Posts

Showing posts from February, 2021

N'Awka, ndị ụlọụka St Thomas Aquinas etoola Fada Akabogu na ndị ọzọ maka ọrụ ọma

Image
NDỊ ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church G.R.A, Awka nọ ụbọchị ụka ọnwa Febrụwarị dị n’abalị iri na anọ wee mee emume jee nke ọma (sent forth) maka Fada Anthony Akabogu jibu ọkwa dịka ụkọchukwu parish na osote ya bụ Fada Solomon Anyaorah tinyere ụkọchukwu bi ebi (in residence) na parish ahụ bụ Very Rev. Msgr. Jerome Mmadueke na ndị sista abụọ bụ Mary Gaudencia Nwankwo na Maria Lotanna Abbah.   Ha nọkwa n’oge ahụ nabata ụkọchukwu parish bịara ọhụrụ bụ Fada Francis Oranye na ukọchukwu abụọ bi ebi na parish ahụ bụ Fada Emmanuel Umezinwa na Fada Victor Rowland Okoli.   Emume ahụ nke e ji aja maasị elekere itoolu were malite bụ nnọọ emume ịhụnanya n’ihi na ndị mmadụ nuputara n’igwe.   N’okwuchukwu, Fada Anyaora kọwara na Dinwenu Jesu Kristi bụ nna nwere obiọma site n’ịrụtụ aka otu o siri gwọọ onye ekpenta rịọrọ ya ka o nyere ya aka, site n’oziọma a gụrụ ụbọchị ahụ.   Msgr Mmadueke n’oge ọ na-enye ekele, gosịrị obi ọma n’ịhụnanya nke Fada Akabogu na ndị ụkọchukwụ ya na ha rụkọrọ ọrụ gosi

Egwu ndị Igbo: Egwu ụmụagbọghọbịa

EGWU ndị Igbo dị ụzọ dị iche iche. E nwere egwu mmadụ niile na-agbakọta ọnụ, ma nwoke ma nwaanyị.   N’akụkụ nke ọzọ, e nwere ndị a na-agba iche iche. N’ụdị ahụ, ndị ọbụla na-agba ya dịka otu ha nọ na ya siri dị, dịka ụmụagbọghọbịa, ụmụikorobịa, ndị nne, ndị nna, ụmụaka w.d.g.   Ya mere, egwu ụmụagbọghọbịa bụ egwu sọọsọ ụmụagbọghọbịa na-agba. Ha na-amụ ya ma na-ebuputakarị ya n’oge oriri ekeresimesi.   N’oge dị otu ahụ, ụmụagbọghọbịa na-achọ onwe ha mma n’ụzọ dị iche iche site n’ịkpa isi, ite ihe otite dị iche iche dịka nzu, uri ọnụ, otanjele w.d.g.   Oge ụfọdụ, ha na-ebu egwu ahụ na-aga n’ụlọ n’ụlọ. Ka ha na-aga ka ha na-adara ego na-etinye n’akpa ha.   Oge ụfọdụkwa ha na-ebupụta ya n’ama-egwuregwu ọha obodo, ebe a ga-agbakọba ọnụ ma jaa ha ego.   Ụmụagbọghọbịa na-ebukwa egwu ha aga oriri dị iche iche dịka: alụmdinanwunye, ụka nwa, akwamozu, w.d.g.   Ọmụmaatụ egwu ụmụagbọghọbịa bụ: Adakụ nwanne  — bịa gbara egwu Nnenna nwanne m          — bịa gbara egwu Ọha obodo niile                —

