Posts

Showing posts from June, 2019

E nyela mmadụ karịrị ótù puku nnyocha maka ọrịa ịbà n'efù

 OKE ọñụ dara nnọọ n’isi ngwụcha izuụka gara aga na Nsugbe, dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’ na steeti Anambra, dịka mmadụ karịrị otu puku n’ọnụ ọgụgụ nwetàrà nnyòcha ahụ ma natakwa ọgwụgwọ maka ọrịa ịbà n’efù. Inyòcha ahụ na inye ọgwụgwọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige Abito Nsugbe, ma bụrụkwa nke e mèrè n’aha onyeisi ọchịchị obodo ahụ lagoro mmụọ, bụ maazị Frank Owelle. N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịchụ ọrịa ịba ọsọ ụkwụ erughị ala, bụ ụlọ ọrụ ‘Roll Back Malaria’ n’okpuru ọchịchị Anambra East, maazị kwuru na ebumnobi ọrụ obi ebere bụ iji wee belata otu ọrịa ịba si agbasàwanye n’ike n’ike ụbọchị ọbụla. O mere ka a mara na nke ahụ bụ agba nke abụọ ha na-achịkọba ihe mmemme ahụ, bunye ezinaụlọ maazị Frank Owelle na ndị òtù isi ọchịchị obodo ahụ, bụ ‘Nsugbe Development Union’ maka ịtụpụta na ịkwàdo ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke o kwùrù na o nyela aka n’ụzọ pụrụ iche n’ibibì na imeṅémìlà ọrịa ịbà n’obodo ahụ. Na ntụnye nke ya, onyeisi oche  nchere oge òtù ‘Nsugbe D

A kpọọla oku ka a na-akuzi mkpụrụ edemede Igbo n'ụlọakwụkwọ

 AKPỌỌLA oku ka ngalaba na-ahụ maka mmụta (Ministry of Education) kwado mkpụrụ edemede Igbo A,B,CH, D n’ụlọakwụkwọ nke prima niile nke dị n’ala Igbo. Imalite ikuzi mkpụrụ edemede Igbo n’ụlọakwụkwọ niile dị n’ala Igbo ga-enye aka mee ka nwa afọ Igbo ọbụla mara ka e si ede ma na- agụ asụsụ Igbo n’oge na mgbe ọbụla. Nwaamadi aha ya bụ Pius Ofuonye, bụ onye lagoro ezumike n’ọlụ nkuzi sịrị na amaghị otu e si agụ mkpụrụ edemede e ji ede asụsụ Igbo bụ ihe kpatara n’ụfọdụ mmadụ amaghị ka e si ede ma ọ bụ agụ ihe e dere n’asụsụ Igbo. Nwaamadi a sịrị na ihe ọzọ kpatara asụsụ Igbo anyị jizi ada ada ugbu a bụ na ọdịghịzị onye na-achọ ime asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ niile dị n’ala Igbo. Ọtụtụ mmadụ chere na ọdịghị ebe e ji asụsụ Igbo eje, mana  ọ bụ asụsụ onye ka e ji ama ebe o si pụta. N’ezie asụsụ niile ọbụla dị mma tinyere ka ndị siri were asụsụ ha maka na okwu Igbo sịrị na onye kpọọ ọba ya mkpọkọrọ, agbataọbị ya ewere ya kpoo ntụ. Oke nlepu anya nke ndị nwe asụsụ Igbo lepuru mkpụrụ edemede e ji ede

Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ihe na-eche aka mgba n'alum di (3)

E KWURU okwu sị na e kere ọlụ eke. Site n’okike ụwa, Chukwu kere ihe nwoke ga-eme na ihe nwaanyị ga-eme. Ma ọ na-abụ ihe mwute na ị bịa n’ọtụtụ ezinaụlọ, ọ dịka a ga-asị na ọ bụ nwaanyị ka a hapụzịịrị ihe niile. Nwaanyị ga-alụ di, nwaanyị ga-adị ime, nwaanyị ga-amụ nwa, nwaanyị ga-azụ nwa. Nwaanyị ga-esi nri, dozie ezinaụlọ, nwaanyị ga-akpatakwa ihe a ga-eri n’ezinaụlọ. Hee! ụwa ụmụnwaanyị! Ebe nwaanyị mere ihe ndị a niile, ọ gịnị bụzi ọlụ ụmụnwoke? Ọtụtụ ego ụmụnwaanyị na-akpata n’ezinaụlọ bụ naanị iji rie nri na igbo obere mkpa dị iche iche, ma ọ bụ ego nwoke ka e ji alụ ọlụ siri ike dịka ịgba ala, ịlụ ụlọ obibi, ịlụ ụlọ ebe nlụpụta ngwa ahịa, wdg. O nwere ebe Chi kere nwaanyị ọ ga-ejedebe ma mgbe ọbụla ọ gafere ya, ahụ na-agbakasị ya n’ihi na ọ gafeela ebe Chi debere ya ọ ga-ejedebe. Nke ọzọ bụ ejechaa ọgwụ n’ihe na-eche ụmụnwaanyị aka mgba n’alụm dị bụ mgbe a jụrụ na nke nwoke na nke nwaanyị hụrụ onwe ha n’anya agaghị alụ di na nwunye n’ihi otu okwu e nweghị nghọta sitere n’akụkụ n

