Posts

Showing posts from August, 2019

Bishop Okoye agaa njem oziọma na Ekwulobia

ỤBỌCHỊ ụka ka nnukwu ụkọchukwu kwọrọ mmadụ otu narị na iri atọ aka n’isi ma gozie tabanakle n’ụlọụka St Anthony’s Catholic Church, Okpo Ekwulobia. Ọ bụ Most Rev Jonas Benson Okoye bụ osote bishọp ụka Katọlik na dayọsis Awka nọrọ n’isi ya bụ emume. N’okwuchukwu ya n’aja maasị, Bishop Okoye gwara ndị ahụ ọ kwọrọ aka n’isi (e duru n’okwukwe) na ọ bụ mgbe e tiri ha mmiri Chukwu ka ha ji bụrụ ndị otu Kristi, oriri dị asọ na-eme ka ha na-eto n’okwukwe, ebe ịkwọ aka n’isi ga-eme ka ha dịwanye ike. Ọ rụtụrụ aka n’akwụkwọ nsọ, Ndị Kọrenti nke abụọ; 11:19-23, nke kwuru sị “Taanụ onwe ụnụ ahụhụ iji banye site n’ụzọ dị warawara.” Ọ gara n’ihu kwuo sị “Paul tara ahụhụ; a pịara ya ụtalị, tinye ya n’ụlọ mkpọrọ, ọ fọrọ obere ihe ka mmiri rie ya, mana n’agbanyeghị ịdọ ya aka na ntị ndị a, ọ gara n’ihu na-agbasa oziọma.” O chetakwaara ha abụọma a gụrụ ka a gụchara ihe ọgụgụ nke mbụ “Gaanụ n’ụwa niile, gbasaanụ oziọma.” Bishop nọkwa n’ime aja maasị ahụ gọzie tabanakle, doo ya asọ ma donye oriri dị asọ (A

ASWAMA, ndị ọzọ ekpochala ọwa mmiri Amansea

ỌCHỊCHỊ Gọvanọ Willie Obiano agbaala ọtụtụ mbọ ma na-agbarịrị iji hụ na ndị mmadụ na-aghafu atịtị ebe o kwesiri na steeti ahụ. Ha na-eme nke ahụ iji kwalite ezi ọnọdụ ahụike n’ebe ndị mmadụ nọ. Onyeisi (Managing Director) Anambra State Waste Management Authority (ASWAMA) bụ Amechi Akorah kwuputara nke a n’ajụjụ ọnụ onye nta akụkọ National Light gbara ya na mkpocha ikpeazu e mere ka ọnwa Ọgọstụ di n’abali iri abuo n’ ano. Ha mere nke ahụ site na njikọ aka nke ‘Africa Clean-Up Initiative’ na Student Union Government (SUG) Nnamdi Azikiwe University Awka. Dika onyeisi ASWAMA bụ Amechi Akorah siri kwu, a ga na-enwezị mkpocha kwa mgbe kwa mgbe. O kwukwara na ya bụ mkpocha nke ha mere site na ọwa mmirii (culvert) Amansea gbadaa ‘Book Foundation’, Ifite, Awka, bụzị ihe a ga na-eme mgbe ọbụla. O kwukwara na mkpocha ọzọ ha ga-eme ga-abu na ogige Ngozika Estate. Okwuru sị, “Ana m ekele ndị niile sonyere na mkpocha na nzacha, bụ ndi mere ka ọ gaa nkeọma. Ana m atụ anya ka ndị na-azụ ahia, ndị nwer

Okwu ọnụ ndị mmadụ ka Anambra gbara afọ iri abụọ na asatọ

Image
Dịka a na-eme ncheta ọgbụgba afọ iri abụọ na asatọ e ji kee steeti Anambra, ọtụtụ ndị mmadụ ekwuputala ebumnuche ha ma kelekwaa aka na-achị steeti a bụ Gọvanọ Willie Maduaburochukwu Obiano (Akpokuedike). Otu a ka ajụjụ ọnụ onye nta akụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ha siri ga: ORIAKỤ Rose Onwuzulike : Steeti Anambra dị mma. Gọvanọ Obiano na-agbasi mbọ ike iji wee hụ na ihe na-aga otu o kwesịrị. Ọkụ na-enwu ebe niile. Dịka ọ na-agbali maka nchekwa, ana m asị ka o lebakwuo anya n’ebe ndị otu nzuzo nọ, ọ kachasi n’Obosi, ka o tinyekwuo anya n’otu ndị nkuzi gọọmenti si akụziri ụmụakwụkwọ ihe. Nwunye ya bụ Ebelechukwu Obiano na-agbasikwa mbọ ike. Ọ na-eleta ndị onweghị ka ọ ha ha. Ọ na-agwọ ụmụaka nwere ọlụsi. EBOGHA Peter: Gọvanọ Obiano na-agbali na steeti Anambra. A bịa n’ihe gbasara nchekwa, egwu adịghị. Ma ana m ekwu ka olebakwuo anya na ndị ntorobịa iji gbaziri ha n’ụzọ dị iche iche. NWAADA Nneka Chuke: Gọvanọ Obiano bụ Akpokuedike n’eziokwu. Steeti Anambra bụzi obodo mmadụ niile na

Idemili South ga-eguzobe ndị nche ọhịa maka ndị na-anyụ nsị aghara-aghara

IGBO sị na ọ na-abụ uhìe kwobe èkwòbe, ndi ichie atụgharịa ọkpa egwu. Ka ọ dị taa, gọọmenti okpuru ọchịchị Idemili South nke steeti Anambra ekwuola na a ga-egùzobe ndị nchekwa ọhịa iji nwụchikọọ ndị arụrụ nsị ahụ na-aga mposi aghara aghara n’ebe dị iche-iche ekwesighị n’okpuru ọchịchị ahụ. Ọ bụ onyeisi nchere oge n’okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Dọn Ụnachukwu kwupụtàrà nke a n’Ojoto dị n’okpuru ọchịchị ahụ mgbe ndị nnọchi anya òtù European Union-UNICEF maka ‘Anambra Mission’ gara kpọtụrụ ya n’isi ụlọ ọrụ ya. O mere ka a mara na okpuru ọchịchị ahụ na-enyere ngalaba na-ahụ maka atụmatụ ọrụ adịmọcha ahụ bụ WASH aka n’ụzọ dị iche-iche site n’inye ha ihe ọrụ, ego nkwàdo, ibugharị ha, na n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ dị iche iche, iji mee ka ọ na-agawanye n’ihu. Ọ kwèrè nkwa ilekọta na ileru ha anya otu o kwèsiri, ma kpọkuo ndị eze ọdịnala na ndị isi ọchịchị obodo dị iche-iche n’ime okpuru ọchịchị ahụ, ka ha sonye ma tinye aka n’ịkwalite ọnọdụ adịmọcha n’ime obodo ha, ọ kachasị dịka o siri metụta ịkwụsị

