Posts

Showing posts from June, 2020

Akpokuela ndị Anambra ka ha gbaa mbọ ka akụ ruo ụlọ

A KỌWAALA mkpa ọ dị na onye ọbụla bụ nwaafo steeti Anambrabi na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria nakwa mba ofesi ga na-erube isinye ọkpụkpọ oku Akụ Ruo Ụlọ ahụ gọọmenti steeti ahụ na-akpọ, site n’ịdịna-ewelataru àkụ ya ụlọO   ku a bụ nke a kpọnwòròọzọ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra site n’ọnụ osote Gọvanọ steeti ahụ, bụ DọkịtaNkem Okeke n’okwu ya oge ọ gara ileta ka ọrụ si aga n’ihu ọrụ ‘Awka MillenniumCity Estate’, bụ ebe a na-arụ ụlọ obibi esteeti nakwa ihe ọgbara ọhụụ ndị ọzọ eji enyere ndụ aka, na-akwalite ọnọdọ obibi ndụ na na ọnọdụ mmepe n’izugbe. Ọrụ ngo ahụ bụ nke a na-arụ site na njikọ aka gọọmentisteeti ahụ na otu ụlọọrụ nnọrọonwe a maara dịka ‘M-P Infrastructure’ n’okpuruatụmatụ ‘Public-Private Partnership’ ma bụrụkwa nke a na-arụ na mpaghara AgụAwka. N’okwu ya n’ebe ahụ, Dọkịta Okeke kọwapụtara afọ ojuju yabanye etu na ogoogo ọrụ si aga n’ebe ahụ, ma kelekwa ụlọọrụ ji ọrụ ahụ makaagbambọ ha. Dịka ọ na-eme ka a mara na ọchịchị steeti ahụ emezuola nke ya,ọ dụkwazịr

Obidiegwu akpọkuola ndị Anambra ka ha kwụsị ịsụchisi ọwà mmiri

DỊKA ọ bụ ohe doro ewu na ọkụkọ anya na a bànyela n’ogeudummiri kpọmkwem; a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra ka ha kwụsị iji ahịhịana àtịtị asụchisi ọwà mmiri dị na mpaghara ha, n’ihi ajọ ọnọdụ gburugburu nansogbu dị iche iche nke ahụ aghaghị iwèta.   Oku a na ndụmọdụ a,bụ nke si n’aka gọọmenti steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a kpọrọ site n’ọnụonyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Clear Drainage and Forest Preservation Agency,’ bụMaazị Chido Obidiegwu n’okwu ya oge ụlọọrụ ahụ na-abàgide n’ọrụ ịkọchàsị ọwàmmiri suchisiri àsụchi na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.   Ọ kwàrà arịrị na ụfọdụndị mmadụ na-aga n’ihu iji ọwà mmiri mere ebe ikpofù ahịhịa, n’agbànyèghị ọkwàniile gọọmenti steeti ahụ na-ama na aka ọ na-adọ na ntị bànyere nke ahụ, ya naajọ ọnọdụ dị iche iche ọ na-ewèta.   Ọ rụtụsịrị aka n’ụfọdụmpụtàrà ọjọọ ịsụchi ọwa mmiri na-ewèta, ọkachasị ugbu a a banyegoro n’ogeudummiri kpọmkwem, ma kwuo na nsogbu ndị ahụ aghàghị ịkawanye njọ ma ọ bụrụ nandị mmadụ gaa n’ihu ịwụnye ahịhịa n’ọ

Ịnya ọkụ ụgụrụ

ỊNYA ọkụ bụ ihe e jiri mara ndị lgbo n’oge gboo. Ha na-emenke a n’oge oyi ọtụtụ dịka ụgụrụ na udu mmiri.   N’ihi ya, nkụ gbara ọkpụrụkpụanaghị akọ ha n’ụlọ. A nọ na mbara anya ọkụ nọrọkwa n’ime ụlọ, dịka oge siri dị.Ịnya ọkụ na-eme ka ahụ gbasie ma okenye ma ụmụaka ike. Oge ụfọdụ, a na-anọ ebea na-anya ọkụ na-akọrọ ụmụaka akụkọ ifo.Ọnọdụ ịnya ọkụ na-eme ka ezinaụlọna-ankọ ọnụ.   Ịnya ọkụ na-enyerendị agadi aka n’ihi na ọ na-eme ka ahụ gbasie ha ike. Ọ na-enyekwara ụmụaka akaka oyi ghara ịba ha ahụ.   Oge ụfọdụ ọkachan’oge ụgụrụ a na-akwanye ọkụ n’ama, onye gafete ọ nyara ọkụ. Ịnya ọkụ na-eme ndịIgbo obi ụtọ.

Egwu ndị Igbo: Atilọgwụ

ATỊLỌGWỤ bụ egwu e ji mara ndị Igbo. Ndị ntorobịa obi na-anụọkụ na-agba ya n’ihi na ọ bụghị egwu onye ike adịghị. A na-agba ya n’ọkụ n’ọkụ.   Atịlọgwụ so n’egwundị Igbo na-agba mgbe elu bụ ala ọsa. Ọ bụ ochie egwu n’ala Igbo nke a na-agbana mmemme dị iche iche dịka emume ofala, iri ji ọhụrụ, emume ọdịnala,ịgba nkwụ,akwamozuw.d.g.   Ụzọ e si agba yana-adị egwu nke kpatara ndị lelere ya mgbe a malitere gbaba ya mbụ jiri jụrịtaonwe ha ma e tinyere ọgwụ n’egwụ ahụ. Ọ bụ ya kpatara e ji gụụ ya, atịlọgwụ.   Ọ bụ ngwa egwu Igboka e ji agba ya dịka ogene, ịchaka, ọkpọkọrọ, ọja na ndị ọzọ.   A maara egwu atịlịọgwụnke ọma n’ala anyị ma na mba ndị ọzọ.Ọ gazuola ụwa niile eme o nwetara ọtụtụnturuugo.

Nri ndị Igbo: Ofe achara

NA nri ndị Igbo nke izu a anyị ga-eje steeti Abia. Anyịga-esi ofe achara. Ụfọdụ ga-asị gịnị bụ ofe achara ebe ụfọdụ ga-asịkwa gịnị bụachara ma ọ bụ a na-eri achara eri?   Otu a ka e si akwadonakwa ka e si esi ofe achara. E mechaa ị ga-ahụ na ofe achara na-atọ ụtọ. Ịga-ebu ụzọ kwadochaa ihe niile ị ga-eji sie ofe achara tutu ibido isi ya.   Ị gaa ugbo, I wetaachara ma ọ bụ igota achara n’ahịa, ị bata ị wepụsịa azụ achara nke siri ikeruo n’etiti ya, ị ga-ahụ nke esighị ike, nke ahụ ka ị ga-ewepụta ị ga-eji sieofe.   I wepụchaa ole ịga-eji sie ofe, ị malite ịgbaji ya kịrịkịrị, ị gbajichaa ya ị debe ya. Ị kwọọegwusi, ị wunye egwusi ahụ ị kwọrọ n’ikwe, tinye obere mmiri na ya, ị sụkọọ yanke ọma, ị malite ịkpụ egwusi ahụ kịrịkịrị.   Ị kpụchaa egwusi ahụi debe. I sinye anụ, ọ bụghị sọọsọ anụ ehi, ị chọọ ị were anụ ewu, ọkụkụ, nchi,i sikọọ ya na okporoko. Ị wụpụ ya debe, ị gbanyezie mmiri ị ga-eji sie ofen’ite sinye n’ọkụ. Mmiri ahụ gbọọ ị wụnye egwusi ahụ ị kpụrụ sibe ya, ị gaghịekwe ka ọ gba

Korona: Ndị Nkpọr ekesàárala ndị ihe na-esiri ike erimeri

ÒTÙ isi ọchịchị obodo Nkpọr a maara dịka ‘Nkpor DevelopmentUnion’ nọrọ na nso-nso a wee kesaara ụfọdụ ndị òtù ha bụ ụmụafọ Nkpọr ọnọdụ dịịrịañaa ihe erimeri dị iche iche, iji mee ka ha ka nwee ihe oriri n’ime oge a ọrịakorona na-enye nsogbu ma na-emekpàkwa ụwa ahụ n’ọtụtụ ụzọ.   Erimeri ahụ e kesàràgụnyèrè àkpà osikapa karịrị narị asaa, ya na nri olilo Semovita, na puku naịrise a tụkwasara n’elu ya, ma bụrụkwa nke ndị dị iche iche si n’ime ógbè iri enwere n’obodo ahụ. Ndị ajadụ na ụfọdụ ndị ọzọ ihe na-esiri ike so na ndị ritaraúrù n’erimeri ahụ e kesàrà. N’okwu ya na mmemme ahụ oge ọ na-ekesàra ha ihe oriri ahụ,onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Innocent Mbagha kọwara na ebumnobi ha jiribute ma kèsàá ihe ahụ bụ iji bèlatara ndị ahụ ritara úrù na ya ihe isi ike dịn’oge a, n’ihi na ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọnọdụ amaghịzị kwụrụ ugbua n’ihi ọrịa korona. O kelere ndị obodo Nkpọr, ma ọnọ n’ụlọ ma ọnọ n’ụzọ ije,maka ịtụkọta ihe oriri na ego ahụ e kesàrà, ma dụọ ha ọdụ ka ha jisie i

