Posts

Showing posts from July, 2020

IFAD-VCDP ekesàárala ndị ọrụ ugbo Anambra mkpụrụ akụkụ

N’IJI kwàdo ha n’ezi ọrụ ha ịhụ na a nwere nri gbàà-nyụụ nasteeti Anambra, òtù na atụmatụ ọrụ ‘International Fund for AgriculturalDevelopment assisted Value Chain Development Programme (IFAD-VCDP)’ ekesàáralandị ọrụ ugbo steeti Anambra mkpụrụ akụkụ ọrụ ugbo dị iche iche.   Mkpụrụ akụkụ ọrụugbo ahụ bụ nke mkpokọta ọnụ ego ya ruru puku kwùrú puku naịra, ma bụrụkwa nkee kesààra ndị ọrụ ugbo sitere okpuru ọchịchị ime obodo asatọ n’ime steeti ahụ,bụ ndị nọ n’okpuru atụmatụ IFAD-VCDP na gọọmenti etiti.   Mmemme ikesà ihe ahụbụ nke weere ọnọdụ n’Atanị, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ọgbaru, ma bụrụkwanke a nọrọ na ya wee gbapee atụmatụ nkesà mkpụrụ akụkụ ọrụ ugbo ndị IFAD-VCDPnke ahọ 2020 na steeti Anambra.   N’okwu ya oge ọna-agbape atụmatụ ikesa ihe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ WillieObianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steetiahụ, bụ Maazị Nnamdi Onukwuba kọwara nke ahụ dịka otu ụzọ pụtara ìhè a pụrụ isikwàdo ọrụ ugbo n’ime steeti ahụ.   Ọ dọr

N'Anambra, Abang ejiela ndị uweojii e buliri n'ọkwa ejiji ọhụrụ

IGBO sị na ezi ọrụ nwere ezi ụgwọ; ma sịkwa ọ na-abụ onye enyèrè mara chịkwaa, e nyekwuo ya nke ka nkè. N’ịgbaso nke a, onyeisi ndịuweojii na steeti Anambra, bụ CP John Abang ejiela ndị uwe ojii dị mmadụ otunarị na iri na atọ (113) ejiji ọhụrụ, dịka e buliri ha n’ọkwa ‘AssistantSuperintendent of Police’ (ASP).   Mmemme iji ndị ahụejiji ọhụrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Amawbịa, ma bụrụkwanke e mere n’ịgbasò mbuli ahụ onyeisi ndị uweojii na Nigeria, bụ IGP MuhammedAdamu buliri ndị uweojii dị puku isi na narị isii na ótù (6,601) n’ala Nigeriana nsonso a.   Mbuli n’ọkwa ọhụrụahụ, dịka o siri dòó anya, bụ otu n’ime ụzọ isi ọchịchị ụlọọrụ ndị uweojiin’ala Nigeria si agbà ndị uweojii ume ka ha na-arụsi ọrụ ike; ma bụrụkwa nke ana-agbaso usoro kwesiri ekwesi nakwa itozùòkè wee na-eme.   N’okwu ya oge ọna-eji ndị ahụ ejiji ọhụrụ ahụ, Maazị Abang tòrò ndị ahụ e buliri n’ọkwa ọhụrụASP site n’ọkwa Inspectorate ha nọbụ mbụ, ma chetara na ọ bụ site n’ihe ha rụpụtaran’ọrụ ka

Egwu ndị Igbo: Egwu agha

EGWU agha bụ egwu ndị Igbo na-agụ ma ha na-eje agha. NdịIgbo bụ agbụrụ gbasiri ike, ya mere ọ bụrụ na agha daa ha na-ejikere, kpaa ikedị egwu.   Ụmụnwaanyị anaghịaga agha.Ọ bụ ụmụnwoke na-aga agha.Ọrụ ụmụnwaanyị bụ ịnọ n’ụlọ na-esi nri makandị gara agha.   Oge ọbụla ndị Igbomalitere ịga agha, ha na-akwakọrọ ngwa agha dịka egbe, mma, ube, ụta w.d.g.   Ka ha na-aga, ka hana-agụ egwu dịka: Nzogbu nzogbu –              Enyimba enyi Nzogbu                –              Enyimba enyi Nzogbu nzogbu  –              Enyimba enyi Nzogbu                –              Enyimba enyi

Akụkọ okike: Otu ihe ọjọọ siri bata n'ụwa

CHINEKE kere ụwa nyere nwaanyị ara ka o jiri ya na-azụ nwa.Ya mere, na mmalite ụwa, ihe e ji azụ nwa a mụrụ ọhụrụ bụ mmiri ara nne ya,n’ihi na ndị mmadụ kwenyere na site n’ịńụ ara nne ya nwa ọhụrụ ahụ na-ańụta eziihe niile Chukwu okike tinyere n’ime mmadụ.   Mgbe nwa ọhụrụ na-ańụara nne ya, ha na-enwe mmekọrịta nke pụtara n’ezie na ọgbụgba ndụ pụrụ iche dịn’etiti mmadụ na ibe ya.   Ihe e ji enwenkwenye na mmadụ bụ mmadụ n’ezie bụ makana onye ahụ ńụrụ ara nne ya. Ọ bụ ya kao jiri bụrụ iwu na nwaanyị ọbụla mụrụ nwa ga-echerịrị ya ara. Ya mere, ọ bụrụna nwaanyị mụọ nwa ma hapụ iche ya ara ọ na-abụ ihe arụ.   O ruru otu oge, otunwaanyị wee mụọ nwa wee hapụ iche ya ara, kama o weere mmiri ara anụmanụ wee zụọnwata ahụ. Nke a mere na mmụọ anụmanụ siri n’ụzọ dị otu ahụ banye n’ime nwa ahụ.Ka ọ na-etolite, o bidoro na-egosipụta omume ụmụanụmanụ n’ụdị omume ọ na-eme.Nke a pụtara na ọ malitere na-akpa agwa ka anụmanụ.   Ya bụ ihe gwagwojurundị mmadụ anya nke mere ka ndị okenye gaa gbaa afa iji ch

Mbize: Ndị Achina akpọọla gọọmenti oku enyemaka

ONYE ụlọ ya na-agba ọkụ ọ na-achụ oke? E ji ihe e ji agba nantị agba n’anya? Azịza bụ mba! ọ bụ n’ihi nke a ka otu nwa afọ Achina, nke dịn’okpuru ọchịchị Aguata ji ebeku gọọmenti etiti na nke steeti Anambra ka ọgbatara ha ọso enyemaka dịka mbize na-achọ ikpochapụ ha.   Dịka ya na Ka Ọ DịTaa na-akparịta nkata, Nze Anthony Ezenwaka, NPOM (Nzedigbo), ode akwụkwọ ọkpụtọrọkpụna steeti Anambra lara ezumike n’ọrụ, ma bụrụ onye ndu obodo kwara arịrị ọnọdụ ọjọọnke mbize debere ala nna ya bụ Achina. O kwuru sị: “Ihe a na-akpọ ebe mbize ahụna-agba bụ Okparanwa Erosion Site, nke dị n’ụkpaka Amanje, Umueleke Achina;n’ogologo ụzọ si Achina gaa Umuchu. O malitere ihe dịka afọ iri na ise garaaga, ma na-abawanye n’ike n’ike n’ihi oke mmiri ozizo na ide mmiri na-ekwoekwo”. Ọ kọwara na ndị obodo ahụ agbaala mbọ igbochi ajọ ọnọdu ahụsite n’igwu ụmị/nti mmịrị na ịtunye ihe dịka akpa aja ebe ahụ iji sụchie ya, matinyekwara ịkụ osisi, ọ kachasị achara (bamboo tree) n’ime ya. Mana mbọ haniile amịtaghị mmịmị n

Nri ndị Igbo: Ọkpa

Ọ DỊ nri dị iche n’ụdị ya anyị ga-esi n’izu a. Nri a bụ ọkpa,ụfọdụ na- akpọkwa ya ọka otu anya. N’obodo anyị ka a na-akọ ọkpa.A na-akọ yamgbe e ji akọ ọpapa (groundnut, ọ na-eme nke ọma n’ ala anyị.A na-esi mkpụrụ ọkpaotu e si esi mkpụrụ ọpapa.Mkpụrụ ọkpa na-atọ ụtọ, ọ bụ otu nri na-amasị ọtụtụmmadụ taa. Ezinaụlo ọbụla maara ka e si esi ọkpa, ọ na-abara ha uru nkeukwuu.Ka anyị ga mara otu e si akwado ma na-esi ọkpa.   Ị gaa ahịa, I gotamkpụrụ ọkpa, I buru ya gaa n’igwe ebe a na-akwọ ọkpa, ị ga ahụ ndị a na-akwụ ụgwọha akwọọrọ gị ya, ma yọọ ya bunye gị. Ị bata I were ole ị chọrọ isi, ị gbanyeya mmanụ, ose, nnu, I were osisi ma ọ bụ ị kwọọ aka gị nke ọma, ị gwọkọba ihendị ahụ ị tinyere ruo mgbe ha niile ga-adịkọta ọnụ. Ị gbanye mmiri, ị lee mannu ọ dịkwa ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ isi nke akwụkwọ, I bee ụgụ kịrịkịrị, ị wunyeya n’ime ọkpa ahụ ị gwọkọrọ. Ihe ndị e ji ekechi ọkpa bụ akwụkwọ unere ma ọ bụ iko. Ị kụnyeya n’akwụkwọ ma ọ bụ iko, I sinye mmiri, ọ gbọọ, I were nwayọọ tinyesịa yan’ime