Anambra agbaala afọ iri abụọ na asatọ

TAA ka steeti Anambra gbara ahọ iri abụọ na asatọ e jiri kee ya. Lee akụkọ ntọala na ihe ndị pụtakarịchara ìhè banyere ya bụ steeti. Anambra bụ otu n’ime steeti ise mejuputara mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Naịjiria. E kere ya n’abalị iri abụọ na asaa (27th) nke ọnwa Ọgọstụ (August) ahọ otu puku, narị iteghete, iri iteghete na otu (1991) n’oge ọchịchị ndi agha, site n’aka ‘General’ Ibrahim Badamasi Babangida. Ọ bụ site n’Anambra Ochie, bụ nke e kèrè n’ahọ 1976, ka e si wee kewapụta ya bụ steeti na nwanne ya bụ steeti Enugu. Aha a bụ ‘Anambra’ sitere na mmiri a na-akpọ Ọmambala, bụ nke dịkwa na steeti ahụ. Njirimara Anambra n’oge gara aga bụ ‘Home For All’; ma ugbua, njirimara ya bụ ‘Light of The Nation’, ya bụ Ihè Nke Ala Anyị; ebe Ọka (Awka) bụkwa isi obodo ya. Anambra nwere ọgbọ nta nkwado Sineetị atọ, ọgbọ nta nkwado ụlọ ọgbakọ nnọchianya etiti iri na otu, na ọgbọ nta nkwado ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti dị iri ato n’ọnụ ọgọgụ. Ya bụ steeti na-ada ụda na mba ụwa, nwere okpuru ọchịch

Mgbape ụlọ ahụike ọhụrụ ebutela ọñụ n'Umụdiọka

OKE ọñụ dara nnọọ nso-nso a dịka a gbàpèrè ụlọ ahụike ọhụụ n’Ụmụdiọka dị n’okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra. N’okwu ya na mmemme ahụ, kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala kèlèrè ndị Ụmụdiọka maka ijikọ aka ọnụ wee rụọ ya bụ ụlọ ahụike, bụkwa nke o kwùrù na a kwanyela akụrụngwa ruru paseenti iri asaa na ya, ma kpọkuokwa ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ndị selitere isi n’obodo dị iche-iche na steeti ahụ ka ha ñòmie nke ahụ, site n’ijikọ aka ọnụ, ha na gọọmenti. Ọ kọwàrà ụlọ ahụike ntà dịka nke dị oke mkpa maka ịgbasawanye ezi ahụ ike n’ala Nigeria, ma kọwaa na gọọmenti steeti ahụ na-agbasi mbọ ike iji mee ka ngalaba na ọnọdụ ahụike ụmụafọ steeti ahụ kawanye mma, ma dụkwazie ọhanaeze ka ha tinye aka n’imé ka nke ahụ pụta ìhè site n’ịgba mbọ hụ na ngalaba ahụ na-agawanye n’ihu n’ime-ime obodo ha dị iche-iche. Na ntụnye nke ya, ode akwụkwọ ukwu nke ụlọ ọrụ ‘Anambra State Health Insurance Agency’, bụ Dọkịta Simeon Onyemaechi, bụkwa nwa afọ obodo ah

Nzukọ Ọgọstụ: Oriakụ Obiano aduọla ụmụnwaanyị ka ha dị uchu n'ọrụ

DỊKA ọnwa Ọgọstụ na-abịa na njedebe ka a na-ahụwanye uru na mbọ ụmụnwaanyị na-agba iji hụ na nzukọ ha na-eme na ya na-amịpụta mkpụrụọma. Ọ bụ na nzukọ ọnwa Ọgọstụ ka ụmụnwaanyị ji atụ alo iji hụ na ihe na-aga nkeọma, ma n’ezinaụlọ, ma n’obodo. Ha na-anọkwa na nzukọ ahụ rụọ ọrụ dị iche iche n’ụlọụka ha dị iche iche. Ọ bụ site na ya bụ nzukọ ka ha ji agba ọnya ego ma werekwa ya mee ọtụtụ ihe bara uru n’obodo. Ụmụnwaanyị na-arụ ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ụlọezumezu w.d.g. N’ebe ụfọdụ ụmụnwaanyị na-esite na nzukọ ọnwa Ọgọstụ mepụta ihe nyiri ụmụnwoke omume. Ima atụ; n’ọtụtụ ụlọụka taa, ụmụnwaanyị rụpụtara agadaga ụlọezumezu ebe ụmụnwoke arụghị ihe ọ bụla. Ha na-ejikọta obi ọnụ na-edozi obodo iji na-enyere ụmụnwoke aka. Iji mee ka nzukọ ọnwa Ọgọstụ na-amịpụta ihe karịa, nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano (Osodieme) na-agagharị obodo dị iche iche na-enye nkwado ya n’ike n’ike. Ọ na-akụziri ma na-agbazikwara ụmụnwaanyị ụzọ ha ga-esi na-ebi n’ezinaụlọ ha ka udo were chịa

A rịọla ụmụafọ Anambra ka ha malite ịzụ ehi Igbo

N’IHI na a sị na ọ na-adị mma ji mee ka ọ bụ ya tọkarịrị n’ụtọ, a hapụ ya gbuo ede awaị; a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra na ụmụ Igbo n’izugbe ka ha malite ịzụ ehi Igbo, dịka o so n’otu n’ime ngalaba ọrụ ugbo kwesiri ka e lebàra ya anya nke ọma ugbua ma were ya kpọrọ ihe. Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ ‘Eagles Food Processing Industry Nig. Ltd’ bụ Maazị Ugochukwu Okpaleke kpọrọ oku a ma nye ya bụ ndụmọdụ n’ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbara ya n’isi ụlọ ọrụ ya dị n’Ụmụchu, n’okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra, banyere ọgbụgba ahọ iri abụọ na asatọ nke steeti ahụ. Ọ gbara akaebe na ya bụ steeti na-emezị nke ọma na ngalaba ọrụ ugbo karịa n’oge mbụ, ma kwuo na n’agbanyeghị nke ahụ, na ọ ka nwegasịrị ụfọdụ akụkụ ngalaba ahụ kwesiri ka e lebàra ya anya, bụ ngalaba ịzụ ehi Igbo na ihe ugbo ndị ọzọ e nwere ike ịkọ na steeti ahụ, mana a ka na-atụbàta ha na steeti ahụ. O mere ka a mara na ihe o jiri dị ka ọ bụ ehi Awụsa ka ndị mmadụ na-akacha ego na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị bụ maka na o

