Posts

Showing posts from February, 2019

Ụbọchị ụka ka a ga-akpope ụlọ ekpere na 'St Anthony's Parish' Okpo Ekwulobia

ỤBỌCHỊ ụka na-abianụ, ọnwa Maachi ga-adi n’abali atọ ka a ga-akpọpe ụlọ ebe a na-ekpe ekpere ‘Chapel of Divine Mercy and Consolations’. Ọ bụ na St Anthony’s Catholic Church Okpo Ekwulobia ka a ga-eme nke a. Ụkọchukwu bụ onye isi n’ụlọ ụka ahụ (Parish Priest) bụ Rev. Fr. Longinus Uchenna Egbonu na-akọwa na a ga-eji aja maasi elekere iteghete we malite ya. Onye ga-anọ n’isi emume bụ Bishop ụka Katolic nke Awka dayọsis bụ Most Rev. P.C. Ezeokafor

Ọba akwụkwọ Anambra emeela ụbọchị ncheta asụsụ na mba ụwa

Kpọọ oku ka a kwàlite asụsụ Igbo   Ọba akwụkwọ steeti Anambra esonyerela mba òtù mba ụwa n’imerùbè mmemme icheta ụbọchị asụsụ nke ahọ 2019, bụkwa nke a maara dịka ụbọchị asụsụ ọdịbendị. Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ akwụkwọ ‘Adorable British Nursery and Primary School’, dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụ akwụkwọ, ndị ọrụ oyibo, ndị nne na nna, ndị ọba akwụkwọ, tinyere ọhanaeze ndị ọzọ. N’okwu ya dịka ọ na-akọwa uru ụbọchị ahụ bara, ihe e jiri hibe ya bụ oke ụbọchị na mba ụwa, na isi okwu nke mmemme ahụ n’ahọ a, onye ji ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ Kenneth Dike dị n’Awka, bụ dọkịta Nkechi Udeze mere ka a mara na ọ bụ n’ahọ 1999 ka e guzobere ya bu ụbọchị, site n’aka òtù mba ụwa a kpọrọ ‘United Nation Education Scientific and Cultural Organization’ (UNESCO) iji kwàlite ma chekwaba asụsụ mba dị iche iche ka ha ghara ịnwụ. Ọ katọrọ akparamagwa ụfọdụ ndị nkuzi, ụlọ akwụkwọ, na ndị nne na nna bụ ndị Igbo, bụ ndị na-adịghị asụrụ ma ọ bụ kwe ka mmadụ sụọrọ

Buhari eturula ùgò ịchị Nigeria afọ anọ ọzọ

DỊKA ya bụ mmiri zochaara ma gbachaa n’ala Nigeria n’ebe o metụtàra nhọpụta ọchịchị onyeisi ala na nke ndị ụlọ omebe iwu etiti ala anyị, bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Satọdee, onyeisi ala bụ Maazị Muhammadụ Buharị nke otu ndọrọ-ndọrọ All Progressive Grand Alliance (APC) eturula ùgò ịchị nke ugboro abụọ ya dịka onyeisi ala. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ onyeisi oche òtù ahụ na-ahụ maka nchịkọba nhọpụta ọchịchị n’ala anyị, bụ ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission (INEC), ọkammụta Yakubu Mahmood, n’okwu ya n’Abụja, dịka ọ kpọpụtara mpụtara ikpe azụ nke nhọpụta ahụ ụbọchị Wednesday. Ọkammụta Mahmood mere ka a mara na onyeisi ala Buharị nwètara mmeri ahụ site n’inweta ntụli aka dị ndè iri na ise, otu narị puku na iri iteghete na otù, narị asatọ na iri anọ na asaa, (15,191,847) n’ime ntụli aka niile e nwetara na nhọpụta ahụ, nke dị ndè iri abụọ na asaa, narị puku atọ na iri abụọ na anọ, narị ire na iri asatọ na atọ (27,324,583), ebe nwa amadi ahụ jiri aha otu ndọrọ-ndọrọ ọ

UN echetala ndị otu nnọrọ onwe

 ABALI iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ afo ọbụla ka ndi out nnọrọ onwe (Non Governmental Orgnisations(NGO) na mba uwa na- eme mmemme icheta nguzobe ha. Otu nnọrọ onwe bụ ọtụ  aka gọọmenti adịghị na ya. Nke a pụtara na ọbụ otu kwụurụ onwe ya na- eme ihe ọ chọrọ mgbe ọbụla ọ chọrọ ime ya. Ebu m n’obi otu a bụ inyere ndị mmadụ aka n’ ụzọ pụrụ iche nakwa ikwalite ndụ ndi mmadụ na anataghi ego. Ha na- akwalite ndị mmadụ site na inyere ndị nọ na mkpa aka, inyere ndị ahụ ike ha adịchaghị mma aka, ikwchitere ndị agaghị ekwuchite ọnụ ha, ime ka ndị a na- emegbụ emegbu nweta ihe ruru ha nakwa inye ọzụzụ na ikuziri ndị mmadụ ihe n’ ọgbakọ dị iche iche. Otu a abụghi otu mkpata ego kama ọlụ ha bụ ịgba mbọ hụ na ihe na -aga nke ọma na ngalaba niile nke mba uwa. Oteela otu a bidoro, a maara aha ha na mba ụwa niile. Ndị NGO bụ ndị malitere gbaba mgba ka emechie ịgba oru na mmegbu a na- emegbu umu nwaanyị na ụmụaka. NGO pụtara ihe site na nguzobe nke Unietd Nations Organization n’ afọ 1945. Ọ bụ mgbe ah

