n’ọkwa na nsonso a dịka ‘Mayor of London Borough of Brent’, ma bụrụkwa Nwaadọ steeti Anambra, bụ Maazị Ernest Ezeajughi.   N’okwu ya oge ọ na-enyefe akụrụngwa ahụike ahụ na ìgòdó ya n’aka Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Okpala, n’aha òtù ọrụ CAFE; Maazị Ezeajụghị kọwara onyinye ahụ dịka nke kwesiri ekwesi ‘n ilekwasị anya n’ezi ọrụ dị iche iche CAFE na-arụ, nakwa etu o si etute olileanya ndị enweghị olileanya site n’ọrụ obiebere dị iche iche ọ na-abàgide, ma n’ime steeti ahụ ma na mpụga ya.   Dị

Echi, ụgbọelu mbụ a daa n'ọdụ ụgbọelu Anambra

OBIDORO ọsọ gbachaa kwèsìrì ịkụrụ aka, maka na ọ bụghị mmadụ niile bidoro ọsọ na-agbaru n’isi.   Echi ga-abụ ‘ụwa bịa lee’ na steeti Anambra, dịka steeti ahụ na-atụ anya ịnabata ụgbọelu mbụ n’ọdụ ụgbụọelu ahụ a rụrụ ọhụrụ na steeti ahụ; n’ihi na ọ na-abụ a rụchaa ụlọ e mepeghị ya emepe, ọ dị ka ọ bụ ahụhụ na arịrị ka a rụụrụ. Ọ na-adịkwa mma onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ka ọ hụ ahụ.  Nnabata ahụ a ga-anabata  ụgbọelu mbụ n’ebe ahụ bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ Gọvanọ Willie Obianọ, bụ aka na-achị steeti ahụ, n’okwu ya na nsonso a banyere ọdụ ụgbọelu ahụ, bụ nke a rụrụ n’Ụmụeri, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’.   Oge ọ na-enye nkọwa banyere ya bụ ọdụ ụgbọelu, Gọvanọ Obianọ mere ka amara na o so n’ọdụ ụgbọelu kachara wee buo ibu n’ala Nigeria, ma nwegasịa kpọchakpọcha akụrụngwa dị iche iche a na-ahụta n’ọdụ ụgbọelu dịgasị na mba ofesi, nke mezịrị ka ọ bụrụ ejiamaatụ n’ogoogo mba ụwa.   Na nkọwa ya, o mere ka a mara na obosara ọdụ ụgbọelu ahụ  ruru ama egwureg

Mgbe adịghị anya, ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ e wepụta iwu kwadoro Ebueagụ

ARỤSỊ enweghị nsọ na ùgwù anaghị anọ ọdụ, maka na mbịara mbịara emerụghị ya, ọnọnụlọ ekpoo ya ntụ. Ọ na-adịkwa mma e wuo ụlọ, e gbuoro ya aja ngwùrù maka echi.   N’ịgbaso ihe ndị a, ndị Gọvanọ ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria ekpebiela iji amụmà iwu wee kwàdó atụmatụ nchekwa ahụ ha wepụtara ọhụrụ a maara dịka ‘Ebubeagụ’, iji mee ya ka o guzosie ike.   Mkpebi a bụ nke ndị gọvanọ ahụ mere n’ọgbakọ izugbe ha nwere na nsonso a, bụkwa nke ha bụ gọvanọ steeti ise dị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ahụ sonyere na ya, nke gụnyere Gọvanọ Dave Umahi nke steeti Ebonyi, Gọvanọ Willie Obianọ nke steeti Anambra; Gọvanọ Hope Uzodimma nke steeti Imo, Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke steeti Abia; na Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyị nke steeti Enugu.   N’okwu ya oge ọ na-agụpụta nkwekọrịta ha, onyeisi òtù ahụ jikọtara ndị gọvanọ ahụ ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ Gọvanọ Dave Umahi kwupụtanwòrò mkpebi ha ihibe òtù ọrụ nchekwa ahụ a kpọrọ ‘Ebubeagụ’ dịka ha siri kwekọrịta n’ọgbakọ ikpeazụ ha nwere na steeti Imo,

Ndị omekome amaala mmadụ atọ elu n'ike, ma gbuo onye nche n'ogige ụmụaka enwe nne enwe nna