Otu nwaanyị nọ na di ereela nwa ọhụrụ ya

OTU nwaanyị aha ya bụ Chinasa Ukaonu ereela nwa ọ mụrụ ọhụrụ narị puku naịra ise (N500.000). Dịka kọmishọna uweojii na steeti Imo bụ Rabiu Ladodo siri kwupụta site n’aka onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti ahụ bụ Orlando Ikeokwu kwuru sị na Chinasa bụ afọ ime ọnwa asatọ wee hapụ be di ya ka ọ gwachara di ya bụ Promise Ukaonu na ọ na-aga na nke nwanne ya nwoke. O kwuru n aka ọ gachara abalị olemole, o zigaara di ya ozi ma gwa ya na ime ahụ pụrụ apụ. Ka ọ ghọgbuchara di ya, ọ gakwuuru ndị ọrụ nọọsụ abụọ, Esomonu Dorothy na Eke Catherine bụ ebe ọ nọrọ mụ nwa. N’ihi na ihe ọ gwara di ya edochaghị ya anya, di ya gara nye mkpesa na nke ndị uweojii. Otu o sila dị, site na ezi nnyocha, ndị uweojii nwụchikọrọ nwaanyị ahụ bụ Chinasa bụ onye kpọrọ aha ndị nọọsụ ahụ nyeere ya aka wee mụ nwa. Dịka onyeisi ndị uweojii ahụ siri kwu, ọ bụ site na nnyocha ha mere ka ha ji chọpụta na Chinasa rere nwa ahụ narị puku naịra ise. Onye o resịrị ya bụ, Oriakụ Chioma Amadi. Ka ọ dị ugbu

SEMA adụọla ndị bi n'akụkụ mmiri ka ha dị njikere ịgba ọsọ iju mmiri

N’IHI na ọ na-adị mma ịma ọkwà mmiri tupu ụbọchị ozùzo ya, a kpọkuola ma dụọ ndị bi na mpaghara ogbu mmiri ka ha mụrụ anya ka azụ ma dịkwa njikere maka ịkwagharị ọnọdụ oge adịghị anya, n’ihi ọkwà ahụ a na-ama bànyere iju mmriri nke a na-atụ anya na ọ ga-agba gwòògwò n’ahọ a. Oku a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ onyeisi òtù ahụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụ-gbanụ na steeti Anambra, — bụ ‘State Emergency Management Agency’ — Maazị Paul Odenigbo na nzukọ inye nkuzi na ịdọ aka na ntị e mere n’okpuru ọchịchị Ayamelụm na Awka North n’otù n’ótù, ma gwa ndị ahụ na ha ga-ama na ya bụ iju mmiri awụchiela ngwangwa ha hụrụ na ogoogo mmiri dị n’obodo ha etobela. Maazị Obidigbo, nke onye nọchitere anya ya bụ onye enyemaka nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara ụlọ ọrụ SEMA na mgbasa ozi, bụ Maazị Emeka Obinwa chètààrà ndị ahụ na ya bụ ozi abụghị iji wee mapụ ha obi ma ọ bụ mee ka egwù bàá ha ahụ, kama na ebumnobi ya bụ iji wee gbochie ya bụ ajọ ọnọdụ ịdabido ha n’amaghị ama, ma ọ bụ n’akwadoghị akwado. Ọ kpọp

Ndị Anambra ekwela nkwà ezi nchekwa obodo na-izu nzukọ ọnwa Ọgọstụ

ÒTU ahụ jikọtara ndị ọrụ nchekwa dị iche-iche na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka ‘Anambra State Security Council’ adụọla ụmụafọ steeti ahụ ka ha ghara ịtụ egwù n’ịbata ụlọ maka nzukọ ọnwa Ọgọstụ ahọ a, n’ihi na egwu ọbụla adịghị. Ndị otu a nyere ndụmọdụ a ka ha na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ nwechara nzukọ n’ebe obibi ya dị n’Amawbịa, ma kwekwazie Ndị Anambra na a ga-aga n’ihu inwe ezigbo ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ dịka e si enwe oge niile. N’okwu ya n’aha ndị òtù ahụ, onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang mere ka a mara na ha tụlèrè ọtụtụ ihe na nzukọ ahụ, ọ kachasị dịka o siri metụta ịhụ na e nwere ezi nchekwa n’ogologo oge nzukọ ọnwa Ọgọstụ a, bụ nke na-aga n’ihu n’ebe dị iche-iche ugbu a, ya na ezi ọnọdụ nchekwa ga-adị ọkpụtọrọkpụ ma e mechagodụ ya bụ ọgbakọ. Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu enweghị mgbagha na mpụ na arụrụala, ya na ohi na ntọrị mmadụ na-abawanyekarị ụba oge ọbụla a na-eme ya bụ nzukọ, n’ihi na ọtụtụ mmadụ na-abatakarị ụlọ;

Mbem: Ehi Igbo

PÒKÒPÒKÒ ka ọ na-ézè N’anya Chukwu na n’anya mmadụ Ihe dị mma na anya gbàrà Ị hụkwàrà anụ na mma Ehi Igbo ka ọ bụ.   Lekene ụyọkọtọ ara ya Na àkpàkwùrù amụ ndị bụ óké Ìtè afọ ya, na àpàtà ụkwụ ya Ihe ndị a niile bụcha anụ anụ Ehi Igbo ka ọ bụ.   Ọ naghị achọ nwoke okwu Nke o ji achọ nwaanyị Ọ naghị ebíbì ihe a kọrọ n’úgbō Ma ya fọdụzie ịràkọ mmadụ na onye nwe ya Ehi Igbo ka ọ bụ.   Ehi Igbo anaghị eri óké egō Mana úrù ya kàrịrị nke ndi ngō Ịzụ ya anaghị ewèta ihe arụ Maka na onye nwe ya ñụjùrù mmiri ara afọ Ehi Igbo ka ọ bụ.   Ehi Igbo na-amụ nwa juru eju Ụmụ ya na-etokwa ọsọọsọ Ehi Igbo na-agba óké anụ Anụ ya bụkwa ezigbo ihe ụtọ Ehi Igbo ka ọ bụ   Ehi Igbo anaghị anwụ hịam Dịka nke ndị ngō Ọ bụghị ọrịa niile na-atụkwa ya Maka na onye nwe ya ma ihe o jìrì zụọ ya Ehi Igbo ka ọ bụ   Ehi Igbo achọghị AK47 Ehi Igbo achọghịkwa RUGA Maka na agbụgbọ dị ya ahụ mma Ehi Igbo bụ anụ ụlọ Ehi Igbo ka ọ bụ   Ehi Igbo na mmadụ anaghị akwàkọ iko Maka na nke ahụ bụ ihe arụ Ehi Igbo anaghị àwá isi Okwu