Ndị NYSC iri na asatọ na-efu efu n'Akwa Ibom

A TỌRỌLA mmadụ iri na asatọ bụ ndị ji otu afọ ejere ala Nigeria ozi ‘National Youth Service Corps’ (NYSC); ndị ọlụ enyemaka ‘Independent National Electoral Commission (INEC) na Steeti Akwa Ibom. Nke a dapụtara n’oge nhọpụta onye isi ala na nke ndị nnọchite ‘National Assembly’ nke e mere. Mike Igini bụ ‘Resident Electoral Commissioner (REC) gwara ndị nta akụkọ ka o si me. A tọọrọ ha na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ. Otu o sila dị, a hapụla ọtụtụ n’ime ha n’ihi mbọ nke ndị ọlụ nchekwa.

Otu nwoke akwụọla ụdọ n'Ekiti

 OTU nwoke gbara afo iri isii, aha ya bụ Daniel Sakpe egbuola onwe ya n’Omobayi nke dị n’okirikiri Itapaji n’okpuru ọchịchị Ikole na steeti Ekiti. Nwoke ahụ ji ụmụ ise ka a kọwara na ọ hapụrụ nwunye ya n’ihe dịka elekere iri na abụọ nke etiti abali n’ihi na ọ sị na ya chọrọ iga mposi. Mgbe nwunye ya nọkatara ọ hụghị ya, o bidoro kpọba ya oku ma ọ zaghị. ọ kpọtere nwa ya bụ Rebecca o wee chọba nna ya. Ọ bụzi Rebecca bụ onye chọtara nna ya ebe ọ kwụrụ ụdọ n’ime ụlọ ha, mgbe ọ gbara ọkụ o ji n’elu ụlọ (ceiling). Ndị agbatobi gosịrị mgbagwoju anya n’ọdachi ahụ n’ihi na dika ha siri kwu, nwoke ahụ enweghị nsogbu ọbụla. Ha kọwakwara na ọ so na ndi nọrọ n’isi emume n’uka ụbọchị ahu. Ozi si n’aka ndi uweojii kọwara na ndị uweojii Ikole ‘Police Station’ ebutela ozu ya ma na emezi nnyocha dị na  ya.  

E nyela ndị ntorobịa ọzụzụ, kesaara ha ihe e ji agba ọgwụ ahụhụ n'Anambra

E NYELA ndị ntorobịa ọrụ ugbo nọ na steeti Anambra ọzụzụ na nkuzi pụrụ iche n’ọrụ ugbo, ma kesaara ha ihe e ji agba ọgwụ ahụhụ na-atagbusi ihe a kọrọ n’ubi, dịka ihe nkwàdo. Inye ọzụzụ na nkwàdo ahụ bụ nke e mere n’okpuru atụmatụ ‘IFAD Value Chain Development Program’ ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’isi ụlọ ọrụ kwàlite ọrụ ugbo steeti, bụ ‘Agricultural Development Program’ dị n’Awka. N’okwu ya na mmemme ọzụzụ ahụ dịka ọ na-ekesara ndị ntorobịa ihe ndị ahụ, onye nhazi nke atụmatụ ahụ na steeti Anambra, bụ maazị Nnamdị Agwụncha mere ka a mara na ha enyela ha ọzụzụ kwesiri ekwesi, tupu inye nkwàdo ahụ. Ọ kpọkuru ndị ahụ ka ha jikọka onwe ha ọnụ dịka òtù n’okpuru ọchịchị ha dị iche iche ma nyere ndị ọrụ ugbo ndị ọzọ aka n’ịgbara ha ọgwụ n’ubi megide ihe a kọrọ n’ugbo, iji hụ na ha adịghị eme nke ahụ n’onwe ha, n’ihi ihe ọdachi dị iche iche na-esi na ya adapụta. O mere ka a mara na nke ahụ bụ nke mbụ a na-eme ụdị ihe dị otu ahụ n’ime steeti niile nọ n’okpuru atụmatụ ‘Value Chain Development Pr