Òtù Obi Jackson ebunyela ndi nwere ọrụsị erimeri

DỊKA otu ụzọ isi tụnye ụtụ nke ya n’ibelatara ndị mmadụ iheisi ike n’ime oge a ọrịa korona na-eme mkpamkpa na mpaghara ebe dị iche icheugbu a, òtù ọrụ obi ebere a maara dịka ‘Obi Jackson Foundation’ ebunyela ndịike dị n’obi si n’ebe dị iche iche na steeti Anambra erimeri.   Mmemme inyefe ihe ọririahụ n’aka òtù jikọtara ndị ike dị n’obi bụ nke weere ọnọdụ n’Awka, bụ isi obodosteeti ahụ. N’okwu ya oge ọ na-enyefè erimeri ahụ n’aka ndị ahụ, onye nnọchianya òtù ‘Obi Jackson Foundation’, bụ Maazị Chukwudi Enukoha kọwara nke ahụ dịka otu n’ime ụzọ dị iche iche òtù ahụ si atụnye ụtụ nke ya n’ịkwàdo na inyere ndị mmadụ aka n’ime oge a. O kwuru na ọ bụghị ọrụ dịịrị naanị gọọmenti maọbụ kwesi ka a hapụrụ ya naanị gọọmenti, bụzị nke mere òtù ahụ jiri kpebie isò nye aka ma tụnye ụtụ nke ya. Ọ jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ndị ahụ ka ha na-erube isinye ntụziaka ahụ gọọmenti na ụlọọrụ ahụ ike mba ụwa bụ WHO nyere dịka ụzọ isigbanahị ibute maọbụ ikesà ọrịa ọjọọ ahụ. Na nzaghachi oge ọ na-anabata ihe

Ndị Uweojii Anambra ejidela onye ohi mara aja gaa izu ọgbatumtum mmadụ

AKA ndị uweojii na steeti Anambra akparala ótù nwoke izu ohidòrò anya, bụ Maazị Chibuzor Nwachukwu Emmanuel (gbara ahọ iri abụọ na anọ),maka ịma aja ngwùrù wee ga zuru Keke mmadụ.   Ọ bụ onye na-ahụmaka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ Maazị HarunaMohammed kwupụtara nke a site n’ozi ọ kụpụrụ na nso-nso a banyere nke ahụ.   Dịka o siri kọwaa,nwata nwoke ahụ, bụ onye obodo Ọkpụnọ Ochie dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘AwkaSouth’ na steeti Anambra, màrà aja, wee gaa izuru Keke Maazị Okafor ChukwunonsoKelvin n’ime ngwùrù be ya dị n’Ụmụdioka n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka South’ahụ, aka wee kpàra ya. O mere ka a mara na ọ bụ oge o jiri ọkàrà gata elekere isiinke ọnụ ụtụtụ ụbọchị Satọdee ka ha nwụchiri ya bụ nwaokorobịa oge ha nwetàràozi bànyere akụmakụ ahụ. Otu ọ dị, ya bụ nwata nwoke ewerela ọnụ ya sàá asịsà na yamere ihe dị etu ahụ n’ezie. A napụtazịkwara ya Keke ahụ, ma na-emekwuzị ụmụnnyòcha olenaole, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-ejiusoro iwu

Otu nwoke achụpụla nwunye ya n'ụlọ, gbuo ụmụ ya abụọ

OTU nwoke aha ya bụ Ifeanyi Apusiobi, gbara afọ iri atọ naanọ e gbuoola ụmụ ya abụọ, ụbọchị ụka nna. Ọ bụ aka ọdụ (pestle) ka o jiri kụgbuha.   Ụmụaka ahụ, Chinecheremgbara afọ asaa na Obinna gbara afọ ise dị n’ụra oge o ji aka ọdụ ahụ wee kụgbueha.   Nwoke ahụ kụkwazịrịnna ya onye nke gbara afọ iri asaa na abụọ aka ọdụ n’isi.   A chọpụtara na nwokeahụ, onye Azu Ogbunike nke dị n’okpuru ọchịchị Oyi na steeti Anambra adịla nambụ chụpụ nwunye ya n’ụlọ ya.   Onye okwupụta okwundị uweojii na steeti Anambra bụ Haruna Mohammed kwuru sị: “Ka ọnwa Juunu dịn’abalị iri abụọ na otu, n’afọ a bụ 2020, n’ihe dịka elekere nke mbụ (1am) nke ụtụtụndị uweojii nke ngalaba Ogbunike nwụchikọrọ otu nwoke aha ya bụ IfeanyịApusiobi; gbara afọ iri atọ na anọ, onye Azu Ogbunike, n’okpuru ọchịchị Oyi nasteeti Anambra.”   Mohammed gara n’ihukọwaa na ndị uweojii bụgara ndị ahụ (victims) ụlọọgwụ ebe dọkịnta nọrọ kwuo na ụmụakaabụọ ahụ anwụọla, ebe nna ya nọzi na-anara ọgwụgwọ.   Otu o sila dị, okwuru na a dọnyela o

A kpụpụla otu nwoke ụlọikpe maka ikwaso ezi iko

ÒA Kpụpụla ma kpụgharịa otu nwoke aha ya bụ Ayokunbi Olaniyin’otu ụlọikpe Majie dị n’Ibadan n’ime steeti Ọyọ, maka ịkwaso ezi mmadụ ikon’ike.   Ya bụ nwoke, bụ onyegbara ahọ iri abụọ na abụọ, ka e kwuru na o bì na mpaghara Eleti–Odo, dị n’ụzọIwo, n’Ibadan, ma bụrụkwa onye ọ bụ ndị uweojii kpụpụrụ ya ụlọikpe ahụ maka arụrụalaahụ ọ rụrụ. Akụkọ kọrọ na nwoke ahụ na-arụ ọrụ n’ebe a na-azụ ezi dịn’otu ụlọ anụmanụ dị na mpaghara Elewi–Odo. Mana ka o sila dị, oge ihe o jiri bụrụnwoke selitere isi wee na-achọgharịzị ihe ọ ga-eri, o jiri nwayọ kpọrọ otu nneezi mara abụba n’ebe ahụ, kpazuga ya n’otu akụkụ, wee mazụrịa ya ebe ahụ. Ọ bụzịoge Maazị Ọlaniyi na-eri ezi ahụ ọkọmbọ ma na-achọkwa ka ọ laa ya n’iyi, ka akakpààrà ya; e wee nwụchikọọ ya, ma kpụpụ ya ụlọikpe. Onye kpụpụrụ nwa amadi ahụ ụlọikpe n’aha ndị uweojii, bụMaazị Opeyemi Olagunju kọwara na ihe ahụ nwoke ahụ mere bụ nsọala ma bụrụkwanke megidere ihe ịdị ka chi siri kèé ya. Ọ gakwara n’ihu kọwaa na arụrụala ahụmègidere ihe mpaghara 214

Ndị Uweojii ejidela nwoke kwasoro obere nwa iko n'ike n'Anambra

OTU nwoke gbara ahọ iri abụọ na abụọ nọ n’aka ịdị uweojiisteeti Anambra ugbu a, maka ịdakpò otu nwatakịrị nwaanyị gbara ahọ ori ma rieya ọkọmbọ n’ike.   Ya bụ nwoke ka ekwuru na aha ya bụ Ikechukwu Okoli, ma bụrụkwa onye obodo Ndiowu dị n’okpuru ọchịchịime obodo ‘Orumba North’ ma biri na mpaghara Uzoegwu dị na Nkpọr, n’okpuru ọchịchịime obodo ‘Idemili North’. Dịka Maazị Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nasteeti Anambra siri kọwaa n’ozi ọ kụpụrụ banyere nwa amadi ahụ e jidere, ya bụnwaokorobịa nọrọ n’abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Juunu a wee kpọkpute ótùnwata nwaanyị gbara naanị ahọ iri n’ime ụlọ ya, wee mazụrịa ya n’ike ebe ahụ. Nke ahụ mezịrị na oge ndị uweojii nwetara ozi banyere nke ahụ,ha biliri ozigbo gaba n’ebe ahụ, wee ga nwụchie ya bụ oke mkpi na-agbara ọhàewu. N’imē nnyòcha, ndị uweojii ahụ gakwara n’ebe ahụ ya bụ ihe nọrọwee mee ma were anya ha hụ. A kpọkwara nwata ahụ gaa ụlọọgwụ, iji lelee ya ahụ, bụkwaebe onye ọrụ ahụike nọzịrị wee gbaa akaebe (oge o mechara