N'Awka, gọọmenti Anambra ebidola idozigharị ebe mbize mebiri n'ụzọ Oby Okoli

GỌỌMENTI steeti Anambra amalitela ọrụ idozigharị mpagharaebe ahụ mbize na-enye nsogbu n’okporo ụzọ Oby Okoli dị n’Awka.   Ọrụ ahụ bụ nke enyere ụlọọrụ CASSID ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji kpàá ya bụ mbize eze, bụnke malitere dịka obere mbize, wee na-agbasàzị ruo ugbu a ọ na-achọzị ikewa yabụ okporo ụzọ Oby Okoli n’ihi óké mmiri òzùzò.   N’okwu ya banyerenke ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiofor kọwaraokporo ụzọ ahụ dịka otu n’ime okporo ụzọ dịkarịchara oke mkpà n’Awka bụ isiobodo steeti ahụ, n’ihi na ọ bụ ya ka e sigasị abà n’ime obodo ụfọdụ dịgasịn’Awka ahụ. O mere ka a mara na ọ bụ ọchịchọ obi Gọvanọ Willie Obianọ ịkwaliteezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ, bụzị nke mere na ọ naghị egbu oge ịrụnyegasịihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.   Maazị Ifejiọfọ garan’ihu kọwaa na e nwere ụfọdụ ebe dị iche iche mbize na-enye nsogbu na steeti ahụ,ma kpọpụtakwa mbọ gọọmenti na-agba iji memilaa ha na ihe na-akpa

Ụgbọala na-ebu ndị njem amakpuola ọhịa n'Anambra

Ọ BỤ nnọọ ihe ịhe ịtụrụ Chineke mmamma maka ọrụ ọma ya n’ịzọpụtaụmụ mmadụ, dịka ihe mberede okporo ụzọ dị oke egwù dapụtara na steeti Anambrana nsonso a.   Ya bụ ihe mberedeokporo ụzọ dápụtara ahụ bụ nke mere n’okporo ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaaỌnịtsha, oge ụgbọala ‘Toyota Hiace Bus’ gbakatara n’ụzọ, gbabazie n’ọhịa.   Dịka ozi si n’akaonye na-ahụ maka nkuzi na mgbasaozi n’ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’n’Anambra, bụ Maazị Pascal Anigbo siri kọwaa, ya bụ ụgbọala jiri ọsọ kwopụn’okporo ụzọ, gbabàá ọhịa, ma ga sụkanye isi n’otu olulu mmiri dị n’ime ọhịa ahụ.   Ụgbọala ahụ nwéréakàrà FGG357ZD ka e kwuru na o bù mmadụ atọ n’ime ya oge ahụ ya bụ ihe mberededapụtara, mana o nweghị onye ọbụla n’ime ha nwụrụ; naanị mmadụ abụọ n’ime hanwetara mmerụ ahụ, bụkwa ndị e buru gaa ụlọọgwụ maka ileru ha anya.   Dịka onye ọnọ mgbe omere siri kọwaa, ọ bụ ịgba oke ọsọ kpatara ya bụ ihe mberede, n’ihi na onyena-anya ya bụ ụgbọala na-agba ajọ ọsọ, nke na o enweghịzị ike ijidenwu ya, weeruzi

Ụmụnwanyị agbarala ọtọ mee ngagharị ịwe maka ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Kaduna

ỤMỤNWAANYỊ bị n’obodo dị iche ịche mejuputara Southern Kaduna,apụtala n’ịgwe mee ngagharị ịwe maka ogbugbu na ịghafu ọbara nke na-arị elu n’ebe ahu.   Iji gosipụta mwuteha banyere ọnọdụ ọjọọ ahu, ụmunwanyị ahụ yipuchara akwa ha, gbara ọto weegagharịa n’okporo ụzọ ma katọọ mwakpo nke ndị e chere bụ ndị Fulani na-achị ehịna-eme n’ebe ahụ.   Ụmụnwaanyị ahụ dịkaha na-egosipụta ara( breast) ha mere ngagharị mkpesa ahụ n’ụzọ udo wee gaan’obi eze nke Atyap bụ onye ọchịchị Zango Kataf na steeti Kaduna. Ha kọwaramwakpo ahụ dịka ihe dị oke egwu.   Otu onye na-ekwupurundị enweghị onye na-ekwuru ha ma bụrụkwa onye Southern Kaduna, Dọkita JohnDanfulani kọwara na ngagharị ahụ ụmụnwaanyị mere bụ nke a gbasoro ọdinala naomenala ha wee mee. O kwuru na mgbe elu bụ ala ọsa, na ọ bụrụ na ihe amaghị kaa ga-esi mee adakwasa ha, na ụmụnwaanyị, ma ụmụaka ma okenye ga-agbara ọtọ jiringagharị ịwe gaa n’obi eze. Ya mere o kwuru si “ihe mere ka ọnwa Julaị dị n’abali iri abụọ na atọ bụ omebere gboo.”   E kwuru na

Otu nwaanyị atọrọla nwa ya, kpọọ oku ka a kwụọ ya nde naịra abụọ

OTU nwaanyị akpaala nkata ọjọọ site n’ime ka ọ dị ka ndị ntọrịọtọọrọ nwa ya, naanị ka o wee mezuo ọchịchọ obi ya.Fatima Bishir, gbara afọ iriabụọ na abụọ tọọro nwa ya dị afọ ise na Katsina.   Onye okwuputa okwundịuweojii kọmandị Kastina bụ SP Gambo Isah kwuputara nke a n’ihu ndị ntaakụkọka a na-akpụghari nwaanyị ahụ na Katsina.   Ọ kọwara na ya bụnwaanyị kpara arụ ahụ ka o were tinyekwụọ onye dị ya chọburu ịlụ (fiancée)n’oge gara aga ma bụrụ ọ nye ọ chọkwara ịlụ ugbu a, na nsogbu.   Dika o siri kwu, ka ọnwaJulaị dị n’abalị ise, n’elekere asatọ nke ụtụtụ ka nwaanyị ahụ wetara mkpesan’ogige ndịuweojii Mashi wee kwuo na obere nwa ya nwaanyị na-efu efu, na yana-eche na ọ bụ onye ahụ di ya chọburu ịlụ tọọrọ nwa ya.Ọ kọwakwara na nwaanyịahụ tụgidekwara nwaanyị mbụ ahụ asị site n’ibo ya ebubo na o kwuru na ọ ga-abọ ọbọnwa ya nwụrụ n’aka ya.   Isah kwuru sị: “Ọgara depe (planted) akwa nwa ya ọ sị na-efu efu n’ụlọ nwaanyị mbụ ahụ ebe ndịuweojii chọputara ma hụ obante na-acha mmee mmee na akpụkp

Ndị uwe ojii Anambra ejidela mmadụ 103 nọ n’òtù nzúzo

Image
ISI ọchịchị ụlọọrụ uweojii na steeti Anambra ekwuola na ụlọọrụahụ anwụchiela mmadụ dị otu narị na atọ site na mpaghara ebe dị iche iche nasteeti ahụ, maka itinye aka n’òtù nzúzo, ohi na arụrụala ndị ọzọ dị iche iche.   Onye na-ahụ makammekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ SP Haruna Mohammed bụ yamere ka a mara nke a, site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, n’Awka banyere nke ahụ.   Dịka o siri kọwaa,ngalaba ọrụ uweojii ahụ pụrụ iche ná-ébú agha megide otu nzuzo, bụ SPAC, nọrọn’abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Julaị a wee nwụchie Maazị SomtochukwuOnyebuchi (gbara ahọ iri abụọ) bụ onye obodo Ogidi dị n’okpuru ọchịchị imeobodo Idemili North, maka ịdọbànyèsị ụmụaka n’òtù nzuzo. Ya bụ nwokorobịa ka ekwuru na o teelarị anya ndị uweojii jiri chọba ya, wee ruo ụbọchị ahụ a nwụchiriya.   Site na nnyòcha emere, a chọpụtara ma nwụchikwa ụfọdụ ndị ọ dọbagoro n’otu nzuzo ‘Junior VikingsSecret Cult Confraternity (JVC)’, nke gụnyere Okoliechukwu Elozanam (gbara ahọiri na isii) na Precious Nmam

Aka akparala onyeisi ụlọakwụkwọ prima maka ịdakpo nwaakwụkwọ ya ugboro abụọ

NDỊ Uweojii Steeti Yobe anwụchikọọla Abubakar Musa bụ Osoteonyeisi ụlọ-akwụkwọ Prima (Assistant Headmaster), maka ịdakpo nwaakwụkwọ yagbara afọ iri, ugboro abụọ.   Ya bụ ihe mere naJajere nke dị n’okpuru ọchịchị Fune na Steeti ahụ. ka a na-akpụghari nwoke ahụna Damauru bụ isiobodo Steeti ahụ, onye okwuputa okwu kọmandị ahụ bụ ASP DungusAbdulkarim kọwara na Musa nọ n’ụlọakwụkwọ Jajere Central Primary School, bụ ebenwata nwaanyị ahụ ọ dakporo nọ n’ogo klaasị nke ise, na-agụ.   O kwuru na ya bụnwoke kwasara nwa ahụ iko ka ọnwa Julaị dị n’abali iri na ise, ya nakwa n’abaliiri na asaa. Abdulkarim kwuru sị: “Nnyocha gosiri na Musa hụrụ nwata ahụ n’ahiaebe ọ na-ere mmiri akpa (sachet water). O were abụọ pụọ ma gwa ya ka ọ bịan’otu ụlọ a ka na-arụ arụ (uncompleted building) were ego ya. Ozugbo ọ bịara, owere ohere ahụ kwaa ya iko.   A chọpụtakwara naMusa kpọkwara nwata ahụ gaa n’ebe ọzọ amabeghi, ma kwakwaa ya iko nke ugboro abụọ.Anyị na nwata ahụ na-arụkọzi iji chọpụta ebe ọ nọ kpaa arụ ahụ n

Anambra ga-ekesa ụlọakwụkwọ tamomịta dị otu puku ma ha meghee

KỌMISHỌNA na-ahụ maka mmụta na steeti Anambra bụ Ọkammụta KateOmenugha ekwupụtala na gọọmenti ga-ekesa ihe e ji enyocha ọnọdụ ahụike mmadụ(infrared themometers) dị otu puku iji wee kwadebe maka mmalite agụmakwụkwọ dịkaa ga-ebido akwụkwọ.   Omenugha onye gwarandị ntaakụkọ banyere nke ahụ n’Awka, isi obodo Anambra, kwupụtara na ọ bụ ndịisi(State Executive Council) nyere nkwado maka ya.   Ọ kọwara na aga-ekesa tamọneta ndị ahụ n’ụlọakwụkwọ prịma na sekọndịrị gọọmenti (public).   Ọ gakwara n’ihu kwuona ụlọakwụkwọ dị na steeti ahụ nwetara akọrọngwa ya (equipment) n’oge e busoro ọrịaEbola agha n’afọ 2014.   Dịka o siri kwu, nkeahụ bụ iji hụ na ụlọakwụkwọ zuru oke dịka iwu e tiri maka korona siri dị.   Ihe ndị ọzọ gụnyerebọkeeti na ncha e ji akwọ aka bụ ụlọakwụkwọ ga-enwetazi ndị ahụ.   Omenugha kwuru nasteeti Anambra ga-emezu ihe niile otu o kwesịrị, ọ kachasị n’ihe gbasara ule2020 WASSCE na nke JSSE.

