Posts

Showing posts from May, 2020

ANPC ehibela Ugbo Azụ Ụnọ ha

NDỊ ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation(ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa naSportsLight Xtra nọ na Fraidee gara aga ọnwa Mee dị n’abalị iri abụọ na abụọwee gbapee (flag off) ugbo ha nke a kporo Ugbo Azụ Ụnọ.   Ya bụ amụma bụ nke abagidere iji kwado mbọ Gọvanọ Willie Obiano na-agba maka ịhu na nri zuuru ndịAnambra.   N’okwu ya na mmemmeahụ, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasara ọrụugbo, Chief PaulNwosu onye nke onyeisi ụlọọrụ Clear Drainage and Forest Preservation Agency,Chido Obidiegwu nọchịtere kwuru na steeti Anambra n’akọ ha nwere adila na mbubagide amuma ọrụugbo nke ga-enyere ndị nke ya aka tupurị korona amalite.   O kwuru sị: “Gọvanọsteeti Anambra bụ Chief Willie Obiano adịla na mbụ hụ echi site n’ịbagide amụmaọrụugbo na steeti iji hụ na nri zuuru ndị Anambra tupu korona anọkata malite.”   Ọ rụtụrụ aka na siten’amụma ọrụugbo nke steeti Anambra bagidere, ha agaghị agabiga oke ihe isi ikenke korona.   Ọ gakwara n’ihu kw

Korona egbuola pastọ kwuru na ọ na-agwọ ya

OTU pastọ onye Cameroon kwuru na ya na-agwọ ọrịa korona siten’ibikwasa mmadụ aka abụrụla onye lara mmụọ n’ihi ọrịa korona.   Pastọ ahụ aha ya bụpastọ Frankline Ndifor bụkwa onye zọburu ọkwa onye isiala Cameroon nwụrụ ka ọgbara afọ iri atọ na iteghete.   Ndị ọrụ nchekwa jiike wee baa n’ụlọ Ndifor n’ihi na ndị na-eso ụzọ ya bụ ndị kwetere na ọ bụ onyeamụma mechiri ebe e si abata n’ụlọ ya dịka ha na-ekpe ekpere maka mbili n’ọnwụya.   Otu onye na-eso ụzọya Rigobert Che gwara ndị nta akụkọ sị; “Onye a bụ pastọ na-ebikwasa ndị ọrịaaka ma na-ekwuputa na ya na-agwọ korona. Ọ bụrụ na gị onwe gị na-ekwu na ịna-agwọ korona anwụọ, keduzi maka ndị na-arịa ọrịa korona? Ugbu a ọ nwụrụlaamaghị m otu ndị ahụ ọ na-ebikwasa aka ga-esi gbake n’ọrịa.”   Dọkịnta Gaelle Nanga gwara ndị nta akụkọ na ndịna-eso ụzọ Ndifor kpọrọ ya ka ọ bịa n’ebe ahụ, mgbe ọ bịaruru ọ hụrụ Ndifor ka ọnọ n’ihe mgbu; o mechara nwụọ ka ọ gachara nkeji iri.   Dịka e si kwu, ezinaụlọNdifor na ndị na-eso ụzọ ya kpebiri idebe ozu ya ma

Dibịa egbuola Pastọ bịara ka ọ gwọọrọ ya ọgwụ

NDỊ uweojii kọmandị steeti Ogun anwụchikọọla otu dibịa makaigbu Pastọ. Dibia ahụ gburu pastọ maka iji ya gwọ ọgwụ (rituals).   Pastọ KalejaiyeEzekiel ka e kwuru na ọ gakwuru dibia ahụ aha ya bụ Ogunkoya gbara afọ iri anọna asatọ ka ọ gwọọrọ ya ọgwụ maka ụlọụka ya mana dibịa ahụ onye nke kwuru na yaonwe ya chọrọ nwoke o ji agwọ ọgwụ kpebiri ozugbo, gbuo Pastọ Ezekiel, ka owere ya gwọrọzie ọgwụ.   Ogunkoya gwara ndịuweojii sị: “Pastọ ahụ bịara na nke m ịnata ike ka ụka ya wee na-eto, mjiri ohere ahụ were ya gboo mkpa nke m.Agwakọrọ m ihe na-atụ mmadụ ụra nye pastọahụ ọ ńụọ nke mere ka ụra buru ya. Ozugbo ụra buuru ya, m were mma gbuo ya. Abụm onye dibịa ọdịnala, enyerela m ọtụtụ ndị mmadụ aka nke gụnyere ndị pastọ chọrọka ndị ụka ha na-abawanye n’ogbe. Ihe a merenụ dapụtara n’ihi na a chọrọ m akụkụahụ mmadụ m ga-eji gwọọrọ otu onye ahịa m n’Iseyin ọgwụ.”   Dibia ahụ gara n’ihurịọ ka a gbaghara ya n’ihi na ya matara na ya mejọrọ ma ọbụrụ na a jụọ ndị mmadụa ga achọpụta na ya bụ ezigbo mma