Akụkọ ifo: Ihe mere ọkụkọ ji abọ ala (2)

MBE, anụmanụ dị oke aghụghọ bidoro masaba nnekwu ụtọ. Mgbe ọ bụla abịara nzukọ, mbe na-abịa nọdebe nnekwu na-akpanyere ya ụka. E mekata, mbe na nnekwu wee bụrụ nnukwu enyi nke na ha na-akpazị maka ezinaụlọ ha. Ha kpakatara nke na ha gwara onwe ha ihe ha ga-eji ego nke ha mee ma e kee ya. Mbe gwara nnekwu na ọ ga-eji nke ya lụọ oke ụlọ ga-enwe ọtụtụ ọnụ ụlọ ọ ga-adọkọju nri ka ọ ga-abụ mgbe ụnwụ bịara, ka ya na ezinaụlọ ya ghara ịtara agụụ ahụhụ n’ịchọ ihe ha ga-eri. Nnekwu gwara ya na ọ ga-eji nke ya zụọ ụmụ ya n’akwụkwọ. Otu ụbọchị, nnekwu na-aga n’ugbo ya ka o wetara ezinaụlọ ya ihe ha ga-eri wee zute mbe n’ụzọ, ha abụọ wee kelekọrịta onwe ha. Mbe wee jụọ nnekwu ma ọ ga-abịanwu n’ụlọ ya n’ihi na o nwere ọjị, nnekwu wee sị ya na ya agaghị abatanwu na ọ dị ya ọsọọsọ wee jụọ ya nke bụ ụlọ ya, mbe gosi ya. Ha keleritakwara onwe ha ọzọ. Nnekwu gaba ịchọrọ ezinaụlọ ya nri n’ugbo ya. Ụmụ anụmanụ niile na-ebi n’udo na aǹụrị. Ego ha tụkọtara agbalitela, ha na-ekpezi ekpere ka afọ bịa n’isi nj

Mbụgharị Nigeria bughàrịrị ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya

KA Ọ dị taa, ọ bụghụzị akụkọ ọhụrụ na ala Nigeria ebugharịala mgbe e ji emerùbezị ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya. Ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya bụ oke ụbọchị pụrụ iche n’ala Nigeria, n’ihi na ọ bụ ncheta ụbọchị ọchịchị ndị nkịtị laghachitakwara azụ n’ala ahụ, ka ọ gachara afọ kwùrú afọ ndị agha weghààra ọkwa. Nigeria, dịka mbà nwèèrè onwe ya pụọ n’aka ọchịchị ndị ọcha n’abalị mbụ nke ọnwa nke iri n’afọ 1960, bụ oge ụmụafọ Nigeria wèghàrà ọkwa ọchịchị ala ha. Ka ọ gachara mkpụrụ afọ ole na ole nke ahụ mechàrà (Jenụwarị 15th1966), ndị agha ala anyị gbawara ndị nkịtị aka, ma weghara ọkwa ọchịchị. Ọchịchị ndị agha ahụ bụzị nke dịgidere gachaa ogologo afọ niile a lụrụ agha Nigeria na Biafra (1966-1970) wee ruo n’afọ 1979, bụ mgbe ọchịchị ndị nkịtị laghàchikwàrà azụ n’ihi nhọpụta izugbe e mere, bụ nke Maazị Shehu Shagarị na Dọkịta Alex Ekwueme nọrọ na ya wee tute ùgò dịka onyeisi ala na òsòte onyeisi ala n’ótù n’ótù. Nke ahụ bụ nke ùgbòrò abụọ ndị nkịtị na-ewèghara ọkwa ọchịchị ala Nige

Ọba akwụkwọ Anambra eturula ugo dịka ọba akwụkwọ kacha mma na Nigeria

DỊKA a sị na ọ bụ ọrụ onye na-ekwuru ya, ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ nke a maara dịka ọba akwụwkọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka eturula ùgò dịka ọba akwụkwọ ọhanaeze kacha mma n’ala Nigeria gbaa gbùrùgbúrù maka ahọ 2018. Ya bụ akụkọ ọgbụgba ama bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ozi a kụpụrụ nso-nso a, bụkwa nke ode akwụkwọ ìzùgbe nke otu jikọtara ọba akwụkwọ niile dị n’ala Nigeria a maara dịka “Nigeria Library Association (NLA)”, bụ maazị Atsenokhar Omoh bìnyèrè aka na ya n’aha onyeisi ìzùgbe nke òtù ahụ n’ala anyị, bụ maazị Umunna Opara. Ya bụ agụ nwoke, site n’ozi ahụ, mèrè ka a mara na ya bụ nturu ùgò na nkwanye ùgwù bụ n’ihi ọrụ ọma dị iche iche na ihe ndị ọzọ dara ụdà ya bụ ọba akwụkwọ meputagòrò  n’ịkwalite ọnọdụ mmụta na steeti ahụ na n’ala Nigeria n’izugbe. Ọ gazịkwara n’ihu mee ka a mara na ọ bụ n’abalị iri atọ na otu nke ọnwa Julaị ahọ a ka a ga-anọ wee mee mmemme inye ya bụ ọba akwụkwọ  nturu ùgò ahụ na asambodo so ya, bụkwa nke ga-ewere ọnọdụ n’ụlọ nkwọriakụ Golden Tuli