Akụkọ: Otu ihe ọjọọ siri bata n'ụwa

CHINEKE kere ụwa nyere nwaanyị ara ka o jiri ya na-azụ nwa. Ya mere, na mmalite ụwa, ihe e ji azụ nwa a mụrụ ọhụrụ bụ mmiri ara nne ya, n’ihi na ndị mmadụ kwenyere na site n’ịńụ ara nne ya nwa ọhụrụ ahụ na-ańụta ezi ihe niile Chukwu okike tinyere n’ime mmadụ.   Mgbe nwa ọhụrụ na-ańụ ara nne ya, ha na-enwe mmekọrịta nke pụtara n’ezie na ọgbụgba ndụ pụrụ iche dị n’etiti mmadụ na ibe ya.   Ihe e ji enwe nkwenye na mmadụ bụ mmadụ n’ezie bụ makana onye ahụ ńụrụ ara nne ya. Ọ bụ ya ka o jiri bụrụ iwu na nwaanyị ọbụla mụrụ nwa ga-echerịrị ya ara. Ya mere, ọ bụrụ na nwaanyị mụọ nwa ma hapụ iche ya ara ọ na-abụ ihe arụ.   O ruru otu oge, otu nwaanyị wee mụọ nwa wee hapụ iche ya ara, kama o weere mmiri ara anụmanụ wee zụọ nwata ahụ. Nke a mere na mmụọ anụmanụ siri n’ụzọ dị otu ahụ banye n’ime nwa ahụ. Ka ọ na-etolite, o bidoro na-egosipụta omume ụmụanụmanụ n’ụdị omume ọ na-eme. Nke a pụtara na ọ malitere na-akpa agwa ka anụmanụ.   Ya bụ ihe gwagwojuru ndị mmadụ anya nke mere ka ndị okenye gaa gb

Nri ndị Igbo: Ji a hụrụ ahụ

NRI ndị Igbo niile bụ sọ ụtọ. Anyị ga-ekwu maka nri bụ ezigbo ọ pụrụ iche n’izu a. Nri a bụkwa nri ị maara nke ọma, ma na ị maghị na ọ pụrụ iche ma ị kwado ya nke ọma. Nri a abughị ihe ọzọ ma ọ bụghị ji a hụrụ n’ọkụ.   Ji a hụrụ n’ọkụ bụ ọ pụrụ iche. Nke mbụ, ọ bụ ọgwụ nye ụfọdụ nsogbu ahụ mmadụ, dịka onye nwere ọrịa ọnyụnyụ na ọgbụgbọ (diarrhea), afọ ọsịsa na onye na-anyụ ọbara; o rie ji a hụrụ n’ọkụ na mmanụ, ọ dajụọ. Nke ọzọ, ọ bụrụ na ike na-agwụ gị i rie ji a hụrụ n’ọkụ ị nwete ume ngwa ngwa. Ji a hụrụ n’ọkụ dị mma ka ezinaụlọ na-eri ya.   Otu a ka e si akwado ji a hụrụ n’ọkụ nakwa ihe e ji eri ya. Ị mụnye ọkụ na nkụ maọbụ na i nwere ite unyi, ị tịnye ọkụ n’unyi o nwukee, ị tịnye ji n’ọkụ ahụ, ị ga na-atụgharị ji ahụ tutuu o ghee, i wee kpachaa azụ ya debe. Weta  mmanụ dị mma gbanye n’efere, tinye ụkpaka, ose, nnu, yabasi, akwụkwọ ụtazị i bere kịrịkịrị, ọ bụrụ oriri.   N’ezie, i were ihe ndị a richaa ji a hụrụ n’ọkụ echi ọgụbakwa gị. Oge gboo, a na-egwunata ji ụmụaka na-enwe mmasị

N'Anambra, e jidela ụmụnwaanyị abụọ ji ụmụaka arịọ arịrịọ

Image
 Ọ NA-ABỤ onye kpọọ onwe ya òké, bùúsù esu ya ọnụ, maka na ọ bụ etu onye siri mete ka e si emeso ya.   Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze na ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị n’ime steeti Anambra anwụchiela mmadụ abụọ maka iji ụmụaka arịọ arịrịọ na steeti ahụ.   Mmadụ abụọ ahụ, bụcha ụmụnwaanyị, bụ ndị e jidere n’Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị sitere steeti Nasarawa na steeti Enugu n’otu n’otu. Ha bụ ụmụnwaanyị abụọ nà ụmụaka isii (nwaanyị anọ na nwoke abụọ) ha ji arịọ arịrịọ ka e kwuru na ha so na ndị arịrịọ a nwụchikọbụrụ n’oge mbụ na Nnewi na n’Ọka (Awka) n’ime ọnwa Disembà ahọ gara aga, site n’aka ndị ụlọọrụ ahụ.   Ka o sila dị, oge mbụ ahụ a nwụchikọrọ ha n’ahọ gara aga, Kọmishọna na-ahụ maka ụlọọrụ ahụ, bụ Oriakụ Ndidi Mezue nyechara ha ndụmọdụ megide ịrịọ arịrịọ, nye ha nri, ma nyekwa ha ego ka ha wee ga malite ndụ ọhụrụ ma kwụsịzie ịrịọ arịrịọ. Mezue (nke mbụ n’aka ekpe) na ndị arịrịọ e jidere   Dịka a ga-asị na nke ahụ ezubeghị, Kọmishọna Me