IHE karịrị ụmụnwoke iri na abụọ awakpola ogige ndị enwe nne na nna (orphanage) nke mba US dị n’isiobodo Haiti. Ha gburu otu onye nche ma kwaa ụmụaka abụọ na otu nwaanyị iko n’ike.   Onye nlekọta (manager) ogige ahụ bụ Brayann Clerge kwuru na ụmụaka ahụ nọ n’ọnọdụ oke mwute na echicheugbu a. Ọ kọwara na ụmụnwoke ahụ kwara ụmụaka enwe nne na nna abụọ dị afọ iri na atọ na iri na anọ, tinyere otu nwaanyị na-arụ ọrụ ebe ahụ dị afọ iri abụọ na asaa iko n’ike. O kwuru na onye nche ahụ ha gburu gbara afọ iri anọ na isii, ma jide ụmụ isii.   Clerge kwụkwara na ndị omekome ahụ tupu ha hapụ ogige ahụ zuuru mgbaaka agbamakwụkwọ ya (wedding ring), otu onyoonyoo tiivii na ihe karịrị dọla dị otu puku na narị ise ($1,500); ma tie ya na nwunye ya ihe.   Ebe obibi ndị enwe nne na nna ahụ ka e kwuru na ọ bụ ndị Global Mission, n’enweghị òtù ụka ọ bụ n’iche nọ n’Orange Country, California na-ahụ ma na-elekọta ya.   Onyeisi (Director) bụ Dave Brodsty gwara ndị ntaakụkọ na ọrụ ha bụ ilekọta ụmụaka a gbahapụ

Ụgbọelu mbụ ga-ada n'ọdụ ụgbọelu Anambra n'Epure 30 – Obiano

Image
IGBO sị na ọ na-abụ a rụchaa ụlọ e mepeghị ya emepe, ọ dị ka ọ bụ ahụhụ na arịrị ka a rụụrụ.   N’ihi nke ahụ, gọọmentị steeti Anambra ekwupụtala na steeti ahụ adịla njikere ịnabata ụgbọelu mbụ n’ọdụ ụgbọelu steeti ahụ a rụrụ ọhụrụ.   Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ Gọvanọ Willie Obianọ, bụ aka na-achị steeti ahụ, n’okwu ya oge ọ gara njem nleta n’ọdụ ụgbọelu ahụ, bụ nke a rụrụ n’Ụmụeri, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’.   Njem ahụ Gọvanọ Obianọ gara ebe ahụ bụ nke nwunye ya bụ Ebelechukwu Obiano, ndị eze ọdịnala obodo, na ụfọdụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ sòrò ya wee gaa n’isi ngwụcha izuụka gara aga.   Otu nwaafọ steeti Anambra na-ewu èwù n’ihe gbasara azụmahịa ma bụrụkwa onye obodo Ọkịja, bụ Dọkịta Earnest Obiejesi bùkwàrà ụgbọelu Helikọpta ya wee wụchaa n’ebe ahụ ụbọchị ahụ.   Dịka ọ na-agba akaebe na ọdụ ụgbọelu ahụ ga-enye aka n’ịkwalite ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe mpaghara steeti Anambra n’izugbe, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ nke ahụ ga-ewèt

Nchekwa Obodo: Obiano na ndịisi ọrụ nchekwa enweela ọgbakọ pụrụ iche

Ọ NA-ABỤ onye rahụọ ụra, e buru egbe ya. Ọ na-abụkwa ihe mekarịa n’ọhammadụ, e nweere ya nzukọ n’ọhammụọ; maka na ọ na-adị mma egwu dágharịa, e hogharịa ụkwụ egwu.   Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obino enweela ọgbakọ pụrụ ichè, ya na ndịisi ngalaba ọrụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ, iji tụọ arò ma chọpụta ụzọ kacha mma a pụrụ isi wee gbochie ma memilaa ajọ ọdachi enweghị nchekwa a na-ahụtazị na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ ugbua, n’ihi akaọrụ ndị omekoome.   Ya bụ ọgbakọ bụ nke weere ọnọdụ n’Agụleri dị n’okpuru ọchịchị Anambra ‘East’, ma bụrụkwa nke ndị òtùọrụ ahụ na-ahụ maka nsogbu ịchị ehi na steeti ahụ, (bụ ‘Cattle Menace Committee’), ndị ndu obodo dị iche iche, ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor, na ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ sonyèrè na ya.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ gbarụrụ ihu banyere etu ndị omekoome si agbasi mbọ ike ịwụnyere ọchịchị ya aja na garị n’ezi ebumnobi ya inye ụmụafọ stee

