Posts

Showing posts from September, 2020

Fada Udogu etoola Chineke ka o mere afọ iri abụọ na ise e chiri ya ụkọchukwu

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ụbọchị Satọdee gara aga ọnwa Septemba dịn’abali iri abụọ na isii, dịka Fada Anthony Nnaemeka Udogu tụụrụ Chineke mmammamaka afọ iri abụọ na ise e jiri chi ya ụkọchukwu. Ya bụ oke mmemme malitere na mgbede ụnyaahụ ya dịka ụkọchukwuahụ na ụmụaka parish ya, tinyere ndị ụkọchukwu ndị ọzọ, ndị enyi na ikwu na ibenọkọrịtara, rie ma ńụọkwa.   Ndị ukwe nke StJoseph The Worker Parish, UNIZIK Temp. Site, Awka, nọ ya wee were abụ dị icheiche too Chineke n’ebe ọ dị ukwuu. A gbakwara egwu ọdịnala, tinyere ihe ndị ọzọ.   N’aja maasị dị asọ ụbọchịemume ahụ kpọmkwem, Fada Udogu kelere Chineke onye mere ka ọ dị ndụ wee na-emeemume icheta afọ iri abụọ na ise e ji chie ya ụkọchukwu. O chefughị ndị niilenyeere ya aka n’ụzọ dị iche iche n’ọrụ ya dịka ụkọchukwu, tinyere ndị enyi yana ndị ụkọchukwu ya na ha gụkọrọ akwụkwọ bụ ndị lagoro mmụọ.   N’okwuchukwu yan’aja maasị ahụ, Fada Anthony Ezoke kọwara na echim ụkọchukwu bụ njem ịhụnanyadịka o kwuru na ọ bụ maka ịhụnanya Chineke hụrụ mmadụ ka

NAWOJ achịkọbala ihe ọmụmụ nkuzi maka ndị otu ha

ỤMỤNWAANYỊ ntaakụkọ, Nigeria Association of WomenJournalists (NAWOJ) nyere ndị otu ha nọ na steeti Anambra nkuzi na ọzụzụ abalịabụọ. Ọzụzụ a weere ọnọdụ n’ụlọezumezu (hall) ‘UNIZIK F.M, Professor ChinyereStella Okunna Legacy Building UNIZIK, Awka’. Ndị a bụ ndị mere ka ọzụzụ a ruondị otu ha ahụ, Stella Igboka bụ onyeisi, Ifeoma Obi na Ebere Eze.   Ndị otu ụmụnwaanyị ahụ sitere n’ụlọ ntaakụkọ dị iche iche bịara ị nara ọzụzụ ahụ. E nwere mmadụ abụọ ụmụnwaanyị ntaakụkọ e ji eme ọnụ bịara nye ndị ngalaba NAWOJ Anambra ọzụzụ a. Ha bụ Rafat Salami na Veronica Ogbole. Onye mbụ kuziri ihe bụ Veronica Ogbole, o kwuru maka ‘Equity and Equality’. Ọ sịrị na o kwesịrị ka a na-enye nwaanyị oke maka na nwa nwaanyị bụ nwa a mụrụ n’ezinaụlọ. Ka ụmụnwaanyị ndị ntaakụkọ lebaa anya ma hụ na ha na-ekwusi ike banyere nke a. Mgbe ọ kuzichara, ọ jụrụ ajụjụ, a sakwaa ya. O nwere ihe ngosi o jiri kpọrọ akọ na uche ụmụnwaanyị bịaruo na ihe ọ kuziri.   Onye nke abụọ bụRafat Salami kuziri maka oke ruuru ụmụnwaanyị

Egwu ndị Igbo: Egwu Indipenda

 EGWU Indipenda bụegwu ndị Igbo gụrụ mgbe Nigeria nwetara Indipenda. Dịka anyị maara, ndị Igbo jiihe niile na-eme na ndụ ha agụ egwu. Ya mere, n’afọ 1960 mgbe Nigeria nwereIndipenda, ha gụrụ ọtụtụ egwu ọṅụ. Ha na-agụ, ha a na-agba iji gosịpụta kpọmkwemna ihe ukwu mere. Ọmụmaatụ egwu indipenda bụ: 1960 Nigeria nwere indipenda N’ime oge ahụ anyị chịba onwe anyị Azikiwe, Micheal Okpala Jisienụ ike, ọ ga-adịrị ụnụ mma.

Ekele ndị Igbo, oge mbụ na ugbua

IHE ndị a wee bụrụ nnọọ nzuzu dị oke ọnụ ahịa n’ebe ọtụtụ ndịmmadụ nọ, ọkachasị ndị ntorobịa na ụmụ na-eto eto. Ụfọdụ n’ime ha hụkwuzie mmadụ,ha atụfuo ihu, maọbụ malite ịza oku ekwentị ndị mmụọ. Ekele n’ala Igbo n’ogeugbua bụzịkwa nchi tàá arụ, o wee tàá, maka na onye echetereghị ka o kèlee, ọgaghị ekele.   N’aka nke ọzọ, ikeleụfọdụ ndị okenye ekele ugbua bụzị iticha aka n’akpụkpụ ehi na ịgbasa mmirin’elu okwute, n’ihi na obi ọjọọ na ọnụma na-ekojuzịkwa obi ụfọdụ oge niile. Ekelee ha ekelee, ha araa ntị mmanụ ka ngwere aghọ, ọ bụrụ na e keleghị ha, ha achọbaonye ga-ebo ibu ọnụma. Ụfọdụ anaghịzịkwa ekweputa ekele ekweputa, ma ya fọdụzieiji obi ha kwe ekele. E kelee ha, ihe ha ga-ekwe bụ ‘mmn’, ma ọ bụrụrị na ha chọrọikwe ya bụ ekele ekwe.   Ngọzị anaghịzịkwaesokarịzị ekele dịka n’oge gboo maka na onye na-ekele ya ejighị obi ya ekele,ebe onye na-ekwe ekwe ejighịkwa obi ya ekwe. Ihe niile na-adazịkwanghata-nghata; nkọcha wee na-esozị ekele karịa ngọzị dịka ọ dị n’oge gboo.   Ugbua bụ oge

Ndị Nawgu eriela ji ọhụrụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodoNawgụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ a bụ 2020.   Na nkenke okwuchukwuya na mmemme ahụ, bụ nke a malitere site n’ịkà ụka obere oge, Ụkọchukwu EugeneAnowai mere ka a mara na ha na-akwanyere ji ùgwù dịka onyinye pụrụ iche sin’aka Chineke wee bịara mmadụ. Ọ kpọkuzịkwara ma kelee Chineke maka ezi ọrụ yan’obodo ahụ, ọbụnadị dịka o kpere ekpere wee kpọkwàsị ngọzị Chineke n’isi ụmụafọobodo ahụ, ma ọnọ n’ụlọ, ma ọnọ n’ụzọ ijè.   N’okwu nke ya oge ọna-awa ji n’óké mmemme iri ji ọhụụ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ na Nawgụ dị n’okpuruọchịchị Dunukọfịa nke steeti Anambra, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe IgweGeorge Okaa-Onwuogu kèlèrè Chineke maka ichekwaba ụmụafọ obodo ahụ malite n’ogeịkọ ọrụ ugbo wee ruo ugbua bụ oge owuwe ihe ubì.   O kpekwaara Chinekemaka ngọzị Ya n’isi ụmụafọ obodo Nawgụ nọ ebe dị iche iche ma kelekwa Ya n’ihiudo na-achị n’obodo ahụ, ma rịọ Ya ka ọ gaa n’ihu ichekwaba na ịgọzi ya bụobodo. Ọ gara n’ihu mee ka a mara na ir

Nri ndị Igbo: Ofe ọgbọnọ

OFE ọgbọnọ bụ otu ofe mmadụ nwere ike isi n’ihi na ọ hịaghịahụ isi. Mana ofe ọgbọnọ hịara ahụ maka na ị kpachaghị anya, ọ gbọọfuo n’ala.Ofe ọgbọnọ na-atọ ụtọ ma ị mara sie ya nke ọma.   Otu a ka e si esiofe ọgbọnọ: i weta ọgbọnọ ole ị chọrọ isi, ị suo ya n’ikwe maọbụ ị kwọọ yan’igwe e ji akwọ ihe ofe. I sinye okporoko, o ghee, I sinye anụ, o ghee, ị wụpụya. I gbanye mmiri ị ga-eji sie ofe, ọ gbọọ I tinye mmanụ, ose,nnu, magị, okpeyi, ịra na azụ mkpọ, I kwuchie ya. ọ gaa nkeji iri ị wụnye ọgbọnọahụ ị kwọrọ, I kpuchie ya mana ị ga-anọ nso maka ọ gbọọ ka ọ ghara iwufu n’ala.Ị ga-esi ọgbọnọ ahụ ka o ghee nke ọma.  Akwụkwọ nri ndị Inwere ike iji sie ọgbọnọ bụ nke a: onugu, ụgụ na ụzịza. I wunye azụ, okporokona kanda ahụ I sikọrọ na otu n’ime akwụkwọ nri ọbụla ị chọrọ iji sie ya, ọ gaaobere oge, i lee ma o gheela. O ghee, I were nri akpụ a sụrụ nke ọma maọbụ nrie sere ese nke ọma wee kebezie ya.

