Posts

Showing posts from April, 2019

Ndị ọlụ na ndị rụrụ n'ANPC ekpeela ekpere nnabata udo

Image
UDO na ọñụ biri ọma n’ụlọ ọlụ Anambra Newspaper and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light’, Ka Ọ Dị Taa na ‘SportsLight Xtra’ ụbọchị Tuzdee. Ha mere mmemme iji weta ezi mmekọrịta na ihụnanya zuru oke (re-union) n’etiti ndị ọlụ na onyeisi, tinyekwara ndị lagoro ezumike n’ọlọ ọlụ ahụ. E ji ekpere ngọzị (benediction) were mee ya nke Rev. Fr Peter Andrew Ibeazor nke ‘St Thomas Aquinas Parish G.R.A Awka’ nọ n’isi ya. Onyisi (Managing Director) nke ụlọ ọlụ ahụ bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife kọwara na mmemme ahụ bụ maka udo; ka obi dajụọ onye ọbụla bu iwe n’obi. Nnabuife kwuru na ụlọ ọlụ ahụ chọrọ udo zuru oke ka ọlụ wee na-aga nke ọma. Fr Ibeazor rụtụrụ aka na ime udo dị mma makana a na-esi na mmụọ jebe ije wee pụta n’ife. Ọ kpọkuru ndị mmadụ ka ha pụta kwuo ka o si dịrị ha. O kwuru si; “onye mara ebe e mejọrọ ya, o kwuo.” Maazi Ubani, onyeisioche otu nhazi mmemme ahụ ma bụrụkwa onye nagworo ezumike nka na Maazị Ekemezie bụ onye nọkwa ezumike nka kwuru na ndị e

Otu nzúzo: Ndị uwe ojii akpụrụla mmadụ 151 n'Anambra

DỊKA a sị na onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọhụ ahụ, mmadụ dị otu narị, iri ise na ótù abụrụla ndị a nwụchikọrọ site n’aka ndị uwe ojii na steeti Anambra maka ihe gbasaara òtù nzúzo. Ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị òtù nzúzo bụ ndị a nwụchikọrọ n’ime izuụka abụọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ozi a kụpụrụ nso nso a, bụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Harụna Mọhammed binyèrè aka na ya. Ya bụ ozi kọwara na e jidere ndị ahụ site na ngagharị na ághá ndị uwe ojii ahụ bùrù nso nso a, site njikọ aka ha na ngalaba pụrụ iche na-ahụ maka ibu agha megide òtù nzuzo, bụ ‘Special Anti Cultism Unit’ nakwa njikọ aka nke ụlọ ọrụ ‘Special Anti Robbery Squad’ (SARS). Dịka ozi ahụ siri kọwaa, mmadụ asatọ n’ime ndị ahụ a na-enyo ényò bụ ndị e jidere n’Awka; mmadụ iri na isii bụ ndị e jidere n’Ọkịja; mmadụ iri na abụọ ka e jidere na Nanka; iri na otu ka e jidere na Nkwelle, jide iteghete n

Ndị òjì egbè abagbuola onyeisi ọchịchị obodo Nimo n'Anambra

DỊKA a sị na ọ bụ chi na-efo ihe ọma na ihe ọjọọ ana-efote, ndị oji egbe ezu, ndị a maghị ndị ha bụ agbagbuola maazị Frank Anthony Igboka, bụ onyeisi ọchịchị òbòdò Nimo dị n’okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra. Nwa amadi a, onye a maara dịka Mmili ka a gbàgburu n’ime ụgbọala ya ụbọchị Tuuzdee mgbe ọ gara ịzụrụ onwe ya ihe n’ahịa Oyè Nimo, bụkwazị ebe a nọrọ wee kwàá mgbọ dị egwù site n’aka ndị a maghị ndị ha bụ. Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Harụna Mọhamed, siri kọwaa, ebelebe ahụ gbùrù ka o jiri nkeji iri na asatọ gafèé elekere asatọ nke anyasị, bụ oge ndị ahụ màlitere gbaba egbè aghara aghara n’ahịa ahụ. O kwuru na ndị ọrụ uwe ojii nọ na mpaghara Nimo ahụ gbààrà gaba ebe ahụ oge ya bụ ụda egbe màlitere ịda; ma mgbe ha rùrù, ha hụzịrị nwa amadi ahụ ka ọ tọbììrì n’ime ụgbọala Chevrolet SUV ya n’ogbu ọbara na àpà mgbọ egbe juru ya ahụ. Nke ahụ, dịka o siri kwuo, mezịrị ka ha búrú ya ozigbo gaba ụlọ ahụike Be