N'Awka, Action Alliance ehibela ọnọdụ na steeti Anambra

OTU ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance (AA) nọ na Satọdee gara aga ọnwa Epure dị n’abalị iri na asaa wee hibe ọnọdụ ha (Secretariat) n’Awka, steeti Anambra. Emume  ahụ bụ nnọọ nke ndị isi ọchịchị ha si mpaghara dị iche iche n’ala anyị wee wụchaa n’Awka, nke onyeisioche ha n’ala anyị bụ  Adekunle Rufai Omo-Aje nọ n’isi ya.   N’ozi ya, onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na steeti Anambra  Justina Nonyerem Ekeji nabatara ndị ahụ bịara njem ahụ, ma kelee Chineke maka idute ha steeti Anambra n’udo dịka ọ rịọkwara nchedo ya n’isi ha niile n’otu n’otu ka ha nọ na njem ahụ.   O kwuru sị: “Nje m ụnụ bịara na steeti Anambra ewulitela nchekwube anyị n’ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance nọ. O wetala ịgba ume na ngozi n’ebe onye ọbụla so n’otu a na steeti Anambra nọ. Action Alliance, dịka ị nọ n’isi ya abụrụla otu ndọrọndọrọ ọchịchị e wugharịrị nke na onye ọbụla so na ya nwere ezi ntụkwasa obi na ya nọ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị mma. Mụ na ndị otu m na steeti Anambra dịka anyị na-esony

Ndị uweojii egbochiela mwakpo ndị omekoome n'Ukpo

ỤLAGA sị na ọ bụrụ na ọ pịaghị ụtarị, ụmụaka anaghị ekwete na ọ bụ mmanwụ.   Ọ wee bụrụ etu ahụ ka ndị uweojii siri pịa ndị omekoome ụtarị mgbọ site n’igbochi ha ịwakpò isi ụlọọrụ uweojii mpaghara ‘Zone 13’ dị n’Ukpo, n’okpuru ọchịchị Dunukọfịa nke steeti Anambra.   Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịtaọhaneze na ndị uweojii na mpaghara isi ụlọọrụ uweojii ahụ, bụ DSP Nwode Nkeiruka siri kọwaa, mwakpò ahụ bụ nke ndị ojiegbeezu mere n’ọnụ ụtụtụ ụbọchị Mọnde, ma bụrụkwazie nke mara afọ n’ala, n’ihi na ndị uweojii nọ na mpaghara ahụ mere ha ‘onye ekwela ụzọ ga’.   O mere ka a mara na ndị omekoome ahụ bịara n’ụbá, wee na-agba égbè aghara aghara, iji chụsasịa ndị mmadụ, ka ha wee nwee ike ịbanye n’ime ogige ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ga mee ihe ha jiri bịa.   Kaosiladị, ndị uweojii nọ ebe ahụ kwèchììrì, wee jiri ịkwà mgbọ wee gbochie ha ịbata n’ime ụlọọrụ ahụ, maka na ọ na-abụ mmà megide ihe bàá ime ji, o mebìghị ya emebì, ọ waa ya awaa.   Oge ndị omekoome ahụ hụzịrị na ha enwe

Ọkụ agbagbuola ụmụaka ntaakara iri abụọ n'ụlọakwụkwọ na mba Niger

Image
ỌKỤ ọgbụgba gbagburu ụmụaka ntaakara (nursery) dị iri abụọ n’ọnụọgụ na mba Niger, n’izuụka gara aga. Ọkụ ahụ gbachibidoro ha na klaasị ụlọ akịrịka (straw-hut classrooms) ha na-agụ akwụkwọ.   Onyeisi ndị ọrụ ntinyụ ọkụ (fire service) mba ahụ Colonel Bako Boubacar kwuru sị na ọtụtụ n’ime ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ obere ụmụaka; tinyere na amatabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ na Niamey.   Otu onyenkuzi so n’òtù jikọtara ndị nkuzi Niger kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ nwere ihe dịka ụmụ akwụkwọ narị asatọ, ndị gụnyere ụmụaka nọ na ntaakara.   Mounkaila Halidou kwuru sị: “Ọkụ ahụ malitere site na geeti ụlọakwụkwọ. Ebe enweghị ebe ọzọ a ga-esi gbapu, ọtụtụ ndị mmadụ tọkịịrị n’ime, ebe amanyere ụmụakwụkwọ (students) ka ha maa elu aja wee gbapụ. Ndị nwụrụ anwụ bụkarịchara ụmụaka ndị ka nọ na ntaakara.”   Onye ọrụ ntinyụ ọkụ ọzọ kwuru na ọkụ ahụ gbagworo klaasị ụlọ akịrịka dị iri abuọ na otu nke ụmụaka tọkịrị n’ime ha.