E liela Pa Okoye n'Azia

E MEELA mmemme akwamozu Ichie Chisata Simon Okoye n’obodo yadị n’Umudiokpara, Azia nke dị n’okpuru ọchịchị Ihiala, na steeti Anambra. Ya bụagụ nwoke bụ onye gbara ahọ iri asaa na abụọ. Maazị Okoye lụrụ nwunye ya bụLolo Christiana Uzochukwu Okoye, ma Chineke jiri ọmarịcha ụmụ asatọ wee gọzieha.   Ọ rụrụ ọrụ dịkannukwu onye enyemaka n’ihe gbasara ‘Infrastructural Development and Urban WaterProject’ n’oge Chinwoke Mbadinuju bụ Gọvanọ steeti Anambra n’oge gara aga.   Ọ rụkwara ọrụ dịkaonyeisi ụlọọrụ Niger Chemical Paint Manufacturing Company n’Ogbaru, n’imesteeti Anambra, tinyekwara ọtụtụ ọkwa dị iche iche o jiri, ma n’ụlọ ụka Katọlikn’ọchịchị obodo ya, na ebe ndị ọzọ.   N’ozi nkasiobi ya,onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra Newspaper and Printing Corporation (ANPC), Maazị ChukaNnabuife, onye du ndi ụlọọrụ ya wee gaa akwamozu gwara ezinụlọ Maazi Okoye kaha ruo uju dịka ndị nwere olileanya n’ime Chineke. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụmaka nwa ha nwoke bụ otu onye n’ime ndị na-arụ n’ụlọọrụ ahụ, bụ ASC Johnpau

Otu Keep Fit Sports Club, Awka emeela ịwa ji nke afọ 2020

… Mee mmadụ anọ ndị ọzọ nkwado omehala I JI gosi mkpa ọ dị ikwalite omenala Igbo, Keep Fit SportsClub bụ otu jikọrọ nwoke na nwaanyị ndị nwere mmasị n’ihe gbasaara mmegharị ahụmaka nkwalite ahụ ike emeela mmemme ịwa ji nke afọ a bụ nke achịkọbara n’ụlọihe mmemme (Event Center) dị n’ogige ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation, Awka.   Otu ahụ malitere mmemmeịwa jị a bụ nke ha na-eme kwa afọ site n’ịmegharị ahụ dịka ha si eme ya kwa izụụkaọbụla. N’okwu mmalite ya, onyeisi otu ahụ ma bụrụkwa onyeisi n’ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation bụ Maazị Chuka Nnabuife kọwara otuKeep Fit Sports Club dịka otu na-emesi ihe ike. O kwuru na ya bụ otu na-agbakọbana ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka kwa ụbọchị Satọde, Wenezide nakwa ụbọchịezumike (public holiday) ọbụla, ma rịọ ka onye ọbụla nwere mmasị na ihe gbasaraegwuregwu mmegharị ahụ bịa ma debanye aha ya ma sonyere ha n’otu ahụ. Ọ gakwazịrị na ihụ kọwaa na mmemme iri ji ọhụụ bụ ihe hana-eme kwa afọ ọbụla ma bụrụ nke n

Di na nwunye ehuola nwa ahọ asatọ mmiri ọkụ maka ịracha nri nwa ha

IGBO sị na ajọ mmadụ ka ajọ mmụọ dị njọ, ma sịkwa na ihe ọjọọso chi efo.   Ka ọ dị taa, otunwoke, bụ Maazị Emmanuel Anichukwu na nwunye ya bụ Oriakụ Ogochukwu Anichukwu nọrọna nsonso a wee gosipụta na obi tàrà ha mmiri, site n’ihu otu nwatakịrị nwaanyịha na ya bi mmiri ọkụ ma merụsịa ya ahụ, maka na ha kwuru na ọ rachàrà mịụlkụ(milk) nwa ha.   Di na nwunye a ka ekwuru na nke nwoke bụ onye Enugu steeti, ebe nke nwaanyị bụ onye obodo Ndikeliọnwụdị na steeti Anambra, ma na ha bi na Nanka dị n’okpuru ọchịchị ‘Orumba North’nke steeti Anambra, ebe ha na nwatakịrị ahụ bì dịka onye enyemaka ha. Nwatanwaanyị ahụ bụ onye a maara aha ya dịka Mma, ma bụrụkwa onye gbara naanị ahọasatọ.   Dịka onye ọnọ mgbe omere siri kọọ, dị na nwunye a na-apịa nwatakịrị ahụ ụtarị oge niile, na-enye yantaramahụhụ karịrị ya, ma na-ebubekwa ya ọnụ nri oge niile, nke mezịrị ka nwataahụ na-aracha aja, ma na-erikwa ihe a tụfuru atụfù oge ụfọdụ.   Na nke ikpeazụ a, dina nwunye ahụ jiri ụtarị pịa nwata ahụ tọọtọọ ma huo y

Aka akparala mmadụ atọ na Sri Lanka maka igbu ọdụm

NDỊ uweojii Sri Lanka anwụchịkọọla mmadụ atọ maka ijide magbuo ọdụm (leopard) ma na-achọ iri anụ yam aka iji ya gwọọ ọrịa ụkwara ụme ọkụ(asthma).   A nwụchịkọrọ mmadụatọ ndị ahụ n’ụlọ ha ka a gbaara ndịuweojii ama na ha ji ụzọ dị aghaa (snare)wee mata anụ ahụ.   Onyeisi, ChiefInspector Dushantha gwara ndị ntaakụkọ sị: “Ha bepụrụ isi anụmanụ ahụ ma gbuoya dịka ha ratara ya.”   O kwuru sị na ndị ahụa na-enyo enyo atụfuola isi odu m ahụ n’ọhịa ma wepu ozu ya maka ire ahụ ya, anụya na akụkụ ahụ ndị ọzọ.   Kangara kọwara na enwere nkwenye na anụ ahụ nwere ike ịgwọ ọrịa ụkwara ume ọkụ.   Odum e nwere na SriLanka agaghị eru otu puku n’ọnụọgụ, dịka ha siri kwenye. Ya mere, onye ọbụla merụrụ anụmanụ ahụ ahụ ga-enwetantaramahụhụ ihe ruru nga afọ ise.

Ejiji ndị ala anyị n'afọ 1960 na nke oge ugbua

N’OGE mbụ, oge Nigeria nweereonwe ha n’afọ 1960, enwereejiji e jirimara ndị alaanyị. Ị hụonye Igbo ị mara, otu ahụka ọ dịkwan’ebendị Hausa na Yoruba naagbụrụ ndị ọzọnọ.   Ejijinwaikorobịana-adịichenankennammadụ, tinyekwara nke agbọghọbịa na nne nwaanyị.   Site n’akwammadụyin’ahụwee ruon’ụkwụ, ị ga-ama ebe onye si naihe ọ bụ. Mana taa ihe agbanwoola, ọnọdụadịghịkwa ka ọ dị na mbụ, a maghịzi onye bụ onye. Agbụrụ dị iche iche na-ejiziejiji otu o siri masị ha.   N’akụkụ ụmụnwoke,anaghị amazị nna mmadụ n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-eyizi akwa ụmụikorobịa. Ọtụtụụmụnwoke na-etezi ihe n’isi, ọtụtụ na-akpa nke ha akpa, ebe ndị ọzọ na-akwụzịiyeri ntị w.d.g.   Ụmụnwaanyị, ma agbọghọma nne nwaanyị na-eyizi traụza n’eleghị anya n’azụ. Ha na-akwụnye mbọ aka, ikuanya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ịma ọgọdọ ukwu abụọ bụ ihe e ji mara ụmụnwaanyị ndịIgbo. N’oge ahụ nwaanyị lụọ di, o bido mawa ukwu akwa abụọ nke bụ na onye ọbụlahụrụ ya ga-ama na ọ lụọla di; ma taa, ekwe akụtaghị onye ala ji. Ajụjụ wee bụrụ:ụmụnwaan