N’Anambra, aka uweojii akparala ndị na-apụnara mmadụ ụgbọala

NDỊ uwe ojii steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ ise kpara nkàta wee jiri egbè pụnara  otu nwa amadi bụ maazị Nzube Udegbu ụgbọala Toyota Camry ya n’Ọnịtsha, n’abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ a. Dịka ozi isi ọchịchị ndị uwe ojii na steeti ahụ kụpụrụ nso-nso a, bụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na ya bụ steeti, bụ maazị Harụna Mọhammed sìrì kọwaa, ụmụokorobịa ise ahụ, bụ maazị Emmanuel Amaechi (gbara ahọ iri atọ na ise), maazị Innocent Onyedịkachi (gbara ahọ iri na iteghete), Obinna James (gbara ahọ iri abụọ), maazị Chukwuma Edeh (gbara ahọ iri abụọ na abụọ) na Tochukwu Owor (gbara ahọ iri abụọ na asaa) ka e kwùrù na ọ bụ n’Ojoto dị n’okpuru ọchịchị Idemili, ka a nwụchikọrọ ha, site n’aka ndị òtù ọrụ SARS, bụ ‘Special Anti Robbery Squad’. Ka ọ dị taa, ya bụ ozi mere ka a mara na ndị uwe ojii anapụtala ndị ahụ ụgbọala ahụ, ma kwukwazie na nnyocha ka na-aga n’ihu banyere ya bụ okwu, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe wee kọọrọ ha ihe e ji eme nwaịkpọ. N’ok

Akụkọ ifo: Haa hoo haa!

OTU ụbọchị n’obodo ụmụanụmanụ, e nwere nnukwu asọmpi ha nwere. Iwu asọmpi ahụ kwuru na-aga e ji nnukwu ose wee sie nri nke na ọ ga-ahịa onye ọ bụla chọrọ iri ya ahụ oriri. Mgbe ụbọchị a kara aka ruru, e buputere nnukwu ihe nrite onye meriri ga-erite. Tupu a malite ya bụ asọmpi, e kwuru na onye ọbụla ga-eri nri ahụ n’ekwughị “haai” ma ọ bụ “asụụ” ga-enweta ihe nrite ahụ. Asompi amalite, ụmụanụmanụ dị iche iche bịara iri nri, nke tinye nri ahụ n’ọnụ o tie “haai” ma ọ bụ “asụụ”. Otu a ka ha niile mere wee ruo mgbe mbe bịara iri nri ahụ.   Ọ sịrị ụmụanụmanụ na o nwere egwu ha ga-agụrụ ya tupu ya amalite iri ya. Ụmụanụmanụ kwere, Mbe sịrị ha gụbara ya: Kọtụma sịrị mbe, mbe sịrị kọtụma, ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha gụọ egwu ahụ o kweere ha: Haa hoo haa, tupu ọ malite iri nri ahụ. Ozigbo mbe na-abata n’ọgbọ ọ sị ụmụanụmanụ : Ị na-agụ egwu, Ị na-akụ aka. Ụmụanụmanụ wee bido gụba: Ụmụanụmanụ: kọtụma sịrị mbe, mbe sịrị kọtụma! Mbe: Haa hoo haa! Otu a ka ha megidere mbe wee richaa nri ahụ. Ụzụ wee

Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ịzụ nwa (2)

ONWERE ụdị obi ụmụnwaanyị nwere n’ụdị Chi siri kee ha. Onye ọbụla bụ nne nwere ụdị obi o nwere n’agbanyeghị otu agwa ya siri jọọ njọ. Ụmụnwaanyị ketara iri asatọ (80%) n’ime otu nari n’agwa onye ọbụla na-akpa n’ihi na ọ bụ nwaanyị na-anọ nwata nso oge niile n’izunye nwata ahụ ihe ọ ga-abụ. Otu onye ọbụla si akpa agwa n’ụwa ka gbado ụkwụ n’ụdị ọzụzụ nne ya zụrụ ya ma ọ bụ ụdị mkpụrụ nne ya kunyere ya n’ime. Mbili na ọdịda onye ọ bụla dịkarịrị nne ya n’aka n’ihi na ọ bụ ọzụzụ nwaanyị zụrụ nwa ga-ekwu ma ọ bụ ga-egosi ihe nwa ahụ ga-abụ n’ọdịnihu. Onye ọbụla bụ nwaanyị kwesịrị ịzụ nwa na-ejighị na nke a bụ ọrụ nwoke ma ọ bụ na nke a bụ ozi dịịrị nwaanyị wee zulite ụmụntakịrị. E kwesịrị iji otu ụdị ọzụzụ zụọ ha abụọ ka onye ọ bụla n’ime ha ghara inwe mkpọbi ụkwụ n’ọdịnihu. Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eji oke ịhụnanya azụ nwa nke na-ebute mmebi na ndụ nwa ahụ ọkachasi mgbe a tụrụ anya ya nke ukwuu tupu ọ bịa, apabazie ya ka akwa. Mgbe o toro bụrụ nnukwu mmadụ, ọ kụwaa! Ọ na-akụwa ka akwa mgbe o tor

Nwaanyị maara obi di ya

OBI di ya bụ nwaanyị ya na di ya bi na-emekwa ihe na-amasị di ya. Nwaanyị ahụ bụkwazi onye di ya hụrụ n’anya. Ọ bụkwa nwaanyị di ya bu n’obi ma bụrụkwa nwaanyị di ya na-adịghị enwe oke ihe nkọcha na ndụ ya. Obi di ya bụ nwaanyị di ya hụrụ n’anya, ụdị ịhụnanya nke ndị bekee kpọrọ ‘unconditional love’. Ọ bụkwa ụdị ịhụnanya a dị omimi nke akwụkwọ nsọ kwuru maka ya na nwoke ga-ahụ nwunye ya n’anya. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka nwoke ji akpọ nwunye ya ‘obi m’. Ụdị ịhụnanya a na-eme ka nwoke ghara inwe mmasi na-ebe ụmụnwaanyị ndị ọzọ nọ, n’ihi na nke o nwere zuuru ya ma kawaa ụmụnwaanyị ndị ọzọ mma. Ya mere ndị Igbo ji tụọ ilu sị na asị nna kpọrọ nne na-ememtụta ụmụ ya. Nke a na-egosipụta na ịhụnanya nna hụrụ nne n’aka nke ọzọ na-emetụta ụmụ ya. Nke a na-egosi na ịhụnanya na-esi n’aka fere aka. Ebe di hụrụ nwunye ya n’anya, ebe ahụkwa ka udo na-adị makana ndị Igbo tụrụ ilu sị na ebe ịhụnanya dị na ebe ahụ ka udo na-adị. Nke a na-egosi na ịhụnanya na-eweta udo ma na-ewetakwa ọganihu. Di ya ji ya em

