Ọba akwụkwọ Nigeria eburula ozi nkwàlite agụmakwụkwọ gaa Ebenebe
A KỌWAALA ịgụ akwụkwọ oge niile dịka ụzọ pụtara ìhè na usoro kacha mma isi chụọ ìtì bọrịbọ ọsọ ụkwụ erughị ala. Nke a bụ isi sekpụ ntị n’ọgbakọ nkwàlite mmụta na agụmakwụkwọ, bụ nke ọba akwụkwọ ala Nigeria, bụ ‘National Library of Nigeria (NLN)’ chịkọbàrà, map bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’Ebenebe, dị n’okpuru ọchịchị Awka South nke steeti Anambra. N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi NLN, bụ Ọkammụta Lenrie O. Aịna kwụrụ na ya bụ atụmatụ nkwalite agụmakwụkwọ bụ nke weere ọnọdụ na steeti niile dị n’ala Nigeria, ma sịkwa na ebumnobi ya bụ ime ka ọhaneze ghọta mkpà ịgụ akwụkwọ dị, ya na ikesàrà ụmụ mmadụ ihe dị iche iche e ji akwàlite mmụta, site na njikọ aka nke òtù dị iche iche nakwa ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù. Ka ọ na-akọwa na atụmatụ ahụ nke ahọ a wèèrè ọnọdụ n’ụfọdụ obodo mepetụrụ emepe n’ala Nigeria; Ọkammụta Aịna, nke ọ bụ osote ya, bụ Oriakụ Gloria Okeagụ nọchitere anya ya na mmemme ahụ, kwùrù na ánaghị agụ akwụkwọ oge niile na-eme ka mmadụ bụrụ ìtì bọrịbọ ma nọrọkwa n’ọnọdụ ihe ízè n