N'Anambra, mmadụ anọ anwụọla n'ihe mberede okporo ụzọ

Ọ BỤ ihe anyammiri na ihe ịkwa akwa, dịka mmadụ anọ zutèrè ọnwụike ụbọchị Mọnde n’ihe mberede dapụtàrà na steeti Anambra.   N’ozi ọ kụpụrụbanyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ ‘Federal Road SafetyCorps, FRSC’ (ngalaba steeti Anambra), bụ Maazị Kamal Musa mèrè ka a mara naihe mberede okporo ụzọ ahụ bụ nke mere n’Obosi dị n’akụkụ Ọnịshà na mpaghara ụzọahụ siri Obosi gaa Owerri.   Ọ kọwara na ihemberede ahụ dapụtàrà n’ihi ngharịpụ ihe e ji akwụsị ụgbọala bụ breeki (brake),ma bụrụkwa nke dapụtara n’etiti ụgbọala 911 M/Benz nwéré akàrà JJT 168 XG, ụgbọalaToyota Camry nwéré akàrà FST 122 DQ, na ụgbọala ‘Toyota Hiace’ nwere akàrà ABN430 YN. Ihe mberede okporo ụzọ ahụ metụtàrà mmadụ iri na atọ (nwokeasatọ na nwaanyị ise), mana mmadụ anọ n’ime ha nwụrụ n’ihe mberede ahụ, ebemmadụ anọ n’ime ha (nwoke abụọ na nwaanyị abụọ) nwètàkwàrà ihe mmerụahụ n’ụdị dịiche iche.   Ndị ọrụ FRSC sitere Ọraifitewee gbata ọsọ bùùrù ndị ahụ nwetara mmerụahụ wee gaa ụlọọgwụ ‘Unit HospitalObosi’, ma dọ

Na Cross River, otu nwoke agbagbuola nwunye ya, kwụọ ụdọ

OTU nwoke aha ya bụ Akpan agbagbuola nwunye ya ma kwụọ ụdọna steeti Cross River. E kwuru na ọ kpara arụ ahụ n’ihi na ọ na-ebo nwunye yaebubo na ọ na-agba n’iro.   Mkpamkpa ahụ kparana Bashua nke dị n’okpuru ọchịchị Boki na steeti ahụ ebe nwoke ahụ na nwunye yandị nke bụ ndị steeti Awka Ibom bi wee na-arụ ọrụugbo.   Otu onye bi n’ogbeahụ aha ya bụ Elias Ejue gwara ndị ntaakụkọ na di na nwunye ahụ nwere nghọtahien’ihi na nke nwoke na-ebo nwunye ya ebubo ịgba n’iro nke butere iwe, nwoke ahụbara wepụta egbe ya, gbaa nwunye ya ọ nwụọ ozugbo ebe ahụ.   Ọ gara n’ihu kwuo sị:“Dịka o gbuchara nwunye ya, nwoke ahụ gbabara n’ime ọhịa, anyị wee chịkọba ndịmmadụ wee chọba ya kemgbe Satọdee. Ọ bụ na Monde ka anyị hụrụ ozu ya ka o koron’elu otu osisi dị n’ime ọhịa.”   Ọ kọwara na nwoke ahụna nwunye ya ebiela ọtụtụ afọ n’obodo ahụ, na ha mụtara ụmụnwoke ise tupu ọdachiahụ adapụta. Ọ rụtụkwara aka na ọ bụ arụ (nsọala) mmadụ igbu mmadụ ibe ya maọbụgbuo onwe ya, n’obodo ahụ.   Ọ gakwara n’ihu kwuosị: “Ot

Ndị uweojii akpụgharịala ndịnkuzi iri na asaa maka igwu ojoro n'ule

ISI ụlọọrụ ndịuweojii The Police Force Headquarters Abujaakpụgharịala ndịnkuzi iri na asaa maka igwu ojoro n’ule Ọgọstụ/Septemba WestAfrican Examination Council (WAEC).   Ndị ahụ a nwụchịkọrọbụ ndị gụnyere ndịisi ụlọakwụkwọ (principals) bụ na steeti ha dị iche iche ka anwụchikọrị ha – Bauchi, Kano, Nassarawa na Rivers.   Dịka ọ na-akpụgharịndịnkuzi ahụ, Mba kọwara na WAEC na ndịuweojii jikọrọ aka ọnụ iji hụ na ule ahụga-akwụ chim chim dịka o kwesịrị.   Ya mere, ọ garan’ihu kwuo na ọ bụ n’ihi ya mere na ha jikọtara ọnụ wee gbasie mbọ ike n’uleWAEC a gara aga iji jide ndị niile na-egwu ojoro n’ule, tinyere ndị na-akwadoya n’ụdị ọbụla n’ala anyị.   O kwuru sị; “Ọ bụn’ihi mkpebi ọhụrụ a na njikọ aka a ka anyị ji egosi ụnụ taa, mmadụ iri na asaaa nwụchịkọrọ site na mpaghara dị iche iche n’ala anyị.”   Ọ gbarụrụ ihu n’ihina ọ bụ ndịe nyere ọzụzụ, nye ha ọrụ ma na-akwụ ha ụgwọ ka ha na-akwalite mmụtana-akpa arụ ahụ, yaabụ ndịnkuzi.   Ọ gara n’ihu kwuosite n’ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ndị gụnye

Onye omeiwu Anambra, Okafor arụgharịarala nwaanyị ajadụ ụlọ ya ọkụ gbara na Nnewi

OMERE nwaogbenye na-emere Chi kere ya, maka na ọrụ ọbụlawèrè ụgwọ so ya.   Ọ bụ n’ịgbasò nke aka onye omeiwu ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi North’ n’ụlọ ọgbakọomeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Nonso Okafor jiri rụzigharịa ma dozigharịaraotu nwaanyị ajadụ ụlọ ya dakpọsịrị adàkpọdị n’Umuzu Mbana, Otolo Nnewi. Ya bụ ụlọnwéré ime ụlọ anọ a rụzigharịrị ọhụụ bụ nke a gbàpèrè, nyefèé ya n’aka nwaanyịàjàdụ ahụ na nsonso a; ma bụrụkwa nke a gbapegidere ya na ụlọ mposi na ogigeebe a na-asa ahụ.   N’okwu ya oge ọna-agbape ụlọ ahụ, onye omeiwu ahụ, bụ Maazị Okafor kọwàrà nke ahụ dịka otun’ime ụzọ o si eme ka ihu ọchị waa ndị ọ na-anọchite anya ha n’ụlụ omeiwusteeti ahụ, na-eme ka ọnọdụ dịrị ha mma, ma na-ewètekwara ha èrèrè ọchịchị onyekwuo uche ya.   O mere ka a mara na ọnọrọ n’abalị iteghete nke ọnwa Julaị ahọ a wee nweta ozi na ụlọ ótù nwaanyịajadụ, bụ Oriakụ Eberechukwu Igwilo na-agba ọkụ n’Umuzu Mbana dị n’Otolo Nnewi.O kwuru ọ bụ ezie na ndị àgbataobi nwaanyị ajadụ ahụ nyèèrè ya a

A gbapeela ògigè ihe banyere akụkọ ntọala na omenala Igbo n'Umueri

A KỌWAALA mkpà ọ dị ịkwalite nà ime nchọcha n’ihe bànyere akụkọntọala na omenala Igbo, iji chekwaba ha maka ụmụ na-eto eto na ọgbọ na-abịa n’ọdịnihu,ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ kwàlite mmepe obodo.   Eze ọdịnala obodo Ụmụeri,bụ Igwe Benneth Emeka bụ ya kwupụtàrà nke a na mmemme ịgbape ògìgè nchọchabanyere akụkọ ntọala na omenala Igbo a rụrụ ọhụụ n’obodo Ụmụeri, dị n’okpuru ọchịchị‘Anambra East’. Nnukwu mmemme ịgbape ụlọ ahụ bụkwa nke a nọrọ na ya wee guzobendị òtù ọrụ nlekọta ogige ahụ, bụ ndị ọ ga-abụ ọrụ ha ịhàzì nchọchà n’ihebanyere akụkọ ntọala na omenala Igbo nakwa ihe ọnatarachi dị iche iche obodo ọbụladị n’ala Igbo nwèrè.   N’okwu ya oge ọna-agbape ogige ahụ, Igwe Emeka rụtụrụ aka bànyere etu e siri rụọ ya bụ ụlọ,mee ka a mara na obodo Ụmụeri so n’obodo selitere isi n’ihe gbasaara akụkọ ntọalaIgbo, ma kpọkuzie ụmụafọ obodo ahụ ka ha kwàdo ogigè ahụ na òtù ọrụ nlekọta ahụe guzobere ọhụụ, iji rụọ ọrụ chere ha n’ihu ma mezùpụtakwa ebumnobi e jiriguzobe ha.   Igwe Ụmụeri gakwaran’i