E jidela nwa afọ iri na atọ na-ezu ohi n'Awka

DỊKA a sị na ọ na-abụ e kwòghị ìrùrò na gboo, ọ ghọọ ajọ ọhịa, a nwụchikọọla otu nwata nwoke gbara ahọ iri na atọ na-ezu ohi n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Nwata nwoke ahụ, onye aha ya bụ Ekene Chukwuchebe bụ onye e jidere na ncherịta iru ụlọ ụka Winners Chapel dị na mpaghara okporo ụzọ Ọby Okoli n’Ọkpụnọ. Dịka akụkọ siri kọọ, ya bụ nwata ka e kwuru na ya na ndị òtù ya ji igwe na akụrụngwa dị iche iche wee na-akpàkasị otu ọnụ ụlọ ahịa dị na ncherịta ihu ụlọ ụka ahụ, wee ruo mgbe ndị ọrụ nchekwa na-eche ya bụ ụlọ ụka pụtara wee nwụchikọọ ya, ebe ndị ọzọ ya na ha riri mbọ mbọ ọsọ. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya, nwa amadi ahụ, bụ onye kwuru na ọ nọ n’ogo nke atọ nke kọleeji ya n’ụlọ akwụkwọ ‘Capital City Secondary School’ kwètara na ya na ndị òtù ya kụrụ ya bụ akụmakụ n’ezie, ma kwuo na ọ bụ ezie na ha ebughị ụzọ gwa ya na ọ bụ ohi ka ha na-abịa n’ebe ahụ. O mere ka amara ọ bụ nwanne ya nwoke, bụ maazị Eze Chukwuchebe na ndị ọzọ ya na ha sòrò wee bịa ya bụ ‘ọrụ’ dubàrà ya n’ọnọdụ ahụ, bụ nk

Ndị uwe ojii Anambra ejidela mmadụ iri na anọ maka wuru-wuru n’oge nhọpụta ọchịchị

NDị uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ iri na anọ, maka itinye aka n’arụrụ ala na ihe ndị ọzọ megidere iwu dịịrị nhọpụta ọchịchị, na ntụli aka izugbe ahụ e mere n’ala anyị n’izu ụka gara aga. Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ maazị Rabiu Ladodo mere ka a mara nke a n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na steeti ahụ dị n’Amawbịa, banyere nhọpụta ahụ. O mere ka a mara na ụfọdụ n’ime ndị ahụ bụ ndị e jidere n’ihi imabu igbe e ji atụ akwụkwọ, ebe ndị ọzọ bụ ndị e jidere n’ihi imebisi ihe e ji atụ akwụkwọ, ịsunye ọgba aghara n’ebe a na-atụ akwụkwọ, ịrị ọrụ akpụ obi, na ọtụ ihe ndị ọzọ dị otu ahụ. O kwuru na ihe a napụtara n’aka ndị ahụ gụnyere: ụgbọala abụọ, ọgbaa tùmtùm abụọ, akwụkwọ abụọ e ji eme ntụli aka, igbe akwụkwọ a tụrụ atụ dị atọ, mma ekwu, tinyere akwụkwọ kpọrọ nkụ a na-enyo enyo na ọ bụ ọgwụ ike Cannabis Sativa, ma kwuo na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe ma were ùsòrò iwu nyụchaa ha anya, ma e mechaa nnyocha miri èmì bànyere n

A ga-arụcha ụzọ Udojị n'Ọzụbụlụ tupu udummiri – Obianọ

E MEELA ka a mara na ọrụ ga-akụrụ ọnụ n’okporo ụzọ Udojị ahụ dị n’Ọzụbụlụ tupu oge udummiri eruo. Aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara nke a n’Ọzụbụlụ dị n’okpuru ọchịchị Ekwusigo oge ọ gara ịmata ka ya bụ ọrụ ngo si aga na mpaghara ahụ. Ya bụ okporo ụzọ bụ nke ogologo ya dị kilomita atọ na ụma iri anọ na atọ ma bụrụkwa nke e nyere ọrụ ngo ya n’ọnwa Jenụwarị ahọ a, site n’aka gọvanọ Obianọ. N’okwu ya dịka o letachara ka ya bụ ọrụ si aga, gọvanọ Obianọ kwuputara afọ ojuju ya banyere nke ahụ, ma mee ka a mara mkpebi na njikere ọchịchị ya ime ka ụmụafọ steeti ahụ rite uru ọchịchị onye kwuo uche ya ma nwetazùkwa ihe dị iche iche e ji enyere ndụ aka. Ọ sị na na-agbanyeghị na a nọ n’oge achụm nta nkwàdo ugbu a, na ike agaghị agwụ ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ n’ịga n’ihu n’ọrụ ọma o ji n’aka ma ọ bụ n’ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ. O jikwazịrị ohere ahụ rịọ ụmụafọ steeti ahụ ka kwado ma tụnyere ndị dị iche iche ji aha otu ndọrọ-ndọrọ All Progressive Grand Al

Ụmụ Nigeria pụtanụ n'igwe tụọ akwụkwọ na Satọdee – Fada Ebube Mụọnsọ

REV Fr. Emmanuel Chibuzo Obimma onye nke e jiri Ebube Mụọnsọ wee mara bụ ‘Spiritual Director, Holy Ghost Adoration Ministry,’ Uke na steeti Anambra akwaana arịrị maka ọnọdụ ala anyị bụ Nigeria mgbe ọ na-arutu aka n’ahụhụ ndị ala anyị na-ata n’oge ugbua. N’okwu ya mgbe ọ na-agwa ndị mmadụ okwu n’ebe a na-ekpe ekpere ‘Adoration Ground’, Uke ka Fr. Ebube Mụọnsọ nọ wee kwuo na ọ bụ mpụtara akwụkwọ nhọpụta ọchịchị a ga-eme na Satọdee ga-akọwapụta ọnọdụ Nigeria n’ọdinihu. Ọ kọwara ya bụ nhọpụta dịka: “oge ngbanwe iji wube Nigera ọhụrụ.” Ọ kpọkuru ndị Nigeria nile ka ha sonyere ngbanwe a site n’ịpụta n’igwe tụọ akwụkwọ na Satọdee iji kwado ezi ọchịchị ma hazie ọnọdụ maka ụmụ ha tinyere ndị a ka ga-amụ n’ọdịnihu.    