Ndị gọvanọ akatọọla etu ndị uweojii si echekwa S’east

… Gwa onyeisi uweojii Nigeria na ọ na-ada mba na mpaghara ahụ OTU ahụ jikọtara ndị gọvanọ ndịda ọwụwa-anyanwụ ala Nigeria,bụ ndị a maara n’asụsụ bekee dịka ‘South-East Governors Forum’ akpọkuolaonyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Abubakar ka o lebàgharịaanya n’atụmatụ ahụ o wepụtara na nso nso a bànyere nchekwa ime-ime obodompaghara ahụ.   Ndị otu a kwupụtaranke a site n’ọnụ onyeisi oche ha ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ GọvanọDave Ụmahi, oge ha mechaara nzukọ ahụ ha na-enwe kwà ọnwa ọbụla, nke ọnwa Mee.   Ha kpọkuru onyeisindị uwe ojii, bụ Maazị Abubakar ka o wezugagodi atụmatụ nke ahụ o wepụtarabanyere nchekwa ime obodo mpaghara ahụ, ma gbaso nkwekọrịta ahụ ya na ha nwerebànyere iwepụta ezi atụmatụ nchekwa ime obodo bụ ịgbà maka mpaghara ndịda-ọwụwaanyanwụ, oge ikpeazụ ọ bịara mpaghara ahụ, iji kwàlite ezi ọnọdụ nchekwa imeobodo na mpaghara ahụ.   Ndị òtu ahụ gbarụrụihu bànyere etu ya bụ onyeisi ndị uweojii siri gbakụta nkwekọrịta ahụ azụ mawepụta usoro na

Otu nwoke agbaala ụlọ ajadu nwaanyị enweghị nwa ọkụ

OTU nwoke aha ya bụ Chima Edeh agbaala ụlọ nwaanyị ajadu ọkụn’Eguho-Ezzagu nke dị n’okpuru ọchịchị Ishielu na steetị Ebonyi.   Agadi nwaanyị ahụaha ya bụ Regina Opoke bụ onye nke gbara afọ iri asatọ, ma bụrụkwa ajadu naenweghị nwa.   Nwaanyị ahụ gbara ọsọndụ ya oge Edeh wakporo ya n’ụlọ n’ime abalị ka o gbuo ya, ma nwoke ahụ garan’ihu gbaa ụlọ ya ọkụ oge ọ chọpụtara na ọ gbapụla.   Mgbe ọ na-ekwuputana ya bụ ihe mere n’eziokwu, ụkọchukwu parish St. Joseph Catholic Church Eguho,Ezzagụ, Rev Fr. Arinzechukwu Nkannebe, onye zọpụtara nwaanyị ahụ kọwara na ọnọdụobibi ndụ nwaanyị ahụ dị njọ ma rịọ ndị mmadụ na gọọmentị ka a gbatara ya ọsọenyemaka.   O kwuru na ihe niilenwaanyị ahụ nwere, tinyere akwa (clothes) gbara ọkụ.   Fada Nkannebe kwurusị: “Ihe nke a merenụ dị egwu. Otu nwoke aha ya bụ Maazị Chima Edeh onyeOnunweke Ubia gbara ụlọ agadi nwaanyị ajadu, dara ogbenye enweghị nwa bụ OriakụRegina Opoke ọkụ. Nke a bụ obi ọjọọ na mmadụ imegide ibe ya. Agadi nwaanyịenweghị nwa, gbazi ọtọ, n’enwg

Anambra eguzobela òtù ọrụ pụrụ iche maka nsogbu dị n'etiti Omor na Umumbo

IGBO sị na ọ bụ ụkwụ ka e ji achọ ihe dara mmiri, ma sịkwana ọ na-abụ e gbuo àhàmà, a bụghị ya n’ukwu, o puchie.   N’iji chọpụta ebemmiri siri wee bàá òpì ụgbọgụrụ, gọọmenti steeti Anambra eguzobela òtù nnyochapụrụ iche iji nyochaa, chọpụta, ma lebà anya n’ihe bụ isi sekpụ ntị nà ihe ọ bụya bùtèrè nsogbu ahụ na-adapụta n’etiti obodo Omor na Ụmụmbo, dị n’okpuru ọchịchịAyamelum.   Òtù ahụ e guzobèrèn’Awka na nso nso a bụ nke e nyèkwara ọrụ ịtụpụta usoro kacha mma a ga-esi wetaya bụ nsogbu n’isi njedobe kpamkpam, ma gbochiekwa ya maọbụ ụdị nsogbu ọzọ dịetu ahụ ịdapụtakwa maọbụ selitekwa isi ọzọ n’ọdịnihu na mpaghara ebe ọbụlan’ime steeti ahụ.   Ya bụ òtù ọrụ, bụ nkemmadụ iri mejupụtara, nwèrè Ọkammụta Solomon Ekwenze dịka onyeisi oche ya, manwekwazie Dọkịta Emma Ude-Akpeh (nke ụlọọrụ ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ) dịkaode akwụkwọ ya.   Ndị ọzọ so n’òtù ahụgụnyèrè Maazị Uchenna Okafor (bụ ọka okwu ụlọ omebe iwu steeti ahụ); MaazịVincent Ofumelu (bụ onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Oyi