Echiche ndị mmadụ ka Nigeria gbara afọ iri isii

Ala Nigeria agbaala afọ iri isii o jiri nwere onwe ya. Ọ bụ ka ọnwa Oktoba dị n’abalị nke mbụ n’afọ 1960 ka o mere. N’ihi nke a, onye ntaakụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ụfọdụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ịmata uche ha banyere ọgbụgbá afo iri isii ala Nigeria. Otu a ka o siri ga: JUDE Emecheta: Anyị agbaala afọ iri isii ma ụkwụ esichabeghịanyị ike. Anyị ga-eru ebe ahụ n’ihi na dịka anyị dara, anyị na-agba mbọ dị egwuikulite.   Mmanụ, nke dị n’alaanyị mere ka anyị ghara ịmakwa ihe anyị kwesịrị ime, anyị were hapụzie ebe mbụanyị si enweta ego, nke bụ ọrụugbo. N’oge ahụ, dịka ndị ‘West’ na-akọ koko,‘East’ bụ mmanụ-nri (palm oil), ebe ‘North’ na-akọ kọtịn na osikapa; ngalaba‘region’ niile nọ na-eme nke ọma.   Ya mere, oge anyịenwetechazighị ihe anyị chọrọ na mmanụ, o wechighara anyị azụ, mana ekene dịrịChukwu na anyị amụrụla akọ, ugbu a anyị na-alaghachi ebe anyị nọbu, nke bụ ọrụugbo,ka anyị were hapụ ịdabere sọọsọ na mmanụ. Obi dị m ańụrị na a kwụsila ịkwụbilataụgwọ mmanụ ụgbọala (fuel subsidy).

Onye nwụrụ anwụ emeriela na nhọpụta ọchịchị e mere na Romania

OTU nwoke na-azọ ọkwa Mayọ na Southern Romania aha ya bụ IonAliman, onye nke nwụrụ n’ihi ọrịa korona eturula ugo dịka imirikiti ndị mmadụ tụụruya akwụkwọ ka ọ chịrị ha na-aga.   Ion Aliman, onye otundọrọndọrọ ọchịchị Romania’s Social Democratic Party (RSD) bụ onye na-azọ ọkwaMayọ nke Deveselu maka agba nke ugboro atọ nwetara mmeri site n’inwe imirikitivootu.   Ndịisi Romania e wepụghịaha Aliman na balọọt (ballots) ka ọnwụchara na Septemba 15 n’isi obodo ahụ bụBucharest. Ya mere, ha kọwara na a ga-emegharị nhọpụta ọzọ n’ebe ahụ.   Ihe onyoonyoo ọnyanwudude(social media) gosịrị ebe ọtụtụ ndị obodo ahụ gbara ili nwoke ahụ bụ Alimanokirikiri.   Otu onye obodo ahụgwara ndị ntaakụkọ sị: “O mere ndị obodo anyị nke ọma ma sọpụrụ iwu niile.Echeghị m na anyị ga-ahụ Mayọ ọzọ ga-adị ka ya.”

Obianọ enyela ndị eze ọhụrụ abụọ akwụkwọ ikike

Ọ NA-ADỊ mma a kpụọ djii, a kpụnye ya óké ji n’aka, maka naa nyụchaa nsị a kapịàghị ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò.   Oke ọñụ dàrà nansonso a dịka aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyèrè eze ọdịnalaọhụụ abụọ asambodo, iji malite ọrụ n’ozuzu òkè dịka ndị ndu obodo ha dị icheiche. Ndị eze ọdịnala ọhụụ abụọ ahụ e nyere asambodo bụ Igwe Lawrence Nwafia,onye e nyere asambodo ịbụ eze ọdịnala Ezi-Agulu-Otu Aguleri, na Igwe JohnsonMbanefo, onye e nyere asambodo ịbụ eze ọdịnala Mkpunando Aguleri.   Iguzobe ndị a dịkandị eze ọdịnala ọhụụ obodo ha dị iche iche, bụ nke bịara dịka ndị obodo ahụ chụtùchàràeze ọdịnala ha ndị nọbụ anọ n’ọkwa ahụ, mgbe gọọmenti steeti Anambra nyèchàràha na ụfọdụ eze ọdịnala ndị ọzọ oche azụ, site n’ịsị ha sepùgodi aka n’ọrụ,n’ihi ihe ezighị ezi ha mere.   N’okwu ya oge ọna-enyefe ha àsàmbodo ahụ na mmemme ahụ weere ọnọdụ n’Amawbịa, Gọvanọ Obianọ kọwàràomenala Igbo, ọdịnala Igbo, na ọdịbendị dịka ihe dị ezi mkpa na nke bakwara urùnke ukwuu, ma kwupụta mkpa ọ dị

Nigeria agbàála ahọ iri isii

IGBO sị na nwa puru eze abụghịzị nwata, maka na ọ na-abụ ihegbàá ahọ, ọ gbanye mgbọrọgwụ.   Taa ka ala Nigeriana-emerùbe mmemme ncheta ọgbụgba ahọ iri isii o jiri nwere onwe ya pụọ n’aka ọchịchịndị ọcha, n’ahọ 1960. Ala Nigeria, dịka akụkọ ntọala ya siri dị, bụ ala dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Africa, ma bụrụkwa nke ndị bi n’ime ya bibụ ichè iche, wee ruo mgbe ndị ọcha bàtàrà n’ahọ 1901 ịchị ha bụ ndị bi na mpaghara ahụ. Tupu oge ahụ, ndị ahụ na-azagasị aha dị iche iche, nọọrọ onwe ha ma nwekwa ndị ọchịchị nke ha, wee ruo mgbe ahụ ndị ọcha bịara. Ndị ọcha kèkọtàra ebe ahụ niile ka ọ dịzie mpaghara abụọ — mpaghara mgbago ugwu na mpaghara ndịdà anyanwụ.   Ka o ruru n’ahọ1914, ha chịkọrọ mpaghara abụọ ahụ ọnụ ka ha bụrụzie otu mbà; ha wee kpọọ ahaya ‘Nigeria’. Nke a bụ nke e mere site n’aka Gọvanọ mbụ chịrị ala ahụ, bụ MaazịLord Lugard.   Ka nke ahụ gachara, ụfọdụ ndị ọzọ jiri ọkwa ọchịchị ahụ bụcha ndị ọcha, wee ruo oge ala Nigeria nwèère onwe ya pụọ n’aka ọchịchị ndị ọcha. Ndị ahụ gụnyè

Gọọmenti Delta enyela ndịnkuzi 41 ntaramahụhụ maka igwu ojoro n'ule WASSCE

GỌỌMENTỊ steeti Delta enyela ndịnkuzi iri anọ na otuntaramahụhụ maka igwu ojoro n’ule 2019 West African Senior School CertificateExamination (WASSCE).   A ga-egbochi ha inwembuli elu n’ọkwa n’ime otu afọ ma gbochikwaa ha iso lekọta (supervision) uleakwụkwọ ọbụla n’ime afọ atọ.   Mkpebi ndị ahụ bụ ndịe nwetara site na ntụziaka ndị na-ahụ maka ule na steeti ahụ, ExaminationEthics Disciplinary Committee, ma bụrụ nke kọmishọna mmụta, Commissioner forBasic and Secondary Education, na steeti ahụ Maazị Patrick Ubah nyere nkwadoya.   Dịka e nyere ndịnkụziahụ gwuru ojoro ntaramahụhụ, a ga-enye otu onyenkụzi, Maazị P.O Okolo leta makaime nke ọma (Letter of Commendation) maka ọrụ ọma ya n’ule ahụ.   N’otu aka ahụkwa, aga-enye ndịisi ụlọakwụkwọ na ndị na-ahụ maka ule n’ụlọakwụkwọ gọọmenti iri naatọ na otu ụlọakwụkwọ nke onwe (private school) bụ ebe ndị a hụtara igwu ojoroule leta ịdọ aka na ntị site n’aka PPEB.   A ga-enyekwaAnointed Secondary School, Ubogo, n’okpuru ọchịchị Udi bụ nke e mechiri n