E kwesịrị inye nwoke dakporo nwaanyị n'ike ntaramahụhụ dị egwu

Ị dakpo ụmụnwaanyị ma kwaa ha iko n’ike bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’ụwa niile gbaa gburugburu ugbu a. Ọ bụghị sọ na a na-eme nke a, ụfọdụ n’ime ha ka a na-egbu egbu. Nke a bụ nnọọ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n’isi. Gọọmenti mba dị iche iche na-agba mbọ n’elu na ala iji hụ na e gbochiri ya bụ ajọ ọnọdụ mana a na-ekwu ndị mere eme, a na-eme ya na-agawanye n’ihu. Dịka ndị mmadụ na-eti mkpu ma na-akatọ arụrụala a, onye nta akụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ọtụtụ ajụjụ ọnụ banyere ya: REV Adaobi – Nkea bụ njirimara ọgwụgwụ oge. Ndị mmadụ enwezighị egwu Chineke nke ha na-asọpụrụnjirimara ha. Ụmụ ụwa na-ańụ ọgwụ ike aghara aghara ma na-abakwa otu nzuzo dịiche iche nke na-etinye ha n’ime ihe ala na-asọ nsọ. Ihe ọzọ bụ na ụzọ e si a zụliteụmụaka dị nnukwu mkpa.   Ekwesịghị inye ụmụaka ohere ka ha na-eme ihe sọrọ ha.Umụaka na-elelezi ihe ọjọọ dị iche iche n’onyoonyoo dịka ndị gba ọtọ.Ha jizi ekwentị eme ihe dị ha mma. Egwu dị. N’oge  mbụ, ọbụghị sọ nne na nna na-azụ nwa makana nwa bụ

Anambra azọpụla nnukwu ije ịkwàlite njem nlegharị anya na steeti ahụ

GỌỌMENTI steeti Anambra, site n’aka minịstịrị ya ná-ahụ makaihe na-eme na mba ofesi, omenala, na njem nlegharị anya (bụ ụlọọrụ ‘DiasporaAffairs, Culture And Tourism’) emeela ka a mara ebumnobi ya inwògharị na ịkwàlitèngalaba njem nlegharị anya na steeti ahụ.   Ọ bụ Kọmishọnasteeti ahụ na-ahụ maka ụlọọrụ ahụ, bụ Dọkịta Christian Madụbuko kwupụtàra nke aoge ya na ụfọdụ ndị ụlọọrụ ya, na nakwa ndị isi ọchịchị gọọmenti ala Nigeriazitère, gàrà ileta ka ọnọdụ siri kwụrụ n’ọgbà na ebe nlegharị anya ndị ọzọ dịiche iche e nwere na steeti ahụ.   Ebe nlegharị anya ahụha gara gụnyere Ọgbà ahụ a maara na bekee dịka ‘Ọgbaukwu Cave’, ya na ebe mmirisi n’elu awụdata a maara dịka ‘Owerre-ezukala Waterfall’ bụ nke dịgbàdò n’obodoOwerre-ezukala dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Orumba South’; Ọgbà Ogbunike dịn’okpuru ọchịchị ime obodo Oyi; ebe ndobe ihe ọkpụ Ọlà Kọpa, bụ ‘Bronze Museum’dị n’Igbo-ukwu n’okpuru ọchịch ime obodo Agụata, tinyere ụfọdụ ebe nlegharịanya ndị ọzọ e nwere na steeti ahụ.   N’okwu ya

Ọṅụ dara dịka ụmụ Anambra abụọ gachara ibe ha n'ule JAMB

ỤLỌỌRỤ na-ahazi ule e ji abanye n’ụlọakwụkọ dị elu n’ala anyịbụ Nigeria The Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) ewepụtala aha ndịmere nke ọma n’ule nke afọ a bụ 2020.Mmadụ iri mere nka ọma karia tuuru ugo siten’inweta akara 352 ruo 365.   Onye gbara onye nkembụ bụ onye steeti Anambra ebe onye nke abụọ bụkwazi onye Anambra. MaduafokwaEgoagwụagwụ Agnes gbara onye nke mbụ site n’inweta akara (score) dị 365 ebeNwobi Okwuchukwu David gbara onye nke abụọ site n’inweta akara 363.   Nwaada Mmadufokwa,onye Ihialla nke dị n’okpuru ọchịchị Ihialla na steeti Anambra tinyere ihe ọmụmụIndustrial Chemical Production na mahadum University of Ibadan ebe NwobiOkwuchukwu David tinyere ohe ọmụmụ Mechanical Engineering na Kwara StateUniversity.   N’ihi nke a akana-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano ekpebiela ikele ụmụ Anambra abụọa maka ugo mmụta nke ha tulatara. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Kọmishọna na-ahụmaka mgbasaozi na ịkọwara ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma na steeti ahụ bụ C. Do

Òtù MUNA edebànyerela mmadụ iri ise aha isonye n'atụmatụ ahụ ike ASHIA

ÒTÙ nnọrọonwe a maara dịka MUNA Foundation’ n’aha bekeeakwàdola ndebànye aha ndị mmadụ ruru iri ise n’ọnụọgụgụ n’akwụkwọ atụmatụnchekwa ahụ ike ‘Anambra State Health Insurance Agency’ bụ ‘ASHIA’, ka ha weeso rita urù n’atụmatụ nchekwa ahụ ike ahụ.   Mmadụ iri ise ndị ahụe debànyere aha ha n’akwụkwọ atụmatụ nchekwa ahụ ike bụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyịobodo Ịgbakwụ dị n’okpuru ọchịchị Ayamelụm n’me steeti Anambra. Mmemme idebanyeaha ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Ịgbakwụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị mmadụ sonyere naya, ọkachasị ndị nne na na nna.   N’okwu ya banyerenke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ASHIA, bụ Dọkịta Simeon kọwara atụmatụ ahụ ike ahụ dịkanke magburu onwe ya, ma bụrụkwa nke mịtagoro ọtụtụ mkpụrụ ọma dị iche ichen’ihe metụtara ịkwalite ezi ọọdụ akụ ike ụmụafọ steeti ahụ.   O kelekwara makwupùru òtù MUNA ahụ maka ịghọta mkpa ọ dị idebanyere ndị ahụ aha n’akwụkwọ kaha wee soro rita urù n’atụmatụ ahụ, ọbụnadị dịka o jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuoma dụọ ndị maọbụ òtù dị iche iche bụ ndị aka ji akụ ma

E meela emume icheta ụbọchị ndị ajadu

Image
OTU ụmụnwaanyị ajadu a kpọrọ Virtuous Widows Association ofNigeria emmela ọgbakọ iji cheta ụbọchị ndị ajadu (International Womens Day),nke afọ a bụ 2020.   Ọ bụ n’ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation, Awka bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọNational Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Extra ka ha nọrọ wee mee ya.   N’ozi nnabata ya,onyeisi otu ahụ ma bụrụ onye hibere ya, Oriakụ Ifeyinwa Egbosiuba kwuru na ụbọchịahụ bụ nke mba ụwa (United Nations) wepụtara maka icheta ndị ajadu.   Egbosionu onye kwuruna nsogbu korona metụtara ndị ajadu n’ụzọ dị iche iche kelere gọọmenti ma rịọkwaamaka enyemaka nke dị n’ihu.   Ọ gara n’ihu kọwaana e hibere otu ahụ maka imetụta ndụ ndị ajadu dịka ha na-ebu ibu ịzụ ụmụ ha.Okwuputakwara na ọ na-adụ ha ọdụ oge niile ka ha kpachara anya n’ụdị agwa hana-akpa.   Nwunye aka na-achịsteeti Anambra bụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano, onye nke Oriakụ Michelle Onugbolunọchitere anya ya kelere Oriakụ Egbosiuba maka ihibe otu ndị ajadu bụ ndịsonyeere ndị otu ha na mb

N’Imo, a dakpola ma gbuo nwaanyị ji ụmụ anọ n'ugbo ya, lie ya n’ụmị

EGWU ji ndị Umuchaku Lowa nke dị n’Ihite Uboma na steetiImo, maka ndakpo a dakporo Oriakụ Suzzana Iwuoha bụ nwaanyị jị ụmụ anọ, kwaa yaiko n’ike ma gbukwaa ya; ebe ọ nọ n’Ugbo ya abụ akpụ.   E kwuru na nwaanyị ahụ dị na mbụ gaa rụchasịaahịhịa n’ugbo ebe ọ kọrọ ọpapa/ọkpaala (groundnut) nke dị na Mbaraocha,Umuchaku ma mechazie gaa n’ugbo akpụ ya dịkwa na Mbaruocha ahụ ka ọ bụrụ akpụ,n’ihe dịka elekere abụọ nke ehihie (2pm) n’ụbọchị ahụ, ebe ọ nọrọ wee zute ọnwụya n’aka ndị omekome bụ ndị gburu ya ma lie ya n’ụmị dị n’akụkụ ugbo ya.   Nwa nwaanyị ahụ larammụọ (osote ada ya) Ugochi Iwuoha, gbara afọ iri na iteghete ma bụrụ nwataakwụkwọnọ n’ogo SS2 na Nsu Comprehensive Secondary School, Umunanu kwuru sị na ya nanne ya gara n’ụtụtụ rụchasịa ahịhịa n’ugbo ọpapa/ọkpaala ha dị na Mbaraocha, dịkaha lọtara n’ihe dịka elekere abụọ nke ehihie nne ya gaghachiri n’ugbo ahụ ka ọbụta akpụ ha ga-eri. Na oge ọ kụrụ elekere isii nke uhuruchi, ọ lọtaghị ya nanwaanne nne ya nwoke kpọtara ndị mmadụ ha wee c