ANSPPB akụtuola ụlọ a rụrụ ebe iwu akwadoghị na Nkpor

Ọ NA-ABỤ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụfèé aja, e bute ozu ya n’ofete nke ọzọ.   O wee bụrụ etu ahụ ka ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board’ (ANSPPB) siri wee kụtuo ụlọ a rụrụ n’ebe iwu akwdòghị na Nkpọr dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra.   N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ANSPPB, bụ Maazị Chike Mmadueke kọwara ya bụ ọrụ ịkụtu ụlọ ahụ dịka nke dabara adaba n’usoro iwu n’ihi na ya bụ ụlọ bụ nke a rụchiri n’ebe okporoụzọ siri gaa n’akụkụ ụlọ abụọ ọzọ, ma bụrụkwa ebe e si abanye n’okporo ụzọ ọzọ dịkwa n’akụkụ ebe ahụ, bụzị nke mere ka ọ na-esiri ndị bi na mpaghara ahụ ike ịbanye n’ụlọ ha, ma ya fọdụzie ịgafè n’ebe ahụ.   Ọ kọwara na ebumnobi ụlọọrụ ahụ abụghị imegide maọbụ imekpà ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ bụrụ na ha akụtughị ụlọ dị etu ahụ ma leghàra ya anya, ị mara na ndị mmadụ ga na-arụzị ụlọ n’ebe ọbụla nà etu ọbụla ha chọrọ, bụ nke ọ kọwara dịka nke adabaghị adaba nà nke megidere ezi ebum

Mmadụ asaa anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu mere n'Abuja

MMADỤ asaa abụrụla ndị zutere ọnwụ ike ha, dịka ihe ụgbọelu ndị ọrụ agha elu ala Nigeria nwèrè ihe mberede na nsonso ọdụ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n’Abuja, wee binwuru ọkụ, ma gbarikọọ.   Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na isi ụlọọrụ ndị ọrụ agha elu ala Nigeria, bụ Maazị Ibikunle Daramola, site n’ozi ọ kụpụrụ banyere ya bụ ihe mberede ụgbọelu dapụtara ụbọchị ụka gara aga.   Dịka o siri kọwaa, ya bụ ụgbọelu bụ nke e zubere ka ọ bagide n’ọrụ ngagharị nnyocha banyere ịzọpụta ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ ụbọchị Wenezdee izuụka gara aga site n’otu ụlọakwụkwọ dị na mpaghara steeti Niger.   Ọ dị ncheta na ndị omekóòmè nọrọ na nsonso a wee tụọ ka égbé, gbuo otu onye, ma tọrọ mmadụ iri anọ na abụọ, nke gụnyere ụmụakwụkwọ dị iri abụọ na asaa n’ọnụọgụgụ, ndị nkuzi atọ na ụmụnne ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọakwụkwọ ahụ; bụzị nke mere onyeisiala Muhammadu Buhari jiri nye ntụziaka ka a nwụchie ndị kpara ajọ agwa ahụ ma zọpụtakwa ndị ahụ a tọọrọ ozigbo ozigbo.   O mezịr