Ọlụ dịrị ụmụnwaanyị

NA mbụ, ọ bụ ọlụ dịrị nwaanyị iji onyinye amara Chineke nyere ya wee mee ka ụwa guzosie ike ma lusie ọlụ ike. Ọ bụ ọlụ nwaanyị ịkwalite nwoke ma mee ka o guzosie ike. Ọ bụkwa ọlụ nwaanyị ị na-atụta elo ka ihe wee na-aga nke ọma maka na mbili na ọdịda dị nwaanyị n’aka. Nwaanyị kwesịrị ime ka ihe na-aga nke ọma ebe ọ bụla ọ nọ, ma n’ụlọ ọlụ, ọma ahịa, obodo, nzukọ, ezinaụlọ wdg. Ọ bụ ọlụ nwaanyị ịlụ di, ịmụ nwa, ịzụ nwa, ilekọta ezinaụlọ anya, isi nri n’ọtụtụ ihe dị iche iche. Heee! Aga ekwu ole ghara ibe ya n’ọlụ dịrị ụmụnwaanyị n’ụwa? Ọ bụ ya ka m ji were igwe omenta eme imo nke bekee kpọrọ “kọmpụta” wee tunyere ụmụnwaanyị n’ihi na ọlụ nwaanyị na-alụ n’ụwa dị ọtụtụ. Dịka anyị na-aga n’iru, a ga akpọpụta ọlụ dịrị ụmụnwaanyị n’ụzọ dị iche iche ha si alụpụta ya bụ ọlụ na ngalaba dị iche iche ha nọ. Na nchịkọta igboro nwoke mkpa agụụ nke anụ ahụ n’ụzọ ziri ezi. Ị nwere ike ikwu ya otu a “o nwere ebe nwaanyị bụ ezigbo ihe oriri nye nwoke.” Ka-emesịa.

Ihe ụmụnwaanyị ji achọ mma mgbe ochie

MGBE mmadụ malitere bawa ụba n’ụwa ka ịchọ mma malitere. Ichọ mma bụ mmadụ idozighari onwe ya na ụdị dị iche ma ile ya anya. Ọ dị ọtụtụ ihe dị iche iche ụmụnwaanyị ji achọ onwe ha mma na abụghị akwa na akpụkpụ ụkwụ, iyeri ntị na ihe ọnụ n’oge ochie. Ihe ndị a bụ uhie, edo, nzu, tanjere, uri, aka a na-eyi n’olu na ọdụ a na-agba n’aka. Ihe ịchọ mma ndị ahụ a na ete adịghị ahi aru mmadụ ahi ma ọbụ igbaji aru ma ọbụ iru onye na ete ya. Ọ dịghị enye aru nsogbu ọbụla chaa. N’oge ochie, nwaanyị ọbụla mara ka esi achọ mma adịghị agha ite uhie, nzu ma ọ bụ edo kwa abali ọbụla. Chi fo, ọ gaa na mmiri saa arụ nke ọma, ọ bata, owere enuakị tee arụ ya nile, were tanjere tee n’anya ya, dozie ntutu isi ya nke ọma. Ọ bụghị ha ncha n’akpa isi kama ha na ara ntutu isi ha nke ọma. O to fee oke, ha esebellata ya ala ka o wee dị mma. Ịhu nwaanyị dị otu a, ọ dị mma ile anya mana akwọ mara mara. Na mgbe ahụ, ihe ịchọ mma dịka aka na ọdụ bụ ihe e ji amakari adaeze ma ọbụ onye ndị mụrụ ya ji ego nakwa jigida ọ