ASCSDA ekwela nkwà ịme ka ọtụtụ ime obodo soro keta ego ọrụ n'izuụka ọzọ

ỤLỌ ọrụ ‘Anambra State Community and Social Development Agency’, (ASCSDA) bụ ụlọ ọrụ mmepe ụlọ ọba ego mba ụwa na-enye nkwàdo na steeti Anambra ekwuola na ọ ga-amalitekwa ikesàkwùrù ụfọdụ ime obodo dị iche-iche na steeti ahụ ego iji kwàlite atụmatụ ọrụ mmepe malite n’ụbọchị Mọnde izuụka na-abịa abịa. Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ ahụ, bụ maazị Chudi Mọjekwu kwupùtara nke a na mmemme inye ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị abụọ, bụ nke a chịkọbààrà ndị a họpụtara isonyè n’òtù ọrụ dị iche-iche n’ịhazi ya bụ atụmatụ n’okpuru ọchịchị ndị ahụ a ga-ekesàra ego n’izuụka na-abịa abịa, nke gụnyere okpuru ọchịchị Awka South, Anambra East, Anambra West na Dunukọfịa. O mere ka a mara na ego ahụ bụ naanị maka ụmụ obere ọrụ mmepe dịgasị iche-iche, dịka ọ dị atụmatụ mmepe obodo ma ọ bụ atụmatụ mmepe òtù ahụ, bụ ‘Community Development Plans’ (CDPs) ma ọ bụ ‘Group Development Plans’ (GDPs) n’otu n’otu; ma gwakwa ha na a ga-enye ha akwụkwọ ozi ikike sitere ụlọ ọba ego mba ụwa ma ọzụzụ ahụ bịa na njedobe, iji nwe ike ide akwụkw

Na ngalaba niile, ọchịchị Obiano na-amuke ka ihe – Eze

ỌCHỊCHỊ bụ ihe na-agụ mmadụ niile nọ n’ụwa mana ajụjụ bụzị mmadụ ole ka a ga-asị chịa ka ha mara chịa. Ọchịchị bụ ngọzi si n’aka Chineke wee na-abịa, ejighị ike eme ya. Ya mere, ọha na eze ndị steeti Anambra akọwaaala aka na-achị Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano (Akpọkuodike) dịka onye ọchịchị maara ihe ekwe na-akụ, onye ọchịchị ya na-amụke ka ihe na ngalaba niile. Iji kọwaa isiokwu a, Peter Eze bụ onyeisi ‘Managing Director’ Ndiolu Micro Finance Bank Limited nke dị n’obi gọọmenti, Awka ekwuola na Chineke gọziri ndị steeti Anambra site n’iwebata mmadụ dịka Obiano ka gọvanọ. Eze kwuru sị; “Ndị be anyị na-echebu na onye ọbụla ga-achị ọchịchị ga-abụrịrị onye akpụ obi ma ndị mmadụ amatala na ezigbo mmadụ na-achị ọchịchị.Ndị mmadụ hụrụ ọchịchị Obiano dịka nke onye nwere obi ịhụnanya ebe ndị ọ na-achị nọ. O nwere obi Chineke, ọ naghị achị ọchịchị nchịgbu.” Eze gara n’ihu kọwaa na Obiano na-amuke ka ihe na ngalaba niile dịka ụlọọgwụ, ụzọ, n’ebe ndị ọlụ nọ wdg, nke mere onye ọbụla ji enwe aǹụrị

Ndị bishọpụ ụka Katọlik akpọkuola gọọmenti etiti ka ọ zọpụta Nigeria

NDỊ bishọp ụka katọlik etiela ebewu n’ihi enweghị ezi nchekwa nke chere ala Nigeria aka mgba n’oge ugbu a. Ha kpọkuru gọọmenti etiti ka o mee ngwa ngwa lebaa ya bụ ihe anya tupu mmiri aǹaa garị. Ozi a sitere n’Ekiti ebe ndị bishọp okirikiri Ibadan nke a kpọrọ ‘Ibadan Ecclesiastical Province’ mere nzukọ. Ha gụnyere Ibadan Achidayọsis, Oyo dayọsis, Ondo, Ilorin, Ekiti na Oshogbo. Ha kwuputara na ekele na-achọzị ịgafe nku aka n’ihe na-eme n’ala Nigeria ugbu a; ma dọọ gọọmenti n’ogo niile aka na ntị, tinyere ndị ọchịchị obodo na ndị ọchịchị ‘civil authorities’ ka ha gbaa mbọ iji zọpụta ala Nigeria na nnukwu nsogbu a. Nke a so n’ozi nke dị na ‘communique’ nke Achịbishop Ibadan bụ onyeisi ‘Nigeria Catholic Conference, Ibadan Ecclesiastical Province’, Gabriel Abegunrin gụpụtara, ka ha mechara nzukọ ha mere na Pope John Paul II Pastoral Centre Ado Ekiti nke dị na steeti Ekiti. Ndị ozi Chineke ahụ gwara gọọmenti etiti hoo haa na ọ dị njọ ka o si leghara anya otu ndị Fulani na-achị ehi na ndị om

Na Benue, nwata afọ iri a dakporo n'ike amụọla nwa

NWA afọ iri a dakporo n’ike na steeti Benue amụọla nwa nwaanyị. Nwata nwaanyị ahụ aha ya bụ Masenengen enweghịzị nne na nna n’ihi na ha alaala mmụọ. Ọ bụ mgbe o so otu nwanne ha (uncle) wee gbapụ n’obodo ha dị n’okpuru ọchịchị Guma wee gbaga ọsọndụ na Makurdi ka ndị Fulani wakpochara obodo ahụ, ka otu nwoke amaghị onye ọ bụ dakporo ya n’ike wee tụba ya ime. Ime mere nwata ahụ abali atọ tupu nwanne ha ahụ were kpọga ya ụlọọgwụ General Hospital North Bank, Makurdi. Ọ bụzi ka otu onye o metụrụ n’obi tinyere ihe banyere ya n’ihe ọgbara ọhụrụ ‘social media’, ka Ukan Kurugh bụ onye na-arụ ọrụ ebere ‘humanitarian activist’ na ndị otu ya ndị ọzọ matara maka ya wee kpọga ya na Foundation Hospital Makurdi ebe a nọ waa ya afọ wee kuputa nwa n’udo. Ka ọ dị ugbu a, ndị mmadụ si n’ugwu na ndịda na-abịa n’ụlọọgwụ ahụ ka ha hu obere nwa ahụ bụzi nne, na nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ, ma na-ewetakwa ihe onyinye dị iche iche iji nyere ha aka. Onye nchịkọba (National Coordinator) Jireh Doo Foundation n’ala anyị bụ