Oriakụ Obiano ekeleela Ezeajughi maka idu ya n'iyi ọrụ dịka Meyọ nke Brent London, agba nke abụọ

NWUNYE Gọvanọ na-achị steeti Anambra ma bụrụkwa onye hibereCaring Family Enhancement Initiative (CAFÉ), Dọkịnta Oriakụ Ebelechukwu Obianoekeleela Meyọ nke London Borough of Brent, London, UK bụ Kanselọ Ernest Ezeajughidịka e dukwara ya n’iyi ọrụ agba nke abụọ.   N’edemede leta nke ozigara n’ofiisi Meyọ ahụ, Dọkịnta Obiano toro odogwu nwoke ahụ maka ya bụ okemmemme nke ọ kọwara ka nke gọsịpụtara ezi mbọ ya na kansụl nke Brent tinyereobodo, n’ime otu afọ gara aga.   O kelere Ezeajughin’aha ụmụnwaanyị Anambra niile, CAFÉ na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ọ kachasị ndịna-arịa ọrịa nńụ ọbara (sickle cell) na steeti Anambra.   Osodieme kwuwapụtarana ya nwere ntụkwasa obi na Ezeajughi ga-eme karịa ka o mere na mbụ n’obodoBrent, ma gaa n’ihu kwe ya nkwa nkwado na ekpere maka ọganihu ya oge niile.   Ka anyị cheta naOriakụ Obiano bụ onye ọbịa pụrụ iche na Mee 1, 2019, na nzuko ome n’afọ nkekansụl Brent (Brent Council’s Annual General Meeting) tinyere echichi meyọ, ogee yinyere Kanselọ Ezeajughi akwa dịka

Ụkọchukwu katọlik eturula ugo dịka ọkaikpe ukwu na Ghana

OTU n’ime ndịọkaikpe ukwu (High Court Judge) iri na isii nkeonyeisiala mba Ghana Akufo-Addo guzobere n’izuụka gara aga bụ ụkọchukwu katọlik.   Rev Fr. Joseph AuduOwusu-Agyemang atọọla ntọala na Ghana site n’ịbụ ụkọchukwu izizi bụ onyeọkaikpeukwu.   Ọ bụ eziokwu na enwere ndị okpe ikpe (lawyers) bụ ụkọchukwu na mba Ghana ma o nwebeghị onyen’ime ha bụ ọkaikpe ukwu. Fr Joseph Adu Owusu-Agymang bụ ụkọchukwu parish nkeAll Saints Catholic Church, Santasi Fankyenebra na Achịdayọsis Kumasi.   Achịbisọpụ PeterAkwasi Sarpong chiri ya ụkọchukwu ka ọnwa Julaị dị n’abalị iri na anọ, n’afọ2007. Tutuu ruo n’ọkwa ọhụrụ a e nyere ya, ọ na-arụ ọrụ na ngalaba na-ahụbanyere ikpe na Archịdayọsis ahụ.   Ya na mmadụ iri naise ndị ọzọ ka onyeisiala ahụ, Akufo Addo duru n’iyi ọrụ dịka ndị ọkaikpe ukwuna mba ahụ. Ọ kpọkuru ha ka ha mata ọrụ dịịrị ha dịka ndị ọkaikpe ukwu ma dọọha aka na ntị ka ha jidesie eziokwu, mgbazi na mkwudosi ike n’ọrụ ha ka ndịGhana wee nwee ntụkwasa obi n’ihe gbasara ikpe (judiciary).  

Egwu ndị Igbo: Egwu ọńụ nwa

NWA bụ nnukwu ihe ọṅụ n’ụwa niile gbaa gburugburu. Ya mere,ndị Igbo n’akụkụ nke ha na-anabata nwa n’ụzọ dị egwu.   Ọ bụ ụmụnwaanyịna-agụkarị egwu mgbe ọbụla nwaanyị ibe ha mụrụ nwa ọhụrụ. Ọ na-abụ ihe oke ọṅụmgbe ọbụla nwaanyị mụrụ nwa n’udo n’ihi na mgbe ụfọdụ a na-ewere nwaanyị dị imedịka nwoke rịrị elu, amaghị ma ọ ga-arịtu n’udo. Ọ bụ n’ihi nke a ka o ji bụrụihe oke ọṅụ mgbe ọbụla nwaanyị mụrụ nwa n’udo.   Ebe ụfọdụ,ha na-etepọụda n’ahụ, na-agụ egwu na-agba na be onye ahụ mụrụ nwa ọhụrụ. Onye ọbụla nụrụka a na-agụ egwu ọṅụ nwa na-agbata sonye n’ọṅụ ahụ, tee pọụda, sonye n’egwun’egbughi oge ọbụla.   Egwu ọṅụ nwa na-amasịonye ọbụla, tinyere ụmụnwoke na ụmụaka. Ọmụmaatụ egwu ọṅụ nwa: Ọ nụrụ akwa nwa  eeaaee Ọ nụrụ akwa nwa me ngwa ngwa Ọbụdị ofu onye nwe nwa.

Nri ndị Igbo: Ụkpọ ogede

NdỊ Igbo nwere ọtụtụ ihe oriri mara mma ma nsogbu e nweren’oge a bụ nganga na ngana. Ụfọdụ chechaa otu ha ga-esi kwado nri ndị a ana-ekwu maka ya, ha agaa goro nri a na-ere n’akụkụ ụzọ. Ma onye ọ bụla dị uchuga na-agba mbọ ka o jiri aka ya siere ezinaụlọ ya ihe oriri ndị a na-ekwu makaha.   Ọ dị mkpa na onyeIgbo ọbụla ga na-esi nri ndị Igbo o pekata mpe ugboro abụọ n’izuụka.   Na nke taa, anyịga-eleba anya n’otu e si esi nakwa ka e si akwado ụkpọ ogede. Ụzọ ihe abụọ ka eji esi ụkpọ ogede. Nke mbụ, ị weta ọka a kwọrọ akwọ (corn flour), ị wụnye yan’ihe ị ga-eji gwọkọ ya, ị gbanye mmanụ n’ọka ahụ ị gwọkọba ya na mmanụ ahụ nkeọma, i weta ojoko chara acha, i wepụ azụ ya wụnye ya n’ikwe kwọrie ya nke ọma, ịkọrọ ya tinye n’ime ọka ahụ ị gwọkọrọ malite gwọkọọ ha abụọ ọnụ. Mgbe ha abụọ bụụrụ otu, i tinye nnu, ose,yabasii, ịra, ị malite gwọkọchaa ya, ị gbanye mmiri dị ńara ńara.   Cheta na mmiri agaghịakarị ya ka o wee kwe nkechi. I weta akwụkwọ unere ị ńara n’ọkụ, i dozichaa yamalite na-akọnye

Ekele n'ala Igbo, oge mbụ na oge ugbua

NDỊ Igbo sị na ọ na-abụ e kwe ekele, ihu asaa, ma sịkwa naekele e kweghị ekwe dapụụrụ mmụọ onye kelere ya. Onye chọrọ ịma ga-ajụzị, sị ‘Ọ bụ gịnị bụ ekele?’   Ekele bụ bụ ime óbìe gosipụtàrà n’elu ọnụ, ma bụrụkwa echiche óbì e mepụtàrà n’omume. Nke a pụtarana ekele bụ ụzọ mmadụ si ekwupụta maọbụ egosipụta ka obi dị ya nyegara mmadụibe ya, mmụọ maọbụ Chi kere ya. Ọ bụ ime obi e gosipụtara n’elu ọnụ, ma bụrụkwaechiche e mepụtara n’omume.   Ekele pụtara ọtụtụihe n’ebe ọtụtụ ndị nọ n’ihi na ọ bụ ezie na uche bụ uche, mana nghọta dị icheiche. Ndị ọbụla nwèrè ụzọ dị iche iche ha si ekele ekele maka na nkụ dị na mbana-eghere mba nri. Ọ bụkwa ihe ndị na-aghọta ka ha na-asụ. Ekele ndị ọbụlana-agbakwasịkwa ụkwụ n’asụsụ ha n’ihi na ekele niile nwere ụsà. Onye aghọtaghịkwaihe e kelere ya apụghị ikwe ekele ahụ, maka na mmadụ abụghị oke ngwere na-ekwen’isi nye ihe ọbụla ọ nụrụ; ma nke a gwara ya ma nke a gwaghị ya, maọbụ ma nke ọghọtara ma nke ọ ghọtaghị.   Nke a pụtara na ndịIgbo, ndị Hausa, ndị Yo