Ozioma Odinani: Nchekwa omenala Igbo bụ ọrụ dịịrị ọbaakwụkwọ ọha

ỌBAAKWỤKWỌ Ọha bụ ebe a na edebe akwụkwọ ederedé ka o were dịrị ndị mmadụ nfe maka mmụta. N’ime Ọbaakwụkwọ, a na ahazi akwụkwọ niile n’usoro n’usoro, ka o were dịrị onye ọbụna nfe ị chọpụta ụdị akwụkwọ ọ chọrọ. Mana Ka ọ dị ugbua, Ọbaakwụkwọ abụghị ebe a n’edebe sọọsọ akwụkwọ, ọ bụkwazi ebe a na e dokwaba ihe Ọkpụ, dịka Nkechi Udeze siri kọwa. Nkechi Udeze bụ nwa-ada na afụ maka Ọbaakwụkwọ niile dị na Steeti Anambra. Ọ gwara m sị “Otu n’ime Okè na Ọrụ dịịrị Ọbakwụkwọ niile bụ ịchekwaba omenala Igbo” Ọọ ihe nwute na ọtụtụ Ọbaakwụkwọ e nwere ejighi asụsụ Igbo kpọrọ ihe. Ị gaa Ọbaakwụkwụ diche iche na ala anyị, Ị ga ahụ na akwụkwọ e dere na asụsụ Igbo na ndị e dere maka igbo bụ ihe a n’achọ-achọ. Ị chọta akwụkwọ Igbo n’ọbaakwụkwọ dị ka ị chọta mkpịsị-azịza n’ime ikpo ahịhịa. Oge eruolá ndị be anyị ga aghọta na ihe kpataara e ji arụ ọbaakwụkwọ bụ ka obodo dị icheiche were chekwaba asụsụ, omenala na ọdịbendị, ọ bụghị maka ị kwanite omenala na asụsụ ndị mbà. Maka na Echi, mgbe ụmụaka chọrọ ị

Emume izuụka dị asọ

IZUỤKA dị asọ bụ izuụka ikpeazu n’ime lenti. Ọ bụ oge ndị otu Kristi n’ụwa niile ji eme emume dị iche iche iji nabata ‘Easter;’. Ọ bụ ụbọchị ụka gara aga ka a malitere ya site n’ịka ụka igu/ọmụ (Palm Sunday). Emume ụka igu bụ nke e ji echeta ka Jesus si gaa Jerusalem. Ọ nọ n’elu anyịnya ndị mmadụ na-atụrụ ya igu na ihe ndị ọzọ dị iche iche n’ala ma na-ebunye ya otito, na-etu ya aha dị iche iche n’ebe ọ dị ukwuu. N’ihi ya, ndị ụka dị iche iche kara ụka ebe ha nọ gọzie igu ma gagharịa, na-abụ abụ otito. Ka ụka igu gachara, a banyere n’emume ndị ọzọ na-esota ya. Ndị ụka Katolik bidoro ụnyahụ bụ Wenezdee wee mebe emume (Chrism Mass Cathedratikum) nke a na-anọ na ya gozie mmanụ e ji alụ ọlụ n’ụka dịka ichi ndị ụkọchukwu, ndị eze, ite ndị ọrịa w.d.g. Mmanụ a bụ so n’oge a ka e ji agozi ya. A na-anọkwa na ya nye Chineke onyinye ma gbukwaara ya ehi. Ọ bụ bishọọpụ na-anọ n’isi ya; a na-anọkwa na ya kelee bishọọpụ maka mbọ ya niile. Na St Patrick’s Cathedral Awka, ọ kpọtụrụ akpọtụ ụnyahụ. E ji a

Anambra amàchiela ibugharị na ịzụ ahịa n'okporo ụzọ

GỌỌMENTI steeti Anambra amachiela kpam kpam ihe ọ bụla bụ ibugharị ahịa mbugharị na ịzụ ahịa n’okporo ụzọ ọbụla na steeti ahụ. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ozi a kụpụrụ nso nso a, bụkwa nke kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka azụmahịa, ịtụ mgbere ahịa na ikewàpụta akụnụba, bụ Maazị Christian Madụbuko binyere aka na ya. Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, ebumnobi nke ahụ bụ iji wee bèlata agbakata akwụrụ, mee ka efè dị n’okporo ụzọ, ma kwàlitekwa ezi adịmọcha gburugburù. Kọmishọna, site n’ozi ahụ gakwara n’ihu kpọkuo onye ọbụla na steeti ahụ ka o nye aka n’ịkwàlite na ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà, dịka ọ bụ ihe dị oke mkpà ga-ényékwa aka n’ịkwàlite mmepe na ịma mma nke steeti ahụ. Onye ọbụla nupùrù isi na ntuzi aka ahụ ma kachie ntị na-ebugharị ma ọ bụ na-ere ahịa n’okporo ụzọ, dịka ozi ahụ siri kwuo, ga-abụzịkwa onye a ga-anwụchikọ, kpụpụ ụlọ ikpe ozigbo, ma were usoro iwu tie ya mmanwụ. Anyị ga-echeta na ọtụtụ ndị mmadụ atụfuola ndị ha na nke ndị ha hụrụ n’anya site n’ịzụ