N'Abia, a zọpụtala nwata nwaanyị nne ya kụrụ ịga, kpọchịbido n'ime ụlọ

AZỌPỤTALA otu nwata nwaanyị na-eto eto (teenage girl) n’ụlọ nne na nna ya dị n’Umuokoro Obinkita Arochukwu na steeti Abia, ebe e ji ịga ‘chain’ wee kpochie ya n’olu na aka.   Ọ bụ n’ihi mbọ nwunye gọvanọ steeti Abia, Dọkịnta Nkechi Ikpeazu bụ onyeisioche, State Action Committee on Gender-based Violence ka e jiri mee nke a.   Ndị ụlọọrụ Nigeria Security and Civil Defense Corps (NSCDC) site n’ama si n’aka Vicar Hope Foundation and Child Protection nke Oriakụ Ikpeazu hibere, zọpụtara nwata ahụ.   Maazị Chika Ojiegbe, odeakwụkwọ (Chief Press Secretary) nke Oriakụ Ikpeazu kwuru na a zọpụtara nwata ahụ aha ya bụ Ada site n’aka ndị NSCDC ma kpọnye ya Vicar Home Foundation maka nleru anya.   Ojiegbe onye nke kwuru na Oriakụ Ikpeazu katọrọ mmegbu ụmụaka n’ụzọ ọbụla kwuru na o nweghị ihe ga-eme nne nwata ahụ ga-eji were nye ya ụdị ntaramahụhụ ahụ onye nke o kwuru na o kwesịrị ịchọ usoro ahụike ọ ga-esi nyere nwa ahụ aka maka uche ezuchaghị oke.   N’akụkụ nke ya,  nne nwata ahụ bụ Oriakụ Blessing

Ihe mberede okporoụzọ: Mmadụ atọ agbanahịla ọnwụ n'Awka

MMADỤ atọ nọrọ na nsonso a wee gbanahị ọnwụ ha, dịka ajọ ihe mberede okporo ụzọ dapụtara n’àkwà ebe ahụ ụgbọala na-agba n’elu na-agba n’ala dị n’Amawbia, n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.   Onye na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ na-ahụ maka ije awele okporoụzọ bụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ ngalaba steeti Anambra, bụ SRC Florence N. Edor bụ ya mere ka a mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na steeti ahụ, bụ nke o sitere na ya wee mee ka a mara na ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàra ụbọchị Tuuzdee n’etiti ụgbọala Peugeot Saloon nwere akàrà YAB 944 JY na ụgbọala ọzọ na ụgbọala Ford Escape SUV nwere akàrà 02E 660 AN.   Dịka o siri kọwaa, ndị ọnọmgbeomere kwuru na ọ bụ mmadụ ịpụ n’akụkụ nke ya ma banye n’akụkụ nke onye ọzọ mèrè ya bụ ihe mberede jiri dapụta. Ọ kọwara na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara mmadụ atọ (bụcha ụmụnwoke), mana o nweghị onye ọbụla n’ime ha tụfùrù ndụ ya, kama ọ bụ naanị otu onye nwetàrà mmerụahụ, ma bụrụkwa onye e buuru ozigbo gaba n’ụlọọrụ ‘Prince

Obiano enyela Igwe Orsumoghu, Ideani, Ugbene asambodo

Ọ NA-ABỤ a nyụọ nsị, a kapịàghị ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò, maka na ọ na-adị mma, a kpụchaa Diji, a kpụnye ya óké ji n’aka.   N’ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie nọrọ na nsonso a wee nye ndị eze ọdịnala ọhụrụ obodo Orsumoghu, Ideani na Ugbene asambodo, iji gosi na gọọmenti kwàdoro ma nye ha ikike ịbụ eze ọdịnala obodo ha dị iche iche.   Mmemme inye asambodo a bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi Gọvanọ dị n’Amawbia, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu n’ime steeti ahụ sonyere na ya.   Ya bụ mmemme bụ nke a nọrọ na ya wee nye Igwe Steven Onyekwelu Ezeji asambodo dịka eze ọdịnala obodo Ideani dị n’okpuruọchịchị ime obodo ‘Idemili North’; nye Igwe Samson Chimakwa asambodo dịka eze ọdịnala obodo Ugbene dị n’okpuruọchịchị ime obodo ‘Awka South’; ma nye Igwe Elochukwu Mbanefo asambodo dịka eze ọdịnala obodo Orsumoghu dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ihiala.   N’okwu ya oge ọ na-enyefe ha asambodo ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwàrà omenala Igbo, ọdịnala Igbo, na ọdịben