Na Bauchi, otu nwoke eliela nwa nwa ya a mụrụ ọhụrụ na ndụ

A NWỤCHIKỌỌLA otu nwoke gbara afọ iri ise na steeti Bauchimaka ili nwa nwa ya a mụrụ ọhụrụ (day-old) na ndụ. Ya bụ ihe mere na RiminZayam n’okpuru ọchịchị Toro.   Dịka okwupụta okwundịuweojii na steeti ahụ, Ahmed Wakil siri kwu, nwa nwoke ahụ bụ nwaanyị dị afọiri na asaa, Hafasat Bawanda mụrụ nwa ahụ, kpesaara ndị ọrụ uweojii na nna yaBawanda Audu napụrụ ya nwa nwoke ọ mụrụ ọhụrụ, ga lie ya n’azụ ụlọ ya.   Ya mere, dịka ndịuweojiinwetara mkpesa ahụ, ha gara ozugbo bọọ ozu nwata ahụ ma buru ya gaa ụlọọgwụ ọhana eze ebe dibịa oyibo nọrọ kwuo na ọ nwụọla.   Hafsat kọwara na otu nwoke aha ya bụ DanjumaMalam Uba, onye amaghị ebe ọ nọ ugbu a tụbara ya ime na mmalite afọ a bụ 2020.  Otu o sila dị, ahafeela ozu nwata ahụ n’aka onyeisi obodo ahụ maka olili, ma nwụchịkọọ nwoke ahụkpara arụ.

Ndị uweojii Anambra ejidela mmadụ atọ maka ịtọrọ ótù nwaagbọghọ

N’ỊGA n’ihu n’ibusò mpụ agha, ndị uweojii steeti Anambra nọrọna nsonso a wee nwụchie ụmụokorobịa atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ntọrị mmadụ.   Dịka ozi a kụpụrụsite n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụSP Haruna Mohammed siri kọwaa, mmadụ atọ ahụ bụ ndị a nwụchiri site n’akangalaba ọrụ uweojii pụrụ iche a maara dịka ‘Special Anti Robbery Squad (SARS)’,ma bụrụkwa ndị e jidere maka ịtọrọ otu nwata nwaanyị gbara ahọ iri abụọ na anọn’Awkuzu site n’iduhie ya n’ụdị na ha chọrọ inye ya ọrụ.   O kwuru na mmadụ atọahọ bụ Maazị Ekwugha Innocent Chinazo (gbara ahọ iri abụọ na ise, ma bụrụkwaonye Awkuzu dị n’okpuru ọchịchị Oyi); Maazị Chidiebere Ogoegbunam (gbara ahọiri abụọ na anọ, ma bụrụkwa onye Egbu Awkụzụ); na Maazị David Nnaemeka (gbaraahọ iri abụọ na anọ, ma bụrụkwa onye Egbu Awkụzụ). Ọ sị na ndị ahụ nọrọ n’abalị iri na atọ nke ọnwa Septemba awee duhìé ótù nwaagbọghọbịa gbara ahọ iri abụọ na anọ (bi na mpaghara Temp.Site dị n’Awka), gwa ya na o nwèrè ọrụ

N'Abakaliki, onye ara ejirila osisi kụgbuo onye ọgbatumtum

NDỊ mmadụ nọ na nwute n’ihi na onye ara kụgburu onye ọgbatumtum(ọkada),n’Abakaliki, isi steeti Ebonyi.   A kọwara na onye ahụlara mmụọ, Maazị Elias Ofoke, bụ onye Agbaja Unuhu n’okpuru ọchịchị Abakalikika onye ara ahụ kụgburu ka ọ kwụsịchara mmadụ n’akụkụ ebe ọ nọ.   Onye ara ahụ ka ekwuru na ọ bụ kemgbe izuụka abụọ gara aga ka o ji eyi egwu n’isiobodo ahụ nkemere na ndị mmadụ nọ n’egwu ma na-agbakwa ọsọ ndụ ha mgbe ọbụla ha hụrụ ya,n’ihi na ọ na-eji ihe na-emerụ mmadụ ahụ mgbe ọbụla.   E kwukwara na ndị ọrụnchekwa Neighborhood Security Watch adịla na mbụ gbaa mbọ ka ha nwụchikọọ onyeara ahụ mana onweghị isi n’ihi na o kweghị ha njide.   Otu onye nọ ka ya bụnjinji jiri ma bụrụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya kọwara na ka onye ọkada ahụkwụsịchara onye o bu ma na-achọ ka ọ pụọ, onye ara ahụ wakporo ya ma kụọ yaogbe osisi o ji n’isi nke mere ka ọ nwụọ.   Onye DivisionalPolice Officer (DPO) kpirikpiri Division, SP Chris Anyanwu, onye nke kwuputarana ya bụ ihe mere n’ezie dụrụ ndị otu na-anya

N'Anambra, ndị uweojii ejidela nwa afọ iri na isii buru egbe ga akwụkwọ

Image
… Jide mmadụ 80 maka òtu nzuzo NDỊ uweojii steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nwetakwanturuugo ọzọ, dịka ha jidèrè mmadụ ruru iri asatọ n’ọnụọgụgụ maka otu nzuzo naarụrụala ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ.   Onye na-ahụ makammekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ SP Haruna Mohammed mereka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ ụbọchị Mọnde.   Ọ sị na ótù onyen’ime ndị ahụ e jidere bụ otu nwata nwoke gbara ahọ iri na isii, bụ EchezonaMetu, ma bụrụkwa onye e jidèrè maka iji egbe ọnụ abụọ (bụ double-barrel) weegaa akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ ya dị n’Igboukwu, n’okpuru ọchịchị Agụata.   Ya bụ nwata nwoke kae kwuru na ọ nọ n’ógó SS1 nke sekọndịrị ya, ma bụrụkwa onye a nwụchiri n’ogigè ụlọakwụkwọya ebe o bu egbe ahụ.   Oge a gbara nwatanwoke ahụ ajụjụ ọnụ, ọ sị na ọ bụ nna ya (kagoro nka) nwe egbe ahụ, ma bụrụkwanke o jiri wee lụọ agha n’oge gara dịka onye òtù agha Biafra. Ọ sị na ya bùrùegbe ahụ wee bịa akwụkwọ ka o wee gosi ụmụakwụkwọ ibe ya n’ezie na nna ya nwèrèégb

N'Awka, a haziela ọgbakọ nkụzi maka ọrịa nńụ ọbara, nyochaa ahụike ụmụaka na ndị ntorobịa n'efu

OTU nnọọrọonwe a kpọrọ Chie’mma Empowerment Foundation (CEF) nọ ụbọchị ụka gara aga chịkọba ọgbakọnkuzi banyere ọrịa nńụ ọbara (sickle cell) n’ụlọụka St Thomas Aguinas CatholicChurch, GRA, Awka, nke dị na steeti Anambra. Ọgbakọ nkuzi ahụ nke gbadoro ụkwụmaka ndụ Cmụaka na ndị ntorọbịa bụ ka ndị mmadụ mata jenotaịpụ ha, ọ kachasịmgbe ha na-akwdobe alụmdinanwunye (courtship).   N’okwu ya na mmemmeahụ, onyeisi otu ahụ, Oriakụ Chinwe Nnagbo kwuputara na ebumnuche mmemme ahụ bụikpochapụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị na-arịa ọrịa ahụ na-ahụtaba n’ime onwe hatinyekwara nke ha na-ahụta n’aka ndị mmadụ. O kwuru sị: ” N’ọtụtụ obodo, ana-akpọ ndị na-arịa ọrịa nńụ ọbara ọgbanje, ebe a na-apịa ndị ọzọ ụtalị maọbụmerụọ ha ahụ n’ụzọ dị iche iche.Ya mere, anyị chọrọ ịgbanwo nghọta ndị mmadụbanyere nke ahụ.” Ọ gara n’ihu kọwaa na ọrịa ahụ anaghị efe efe kama ọ na-abịasite na elezighi anya nke nne na nna.Ya mere, ọ dụrụ ụlọakwụkwọ, ụlọụka tinyerenne na nna ka ha na-agba mbọ chọpụta jenotaịpụ ụmụakwụkwọ  na ụmụ ha.