E gbuola mmadụ iri na isii, merụa ndị ọzọ ahụ na Nasarawa

NDỊ oji egbe aga, ndị nke a na-ele anya na ha bụ ndị isi abaokpu si na agbụrụ Fulani awakpoola obodo Numa nke dị n’okpuru ọchịchị Akwanga na steeti Nasarawa. Ozi anyị nwetara n’ekwu na ọ bụ mmadụ iri na isii ka anapụrụ ndụ ha n’ike ebe ndị ọzọ nwetara ihe mgbụ dị iche iche. Ogbugbu egburu ndị a biara ka ọgachara izu ole na ole ndị Fulani na-achị ehi wakporo nwatakiri nwagbọghọ Mada, meruo ya ahụ ma gbukwaa ya. Nke a butere ọgbaghara n’etiti ndị obodo ahụ na ndị Fulani na-achị ehi. Onye omebe iwu na-anọchite anya okpuru ọchịchị Akwanga n’ụlọ omebe iwu ala anyị bụ Senale bụ Philip Gyunka kwuru ezinaụlọ ahụ na-emerube emume igu nwa aha bụ ndị egburu nna, nne na nwa ha nwoke na ya bụ nwakpo. Ọ gakwara n’ihu katọọ ogbugbo egburu ndị a, okwukwara na nwaanyị dị ime na okenye nke gafegoro afọ otu nari bụ ndị alakwara ndụ ha n’ike. Omekwara ka anyị mata na ndị a gburu ụmụnwaanyị na ụmụaka aka ha dị ọcha. Onyeisi obodo Mada bụ Samuel Gamu-yare kwuru na ihe nke a mere ha dịka egbe igwe nke n’agba

Nwa Anambra bi Ireland eturula ugo

ADA Anambra gbara afọ iri na otu (11) aha ya bụ Amarachukwu Akwuobi, onye nke na-agụ akwụkwọ na ‘Ladyswell International School’ nke dị na Dublin, Ireland, eturula  ugo dịka ọka ibe n’asompi edemede nke onyeisi ala mba ahụ (Irish Prime Minister’s School Writing Competition). Nwaada Akwuobi, onye nke ezinaụlọ ya bi na mba Ireland bụ onye Aguleri nke dị n’okpuru ọchịchị Anambra East na steeti Anambra. Ọ bụ nwa Dọkịnta Jossy Akwuobi, onye nke bikwa na mba ahụ. Edemebe ahụ nke onyeisiala mba Ireland bụ nke ụmụakwụkwọ mba ahụ na-emerube ma bụrụkwa nke na-ekwo ekwo. Ihe nrite nturu ugo ahụ gụnyere izute onyeisiala ma soro ya rie nri abalị, tinyekwara akatamkpo ego €25,000.  

Ndị keke egosila iwe ha n'Onitsha

Merụọ mmadụ ise ahụ, mebie ọtụtụ ihe OBODO gbara aghara ma sụọkwa wuruwuru nso nso a, dịka ndị na-anyà ihe ọnyịnyà Keke nwèrè nkwàtụ ma pịachara obere ọkpọ n’Ọnịtsha dị na steeti Anambra. Kàtàkátá bụ nke e kwuru na o wètààrà mmadụ ise mmerụ ahụ, ma bụrụkwa nke e si na ya wee bibie Keke ruru iri asaa n’ọnụ ọgụgụ. Dịka akụkọ siri kọọ, ya bụ nsogbu bụ nke dapụtara oge ndị òtù jikọtara ndị na-anya keke, bụ ‘Keke Drivers Welfare Association’ nọ na-akpọ ganịganị bànyere otu e sì akapụsị ndị òtù ha ego ọdụ dị n’Ọnịtsha ahụ; ndị òtù ọzọ wee wákpò ha n’ike ma manye ha ọgụ ozigbo; ha wee màlite ịpịrị ya. Ndị keke ahụ anọrọlarị n’ụbọchị gara aga wèré Keke dochisie okporo ụzọ awara awara ahụ siri Ọnịtsha gaa Owerri na ụfọdụ okporo ụzọ e sì abà na mpaghara nnukwu ahịa Ọnịtsha dịka ha na-eme ngagharị iwe megide ótú ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị na-anakọ ego n’ụzọ iwu akwadòghị n’ahịa ahụ sìrì wee kụọ ótù onye òtù ha gwoo gwoo maka na o kweghị akwụ ótù puku Naịra ha na-akwụ kwà ụbọchị ọbụla n’ahịa