Ọba Akwụkwọ Anambra agbasàárá ụmụnyaanyị ime obodo ozi ọrịa kansà

AKPỌKUOLA ma gwa ụmụnwaanyị ka ha gbaa mbọ na-enyòcha ara ha na akụkụ ahụ ha ndị ọzọ na mgbe na mgbe, dịka ụzọ kacha mma isi chọpụta ma gbochie ọrịa kansà nà ọrịa ndị ọzọ na-efe èfè n’ogè.   Nke a bụ ‘isi sekpụ ntị’ na mmemme inye nkụzi banyere ọrịa kansà bụ ‘2021 Cancer Awareness Campaign’, bụ nke a chịkọbàrà site n’aka Ọba Akwụkwọ Steeti Anambra, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ ahụ dị n’Ihembọsị, n’okpuruọchịchị ime obodo Ekwusigo dị na steeti Anambra.   Ya bụ mmemme a chịkọbara maka ụmụnwaanyị bụkwà nke ọba akwụkwọ ahụ jiri wee merùbe mmemme ụbọchị ọrịa kansà nke ahọ 2021.   N’okwu ya oge ọ na-enye nkụzi na steeti ahụ, Dọkịta A.B.C. Ikeano nke ụlọ ahụike nkụzi Mahadum Nnamdị Azikiwe dị na Nnewi kọwara ọrịa kansa dịka ntopùte nke anụ ahụ n’ụzọ ekwesighị ekwesi n’ahụ mmadụ, ma mee ka a mara na kansà ara na kansà nke na-eme n’àkpà nwa (cervical cancer) so n’ụdị kansà ụmụnwaanyị kàchà arịa, ma sòkwa na kansa kacha egbu mmadụ na mba ụwa.   Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche

Onye Igbo ọbụla kwesiri iji asụsụ ya na-eme ngala –Nworah

A DỤỌLA Ndị Igbo ọdụ ka ha were asụsụ ha kpọrọ ihe, jiri ya na-eme ngala, ma na-asụsikwa ya ike oge niile, dịka otu n’ime ụzọ a pụrụ isi wee chekwaba ya bụ asụsụ ka ọ ghara ịnwụ, ma nyefèkwa ya n’aka ọgbọ na-abịa abịa.   Onyeisi ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcasting Service’ bụ Maazị Uche Nworah bụ ya kpọrọ òkù a n’okwu ọ gwara Ka Ọ Dị Taa n’isi ụlọọrụ ya dị n’Ọka (Awka) banyere ụbọchị asụsụ ọdịnala na mba ụwa (International Mother Language Day) nke ahọ 2021, nakwa ọnọdụ asụsụ Igbo nọ na ya taa.   Dịka o siri kọwaa, ụbọchị ahụ bụ ụbọchị pụrụ iche e wepụtara iji merube asụsụ ọdịnala na ndị na-asụ asụsụ ọdịnala na mba ụwa gbaa gburugburu, ya na ịkọwa mkpà ọ dị ịkwàlite asụsụ ọdịnala. O kwuru na asụsụ bụ ‘isi a hụrụ kwaba okpu’ n’omenala obodo ọbụla, bụ nke mere o jiri dị mkpa ka agbụrụ ọbụla kwàdo, kwalite ma na-echekwaba nke ha oge niile, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fuo.   O kọwara na ámụmá ahụ òtù UNESCO buru sị na asụsụ Igbo ga-anwụ tupu ahọ 2050 bụ nke adabàghị adabà (n’agbanyeghị na ha

Emeela Kuryas onyeisi ndị uweojii n'Anambra

IGBO sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ.   N’ịgbasò nke a, CP Monday Bala Kuryas, fsi, awụchaala ma malite ọrụ na steeti Anambra dịka onyeisi ọhụrụ nke ndị uweojii na steeti ahụ, ma bụrụkwa onyeisi nke iri abụọ na iteghete steeti ahụ nwègoro, dịka onye jibụ ọkwa ahụ bụzị onye nke e buliri n’ọkwa dị elu ma wegazie ya n’ebe ọzọ.   N’okwu ya na mmemme mkparịtaụka mbụ ya na ndị nta akụkọ nwere n’isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n’Amawbia, CP Kuryas kelere AIG John Abang, bụ onyeisi ndị uweojii ahụ nke pụrụ àpụ na steeti ahụ na nsonso a, maka ezi agbambọ ya ime ka steeti Anambra bụrụ steeti kachara nwee ezi nchekwa n’ala Nigeria, dịka ọ dị taa.   Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe a gwagoro ya kacha echere ọnọdụ nchekwa aka mgba na steeti ahụ, nke gụnyere ohi, ịtọrọ mmadụ, otu nzuzo, ịma aka akpà, nsogbu ịzọ ókè ala, nsogbu ịzọ ọchịchị obodo, nsogbu ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo, tinyere nsogbo ndị ọzọ, ma mee ka a mara na ụlọọrụ uweojii steeti ahụ ga-aga n’ihu ịrụsi ọrụ ik