Iju mmiri: Agwọ na-arịbatazị n'ụlọ ndị mmadụ n'Ogbaru

ỤMỤANỤMANỤ ọjọọ na-arị arị (reptiles) dịka agwọ na-arịbachazịn’ụfọdụ ụlọ ndị mmadụ n’okpuru ọchịchị Ogbaru na steeti Anambra n’ihi iju mmirina-eto ebe ahụ.   Maazị Arinze Awogu,onyeisioche (Transition Chairman) nke kansụl Ogbaru onye kwuputara nke a kọwarana ụfọdụ ndị ọ chụpụrụ n’ụlọ na-agazi na kampụ ebe gọọmenti Anambra kwadooroha.   Awogu kwuru naosimiri Niger na-eto n’ike n’ike mere na iro, tinyere ọwa mmiri na-abanyen’osimiri ahụ na-alaghachịzi azụ. O kwuru na o pekata mpe ndị mmadụ dị otu pukun’ọnụọgụ akwapụla n’ụlọ ha.   Ogbaru na obodo irina isii mejuputara ya bi n’akụkụ osimiri Niger. O kwuru na nnukwu agwọ (cobra)rịbara n’ụlọ mmadụ n’Atani bụ nke e gburu site n’enyemaka ndịuweojii AtaniDivisional Police Station.   Dịka o siri kwu, egburu agwọ ahụ n’Atani, na nwoke e gburu ya gbanahụrụ agwọ ahụ ịta ya n’abalịahụ dịka ọ nọ n’obere ụlọ (boys quarters) na-achọ ihe dị ya mkpa.   O kwuru sị; “Dịka ọhụrụ agwọ ahụ, ọ kpọchịrị ụzọ ozigbo ma kpọọ ndịuweojii divishọn Atani bụ ndị bịaraw

Anambra: Ụlọ etigbuola nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'Obosi

… Gọọmenti Anambra ekpebie ịkụtù ụlọ ahụ ANYAMMIRI gbàrà ka ijummiri na nsonso a, dịka akụkụ otunnukwu ụlọelu dàrà wee tigbuo otu nwaanyị mụrụ nwa ọhụụ n’Obosi, dị n’okpuru ọchịchịime obodo ‘Idemili North’ nke steeti Anambra. Ya bụ ụlọ merụkwara ụfọdụ ndịmmadụ ahụ n’otu oge ahụ ọ dara. Mana, dịka amara Chineke siri dị, o nweghị ihe ọbụlamere ụmụaka ha, nke otu n’ime ha bụ nwa a mụrụ ọhụụ, dị naanị ọnwa isii.   Nwaanyị ahụ ụlọ ahụtigburu ka e kwuru na ọ gbàrà ahọ iri anọ, ma bụrụkwa onye na na-echebe nwaara. E bukwara ya wee gaa ụlọ ahụike dị nso ebe ahụ ozigbo ozigbo a dọpụtacharaya, mana dọkịta lelechaara ya ahụ, wee kwuo na ụkwà a na-apị, nà mkpụrụ adịghịya —nke pụtara na ya bụ nwaanyị alaala mmụọ.   Ka ọ dị taa, gọọmentisteeti Anambra ekpebiela ma kwuwaa na ọ ga-akụtù ụlọ ahụ tigburu ya bụ nwaanyị,maka na o teela aka o jiri maba ọkwà ma na-adọ aka na ntị megide ụlọ ọdịda (n’ụdịọbụla) n’ime steeti ahụ.   Mkpebi ịkụtù ụlọ ahụbụ nke e kwupụtàrà site n’ọnụ Maazị Chike Maduekwe, bụ onyei

Ndị Ogbunike etòóla Obiano maka ọrụ mmepe ya

NDỊ  Ogbunike dịn’okpuru ọchịchị Oyi nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee fọọ ekele n’ụkpa,bunye aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obiano maka ọmarịcha ọrụ mmepe dịiche iche o ji n’aka na steeti ahụ.   Ndị obodo a kwupụtaraòtùtó a na obi ekele ha site na nnukwu mmemme nkwàdo ha chịkọbàrà nà ngagharịudo ha mere na nsonso a iji kelee ya bụ Gọvanọ. Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụn’ụlọ ezumeezu obodo ahụ, ma bụrụkwa nke imirikiti ndị obodo ahụ sonyere na ya,ma ndịisi ọchịchị obodo ahụ, ụmụnwoke, ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa Ogbunike.   N’okwu ya na mmemmeahụ, onyeisioche mmemme ahụ ma bụrụkwa onyeisioche nchere oge n’okpuru ọchịchịime obodo Oyi, bụ Maazị Nnamdi Nwadiogbu mèrè ka a mara na obodo Ogbunike na ụmụafọobodo ahụ anaghị enwetabụ nkusa ume gọọmenti maọbụ mmetụta gọọmenti n’oge mbụ,wee ruo mgbe Gọvanọ Willie Obianọ bàtàrà n’ọkwa ọchịchị.   O mere ka a mara na ọchịchịObianọ èwètela ọtụtụ mmepe na mnwògharị na ngalaba niile nke steeti ahụ naobodo ahụ. Ọ kpọkukwazịrị ndị na-akụgh

Korona: Ụlọọrụ nnọrọonwe ebunyela gọọmenti Anambra ihe mkpuchi ọtọ ụmụaka

IGBO sị na ọ bụ ihe nnekwu ọkụkọ nwere ka o ji emere okeọkpaọgọ, ma sịkwa na ọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyī, ọ dị mfe.   N’ịgbaso nke a, ótù ụlọọrụnnọrọonwe a maara dịka ‘Procter And Gamble Limited’ ebunyela gọọmenti steetiAnambra ihe e ji awàchi ụmụaka íkè (bụ ‘pampers’ n’asụsụ bekee), nke ọnụọgụgụya ruru otu narị puku na iri abụọ, ka e késàárá ụlọ ahụike steeti ahụ, ụlọọrụna-ahụ maka ihe metụtara ụmụaka na ụmụnwaanyị na steeti ahụ, ògìgè ụmụakaenweghị nne na nna, nakwa òtù ọrụ obi ebere bụ ‘Caring Family EnhancementInitiative (CAFÉ)’.   Mmemme nnyefè ihe ahụbụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwanke ụfọdụ ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti steeti ahụ sònyèrè na ya.   N’okwu ya oge ọna-enyefè ihe ahụ n’aka gọọmenti, onye duru ụlọọrụ ahụ wee bịa ya bụ njem, ma bụrụkwannukwu onye enyemmaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaaramgbasaozi na ijikwà oyinyò, bụ Maazị Chika Ibeneme kọwàrà na ụlọọrụ ahụ butèrèihe ndị ahụ dịka ótù ụzọ isi tụny

A kpọkuola ndị Anambra ka ha na-edobe ọwà mmiri ọcha

Image
Ọ NA-ADỊ mma ịma ọkwa mmiri tupu ozuzo ya, ma na-akakwa mmaiji ehihie wee chụba ewu ojii, maka na chi jie ọ hịa ahụ njide.   Ọ bụ n’ịgbaso nke aka gọọmenti steeti Anambra jiri kpọọ òkù ọzọ ma dụọ ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka hana-edebe ọwà mmiri ha ọcha, ma kwụsị iji unyi, atịtị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụwere na-emetọ maọbụ na-asụchisi ọwà ọwà mmiri dị na mpaghara ha.   Òkù a bụ nke a kpọrọsite n’ọnụ onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Clear Drainage and Forest PreservationAgency,’ bụ Maazị Chido Obidiegwu n’okwu ya oge ya na ndị òtù ọrụ ya na-abàgiden’ọrụ ịkọchàsị ọwà mmiri suchisiri àsụchi na mpaghara okpuru ọchịchị ime obododị iche iche na steeti ahụ. O kwuru na ebumnobi nke ahụ bụ iji hụ na mmirina-ehùrú onwe ya ma na-agakwa etu o kwesiri.   Dịka ọ na-akatọ etundị mmadụ si ekponye ahịhịa n’ebe mmiri si aga, Maazị Obidiegwu gbarụkwàrà ihubànyere etu ụfọdụ ndị oji ego achụ ego nà ụfọdụ ụlọọrụ dị iche iche na steetiahụ si emetọsị ọnọdụ gburugburu site n’iji ụnyí na ihe ọjọọ ndị ọzọ si n’ụlọọrụha