N’Awka, ndị nkụzi enyela onyinye ihe nkwado adịmọcha

DỊKA ọ bụ ihe doro anya na ụlọakwụkwọ ga-emepeghatị nasteeti Anambra n’abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ ahọ a maka ndị nọ n’ogoogo ụfọdụ; ndịnkuzi akwụkwọ praịma nọ n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka North’ nke steeti ahụejikọọla aka bute, ma nye onyinye ihe dị iche iche e ji akwalite adịmọcha.   Nke a, dịka o siridòó anya, bụ na nkwadobe maka mmepe akwụkwọ ahụ, ma bụrụkwa ntụnye nke han’igbochi mgbasa ọrịa nje korona na n’ịkwàlite ọnọdụ adịmọcha n’ụlọakwụkwọ dịiche iche.   Akụrụngwa nkwàliteadịmọcha ahụ ndị nkuzi ahụ tụkọtara gụnyère bọkeeti mmiri dị iri asaa na asatọn’ọnụọgụgụ, mkpọ mmanụ nkwọcha aka, bụ sanịtaịza dị iri asaa na asatọ n’ọnụọgụgụ,tinyere nchà mmiri dị iri asaa na asatọ n’ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke ha nyefèrèn’aka okpuru gọọmenti okpuru ọchịchị ‘Awka North’, maka ikesàrà ya ụlọakwụkwọpraịma niile dị n’okpuru ọchịchị ahụ.   N’okwu ya oge ọna-anabata ihe ndị ahụ n’aha gọọmenti, onyeisi oche nchere oge n’okpuru ọchịchịime obodo ‘Awka North’ , bụ Maazị Ferdinand Onwuje kọwara akparam

N'Abakaliki, nwaagbọghọ nọ mahadum amalitela ịnya ọkada n'ihi ụkọ ego

OTU nwaagbọghọ na-agụ akwụkwọ na mahadum amalitela ịnya ọgbatutumo ji akpa ego, nke ụwa kpọrọ ọkada n’ihi otu o siri hụ ọnọdụ ụwa.   Nwaada GoodnessAmarachukwu Onwumere gbara afọ iri abụọ na ise nọ na mahadum Ebonyi StateUniversity (EBSU), Abakaliki ebe ọ na-agụ banyere ihe ọmụmụ Political Sciencema nọrọ n’ogo nke atọ (300 level). O kwuru na ọ bụ n’ihi enweghị ego o jienyere onwe ya aka mere o ji sonyere ụmụnwoke ndị na-anya ọkada n’Abakaliki,isi obodo steeti Ebonyi.   Ya bụ nwaagbọghọ bụonye Okposi Okwu nke dị n’okpuru ọchịchị Ohaozara na steeti ahụ gwara ndị ntaakụkọna ihe kpaliri ya ịbagide ịnya ọkada bụ ka ya wee nwee ike nweta ego ọ ga-ejikwụchapụ ụgwọ o ji n’ụlọakwụkwọ, dịka ha ka nọ n’ụlọ n’ihi nsogbu korona.   Ya bụ otu nwaanyịn’ime ụmụ anọ nne na nna ya mụtara kọwara na ha ahụghị tụtụrụ rachaa kemgbe nnaya nwụchara afọ iri na atọ gara aga, nke mere ọ hịara nne ya ezigbo ahụ ịzụpụtaya na sekọndịrị.   Dịka Nwaada Onwumeresiri kwu, ọ gbaala mbọ dị iche iche iji nyere ndụ ya aka;

Gọọmenti Anambra azọpụla ụkwụ ịchụla ọrịa ịba ọchananya

GỌỌMENTI ọchịchị steeti Anambra ekwupụtala ezi njikere yaibuso ọrịa ịba ọchananya agha na steeti ahụ, na ịchụ ya ọsọ ụkwụ erughị alan’ime steeti ahụ.   Nke a bụ nke e kwupụtarasite n’ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta VincentOkpala, n’okwu ọ gwara ndị nta aụkọ na mmemme imerùbè ụbọchị ọrịa ịba ọchananyana mba ụwa, bụ nke a chịkọbara n’isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ dị n’Awka.   Ọ kọwara ịba ọchananyadịka ọrịa jọgburu onwe ya, ma kpọpụtasịa ụzọ dị iche iche a pụrụ isi bute ya,nke gụnyere site na mmekọ nwoke na nwaanyị, site na mmetụkọrịta ọbara siten’ihe dị nkọ, site n’afọ nwaanyị nwere ‘Hepatitis B’, oge ọ mụrụ nwa, tinyere ụfọdụụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi kesàá ya bụ ọrịa. O kpọpụtasịkwara ụfọdụ n’ime njirimaraọrịa ahụ.   N’iji gbochie mgbasaya bụ ọrịa, Dọkịta Okpala nyekwazịrị ndụmọdụ ka ndị mmadụ kwụsị ime ụfọdụ ihe dịiche iche ha na-eme, dịka íbì úgwù ezighị ezi, igbu ichi, ijikọrịta ihe dị nkọwere eme ihe, tinyere ihe ndị ọzọ dị etu ahụ. Ọ dụkwara ndị mmadụ ka h

Nwata nwaanyị na-eto eto agbagbuola ndị agha ọlụọ ọlaa abụọ gburu nne na nna ya

OTU nwata nwaanyị na-eto eto (teenage girl) onye Afghanistanagbagbuola ndị agha ọ lụọ ọ laa (Taliban fighters)abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọahụ dika ha kpụụrụ nne na nna ya n’ụlọ ha ma gbuo ha maka ịkwado gọọmenti mbaahụ.   Ya bụ mkpamkpa kparaka ndị omekome ahụ wakporo ụlọ ha nke dị n’ime obodo Ghor.   Dika onyisi uweojiibụ Habiburahman Malekzada siri kwu, ndị agha ahụ bịara ịchọ nna ya onye bụonyeisi ogbe ahu (village chief). O kwuru na nna ya ahụ na-enye gọọmenti nkwadonke mere ndị agha Taliban ahụ ji wakpo ya n’ụlọ ya ma kpụrụ ya pụọ. Oge nwunyeya jụrụ ndị agha ahụ gburu di na nwunye ahụ ka ha pụrụ n’ụlọ ha.   O kwuru sị: “QamarGul, onye nke nọ n’ime ụlọ buuru egbe AK-47 nke ezinaụlọ ahụ nwere ma buru ụzọ gbagbuo mmadu abụọ ndị aghaTaliban ahụ gburu nne na nna ya ma meruzie ufọdụ ndị ọzọ ahụ.”   Gul dị n’agbata afọiri na anọ (14) na afọ iri na isii (16) dịka e siri nweta ozi.  Ka nke ahụ mechara, ọtụtụndị agha Taliban wakporo ụlọ ya ma ndị mmadụ,tinyere ndị ọrụ nchekwa chụrụ ha ọsọ,ka

Okeke eletela ọrụ na-aga n'ụlọ ezùméèzù mba ụwa a na-arụ n'Awka

OSOTE aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okekebagidère na njem nleta n’ogige ebe ahụ gọọmenti steeti ahụ na-arụ ụlọ èzùméèzùmba ụwa n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ahụ, ya naiji leruo anya n’akụrụngwa ọhụrụ dịgasị iche iche e bulatara n’ebe ahụ na nsonsoa, maka iji kụọ elu ụlọ ahụ.   Njem nleta ahụ bụnke Dọkịta Okeke mere na nsonso, ma bụrụkwa nke Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọna steeti ahụ, bụ Michael Okonkwo sonyere na ya, bụ onye dugharịrị ya n’ogigeahụ ma kọwaara ya ka ọrụ siri gbata kwụrụ.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Dọkịta Okeke gosipụtaraobi añụrị ya bànyere etu ọrụ si agawanye n’ihu n’ebe ahụ, ma gosipụtakwa afọojuju ya n’ogoogo akụrụngwa ọhụrụ ahụ e bulatara.   Ya bụ akụrụngwa ígwènke a ga-eji wee kụọ elu ụlọ ahụ gbamgbam, ka Dọkịta Okeke mere ka a mara na ọga-enye aka ime ka a gbapụ ọrụ ahụ ọsọ.   O kwupụtazịkwara eziolileanya o nwere na ọrụ ga-akụrụ ọnọ n’ebe ahụ tupu isingwụcha ahọ a, ọbụladịdịka ọ kpọkuzịrị ụlọọrụ ji ọrụ ahụ ka welitekwuo

N'Imo, mmadụ anọ lagoro ezumike n'ọrụ ekoropula ka ha na-eme ngagharị maka ụgwọ e ji ha

MMADỤ anọ ekoropula na steeti Imo dịka ndị lara ezumike nkan’ọrụ oyibo na steeti ahụ na-eme ngagharị (protest) iji nye mkpesa maka ụgwọ ọnwagọọmenti ji ha.   Ngagharị mkpesa ahụnke onyeisioche otu kọmiti ha (Pensioners Intervention Committee), Iyke   Ohaneje nọ n’isi ya kpatara eje eje ala  ala (gridlock) dịka ha gbochirị ụzọ a maaranke ọma bụ ‘Okigwe roundabout’   Ohaneje kọwara nanke ahụ bụ ugboro atọ ha na-eme ya iji rịọ Gọvanọ Hope Uzodimma ka ọ kwụọ ha ụgwọ   O kwuru sị “Gọọmentijị anyị ụgwọ ọnwa ịrị anọ na ise (45 months) mana anyị na-arịọ ka a kwụọ anyị ụgwọọnwa ise,site na Maachị 2020.”   Kọmishọna ndịuweojii steeti ahụ, Issac Akinmoyede rịọrọ ha ka ha gbasoro udo ma nyemkpesa  ebe ọ kwesịrị.