Obianọ anabatala ugwu akwanyere Anambra maka ịkwàlite MSME

AKA na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ anabàtala nkwanye ùgwùṅahụ e nyèrè steeti Anambra na nso-nso a dịka steeti kacha akwàdo obere ụlọ ọrụ na azụmahịa ka na-eto eto n’ala Nigeria, a maara na bekee dịka ‘Micro, Small and Medium Scale Enterprises’, bụkwa nke e nyere site n’aka osote onyeisi ala, bụ maazị Yemi Osinbajọ n’aha gọọmenti etiti. Inyefè ya nkwanye ùgwù ahụ bụ nke e mere na nzukọ isi ọchịchị obodo ahụ nwere nso-nso a n’obi gọọmenti dị n’Awka, ma bụrụkwa nke e mere site n’aka odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ. N’okwu ya oge ọ na-anbata ya bụ nkwanye ùgwù, gọvanọ Obianọ kọwara n’eziokwu na steeti ahụ na-eme nke ọma na ngalaba ahụ, tinyere ngalaba ọrụ ugbo, ngalaba mmepụta ngwọahịa, ngalaba ọrụ na ngalaba ndị ọzọ dị iche-iche. Ọ gakwazịrị n’ihu kwe nkwa na ọchịchị ya ga-agawanye n’ihu n’ịkwàdò ngalaba ndị ahụ na ụmụafọ steeti ahụ chọrọ ibido obere azụmahịa, ọ kachasị dịka o siri metụta n’inweta ego ha ga-eji mee nke ahụ site n’isi ụlọ a

Eduola Onwuamaegbu n'iyi ọrụ dịka ọka ikpe ukwu steeti Anambra

IGBO sị na ọ na-abụ onye e nyèrè mara chịkwaa, e nyekwuo ya nke ka nkè. Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ eduola oriakụ Ijem Ọnwụamaegbu n’ọrụ dịka ọkaikpe mkwụmọtọ steeti ahụ, na dịka nwaanyị mbụ na-eji ya bụ ọkwa. Oke mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị isi ọchịchị steeti ahụ nwere nzukọ. N’okwu ya oge ọ na-edu ya n’ọkwa ahụ, gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike ịhụ na o tinyere ọtụtụ ụmụnwaanyị n’ihe a na-arụ, ma kwuo na ya bụ agụ nwaanyị emeputala ihe a hụrụ anya na ngalaba ọrụ iwu, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ya ka o were egwu Chineke rụọ ọrụ ya nke ọma, n’eleghị mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ tụọ ụjọ maka ihe ọbụla. O kwere nkwa ịhụ na e nwere ezi mmekọrịta n’etiti ngalaba ọrụ ikpe steeti ahụ na ọchịchị ya iji hụ na ọrụ ikpe mkwụmọtọ na-aga otu o siri kwesi na ya bụ steeti, ma gakwa n’ihu kwuo na ọchịchị steeti ahụ na-agba mbọ iwebàtà akụrụngwa ọgbara ọhụụ na ngalaba ahụ ij

Egwu dị ka ozu udele si n'elu na ala daa n'Eke Ihe na steeti Enugu

NDỊ obodo Ihe nke dị n’okpuru ọchịchị Awgu na steeti Enugu e nwetabeghị onwe ha na nnukwu ihe mgbagwoju anya dapụtara n’Eke, nke bụ ahịa ha na-azụ, na nwa mgbe gara aga. N’ihe dịka elekere isii nke mgbede ụbọchị Eke ahụ, ka a zụkatara ahịa ozu udele sitere n’elu na-ada n’ahịa ahụ n’ike n’ike. Ụfọdụ ka e kwuru na ha danyechara n’elu gbamgbam ọdụ ahịa. Ya bụ ihe butere nnukwu katakata n’ihi na o nweghị onye maara ihe kpatara ya. Ka a na-ekwu, ọtụtụ ndị mmadụ bidoro kwube na ndị Fulani na ndị Hausa tinyere nsi n’anụ e gburu ụbọchị ahụ. Ka ya bụ ihe na-aga n’ihu, ndị mmadụ bidoro tufube anụ ha gotara ụbọchị ahụ. N’ihi na ya bụ ihe mere na mgbede, ndị jirila ya sie nri ghafuru nri ha. N’ihi ya bụ ebubo e boro ndị Hausa na Fulani na ha tinyere nsi n’anụ nama ha gburu, otu onye Hausa na-egbu anụ n’Eke Ihe aha ya bụ Rabiu bidoro kwuputa ka ihe siri mee site n’itụ otu nwoke na-amụ igbu anụ aka na ọ bụ ya kpatara ihe merenu. Nwoke ahụ na-amụ igbu anu aha ya bụ Ike ka onye dibịa kwụrụ ụgwọ ka ọ w

Gọvanọ Obiano agbaala afọ iri isii na anọ taa

ABALI asatọ nke ọnwa asatọ afọ 1955 ka Chineke mere ka a mụpụta oke nwa aha ya bụ William Maduaburochukwu Obiano n’ezinaụlọ Maazị Philip Onuorah Obiano na Odoziakụ ya bụ Christiana n’Umuanaeveli Egbeagu Aguleri nke dị na steeti Anambra. Oke nwa a toro ma gụkwaa akwụkwọ n’etiti ndị mmadụ. O toro dịka nwa a mụrụ nkeọma, ọ gụkwara akwụkwọ ya mgbe kwesiri. Ichi isi ya abụghị ugbu a ka o bidoro n’ihi na Chukwu mere ya onye isi malite n’afọ nne ya; ya mere o ji malite ọchịchị mgbe ọ na-agụ akwụkwọ na CKC, Onitsha. Ọ bụ onye a kpọlitere dịka onye isi (Head boy). Obi umeala dị n’ọchịchị ya gosiri na ọchịchị ya sitere n’aka Chukwu. Ọchịchị Obiano yiri ọchịchị Solomon n’akwụkwọ nsọ. Chukwu wepuuru Solomon agha nakwa ọtụtụ nsogbu nke mere ihe jiri gara ya nkeọma. N’agbanyeghị na nna ya nwụrụ n’oge,o meghị ya ka ọ laghachị azụ n’ihe Chukwu kwuru banyere ndụ ya. O rubere isi wee ruo ogogo dị elu n’ụlọ ọbaego. Ọ bụ obi umeala ya mere e jiri kpọlite ya dịka onye  ndu nke steeti Anambra. Kemgbe a kpọl