MMA (Beauty)

KERE kere ka ọ na-egbu Ọbụnadị n’anya onye ìsì Onye chi ya gọzìrì O were nke ya, mebe ngàlá   Mma adịghị n’ótú Ọnịtsha Maka na ihe dị ụtọ bu ihe dị ụkọ Ọ bụ ezie na e nwere adịgbòlója Mana ihe a gba n’aka E jighi ènyò ele ya   Mma so n’ihe nwaanyị jiri ka ibe ya Ọ bụghị naanị mma ihu Ma ọ bụ ọcha ihu fanta ọkpọ kooku Kama, ezi agwa bụ mma nwaanyị   Ụmụ nwoke nwere nke ha Ọ bụghị naanị mma afọ ọnụ Kama site na mpempe akwụkwọ na-esi ajọ isi Maka na ego bụ mma nwoke Onye nwekarịa, ọ makarịa N’anya ụmụ nwaanyị Na-agbanyeghị ole afọ ọnụ ya ha   Mma bụ ego Mma bụ agwa E nwerekwara mma ihu Mma bụkwazị ihe ónwúnwé   Mma niile a dị mma Mana ihe kacha mkpà bụ Gịnị ka onye nwe ya jiri ya mepute Tupu à tụnye ihe niile ahụ n’igbé Maka na agbọghọ na-esu ùdù Oge ya ana-aga   Mma nịịle nwere ebumnobi Mma abụghịkwa ihe ngàlá Mma abụghịkwa maka ịpịa ọkụ Maka na otu ụbọchị Ihe niile ahụ ga-aba n’ajọ ọcha   Lezie anya ma hazie mma nke gị Ka i wee sòró àbàlà mụrịa amụ Maka na mma na-agafe agafe Abụkwa orec

Ọmụgwọ

ỌMỤGWỌ bụ oge nwaanyị mụrụ nwa na-anọ n’ime ụlọ emeghị ihe ọ bụla rue ihe dị ka izu asaa ma ọ bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ nke bụ otu ọnwa.Ọ bụ oge e ji elekọta nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ anya maka afọime o buru na nwa ọ mụrụ. Ndị Igbo weere nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ dịka onye si n’elu rituo ma ọ bụ onye si be mmụọ lọta. Ọ bụ nke a mere na mgbe ọ bụla a hụrụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ, a na-ekele ya ‘nnọọ’ ma ọ bụ ‘ekene dịrị Chukwu’. Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji emere nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ihe ọma dị iche iche. Mgbe oge ọmụmụnwa nwaanyị na-akpudebe nso, di ya na-egote ọtụtụ ihe dị iche iche e ji ele ọmụgwọ. Nwoke aka dị arọ na-egburu nwunye ya ewu oge ọ mụrụ nwa. Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-echutere nwaanyị mụrụ nwa mmiri ebe ụfọdụ na akpatara ya nkụ, zaara ya ụlọ na ozi ndị ọzọ dị iche iche mgbe ha biara ileta nwa. Nwoke na-akpo nne nwunye ya ka ọ bịa lekọta nwa ya nwaanyị site n’isiri ya nri na ịma ya mmiri ọkụ na ileta ya na nwa a mụrụ ọhụrụ. Ọ bụrụ na nne nwunye ya anọzịghị, nwanne ya nwaanyị nwere ike

A dụọla ndị na-agụ akwụkwọ ka ha na-ahụrịta onwe ha n'anya

DỊKA ọ bụ ihe dị oke mkpà, a dụọla ma kpọkuo ndị na-agụ akwụkwọ na ọhanaeze n’izugbe ka ha na-ahụrịta ibe ha n’anya ma na-egosirịta onwe ha obi ọma oge niile. Onye ji ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka, bụ dọkịta Nkechi Udeze nyere ndụmọdụ a n’okwu ọ gwara ndị na-agụ akwụkwọ na ya bụ ụlọ mmụta n’ọgbakọ oriri na ọñụñụ ọ chịkọbaara ha iji merube ụbọchị Valentine nke ahọ a. Ọ kọwara ịhụnanya dịka ihe mmadụ kwesiri ịdị na-egosìpụta n’ebe mmadụ ibe ya nọ oge ọbụla, dịka ọ bụ ihe Chineke nyere n’iwu, ma kpọkuo onye ọbụla ka o na-akwàlite ezi mmekọrịta na ịdị n’otu n’etiti mmadụ na ibe ya. Dọkịta Udeze tòrò ndị ahụ maka ịbịa n’ọba akwụkwọ ahụ agụ akwụkwọ, ma kwuputakwa ezi njikere nke ya bụ ọba akwụkwọ dị n’ịkwàlite mmụta na ọdịmma ha, bụ nke mere ha jiri wetuo ọnụ ego a na-akwụ maka ịnọ ebe ahụ gụọ akwụkwọ, ka ọ bụrụzie naanị narị Naịra atọ maka otu ahọ. O kwere nkwà na ụlọ mmụta ahụ ga-aga n’ihu ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ dị ahụ mma na akwụkwọ bara uru maka ndị na-a