Chiekezie atụọrọ Chineke mmamma maka mbuli n'ọkwa ọkammụta

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma bụrụ ihe inye Chineke ekele ka Ọkammụta Oriakụ Obianuju MaryTheresa Chiekezie buru ụkpa ekele bịa tụọrọ Chineke mmamma n’ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church G.R.A, Awka; n’ihi mbuli elu e buliri ya n’ọkwa ọkammụta na mahadum Nnamdi Azikiwe University, Awka.   Oke mmemme ahụ nke e ji aja maasị dị asọ wee malite kpọkọtara ndị ọnụ ruru n’okwu ọ kachasị ndị ọkammụta si mahadum dị iche iche bịa.   N’okwuchukwu, Fada Dọkịnta Emmanuel Umezinwa kọwara na ụbọchị ụka ahụ bụ ụbọchị ncheta oke ebere Chineke (Divine Mercy Sunday); nke bụ ụbọchị Kraist hibere sakaramenti nke mgbaghara njọ.   Ọ rịọrọ amara ka emume ahụ wetara mmadụ niile ebere Chineke ma kpọkuo mmadụ niile ka ha na-akwụba aka ọtụ ma na-enwekwa obi ebere.   Ọ kọwara Ọkammụta Chiekezie bụ onye ji olu ogene ya kwee abụọma dịka ọgụ egwu dị egwu, onye nyerela otu ukwe parish aka gaa asompi dị iche iche, ma turu ugo lọta. O nyere Chineke otito niile maka mbuli n’ọkwa nke e buliri ya dịka ọkammụta, ma kọwaa na nke a

Ndị Ebenator amalitela ndozi okporoụzọ ha, rịọ enyemaka gọọmentị

Image
IGBO sị na ọ na-adị mma nwaanyị na-eche di ya, ọ na-emetụ nke ọ ga-emenwu; maka na ọ naghị adị mma ọhammadụ ịnọ nkịtị wee na-eche ọhammụọ.   N’ịgbasò nke a, ndị Ebenator, dị n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra amalitela iji aka ha edozi okporoụzọ ha na ọwàmmiri ha mebisiri emebi, ka ọ gachaara ọtụtụ ahọ ha jiri chebe mgbataọsọ na enyemaka gọọmentị n’idozi okporoụzọ ahụ na ọwàmmiri ahụ, n’enweteghị ụsa ọbụla.   Okporoụzọ ahụ na ọwàmmiri ahụ, nke dị na mpaghara njikọ ụzọ Amannalụ (Amannalu Junction) bụ nke a malitere ọrụ mmetụ aka na ya na nsonso a site n’aka ndị a maara dịka ‘Ummunnama Progressive Youths’, bụ òtù jikọtara ndị ntorobịa Ụmụnnama, bụ ótù ógbè n’ime ógbé atọ mejupụtara Ebenator.   Ya bụ okporoụzọ gọọmenti etiti bụ otu n’ime okporoụzọ pụtakarịchara ìhè e si abata ma na-apụ n’obodo ahụ, ma bụrụkwa nke gafere obodo ahụ, si ya bànye Ụkpọr (bụ isi obodo okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’), wee si ya gaa Ihembosị na Ọkịja, nà obodo ndị ọzọ. Ụfọdụ akụkụ okporoụzọ ahụ a na-