N'Anambra: Gọọmenti akụtusiela ụmụ ihe a rụrụ n’ọwa mmiri ebe ezighị ezi

KA Ọ dọchara aka na ntị ọtụtụ oge bànyere nke ahụ, gọọmentisteeti Anambra amalitela ịkụtùsì ụlọ/ọdụ ahịa na ihe ndị ọzọ dị iche iche a rụrụn’ebe ekwesighị ekwesi na steeti ahụ.   Ụfọdụ n’ime ihe ndịahụ a kụtùrù bụ nke a rụnyere n’okpuru ebe eriri ọkụ latiriki nwere ike dị egwu(bụ ‘High Tension Wire’ n’asụsụ bekee) siri gaa; ebe ndị ọzọ bụkwa ndị a rụnyeren’elu ọwà mmiri, bụ ebe idè mmiri si agafè.   Atụmatụ ọrụ ịkụtùsiihe ndị ahụ bụ nke a bàgidere na mpaghara ‘Club Road’ bụ nke a ma n’oge mbụ dịka‘Abakaliki Street’ dị n’Akwa bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ọ bụ ụlọọrụ‘Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)’ nọ n’isi ya, site nanjikọ aka ndị ọrụ nchekwa dị iche iche.   N’okwu ọ gwara ndịnta akụkọ banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ACTDA, bụ Maazị Amaechi Okwuosa kwuruna ha adọọla ndị ahụ aka na ntị ọtụtụ ugboro bànyere ime ihe dị etu ahụ, nà iheégwù dị na ya; mana ha kachiri ntị nọrọ n’ebe ahụ.   Ọ dụrụ onye ọbụlana-achọ ịrụnye ihe ọbụla ka o buru ụzọ nweta nkwàdo sit

A zọgbuola otu nwaanyị ka ọ gara iketa ihe enyemaka maka korona

OTU nwaanyị aha ya bụ Oriakụ Florence Onuobodo atụfuola ndụya n’Elele nke dị n’okpuru ọchịchị Ikwerre nke steeti Rivers site na nsogbuigwe mmadụ izọgide ya ụkwụ (stampede) mgbe a na-eke ihe enyemaka gbasara koronanke gọọmenti steeti ahụ wetere.   Dịka a na-eke ihe ndịahụ, nsogbu nke sitere na ndị mmadụ ikwo ekwo n’igwe dapụtara nke mere kanwaanyị ahụ bụ Florence gbara afọ iri isii na abụọ tufuo ndụ ya; ebe ụmụnwaanyịanọ ndị ọzọ merụrụ ahụ.   N’okwu ya gbasara yabụ ọdachi, Eze Okechukwu Okah tara kọmiti haziri ya bụ ihe n’obodo ahụ na otunwoke aha ya bụ Chief Mike Elechi ụta, n’ihina dịka o siri kwu, a gaara igbochiọdachui ahụ ma ọ bụrụ na ha leruru anya ma hazie ihe nke ọma.   Okah kọwara nakomiti ahụ kpọchibidoro ndị ahụ bịara iketa ihe enyemaka ụzọ, na ọ bụ mgbe hana-azọ ka ha bata n’ogige ebe a na-eke ihe ka o ji wee mee.   O kwuru sị; “Iheonyinye nke m bịara tupu nke gọọmenti, ọtụtụ ndị mmadụ ketara ihe, onweghị onyeọ bụla nwụrụ. ihe a dapụtara n’ihi na otu nwoke gwara kọmiti ahụ k

E jidela ụgbọala gwomgworo si Plateau buru ndị mmadụ bata Anambra

IGBO sị na ọ na-abụ onye zoro ezoro gafee, e zoro ezoro chụbaya.   N’ịgbaso nke a, omere ndị mmadụ vam n’anya na nso nso a, dịka ndị ọrụ nchekwa na steeti Anambragbachibìdòrò ma nwụchie ótù nnukwu ụgbọala si na steeti Plateau dị na mpagharamgbago ugwu ala Nigeria wee buru ndị mmadụ na-abata n’ime steeti ahụ (Anambra),na-agbanyeghị na gọọmenti nyere iwu ka e mechigodi ókè ala steeti niile ugbuan’ihi ọrịa nje korona.   Ya bụ ụgbọala bụ nkebu ma ewu ma ọgbatumtum, na mmadụ dị iri atọ na atọ n’ọnụọgụgụ wee bata n’imesteeti ahụ, ma bụrụkwa nke a nwụchiri n’ihu obi gọọmenti dị n’Awka.   N’ajụjụ ọnụ a gbarandị ahụ nọ n’ụgbọala ahụ, ha kọwara na ha si na Jos, bụ isi obodo Plateau, weena-aga Ọnịtsha, ịga nọrọ ebe ahụ gbaara onwe ha mbọ ma chọkwa ihe ha ga-eme ijibara onwe ha úrù.   N’ihi na ya bụ akụkọha kọrọ nà njem ahụ ha bàgidere edochaghị anya, ndị ọrụ nchekwa Anambra dùùrùma chụghachi ya bụ ụgbọala (nwéré akàrà MGR 148 XA Jigawa) azụ ozigbo, ya naihe niile ahụ o bùkọsị, ka ọ laghachi Enugu

