Onye Anambra, Nnubuonye eturula ugo ọkaibe n'atụmatụ ọrụ ugbo CBN
OTU onye ọrụ ugbo na-ewu èwù n’Ifite-Ọgwarị dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ayamelum nke steeti Anambra, bụ Maazị Anthony Nnubuonye eturula ugo ma nweta onyinye nkwanyeùgwù dịka ọkaibe n’ọrụ ugbo n’atụmatụ CBN ACGSF 2020, nke a maara dịka ‘Central Bank of Nigeria and the Board of Agricultural Credit Guarantee Scheme Fund’ nke ahọ 2020. Nturuugo ahụ bụ nke Maazị Nnubuonye, onye nwe ogige ọrụ ugbo (Sheriff Farms) nwètara dịka ọkaibe n’ime ndị ọzọ sonyere n’atụmatụ ahụ, site n’ịbụ onye kacha wee mezupụta atụmatụ ọrụ ugbo ahụ, nwee ezi ndekọ bụ ọkachamma banyere etu ọrụ ugbo ya siri gaa, ma nwekwa mmepụta na owuwe ihe ubi kachasị mma, iji kwụghachi ego mgbazinye ahụ e nyere ya site n’atụmatụ ahụ na ọmụrụnwa dị n’elu ya tupu ụbọchị ikpeazụ e nyere maka ịkwụghachi ya. N’okwu ya na mmemme inye nkwanyeugwu ahụ, onyeisi ụlọakụ etiti ala Nigeri bụ ‘Central Bank of Nigeria (CBN)’, ngalaba ya nke Awka, bụ Maazị Benedict Maduagwu kọwara na inye onyinye nkwanyùgwù ahụ bụ n’ịgbaso ntụziaka òtù nlek