Ndị uweojii Anambra ejidela mmadụ asatọ maka otu nzuzo

ỤBỌCHỊ niile nwere ike bụrụ nke onye ohi, mana otu ụbọchị ga-abụrịrị nke onye nwe ụlọ.   O wee bụrụ n’ịgbasò nke ahụ ka ndị uweojii steeti Anambra jiri nwụchikọọ mmadụ ise a na-enyo ènyò na ha bụ ndị otu nzuzo.   Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Toochukwu siri kọwaa, ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na aka ha dị na nkwàtụ ahụ ndị òtù nzuzo kwàtụrụ n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ ụbọchị ụka.   Nkwàtụ ahụ bụ nke e sitere na ya wee gbagbuo mmadụ abụọ a maghị ndị ha bụ na mpaghara azụ Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Ifite Awka ụbọchị ụka.   O mere ka a mara na ha jikeere onwe ha ozigbo wee wụchaa n’ebe ahụ ngwangwa ha nwetara ozi banyere nkwàtụ ndị otu nzuzo ahụ; mana oge ha rutere n’ebe ahụ, ndị òtù nzuzo ahụ hụchatara ha, ha wee ripù ọsọ. Ndị uweojii ahụ chụsòrò ha ozigbo ka nkịta na-achụ nchì n’ọdọ ìrùrò, wee nwụchikọọ mmadụ ise n’ime ha.  

Korona: Akwa mkpuchi ihu achụọla uriọnụ ọsọ n'ọnụ ụmụnwaanyị

Uriọnụ (lipstick) bụ ihe ụmụnwaanyị na-ete n’ọnụ. Ọ bụ otu n’ime ihe e ji achọ mma. Uriọnụ na-eme ka nwaanyị chawapụ ma maa mma ile anya.   Uri ọnụ bụ ihe dịbara site n’oge gboo n’ihi na ịchọ mma amaliteghị taa. Ụmụ ụwa  bidoro gboo choba mma. N’oge ahụ, a na-ete ọtanjele, uri na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji achọ mma.   Uriọnụ na-acha ụdị agwa dị iche iche dịka, ọbara ọbara, oji, ọcha w.d.g. Ọtụtụ mmadụ ejirila ire uri ọnụ na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma mepụta ihe n’ihi na uriọnụ na-aga ahịa n’ụzọ dị egwu.   Uriọnụ na akwa mmadụ yi n’ahụ na-agakọta. Ọmụmaatụ: onye yiri akwa na-acha ọbara ọbara, o tee uri ọnụ na-acha ọbara ọbara, ka o wee bụrụ ihe e kwuru ka a na-eme.   Otu o dila dị, nsogbu ụmụ nwaanyị nwere gbasara uriọnụ ugbu a bụ na akwa nkpuchi ihu a na-ekpu maka igbochi korona ekweghịzi ha tee uriọnụ. Ha nwaa anwaa tee ya, akwa nkpuchi ihu e hichaa ya. Nke a malitere kemgbe ọrịa korona batara n’ụwa. Ka ihe siri kwụrụ, gọọmenti tiri iwu na onye ọbụla ga na-eji akwa nkpuchi ihu ekpuchi onwe

NDLEA anwụchiela nwaanyị na-eresi ụmụakwụkwọ ihe oriri e jiri ọgwụ ike mee n'Abuja

ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịkpọ na ịtụ mgbere ọgwụ ike, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ nọrọ n’Abuja wee nwụchikọọ otu nwaanyị a na-enyo ènyò na ọ na-eresi ụmụaka ụmụakwụkwọ na-agụ n’ụlọakwụkwọ dị n’ebe ahụ, nà ọfụdụ ndị ọzọ bi na mpaghara ahụ ihe oriri na achịchị e jiri ọgwụ ike wee mee.   Nke a bụ nke a gbara n’anwụ site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi ụlọọrụ NDEA n’Abuja, bụ Maazị Femi Babafemi, site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuzdee.   Dịka o siri kọwaa, nwaanyị ahụ bụ Rhoda Agboje ma bụrụkwa nwata akwụkwọ nọ n’ogo nke atọ ya na mahadum, ebe enyi ya nwoke bụ Maazị Ifeanyi Nwankwo ma bụrụkwa onye a nwụchikọrọ n’isi mbido izuụka a. Ọ sịkwa na ha ka na-achụ ụfọdụ ndị òtù ahụ ndị ọzọ nọ n’ọsọ ugbua.   O kwuru na ndị òtù ahụ na-eji ọgwụ ike dị iche iche, dịka ‘arizona’, ‘alcohol’, ‘rohypnol’ na ndị ọzọ wee na-emepụta achịcha bekee, ihe ntagharịọnụ na ihe oriri ndị ọzọ wee na-eresi ụmụakwụkwọ ahụ.   Ọ gara n’ihu kọwaa na ha chọpụtara arụrụal