Gọvanọ Obianọ agbapeela amụmà mmiri ọñụñụ abụọ n'Anambra

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọagbapeela atụmatụ mmiri ọñụñụ mpaghara Otuọcha, bụ nke a maara dịka ‘OtuochaRegional Water Supply Scheme’   Ya bụ atụmatụ mmiri ọñụñụbụ nke a rụrụ site na njikọ aka gọọmenti steeti ahụ na otu mba ụwa ‘EuropeanUnion’, ma bụrụkwa nke nwere ikike ịmịtà na imezi mmiri ruru ndè lita iri n’ụbọchị.   N’okwu ya oge ọna-agbape atụmatụ mmiri ahụ, bụ nke a rụrụ n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘AnambraEast’, Gọvanọ Obiano kọwara na nke ahụ ga na-ekesà mmiri ọñụñụ nyegara obodo dịiche iche dị n’okpuru ọchịchị ahụ, nke gụnyere Aguleri, Umueri na Umu-Oba Anam.   Oge ọ na-akpọkù ndịmpaghara ahụ ka chekwaba ma leruo akụrụngwa ahụ anya nke ọma, o mekwàrà ka amara na ya akpọlitela onye ga na-ahụ maka ilekọta ya bụ atụmatụ mmiri ọñụñụ, magwakwazie ndị na-arụ ụlọ ọhụụ na mpaghara ahụ nwere mmasị isi n’akụrụngwa ahụ dọrọmmiri, ka ha kpọtụrụ ma nweta nkwàdo site n’aka ụlọọrụ na-ahụ maka ihe e jienyere ndụ aka na steeti ahụ, bụ ‘Ministry of Public Utilities and Wa

Nwa a tọọrọ atọrọ ezutela nne na nna ya ka ọ gachara afọ 32

DI na nwunye ndị China a tọọrọ nwa ha nwoke n’afọ 1988ezutela ya n’ọnụ ka ọ gachara afọ iri atọ na abụọ.   Mao Yin onye a tọọrọmgbe ọ gbara afọ abụọ ka nna ya kwụsịrị ụgbọala ka onye ya mmiri ka ọna-ebulata ya site n’ụlọakwụkwọ ọtaakara (nursery school).   Nne na nna ya chọrọya mba China niile, ebe nne ya kere mpempe akwụkwọ (flyers) karịrị otu narịpuku (100,000).   A mụrụ Mao Yin ka ọnwaFebụwarị dị n’abalị iri abụọ na atọ n’afọ 1986. Ka ọnwa Oktoba dị n’abalị irina asaa n’afọ 1988 ebe nna ya bụ Mao Zhenjng na-akpọlata ya n’ụlọakwụkwọ ebe ọnọ ọtaakara na Xian nke dị na Shaanxi; nwata ahụ kwuru na ọ chọrọ ịńụ mmiri nkemere ka nna ya kwụsị ụgbọala n’ihu otu ụlọ oriri na ọńụńụ. Ka nna ya chọrọ ka omee mmiri ọkụ ha ji ka ọ jụọ oyi, n’otu ntabi anya a tọrọ nwata ahụ.   Ezinaụlọ ahụ, MaoJingzhi na nwunye ya Li Jingzhi gbara mbọ elu na ala ma ekwe akụtaghị onye alaji. Mana nke ahụ emeghị ka ike gwụ ha ịchọ nwa ha. Ha chọgidere ya ganye na haahụ ya.   N’ọnwa April afọ a,ndị uweojii nwetara ozi

Gọvanọ Obiano na-emeta ndị ọrụ lara ezumike nka nke ọma – Obiora-Ibezim

ỤLỌỌRỤ Local Government Pensions Board, Awka bụ ndị na-ahụmaka ndị ọrụ okpuru ọchịchị obodo na ndị nkuzi prịma lara ezumike nka nọ na Tọzdeeizuụka gara aga ọnwa Mee dị n’abalị iri na atọ n’afọ a bụ 2020 wee mee emumenke ha na-eme ọnwa ọbụla iji nabata ma nye ndị lara ezumike nka ikike(capturing), ga-eme ka ha sonyere ibe ha na steeti Anambra.   Emume ahụ bụ nnọọnke a haziri site n’usoro na ntụzi aka nke WHO, NCDC na gọọmenti steeti gbasarakorona.Ọ bụ sọ ndị lara ezumike nka nọ na steeti ahụ ka a kpọrọ. Iji wee hụ nammadụ anọghị ibe ya nso dịka iwu siri kwu ụlọọrụ ahụ ejizighị sọ ụlọezumezu hakama ha tinyekwara ọtụtụ kanopi tinyekwara igwe na-ebulite ihe mmadụ na-ekwu mamee ka a nụ ya nke ọma. E kewakwara ha ekewa nke pụtara na ha emekọtaghị ya ọnụ.   N’okwu ya, Odeakwụkwọụlọọrụ ahụ Local Government Pensions Board, Awka bụ Oriakụ Gloria Obiora-Ibezim(JP) toro mbọ gọọmenti steeti ahụ. O kelere Gọvanọ Obiano maka ezi ọchịchị ya.O kwuru sị:”Ana m ekele Chief Willie Obiano, Gọvanọ na-achị s