Anambra ebidola amụma nkuzi ọrụ aka dị iche iche ọzọ maka ndị ntorobịa

IGBO sị na ọ na-adị mma a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, ana-abachawanye ji, maka na ọ na-abụ ụzọ dị mma, a gaa ya ugboro abụọ.   Ka ọ dị taa, gọọmentisteeti Anambra ekwupụtala njikere ya inye ndị ntorobịa sitere obodo niile dị nasteeti ahụ nkuzi na ọzụzụ ọzọ n’ọrụ aka dị iche iche.   Nke a bụ e kwupụtaran’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, site n’ọnụ Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ makaịkwàdò ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe eji aka emepụta, bụ Ọkammụta TheresaObiekezie, oge o nwechààrà nzukọ, ya na ndị ọrụ gọọmenti nọ na ngalaba naogoogo dị iche iche metụtara ndị ntorobịa.   Isi sekpụ ntị e jirichịkọba ya bụ ọgbakọ bụ iji tụkọta isi nà elò ọnụ banyere ọmarịcha atụmatụ ahụna atụmatụ ndị ọzọ metụtara ndị ntorobịa steeti ahụ.   Ọ kọwara ịkụziri ndịntorobịa ọrụ aka dị iche iche dịka otu n’ime ụzọ kacha mma ma kakwa pụta ìhè apụrụ isi kwàdo ụmụ na-eto eto, ya na otụ ụzọ a pụrụ isi memilaa maọbụ chụọ mpụna arụrụala ọsọ ụkwụ erughị ala n’obodo.   O kwuru na ọchịchị GọvanọWillie Obianọ nwere ezi m

Ọba akwụkwọ Anambra e meela nkụzi pụrụ iche megide ịkwasò mmadụ iko n'ike

DỊKA otu ụzọ isi tụnye ụtụ nke ya n’ịkwàlite ezi akparamagwana ibèlata nsogbu ịkwaso iko n’ike, bụ nke na-arịzị obè ya elu n’ala Nigeriaugbua, ọba akwụkwọ steeti Anambra a maara dịka ọba akwụkwọ Ọkammụta KennethDike dị n’Awka achịkọbala mmemme nkụzi pụrụ iche banyere akwamiko n’ike.   Mmemme nkuzi bụ nkee mere site na njikọ aka ọba akwụkwọ ahụ na òtù nnọrọonwe ‘Davina CareFoundation’, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ ahụ dị n’Amichi,bụ ‘Amichi Branch Library’ dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi South’ nasteeti Anambra.   N’okwu ya n’ọgbakọahụ, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze gbarụrụ ihubànyere etu ịkwaso iko n’ike sizị arị ibe ya elu n’ala Nigeria ugbua, ma kọwaaimetọ mmadụ n’ụzọ akwamiko dịka ihe arụ, ihe obi mgbọwa nakwa ihe jọgburu onweya, ma n’anya Chukwu ma n’anya mmadụ.   Dịka ọ na-arụtụ akan’ụfọdụ nsogbu ịkwaso iko n’iké a kwasògoro ụmụ mmadụ (ọ kachasị ụmụnwaanyị, mandị agadi, ụmụagbọghọ na ụmụntakịrị) n’ebe dị iche iche n’ala Nigeri

Alụmdinanwunye, omenala zuru Igbo ọnụ

ỊLỤ di na nwunye bụ omenala zuru Igbo ọnụ. Obodo niilena-eme ya dịka usoro nke ha siri dị, ma n’ime ihe niile, otu mmiri na-asụn’ite.   Ya mere, tupu nwoke ọbụlaamalite njem ịlụ nwaanyị ọ na-ebu ụzọ gwa ndị mụrụ ya. Ha na-eleru anya ala weechọtara ya onye ọ ga-alụ n’ihi na ịlụ nwaanyị abụghị uri e debi e degharịa.   Mgbe nke ahụgachara, nwoke ahụ na ụfọdụ ndị okenye ezinaụlọ ya na ụmụnna ya ga-ekuli gaa nabe nwaanyị ahụ a chọrọ ịlụ.Dịka anyị maara alụmalụ di na nwunye bụ okwu dịịrịndị okenye, ya mere ọ bụ okenye ga-ekwuputa uche ha ma ha ruo n’ụlọ nwaanyị ahụha chọrọ ịlụ.   Ihe izizi a na-emen’alụm di na nwunye bụ ịkụ aka n’ụzọ na be nke nwaanyị. A na-eji mmanya eme yamakana mmanya bụ isi n’alụm di na nwunye.   Nka ahụ gachaa, abaa ọhịa ajụjụ nke pụtara na ezinaụlọ abụọ ahụ ga-amalite jụba ese onwe ha ijichọpụta ma ha a bụkwa ezi agbọ.   Ọ bụrụ na ha ekwekọrịtana ụmụ ha ga-alụ di na nwunye, ha ga-ezukọtakwa, ebe ezinaụlọ nke nwaanyị ga-agụpụtarandị nke nwoke ihe e ji alụ nwaanyị na be

Egwu ndị Igbo : Nkpọkịtị

NKPỌKỊTỊ bụ ọpụrụ iche dị n’egwu e nwere n’Igbo. E hibere yan’ala Umunze nke dị n’okpuru ọchịchị Orumba South (ochie Aguata) n’afọ 1959. Ọbụ odogwu nwoke, Chief Festus Okoli lagoro mmụọ, onye e ji Ojimgba mara(1927-2009), hibere ya.   Nkpọkịtị Umunze (NkpọkịtịUnique Cultural Dance Group) dịka ndị mmadụ na-akpọ otu egwu ahụ na-eji ụzọ dịiche iche (styles) nke gụnyere irigo n’elu onwe ha wee na-eme ndị na-elele haobi ụtọ. N’ikwu eziokwu, ọ gbara ụwa gharịị etu ha si agba egwu.   Ha gara asọmpi dịiche iche n’ala anyị bụ Nigeria ma turu ugo lọta. N’afọ 1970, dịka steeti niilegbakọtara ka a ṅụrịa maka agha a kwụsịrị; ha gbara ndị nke mbụ wee turu ugoburu ihe onyinye ha laa.   Otu ahụ ka ha si agaasọmpi ma na-agba ndị nke mbụ oge niile.N’ihi ya, gọọmenti Anambra steeti ochiehọọrọ ha dịka egwu steeti ji aga asọmpi egwu ọdịnala.   Dịka ha na-aga n’ihuna-eturu ugo n’ike n’ike n’asọmpi ala anyị, Gọọmenti Etiti kpọrọ ha gaa mba ụwa.Ya mere, n’afọ 1978 ha gara asọmpi na Wernbley England ma merie e

Korona: E kesàárala ndị ihe na-esiri ike ego karịri otu nde naịra n'Ekwulọbịa

NDỊ mmadụ ihe na-esiri ike ruru narị atọ na iri ise n’ọnụọgụgụeritela uru ma keta òkè n’ego nkwàdo dị otu nde naịra na narị puku naịra asaa,bụ nke e kesàrà n’Ekwulọbịa dị n’okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra, n’ihiọrịa nje korona.   Ego ahụ bụ nke ewètara site n’aka òtù a maara dịka ‘Ekwulobia Urban League, United Kingdom,(EULUK)’ bụ òtù jikọtara ụmụafọ obodo Ekwulọbịa bi na mba UK, iji nyere ndịobodo ahụ bụ ụmụnne ha aka, ma bụrụkwa nke e mere site na njikọ aka ụfọdụ ndị ọzọbụ ndị obodo ahụ ọnọdụ ụmụ mmadụ na-emetụ n’obi.   N’okwu ya oge ọna-enyefè ego ahụ n’aka òtù ọrụ na-ahụ maka ihe e ji akwalite obibi ndụ n’obodoahụ, Eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Emmanuel Onyeneke kèlere ndị dị iche ichesoro kwàdo ọrụ obi ebere ahụ maka icheta ụmụnne ha n’oge ihe isi ike a, ma kpọkukwaziendị ọzọ ka ha bụ ndị aka ji akụ ka ha ñòmie ezi akparamagwa dị etu ahụ.   Ndị dị iche ichesoro keta òkè n’ego ahụ gụnyere ndị di ha maọbụ nwunye ha nwụrụ, ndị agadi, ndịamụtaghị nwa, ụmụaka enweghị nne na nn

Nri ndị Igbo: Ofe akwụ

MGBE anyị na-ekwu maka nri ndị Igbo o nwere ihe kpatara e jiekwu ya. Ihe ọbụla a na-eri eri onye Igbo weta ya ọ kwado ya ma sie ya n’udi ọga-abụ na i rie ya ụbọchị ọzọ ọ gụọ gị.   Onye Igbo chọọ isiazụ ọ ga-akwadobe ya n’ụdị ọ ga-abụ na i risia ya o ju gị afọ.   Na nri ndị Igbo nkeizu a, anyị ga-eleba anya n’otu e si esi ofe akwụ. Akwụ bụkwanụ n’ala anyị ka esi eweta ya. Mpaghara ala Igbo ọbụla na-esi ofe akwụ n’udi nke ha. Nke a bụkwaotu anyị si esi ofe akwụ ahụ, onye ọbụla riri ya ojiri ya mara gị.   Egbutu o isi akwụ,ibute ya, igbọsịa, ifesa ya mmiri, ikpuchie ya abalị abụọ ikpapụtachaa mkpụrụakwụahụ. I sachaa mkpụrụakwụ nke ị chọrọ iji sie ofe akwụ nke ọma, isinye ya n’ọkụ,o ghee ị sụọ mkpụrụakwụ n’ikwe.   I ga-eji nwayọọ kaakị dị n’akwụ ahụ ghara ịgbari. I sụchaa ya, I were mmiri dị ńarańara wee fọọya nwa oge ka o wee pụta  ọma, I wepụ avịrịvọiche, I wepụ akị iche. Cheta na mgbe ị na-afọ ya mmiri ị ga-agbanye na ya bụmmiri ị ga-eji sie ya, i were nyọ nwere obere oghere wee zaa ya