NAFDAC agwala ndị na-arụpụta mmiri ka ha soro ezi usoro maọbụ e mechie ha

ỤLỌỌRỤ na-ahụ banyere imepụta erimeri na ọgwụ n’ala anyị, National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) adọọla ụlọọrụ na-arụpụta mmiri aka na ntị ka ha gbasoro usoro ahụike e nyere ha, ma ha emeghị otu ahụ a machie ha ịrụpụta mmiri. NAFDAC, na ngwụcha izuụka ńụrụ iyi ịmachi ndị ọbụla na-arụpụta mmiri bụ ndị jụrụ ịgbaso usoro e wepụtara maka ịrụpụta mmiri.   Dịka o kwere nkwa njikọ aka otu dị iche iche iji hụ na e so ezi usoro arụpụta mmiri, onyeisi (Director General) NAFDAC bụ Ọkammụta Mojisola Adeyeye na nzukọ nke ya na ndị ọnụ ruru n’okwu na ndị na-arụpụta mmiri na Nigeria nwere kwuputara mkpa ọ dị ime ka ịrụpụta mmiri bụrụ ịgba.   Adeyeye rịọrọ ndị niile na-arụpụta mmiri bụ ndị bịara ọgbakọ ahụ ka ha gba mbọ ịhụ na ha na-agbaso usoro NAFDAC bụ nke e jiri nye ha ikike ịrụpụta mmiri oge nille.   Ọ kọwara na ọ bụ iwu na mmiri niile ga na-adaba n’usoro NAFDAC ma maa ọkwa na ụlọọrụ ahụ ga na-aga n’ihu n’ime njem nleta iji chọpụta ndị na-ada iwu ma na-enye ha ntara

Opekatampe mmadụ 15m na Nigeria na-ańụ ọgwụ ike – NDLEA

ỤLỌỌRỤ  National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) akọwaala na ọ bụ ịńụ ọgwụ ike  kpatara oke arụ a na-akpa na Nigeria, dịka ọ rụtụrụ aka na o pekatampe mmadụ dị nde iri na ise (15million) n’ọnụọgụ, ka ọ dị ugbu a, na-ańụ ọgwụ ike (illicit drugs).   Brig-Gen. Buba Marwa (Rtd) bụ onyeisioche ọhụrụ (Chairman/Chief Executive Officer) ụlọọrụ ahụ kwuputara nke a na Port Harcourt ka ọ gara njem na steeti Rivers.   Ọ kọwara na ala anyị na-aghasa n’ike n’ike n’ihi ịńụ ọgwụ ike ma rụtụ aka na arụ niile a na-akpa na-esite n’aka ndị na-ańụ ọgwụ ike.   O kwuru sị: “Iji egbe aga ohi, ntọrị, mwakpo, ịma nwaanyị elu n’ike tinyere ọtụtụ arụ ndị ọzọ bụ ndị na-ańụ ọgwụ ike na-eme ya. Onweghị onye ji uche ya ga-etinye aka n’arụ ndị a niile, ya mere ọ bụrụ na anyị ga-ekpochapụ ọgwụ ike arụrụ ala ga-ebelata n’ala anyị.”   Onyeisioche NDLEA ahụ gara n’ihu kwuo na mbọ niile a na-agba ịnwụchikọ na ijichi ọgwụ ọjọọ ndị a niile bụ iji belata ndị Nigeria inwete ya.   O kwukwara na mbọ ha na-agba gụnyere ịhụ na

