Obianọ enyela ndị igwe ọhụrụ akwụkwọ ikịke
DỊKA a sị na ọ na-adị mma a kpụọ Diji, a kpụnye ya óké ji n’aka, aka na achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ enyela Igwe Ihiala, Igwe Thomas Obidiegwu, Oluoha nke asatọ n’Ihiala na Igwe Raphael Chukwurah nke Ụmụdiọka dị n’okpuru ọchịchị Dunukọfịa na steeti ahụ asambodo dịka eze ọdịnala obodo ha. Mmemme inye asambodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị eze ọdịnala na ndị e ji okwu ha agba ìzù n’ihe gbasaara ọchịchị na echichi ọdịnala. Dịka ọ na-enye ha àsàmbodo ahụ, Gọvanọ Obianọ chetaara ndi eze ọdịnala ahụ na ọchịchị bụ maka nchịkwa obodo na mmadụ, dịka o siri bụrụ mmasị Chineke, ma kpọkùzie ha ka h wère òhèrè ọchịchị ahụ wee hazie ma chịkwaa obodo na ndị bi n’ime ya n’ụzọ ọma dịka a tụrụ anya. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ghara ịbụ eze na-agbakụta ndị ha na-achị azụ, ma gbakwa mbọ hụ na ha tinyèrè úchú n’ebe ndị ntorobịa obodo ha nọ, iji mee ka ha bụrụ ndị bara úrù, ma sikwazie n’ụzọ dị otu ahụ wee kwàlite udo na ọnọdụ mmepe