Korona: Gọọmenti Anambra enyela ndị ọrụ ahụ ike ọzụzụ nkuzi ọzọ

N’IJI kwalitekwuo agha ahụ a na-ebu megide ọrịa korona n’imesteeti Anambra, Gọọmenti steeti ahụ amalitela ịchịkọba ọzụzụ na nkuzi ọzọnyegara ndị ọrụ ahụ ike na steeti ahụ, iji kwadobe ha maka ọrụ chere ha n’ihu.   Ọgbakọ nkuzi ahụgá-éwè mkpụrụ ụbọchị anọ bụ nke a chịkọbara site n’aka ụlọọrụ gọọmenti a maaradịka ‘Anambra State Primary Healthcare Development Agency’, ma bụrụkwa nkena-ewere ọnọdụ ugbua n’ime okpuru ọchịchị ime obodo iri abụọ na otu e nwere nasteeti ahụ. Ọ bụkwa ụlọọrụ ‘National Primary Healthcare Development Agency’na-akwàdo ya bụ ọgbakọ nkuzi.   N’okwu ya n’Amawbịa,bụ ebe ọgbakọ nkuzi ahụ na-ewere ọnọdụ n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Awka South’,onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Primary Healthcare Development Agency’ bụ DọkịtaChioma Ezenyimulu mere ka a mara na ịkọwara ndị mmadụ ihe ha kwesiri ịmabànyere ọrịa nje korona so n’otu ụzọ pụtara ihe a pụrụ isi belata mgbasa ọrịaahụ.   Ọ kọwara na ọ bụ etugọọmenti steeti ahụ siri malitezị ime nnyocha aghara aghara iji mara ndị bu ọrịa

Cater ekesaara ndị Aguata ihe enyemaka maka korona

ONYE na-anọchite anya ọgbọnta vootu Aguata 1 n’ụlọ nzukọomebe iwu steeti Anambra (Anambra State House of Assembly) Hon. Dr. Cater DikeNnamdi Umeh ekesakwaala ihe enyemaka ọzọ maka korona na wọọdụ iteghete nkemejuputara ọgbọnta vootu Aguata 1. Nke ahụ bụ agba nke atọ ya ọ na-eme kemgbekorona jiri malite.   Nkesa lhe ndị ahụ bụnke a haziri n’ụzọ bụ ịgba kpalitere aṅụrị na ịgọ ọfọ ọma n’ime ndị mmadụ.   N’okwu ya mgbe a nọn’emume ahụ, Hon. Umeh kọwara na n’agbanyeghị ihe isiike n’oge ugbu a n’ihi korona na ya gbara mbọ inyere ndị ọ na-anọchiteanya ha aka, ma rụtụkwa aka na ya na-etinye Aguata 1dịka nke mbụ n’ihe ọbụla yana-eme.   Ọ gara n’ihu kọwaana ya kesara agba mbụ nke ihe enyemaka ahụ site n’aka ndị kanselọ mejupụtara ọgbọntavootu Agụata 1, ma bụrụ ihe ndị gụnyere puku kwuru puku sanịtaịza, ihe e jiekpuchi ihu (face masks) na ihe ndị a na-agba n’aka (glooves) ma tinyekwarankuzi na mgbazi nke a haziiri ọha mmadụ niile banyere ihe ha kwesịrị ịma makansogbu korona (intensive sensitizati

Ndị uweojii Anambra ejidela otu onye maka òtù nzuzo, napụta ya egbe

NDỊ ọrụ uweojii na steeti Anambra ejidela otu onye a na-enyoènyò na ọ bụ onye òtù nzuzo, ma napụtakwa ya égbè o ji eme mkpamkpa.   Nke a bụ nke e mereka a mara site n’ozi onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii nasteeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed kụpụrụ, bụkwa nke o siri na ya kọwaa na ọbụ ngalaba ọrụ uwe ojii pụrụ iche na-ahụ maka ibu agha megide otu nzuzo, bụ‘Special Anti-cult Section (SPACS)’ jidere ya bụ nwa amadi.   Dịka ozi ahụ siri kọwaa,nwa amadi ahụ e jidere, bụ Maazị Amaechi Stanley (onye gbara ahọ iri abụọ naise) ma bụrụkwa onye Obosi dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nasteeti Anambra, ka e jidere n’abalị asatọ nke ọnwa Juunu a, oge ndị òtù SPACSahụ nwetara mkpesa na ozi banyere ya.   Ka ọ dị ugbua, nwaamadi ahụ ejirila ọnụ ya gbaa sàá asịsà ma kwuo n’eziokwu na ya bụ onye otunzuzo a maara dịka ‘Black Axe’. E nwetakwara égbè na mgbọ egbe n’aka ya.Nnyocha e mere kọwakwara na nwa amadi ahụ so n’òtù ndị na-apụnara ndị mmadụ ụgbọalana ihe ndị ọzọ n’ike.

Ụlọọrụ ANSPPB akụtusiela ụfọdụ ụlọ ndị mmadụ rụrụ n'ala gọọmenti Anambra

IGBO dị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o meeemee, ọ hụ ahụ.   N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra akụtusiela ụfọdụ ụlọ na ihe ndị ọzọ dị iche iche ndị mmadụ rụrụn’ala ya, na mpaghara ebe dị iche iche n’ime steeti ahụ, ma kparàghachikwa alaya.   Ọrụ ịkụtusi ụlọ ahụbụ nke a bàgidere site n’aka ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka atụmatụ ewumewu, bụ ụlọọrụ‘Anambra State Physical Planning Board (ANSPPB)’ na njikọ aka ụlọọrụ nchekwa dịiche iche na steeti ahụ, nke gụnyere ụlọọrụ ‘Operation Clean and HealthyAnambra (ỌCHA Brigade)’ tinyere ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ.   E buru ụzọ malite ọrụahụ ụnyaahụ bụ Wenezdee n’Ịgbarịam dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Oyi; ma oge ndịòtù ọrụ ahụ ruru ebe ahụ, ha hụrụ ka ọrụ na-gawanye n’ihu n’ala ahụ, bụ ebe ana-arụ ọdụ ahịa, n’agbanyeghị na a dọọla ha aka na ntị ka ha kwụsị ọrụ ebe ahụma sepụ aka n’ala ahụ. Ndị òtù ọrụ ahụ wee kụọ ihe ahụ a na-arụ jàà-jàà makparàghachi ala gọọmenti ahụ.   Ha sikwara n’ebe ahụwee gaa na Nsugbe dị n’okpuru ọchịchị ime ob

N'Imo, otu nwaanyị atapụla ihe nwoke di ya

NDỊ uweojii kọmandi steeti Imo ekwuputala na ha nwụchikọrọotu nwaanyị gbara afọ iri abụọ na ise maka ịtapụ amụ di ya. Nwaanyị ahụ kparaarụ ahụ dịka di ya na-arahụ ụra.   Ya bụ ihe nke merensonso a n’Umuofuga Umuhu nke dị n’okpuru ọchịchị Aboh Mbise, na steeti Imo kae kwuru na o nyeghị ndị obodo ahụ ọnụ okwu.   Nwanne (cousin)nwoke ahụ, Udochukwu Nwimo kwuru na enyi nwoke nwaanyị ahụ n’oge gara aga bịaraụbọchị ahụ were ọgbatumtum buru ya pụọ ma bughachie ya azụ na be di ya n’imeabalị. Ozugbo ọ batara ụlọ, di ya onye nke were iwe n’ihi ihe ahụ merenụ jụrụya ebe o si, nke ahụ mere na ha bido lụba ọgụ. Udochukwu kwuru na ụfọdụ ndịagbataobi bịara gboo ha ọgụ.   Ọ gara n’ihu kọwaana ka o ruru n’etiti abalị ha nụrụ oke mkpu nke kpọtere ha n’ụra, ọ bụ otu ahụka ha si chọpụta na nwaanyị ahụ atapụla amụ di ya ka ọ na-arahụ ụra. Ha bugaraya ụlọọgwụ n’abalị ahụ.   Dịka o siri kwu, ihenwoke ahụ jiri bụrụ nwoke nwere ike ọ gaghị arụkwa ọrụ ọzọ n’ihi mmeru ahụ.   Otu o sila dị, ndịntorobịa iwe na-ewe