Dọkịnta Ifeanyi emeela ọgbụgba afọ ya n'ụlọọrụ ANPC

NdỊ Igbo kwuru okwu sị na oriri abụghị ọnụ nkahie, na onweghịonye e tinyere nnu n’ọnụ ọ gbụpu ya makana anya na ihe dị mma gbara akwụkwọ. Yamere, oriri na ọṅụṅụ rịrị ibe ya elu n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taana SportsLight Extra; na Tuzdee dịka Dọkịnta Paul Ifeanyi, onye enyemaka pụrụiche gọvanọ (SSA) n’ihe gbasara agụmakwụkwọ sekọndịrị wụchara maka emume ọgbụgbaafọ ya.   Onyeisi ANPC(MD/CEO) bụ Sir Chuka Nnabuife ji obi aṅụrị wee nabata ya wee kwuo sị: “DọkịntaIfeanyi bụ otu n’ime anyị. Obi dị anyị ụtọ na taa bụ ụbọchị ọ na-echeta ọmụmụya. O wee bụrụ na ya na onye nke anyị, Chief Patrick Ugbaja onyeisi ASUBEB;onye nke ọ bụghị sọ na ọ gụkwuru akwụkwọ na Abbot Boys Ihialla, kama na ọ bụbuonyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, sokwu wee bịa. Ọ na-eme mma n’ASUBEB. Anyị na-asị ụnụnnọọ.”   N’okwu nke ya,Ugbaja kọwara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị ọma. O kelere Nnabuife na ndị ọrụ ANPCmaka ezi mmekọrịta. O kwuru sị: “Daalụnụ,

N'Anambra, ndị ụka Katọlik na-enwe ańụrị maka mbuli n'ọkwa Pope Francis buliri Bishọọp Isiuzoh

NDỊ mmadụ egosipụtala obi ańụrị ha n’ihi nhọpụta onyeisi ụkakatọlik n’ụwa niile, Pope Francis họpụtara onye enyemaka bishọọpụ (axuilliarybishop) nke Onitsha Achidayọsis na steeti Anambra bụ Most Rev Dennis Isiuzoh kao sonye n’otu na-ahụ maka mkparịtaụka n’etiti okpukperechi dị iche iche(Ponitifical Council for Interreligious Dialogue).   Bishọọp ụka Katọlikdayọsis Awka, Most Rev Paulinus Ezeokafor n’ozi ekele o zigaaraa BishọọpIsiuzoh kọwara nhọpụta ahụ dịka ihe ọńụ, ma kwuo na mbuli elu ya ga-eweta ezi ọganihuna ihe ọma n’ebe ndị nke Chineke nọ; ọ kachasị ndị katọlik Nigeria.   O kwuru sị na BishọọpIsiuzoh tozuru etozu maka ọrụ ahụ, n’ihi na o doro ya anya nke ọma. Ọ rụturuaka na dịka ya na Cardinal Arinze rụkọrọ ọrụ, ọ maara ihe ekwe na-akụ.   Bishọọp Ezeokaforgara n’ihu kwuo sị: “Ana m ekele Pope Francis maka nhọpụta a. Onyeisi (SupremePontiff) mere ezi mkpebi. Anyị niile ga-erita uru site na mbuli elu BishọọpIsiuzoh. Anyị nọ ebe a maka ịkwado ya. Anyị ji ya ụgwọ ekpere.”   Otu Pont

Nri ndị Igbo: Anyụ (ụgbọgụrụ)

ANYỤ bụ otu n’ime nri ndị Igbo. Anyụ bụ ụgbọgụrụ na-amị ya. Ọna-ebu isi dị ka ụgụ. A na-eri akwụkwọ ụgbọgụrụ eri, e ji akwụkwọ ụgbọgụrụ esiofe, e jikwa ya agwọ ji.   Ka anyị mara otu esi e ji anyụ esi ji. Ị bachasịa ji, ị waa ya kịrịkịrị, ị sachaa ji ahụ, wunyeya na nyọ, ị wepụchaa azụ anyụ ahụ, ị waa ya, I wepụchaa mkpụrụ dị n’ime ya, ịwazie ya kịrịkịrị, ị sachaa anyụ ahụ, wụnye ya na nyọ ka ọ gụpụ mmiri.   I sinye ite n’ọkụ, ịgbanye mmanụ, ọ dị ọkụ, ị wụnye yabaasi, o ghee ị wụnye ịra, ose, nnụ, magi, ịkpagharịa ya, i tinye obere mmiri n’ihi na mmiri dị n’anyụ. Ị chọọ, i tinye azụ,  lee ma nnụ ọ dịkwa ya, i kpuchie ya ka ọ sụọ.I wunye ji n’anyụ ahụ, i kpuchie ya. Ọ fọdụ obere ka o ghee, ị wụnye obere akwụkwọinine i bere kịrịkịrị, ma ọ bụ akwụkwọ nchụanwụ, I kpuchie ya nwa oge, o ghee, ịfọtuo ya, ọ bụrụzie oriri. I nwekwara ike isi anyụ n’ejighị ji.  N’ezie,i richaa anyụ ụraanọrọ ebe ị nọ rie ya tụba gị..

Egwu ndị Igbo: Egwu Ụka (Gospel Music)

NDỊ Igbo so n’agbụrụ ji egwu eto Chukwu okike. Mgbe elu bụala ọsa, tupu ndị ọcha abịa ha na-eji ngwa egwu ha nwere nke gụnyere ọja, ekwe,ogene, ịgba w.d.g. wee na-eto ya ma na-ebuli aha ya elu.   Ka ha na-agụ ka hana-agba, na-atụ ọgụgọ ( ịma mnya), ma na-amakwa mbem.   Dịka ụka batacharan’ala Igbo, a malitere kpọba egwu e ji eto Chineke egwu ụka. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụndị Igbo etiela egwu ụka gazuru ụwa niile, ma bụrụ nke ma ndị abụghị ndị Igbona-enwe mmasị na ya.   Patrick Obasi, onyenke ụwa maara dịka Patty Obassey so na ndị mbụ malitere jiri asụsụ Igbo tibeegwu ụka. Egwu ya pụtara ihe ka o tipụtachara nke ọ kpọrọ Nwa Mama Iwọta n’afọ1980.   Ya mere, site n’afọahụ egwu ya  malitere na-ewu ebe niile. N’ezie,egwu Patty Obassey na-emetu n’obi, ka ị na-ege ya ka ị na-ahụ ịma mma nkeChineke.   Egwu ya gụnyere: NwaMama Ịwọta, Onye Isi Agha, Ezi Nwaanyị dị Ụkọ, Ụbanese, Onye Kwere Ekwe BịanụK’Anyi Kelee Jehovah na ọtụtụ ndị ọzọ.   A mụrụ PattyObassey  ka ọnwa Mee dị n’abalị iri naise n’afọ 1

Asụsụ Igbo ga-adị

ASỤSỤ bụ njirimara ndi ma bụrụkwa nkụ dị na mbà na-egherembà nri. Ọ bụ ahụghị ebule ma sị elina dike n’ebe mkprịta ụka n’etiti mmadụ naibe ya dị. Asụsụ bụ ihe mbụ mmadụ jiri karị ibe ya n’elu ụwa. Asụsụ bụ iheukwu.   N’ala Igbo, asụsụ bụomenala; asụsụ bụ nwata tote o tokwuru; asụsụ bụkwazị ihe nketa, bụ nke siteren’aka ndi nna-nna anyị ha wee rute anyị aka. Onye amaghị asụsụ ya nọ ọdụ kaonye ọbara kọrọ n’isi, maka na asụsụ bụkwa ndụ. Ọzọ, onye enweghị asụsụ, aha yaefuola maka na aha onye na-esite n’asụsụ onye.   Ihe ndi a niile bụeziokwu ma bụrụkwa ihe a gba n’aka e jighị enyò elele. Mana ọzọ dịka ibe ya mabụrụkwa eziokwu ghe anya oghe bụ na ya bụ ọkụ siri n’aka nna-nna anyị hà weerute anyị aka na-achọzị ịnyụ anyụ n’ụbọchị taa, maka na ndi e nyere ya bụ ogiriamaghịzị uru ogiri bara n’ofe. Ndi Igbo n’ụbọchị taa na-agbakụtazị ya bụ asụsụha azụ ma chezọọ na ọ bụ ebe onye bi ka ọ na-awàchi, na a naghịkwa aghara isiaka wee agba ụrịọm, maka na ngwere ghara ukwu osisi, aka akpara ya.   Ọtụtụ