E jidela mmadụ asatọ maka imetọ mbara obodo n'Anambra

A NWỤCHIKỌỌLA mmadụ asatọ na steeti Anambra maka ime na itinye aka n’ihe na-ebute mmebisi gburugburu, bụ ịsa ụgbọala n’ebe na-ekwesighị ekwesi. Mmadụ ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ na mpaghara okporo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, site n’aka ụlọ ọrụ na ahụ maka gburugburu na steeti ahụ, na njikọ aka ya na ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka nsogbu agbakata akwụrụ n’okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ ‘Anambra Traffic Management Agency’ (ATMA). N’okwu ya banyere nke ahụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka gburugburu, bụ maazị Mike Okonkwọ kwuru na nnwụchikọ ahụ a nwụchikọrọ ndị ahụ dabara nnọọ adaba na mbọ gọọmenti steeti ahụ na-agba ịhụ na e gbochiri nsogbo na mkpamkpa nke ólùlù, mbize na idè mmiri na-akpa na steeti ahụ. O mere ka a mara na mmiri ahụ ndị ahụ na-asapụta ma na-agbachikakwa n’okirikiri ebe ahụ niile oge ha na-asa ụgbọala nà-emebisi okporo ụzọ na gburugburu ebe ahụ, n’ihi na ebe ahụ abụghị ebe kwesiri ekwesi ịnọ wee mee ihe dị otu ahụ chaa chaa. Ọ kwara àrịrị na a dọọla ndị ahụ aka

Ndị Nigeria bị South Africa akatọọla ogbugbu e gburu onye otu ha

ONYEISIOCHE otu jikọtara ndị Nigeria bi South Africa bụ Maazị Benjamin Okoli akwaana arịrị maka ogbugbu nke e gburu otu nwa afọ Nigeria bị ebe ahụ bụ Maazị Ire Chinello ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri atọ na otu site n’aka ndị amaghị. Okoli, onye kwupụtara nke a site n’okwu ọ gwara ndị ‘News Agency of Nigeria’ (NAN) Abuja kọwara ogbugbu ahụ e gburu ya bụ nwa amadị dịka nke jọgburu onwe ya. O kwuru na ogbugbu ahụ bụ nke dapụtara site n’ihe gbasara nsọgbụ ajọ otu nzuzo  ‘cult’ nke dị n’etiti ndị Nigeria bị mba South Africa. O kwupụtara na a gbagburu ya bụ nwoke onye nke e jiri Ire wee mara na Sunnysidde Pretoria South Africa. Ọ gara n’ihu kọwaa na ọtụtụ ndị Nigeria atufuola ndụ ha site n’ihe gbasara otu ọjọọ (ihe karịrị mmadụ iri abụọ na ise) n’ime afọ abụọ. Okoli kwuru na ụdị agwaa ọjọọ ahụ emeela ka ndị ha nọ be ha bụ ndị South Africa na-ehuzi ha dịka ndị iberibe; ebe ndị uweoji na-ahụzị ha ka ndị ogbu ọchụ, otu ọjọọ ‘cultists,’ ndị omekome, tinyekwara ndị na-ebu ọgwụ ike nke mere na ha

NAFDAC amaala ọkwa maka ọgwụ ọnyụnyụ na ọgbụgbọ adịgboroja juru n'ahịa

ỤLỌ ọlụ ‘National Agency for Food and Drug Administration and Control’ (NAFDAC) amaala ọkwa maka ọgwụ adigboroja nke a kpọrọ ‘Dukoral Oral Cholera Vaccine’ nke a na-ekesa na mba Bangladesh. Onyeisioche ‘Director-General’ nke NAFDAC bụ Ọkammụta Moji Adeyeye n’ozi ya dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ma kwuo na e ji asụsụ bekee (English) na ‘French’ wee depụta ihe n’ọgwụ ọjọọ ahụ. Adeyeye kwuru na ‘World Health Organisation’ (WHO) ekporola ma kpọchie ọtụtụ ọgwụ ahụ. Ọ gakwara n’ihu kọwaa si na ha na-eme ka ndị ọlụ ahụike na ọhaneze mata maka ya bụ ọgwụ, ma rụtụkwa aka na ndị WHO tinyekwara ndị okwu ahụ ike dị n’aka na Bangladesh akpọchiela ọgwụ ‘Dukoral Oral Chorela Vaccine’ ahụ nke dị ngwugwu puku asatọ, nke bụ ole ha chọpụtarala. Nwaanyị ahụ nọ n’isi na NAFDAC kọwara na ndị na-alụ ọgwụ ‘Dukoral Oral Chorela Vaccine’ nke ezigbo ya bụ ‘Valneva Canada Inc’ enweghị akara NAFDAC. N’ihi ya ọ dọrọ ndị nile na-ere ma na-ekesa ọgwụ tinyere ndị na-atụ mgbere ya ka ha kpachara anya ha.    