Akụkọ ifo: Ezezemali (3)

OGE ụbọchị a kara aka ruru, ndị mmụọ bịara n’ụlọ Ezezemali lụrụ ya laa. Mgbe ha na-ala Ojokoudene sooro ha. Mgbe ha ruru n’ụzọ Ojokoudene kpọrọ Ezezemali gwa ya sị: “Ihe ọ bụla ndị mụọ nyere gị sị gị rie ma ọ bụ sị gị mee, sị ha na ị dịghị eri ya ma ọ bụ na ị dịghị eme ya.” Ezezemali kwere. Mgbe ha ruru ala ndị mmụọ, ndị mụọ niile pụtara, ma okenye ma nwata na-agba egwu, na-enwe aǹụrị na ekele Ezezemali na-akpọ ya nwunye ha. Ọtụtụ ndị mmụọ ahụ na-atụ ụjọ n’ile anya nke ukwuu ma Ezezemali kwudosiri ike n’ihi ihe Ojokoudene gwara ya. Mgbe ha buteere Ezezemali nri ka o rie, Ezezemali guba egwu sị: Mgbe m nọ be nne m faa (ugbo abụọ) Ijụgo Ojokoudene dịka ana m Erika nrị (ugbo abụọ) Ojokoudene lesịa nri ahụ jere rie Ojokoudene nwa ine m. Ihe ọ bụla ha wetara Ezezemali agụọ egwu ahụ. Ha bute ihe ọǹụǹụ Ezezemali a sị na ya adịghị aǹụ. Ha asị ya bịa rahụ ụra, ọ sị ha na ya adịghị arahụ ụra. Ihe ọ bụla ha gwara Ezezemali ọ sị ha na ya adịghị eri ma ọ bụ na ya adịghị eme ihe ahụ. Mgbe ha jụrụ Oj

Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ịzụ nwa (1)

OZIGBO nwaanyị mụpụtachara nwa n’ụwa, ihe ọzọ na-esochi ya bụ ịzụ nwa. Ọzụzụ nwa bụkwa nnukwu ihe ma ọ bụ ọlụ ọzọ siri ike dịịrị nwaanyị nke o ji ike ime mmụọ na ike anụ ahụ alụpụta. Site n’ụbọchị mbụ nwaanyị mụpụtara nwa n’ụwa ka ọzụzụ ahụ bidoro site n’iji ara ya zụọ ya nri. Ọ na-eku ya n’aka ya abụọ, ọ na-amakudo ya n’obi ya. Ọ na-agụgụ ya mgbe ọ na-ebe akwa; ọ na-esutu ya ọnụ; ọ na-asa ya ahụ na-asụ akwa ya ma na-ejikwa ya nke ọma nke na nwatakịrị ahụ na-agụ onye ọ bụla hụrụ ya agụụ ikuru ya n’aka ya abụọ. Nwaanyị na-eji oke ịhụnanya eleta nwa ya. Ka nwata ahụ na-eto ka nwaanyị na-azụ ya na-aga n’ihu site n’ikuziri ya ihe dịka ịdọ ọdụ, igwa ya okwu, igwusa ya egwu na ịbara ya ntakịrị mba. Ihe omimi dị ebe nwaanyị nọ bara ụba nke amaghị ka a ga-esi ekwu n’ịzụ nwa. Ụdị obi nwaanyị ji azụ nwa na-abụ ihe mgbagwoju anya n’ihi na ọ dị otu nwa nwoke gara mposi, wee were mposi ya chọọ onwe ya mma dị egwu nke na ịhụ nwa ahụ ịgaghị elenwu ya anya. Onye ọbụla hụrụ nwa ahụ na-eti mkpu na-ajụ “

Nne m bụ ọmalịcha nne – Fada Ezeani

 FADA Cyril Ezeani akọwaala nne ya bụ Oriakụ Felicia Ezeani (nee Oguadi), onye lara mmụọ dịka ọmalịcha nne nwere obi umeala, ma bụrụkwa onye udo. O kelekwara Chineke maka onyinye na ndụ nke ezi nne ya. Fada Ezeani onye bụ otu n’ime ndị isi ‘directors’ na Fides Communication Okpuno kwupụtara nke a n’ụka elimozi nne ya nke e merubere n’ụlọụka St John the Apostle and Evangelist Catholic Church, Agulu nke dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha na steeti Anambra. Ọ bụ nnukwu ụkọchukwu, Most Rev P.C Ezeokafor, bishop ụka katọlik dayọsis nke Awka nọrọ n’isi emume. N’okwuchukwu, Bishop Ezeokafor kpọkuru ndị ụka ka ha na-eme nke ọma n’ihi na onweghị onye ma mgbe ọ ga-ahapụ ụwa, maka na eligwe bụ ụlọ anyị. Ọ kọwara Oriakụ Ezeani lara mmụọ dịka nwaanyị nwere nnukwu okwukwe na Chineke, onye di ya nwụrụ afọ iri abụọ na anọ gara aga, mana ọ gbara mbọ zụọ ụmụ ya nkeọma. O kwuru sị, “Keenụ ajị n’ume, ahụhụ na-eme ka mmadụ gbasie ike. Nwaanyị a dị umeala ma gbasie ike, ruo na njedebe.” Ụkọchukwu Parish ahụ bụ Fad

Ndekwuru nde mmadụ na-arịa ịba ọcha n'anya na Nigeria – Dọkịta Okpala

DỊKA ọ bụ ihe doro anya na ọrịa a mààrà aha ya bụ òzùrù ụwa ọnụ, e meela ka a mara na mmadụ karịrị nde iri abụọ nà-arịa ọrịa ịba ọcha n’anya n’ala Nigeria, bụ nke nwa bekee kpọrọ Hepatitis. Ọ bụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala kwupùtàrà nke a oge ya na ndị nta akụkọ na-akparịta ụka n’isi ụlọ ya dị n’Awka bànyere mmemme ụbọchị ọrịa ịba ọcha n’anya na mba ụwa nke ahọ 2019. O kwuru na ala Nigeria so n’otu n’ime mba ọrịa ịba ọcha n’anya si agbasàwanye na mba ụwa dị iche-iche, n’ogoogo dịka pasentị iri na ótù nkịe ọrịa ịba ọcha n’anya B na pasenti abụọ na ụma abụọ nke ịba ọcha n’anya CH, bụkwa nke mkpokọta ya pụtara na mmadụ karịrị ndè iri abụọ nà-arịa ya bụ ọrịa n’ala anyị, ma bụrụkwa ndị amaghị banyere ihe egwù dị na ya, nakwa otu o si emetụta wee na-emetụta akụrụ mmadụ. O mekwàzịrị ka a mara na gọọmenti steeti ahụ na-agbasi mbọ ike esepughị aka ma na-ebukwa agha dị egwu ịhụ na e memìlàrà ya bụ ọrịa ma nyekwa ya ọsọ ụkwụ erughị ala na steeti ahụ. N