Gọọmenti Anambra ebunyela ụlọ ọrụ ATMA na VIO akụrụngwa ọhụrụ

DỊKA a sị na ọ na-abụ a gwọọ ezigbo ajụ, ibu adị mfe, gọọmenti steeti Anambra ebunyela ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ibelata agbakata akwụrụ n’okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ “Anambra Traffic Management Agency (ATMA)” na ụlọ ọrụ nke na-ahụ maka nnyòcha ọnọdụ ụgbọala, bụ ụlọ ọrụ “Vehicle Inspection Officers (VIOs)” akụrụ ngwa ọhụụ pụrụ iche  eji ebelata ya bụ agbakata akwụrụ. Ya bụ akụrụngwa bụ nke a gbàrà n’anwụ n’isi ụlọ ọrụ oyibo steeti ahụ dị n’Awka, site n’aka kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka njèm okporo ụzọ bụ maazị  Uchenna Okafor mere ka a mara na ọ bụ ụlọ ọrụ abụọ ahụ ga-eji ya bụ akụrụngwa wee na-arụ ọrụ n’okporo ụzọ dị iche iche na ya bụ steeti, ma kwuo na ọ ga-enye aka ime ka ụgbọala kwụsị ikwòkọsị ọnụ n’okporo ụzọ.   N’okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ATMA, bụ maazị Pat Obiefuna mere ka a mara na akụrụngwa ahụ ga na-enye aka n’ịgwa onye na-akwọ ụgbọala kwụsị, ma ọ bụ gàbá, ma sịkwa na onye ọbụla na-akwọ ụgbọala ga-ahunwu ya bụ akụrụngwa na-agbanyeghị ụdị oteaka ọ sọkwara ya nọrọ. Ọ dụkwazịrị

Ndị uweojii ejidela nwaanyị tọọrọ nwa a mụrụ ọhụrụ na Jos

NDỊ uweojii anwụchikọọla otu nwaanyị tọọrọ nwa a mụrụ ọhụrụ na Jos, isi obodo steeti Plateau. Nwaanyị ahụ aha ya bụ Oriakụ Lerishimwa Diyal, gbara afọ iri atọ na abụọ zuuru nwa ọhụrụ ahụ ka ọ gachara abalị atọ nne ya bụ Oriakụ Mary Chukwuebuka mụchara ya n’ụlọọgwụ ‘Plateau Specialist Hospital, Jos’. Diyal (nwaanyị zuru ohi nwa) yiiri akwa njirimara ndị ọlụ ahụike wee bata n’ụlọọgwụ ahụ nara nwata ahụ n’aka nne ya n’ụdị na ọ bụ onye ọlụ ebe ahụ na ọ chọrọ ikuru ya gaa mịrị ya ọbara maka nnyocha. Otu ahụ ka o siri zuru nwata ahụ wee gbapụ ọsọ gaba n’ụlọọgwụ ọzọ ‘Bingham University Teaching Hospital, Jos’ ebe ọ gwara ha na ndị ntọrị (kidnappers) tọọrọ ya, ọ nọrọ ebe ahụ mụọ nwa ka di ya nyechara ha ego dịka ha siri chọ. Ụlọọgwụ ebe nke a bụ ebe e kwuru na nne ya na-alụ ọlụ dịka nọọsụ. Otu o sila dị, a nwụchikọrọ ya site n’ịma imi n’ala nke ndị uweojii ka e nwetachara ozi na a na-achọ nwa ọhụrụ a mụrụ na ‘Plateau Specialist Hospital, Jos’ achọ. Ka e mechara nnyocha, ilele ọbara ụmụnwaanyị

Anyị agaghịzị eziga onye ọbụla na mpaghara ogbu mmiri – NYSC Delta

DỊKA a sị na ọ na-aka mma ịgbanahị ihe izè ndụ, karịa ízè ndụ n’ihu ọnwụ, isi ọchịchị òtù ahụ na-elekọta ndị ahụ ji otu ahọ éfè ala nna anyị, bụ nke a maara na bekee dịka ụlọ ọrụ ‘National Youth Service Corp’ ngalaba steeti Delta emeela ka a mara na ha agaghịzị ezìga onye ọbụla ji otu ahọ efe ala nna anyị gaa na mpaghara ebe ahụ ogbu mmiri dị. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ òsòtè onyeisi nchịkọta na-ahụ maka izipù na izìgà ndị ahụ gaa n’ebe ha ga-anọ wee fèé ala nna ha, bụ oriakụ Ngọzị Akụagbaọgụ, n’ọgbakọ nkuzi a chịkọbààrà ndị ahụ n’ogige ụlọ ikwúù ebe ha na anata ọzụzụ, dị n’Issele-Uku, n’okpuru ọchịchị Anịọcha North. Oriakụ Ngọzi mere ka a mara na ọ bụ ihe na-echu ha ụra oge ọbụla ịhụ na ndị ahụ ji otu ahọ efe ala nna anyị na steeti ahụ nwèrè ezi ọnọdụ obibi ndụ, ma nọrọkwa n’ahụ dị mma oge niile, ọbụnadị dịka o  kwurù na gọọmenti steeti ahụ na-enyekwa ndị ahụ ego mmachi akpa dị puku Naịra ise kwà ọnwa ọbụla, tinyéré nke gọọmenti etiti na-akwụ ha. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ b