Gọọmenti Anambra ga-amalite ijide ụgbọala na imechi ọdụ ụgbọala dara iwu korona

IGBO sị na ọ na-adị mma ibu ụzọ maa ọkwa mmiri tupu ozuzoya, maka na ekwughị ekwu màrà ọnụ, ebe anụghị anụ màrà ntị.   N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ekwuola na ọ ga-amalite ịnwụchi ụgbọala na imechi ọdụ ụgbọala dịiche iche na-adịghị erube isi nye iwu ahụ gọọmenti tiri banyere ọrịa njekorona, malite n’izuụka a.   Nke a bụ nke e kwupụtarasite n’ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Maazị AfamMbanefo, n’ọgbakọ ya na ndị isi òtù dị iche iche jikọtara ndị na-anyà ụgbọalana steeti ahụ nwèrè n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   Dịka o siri kọwaa,atụmatụ ọhụụ a bụ nke ọ bụ ndị òtù ahụ na-ahụ maka itinye amụmà iwu korona n’ọrụna steeti ahụ gà-etinyekwa ya n’ọrụ, ma bụrụkwa nke a ga-ejikwa ụlọikpe ngagharịwee na-etinye n’ọrụ, iji na-ekpe ndị dara iwu ahụ ikpe ozigbo a nwụchiri ha.   Ọ kpọkuru ndị nwere ọdụụgbọala dị iche iche na ndị isi òtù jikọtara ndị na-akwọ ụgbọala na steeti ahụka ha kụziere ndị òtù ha ihe ha kwesiri ịma banyere nke ahụ nakwa ntaramahụhụ dịiche ic

N'Akwa Ibom, iju mmiri achụpụla ọtụtụ mmadụ n'ụlọ

OKE mmiri ozizo nke kpatara iju mmiri (flood), emebiela ụlọ ọnụọgụya ruru otu narị, ma chụpụ ihe ruru narị mmadụ atọ n’ụlọ n’okpuru ọchịchị Eketdị na steeti Akwa Ibom.   Maazị Ubong Markonye bi n’Edem Udom dị n’Eket, oge ọ na-ekwuputa ka o siri me kwuru na yaataala ahụhụ site n’iju mmiri n’ebe ahụ kemgbe afọ asatọ.   O kwuru sị; “Ijummiri nke taa dị egwu n’ebe m nọ. Anọ m n’ụlọ na-akwado ịga ụka oge mmiribidoro batawa n’ụlọ m. Dịka m na-agwa ụnụ ugbu a, atụfuola ọtụtụ ihe m ji birin’ụlọ dịka akwụkwọ, eletrọniki, akwa, laptọọpụ na ọtụtụ ngwongwo m ndị ọzọ.”   Mark gara n’ihu kwuona ya bụ ọdachị etinyela ọtụtụ ndị bi ebe ahụ, tinyere ndị nwe ụlọ ahịa (shops)na nsogbu. O kwuru na ngwongwo gburu nde kwuru nde naịra alaala n’iyi n’ihi ijummiri na-eto n’Eket.   Otu o sila dị, ọ kpọkurugọọmenti ha ka ọ gbata ọsọ enyemaka.

Gọvanọ Obiano na nwunye ya ekeleela ndị uweojii jidere onye ji egbe jee ohi n'Awka

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano ekeleelandị uweojii asatọ bụ ndị jidere onye ohi ma gbochie ya ịkpa mkpamkpa n’otu ụlọụkadị n’Awka, isi obodo steeti ahụ. O nyere ha nde naịra abụọ (N2million).   Nwunye gọvanọ bụOriakụ Ebelechukwu Obiano (Osodieme) bunyekwaziri ndị uweojii ahụ akpa osikapa(25kg) n’otu n’otu.   Onye okwuputa okwundị uweojii kọmandi ahụ, Haruna Mohammed nọ n’izuụka gara aga kwuo na ndịuweojii jidere onye ohi nke chọrọ ịnapụ otu onye si n’ụlọụka akpa ya nke ego dịn’ime ya.   Haruna dịka ọna-ekwuputa maka onyinye ahụ nke si n’aka gọvanọ kwuru sị na His ExcellencyChief Willie Obiano nyere ndị uweojii jidere onye ohi na njikọ ụzọ ‘Regina CeliJunction’ dị n’ụzọ awarawara si Enugu gaa Onitsha n’Awka. Ya bụ ihe bụ iji weekelee ha ma mee ka ndị ọzọ soro nzọ ụkwụ ha.   Haruna kọwakwara nanwunye gọvanọ bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano nyekwaziri ha akpa osikapa anọ(50kg).   O kwuru sị na ndịuweojii ahụ gụnyere inspektọ atọ, sagentị anọ na otu kọnstable bụ ndị nọ nang

Mmadụ abụọ nwuru n’ihe mberede okporo ụzọ mere n’Anambra na izu a – FRSC

OKE ihe mberede okporo ụzọ adapụtala ma taa isi mmadụ abụọmmadụ, merụọkwa ọtụtụ ndị mmadụ ahụ na nso-nso a n’ime steeti Anambra.   Maazị PaschalAnigbo, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta oheneze na ụlọọrụ ‘Federal Road SafetyCorps (FRSC)’ na steeti Anambra mere ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụrụ ụbọchịTuzdee, n’aha onyeisi ụlọọrụ ahụ na steeti ahụ, bụ Maazị Andrew Kumapayi.   O mere ka amara naihe mberede ahụ weere ọnọdụ n’ihu ọdụ ụgbọala ‘Peace Mass Transit’ dị nampaghara Upper Iweka, n’Ọnịtsha, ma kọwakwa na ọ bụ ngharịpụ nke ihe e ji akwụsịụgbọala, bụ breeki kpàtàrà ya bụ ihe mberede okporo ụzọ.   Dịka o siri kọwaa,breeki nnukwu ụgbọala Tipa (nwere akàrà XA44NSK) gharịpụrụ ya, onye na-anya yawee jirizie oke ọsọ wee kwokanye ya n’ebe ndị mmadụ nọ, wee kwọrikọọ mmadụ abụọ,merụọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ. Ndị ahụ nwụrụ bụ otu nwata nwaanyị na-arụrụ onwe yaọrụ na mampaghara ahụ na otu nwata nwoke ọzọ, bụ ndị ọ bụ n’ụlọọgwụ Toronto dịn’Ọnịtsha ahụ ka Dọkịta nọrọ wee gbaa akaebe na ha a nwụọla,

Ihe mberede okporo ụzọ ọzọ emeela n'Onitsha, merụọ mmadụ atọ ahụ

KA ọ gachaara otu izuụka kpọmkwem ihe mberede okporo ụzọtara isi mmadụ isii n’Ọnịtsha, ihe mberede okporo ụzọ ọzọ adapụtakwa n’Ọnịtshaahụ, ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.   Nkọwa banyere ihemberede okporo ụzọ ahụ bụ nke a gbara n’anwụ site n’ozi a kụpụrụ site n’aka ụlọọrụna-ahụ maka ije awele okporo ụzọ, bụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’,ngalaba ya nke steeti Anambra, bụ nke onye na-ahụ maka mgbasa ozi n’ụlọọrụ ahụ,bụ Maazị Paschal Anigbo kụpụrụ n’aha onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Maazị AndrewKumapayi.   Dịka o siri kọwaa,ihe mberede ọhụụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Tuzdee na mpaghara ahịa ebe ahụa na-ere akụrụngwa e ji arụ ụlọ, bụ ‘Building Materia Market’ n’okporo ụzọawara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha.   Akụkọ kọrọ na ihemberede ahụ dapụtara oge ihe e ji akwụsị ụgbọala bụ breeki gharịpụrụ otu onyebu ụgbọala Mercedes Benz 911 nwere akara XB206AGU n’ihi na ọ na-agba oke ọsọ; owee kwòro ọsọ sukanye isi n’ebe e dobere ihe a kpụrụ akpụ e ji akpa ókè n’ụzọ,wee kpọrikọọ ụgbọala ya ebe ahụ  

Na Kano, e jidela nwoke dakporo ụmụnwaanyị iri anọ n'ike n'otu afọ

A NWUCHỊKỌỌLA otu nwoke dịka ọ dakporola ma kwaa ụmụnwaanyidị iri anọ (40) n’ọnụọgụ iko n’ike n’otu afọ, n’ime otu obodo nke dị na steetiKano.   Onye okwuputa okwundị uweojii na steeti ahụ, Abdullahi Haruna kwuru na ọ bụ otu nwaanyị jiderenwoke ahụ n’ime ọnụ ụlọ (bedroom) ụmụ ya. Dịka o siri kwu, nwoke ahụ gbara ọsọma ndị agbataobi chụrụ ya ọsọ, wee jide ya.   Ndị ahụ a dakporo gụnyereagadi nwaanyị gbara afọ iri iteghete na ise, iri asatọ, ma tinyere ụmụaka, mandị dị afọ iri. Dangora bụ obere obodo na steeti Kano.   Eze obodo ahụ bụAhmadu Yau kwuru na ya bụ nnwuchikọ a nwụchikọrọ nwoke ahụ dabara nke ọma. Okwuru sị’ “Ndị Dangora na-enwe ańụrị n’oge a, anyị nwere olile anya na a ga-enweikpe mkwụmọtọ.”   Ndị bi n’ogbe ahụgwara ndị nta akụkọ na ha bi n’ụjọ n’ime otu afọ, ọ bụladi n’ime ụlọ ha, n’ihina ha nụrụ na onye na-awakpo ma na-akwa ụmụnwaanyị iko n’ike na-arị elu aja(fences) ndị mmadụ wee na-abata na-akwa ụmụnwaanyị iko n’ike n’ime ụlọ ha.   Otu nwaanyị kwuru sị;“Anyị ga-arahụzi ụra