A họpụtala nwaanyị Nigeria dịka minista na UK

A HỌPỤTALA otu nwaanyị onye Nigeria, Kemi Badenotch dịka minista na mba United Kingdom. Ọ ga-esonyezi na ndị ọchịchị (cabinet) nke onye ọchịchị ‘Prime Minister’ a họpụtara ọhụrụ bụ Boris Johnson. A mụrụ Oriakụ Badenotch, onye nke bụbụ Kemi Olufunto Adegoke n’ọnwa Jenụwarị n’afọ 1980 na Wimbledion UK. Ọ biri na Lagos na America mgbe ọ dị na nwata ma mechaa laghachi UK mgbe ọ dị afọ iri na isii. Onye Anglo-Irish bụ Hamish Badenotch lụrụ ya dịka nwunye ya n’afọ 2012. Banyere nhọpụta ahụ, o kwuru sị “Obi dị m ụtọ banyere nhọpụta a nke ga-enyere m aka ịtụnye ụtụ nke m ka ihe wee dị mma.” Ọ gara n’ihu kwuo na ya ga-agba mbọ rụọ ọrụ nkeọma n’akpaghị oke.      

Gọọmenti Anambra amalitela ịkọchàsị ọwà mmiri sụchiri asụchi

N’ỊGA n’ihu ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ gbùrùgburu bụ ịgbà na steeti Anambra, gọọmenti steeti ahụ amalitela ịkọchàsị na ịsụghèsì ọwà mmiri dị iche-iche mere nsụchi na steeti ahụ, site n’okpurù atụmatụ adịmọcha a kpọrọ ‘Dobe Anambra Ọcha’. Ya bụ ọmarịcha atụmatụ ịkọchasị ọwa mmiri bụ nke ọ bụ isi ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka gbùrùgbúrù nọ n’isi n’imezùpùta ya nakwa itinye ya n’ọrụ, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji hụ na e bèlàtàrà ma gbòchie mkpamkpa idè mmiri na-akpa n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ na mpaghara ebe ndị ọzọ na ya bụ steeti. Ya bụ amụmà ọrụ bụ nke weere ọnọdụ na mpaghara ebe dị iche-iche, ma bụrụkwa nke ndị òtù ọrụ ahụ gàghàrịrị n’ọtụtụ ebe n’ihi ya ịhụ na ileta ka o si aga. N’okwu ya bànyere atụmatụ ahụ, onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n’ihe gbasaara gburugburu, ma bụrụkwa onye onye nlekọta nke atụmatụ ‘Dobe Anambra Ọcha’ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti, bụ maazị Francis Igweh kwuru na itinye nke ahụ n’ọrụ bụ iji hụ na ndị Anambra na-esonyesi ike na ya

Ndị uwe ojii Anambra ejidela ndị ohi ọzọ na ndị òtù nzuzo

IGBO sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, maka na ọ na-abụ a na-etigbu ọ ka na-arịsịta, ị mara na ihe a na-etigbu agwụbèghị n’ebe o si arịpụta. Ka ọ dị ta, ndị uwe ojii na steeti Anambra Steeti anwụchikọọla ndị dị iche-iche a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi, ndị otu nzuzo na ndị na-apịa ụmụnwaanyị ọkụ n’ike. Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ozi isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na steeti ahụ kụpụrụ nso-nso a, bụkwa nke ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Harụna Mọhammed bìnyèrè aka na ya, n’aha onyeisi uwe ojii na ya bụ steeti, bụ maazị John Abang. Ya bụ ozi kọwara na ngalaba òtù ọ ọrụ ndị uwe ojii ahụ pụrụ iche na-ahụ maka ibu agha megide ohi, bụ nke e jiri ‘SARS’ mara nwụchikọrọ maazị Chinedu Umerah (gbara ahọ iri na asatọ), Ọlụebube Uboh (gbara ahọ iri na isii) na Chinwendụ Obute (gbara ahọ iri na asaa) na Chukwuma Amazu (gbara ahọ iri na asaa) maka ijikọ aka ọnụ, ha na mmadụ abụọ ọzọ ka na-eri mbọmbọ ọsọ ugbua, wee gaa n

E tòóla gọọmenti Anambra maka ezi ọrụ ya n'ịkwàlite ahụike

IGBO sị na ọ na-abụ e tòó onye gburu ewu, ọ hụ ehi, o gbuo. N’ịgbasò nke a, gọọmenti steeti Anambra nọrọ nso-nso a wee nweta òtùto site n’aka òtù ọrụ ahụike gọọmenti etiti a kpọrọ ‘National Primary Health Care Development Agency’ maka ezi ọrụ ya na ịgba dị iche-iche ọ na-eti na ngalaba ahụike steeti ahụ. Ya bụ òtùto bụ nke e kwuwàpụtàrà sit n’ọnụ ndị òtu a oge ísi ha gara kpọtụrụ aka na-achị ya bụ steeti, bụ gọvanọ Willie Obianọ n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ. Njem mkpọtụrụ ahụ bụ nke weere oge ndị òtù ọrụ ahụ bùrù ụzọ gagharịa n’ụfọdụ ụlọ ahụike dị iche-iche na ya bụ steeti, iji mara na ọrụ ọ na-agakwa otu o sìrì kwesi ekwesi n’imezùpùta ebumnobi ọchịchị onyeisiala bụ Buharị dịka o siri metụta ịkwàlìtè ngalaba ahụike bụ ịgbà n’ala Nigeria. N’okwu ya banyere ije ahụ ha bịara, onye duru ndị ahụ wee bịa, ma bụrụkwa onyeisi òtù ọrụ ahụike ‘National Primary Health Care Development Agency’ bụ Dọkịta Faisal Shuaibu gosipùtàrà afọ ojuju ya bànyere ihe ha hụtagàsịrị n’ụlọ ah