N’Omagba Onitsha, ndị Sista emeela ngagharịiwe, katọọ ndị agbatobi na-ahafe nsị n'ọwa mmiri
NDỊ ụka, tinyere ndị bi n’okirikiri Omagba Phase One Layout, Onitsha nke dị na steeti Anambra emeela ngagharịiwe udo n’ihi mmetọ nke megidere ahụike mmadụ site n’aka ndị nweụlọ (landlords) bị n’ebe ahụ. Ndị nweụlọ ka e kwuru na ha na-akwara okporo (pipe) na-ebu nsị wee na-etinye ya isi n’ọwa mmiri n’enweghị ụzọ ọbụla ha si amịpụ nsị ahụ. Ndị chịkọbara ya bụ ngagharịiwe bụ ndị Justice, Development and Peace Caritas (JDPC), archidayọsis nke Onitsha bụ ngalaba na-ekwupuru ndị mmadụ maka ọdị mma ha n’ụka Katọlik. Ha tiri mkpu banyere ahụike ụmụakwụkwọ na ndị ụka Holy Spirit Catholic Church, Omagba bụ ndị nke mmetọ (pollution) ahụ kacha metụta. Ndị bu ụzọ na ngagharịiwe ahụ bụ ndị Sista (Rev Sisters). Ha na ndị mmadụ bucha ihe e dere n’obosara akwụkwọ iji katọọ ihe ọjọọ ahụ. Ha nọ na-agụ, na ekwupụta ihe dị iche iche iji kwado ezi mkpocha, ịmịcha nsị na ịdị ọcha dịka ha na-agagharị n’ogbe ahụ. Ihe ha dere were na-agagharị gụnyere; “Ịhapụ nsị ka ọ na-abanye n’ọwa mmiri bụ njọ megide mmadụ.”