Mmadụ asaa si otu ezinaụlọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ si Ogidi gaa Abatete

MMADỤ asaa si n’otu ezinaụlọ atụfuola ndụ ha n’ihe mberedenke mere n’okporoụzọ si Ogidi gaa Abatete dị n’okpuru ọchịchị Idemmili North nasteeti Anambra.   Ọ bụ na Satọdee izuụkagara aga ka njinji ahụ jiri ka ha na-aga akwamozu.   Ọ bụ ụgbọala tipa(Mercedes Benz tipper) bu aja na bọọsụ (Mercedes Benz 608) bu mmadụ iri naiteghete ka ya bụ ihe mberede dakporo, ma bụrụ nke hapụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyereotu obere nwa na mmeru ahụ.   Dịka otu onye ọ nọka o mere si kwu, tipa ahụ kụturu ụgbọala bọọsụ ahụ n’ihi na otu ụkwụ taya yagbawara nke mere na ọ kwọ ụgbọala ejikwataghị ya.   Onye ọrụ nchekwanjem okporoụzọ (Sector Public Education Officer) nke Federal Road Safety Corps,Pascal Anigbo onye kwuputara na ya bụ ihe mberede mere n’eziokwu kọwara na a dọnyelaozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n’ọba ọzụ ebe ndị meruru ahụ na-anara ọgwụgwọ.   O kwuru sị; “Anyịnatara oku maka ihe mberede okporoụzọ nke dapụtara n’akụkụ Buckle Polytechnicn’ụzọ si Ogidi gaa Abatete. E zigara ndị ọrụ FRSC nke kọmandi Nteje ebe ahụo

Ndị omeiwu Anambra ewerela ekpere mee ncheta ọgbụgba otu afọ ha jiri bido ọrụ

NDỊ omeiwu steeti Anambra (agba nke asaa ya) emerùbe mmemmencheta ọgbụgba otu ahụ ha jiri banye n’ọrụ.   Oke mmemme ahụ bụnke weere ọnọdụ n’ogige ụlọ omeiwu ahụ dị n’Awka, ma bụrụkwa nke e jiri àjàmaasị dị asọ wee malite, bụ nke ọ bụ Bishọọpụ ụka Katọliiki na dayọsiisi Awka,bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor nọ n’isi ya.   N’okwu ya na mmemmeahụ, ọkaokwu ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kọwapụtara afọ ojuju yabanyere etu ndị omeiwu ahụ sigoro rụọ ọrụ n’ime otu ahọ gara aga n’ihi na haagharịpụghị steeti ahụ maọbụ ndị ha na-anọchite anya ha n’ụlọ ome iwu ahụ.   Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụihe dị iche iche ha mepụtara n’ime otu ahọ gara aga dịka ndị omeiwu, ọ kachasịdịka o siri metụta imepụta atụmatụ iwu bụ ịgbà, ịhụ na ihe na-aga etu o kwesirin’ọchịchị steeti ahụ, ịnọchite anya ndị ọgbọ nta nkwàdo ha etu o siri kwesi,tinyere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ ha sigoro rụpụta ihe anya na-ahụ; ma kwekwazie nkwàna ha ga-aga n’ihu ịrụ ọrụ etu o siri kwesi, ya na ijikọ aka ọnụ n’ọrụ, ha naisi ọchịchị steeti ahụ.  

Otu nkwalite ọdịmma ụmụaka ekwuola mkpa imechi ọrụ na-iji ụmụaka akpa ego bara

ONYEISI chọputara otu a kpọrọ Beecharity Outlook Foundationbụ nwaada Iwuoba Ogechukwu Blessing enweela mkparịta ụka nke dị n’etiti ya naonyeisi na-elekọta ụlọọrụ Anambra Newspaper and Printing Corporation ma bụrụkwandi na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, nakwazị SportsLightXtra, bụ Sir Chuka Nnabuife n’ọfiisi ya iji nye nkwodo banyere atụmatụ mmegideajọ ọnọdụ ụmụaka n’ụwa niile ma bụrụ nke otu ahụ kpọrọ Say No To Child Labour.   Iwuoba ekwuola naotu ahụ ga-eme ncheta ọnọdụ ọjọọ ụmụaka na mkpụrụ abalị iri n’ọnwa June naSteeti Anambra. O kwuru nke a na mkparịta ụka nke dị n’etiti ya na onyeisi ụlọọrụANPC, Sir Chuka Nnabuife n’Awka.   Ọ kọwara ya dịka ọnọdụjọgburu onwe ya n’etiti ụmụaka na ndi na-azụ ha n’ụzọ dị iche iche. Iji maa atụ,ọnọdụ agụghị akwụkwọ ma ọ bụ Almajiri ma kwue na ncheta ahụ ga-abụ ịgbasa ozin’ụzọ Televishọn, Redio nakwazi akwụkwọ akụkọ nke Anambra iji megide mmegbụ ma ọbụ agaghị akwụkwọ ụmụaka n’ala Nigeria.   N’okwu ya, ọ sịrị nammemme ahụ bụ nnọọ nk

Korona: Ụmụafọ Ossomala bi na USA ekesàràla ndị obodo ha erimeri

ỤMỤAFỌ obodo Ossomala dị n’okpuru ọchịchị Ọgbaru bi na mbaUSA ekesàarala ndị obodo ahụ akpa osikapa ruru iri abụọ na asatọ n’ọnụọgụgụ,iji belatara ha agụụ na ihe isi ike ndị ọzọ ha nwere ike ịdị na-agabiga n’imeoge ugbua n’ihi ọrịa nje korona.   N’okwu ya na mmemmeikesà erimeri ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ IgweVictor Awogu; onye nyefere ihe ndị ahụ n’aka ndị obodo ahụ (n’aha ndị butereya), bụ Oriakụ Ijeoma Uche kọwara na ọrịa korona a metụtara ma onye ukwu maonye nta n’ụzọ dị iche iche.   Ọ kọwara na ọbụnadịndị ahụ butere ihe erimeri ahụ ka e kesesàára ha ketàkwàra òkè na mmetụta nkeoge ọrịa korona a, n’ihi na ha anaghịzị aga ọrụ ogologo oge niile ahụ gọọmentimba USA tiri iwu onye apụtakwala ezi; kama na o metụrụ ha n’obi inyere ha bụ ụmụnneha aka, bụzị nke mere ha jiri kpebie ikesàrà ha akpa osikapa ahụ.   N’okwu nke ya nammemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Victor Awogu, nke onye nọchitereanya ya bụ otu onye n’ime ndị ichie ya, bụ Maazị Patrick Chukwu

Egwu ndi Igbo: Egwu n’ifo

EGWU Ifo (folk music) so n’egwu ndị Igbo nwere. Ọ bụ egwu ana-agụ nke na-adị n’ime akụkọ ifo.   Dịka anyị maara, akụkọifo dị ọkpụtọrọkpụ n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ haomenala,otu ha si hụta ụwa,nsọ dị iche iche ha na-asọ,nkwenye ha na ihe ndị ọzọbanyere obibi ndụ ha.Akụkọ Ifo bụ usoro mmụta bụ ịgba nke na-esi n’aka fere akawee na-aga.   A na-akọkarị akụkọifo na mgbede abalị, n’oge egwu ọnwa tinyekwara oge ezumike.   Ọtụtụ akụkọ ifona-enwe egwu.Egwu ifo na-atọ ụtọ. Ọkọakụkọ na-agụpụta, ndị ọ na-akọrọ ana-ekwe. Ọmụmaatụ egwu ifo: Mbe agaba……… Ajambene Mbe agaba………. Ajambene Gaagaagaagaa    Ajambene   Otu o sila dị, onwere otu nwaanyị haziri Egwu Ifo, mee ka ụwa mata na ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ. Oji olu ya na-ada ka ogene wee mee ka Egwu Ifo gazuo ụwa niile.   Onye m na-ekwu makaya bụ Nelly Uchendu MON.Ọ bụ onye Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steetiAnambra.Site n’ịgụ Egwu Ifo, ala Nigeria nyere ya nkwanye ugwu ‘Member of theOrder of Niger ‘(MON).   Odogwu nwaanyị

