IGBO sị na nwata a na-agwọ ibì ọ na-eto afọ, ị mara na o nwèrè ihe ọ tọbàrà n’ajọ ọfịa. O wee bụrụ ya, na ka ọ dị taa, na ndị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọla ndị òtù ohi ọzọ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, na-agbanyeghị mbọ dị iche-iche ọchịchị steeti ahụ gbàgòrò imemìla ohi na arụrụ ala na steeti. Dịka ozi isi ọchịchị ndị uwe ojii na steeti ahụ kụpụrụ nso-nso a siri kọwaa, bụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na ya bụ steeti, bụ maazị Harụna Mọhammed sìrì kọwaa; ndị oji akpa eli ozu ahụ na-aga akpàkasị ụlọ ndị mmadụ, ma na-ezu ha ohi. Ozi ahụ mere ka a mara na ọ bụ site n’ịkwụsị ụgbọala na inyòcha ndị mmadụ, bụ nke ndị uwe ojii na-eme n’okporo ụzọ Ifitè Awka, ka e jiri nwụchikọọ otu nwaokorobịa, bụ Elendu Wisdom, gbara ahọ iri abụọ na isii, ma mgbe ha nyòchàrà àkpà ya, ha wee hụ akụrụngwa na ngwaọrụ dị iche-iche o ji akpàkasị ụlọ ndị mmadụ, tinyere nkwụ ọkụ, anwụrụ, ihe nri na ihe ndị ọzọ dị iche-iche. Mgbe a gbàrà ya ajụjụ nnyòcha, nwata nwoke ahụ