UK amalitela inye nkịta ọzụzụ maka ịchọpụta korona tupu ọ pụta ihe

MBA United Kingdom amalitela inye nkịta ọzụzụ maka ịchọpụtanjirimara (symptoms) ọrịa korona, tupu ọ pụta ihe na mmadụ.   Dịka ozi si Londonsi kọwaa, nnwale iji mata ka ya bụ ihe si aga ga-amalite nso nso a.   Gọọmenti UK jinnukwu ego wee na-akwado amụma ahụ. Ọ bụrụ na nke ahụ (ọzụzụ) gaa nke ọma aga-eji nkịta ndị ahụ wee na-achọpụta ọrịa korona n’ebe mmadụ ọnụọgụ ha dị narịabụọ na iri ise (250) nọ n’otu awa.   Ka ọ dị ugbu a, nkịtandị ahụ na-achọpụta ọrịa ọjọọ gụnyere kansa, iba, ahụ ịma jijiji (Parkinson).   A ga-enyezi ha ọzụzụpụrụ iche ugbu a maka ịchọpụta korona tupu njirimara ya apụta ihe.   A ga-enye ha ọzụzụsite n’iji ihe (sample) e nwetere na ndị bu nje ọrịa korona na ndị ebughị ya dịkaa maara na ụfọdụ ọrịa okuku ume (respiratory diseases) na-agbanwe isi ahụ mmadụ(body odour).   E sitere na nchọcha(research) wee chọpụta na nkịta na-enwe ike ịchọpụta isi (odour) ọrịa.   Ndị na-eme nchọchaga-eme agba mbụ nke nnwale ahụ na London School of Hygiene and TropicalMedicine site na njik

COVID-19: Ụlọọrụ China ejirila ihe erimeri kwàdo gọọmenti Anambra

NNEKWU ọkụkọ sị na ọ bụ ihe o nwere ka o ji emere okeọkpa ọgọ,ebe ndị Igbo sị na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbaa ụfụfụ.   Ka ọ dị taa, n’iji sịya jisie ike, otù ụlọọrụ ngo mba China ejirila ihe erimeri dị iche iche weekwàdo gọọmenti steeti Anambra n’agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje korona nàmmetụta ya dị iche iche n’ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.   Mmemme inyefè iheoriri ahụ n’aka gọọmenti bụ nke weere ọnọdụ na nso nso a n’obí gọọmenti dịn’Awka, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị so n’òtù ọrụ gbanụ gbanụ ahụ gọọmenti steetiahụ guzobere maka ọrịa ahụ sonyèrè na ya.   Oge ọ na-enyefè ihendị ahụ n’aka gọọmenti, onye na-ahụ maka mmekọrịta ụlọọrụ ahụ na ọhaneze, bụMaazị Abdulfata Abdulraheem kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka mbọ dị iche iche ọgbagòrò nà ihe o mepụtagoro n’agha ahụ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa ahụ nà mmetụtanke oge ihe isi ike a n’ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.   O mere ka a mara na ọbụ ihe ndị ahụ mèrè ha jiri kpebie ịbịa kwàdo ọchịchị steeti ahụ, iji ịsị yajide ka o ji n’agha ahụ ọ na-ebu;

Sierra Leone emeela onye Nigeria onyeisi ọrụ gbanụgbanụ maka korona

A HỌPỤTALA dibia oyibo onye Nigeria dịka onyeisi ọrụ gbanụgbanụmaka ọrịa korona (COVID-19 task force) na Sierra Leone.Odogwu nwoke ahụ aha yabụ Dọkịnta Laoluwa Adejayan ka e kwuru na e nyere ya nnukwu ọkwa ahụ ka hatubechara ya ugo dịka dibia oyibo si mba ọzọ kacha eme nke ọma.   Dịka ha mere nke ahụha bulikwara ụgwọ ọnwa ya elu, nke pụtara na ọ na-erizi akatampo ego dị $20,000ọnwa ọ bụla.   Adejayan gụrụ akwụkwọma turu ugo mmụta na Ladoke Akintola University, Ogbomoso, steeti Oyo.   Ọ rụrụ ọrụ obere ogena steeti Bayelsa ka o fechara ala nna ya National Youth Service Corps (NYSC)tupu ọ tụgharịa ọkpa egwu site n’ịga mba ahụ nke dị na West Africa site n’amụmaa kpọrọ Technical Aids Corps Scheme n’afọ 2012.   Onyeisiala mba ahụ bụPresident Julius Maada Bio kwuputara n’ezie nhọpụta Adejayan n’akwụkwọ ozi letao zigaara onyeisiala Nigeria bụ President Muhammadu Buhari.   Bio kọwara nwa amadiNigeria ahụ dịka onye na-egosipụta ịma mma obodo ya, ezigbo nwa afọ Nigeria. Ọgara n’ihu kwuo na ọ bụ o

Pin Up On Line Casino India Evaluate

Pin Up On Line Casino India Evaluate ️ Get 25,000 Bonus Each class is additional divided into different courses and variations. A search function helps slender down the long record to make recreation search simple. PinUp is among the greatest gambling establishments for Indian players. Large starting bonus allows the gambler to start out energetic betting even with a small deposit. In case you like to play from your phone or pill, use the cell model of the positioning. You also can download the PinUp client that is compatible with Android and iOS operating techniques. There you will find an outline of bonus programs with fund prize draws, free spins, tickets for a win-win lottery. You won’t be capable of download the app on any gadget that’s powered by the iOS operating system. Some players might have come throughout purposes much like Pin Up, however they don’t have anything to do with the official on line casino. Slot video games, table games, and India reside casino video games Pin-