Fada Dike enyela nwatakịrị ohere agụmakwụkwọ n'efu iji kwalite asụsụ Igbo

ỤBỌCHỊ taa ọnwa Febụwarị dị n’abalị iri abụọ na otu ka otu ‘United Nations’ wepụtara dịka ụbọchị a na-emerube emumu asụsụ ndị ‘International Mother Language Day’. Ọ bụ kemgbe Febụwarị afọ 2000 ka a malitere nke a iji kwalite asụsụ na omenala ndị na ihe ndị ọzọ so ya n’azụ. Asụsụ dịka anyị maara na-ekwu ebe onye si. Ọ na-eweta ezi mmekọrịta, ịkparịtaụka, agụmakwụkwọ, mmepe w.d.g. Ọ bụ ya mere otu ‘United Nations’ ji akpọ oku ka a kwalite asụsụ ndị iji wee rite elele so ya. Ọ bụ site n’asụsụ ka agbụrụ niile ji ahafe omenala na njirimara ha site n’aka fere aka. Otu ‘United Nations’ na-arụtukwa aka mkpa ọ dị iji asụsụ ndị nke bụ asụsụ mbụ mmadụ wee na-akụziri ya n’ụlọakwụkwọ, ọkachasị na mmalite. Nke a dị nnukwu mkpa n’ihi na ọ bụ asụsụ ndị ahụ na-asụ ma na-aghọtakwa nke ọma. Asụsụ nile dị mkpa, nke a kpatara na onweghị nke a chọrọ ka ọ nwụọ. Ma otu o sila dị, asụsụ Igbo so n’asụsụ a na-ekwu na ọ bụrụ na amaghị ihe e mere ya, ọ ga-anwụ pịị. Ọ bụrụ na nke a mee, olee ụzọ a ga-esizi na-akuzi

Nhọpụta ọchịchị e bugharịrị: Ihe ndị mmadụ chere

ITỤ akwụkwọ ndọrọndọrọ ọchịchị iji họpụta onyeisiala na ndị ga-anọchịte n’ụlọ nzukọ etiti ala anyị, nke a kaara ime na Satọdee gara aga mara afọ n’ala n’ihi na ndị ọ dị n’aka bụ ndị ‘Independent Electoral Commission (INEC)’ yigharịrị ya ka ọ dịbazie na Satọdee na-abịa abịa, ọnwa a ga-adị n’abali iri abụọ na atọ. Ọnọdụ a mere ndị mmadụ taa mechie ọnụ n’ihi na ọ bụghị ihe a tụrụ anya. Na mpaghara Nodu Okpuno nke dị n’okpuru ọchịchị Awka ‘South,’ ndị mmadụ apụtaghị maka ịtụ akwụkwọ . Ọdịghị ndị a hụrụ n’ụlọ ezumezu Nodu Okpuno na St Gabriel’s Parish Okpuno bụ ebe e kwesịrị ịnọ tụọ akwụkwọ. Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ihe ejighị wee hụ ndị mmadụ n’ebe ndị ahụ so n’ebe a na-atụ akwụkwọ bụ n’ihi na mmadụ nile anụchaala na a gaghị emekwa nhọpụta ọchịchị ụbọchị ahụ. Kenneth Ezinwa bụ onye nche na St Gabriel kwuru na ya bịara ọlụ n’ụtụtụ ahụ ka ya nabatawa ndị mmadụ, ndị ga na-abịa maka ịtụ akwụkwọ, mana oge ya rutere, na ya  chegidere ọdịghị onye ọ hụrụ. O kwuru na ọ bụ n’ikpeazu ka ya nụziri na

N’Anambra, INEC ekesàala ihe a ga-eji tụọ akwụkwọ na Satọdee

DỊKA otu ụzọ n’ịkwadobe ọnọdụ maka nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee, ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n’ala anyị, bụ ‘Independent Electoral Commission’ (INEC), ngalaba ya nke steeti Anambra ekesaala ihe dị iche iche a ga-eji wee mee ya bụ ntụli aka. Ya bụ nkesà akụrụngwa bụ nke e mere ụnyaahụ n’ụlọ ọba ego ala anyị dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, ebe e siri wee busaa akụrụngwa ndị ahụ gaa n’ime okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onyeisi ụlọ INEC na steeti ahụ, bụ dọkịta Nkwachukwu Ọrjị mere ka a mara na nke ahụ bụ iji hụ na akụrụngwa ndị ahụ niile ruchara ebe a ga-eji ha rụọ ọrụ n’oge ma zukwa òkè, n’ihi na a ga-eweputakwa oge wee nyochaa ihe ndị ahụ niile ma e busachaa ha, iji hụ na o nweghị nke na-eri mperi tupu ụbọchị nhọpụta. O mere ka a mara na ụlọ ọrụ ahụ adịla ezi njikere ugbu a ịchịkọba nhọpụta ọchịchị ghe anya oghe, n’ihi na ha e werela otu izu ụka ahụ e bugharịrị nhọpụta ahụ wee tinyesie haz