Ihe mere egbe ejighị eri nwa ọbọgwụ

OTU ụbọchị, égbé gwara nwa ya ka ọ gaa chọọ ihe ọ ga-eri. O wee pụa bute nwa ọbọgwụ. Mgbe ọ lọtara, nne ya jụrụ ya “Gịnị ka nne ya mere mgbe ị buuru nwa ya?” Ọ sị ya ‘ọ dịghị ihe o mere”. Égbé sị nwa ya “bụghachi ya azụ, ọ bụghị anụ oriri ebe ọ bụ na o nweghị ihe o mere n’ihi na ọ gbara nkịtị nwere ihe o bụ n’obi.” Nwa egbe bughachiri nwa ọbọgwụ wee bute nwa ọkụkọ. O rue mgbe ọ lọtara, nne ya wee jụọ ya ọzọ “Gịnị ka nne ya mere?” Ọ sị ya na nne ya chụrụ ya oke ọsọ, felie, fetue, tisie mkpu ike, kpọọ ndị nne ya ochie na ndi nna ya ochie. Tiee! Ewoo! Ewoo! Nwa m oo! Nne égbé sị nwa ya, “Ehee! Nke a bụ nke anyị.” Buru ya debe ka anyị rie na nke a bụ ezigbo anụ oriri n’ihi na nne ya emechaala ihe nile o nwere ike ime. Ọ bụ nke a mere na égbé adịghị ebu nwa ọbagwụ wee rue taa.

Ụwa ụmụnwaanyị: Onye bụ nwaanyị?

NWAANYỊ so n’otu n’ime ụdị mmadụ Chineke kere n’ụwa ka ọ bụrụ onye nlekọta ihe nile e kere eke. Ọnọdụ adịchaghịrị mmadụ mbụ ekere nke a na-akpọ nwoke mma n’ihi na ọ nọ nanị ya. Ọ dịghị onye na-akpanyere ya ụka, ọ dịghị onye na-enyere ya aka, ọ dịghị onye na-asị ya jisie ike. Ọ dịghị onye na-eleta ya, ọ dịghị onye na-anọdebe ya, ọ dịghị onye na-akasi ya obi, ọ dịghị onye na-ekpo ya ọkụ. Ọ dịghịkwa onye na-enye ya ihe ọ na-eri. Ọ bụ n’ihi nke a ka Eke kere ụwa jiri kee nwaanyị ka ọ bụrụ ozuzu oke ma nyekwa nwoke ihe ndị a nke siiri ya ike ịnweta. Nwaanyị bụ otu nnukwu ihe dị n’ụwa nke na ọ bụrụ na ọnọghị, ihe agaghị na-agacha nke ọma. Ọ dị ọtụtụ ihe dị iche iche eji kee nwaanyị. N’izu ụka ọzọ anyị ga ahụ ya. Ka-emesia.

E liela ozu Oriakụ Nwachukwu n'Ụkpọr

DỊKA a sị na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laba, ọ bụ nnọọ oge ntụgharị uche na oge iti aka n’obi, dịka e lìrì ozu oriakụ Josephine Nnenna Nwachukwu, bụ nne onyeisi ọchịchị obodo Ụkpọr. Mmemme akwamozu ahụ, nke e mere màlite n’abalị iri abụọ na asatọ wee ruo n’abalị iri atọ na otù nke ọnwa Maachị ahọ a bụ nke weere ọnọdụ n’ezinụlọ be di ya dị n’Umuhu Ụkpọr, bụ isi obodo okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra. N’ozi nkasiobi o ziteere ezinaụlọ ndị be Nwachukwu, Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dayọsiisi Nnewi, bụ Most Rev. Hilary Odili Okeke tòrò Mama Josephine, bụ onye o kwùrù na ezi ọrụ ya n’obodo, ọrụ obi ebere ya inyeịtara ụmụ mmadụ na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka, tinyere ezi ntụnye ya na nsònyesi ike ya n’ụlọ ụka na n’ihe Chineke nà-agba nnọọ ezi àmà na akaebe na ọ ghọtara ihe ọsọ eluigwe pụtara nakwa ụgwọ ọrụ so ya; o wee gbaa nkè ya n’ụzọ a tụrụ anya. Bishọọpụ Okeke, onye kwara àrịrị na ya apụghị ibịanwu ya bụ akwamozu n’onwe ya ụbọchị ahụ n’ihi ihe ndapụta, kasìzịrị ezinaụlọ nd