Aka EFCC akparala ndị China abụọ maka inye aka azụ

ỤLỌỌRỤ ahụ na-ebu agha megide mpụ na arụrụ ala n’alaNigeria, a maara dịka ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission’ (bụEFCC n’aha ịchafụ bekee) anwụchiela mmadụ abụọ bụ ụmụafọ mbà China maka inyeonye ọrụ ha aka azụ na steeti Sokoto.   Nke a bụ nke e kwupụtarasite n’ọnụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi n’ụlọọrụ EFCC na mpaghara Sokoto, bụMaazị Dele Oyewale, site n’ozi ọ kụpụrụ na nso nso a, iji mee ka ụwa mara nkeahụ.   Dịka o siri kọwaa,mmadụ abụọ ndị China ahụ, bụ Maazị Meng Wei Kun na Maazị Xu Koi nyèrè onyeisi ụlọọrụahụ na mpaghara Sokoto, bụ Maazị Abdullahi Lawal ọkpụrụkpụ ego dị otu narị ndenaịra iri ise (100, 000,000) dịka aka azụ.   Aka azụ ahụ ka ekwuru na ebumnobi ndị ahụ jiri nye ya bụ iji pịchie maọbụ mee ka ya bụ onyeisi ụlọọrụEFCC kpùdo eziokwu ihu n’ala na nnyocha dị omimi a na-enyocha otu ụlọọrụ ngomba China, a maara dịka ‘China Zhonghao Nig. Ltd’ bànyere ọrụ ngo gọọmentisteeti Zamfara nyere ụlọọrụ ahụ n’agbàtà ahọ 2012 ruo 2019. Ọrụ ngo ahụ bụ nkegburu ego dị ijeri n

Ndị uweojii Anambra ejidela mmadụ ise maka izu ohi ụgbọala, ọgbatùmtùm

NDỊ uwe ojii steeti Anambra nọrọ na nso nso a wee nwụchiemmadụ anọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị oji egbe ezú na ndị na-apụnara mmadụ ụgbọalan’ike.   Ọ bụ onye na-ahụmaka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị HarunaMohammed kwupụtara ma mee ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọn’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   Dịka o siri kwuo,mmadụ anọ ahụ, nke gụnyere Maazị Emeka Onyeoma (gbara ahọ iri abụọ na atọ);Maazị Chidiebele Amaluaka (gbara ahọ iri abụọ na abụọ); Maazị EzenwaokoloIkechukwu (gbara ahọ iri abụọ); na Maazị Abuchi James (nọ n’agbata ahọ iri atọ)bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe sị iche iche na steeti ahụ.   Ọ sị na ha bụ ndịomekoomè wakpòrò otu nwoke aha ya bụ Uche Iheme n’azụ ụlọ ọba ego ‘First Bank’dị n’Oyeolisa Ogidi (n’okpuru ọchịchị ime obodo Idemili North), wee chedo yaegbe n’ihu, ma pụnara ya ụgbọala ya n’ike, bụ ụgbọala Toyota RAV4 (nwere akaraafere GRE 170 AA), nara ya ekwentị Samsung J4 ya (nke ọnụ ego ya ruru N82,000n’ahịa), m

A gaghị eme Imo Awka n'afọ a ka ghara ikesa ọrịa korona – Gọọmenti Anambra

IGBO sị na ọ na-abụ a hụ ihe ka ubi, e ree ọba; ma sịkwa naonye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.   N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ekwuwaala hoohaa ma maa ọkwà sị na ya bụ oke mmemme na-ewu èwù ejiri mara ndị Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụ mmemme Imo Awka agaghị ewere ọnọdụn’ahọ a.   Nke a bụ nke e mereka ụwa mara, site n’ozi a kụpụrụ nso nso a n’aha ọchịchị steeti ahụ site n’akaodeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobeụ.   Dịka ya bụ ozi sirikọwaa, ọchịchị steeti Anambra mere mkpebì ahụ n’ihi ọrịa nje korona, bụ nkena-akpa mkpamkpa na mpaghara ebe iche iche n’ala Nigeria ugbua, ma na-ebìkwamba ụwa aka ọjọọ n’ụzọ dị iche iche.   O kwuru na ịchịkọbannukwu mmemme dị etu ahụ ugbua adabaghị adaba n’ihi na o megidere ntụziaka ahụòtù ọrụ ahụ ike mba ụwa (bụ World Health Organisation, WHO) na ụlọọrụ ‘NigeriaCenter for Disease Control (NCDC)’ nyere bànyéré igbòchì mgbasà ọrịa korona ahụ,maka na ọtụtụ mmadụ na-adị esonyekarị na mmemme ahụ, bụkwa nke ha na-anọ na yana

Korona: Ndị bishop ụka Katolik ewepụtala ụlọgwụ karịrị narị anọ maka ogige nleta maka ọrịa korona

N’IHI agha a na-ebu iji megide ọrịa ọjọọ korona, ndị bishọp ụkaKatọlik n’ala Nigeria gbaa gburugburu ahafeela ụlọọgwụ dị narị anọ, iri abụọ naise (425), bụ nke ha ka e jiri ha mere ogige nleta (isolation centres).   Maazị Boss Mustapha,bụ odeakwụkwọ gọọmentị etiti ma bụrụkwa onyeisioche PTF kwuputara nke a ụbọchịMonde n’Abuja.   O kwuru sị; “NdịCatholic Bishops Conference Nigeria, ahafeela ụlọọgwụ 425 n’ala anyị maka ijiha mee ogige nleta maka ọrịa korona. A na-akpọkuzi ndị gọvanọ na steeti  dị iche iche ka ha gakwuru ndị bishọp ụka Katọlikmaka ileta ebe ndị ahụ.”  Mustapha gara n’ihu dụogoomenti steeti dị iche iche ka ha hibe ogige nleta nke ga-enwe o pekata mpeakwa (bed) dị narị ato na steeti ha iji nye aka kwalite agha a na-ebu megide orịakorona.  Mustapha kwuru na ebendị ahụ ga-enwe ọnụụlọ ndị ọrịa (wards) na ọnụụlọ pụrụ iche (intensive careunits).   O kwuru sị na nke ahụga-enye aka maka ọnọdụ nke mbụ na abụọ ọrịa ahụ. Ọ kọwara na dịka ọrịa koronana-aga n’ihu n’ike n’ike na akwa nd