Anambra agaghị ada mbà n'ibusò mbize agha – Ivenso

IGBO sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị.   N’ịgbaso nke a,onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide nsogbu mbize n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ‘Nigeria Erosion and Watershed Management Agency Project (NEWMAP)’ n’ime steetiAnambra, bụ Maazị Michael Ivenso ekwuola na ụlọọrụ ahụ na gọọmenti agaghị adambà n’agha ọ na-ebu megide mbize na mpaghara ebe dị iche na steeti ahụ.   Maazị Ivenso kwupụtaranke a n’ihe mmemme mkparịtaụka ya na ndị nta akụkọ a kpọrọ ‘Meet the Media’, bụnke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ. O mere ka a mara na e nwere eberuru otu puku n’ọnụọgụgụ mbize na-enye nsogbu n’ime steeti Anambra, ma kwuo na ọrụna-aga n’ihu na mpaghara iri na anọ n’ime ebe ndị ahụ ugbua, ebe a rụchagokwaraatọ ndị ọzọ arụcha, bụkwa nke Gọvanọ Willie Obianọ ga-agbape n’oge adịghị anya.   Dịka ọ na-agbaakaebe na naanị amụmà ego ọrụ gọọmenti steeti Anambra na-amà apụghị igbònwunsogbu mbize steeti ahụ, Maazị Ivenso gara n’ihu kọwaa na ụlọọrụ NEWMAP bụ njikọakagọọmenti e

Ịgba mgba bụ gwuregwu na-akwalite ezi mmekọrịta n'ala Igbo

ỊGBA mgba (wrestling) so n’otu egwuregwu e nwere n’ala Igbo.A na-esi na ya ama onye bụ dike.   N’oge gboo, ụmụikorobịana-apụta n’amaegwuregwu gbaa mgba, a mata aka ka aka, onye karịrị ibe ya. Ogbena ogbe, tinyere obodo na obodo na-agba mgba. A na-esi na ya enwe ezi mmekọrịtan’ihi na ọ bụ ihe e ji ọńụ eme. A na-agbakwa mgba ma a na-eri ji ọhụrụ. Ana-ebido n’oge na-akụzịrị ụmụaka ihe banyere ịgba mgba. Ya mere, a bịa n’egwu ọnwa,mgba so n’ihe egwuregwu ụmụaka na-eme.   E nwere usoro e ji agbamgba. Tupu a malite ya, a na-akụ ekere mgba ma na-agụkwa egwu dịka ndị ga-agbamgba na-agbapụta n’ọgbọ na-awụgharị ma na-akwadebe maka mgba. Ọ bụrụ na agbachaa mgba, ya bụ dịka otu onye tụrụ ibe ya n’ala, oke ụzụ na-atụ nke mere nandị ahụ meriri na mgba ga-amalite gụba egwu ma na-agbagharị ebe niile. Ana-esikwa na ya erite ihe onyinye dị iche iche.   O nwere ndị a na-amadịka ndị na-agba mgba nke ọma. Ndị dị otu ahụ ka a na-asị na azụ ha anaghị eruala, nke pụtara na mmadụ anaghị emeri ha na mgba.   Ọ b

E liela ozu Emmanuel Ezike n'Amichi

ỌNWỤ bụ ọzọ a mà na onye ọbụla ga-echirịrị, ma bụrụkwa òkù ama na onye ọbụla dị ndụ ga-azarịrị chi ya oge ọbụla o jiri kpọọ ya.   Nke a bụ isi sekpụntị n’okwuchukwu ofufè nrò akwamozu Emmanuel Ezike, bụ nke weere ọnọdụ nso-nsoa n’ezinụlọ be ya dị n’Amichi, n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi South’ nkesteeti Anambra.   N’okwuchukwu ya nammemme akwamozu ahụ, Ụkọchukwu Samson Ikedinma gbàdòrò ụkwụ n’akwụkwọ nsọ dị kaọ dị na Mkpughe 22: 12, wee kpọkuo onye ọbụla ka o chegharịa ma chigharịkwuteChineke, dozie ndụ ya ma nye fèé ya onwe n’aka Chineke, iji wee kèta òkèn’alaeze eluigwe n’ụbọchị ikpeazụ, n’ihi na onye ọbụla nwụrụ anwụ ga-enwerịrịebe ọ ga-anọ ọnọdụ ebighịebi   N’okwu nke ya, OriakụAmaka Ezike, bụ nwunyè nwoke ahụ nwụrụ anwụ ma bụrụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụiche nyegara Gọvanọ Willie Obianọ n’ọrụ pụrụ iche, kọwàrà di ya dịka onye udo,onye na-arụsi ọrụ ike, nwoke obi umeala, na nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụ pụrụiche.   O kpezịrị ka Chinekenabata mkpụrụobi ya na ndokwa ma nyekwa ya e

Mbize: Ndị Ebenator ebekuola gọọmenti maka enyemaka

Image
IGBO sị na onye ọ na-eme omume oume na-ebe obube obube, ma sịkwana ọkụkọ anaghị ahaà mkpu akwa maọbụrụ na ihe ji ya ahàghị ya aka.   Ka Ọ Dị Taa, ndịEbenator dị n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ na steeti Anambra akpọkuola ma rịọ gọọmentisteeti ahụ na gọọmenti etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n’ihi ajọ ọnọdụmbize na-echere ha aka mgba ma na-achọkwazị ikpochàpụ ya bụ obodo.   Òkù arịrịọ bụ nke akpọrọ site n’ọnụ onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Anthony Okechukwu n’okwu ọgwàrà Ka Ọ Dị Taa bànyere ọnọdụ mbize ahụ n’ihi oke mmiri ozuzo ahụ kwọsịrị nansonso a ma ka na-agakwa n’ihu ugbua, ya na ụzọ dị iche iche nke ahụ siri metụtaya bụ obodo na ndị bi n’ime ya.   Dịka o siri kọwaa,mbize ahụ a maara dịka ‘Ibo Ebentọr’ so n’ótù n’ime mbize kachara mie imi nampaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị, ma bụrụkwa nke na-emekpà obodo ahụ na ụmụafọya ahụ kemgbe ihe karịrị ahọ iri atọ.   Ọ gara n’ihu kwuo nambize ahụ etinyela ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ n’ọnọdụ anya mmiri n’ụzọ dị icheiche, tinye ọtụtụ mma

Ndị Uweojii ejidela ndị ohi atọ n'Anambra

N’ỊGAWANYE n’ihu n’agha ahụ ọ na-ebu megide ohi, mpụ na arụrụalan’ime steeti Anambra, ndị uweojii steeti ahụ nọrọ na nsonso a wee nwụchie mmadụatọ maka izu ohi.   Onye na-ahụ makammekọrị ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed bụ ya kwụpụtaranke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ iji mee ka ụwa mara bànyere nke ahụ.   Dịka o siri kọwaa,mmadụ atọ ahụ gụnyere Maazị Onyebuchi Osadebe (gbara ahọ iri abụọ na asatọ ma bụrụkwaonye obodo Akwu-Ukwu, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Idemili South nke steetiAnambra); Maazị Chibuike Ebere (gbara ahọ iri abụọ na atọ, ma bụrụkwa onyeokpuru ọchịchị ime obodo Isiala Mbano nke steeti Imo); na Maazị Umoke Kelechi(gbara ahọ iri abụọ na abụọ, ma bụrụkwa onye sitere okpuru ọchịchị Ikwo nkesteeti Ebonyi).   O mere ka a mara nammadụ atọ a nọrọ na abalị iri na otu nke ọnwa a, wee jiri egbe wakpò otu nwoke,bụ Maazị Emmanuel Obi n’Akwa-Ukwu, wee zuo ya ohi ego narị puku naịra asaa(700,000), puku yurò asatọ (£8000) na puku dọlà atọ ($3000),

Na Rivers, a bọọla mmadụ atọ ndị ntọrị lịrị

A BỌPỤTALA ozu mmadụ atọ ndị ntọrị liri na ndụ na steetiRivers. Ọ bụ n’ọhịa dị na Bera n’okpuru ọchịchị Gokana ka ndị omekome kpara arụahụ kpọrọ ndị uweojii gaa wee gosi ha.   Ndị ahụ a tọọrọ bụBaridomale Sunday Tor, Baridon Gbarabera na Barisiton Nawee ka e kwuru na ndịntọrị ahụ kefere ha ọnụ ha na aka ha n’azụ, wee lie ha na ndụ ka ọnwa Maachị dịn’abalị iri na anọ.   Ndị ntọrị ahụ kwuruna ha gburu ndị ahụ n’ọnọdụ ọjọọ ahụ maka inye mkpesa banyere ndị na-ezu ohimmanụ na ndị na-akpa arụ n’obodo.   Prophet naBarididum  Dabama onye e jiri ‘kill andbury’ mara kwetere na ọ bụ ha gburu ha n’ezie mgbe a na-abọpụta ozu ha na-emebiziemebi.   Onyeuweojii na-ahụmaka mmekọ ha na ndị mmadụ na steeti ahụ bụ DSP Nnamdi Omoni kwuru na ngalabaha na-ahụ maka ibuso otu nzuzo agha (anti-cultism unit) nwụchịkọrọ ndị ahụkpara arụ ahụ, bụ ndị kpọrọ ha gaa n’ọhịa ahụ ha liri ha.   Omoni kwuru na kọmandịahụ n’okpuru komishọna uweojii Joseph Mukan eforola ntutu taa imechi arụ kpamkpam na steeti Rivers.