Nri ndị Igbo: Ofe akwụ

 MGBE anyị na-ekwu maka nri ndị Igbo o nwere ihe kpatara e ji ekwu ya. Ihe ọbụla a na-eri eri onye Igbo weta ya ọ kwado ya ma sie ya n’udi ọ ga-abụ na i rie ya ụbọchị ọzọ ọ gụọ gị.   Onye Igbo chọọ isi azụ ọ ga-akwadobe ya n’ụdị ọ ga-abụ na i risia ya o ju gị afọ.   Na nri ndị Igbo nke izu a, anyị ga-eleba anya n’otu e si esi ofe akwụ. Akwụ bụkwanụ n’ala anyị ka e si eweta ya. Mpaghara ala Igbo ọbụla na-esi ofe akwụ n’udi nke ha. Nke a bụkwa otu anyị si esi ofe akwụ ahụ, onye ọbụla riri ya ojiri ya mara gị.   Egbutu o isi akwụ, ibute ya, igbọsịa, ifesa ya mmiri, ikpuchie ya abalị abụọ ikpapụtachaa mkpụrụakwụ ahụ. I sachaa mkpụrụakwụ nke ị chọrọ iji sie ofe akwụ nke ọma, isinye ya n’ọkụ, o ghee ị sụọ mkpụrụakwụ n’ikwe.   I ga-eji nwayọọ ka akị dị n’akwụ ahụ ghara ịgbari. I sụchaa ya, I were mmiri dị ńarańara wee fọọ ya nwa oge ka o wee pụta  ọma, I wepụ avịrịvọ iche, I wepụ akị iche. Cheta na mgbe ị na-afọ ya mmiri ị ga-agbanye na ya bụ mmiri ị ga-eji sie ya, i were nyọ nwere obere oghe

Egwu ndị Igbo : Egedege

EGEDEGE  bụ egwu ndị Igbo na-agba. Ha malitere ya mgbe ụwa dị n’ụra. Ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị na-agba egedege.   N’oge ahụ, ndị ntorobịa na-agba egedege n’egwu ọnwa.   Ejiji e ji agba egedege na-adị iche. Ụmụnwaanyị na-akpa ụdị isi dị iche iche.   Mgbe elu bụ ala ọsa, ha na-akpa isi okpoko, isi ego, nkonyerenantị w.d.g. Ha na-etekwa uhie, dee uri, yiri jigida n’ukwu, ma gbara nja n’ụkwụ.   Dịka a na-agba egedege, ụfọdụ na-akụ akụ, ụfọdụ na-agba agba, tinyere ndị na-agụ agụ. E ji ngwa egwu dị iche iche akụ ya, ndị gụnyere: ịchaka, ọkpọkọrọ, ogene, aro, udu, ọja w.d.g. Ọja dị nnukwu mkpa n’egwu egedege makana ọ bụ ya na-ezipụta ihe a na-eme.   Obodo dị iche iche agbaala egedege, ma na-agba ya ruo taa. Ma obodo e jiri mara egedege bụ Unubi, nke dị na Nnewi South na steeti Anambra. Onye na-agụpụta ya bụ Queen Theresah Onuora nke Original Egedege Dance. Ọ bụ odogwu nwaanyị ahụ mere na egedege na-ada ụda n’ụwa niile taa.   Theresa Onuora (Queen of egedege dance) malitere egwu egedege n’afọ

Nne na nna: Olee onye ka mkpa n'ezinaụlọ?