Otu afọ agaala, ahụbeghị Leah Shaibu

KA ọ gatara otu afọ ndị Boko Haram ji tọrọ Leah Sharibu ezinaụlọ ya akpọkukwaala Gọọmentị Etiti ka ọ kwụdosie ike na nkwa o kwere ịgbapụta ya. Ọtụtụ oge ka nne nwata nwaanyị ahụ bụ Rebecca Sharibu na-ebe akwa ka a tọhapụ nwa ya. Ka anyị cheta na Leah Sharibu bụ nwata akwụkwọ nke a tọọrọ ya na ibe ya n’ụlọakwụkwọ gọọmentị dị na Dapchi. Ha karịrị otu narị n’ọnụọgụ mana ka otu ọnwa gachara a hapụrụ ndị ọzọ ma jidezie sọọsọ Leah. Ha jidesiri ya ike n’ihi na okweghị ajụ okpukperechi ya, ọ kwudosiri ike n’okwuke ya ‘Christian faith’. Kemgbe otu afọ, ọtụtụ ndị mmadụ akpọọla oku ka a gbaa mbọ hụ na a tọhapụrụ nwa ahụ ka ọ lakwuru ezinaụlọ ya bụ ndị nke nọ n’uru. Ka ọ dị ugbua, otu afọ agaala ahụghị ya. Nke a bụ nnọọ ihe iju anya. Ezinaụlọ ya akpọọla oku ka onye ọbụla rịọ Chineke na gọọmentị maka ntọhapụ ya bụ nwata.

A ga m agba mbọ itinye ọkụ okporo ụzọ n'obodo niile dị n’Anambra – Obianọ

AKA na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ emeela ka a mara ezi mbọ nke ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ na-agba iji hụ na e tinyere ọkụ okporo ụzọ n’obodo niile dị na ya bụ steeti. Gọvanọ Obianọ mere ka a mara nke a na Nibo dị n’okpuru ọchịchị Awka South oge ọ gara ịgbape na ịgbanye ọkụ okporo ụzọ ahụ siri Awka gaa Isiagu wee pụta Nibo. O kwuru na gọọmenti ya agbapeela ma gbanye ọkụ okporo ụzọ n’ihe karịrị obodo otu narị na iri abụọ, ma sị na ọ ga-aga n’ihu n’ime nke ahụ, ruo mgbe ọ gazuchara obodo niile ọnụ. N’ihe gbasaara ịkwalite mmepe Awka bụ isi obodo steeti ahụ, gọvanọ Obianọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe dị iche iche, nke gụnyere itinyesi ọkụ n’ọtụtụ ebe dị iche iche, inye ọrụ ngo maka ịrụ na idozigharịsị ime okporo ụzọ dịgasị iche iche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, ma kọwaa na ọ ga-eji ahọ ole na ole ahụ fọdụụrụ ya n’ọkwa wee rụpụtakwuo ọtụtụ ọmarịcha ọrụ ga-enye aka n’iwulite ọdịmma steeti ahụ na n’ịkwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ ya. N’aka nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ mak

Nwatakịrị nna ya tụbara ime n'Edo a mụọla nwa

NWATA nwaanyị gbara afọ iri na atọ nke nna ya dị afọ iri anọ na abụọ tụbara ime a mụọla nwa. Ọ mụrụ nwa nwaanyị n’ụlọgwụ ‘Benin Central Hospita’. Nna ya bụ Friday Moses bụ onye na- agba ọkada nke o ji akpa ego ka e kwuru na ọ bụ mgbe nwa ya nwaanyị dị afọ asaa ka o bidoro dinaba ya; mgbe nne nwata ahụ bụ nwunye ya nwụchara. Oge a chọpụtara nke a n’ọnwa Oktober afọ gara aga ka e kpere nwoke ahụ ikpe ma tụọ ya nga afọ iri na anọ nke gụnyere ọlụ ike ‘hard labour’ ebe gọọmentị steeti Edo kpọọrọ nwata nwaanyị ahụ ma na-elekọta ya anya nke ọma. Otu o sila dị, nwata ahụ kwuru na ya ga-achọ ịgụrụ akwụkwọ na-aga, na ya chọrọ ibu dibịa bekee n’ọdịnihu. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, ọ gara n’ihu kwuo na mgbe nna ya ji tụba ya ime na ya elebeghị ule ‘First School Leaving Certificate Examination’. O kwuru na ya ga-enwe añụrị ma o nwee onye o metụrụ n’obi ịzụ ya n’akwụkwo. Onye dọkịta bụ onyeisi n’ụlọgwụ ahụ bụ Dr Philip Ugbodaga kwuru na ụlọgwu ahụ na ministịrị na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyị ‘Minis