Aka ndị uwe ojii akparala Ikanda, a na-enyo enyo na ọ bụ ogbu mmadụ

NDỊ uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa ụfọdụ ndị a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n’arụrụ ala, nke otu onye n’ime ha bụ maazị Ikechukwu Udensi, onye a maara dịka Ikanda, bụ onye a na-enyò na ọ bụ ogbu mmadụ. Ikanda gbárá ahọ iri abụọ na asaa sitere Azịa n’okpuru ọchịchị Ihiala bụ onye a na-enyo enyo na ọ bụ ya na ndị òtù ya gbùrù otu nwoke a maara dịka Ndubuisi Nwokolo na mkpewara ụzọ Otumoye dị n’Ọdọakpụ Ọnịtsha, na steeti Anambra n’abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Juunu ahọ 2018. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ dịka ọ na-akpụgharị ndị ahụ n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe oji dị n’Amawbịa, onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Mustapha Dandaura mere ka a mara na e jidere ya bụ nwoke n’Ọnịtsha site n’ọrụ nke alaka ndị uwe ojii na-ahụ maka iji ọgụgụ isi achọpụta ihe, ma kwenwèé nkwà na ha agaghị ada mbà n’ọrụ ya na n’agha ọ na-ebu megide ohi, mpụ na arụrụ ala na steeti ahụ. O kwupùtakwara ezi njìkere ha dị ịkwàlite ezi nchekwa ndụ na akụnụba na steeti ahụ, ma kpọkùkwazie

Ụmụakwụkwọ Anambra eritela ọla nchara n'asọmpi nkà na ụzụ mba ụwa

ỤMỤAKWỤKWỌ sitere ụlọakwụkwọ ‘St John’s Science and Technical College’ dị n’Alor n’okpuru ọchịchị Idemili South nke steeti Anambra eritela ọlà nchara n’asọmpi mba ụwa a kpọrọ ‘International Festival of Engineering, Science and Technology’, bụ nke weere ọnọdụ na Monastir nke mba Tunisia. Asọmpi ahụ bụ nke were mkpụrụ ụbọchị iteghete, màlite n’abalị iri abụọ na otù nke ọnwa Maachị wee ruo n’abalị iri na itoolu, ma bụrụkwa nke ọ bụ ụmụakwụkwọ nọ n’agbata ahọ iri na anọ wee ruo n’agbata ahọ iri abụọ na otu sonyere na ya, bụ ndị sitere mba iri anọ sònyere na ya. Ụmụakwụkwọ Anambra ahụ gara ya bụ asọmpi bụ maazị Meshack Ugwuishi, maazị Onyedika Chuka-Umeora, maazị Chukwualụka Nwachukwu, na maazị Dominic Machi, ma bụrụkwa ndị nwetara mmeri site n’ihe ha jiri aka ha rụọ, bụ nke ha kpọrọ ‘Adaptable Alternative Power Supply for Sub-Saharan Africa’. Ya bụ akụrụngwa bụ igwe na-ewèta ọkụ, site n’igwè solar bụ nke na-enyere ya aka ịdọta ike sitere n’anyanwụ, jìgide ike ahụ wee na-ekesà ya dịka ọkụ n

Ụka Nne

 ỤBỌCHỊ ụka gara aga bụ ụka nne, nke so n’otu ihe e jiri mara ndị otu ‘Christ’ n’ụwa nile. A bịa na ‘Anglican Communion’, ụka anọ n’ime lent na-abụ ụka ndị nne n’ụwa nile. Ihe o jiri danye n’ime lent bụ n’ihi na n’ime lent, a na-anọ n’obubu ọnụ mana ụka anọ n’ime lent bụ ụbọchị a kpọrọ na ọnụ oyibo ‘Refreshment Sunday’ dịka ọ dị n’usoro e ji aka ụka. Ọ na- abụ ụbọchị ndị na-ebu ọnụ ji eneta onwe ha, rie nri, rijuo afọ were nwekwa ike iji were gaa n’ihu ibu ọnụ izu ụka olemaole fọdụrụ tupu na abanye izu ụka Nsọ. Ụbọchị ụka nne na- abụ oke ụbọchị e ji eri nnukwu oriri na ọñụñụ dị iche iche. Ọ na – abụ ụbọchị ndị bụ nne ji eneta ndị di ha, ụmụ ha, ikwu na ibe, agbata obi, ụmụ akwụkwọ dị iche iche, ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ na ndị ọzọ dị iche iche. Ndị nne na-eji oge ahụ gaa nleta n’ụlọọgwụ dị iche iche. Ha na-ebu ọtụtụ ihe oriri dịka achịcha bekee, osikapa, mmanya ọñụñụ, akị oyibo na ihe oriri ndị ọzọ. Ụfọdụ na-ejikwa akwa ụmụntakiri na nke ndị okenye were gaa nleta n’ebe