Ide mmiri akpaala nnukwu ike ọzọ na Delta

NDỊ bị n’Asaba, isi obodo steeti Delta na gburugburu ya ka na-akwa arịrị n’ihi mkpamkpa ide mmiri kpara n’ebe ahụ n’ihi oke mmiri ozizo nke zoro abali atọ. Mmadụ abụọ ka e kwuru na ha tufuru ndụ ha n’ihi ya bụ ọdachị. Ha bụ otu nwoke nọ n’agbata etiti (middle aged) na nwata nwaanyị dị afọ iri. Oke ide mmiri buuru nwoke ahụ (Hassan) n’ike, ọ bụ eziokwu na a gbalịrị zọpụta ya ma ọ nwụkwara ozugbo. Nwata nwaanyị ahụ bụ onye nke e kwuru na nne na nna ya adịlarị na mbụ nwụọ, danyere n’ime ide mmiri n’Okpanam ebe o buuru ya tinye isi n’ọwa mmiri a na-alụ ọhụrụ n’okporoụzọ sị Okpanam gaa Asaba tupu ọ tụhapụ ozu ya n’otu ebe. Ọtụtụ ndị mmadụ kwara arịrị ka mmiri siri chụpụ ha n’ụlọ ma mebichaa ngwongwo niile ha jiri biri. Otu onye ọlụaka aha ya bụ Chika Onadeko kwuru na ide mmiri ahụ kpara ike dị egwu. Ọ kọwara na ha ka nọ n’ọlụ oge ọ malitere, wee buru ọtụtụ ngwongwo o ji alụ ọlụ. N’okporoụzọ gara ‘Delta Broadcasting Service’ (DBS) bụ redio steeti ahụ, otu akụkọ ahụ ka a na-akọ. Ide mmiri kwo

Otu nwoke Ozubulu ereela nwa mbụ ya, a mụrụ ọhụrụ

NDỊ uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ abụọ maka ire nwa a mụrụ ọhụụ. A gbara nke a n’anwụ site n’ozi a kụpụrụ nso-nso a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii  na steeti ahụ, bụ maazị Harụna Mọhammed bìnyèrè aka na ya, n’aha onyeisi uwe ojii na ya bụ steeti. Dịka ya bụ ozi sìrì kọwaa, otu onye n’ime ndị oji akpa eli ozu ahụ, bụ maazị Chukwuma Enemụọ (gbara ahọ iri abụọ na asaa), onye Okwutu Amawka dị n’Ọzụbụlụ n’okpuru ọchịchị Ekwusigo ka e jidere maka ịgbakọ ìzù ọnụ, ya na nwoke ọzọ, bụ maazị Chidubem Obi (gbara ahọ iri anọ na iteghete), onye Umuabuche Eziama Uli dị n’okpuru ọchịchị Ihiala, o wee ree nwa ọhụụ ya gbara naanị mkpụrụ ụbọchị atọ n’ọnụ ego dị otu narị puku Naịra na iri ise. Onye e rèsìrì nwata ahụ, bụ oriakụ Anulika Okafor, onye Uruokwe dị n’Ozubulu ka e kwùrù na e jidèkwarà. Ya bụ ozi mere ka a mara na nwoke ahụ réré nwa ya gàrà tụọrọ nwunye ya okpookpo asị, ma gwa ya na nwata ahụ nwụrụ anwụ ka ọ gach

Ndị ọlụ ANPC amalitela ihe ọmụmụ ọzọ maka ka e si akwado ịla ezumike nka

 NDỊ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation’ (ANPC)’ bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLightxtra’a malitela ọmụmụ na nkuzi agba nke abụọ maka otu e si alụ ma na-agbakọ ego ndị na-ala ezumike nka n’ọlụ oyibo. Ọmụmụ ihe ahụ bụ nke bidoro ụbọchị Monde. Onye isi ụlọ ọlụ ahụ bụ Sir Chuka Nnabuife na ndị ọlụ niile ma ndị ngalaba ha nọpụrụ anọpụ (out station) sonyere na ya. Nnabuife nọrọ n’oge nguzobe ọgbakọ ahụ wee kwuo ebumnobi ya ime ka ndị ọlụ ANPC mara ka e si alụ ma na- agbakọ ego ndị na- ala ezumike nka n’ọlụ oyibo. Ọ siri na ọmụmụ ihe a ga-ewe otu izuụka, okwuru na nke a bụ iji mee ka ndị akụziiri ihe n’afọ gara aga na ndị nke ọhụrụ ghara ichezọ ihe ọbụla akụziri ha. Onye isi ụlọ ọlụ a gara n’ihu kwuo na ihe ya ji agba mbọ a niile bụ na ya achọghị ka ọ nwee onye ga-enwe nsogbu mgbe ọ ga- ala ezumike nka n’ọlụ, na ya chọrọ ka onye ọbụla mara ihe o kwesiri ịma nakwa ihe niile o kwesiri ịhazi tupu o ruo mgbe ọ ga-akwụsị ọlụ. Maazị Jude Anadi