Ndị uwe ojii anwụchikọọla nwaanyị na nwa ya maka izu ohi nwa

NDỊ uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị maka izu ohi nwatakịrị nwaanyị gbara ahọ anọ na steeti ahụ. Nwaanyị ahụ, bụ oriakụ Ngozi Ede na nwa ya nwaanyị, onye aha ya bụ Kaosisọchukwu Ede ka e kwuru na ha zuru ma ree nwata ahụ n’ọnụ ego dị puku narị Naịra abụọ na ụma iri ise n’Awada dị n’Obosi n’okpuru ọchịchị Idemili South. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Harụna Mọhammed kwuputara na ya bụ akụkọ bụ eziokwu. O kwuru na ya bụ nwaanyị gbara ahọ iri anọ na abụọ, ebe nwa ya nwaanyị gbara ahọ iri na asaa, ma kọwaa na a hafeela nwata ọhụụ ahụ n’aka nne ya. Ọ gara n’ihu kwuo na nwata ọhụụ ahụ, bụ Mmesoọma Ikoko bụ onye gbara naanị ahọ anọ, ma bụrụkwa onye e zuuru n’ebe nne ya bụ oriakụ Nneka Ikoko na-elekọta ya anya. O kwukwara na site na nnyocha e mere, na a nwụchikọkwara nwaanyị ọzọ a na-akpọ oriakụ Ifeọma Okeke, bụ onye gbara ahọ iri anọ na ise, onye kpọọrọ nwata ahụ wee

Ụlọ mgbasa ozi ANPC akpọkọtala ndị na-azọ ọchịchị maka nrụrịta ụka

Image
DỊKA otu ụzọ ịkwadobe nhọpụta ọchịchị ahụ na-abịa n’ihu n’ala anyị n’afọ a, ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Newspapers And Printing Corporation’ bụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light’, Ka Ọ Dị Taa na ‘Sportslight Xtra’ ejikọọla aka ọnụ, ya na ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi ndị ọzọ dị na steeti Anambra wee hazie ma chịkọba nrụrịta ụka maka ndị ji aha otu ndọrọ-ndọrọ dị iche iche azọ ọkwa sineeti na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo sineeti atọ e nwere na steeti ahụ. Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumezu dị n’ogige isi ụlọ ọrụ National Light dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ndị na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ, otu jikọtara ndị otu nkịtị dị iche, ndị nta akụkọ, tinyere ọhanaeze na òtù ndị ọzọ. N’okwu mmàlite ya maka ya bụ nrụrịta ụka, onyeisi ụlọ ọrụ National Light, bụ Chuka Nnabụife mèrè ka a mara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji mara banyere ntozu-okè onye ọbụla n’ime ndị ahụ na-azọ ya bụ ọkwa ọchịchị, ebumnobi ya nyegara ndị ọ na-achọ ịnọchite anya ha, ihe ndị dị oke mkpa ọ

Ọba akwụkwọ Anambra emerùbe mmemme ụbọchị ọrịa mkpụrụ akị

Ọ BỤ nnọọ oge mmepe anya, oge ịgbanwè echiche obi na oge ịkpọlite mmụọ ndị mmadụ, dịka ọba akwụkwọ steeti Anambra sonyeere mba ụwa n’imerubè mmemme ụbọchị ọrịa mkpụrụ akị, bụ ọrịa ‘cancer’ n’aha bekee, site na mmemme ịkọwara na ịgbasara ọhanaeze ozi banyere ya bụ ọrịa. Oke mmemme ahụ bụ nke e mere site na njikọ aka nke ‘Gran Hermano Academy, Awka’, bụrụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumeezu nke ụlọ ụka ‘St. Anthony Catholic Church, Ihembosi’ dị n’okpuru ọchịchị Ekwusigo na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye nkuzi, jụọ ma zaa ajụjụ banyere ọrịa mkpụrụ akị Na nkụzi ya na mmemme ahụ, otu onye selitere isi na ngalaba ọrụ ahụike, bụ Oriakụ Geraldine Ikenwa kpọpụtasịrị ma katọọ ụfọdụ akparamagwa na ụdị ihe ndị ọzọ na-ebi ahụike aka ọjọọ, bụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme ma ọ bụ na-etinyesi aka na ya n’oge ugbu a, nke gụnyere iri oke ihe ọtọ bụrị bụrị, isè anwụrụ (n’ụdị ọbụla), iji ànwà nri na-ezighị ezi wee sie nri, iri oke nnu, ịrụ oke ọrụ ezughị ike, mmadụ iji aka ya enye onwe ya ọgwụgw