Nwata akwụkwọ esila n'elu mango daa, nwụọ

OTU nwata akwụkwọ nke ‘Ijo Mimo High School, Akure,’ aha ya bụ Temitayo Oluwole esila n’elu osisi mango daa wee nwụọ. E kwuru na ọ bụ onyenkuzi ha, Oriaku Kura ziri ya ka ọ ghọtara ya mango ka ha mechara ọmụmụ  ihe ụbọchị Satọdee. Nwata akwụkwọ ahụ bụ onyeisi ụmụakwụkwọ ‘senior prefect’ bụ onye nke anọ darala ma nwụọ n’osisi mango ahụ nke pụtara na ụmụakwụkwọ atọ anwụọla na mango ahụ na mbụ. Mgbe ọ dara ada ahụ ma kụọ isi n’ala, a gbara mbọ izọ ndụ ya site n’ibu ya gaa ụlọọgwụ atọ tupu ọ nwụọ na ‘Trauma Centre,’  Ondo. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Akure, onye uweojii ‘image maker’ nke steeti ahụ Femi Joseph kwuru  na ahụbeghị onye nkuzi ahụ ziri Temitayo ka ọ ghọtara ya mango, wee nye iwu ka o jiri ọsọ wụchaa n’ogige ndị uweoji.

A tụọla otu nwoke nga maka ịwụ nwunye ya mmiri ọkụ

ỤLỌIKPE ‘Isolo Chief Magistrate Court’ nke dị na Lagos atụkpoola otu nwoke aha ya bụ Michael Essien na nga maka iwu nwunye ya mmiri ọkụ juru otu ite. Onye ọkaikpe okwu dị n’aka bụ Oje Uagbale, kọwara nwoke ahụ dịka onye na-etinyere nwuye ya anya (jealous lover). O nyere nwunye ya bụ Mariam Essien iwu ka ọ hapụ ịdị na-enwe mmekọrịta n’ebe ndị agbataobi ha nọ. Di na nwunye ahụ ebiela afọ olemole ma jide ụmụ abụọ. Onye uweojii okwu dị n’aka n’akụkụ nke ya kwuru na nsogbụ dapụtara ụbọchị ya bụ nwoke lọtara ọlụ wee hụ nwunye ya n’usoekwu (kitchen) ebe ya na nwunye onye agbataobi ha na-akpa nkata. O kwuru na nwoke ahụ ji iwe na nwunye ya nupuuru ya isi wee buru mmiri gbọrọ agbọ nke nwunye ya sinyere iji see semovita wee wụọ ya. O kwukwara na nwaanyị ahụ merụrụ ahụ nke ukwu ma nọrọ n’ụlọọgwụ ebe ọ na-anara ọgwụgwọ. Ka ọ dị ugbu a, onye Majie ji ya bụ okwu, Oriaku O.A Teluwo enyela iwu ka a tọhapụgodụ Essien (bail) n’ọnọdụ ịkwu otu narị naira tinyekwara otu onye maara ya (surety) n’ụdị ọnụ ego

Anambra amàlitela ịkpọchisị ụfọdụ ụlọ ọlụ maka atụghị ụtụ isi

DỊKA a sị na onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; gọọmenti steeti Anambra amalitela imechisi na ịkpọchisi ọtụtụ ụfọdụ ụlọ ọrụ ndị nnọrọ dị na steeti ahụ, n’iji nnupù isi ha n’ịtụ ụtụ kwesiri na ha ga-atụ. Nke a bụ nke e mere site na nkwàdo akwụkwọ ikike e nwètàrà site n’aka ụlọ ikpe ukwu steeti ahụ, bụrụ nke weere ọnọdụ na Awka bụ isi obodo steeti ahụ, Ọnịtsha, Nnewi na ụfọdụ ebe ndị ọzọ, ma bụrụkwa nke e mere site n’aka ụlọ ọrụ ‘Anambra State Internal Revenue Service’, ndị òtù ọrụ ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps’ na ndị ọrụ uwe ojii. N’okwu ya bànyere nke ahụ, onyeisi oche nke ụlọ ọrụ ‘Anambra State Internal Revenue Service’, bụ Dọkịta David Nzekwu kọwara na nke ahụ dabàrà adaba na ntụziaka na ebumnobi gọọmenti steeti ahụ na-achụso ugbu a, bụ ịkwàlite ọnụ ego a na-enweta na steeti ahụ kwà ọnwa ọbụla, bụkwa nkè ọ sị na ha na-agbaso ùsoro iwu were na-emezùputa. O mere ka a mara na ụlọ ọrụ ọhụụ ọbụla kwesiri idebànye aha n’akwụkwọ ma màlite tụba ụtụ ya na ụt