NNE na nna bụ ide ji ezinaụlọ. Ọ bụ eziokwu na a bịa n’ala Igbo, nna ka a na-akpọ ide ezinaụlọ, mana n’ime ihe niile, nne nọ n’akụkụ ya na-eme ka ọrụ ọ na-arụ na-apụta ihe dịka o kwesịrị.   Chineke kere ụwa, kere ha nwoke na nwaanyị. Ya mere, nke ọbụla n’ime ha nwere ọrụ ọ na-arụ ma n’ezinaụlọ ma n’obodo. Ebe ọbụla nwoke anọghị ihe anaghị adabacha dịka a chọrọ, n’otu aka ahụkwa ka ọ dị ebe nwaanyị anọghị.   Otu o sila dị, ndị mmadụ tinyere echiche ha n’isiokwu a maka na agwọ otu onye hụrụ na-aghọ ukoro. Echiche ọha mmadụ ka mma karịa nke otu onye. Nwaada Uju Okeke: Ma nne ma nna bachara uru n’ezinaụlọ. O nweghị nke ka ibe ya mkpa. Ọtụtụ ọrụ dịịrị nwoke dịka ọtụtụ dịkwaara nwaanyị. Oge ụfọdụ, nwoke na-akwụ ụgwọ akwụkwọ mana ọ bụ nwaanyị na-eleru anya ala hụ na nwa ahụ gụrụ akwụkwọ nke ọma ma mee ihe omume e nyere ya n’ụlọakwụkwọ, ma ọ lọta n’ụlọ. Ụfọdụ ụmụnwoke kwụchaa ụgwọ akwụkwọ ha anaghị achọzị ịma ma onye ha kwụụrụ ụgwọ akwụkwọ ọ na- elerukwe anya n’akwụkwọ  ya. Nke a dị otu a n’ih

Ụmụakwụkwọ Anambra eturula ugo ọzọ n'asọmpi mba ụwa

ỤMỤAKWỤKWỌ ‘Queen of Rosary College’ dị n’Ọnitsha, n’ime steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nweta ntúrúùgò dara ụdà n’asọmpi mba ụwa, dịka ha meriri ndị ògbò ha sitere mpaghara mba ụwa dị iche iche n’asọmpi ahụ.   Ụmụakwụkwọ ahụ dị asaa n’ọnụọgụgụ ka e kwuru na ha meriri ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ ndị ọzọ karịrị puku ise na nnukwu asọmpi ahụ a kpọrọ ‘University of Delaware’s Global Prize Award’, bụ nke weere ọnọdụ na mmemme ‘Diamond Challenge Global Summit’, bụ nke bịara na njedobe na nsonso a.   Ya bụ mkpọpụta ndị tuuru ùgò na nnukwu mmemme bụ nke gaara ewèré ọnọdụ na mahadum Delaware dị na mba ‘United States of America’, mana n’ihi ọrịa nje korona, e mèzịrị ya n’usoro nzikọrịta ozi ọgbaraọhụrụ.   Ụmụakwụkwọ ahụ sitere Anambra, ka e kwuru na ha dị mmadụ asaa, ma bụrụkwa ndị nọchitere anya ala Nigeria n’asọmpi mba ụwa ahọ, ka ha merichara ndị ọzọ sitere ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị iche iche n’ala Nigeria, wee bụrụzie ndị e weputere ga-anọchite anya Nigeria n’ogoogo mba ụwa.   Ha bụ ụmụakwụk

Ụkwaranta na-egbu mmadụ iri na asatọ awa ọbụla na Nigeria – WHO

NCHỌPỤTA nke si n’aka òtù ahụike mba ụwa World Health Organisation ezipụtala na ụkwaranta (tuberculosis) na-egbu opekatampe mmadụ iri na asatọ awa ọbụla na Nigeria.   Onyeisi (Director) otu na-ahụ maka ngbochi ọrịa ụkwaranta na ekpenta, National Tuberculosis and Leprosy Control Programme bụ Oriakụ Itohowo Uko onye kwuputara nke a n’ọgbakọ ‘virtual media seminar’ nke ha họọrọ ndị ntaakụkọ wee mee n’Abia na Enugu kwuru sị: “Ụkwaranta na-egbu ndị mmadụ karịa korona na Nigeria.”   O kwuru sị dịka nchọpụta nke WHO siri dị, na mmadụ dị puku narị na iri ise (150,000) nwụrụ n’ihi ọrịa ụkwaranta n’afọ 2019 sọọsọ.   Dịka onyeisi NTLCP ahụ siri kọwa, n’ihi na ndị na-arịa ụkwaranta enweghị ike inweta ọgwugwọ n’oge ahụ a lakpuru (lockdown) n’ihi korona mere ka ọrịa ụkwaranta fesaa n’ala anyị karịa. O kọwara njirimara ya dịka ahụọkụ, mmadụ ịta ahụ na ikwa ụkwara ogologo oge.   Otu o sila dị, Oriakụ Uko kọwara na a na-agwọ ụkwaranta agwọ ma kpọkuo onye ọbụla kwarala ụkwara ihe ruru izuụka abụọ ka ọ g