Ndị Abacha ekwupụtala obi ha banyere igwe ha a chụrụ achụ
NDỊ obodo Abacha dịn’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee mee ịkpọganị-ganị n’ụzọ udo, banyere ọchụchụ ahụ gọọmenti steeti ahụ chụrụ eze ọdịnalaha bụ Igwe Godwin Ben Chuba Mbakwe. Ịkpọ ganị-ganị ahụ bụnke ndị ahụ malitere na mpaghara ebe dị iche iche n’obodo ahụ, ma bụrụkwa nkeha meere wee gaa n’obi gọọmenti steeti ahụ dị n’Awka, bụ ebe ha nọrọ wee chịkọtaya. Ndị ahụ bugasịkwaakwụkwọ e dere ihe dị iche iche na ya wee mee ịkpọ ganị-ganị ahụ, nke gụnyere:“Abacha bụ obodo udo”, “Anyị kwụ gọọmenti Anambra n’azụ”, “Anyị katọrọihe Igwe GBC Mbakwe mere”, “Abacha na Obianọ dị n’udo”,“Anyị jụrụ ọchịchị aka ntagide Igwe GBC Mbakwe”, tinyere ụfọdụederede ndị ọzọ dị etu ahụ. N’ikwupụta ọnọdụ hadịka ndị obodo Abacha, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Okeke mereka a mara na ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ emeerela obodo ahụ ọtụtụ ihe dị icheiche, ma rụkwara ha ọrụ mmepe dị iche iche kemgbe ọ batara n’ọkwa ọchịchị. Ọ katọkwazịrị ihe ahụ eze ọdịnala ha