Nri ndị Igbo: Ofe Onugbu

NRI ndị Igbo niile mara mma nke ukwuu. Ezinaụlọ ọbụla kwesịrịịdị na-esi nri ndị Igbo n’ụlọ ha maka na ndị mgbe ochie adịghị eje ụlọọgwụ mgbeniile, ha adịghị achọ ọbara achọ maka na nri ndị Igbo bụ ọgwụ n’ihi ọtụtụ iheha ji esi nri ha.   Na nke ụbọchị taa,anyị ga-esi ofe naani ndị Igbo na-eri. Ọdịkwa ndị mpaghara e ji ofe ahụ maranke ọma ma na ka ọ dị taa obodo Igbo niile na-enwe mmasị n’ofe ahụ. I ga-asikedu nri ma  ọ bụ ofe a na-ekwu maka yaotu a. Ofe ahụ bụ ofe onugbu ma ọ bụ ofe ede dịka ndị sị asụ.   Otu a ka e si esiofe onugbu. E jikwa ọra esi ofe ede mana nke anyị na-ekwu maka ya taa bụ ofeonugbu. Ị chịta ede, ị ga-eji si ofe ị sachaa ya nke ọma ka aja ghara ịdị naya, I sinye ya n’ọkụ, o ghee iwepu azụ ede ahụ, ị sụọ ya n’ikwe. Mgbe ị na-asụede ahụ i sinye anụ na okporoko ị ga-eji sie ofe.   Etinyela yabaasin’anụ ahụ, were naanị nnu na magị sikọọ ya, ọ ga-eme ka ị mara ezi ụtọ ofe ede.Anụ na okporoko ahụ ghee, ịgbanye mmiri ị ga-eji sie ofe gị, I were obere ngajina akọrọ ede ahụ

ANSAA amalitela ịkụtùsi ihe mgbasa ozi azụmahịa iwu akwadóghị na Nnewi

ỤLỌỌRỤ ahụ na-ahụ maka ịgbasa ozi azụmahịa na steetiAnambra, bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Signage and Advertisement Agency (ANSAA)’amalitela ịkụtùsì ihe mgbasa ozi azụmahịa (bụ ‘Billboard’) e tinyesiri n’ebeiwu akwadoghị, ndị tara nchara, na dị nke mebisiri emebi na Nnewi, dị n’okpuru ọchịchịNnewi North.   Dịka onyeisi ụlọọrụANSAA, bụ Maazị Jude Emecheta siri kọwaa, ọrụ ịkụtusi ihe ndị ahụ bụ nke emegoro n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ na mgbe gara aga, ma bụrụkwa nke aga-emekwa na mpaghara ebe ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ, nke gụnyereEkwulobịa, Ọnịtsha na ụfọdụ ebe ndị ọzọ.   N’okwu ya bànyerenke ahụ, onye duru ndị ahụ wee bagide n’ọrụ ahụ, bụ Maazị Chijioke Agbanyim kpọkùrùma dụọ ndị Anambra ka ha gba mbọ na-enweta nkwàdo site n’aka ụlọọrụ ANSAA tupuha amalite itinye maọbụ iguzobe ụdị ihe mgbasa ozi azụmahịa ọbụla nna mpagharaebe ọbụla na steeti ahụ.   Ọ katọrọ etu ụfọdụsi etinye nke ha aghara aghara n’ebe ezighị ezi, ma n’okpuru ebe eriri ọkụ garanakwa ebe ndị ọzọ adịghị mma n’anya

Nwaanyị Nigeria a kpọbara ka ahịa na mba Lebanon ajụla ịlọta ka a zọpụtachara ya

Ọ ONYEISIOCHE otu na-ahụ maka ndị ala anyị nọ mba ọzọNigerian Diaspora Commission (NIDCOM) bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuputala na otunwaanyị onye Nigeria aha ya bụ Peace Busari onye nke a chọrọ irefu dịka a kpọbaraya ka ahịa na mba Lebanon ajụla ịlọghachị ala Nigeria.   Onyeisioche NIDCOMonye kwuru nke a n’izuụka gara aga dịka ya na Ambasadọ mba Lebanon na Nigeria bụHoussan Diab na-akparịta, kọwara na nwaanyị ahụ anabataghị oku niile a na-akpọya ka ọ lọghachi Nigeria.   Dabiri kwuru naBusari onye nke gbara afọ iri atọ na atọ kwuru na ya enwetala ọrụ ọzọ nke merena ya chọziri ịnọ na mba Lebanon.   Ọbụladi arịọrịọ gọọmentisteeti Oyo rịọrọ ya e meghị ka ọ gbanwee obi ya n’ihi na ọ nọ na-ekwu na okpebiela ịnọ mba ahụ.   Dabiri-Erewa kwuru sị;“Ọ bụrụ maka nwaanyị Nigeria ahụ onye nke anyị gbara mbọ zọpụta, onye nke amara ọkwa (advert) ire ya n’ọnụ ego $1000, Ambasadọ ahụ gwara anyị na onyekpara arụ ahụ bi na mba Lebanon. Nke bụ eziokwu bụ na o kwuru na ya achọghị ịlọchighaNigeria, dịka ọ kọwar

Nne Sam Okwaraji alaala mmụọ

JANET Okwaraji alaala mmụọ. Ọ bụ nne Sam Okwaraji, nwaokorobịanwụrụ ka ọ na-agbara ala anyị bụ Nigeria bọọlu.   Janet gbara afọ iriasatọ na atọ tupu ọ laa mmụọ. Onye kwuputara banyere ọnwụ ya bụ diọkpara ya bụPatrick Okwaraji.   Patrick kwuru na agwala minista na-ahụ maka egwuregwu n’ala anyị bụ Sunday Dare na ndị otuNigeria Football Federation (NFF) banyere ọnwụ ahụ.   Ọ kọwakwara na ezinaụlọha anọkọbeghị iji kwuputa usoro akwamaozu, ma kwukwaa na ha na ndị Umudioka nkedị n’Orlu na steeti Imo ka ga-enwe nzukọ banyere nke ahụ.   Onyeisiala Nigeria bụMuhammadu Buhari ezigarala ezinaụlọ Okwaraji ozi nkasiobi. Buhari n’ozi nke sin’aka okwuputa okwu ya Femi Adesina kwuru na dịka onye nne nke nwa ya nwụrụsite n’ụzọ ntụmadị, na o kwenyere na e kwesịrị ikene (acknowledge) Janet makankwụdosi ike n’agbanyeghị ọdachị.   Ka anyị cheta na nwaJanet bụ Sam Okwaraji dara ma nwụọ ebe ọ na-agbara ala anyị Nigeria bọọlụ ka ọnwaỌgọstụ dị n’abalị iri na abụọ n’afọ 1989.   Adesina kwuru sị;“Onyeisiala kwen

Gọvanọ Abia ebutela ọrịa korona

GỌVANỌ steeti Abia bụ Okezie Ikpeazu ebutela korona. Ka ọ dịugbu a, ọ nọzi na nchekwa (isolation) ma na-anara ọgwụgwọ.   Dịka Kọmishọna na-ahụmaka mgbasaọzi na steeti ahụ John Kalu si kwu, igwe ndị ọrụ ahụike nọ na-aghaike n’anwụ n’ebe ọ nọ.   Kalu kwukwara na Gọvanọahụ agwala osote ya bụ Ude Chukwe ka ọ na-arụ ọrụ n’aha ya n’oge a ọ na-anara ọgwụgwọ.   Dịka o siri kwu, GọvanọIkpeazu adịla na mbụ nye ndị NCDC ọbara ya maka nnyocha, ma gwakwa ndị ọrụ yaka ha mee otu aka ahụ, ma ọbara ya gosipụtara na o bughị nje korona.   Ọ gara n’ihu kwuo sị:“Ụbọchị Tọọzdee ọnwa Juunu dị n’abalị anọ n’afọ a bụ 2020, Gọvanọ hafekwara ọbaraya maka nnyocha ọzọ na laabụ NCDC, o wee bụrụ na o bu korona. N’ihi ya, GọvanọIkpeazụ nọzi maka nchekwa n’usoro NCDC ebe ndị ọrụ ahụike maara ihe ekwe na-akụna-elekọta ya iji hụ na o nwetakwara ahụike.”

Korona: Gọọmenti Anambra ewepụtala usoro akwamozu ọhụrụ

IGBO sị na ọ na-abụ egwu dagharịa, a tụgharịa ọkpà egwu,maka na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.   N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ewepụtala usoro ọhụụ a ga na-agbasozị wee na-akwa ozu n’imesteeti ahụ, iji belata mgbasa ọrịa nje korona na ya bụ steeti.   Nke a bụ nke e mereka ụwa mara site n’ozi a kụpụrụ n’isi mbido izuụka a banyere usoro ọhụụ ahụ, bụnke ọ bụ ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu binyereaka na ya.   ỌkammụtaChukwulobelu sikwara n’ozi ahụ chètara ọhaneze steeti ahụ na Gọvanọ WillieObianọ ebinyela aka n’akwụwkọ iwu korona, bụ nke kpọpụtasịrị ntụziaka dị icheiche a ga na-agbasozị na steeti ahụ ugbua maka ọrịa ahụ, ya na ntaramahụhụ dịịrịonye ọbụla nupùrù isi na nke ọbụla n’ime ya.   Dịka o siri dịn’usoro ọhụụ ahụ e wepụtara a ga-esi na-akwazị ozu, onye ọbụla mmadụ nwụnahịrịga-eli ya ozigbo, ma bụrụkwa nke a ga-eme n’ịgbaso ntụziaka ahụ gọọmenti nyeremaka ibelata mgbasa ọrịa korona.   Ozi ahụ a kụpụrụ kọwarana a gaghị na-akarịzịkwa mma