A tụọla nwoke nga maka ire Akwụkwọ Nsọ adịgboroja

ỌKAIKPE ukwu bụ Justice F.O Riman nke ụlọikpe ukwu, Uyo, Steeti Akwa Ibom atụọla otu onye ji ego achụ nta ego (trader), Ugochukwu nga otu afọ  maka ire Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ adịgboroja, yaabụ ndị e bigharịrị ebigharị (piracy).   A mara Ugochukwu ikpe n’ọnọdụ ihe ọjọọ abụọ nke bụ ire ihe adịgboroja na inweta ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ n’aka ya.   N’oge ikpe ahụ, otu onye aka ebe, Martins Umoh bụ onye ọrụ nke Nigeria Copyright Commission gwara ụlọikpe ahụ na ụlọọrụ ahụ nwetara mkpesa site n’aka ndị nwe akwụkwọ ndị ahụ ‘copyright owners’ nke gụnyere Bible Society of Nigeria (BSN) wee na-ekwu na a na-ebipụta ma na-ere akwụkwọ ha n’ụzọ adịgboroja.   Umoh kọwara na dịka e nwetara mkpesa ahụ, na ya bụ ụlọọrụ malitere chọgharịba n’okpuru ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ were nwụchikọọ onye ahịa ahụ ma nweta akwụkwọ ọgụgụ e bigharịrị ebigharị dị narị ise, iri asaa na asatọ n’ọnụọgụ nke gụnyere Akwụkwọ Nsọ n’ọdụ ahịa ya dị n’Eket.   Onye akaebe ọzọ bụ Oluwafemi Akindele nke BSN gbakwara ama ma kwuo otu h

Ndị omeiwu Anambra gara leta ụlọ ezumeezu ICC a na-arụ n'Awka etoola etu o si aga

Image
ỤFỌDỤ ndị omeiwu steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee bàgide njem nleta n’ogige ebe ahụ a na-arụ ụlọ ezumezu mba ụwa n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ.   Njem ahụ, nke ọ bụ ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor duru ha wee bàgide, bụkwà nke ụfọdụ ndị dị iche iche selitere isi n’ọrụ gọọmentị n’ime steeti ahụ sonyere na ya.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Maazị Okafor gosipụtara afọ ojuju ya banyere etu ọrụ si aga n’ebe ahụ, ogoogo e ji arụ ya bụ ọrụ, nakwa ogoogo ụlọ ahụ nọ na ya ugbua, ma kọwaa na eserese na atụmatụ e jiri rụọ ya bụ ụlọ bụ ụdị nke a na-ahụta na mba ofesi.   Dịka ọ na-akpọpụtasị uru dị iche iche ya bụ ogige ga-ewebàta na steeti ahụ ma a rụchaa ya, ọ gara n’ihu mee ka a mara na nke ahụ ga-enyekwa aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe na steeti ahụ, kewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ ọtụtụ ohere ọrụ, ma kwalitekwa ọnụego na-abata n’akpa gọọmenti steeti ahụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-eweta.   O kwupụtara olileanya o nwere na a ga-arụcha ya bụ og

N'Enugu, dibia anwụọla n'ime ili ka ọ na-abọpụta ozu nwaanyị e liri afọ ise gara aga

DIBỊA a kpọtara ka ọ bọpụta ozu nwaanyị nwụrụ anwụ a siri na ndị di ya kpọrọ ya asị, ekoropụla ma nwụọ n’ime ili.   Dibịa ahụ aha ya bụ Idike Ezikanyi nke si Uwani-Amaogbo, Amabokwu n’Aku dị n’okpuru ọchịchị Igbo-Etiti na steeti Enugu ka e kwuru na ọ bụ di nwaanyị ahụ, Nnadi tinyere ndị ezinaụlọ ahụ ndị ọzọ kpọrọ ya ka ọ bịa rụọ ọrụ ahụ, nke bụ ịbọpụta nwunye Nnadi aha ya bụ Stella nwụrụ afọ ise gara aga ma bụrụ onye e liri na ngwuru be di ya.   Otu onye ọ nọ ka o mere gwara ndị ntaakụkọ na dibịa ahụ nọkatara tie mkpu n’ime ili ahụ, ma tupu ndị mmadụ enwee ike ime ihe ọbụla, ọ chọrọ ka ọ wụpụta n’ili ahụ ma dachighakwaa azụ n’ime ya, nwụọ ozigbo ahụ.   E kwuru na ezinaụlọ ahụ chọrọ ka a bọpụta ozu nwaanyị ahụ ma tufuo ya n’ajọ ọhịa ka e were nwee ike imechi mmụọ ya anya inye ndị bi n’ụlọ ọ rụrụ nsogbu. E kwukwara na ezinaụlọ ahụ kpọrọ nwaanyị ahụ onye nwere nsogbu n’ụkwụ asị dị egwu nke mere na ha jụrụ ka a lụọ ya n’ezinaụlọ ahụ ma nke ahụ enweghị isi n’ihi na Nnadi, onye nke dapeere n