Obiano enyela iwu onye-lakpuo-be-ya bido mgbede ruo ụtụtụ, n'obodo abụọ nwere ọgbaghara

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano(Akpokuodike) enyela iwu gbasara oge mmadụ ga na-alakpu (curfew) n’obodo Umumbona Omor dị n’okpuru ọchịchị Ayamelum na steeti ahụ; nke bụ elekere isii nkemgbede wee ruo elekere isii nke ụtụtụ (6.pm – 6.am).   Nke a pụtara ihen’ozi si n’aka kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkọwara ọhanaeze ihe ha kwesịrịima bụ Maazị C Don Adinuba n’izuụka gara aga. Iwu a e tiri bụ maka nsogbu na ọgbagharanke dị n’etiti obodo abụọ ahụ. Mgbe ọ na-akatọ nsogbu ahụ, Adinuba kwuru na nkeahụ megidere ọchịchị Obiano bụ nke gbadoro ụkwụ n’udo na ezi mmekọrịta.   Otu onye n’achọghịka a kpọọ aha ya gwara ndị ntaakụkọ na a ka na-achọ ọtụtụ ndị mmadụ, ndị obodoabụọ ahụ achọ.   Adinuba kwuru na ezigala ndị ọrụ nchekwa gụnyere: ndịuweojii, ndị agha (amị) na Civil Defence(NSCDC) ebe ahụ e nwere nsogbu iji kwalite udo.   O kwuru sị; “Nsogbua bụ mkparị n’ebe ezi mbọ nke gọọmentị na ndị Anambra na-agba kemgbe afọ isiigara aga iji mee ka steeti a bụrụ eji amaatụ, ọ bụghị

Ọrụ Ugbo: Gọọmenti Anambra ekèéla ndị ọrụ ugbo mkpụrụ akụkụ na Neni

IGBO sị na onye akọghị anaghị egwute, ma sịkwa na ọ na-abụ awụnyere dike ji na mbụbọ, o were obi dimkpa mapuo ala.   N’ịgbaso nke a, gọọmentisteeti Anambra ekesàála mkpụrụ akụmakụ dị iche iche na ihe e ji akọ ọrụ ugbonyégárá ndị ọrụ ugbo ruru narị abụọ n’ọnụọgụgụ na Neni, dị n’okpuru ọchịchị imeobodo Anaọcha, maka ịkọ ọrụ ugbo ahọ a.   N’okwu ya mgbe ọna-ekesa ihe ọrụ ugbo ahụ n’aha gọọmenti, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo nasteeti ahụ, bụ Maazị Nnamdị Ọnụkwụba, nke ọ bụ Dọkịta Okey Okwuosa nọchitereanya ya, mere ka a mara na atụmatụ ahụ bụ iji kwàdo ma kwàlite ọrụ ugbo n’imesteeti ahụ.   Ọ kọwapụtara mkpa ọdị, bụ ịkọ ọrụ ugbo nke ukwu, ọ kachasị n’oge ugbua ọtụtụ obodo dị iche iche namba ụwa tinyezịrị uche n’ọrịa korona, wee gbakụtazie ngalaba ọrụ ugbo azụ.   O kwukwazịrị na ya bụatụmatụ ga-enye aja ịme ka e nwee nri gbaa nyụụ n’ime steeti ahụ, ma gharakwainwe ụkọ nri n’ọdịnihu, ọ kachasị oge ihe gbasaara ọrịa nje korona dajụọrọ.   Ọ dụkwara ndị ọrụugbo ahụ soro nweta ihe ahụ e kèrè k

Na Lagos, ndị uweojii ejidela nwaanyị gburu odibo ya, lie na mmadụ atọ

NDỊ uweojii steeti Lagos anwụchịkọọla mmadụ anọ maka igbunwata nwaanyị gbara afọ iri na isii. Nke ahụ dapụtara na Bariga dị na Lagos.   Onye okwuputa okwundị uweojii steeti ahụ bụ DSP Bala Elkana kwuru na ndị uweojii nwetara ozi n’ụtụtụSatọdee na otu nwaanyị aha ya bụ Shade Moke gbara afọ iri anọ na otu na mmadụatọ ndị ọzọ gbara izu gboo nwata nwaanyị aha ya bụ Halimat Sodiq gbara afọ irina isii dịka ha boro ya ebubo izu ohi.   O kwuru sị na ya bụnwa e gburu egbu bụ onye na-agba odibo (house help) n’ụlọ Moke , ka e boroebubo na o zuru ego dị puku naịra abụọ (N2,000) nke nne ya ukwu, ma bụrụ nkenwata ahụ gọrọ agụgọ na ya ezughị.   Dịka ozi ahu si kwu,nwaanyị ahụ nwe ụlọ kpọtara mmadụ atọ bụ ndị tara ya oke ahụhụ (torture) nkebutere ọnwụ ya. Ka ha hụrụ na ọ nwụọla, ha buuru ya na nzuzu ga lie ya n’ebeolili ozu Atan Cementry dị na Yaba, Lagos ka ha wee kpuchie arụ ha mere.   Ka a nwụchikọrọ mmadụanọ ahụ, ha gọrọ agụgọ na ọbụghị ha gburu ya kama na ha mara ya ụra maka ikwuna ozughị ego. Ha