Ndị nọọsụ karịrị narị abụọ ebutela korona na FCT

OTU jikọtara ndị ọrụ nọọsụ n’ala anyị bụ NigerianAssociation of Nurses and Midwifery ekwupụtala na ihe karịrị ndị nọọsụ dị narịabụọ n’ọnụọgụ n’ụlọahụike dị iche iche na Federal Capital Territory (FCT)ebuletal korona.   Onyeisi otu ahụngalaba FCT Deborah Yusuf gwara ndịisi otu jikọtara ndị ntakakụkọ n’ala anyịNigeria Union of Journalists, ngalaba FCT bụ ndị bịara n’obi ha (secretariat)n’Abuja maka inye ha onyinye ihe nchekwa maka ọrụ ha, ‘Personnel ProtectiveEquipment’ (PPEs).   Ọ gwara ha sị nan’ime ndị nọọsụ ahụ butere korona na mmadụ iri na abụọ adịla mma ma pụọ n’ụlọnchekwa (isolation centre).   Dịka Yusufu sirikwu, ndị nọọsụ Nigeria nọ n’isi ibuso ọrịa korona agha n’ihi otu ọrụ ha siri dị,nke mere ka ha bụrụ ndị na-enwetakarị ọrịa ahụ n’ime ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ.   Ọ kọwara na agha ana-ebuso korona bụ nke onye ọbụla ga-etinye aka na ya iji chụọ ọrịa ọjọọ ahụ ọsọụkwụ eru ala na FCT, Nigeria, Africa na ụwa niile gbaa gburugburu.   Onyeisi ndị NUJ (FCT) Comrade Emmanuel Ogbeche dịka

Ihe mberede okporo ụzọ egbuola dọkịnta abalị abụọ o mechara NYSC

OTU dibịa oyibo/dọkịnta aha ya bụ Urenna Iroegbu anwụọlan’ihe mberede ụgbọala dịka ọkwọụgbọala nyara waawaawaa. Ọ bụ n’okporo ụzọ Onne(Onne Road) na Port Harcourt, isi obodo steeti Rivers ka ya bụ ọdachị nọ weedapụta.   Ya bụ ihe mere ka ọgachara abalị abụọ o jiri fechaa ala Nigeria (National Youth Service CorpsProgramme).   Iroegbu tuuru ugo namahadum Imo State University n’afọ gara aga ka ọ nọchara afọ asatọ ebe ọ na-amụihe ọmụmụ banyere ibụ dịbịa oyibo.   Na Saturday ka ọbanyere ụgbọala Toyota Sienna nke na-ebu ndị njem aga steeti Akwa Ibom, ma ọlarughị ụlọ. Ọkwọ ụgbọala ahụ ka e kwuru na o napụrụ isi n’iwu okporo ụzọ siten’ịnya otu masịrị ya, ka oke mmiri ozizo zochara n’ihe dịka elekere anọ nkemgbede. Nke ahụ mere na nnukwu ụgbọala (lorry) nke kwesịrị isi n’ụzọ ahụ gaadakpoziri ụgbọala ahụ Iroegbu nọ na ya, n’ike.   Onye uweojii kwurun’ezie na ọ bụ onye ọkwọ ụgbọala ahụ kpatara ihe mberede ahụ n’ihi na ọ nyaraotu ọ masịrị ya, ma kọwaa na ndị mmadụ o metụtara n’obi buuru ndị merụrụ

Ọgbaghara dara mgbe onyeisi NDDC koropuru n'ụlọ nzụkọ omeiwu etiti

NJINJI jiri n’ụlọ nzụkọ omebeiwu etiti ala anyị House ofRepresentatives na Monde ọnwa Julaị a dị n’abalị iri abụọ, n’afọ a bụ 2020 dịkaonye jigodi ọkwa onyeisi (Acting Managing Director) nke Niger Delta DevelopmentCommission (NDDC), bụ Ọkammụta Kemebradikumo Pondei koropuru dịka a na-agba yaajụjụ ọnụ.   Ọ bụ ndị kọmitina-ahụ maka NDDC (House of Representative Committee on NDDC) na-agba ya ajụjụ ọnụahụ banyere otu o siri hazie ego ọrụ dị ijeri naịra iri asatọ na otu na ọkara(N81.5 billion).   Ya bụ ihe mere n’ihuminista na-ahụ maka ihe banyere Niger Delta, Maazị Godswill Akpabio bụ onye akpọrọ ka ọ bịa ma nyekwuo kọmitii ahụ nkọwa.   N’ihi otu ọnọdụ sirigbata kwụrụ, a kwụsịrị nzụkọ ahụ nkeji iri atọ, ebe e bupuru Ọkammụta Pondeimaka ileru ahụike ya anya.

FRSC ekwuola na ha ga-amalitezị ijide ụgbọala buru óké íbū n'Anambra

N’ỊKWALITEKWU ọrụ ya na mbọ ahụ ọ na-agba ibelata ihemberede okporo ụzọ, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ije awele okporo ụzọ, bụ ụlọọrụFederal Road Safety Corps (FRSC), ngalaba ya nke steeti Anambra, agbapeela atụmatụọrụ ọhụụ pụrụ iche, megide nnukwu ụgbọala na-ebu oke íbū nakwa ndị ọzọ na-adaiwu okporo ụzọ dị iche iche.   Dịka ozi si n’akaonye na-ahụ maka nkuzi na mgbasaozi n’ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Pascal Anigbo siri kọwaa,ya bụ atụmatụ ọhụụ a gbapere na nsonso a site n’aka onyeisi ụlọọrụ ahụ nasteeti ahụ, bụ Maazị Andrew Kumapayi, metụtàrà ndị na-anya Tipà maọbụ nnukwu ụgbọalandị ọzọ buru óké íbū maọbụ dàá iwu okporo ụzọ.   Dịka o siri kọwaa,atụmatụ ọhụrụ ahụ gbasòrò ntụziaka Gọvanọ Willie Obianọ nyèrè ma bụrụkwa nke gbadoroụkwụ na mkpebi 13, 2020 ahụ ndị ụlọ omeiwu steeti Anambra mere, bụ nke nyere ụlọọrụFRSC ahụ ntụziaka ka ọ welitekwuo aka n’ọrụ ibelata oke ihe mberede okporo ụzọna-emegasị na steeti ahụ, iji chekwaa ndụ ndị na-anyà ụgbọala na ndị na-agan’okporo ụzọ.   Ọ dị ncheta naonyeisi

Isi ụlọọrụ ndị uweojii zone 13 amalitela ọrụ

… Yọọ nkwado onye ọbụla KA ọ dị taa, ọrụ amalitela n’ozuzu òkè na ngalaba isi ụlọọrụndị uweojii ahụ a rụrụ ọhụụ n’Ukpo, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Dunukọfịa nasteeti Anambra, bụkwa nke a maara dịka mpaghara nke 13, (bụ ‘Zone 13’ n’asụsụbekee).   Nke a bụ nke pụtaraìhè dịka onyeisi nlekọta ngalaba isi ụlọọrụ ahụ, bụ ‘AssistantInspector-General’ (AIG) Danmallam Muhammed wụchara n’ebe ahụ, bụkwa ebe ọ nọrọwee nwee ọgbakọ pụrụ iche, ya na ndị isi uweojii steeti atọ nọ n’okpurumpaghara ngalaba isi ụlọọrụ ọhụụ ahụ, nke gụnyere steeti Anambra, Enugu naEbonyi.   N’okwu ọ gwara ndịnta akụkọ oge ha nwechara ọgbakọ ahụ, Maazị Muhammed kwuru na ya ọchịchị yaga-akwụsị ihe ọbụla bụ imegide ikike dịịrị mmadụ, bụ nke a na-ahụtazị n’ọrụ ndịuwe ojii n’ụfọdụ ebe dị iche iche n’ala Nigeria ugbua.   O kwukwàrà na ọchịchịya ga-akwụsị ihe ọbụla bụ ịna aka azụ, ịtụ mmadụ mkpọrọ n’ụzọ iwu akwadoghị,igbusi mmadụ n’ụzọ ezighị ezi, ya na ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche a na-ahụtan’ebe ndị ọrụ nchekwa nọ taa.   Ọ

Asịla ndị isi oche okpuru ọchịchị Anambra ka ha nọtukwuo

N’IJI sị ha nọtụkwuo, ndị omeiwu steetiAnambra, agbatịkwuola oge ọchịchị ndị isi oche nchere oge okpuru ọchịchị iri abụọna otu e nwere na steeti ahụ.  Mgbatịkwu oge ọnụnọ ahụ bụ nke e kwupụtara n’ogigè ụlọ omeiwu ahụ oge hanwere ọgbakọ, bụkwa nke a nọrọ kwuru na ọ ka ndị isi nchere oge ahụ nọkwuo ọnwaatọ ọzọ. Ya bụ mgbatịkwu oge bụ nke e mèrè n’ịgbasò mpaghara iri (section) 208nke amụma iwu okpuru ọchịchị ime obodo nke ahọ 1999, ma bụrụkwa nke GọvanọWillie Obianọ rịọrọ ka e mee.  N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Uchenna Okaforkpọkùrù ndị isi oche nchere oge ahụ ka ha gbasie mbọ ike ịdọta mmepe na èrèrè ọchịchịonye kwuo uche ya n’okpuru ọchịchị ha dị iche iche.   Ọdụkwara ha dụkwàzịrị ha ka ha dị uchu n’ọrụ ha ma gbasie mbọ ike rụpụta ihe a hụrụanya, ọbụnadị karịa karịa ka ha mere na mgbe gara aga, iji nye aka n’ịkwàliteya bụ ezi mbọ esepughị aka Gọvanọ Obianọ na-agba n’ịkwàlite steeti ahụ ka ọ bụrụeji ama àtụ. Ọ rịọkwara ha ka na ndị nnọchianya ha n’ụlọ omeiwu a

Enyi azọgbuola nwaakwụkwọ mahadum

NWAAKWỤKỌ mahadum abụrụla onye ọzọ enyi (elephant) gburu naSri Lanka, dịka a na-anụkarị ụdị ọdachị ahụ na mba ahụ.   Ya bụ nwaanyị gbaraafọ iri atọ na abụọ ka e kwuru na ọ bụ ka ọ na-alaghachị n’ụlọ obibi ya(hostel) na mahadum ahụ, University of Jaffna ụbọchị ụka ka enyi wakporo ma zọọya gwoogwoo.   Oge akụkọ ruru anyịaka, onye uweojii mba ahụ kọwara na ya bụ nwaanyị na otu enyi ya nọ oge ọdachịahụ dapụtara, ma onye nke ahụ gbapụnwuru na mwakp ahụ.   O kwukwara na rukwaaoge ahụ na ndị ọ dị n’aka ‘wildlife authorities’ agbaala mbọ ịchọpụta enyikpara arụ ahụ ma ha enweghị ike.   Otu o sila dị, ekwuru na nwaakwụkwọ ahụ nwetegasịrị mmerụ ahụ n’isi ma nwụọ n’ụlọọgwụ na Monde.   Enyi na-awakpokarịndị mmadụ n’ebe dị n’ime ime na Sri Lanka ma nke ụbọchị ụka ahụ dapụtara n’ebendị mmadụ bijuru ebiju, Kilinochchi; ebe ụdị ihe ahụ adapụtabeghị mbụ.   Mmadụ dị otu narị nairi abụọ na otu ka enyi gburu na mba ahụ n’afọ gara aga; ebe ndị mmadụ gburuenyi iri anọ na ise n’otu afọ ahụ.