Obianọ agbapeela izuụka ahụike nne na nwa

AKA na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ agbapeela agba nke mbụ nke amụmà izuụka ahụike nne na nwa na steeti ahụ. Mgbape amụmà ahụike ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Otolo Nnewi dị n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi North’, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị ikpùchi ikpùchì mmadụ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, nke gụnyere: aka chịbụrụ steeti Anambra n’oge mbụ, bụ oriakụ Virgy Etiaba; kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ahụike, Dọkịta Vincent Ọkpala; eze ọdịnala Nnewi, bụ Igwe Kenneth Orizu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ okwu ha na-ada gbowàm. N’okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ amụmà, gọvanọ Obianọ kọwara oke mkpà ezi ọnọdụ ahụike dị na ndụ mmadụ ọbụla, ma kwuo na ọ bụ nke ahụ mere ọchịchị ya jirila gbaa ma ka na-agbakwa ọtụtụ mbọ esepughị aka iji wee kwàlite ngalaba ahụ site n’ịhụ na ha nwetàzùrù akụrụngwa na ihe ndị ọzọ dị iche iche dị oke mkpa n’ime ka ọnọdụ ahụike na steeti ahụ bụrụ ejiama atụ. O mere ka a mara na ụmụaka karịrị ndè abụọ n’ọnụ ọgụgụ esonyela n’ịgba ọgwụ mgbochi na steeti ahụ kemgb

Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ihe na-eche aka mgba n'alum di (2)

N’IHI otu omenala Igbo siri debe alum di na nwunye. Ọtụtụ ụmụnwoke kwere na ọ bụ sọọsọ ha nwere ikike n’alum di na nwunye imeso ụmụnwaanyị otu o siri masi ha. Ihe a bụ otu nnukwu ihe iche aka mgba e nwere n’alum di na nwunye ugbu a na-emebisi ọtụtụ ihe. Ị ga ahụ nwoke jọrọ njọ, sụọ mkpụmkpụ, a gwa ya chọba nwaanyị mara mma ma tokwaa ogologo. Ị ga-ahụ nwoke agwa ya nwere ka ọ dị, dị oji ma na-eru unyi, a gwa ya chọba nwaanyị maara ihe, dị ọcha n’ile anya ma na-adịkwa ọcha n’ibi ndụ ya. Nke kacha njọ ahụghị ọnụ elu eji epuchi ọnụ ala bụ na ị ga-ahụ nwoke agụghị akwụkwọ, enweghị ihe ọ na-eme, asị  ka a chọbara ya nwaanyị gụrụ ezigbo akwụkwọ ma nwekwa ihe ọ na-eme. Ajụjụ wee bụrụ: n’ihe ndị a niile a kpọpụtara kedụ ka i siri chee na mmadụ abụọ ndị a ga-enwe ezinaụlọ ga-eguzo? O nwere okwu a na-ekwu sị na ‘nnụnụ nwere otu ụdị nku na-efekọ ọnụ’. Kedụ ka nwoke agwa ya jọrọ njọ na nwaanyị agwa ya mara mma ga-esi ebikọ? Kedụ ka nwoke uche ya ezughị oke na nwaanyị uche ya zuru oke ga-esi ebikọ?

Akụkọ ifo: Ihe mere ọkụkọ ji abọ ala (I)

OTU oge gara aga mgbe amụbeghị ndị nna anyị ha,ọ dị otu nzukọ jikọtara ụmụanụmanụ niile. Ụmụanụmanụ na-agbakọ na-atụ elo ma na-ekwukwa maka nsogbu dịirị ha na otu a ga-esi dozie ya. Ihe kacha ha mkpa na ya bụ nzukọ bụ otu ha ga-esi dozi nchekwa ha na ime onwe ha ka ha baa ọgaranya. Ha chọrọ ibi n’obi aǹụrị n’obodo ha. N’ime nzukọ ha, ha nwere ndị isi: Agụ bụ onye isi oche, Enwe bụ ode akwụkwọ, Ewu bụ ode akwụkwọ ego na ndị isi ndị ọzọ ma ha e nweghị ojide ego. Ha bidoro nwebe mgbakasi ahụ n’onye ga-abụ ojide ego, ha wee nwee nzukọ ịhọpụta onye ga-abụ ojide ego ha. N’ikpeazụ, ha họpụtara nnekwu (nwunye ọkụkọ) na ọ bụ ya ga-abụ ojide ego ha. Ụmụanụmanụ nwere aǹụrị nke ukwuu n’ihi na ha hụrụ na ọ ga- ejidenwu ego ha n’ihi obi umeala ya na ikwesi ntukwasi obi ya. Ụmụanụmanụ wee bido tụkọtaba ego ka ume onye ọbụla ha. Ihe bụ ebum n’obi ha na ya bụ ego ha na-atụkọ bụ ịba onwe ha ọgaranya. A na-enye nnekwu ego niile ha tụkọtara n’nzukọ dịka ojide ego. Mgbe nnekwu laruru n’ụlọ ya, o gwuru ala