Korona: Ụlọikpe adaala otu nwoke nha N40,000 n’ihi na oyighi akwa mkpuchi ihu

ỤLỌIKPE (magistrate court) nke dị n’Ado Ekiti adaala otunwoke nha ego dị puku naira iri anọ (N40,000) maka ejighị akwa mkpuchi ihu(face mask) wee kpuchie ihu ya.   Nwoke ahụ aha ya bụVincent Ikechukwu bụ onye izizi a na-enye ụdị ọnọdụ ahụ maka ekpuchighi ihu yanke bara n’iwu na steeti ahụ kemgbe korona malitere kpaba ike. E kwukwara na ọga-arụkwa ọrụ obodo (Community labour) abali atọ, wee tinyere nha nke a daraya.   Magistrate B.AOluwasanwi, mgbe ọ na-ekpe ikpe ahụ kwuru na ọ bụ n’ihi ike korona na-akpa, makọwakwaa na ọ bụ arụ mmadụ imebi iwu nke e tiri maka ichekwa ndụ onye ọ bụla.   Ihe karịrị otu narịmmadụ nke gụnyere ndị ụkọchukwu ka a dịrịla na mbụ nye ntaramahụhụ dị iche ichena steeti Ekiti maka ịda iwu gọọmentị tiri iji gbochie nkesa ọrịa korona.

Gọvanọ Obianọ agbarụọla ihu maka etu ihe si aga n'ókè àlà Anambra na Delta

ONYE na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Wilie Obianọ agbarụọlaihu ma kọwakwa na afọ ejughị ya bànyere etu ọnọdụ gbata kwụrụ na etu ihe si agana mpaghara ókè àlà steeti ahụ na steeti Delta ugbua.   Gọvanọ Obianọ kwupụtaranke a oge ọ gara njem nleta a kaghị àkà na mpaghara àkwà mmiri Niger dị n’Ọnịtsha,ịmata ka ọnọdụ si aga n’ebe ahụ nakwa etu ndị mmadụ si erube isi nye mmachi ahụa machiri mmadụ isi na steeti ọzọ bata na steeti ahụ, n’ihi ọrịa nje korona.   Ka o rutere n’ebe ahụ,ọ hụrụ ka ndị mmadụ na ụgbọala dị iche siri kwụkọjuo n’ogologo ebe ahụ mana-agakwa na ya bụ àkwà mmiri. Nke kacha nke bụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ eyìghịuwe mkpuchi ihu bụ ‘facemask’ bụ nke ọchịchị steeti ahụ nyegoro ntụzịaka kaonye ọbụla yiri tupu ọ pụta ezi.   Ọzọ bụkwa na ọtụtụn’ime ndị mmadụ ahụ anọsapụghị anọsapụ n’ebe ibe ha nọ (dịka gọọmenti na ụlọ ahụike mba ụwa, bụ ‘World Health organisation sikwara nye ntụziaka); onye ọbụlana-emetụkọrịtakwa onwe ha ahụ ka ha nà-àga.   Nke a mezịrị ka ya bụGọvanọ gbarụọ ihu, ma

Nwaanyị agbagbuola nwa o ku n'aka na bọkeeti mmiri

OTU nwaanyị aha ya bụ Adisa Fumilola, egbuola nwa o ku n’akasite n’itinye ya n’ime bọkeeti mmiri, ọ nwụọ pịị.   Nwaanyị ahụ gbara afọiri abụọ na abụọ kwuru na iwe ya o jiri gbu nwata ahụ gbara otu afọ na ọnwaisii bụ maka na ọ bụ ya gbochiri ya ịba mahadum gụọ ihe ọmụmụ banyere iwu(law).   Ọ bụ n’ụlọ ha nke dịna Gowon Estate, Lagos ka ọ nọrọ kpa arụ ahụ ụbọchị Monde ma gaa n’ogige ndịuweojii nye mkpesa.   Dịka ndị uweojiina-agba ya ajụjụ ọ sịrị na ọ bụ onwe mmadụ igba ya gharịị (frustration) tinyereya n’ịkpa agwa ọjọọ ahụ, ma kwukwaa na nwata ahụ gbochiri ya imezu ebumnobu yanke bụ ibụ ọkaiwu (lawyer).   Ọ kọwara na otunwoke aha ya bụ Yusuf Folarin tụbara ya ime oge ha abụọ na-aga akwụkwọ maka uleJoint Admission and Matriculation Board (JAMB). Nwoke ahụ dịka o siri kwu, gọnahụrụya ma gwa ya ka o wepụ afọ ime ahụ.   Ka o mechara turuugo ịbanye mahadum Obafemi Awolowo University, Ile Ife nke dị na steeti Osun ịgụihe ọmụmụ banyere iwu, onweghịzị ike imeju ebumnobi ya n’ihi nwata ahụ.   Fol