WSC achọpụtala agbụrụ ọzọdịmgba ahụtụbeghị n'ụwa na Nigeria

OTU ndị na-ahụ maka anụmanụ bi n’ọhịa (wildlife conservationgroup) akwadola ụdịrị ọzọdịmgba adịkebeghị n’ụwa a (worlds rarest gorillas)n’ala Nigeria. A hụrụ ọzọdịmgba ndị ahụ na ụmụ ha na mpaghara Southern Nigeria.   Ndị WildlifeConservation Society (WCS) kwuputara na ha ewepụtala foto nke mbụ na mbụ ya nkezipụtara ọzọdịmgba Cross Rivers na ọtụtụ ụmụ ha ndị dị agbata afọ dị iche iche.Ebe a nọrọ see ha bụ n’ugwu ‘Mbe Mountains) na Nigeria.   WCS kọwara na fotondị ahụ bụ nke mbụ a na-ezipụta ha na ọtụtụ ụmụ n’otu oge.   Otu ahụ kwuru sị nanke ahụ gosịrị na ọzọdịmgba Cross River na-amụba nke ọma.   WCS kwuru na onyeisiotu ogbe dị nsọ ebe ahụ aha ya bụ Otu Gabriel Ocha kwuru sị; “Obi bụ m sọ ańụrịịhụ oke foto ọzọdịmgba Cross River na ọtụtụ ụmụ ha. Nke a gọsịrị na mbọ anyịna-agba (conservation) na njikọ aka WSC banyere na-amịta mkpụrụ.”   Ocha gara n’ihu kwuona ọ dị mma ka ha na-agbasi mbọ ike ka ha wee hafee ya n’ọgbọ ga-abịa n’ọdịnihu.   Dịka WSC si kwu ana-ahụta ọzọdịmgba Cross River dịk

N'Awka, UTA emeela ngagharị iwe megide ịkwaso ụmụnwaanyị iko n'íké

IGBO sị na ọ na-abụ a sụpịaghị ụtàrà n’ọkụ n’ọkụ, ọ gbaa akpụrịkpọ,ọ hịá ahụ; maka na ọ na-abụ arụ gbàá ahọ, ọ bụrụ omenala.   Ka ọ dị taa, òtù jikọtarandị na-azụ ahịa a maara dịka ‘United Traders Association’ nọrọ na nso-nso a weemee ngagharị iwe n’ụzọ udo megide nkwasò iko n’ike, bụ nke na-ewùzị na mpagharaebe dị iche iche n’ala Nigeria ugbua.   Ya bụ ngagharị iwe bụnke weere ọnọdụ na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ha mèèrè gaa n’ụfọdụ isi ụlọọrụdị iche iche dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, nke gụnyere ụlọ mgbasa ozi‘Anambra Broadcasting Service (ABS)’, ogige ụlọ omeiwu steeti Anambra, nakwaogige isi ụlọọrụ ndị uwe ojii na steeti ahụ.   N’okwu ya n’ụlọọrụahụ dị iche iche ha gàrà, onyeisi izùgbe òtù ahụ n’ala Nigeria, bụ Oriakụ NkiruDuru kọwàra na òtù ahụ bụ òtù nnọrọonwe jikọtara ụmụnwaanyị na-azụ ahịa nasteeti Anambra.   Ọ gara n’ihu kọwaana ihe mere ha jiri bàgide na ngagharị iwe ahụ bụ iji gosipụta obi mwute habànyere etu akụkọ ịkwaso iko n’ike sizị arị ibe ya elu ugbua ma bụrụk

Egwu Ekpiri ka na-agakwa n’ihu

NKE a bụ izu nke atọ anyị jiri malite ikwuputa maka egwuekpiri (highlife music). Ọtụtụ ụmụ Igbo chawapụrụ n’egwu ekpiri, nke mere naanyi ka na-aga n’ihu n’ịgba ha n’anwụ.   Ya mere, anyị ga-akọwapụtamaka King Chief Oliver De Coque (Onye a mụrụ dịka Oliver Sunday Akanite).    A mụrụ ya ka ọnwaEpure dị n’abalị iri na anọ n’afọ 1947. Ọ bụ onye Ezinifite nke dị n’okpuru ọchịchịNnewi South, na steeti Anambra. Ọ kụrụ egwu site n’afọ 1965 wee ruo 2008. Ọna-agụ egwu ma na-akpọkwa jita  n’ụzọ dịegwu. Kemgbe ọ kụchara egwu ya bụ Messiah Messiah n’afọ 1977, ọ kụpụtaara ụwaegwu ruru iri iteghete na atọ.Egwu ya wuru ewu ma gazuo mba ụwa. Ha gụnyere:Biri ka m biri, Nwanne dị na mba, Ụwa bụ aja, 10th anniversary Peoples Club ofNigeria, Nnata Chief Emeka Odumegwu Ojukwu w.d.g.   Oliver De Coque nwụrụka ọnwa Juunu dị n’abalị iri abụọ n’afọ 2008 n’ụlọọgwụ R Jolad Hospital, Lagos.

Nri ndị Igbo

Ịgba ọka Ọ DỊ ụfọdụ nri ndị Igbo a na-echezọzị ugbu a, ọ kachasi ndịbi n’obodo mepere emepe. Ụfọdụ ga-asi gịnị bụ ịgba ọka? Ịgbaọka bụ otu n’imeihe oriri ndị gboo ji azụ ụmụ ha.  ụfọdụga-asị na ọ bụ nri ndị ogbenye.   N’ezie a, ịgbaọka bụihe oriri dị mma, mana ndị nne na nna na-eleda ya anya n’oge a.   Ka anyị baa n’ịma kae si akwado ịgbaọka ya na ka e si esi ya. Mbụ, I weta ọka, ị gbapụtasịchaamkpuru ọka n’osisi ọka, ọ bụrụ ọka ka dị mmiri, ị saa ya wunye n’ihe ị ga-esikwọọ ya, tinye ya ose ndụ, yabaasị buru ga n’igwe na-akwọ ọka.   Ị bata ị gbanye yammanụ, nnu, ịra, mkpuruańara I bere kịrịkịrị, akwụkwọ ụgụ ma ọ bụ nchụanwụ. Iwere osisi ma ọbụ ngaji gwọkọọ ya ruo mgbe ihe niile I tinyere ga-agwọkọta ọnụnke ọma, ị gbanye mmiri. Cheta na mmiri agaghị akarị ka ị nwee ike ikechi yan’akwụkwọ unere ma ọ bụ akwụkwọ ojoko. I kechisia ya, ị gbanye mmiri sinye n’ọkụ,ọ gbọọ, I were nwayọ tinyechaa ya n’ite, ikwuchie ya. Ị ga-esitee ya aka ka owee ghee nke ọma maka na o ghee nke ọma, ị rịcha ya,

Ndị Uweojii Anambra anwụchiela nwoke gburu ma lie nwa ya

DỊKA a sị na ọ na-abụ chi na-efo, ihe ọjọọ a na-amụpụta, ndịuweojii na steeti Anambra anwụchiela otu nwoke maka iji mmà gbuo nwa ya nwokegbara ahọ anọ, ma gwuo obere ílì emighị èmì n’ezinụlọ be ya, lìé ozu ya ebe ahụ.   Ọ bụ onye na-ahụmaka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ Maazị HarunaMohammed kwupụtara nke a site n’ozi ọ kụpụrụ ndị nta akụkọ na nso-nso a banyerenke ahụ.   Dịka ozi ahụ siri kọwaa,ya bụ nwoke, bụ Maazị Christian Alisigwe, gbàrà ahọ iri atọ na ise, ma bụrụkwaonye Ihite Azịa dị n’Ihiala dị n’okpuru ọchịchị Ihiala na steeti Anambra. Oziahụ gakwara n’ihu mee ka a mara na ọ bụ oge ndị uweojii nwètàrà mkpesa bànyerearụrụala ahụ ya bụ nwa amadi rụrụ ka ha mere ngwangwa wee gaa n’ebe ahụ ya bụihe nọrọ wee mee, ma jiri anya ya hụ.   A bọpụtazịkwara ozunwatakịrị ahụ ma buru ya gaa dọnye n’ụlọ nchekwa ozu, ebe a ga-anọ wee meennyocha miri èmì banyere ihe kpatara ọnwụ ya na etu o siri nwụọ.   Maazị Harụna kwùrùna nnyòcha ka na-agakwazị n’ihu ugbua bànyere okwu