Ịnyụ nsi aghara-aghara adịghị mma

IGBOCHI ịnyụ nsị aghara aghara, ọkachasi n’obodo mepere emepe bụ ihe dị oke mkpa.Ịnyụ nsị n’akụkụ ụzọ, n’akụkụ mmiri ma ọ bụ n’ọwara mmiri si aga adịghị mma. Nke a na-eme ka gburugburu na-esi isi. Ọzọ, ọ na-eme ka ọrịa na nsogbu dị iche iche na-adapụta n’obodo. Oge ụfọdụ, ị na-aga n’okporo ụzọ, ịhụ nsị ka ekechiri tọgbọ, ụgbọala ria ya elu ma ọ bụ mmadụ zọkwasị ya ụkwụ, ọ gbasaa ebe niile. Nke a jọgburu udele ma sigbuo nkapi n’isi. Ndị na-eme ihe ndị a abụghị ụmụaka, ha bụ ndị tozuru oke ma mara ihe dị mma. O kwesiri ka tupu onye ọbụla esi be ya pụọ n’ụbọchị ọbụla ka ọ nyụọ nsị na be ya . Nke a ga-enye aka beleta ịnyụ nsị n’okporo ụzọ. Ụfọdụ ụlọ ebe ha na-anyụ nsị mebie, ha agaghị edozi ya mgbe kwesịrị. Nke a sokwa na-eme ka ụfọdụ ndị bi ebe dị otu a malite ịnyụ nsi na-ekechi. Mmiri zobe, ha ebuputa ha wụnye n’ide mmiri. O kwesiri ka gọọmenti jide ma kpụrụ onye ọbụla nwere ụlọ n’obodo mepere emepe ma onweghị ebe a na-anyụ nsị ma ọ bụ na omebiri ma edozighị ya. N’ihi ihe ịsọ oyi a, aka

Ihe ụmụnwoke ji achọzi nwaanyị aka siri ike

N’OGE mbụ, ụmụnwaanyị na-aza oriakụ ma na-erikwanụ akụ ahụ n’ezie. Mgbe ahụ ihe dị mma, ọlụ nwaanyị na-abụkarị ịmụ nwa, ịzụ nwa na ije ozi ụlọ dị iche iche ma lekọtakwa di ya anya. Ma taa, ihe agbanweela, ụmụnwaanyị na-akpatazị akụ akpata ọ bụghị sọ inyere di ha aka. N’oge mbụ, nwaanyị na-enyere di ya aka site n’ịlụ ọlụ dị iche iche dịka ọlụugbo, ịzụ ahịa, aka ọlụ dị iche iche w.d.g. Site n’ụzọ dị otu ahụ, ezinaụlọ ha a na-ebu na-enwe aǹụrị. Mana ụmụnwaanyị esila n’oriakụ na onye enyemaka baa n’ide ji ụlọ. Ụmụnwoke na-achọzị nwaanyị aka siri ike ka ihe ụwa wee dịrị ha mfe, nwoke na-enweta nwaanyị na-enweta ibu adị mfe makana ndị Igbo kwuru okwu sị, aka weta aka weta, akpa eju. Ọnọdụ ụwa taa mere na ọtụtụ ụmụnwoke chọọ ịlụ nwaanyị, ha achọba onye aka siri ike. Nke ahụ adịghị njọ n’ihi na mgbe ụfọdụ, sọọsọ nwoke na-enweta ego n’ezinaụlọ, ọnaghị ezucha. Ebe nsogbu dịzị bụ na ọtụtụ ụmụnwoke na-akpachara anya na-anọ nkịtị bido ụtụtụ ruo mgbede. Ha zụọ ahịa taa, ha anyaa ụgbọala echi, ụbọchị

Otu a ga-esi gbochi nsogbu n'omenala ụfọdụ n'ala Igbo

OBODO niile dị na mba ụwa nwere omenala ha na-eme. Omenala pụtara ka ndị si eme, ihe ndị kwenyere, ka ha si akpa agwa, ka ha si ebi obi na ka ha si ebi ndụ, ụdị egwu ha na-agba na ejiji ha na-eji nakwa ekike ha na-eke. Nke a mere obodo ọbụla ihe ha bụ. Omenala na ọdịnala na-eyibe onwe ha mana otu ihe ọdịnala jiri dị iche bụ na obodo adịghị achọ igbanwe ọdịnala ha ma ọ na-emegide ha ma ọ bụ na ọdịghị emegide, iji ma atụ, ọdịnala ‘Zuma Rock’, ndị na-eme ya ka na-agba ọtọ eme ya. N’agbanyeghị na ebe ahụ emepeela, ha achọghị ịgbanwe ya maka na ọ bụ otu nna nna ha si eme ya. Mgbe ochie, ọ dị ụfọdụ omenala a na-eme dị mma ma na- atọ ụtọ, mgbe ọbụla ha ga-eme ya n’afọ, ndị niile bi ha gburugburu ga-esonyere ha na- enwe ọṅụ. E mee omenala dị otu a, ha akpọọ ndị enyi ha na ndị ọgọ ha ka ha bịa soro ha ǹụrịa, ha risie nri, e duru ha gaba n’ama obodo ahụ ebe a na-egosi egwuruegwu dị iche iche. Dịka anyị maara na ụfọdụ omenala na-eti mmọnwụ, ụmụnwoke na ndị ikorobịa buru mmọnwụ ha na-agba egwu, nd