Otu nwoke ebewaala nwunye ya dị ime afọ iji mara ihe ọ ga-amụ

IGBO sị na onye ọ na-agụ ebèghị èbè na-eri n’eghèghị èghè.   Ka ọ dị taa, otunwoke nọrọ na nsonso a wee bèwaa nwunyè ya dị ime afọ, iji mara ma ọ bụ imenwoke ka ọ dị ma ọ bụ ime nwaanyị; ka o wee mara nke ọ ga-amụrụ ya ma ọnwa ruoya. Nke a bụ nke mere n’obodo Budaun dị na mpaghara steeti Uttar Pradeshmba nkembà India.   Dịka akọkụ siri kọọ,ya bụ nwoke mere ihe ahụ, bụ Maazị Pannalal gbàrà ahọ iri anọ na atọ. Nwoke ahụka e kwuru na o ji ụmụ ise ugbua mana ha ise bụcha nwaanyị, nke mezịrị o ji achọsinwa nwoke ike agara-aghara.   Ka o sila dị, n’ihina nwoke ahụ na-achọsi nwa nwoke ike, o jidezịrị nwunye ya dị ime ọnwa oruru, bụOriakụ Anita Devi (gbara ahọ iri atọ na ise) n’ótù abalị, wee bèwáá ya afọ, ka ọmara ma ọ bụ nwa nwoke ka ọ bụ nwa nwaanyị ka o bu n’afọ, n’ihi na ike ịmụ naanịnwa nwaanyị agwụla ya.   Nke a mezịrị kanwaanyị ahụ dị ime nọrọ na nnukwu ihe mgbu na ahụ ụfụ, n’ihi afọ di ya bèwàràya; ọbara wee ju ebe niile n’abalị ahụ. E bukwàzịrị ya bụ nwaanyị wee gaa ulọọgwụ,ebe ọ nọ

Ndị Nigeria bi Namibia amalitela ịnye ụmụ ha ihe ọmụmụ na Igbo, Hausa, Yoruba

NDỊ Nigeria bi Namibia, site n’atụmatụ ndịisi otu jikọtaraha bụ Association of Nigerians in Namibia (ANINAM) na nkwado nke ọnụ na-ekwuruNigeria na mba ahụ Nigeria High Commissioner to Namibia, Ambassador Lilian Onohamalitela ịhaziri ụmụ ha ihe ọmụmụ n’asụsụ atọ a kacha mara n’ala anyị bụNigeria – Hausa, Igbo na Yoruba.   Nke a wetere ọńụn’ebe ndị Nigeria bi Namibia, nke dị na mba South Africa nọ n’ihi na haemejuputala ebumnuche ha bụ ichekwaba asụsụ ha dịka ha nọ n’ụzọ ije na mba ọzọsite n’ịkụziri ụmụ ha asụsụ Nigeira.   Amb. Onoh kwuru sị,dịka onye na-anọchite Nigeria na Namibia na ya nwere afọ ojuju na ndị ahụ yana-anọchitere.   O kwuru sị: “N’imeafọ a na ihe iche aka mgba so ya, ANINAM haziri ma malite ịkụziri ụmụ anyị naNamibia asụsụ ala anyị. Nne na nna wepụtara onwe ha, na-ehicha ụlọ ahụ, weta akọrọngwaniile; ọtụtụ sonyere nke mere na a ga-abawanye ebe ahụ maka ezi mmụta. E silana nkuzi asụsụ ahụ rite uru ọzọ. Nne na nna na-abịazị na Satọdee, ha na ụmụ hama hazie ihe ańụrị na egw

Anụ ọkụkọ e si mba ọzọ ebubata nwereike buru korona – Customs

NIGERIA Custom Service (NCS) adọọla ndịọrụ ha nọ n’agbataNigeria na mba ọzọ nke gụnyere ọdụụgbọelu na nke mmiri (seaports) aka na ntị magwa ha ka ha kee nkwụcha gbasara ndị na-ezubata anụ ọkụkọ (frozen chicken) na ụmụanụ ndị ọzọ na-ebi na mmiri n’ihi na ọtụtụ n’ime ha bu korona.   N’ozi ahụ nke otuonye so na ndị ọnụ ruru n’okwu na NCS bụ I.T.Magaji tinyere aka na ya kwuru sịna gọọmenti mba China ahụtala korona n’erimeri a na-ebubata ebe ahụ.   Ya mere, onyeisi(The Controller General), nke ụlọọrụ NCS, Col Hameed Ali akpọkuola ndị ọrụ yaka ha gbaa mbọ ịhụ na ezubataghị anụ ọkụkọ na Nigeria.   Ozi ahụ kwuru sị:“Mkpesa rutere isi ụlọọrụ anyị gosịrị na dịka a na-enyocha anụ, ma ndị nkebi na mmiri, ndị ọchịchị China hụtara ọrịa korona na nku anụ ọkụkọ na nsịkọ simba Brazil na Ecuador.”   Ya mere, a dọrọ ndị ọrụNCS aka na ntị ma chetara ha na a machiri ịtụbata anụ ufe (birds), ma nke dị ndụma nke nwụrụ anwụ n’ala Nigeria.

Ịgụ aha n'ala Igbo: Oge mbụ na ugbua

… Akụkọ malitere n’izuụka gara aga IHE ndị a bụ otu e si eme ya bụ emume ịgụ aha n’oge gboo. Ọbụ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuokwa nkakwụ n’isi, ka ihe ndị a e jiri maraanyị bụ ndị Igbo sizị anwụnyụ anya ma na-efunahịzịkwa anyị bụ ndị Igbo. Ihe ndịahụ niile bụzịkwa ihe anyị na-akpọdo isi n’ala ugbua, wee na-emezị omenelu,chèé na anyị so n’egwú. A sị na ọ na-abụ onye ghara ikwe, ọ sụọ n’ala, maka na ọna-abụ ụkpala na-ere ọkụ, o chee na ọ na-aha mmanụ.   Ndị Igbo ọgbara ọhụụugbua na-emegharazị ihe ihu. A naghịkwa emekebe emume ịgụ aha maọbụ ịbà ahan’ala Igbo ugbua, ma ya fọdụzie inye nwata ahụ aha uche na amalihe dị n’ime ya.Ihe a na-amàzị aka ya ugbua bụ onye aha nwa nke nwa ya ga-akacha wee pụọ ichèmaọbụ wee da ụda na ntị.   Onye ọbụla na-achọzịkwaka nwa ya zaa aha onye ọcha, nke ọtụtụ n’ime ha enweghị ike ịkọwa ihe ọ pụtarama a sị ha kọwaa. Ọtụtụ ndị Igbo wee na-abàzị ụmụaka aha inyo, aha nkịta, ahanri, aha obodo, nakwa ọtụtụ aha ndị ọzọ uche na-adịghị n’ime ya; naanị ka e weesị n

Ndị Ihiala ejiri ọñụ rie ji ọhụrụ afọ 2020

Image
OKE ọñụ dara na nsonso a n’obodo Ihiala dị n’okpuru ọchịchịsteeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020.   Mmemme Ịwa Ji ahụ emere n’obi eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Thomas Ikenna Obidiegwu dọtàrà ụmụafọobodo ahụ nọgasị n’ebe dị iche iche, ndị ikwu na ibe, ndị nwadiala, ndị enyi,ndị agbatobi na ndị ọzọ na-echère obodo ahụ ezi echichè.   N’okwu ya oge ọna-agọ ọjị na mmemme ịwa ji ahụ, Igwe Obidiegwu kelere Chineke maka ọrụ ọma yan’isi ụmụafọ obodo ahụ, ọkachasị n’ihi ndụ, ngọzị, udo na ọganihu nke o jiri chọọha mma, ya na amara o nyere ha, ha wee kọọ ihe n’ubi ma dịkwa ndụ weta ihe ha kọnyèrèn’ubì.   O kelekwara akana-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka ụzọ dị iche iche o sigoronwògharịa ngalaba niile nke steeti ahụ, ọkachasị ngalaba ọrụ ugbo; etu o sirikwàlite ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ, ma wetekwa ọnọdụ mmepe tọrọ atọn’ime-ime obodo dị iche iche na steeti ahụ.   O kwezịrị nkwà na NdịIhiala ga-aga n’ihu ịkwadò ọchịchị nọ ugbua na