A kpụpụla onyenkuzi ụlọikpe maka ịdakpo nwaakwụkwọ

ỤLỌIKPE, Majie (Abiokuta Magistrate Court) amalite ikpebanyere otu onyenkuzi aha ya bụ Azunyere Chima, gbara afọ iri abụọ na atọ maka ịdakpoma kwaa nwaakwụkwọ gbara afọ iri na anọ iko n’ike.   Dịka a nọ n’ikpe,Majie I.O Abudu nabatara ka a tọhapụgodu ya bụ onyenkuzi (bail); mana ọ ga-akwụpuku narị naịra ise (N500,000) ma kpọtakwa mmadụ abụọ ọnụ ruru n’okwu n’ụdị egoahụkwa, bụ ndị ga-anapụ ya n’aka ebe (sureties).   Ọ gara n’ihu kwuo nammadụ abụọ ahụ ga-enwe ala nke dị n’okirikiri (jurisdiction) ụlọikpe ahụ magosikwa ihe zipụtara na ha na-atụ ụtụ isi takịsị afọ abụọ bụ nke ga-agụnye afọa bụ 2020.   Abudu kwuru na ya bụnwoke kpara arụ ahụ ka ga-anogodu n’ụlọnga nke dị n’Ibara (correctional centre)ma ọ bụrụ na o nwetaghị ihe ndị ahụ a gwara ya, ma yigharịa ikpe ka ọ dịbaziema ọnwa Septemba dị n’abalị iri na otu.   Onye uweojii okwu dịn’aka (prosecutor) Maazị Adekunle Opayemi gwara ụlọikpe ahụ nan woke ahụ kparaya bụ arụ ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ n’ihe dịka elekere ise nke mgbede.

E jidela mmadụ abụọ ọzọ n'Anambra maka ịkwaso ụmụaka iko n'íké

IGBO sị na ọ na-abụ a na-etigbu, ọ ná-árịsịtá, ị maghara naihe a na-etigbu agwụbèghị n’ebe o si arịpụta.   Ka ọ dị taa, ndịuweojii steeti Anambra nọrọ na nso-nso a wee nwụchie otu nwoke gbara ahọ iriisii maka ịkwasò nwata nwaanyị gbara naanị ahọ iteghete iko n’ike.   Dịka ozi a kụpụrụsite n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụMaazị Haruna Mohammed siri kọwaa, aha ya bụ mkpi ahụ na-agbara ọha ewu bụ MaazịNdubuisi Okafor, ma bụrụkwa onye bi n’ụlọ ‘Sun Rise Estate’ dị na NkwelleEzunaka, n’okpuru ọchịchị ime obodo Oyi.   Ya bụ nwoke ka ekwuru na ọ nọrọ n’abalị iri na abụọ nke ọnwa a bụ Julaị a wee jide otu nwatanwaanyị gbara ahọ iteghete, kpọbata ya n’ime ụlọ ya, ma kwasoo ya iko n’iké.   Ndị uweojii nwetaraozi banyere nke ahụ, wee gaa n’ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ wee mee, ma nwụchikọkwa,kpọchie ya bụ nwoke. Nwata ahụ bụkwazị onye e buru gaa ụlọ ahụike ebe dọkịta nọrọwee lelee ya ahụ ma gbaa akaebe na a pịara ya ọkụ n’ezi.   N’akụkọ dịkwa ka ibèya, ndị uweoji

N'Anambra, ihe mberede okporoụzọ egbuola otu onye ọgbatumtum ụkwụ atọ

IHE mberede okporoụzọ ọzọ adapụtakwala na steeti Anambra, madulaa otu onye mmụọ n’oge erughị eru, ebe ụfọdụ ndị ọzọ nwètàkwara mmerụahụ n’ụdịdị iche iche.   Maazị PaschalAnigbo, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta oheneze na ụlọọrụ ‘Federal Road SafetyCorps (FRSC)’ na steeti Anambra bụ ya mèrè ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụrụbànyere ya.   O mere ka a mara naihe mberede ahụ bụ nke mere na njikọ ụzọ Kwata (bụ ‘Kwata Junction’ n’asụsụbekee) dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, na mpaghara ụzọ awara-awara ahụ siriEnugu gaa Ọnịtsha, oge ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere ise nke ụtụtụ.   Dịka o siri kọwaa,ya bụ ihe mberede dapụtara oge otu onye na-anyà nnukwu ụgbọala Típà (nwéréákàrà AKL325ZT) nupùrù isi nyegara ọkụ ahụ n’ekwu mgbe ndị ga-aga na mgbe ndịagaghị aga n’okporoụzọ (bụ Traffic Light n’asụsụ bekee); o wee jirizie oke ọsọkwofèrè (n’oge na ebe o ekwesighị ịgafè mgbe ahụ), wee kwọrikọọ ótù ọmarịchaKeke ọhụụ (nwéré akàrà HTE159VC) bụ nke na-agafère onwe ya n’akụkụ okporoụzọnke ọzọ.

Akaegbobi arụọrọla ndị Ebenator ụlọ ahụike, gbapuoro ndị Ukpor mmiri

N’IMEZÙPỤTA nkwà onkwere mgbe ọ na-achụ nta nkwado ọchịchị,onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi South’ nke abụọ n’ụlọ omeiwusteeti Anambra, bụ Maazị Johnbosco Akaegbobi nọrọ na nso-nso a wee rụọrọ manyefèé ndị Ebenator ọmarịcha ụlọ ahụike ọhụụ ọ rụụrụ ha, ma nyéfèkwa ndị Ukpormmiri ọñụñụ ọ gbapùùrù ha.   Ya bụ ụlọ ahụike bụnke a rụrụ n’ógbè Umuonyeukpa dị n’Ebentor, ma bụrụkwa nke a nọrọ na nso-nso awee gbapee site n’aka Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ DọkịtaVincent Okpala.   N’okwu ya na mmemmeahụ, Maazị Akaegbobi kọwara nke ahụ dịka otu n’ime ọrụ ọgbọ nta nkwàdo o jin’aka, ma bụrụkwa nke dị obodo ahụ oke mkpà n’ihi na ha enwebụghị ogìgè ụlọ ahụike‘Primary Healthcare Centre’ n’oge mbụ.   O kèlèrè ụmụafọobodo ahụ maka ịkwàdo ya n’ụzọ dara ụda oge ọ na-achụ nta nkwàdo, ma kelekwaMaazị Chuddy Atuchukwu na Maazị Arinze Chukwudebelu, bụ ndị bunyere ụlọ ahụike ọhụụahụ mkpụrụ ọgwụ na akụrụngwa ahụike dị iche iche iji kwàdo ọrụ ahụike n’ebe ahụ.   Ọ kpọpụtasịkwara ụ

Editọ ANPC, Oranye emeela ncheta ọgbụgba afọ ya

ỤLỌỌRỤ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC),Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọakụkọ Nationa Light, Ka O Dị Taa naSportslightXtra nọ ụbọchị Tuzdee, sonyere editọ ha, Oriakụ Rose Oranye dịka otinyere otu afọ na ndụ ya (birthday).   E ji abụ otito weemalite ya, ebe a nọ wee kelee Chineke maka ezi ndụ onyere ya. Ụfọdụ ndị hụrụ yan’anya bịara na ANPC wee soro ya ṅụrịa.   Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụSir Chuka Nnabuife gọọrọ ya ọfọ ndụ, ihe ọma ihe ọma dịka o kelere Chineken’isi ya ma rịọkwaa ya ka o duru ya na-aga.   Ọ gọkwaara ndịọrụANPC na ndị niile gbakọrọ maka mmemme ahụ ọfọ. Chukwubuike Oranye, n’akụkụ nke ya kelere Chineke maka ngọzịya n’ebe ezigbo nne ya nọ. O kelere nne ya maka ịhụnanya ya ma kpekwaa ka ona-agawanye n’ahụike. Ọ gara n’ihu kpọkuo Chineke n’isi ndị niile bịara soronne ya ṅụrịa, ka ngọzị bụrụ nke ha.   Otu onye ọrụ ANPC,Oriakụ Uchenwa Mba kelere Chineke maka ndụ Oriakụ Oranye, bụ editọ ha. O kwurusị: “Editọ anyị nwere mmụọ mmadụ, bụrụ ezigbo onye nne ma were yana-et

Onye ntaakụkọ furu efu: ANPC etoo Chineke dịka a chọtara Onwuasoanya

AŃỤRỤ tụụrụ ime mụta ejima n’ụlọọrụ Anambra Newspapers andPrinting Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ NationalLight, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra dịka a chọtara onye ọrụ ha, BarịstaMathew Onwuasoanya fuburu efu.   Ihe karịrị otu ọnwaka ụlọọrụ ANPC nọ na-eti mkpu ma na-akpọ oku ka a hụ na a chọtara nwaamadi ahụ,onye nke a tọọrọ n’ụlọ ebe obibi ya nke dị na Ngodo Nise ka ọnwa Mee dị n’abalịiri atọ n’afọ a bụ 2020.   Ya mere, dịkaChineke mere ka a chọta ya, ANPC nọ na Fraidee, izuụka gara aga bulie ahaChineke elu n’ebe ọ dị ukwuu.   N’okwu ya na mmemmeahụ, onyeisi (MD/CEO) ANPC bụ Sir Chuka Nnabuife kelere Chineke onye mere ka ahụ Onwuasoanya. Ọ kọwapụtara mbọ dị iche iche a gbara mgbe a nọ n’iheicheakamgba ahụ.   O kelere aka na-achịsteeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano maka ezi mbọ ọ gbara iji hụ na a chọtaraonye ntaakụkọ ahụ. O chefughị onyeisioche otu ndị ntaakụkọ Nigeria Union ofJournalists (NUJ), n’aha ịchafụ bụ Emma Ifesinachi na ode akwụkwọ otu ahụ bụEmm