E liela Oriakụ Okwuedo

E LIELA Oriakụ Chizoba Rosemary Okwuedo (nee Ezeoke)  ‘Diesel’ ebe ụwa niile bịara kelee Chineke maka ndụ ya.Ihe niile gara nkeọma, ma be di ya ma be nna ya. Akwamozu ya ji ụka nche abalị (vigil mass) wee malite n’ezinaụlọ be nna ya bụ Pius Ezeoke n’Umugama Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra na Tọọzdee ọnwa Junu dị n’abalị iri na atọ. Ndị ụkọchukwu si ebe dị iche iche bịa, ha gụnyere bishọp abụọ, Bishọp Jonas Benson Okoye bụ osote bishọp dayọsis Awka na Bishọp Peter Eberechukwu Okpareke bụbu bishọp Dayọsis Ahiara na ndị ụkọchukwu dị ihe dịka iri ise. A kara ụka elimozu na be di ya na St Anthony’s Catholic Church Ifite-Ogwari nke dị n’okpuru ọchịchị Ayamelum na steeti Anambra na Fraidee ọnwa Junu dị n’abalị iri na anọ. N’okwuchukwu, Fada Benjamin Ewelu, onyeisi ụlọakwụkwọ ‘Pope John Paul II Seminary Okpuno’ chetaara ndị ụka maka nkewa nke ga-adị n’ụbọchị ikpeazu n’etiti atụrụ na ewu. Ọ kọwara na ihunanya bụ isi na njem eluigwe. Ọ dọrọ aka na ntị ma kọwaa mkpa ọ dị m

Omenala lgbo agaghị anwụ – Ugbaja

ONYE Ozioma Ọdinala, nke na- eji ụlọọlụ’Anambra Broadcasting Service’ (ABS) wee na-ezi ndị mmadụ ozi maka ntọnala lgbo bụ Maazị Chukwubike Ugbaja ekwuola na ọdinala na omenala Igbo ga-adiriri. Okwuru okwua  mgbe  ndị a na-akpo ‘Love Care for the Needy, Destitute and Physically Challenged’  na ndi ‘Sharing lLfe Issues with Ifeomamebe’ (bụ emume mgbasa ozi n’ABS)  kwadoro ihe nkuzi “Na arụ isi ike kam ga-eto Chukwu”, nke e mere n’ụlọọlụ ‘Anambra State Universal Basic Education’ (ASUBEB). Ugbaja kwuru na obodo ọbụla na-eme nkeọma bụ ndị ji omenala ha  kpọrọ ihe. Okwuzikwara na obodo ọbụla tufuru asụsụ ha na omenalaha agaghị aga n’ihu. Ojikwara ohere ahụ kagbuo ọtụtụ ndị jụrụ ime omenala ha ma na-eme nke ndịọzọ. Onye  oziọma ọdinala jiri ohere ahụ  gwa ụmụ afọ  Igbo ka ha lachighaa azụ n’asụsụ na ihe ejiri mara Igbo.

Ọzọdimgba eloola nde naira asaa na Kano

A NA-EME nnyocha ugbua gbasara mkpesa e nwetara na ọzọdịmgba eloola nde naịra asaa (seven million naira) n’ebe a na-echekwa ụmụanụmanụ (zoo) nke dị na Kano. Onyeisi ụlọ anụ ahụ ‘Kano zoo’ bụ Umar Kashekobo kwuru sị “Ndị uweojii na-enyocha ihe merenụ, ihe m nwere ikwu bụ na ego na-efu.” Onye okwupụta okwu ndị uweojii na Kano bụ Abdullahị Kiyawa kwuru sị na ego abalị ise a natara na geeti (gate fees) furu efu. Ọ gwara ndị nta akụkọ na anwụchikọọla mmadụ iri maka nke ahụ ma kwukwaa na a na-emekwa nnyocha iji chọpụta ihe mere e ji debe nnukwu ego ahụ n’ụlọọlụ ahụ karịa idebe ya n’ụlọakụ. N’ajụjụ ọnụ a gbara otu onye nọ na ngalaba na-ahụ maka ego n’ụlọọlụ ahụ, o kwuru na ọzọdịmgba mịbatara zuru ma loo ego ahụ. Ozi e nwetere n’ikpeazụ site n’aka onye is ebe ahụ na-akọwa na ọ bụ ndị ohi zuuru ego ahụ.O kwuru hoo haa na ha enweghị ọzọdimgba n’ụlọ anụmanụ ahụ.Otu o sila dị, a na-eme nnyocha maka ohi ahụ ugbu a. Ka anyị cheta  n’afọ gara aga na otu onye ọlụ na ‘Nigeria’s National Exam Board’ na

Otu nwaanyị agbahapụla nwa ọ mụrụ n'Osumenyi

OTU nwaanyị agbahapụla nwa nwaanyị ọ mụrụ n’ụlọ ahụike ‘Primary Health Care Centre’ nke dị n’Obiuno Osumenyi okpuru ọchịchị Nnewi ‘North’ na steeti Anambra. Ozi si n’aka onye na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti Anambra bụ Haruna Mohammed kwuru na ndị uweojii na-ahụ maka ụdị ihe ahụ ‘Juvenile and Welfare Unit’ ngalaba Osumenyi gara n’ebe ahụ; ebe a na-agbazi mbọ ijide nwaanyị ahụ nọ n’ọsọ iji kpee ya ikpe. Onye uweojii ahụ gara n’ihu kwuo na mkpesa ha nwetara kwuru na nwaanyị ahụ nke amaghị onye ọ bụ gbabatara n’ụlọọgwụ ahụ mgbe ọ nọzi n’ọnọdụ ịmụ nwa. Ndị ọlụ ụlọọgwụ ahụ nyeere ya aka o wee mụọ nwa nwaanyị n’udo ka ọ gachara nkeji iri na ise, ebe ndị nọọsụ hapuru ya ma na-elekwa ndị ọzọ, o rie mbọmbọ ọsọ. O kwuru sị: “N’oge eteghị aka o ji mụcha nwa, nwaanyị ahụ gbahapụrụ nwa ọhụrụ ahụ ma tinye isi ebe mmadụ amaghị ma hapuzie nwa n’aka ndị nọọsụ ụlọ ahụike ahụ. Dịka o si kwu, a na-akwadobe ịhafe nwa ahụ n’aka ndị na-elekọta ụmụaka enwe nne na nna nke gọọmenti (governm

NIMASA etiela ndị iju mmiri wakpòrò n'afọ 2018 aka n'obi

DỊKA ótù ndị ọrụ agha mmiri ala anyị a maara dịka “Nigerian Maritime Administration and Safety Agency” (NIMASA) etiela ndị ahụ iju mmiri wakpòrò na steeti Anambra n’ahọ 2018 aka n’obi, ma sị ha dìbé, site n’ịtụrụ na ibunye ha ọtụtụ ihe enyemaka na ihe erimeri dị iche iche iche. Iti aka n’obi a bụ nke ndị òtù ahụ bịara me n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadị na steeti ahụ, bụ ụlọ ọrụ “Anambra State Emergency Management Agency” bụ Maazị Paul Odenigbo nabàtàrà n’aha gọọmenti steeti ahụ. Ndị ahụ bụkwa ndị buru ọtụtụ ihe erimeri na ihe e ji akwalite ọnọdụ obibi ndụ wee bịa ya bụ njem iti aka n’obi, nke gụnyere akpa osikapa, akpà nnu, mmanụ, ihe ọñụñụ dị iche iche, àkwà edinà, igwe e ji akwa ákwà, àkpà fịọ-fịọ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’okwu ya dịka ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n’aka steeti Anambra, onyeisi ụlọ ọrụ NIMASA n’ala anyị, bụ maazị Dakuku Peterside, nke onyeisi ngalaba na-ahụ maka inyòcha akpa ego, bụ maazị Victor Ọnụzuruike nọchit

Anambra akụzierela ndị ntorobịa otu e si edenye asụsụ Igbo na Wikipedia

GỌỌMENTI Anambra enyela ndi ntorobịa sitere mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ ọzụzụ maka otu e si ede, agbakwụnye ma na-atụgharị okwu n’asụsụ Igbo na wikipedia. Ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị abụọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Awka, n’isi ngwụcha izuụka gara aga, ma bụrụkwa nke a chịkọbara site n’aka ụlọ ọrụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara usòrò ọrụ aka dijitaalụ, na njikọ aka ụlọ ọrụ na-ahụ maka nkwàlite ndị ntorobịa na nkewapụta akụnụba ihe e ji aka emeputa, tinyere ụlọ ọrụ Wikipedia. N’okwu ọ gwara Ka Ọ Dị Taa bànyere ya bụ ọzụzụ, onye chịkọbara ya bụ ọgbakọ, ma bụrụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara usòrò ọrụ aka dijitaalụ, bụ Maazị Ifeanyị Anịagọh mere ka a mara na ebumnobi e jiri hazie ya bụ iji mee ka ndị ntorobịa steeti ahụ soro bụrụ ndị ma nke ekwe na-akụ n’ihe gbasaara iji usoro dijitaalụ mee ihe n’asụsụ Igbo, ọbụnadị dịka ka o siri metụta idebanye, ịtụgharị na itinye okwu na ederede ndị ọzọ na Wikipedia, bụ ebe ndị mmadụ n’ụwa gbaa gb

Mmadụ iri ekpuola isi ka a gbachara ha ntụtụ n'ụlọọgwụ Kaduna

MMADỤ iri a gbara ọgwụ n’ụlọọgwụ anya na Kaduna e kpuola isi ozugbo a gbachara ha ntụtụ kemgbe ọnwa Mee. Ndị ahụ niile kpuru isi bụ ndị na-abịabu anara ọgwụ n’ụlọọgwụ anya ‘National Eye Centre’ Kaduna.   Ozugbo ya bụ ihe mechara, ndị ụlọọlụ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ bụ ‘National Agency for Food na Drug Administration and Control’ (NAFDAC) gbatara ozugbo ma were ọgwụ ahụ maka nnyocha.   N’ihi mgbagwoju anya maka ya bụ ihe, ndị nlekọta ụlọọgwụ ahụ debere ndị ahụ niile kpuru isi na-enye ha nri na ọgwụ n’efu iji nye aka ka ha hụbakwa ụzọ ọzọ.   Ndị ahụ kpuru isi kwuru na o nyeghị ha ọnụ okwu, na ha amaghị ihe mere ha niile ji kpuo isi ụbọchị ahụ a gbachara ha ọgwụ nke sitere n’otu olilo (bottle), ebe ndị nlekọta ụlọọgwụ ahụ kwuru sị na ha na-anwa ike ha iji hụ na ndị ahụ niile bidokwara hụba ụzọ. Onyeisi ndị dibia oyibo n’ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịnta Mahmoud Alhassan kwuru na ụlọọgwụ ahụ dịbu mbụ agba ndị mmadụ ọgwụ ahụ n’enweghị nsogbu ọbụla.   O kwuru si: “ọgwụ ọgbụgba ahụ (injection) nke a