Oziọma ọdịnanị

ỌGỊNỊ bụ ọdịnanị? Ọdịnanị bụ usoro obodo niine dị na ụwa si a gọ mmụọ. ( Ị gọ mmụọ bụkwanụ i kpọkù Mmuọ. Chukwu bụ mmụọ, Ndị-ichie, maọbụ Ndịmbụ na Ndịegede bụkwa mmụọ. Chi mmadụ na Onyeụwa bụkwazi mmụọ). Mgbe onye ọbụla na akpọkù mmụọ ọ bụla, anyị na sị na: “Ọ na-agọ mmụọ. Ọzọ, Ọdịnanị bụkwa mmadụ ị mara na ihe niile Chukwu kerè na Ụwa a, dịka Mmiri, Ikuku, Ana maọbụ Ọkụ nwere ndụ n’ime ha, ma nwekwaa usoro dị iche iche ihe nine ahụ na mmadụ si enwé mmekọrịka. Osisi Chukwu kere dị ndụ, mmiri dị ndụ, ikuku dị ndụ, Ala dikwa ndụ. Obodo niile dị n’ụwa, nwere etu ha na ihe ndị a Chukwu ji chọọ ụwa mma si mmekọrịka, ka ha nwee ike ịsachata ike dịgasị n’ime ha, ma werekwa ike ndị ahụ dozie obodo ha. Ya mere ndị Gboo jiri sị “Nkụ dị mba, na e ghere mbà nri”. Ọdịkwà mkpà ka anyị ghọta na n’ime Ọdịnanị Igbo, Chukwu Okike na CHI mmadụ bụ Mmụọ ndị kachasị mmụọ nine ike. Ya kpatarà ndị Gboo ji kwuo sị: “Onye buru Chi ya Ụzọ, Ọ gbagbuo onwe ya n’ọsọ”. Nke kachasị mkpà bụ na OGU NA. ỌFỌ bu isi mbid

Uru na nsọ gbasara ọji

ỌJI bụ mkpụrụosisi ndị Igbo na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ọji bụ mkpụrụosisi a na-akụ akụ mana ọ na-epuru onwe ya. Ọji nwere ike ịmị n’ụlọ ma mịkwaa n’ọhịa. Ndị Igbo kwenyere na enwere ụdị ọji dị iche iche, ụfọdụ na-aza aha site n’etu o si mịpụta. Abịa na Nigeria, enwere ọji Igbo ma nwee ọji ugwu Awụsa ma nwekwaa nke ndị ọdịda anyanwụ bụ ndị Yoruba. Ọji Igbo na-agbakarị n’ibe site n’atọ ruo ibe asaa. Igbo na-akwanyere ọji gbara ibe asaa ugwu, ụfọdụ na-egbukwa ọkụkọ ma ha hụ ya bụ ọji. Ndị Igbo kwenyere na ọji bụ ihe a ga-ahụrịrị n’emume dị iche iche. Ọji dị oke mkpa n’omenala ndị Igbo maka na Igbo kwere na onye wetara ọji wetara ndụ. Abịa na ibe ole ọji na-agba, , ndị Igbo kwenyere na ọji gbara otu ibe a bụghị ezigbo ọji maka na a naghị ata ya ata. A na-akpọ ya ‘ọji ogbi’. Nke gbara ibe abụọ, ndị Igbo na-akpọ ya ọji kuchara ‘aka’, nke gbara ibe atọ a na-akpọ ya ọji ‘ikenga’, nke gbara ibe anọ na-egosi ahịa anọ enwere n’ala Igbo- Eke, Orie, Afọ, Nkwọ. Enwere ọji gbara asaa a na-akpọ ọji

Omenala

OMENALA dịka a kọwara bụ ihe anyị na-eme, otu anyị si adị ndụ, ihe anyị na-eri na ihe anyị na-etinye n’ahụ na otu anyị si eke ekike ma ọ bụ eji ejiji, ihe e jiri mara anyị dịka mba, abụ anyị na-abụ, egwu anyị na-ete, omume na agwa anyị na- akpa ya na ihe anyị kwenyere na ya. Omenala pụtara otu ndị si ebi ndụ ha. Ọ bụ omenala ndị ka e ji mara ha. Ọ bụ nke a mere na ọ dị nnukwu mkpa na ndị ọbụla ga na-echekwa omenala ha. Agbụrụ ọbụla enweghị omenala nwụrụ anwụ. Omenala ndị metụtakwara asụsụ ha, agụmagụ ha, nkwenye dị iche iche ha nwere, ekpemekpe ha na mmemme dị iche iche ha na-eme. Ndị ọ bụla na-azulitekwa ụmụ ha n’ụzọ ha si ebi ndụ ha; nke a pụtara na omenala anyị anaghị anwụ anwụ kama ọ na- etowanye kwa mgbe kwa mgbe n’ihi na ọ na-anabata mgbanwe ma ọ bụ ihe ọhụrụ dị iche iche site n’omenala ndị ọzọ. Iji maa atụ, omenala Igbo nabatara ihe dị iche iche site n’omenala ndị agbatobi ha dịka Igala, Idoma, Edo, Ibibio na Efik. Otu aka ahụ kwa, mgbanwe dị iche iche adila n’omenala ndị Igbo s

Ịkwalite udo na ihunanya n'etiti okpukperechi dị iche iche

OTU ‘United Nation’ wepụtara izuụka izizi n’ọnwa Febụwari ka ọ bụrụ nke e ji enwe ọgbakọ maka ịkwalite udo na ihunanya n’etiti okpukperechi dị iche iche n’ụwa nile nke a kpọrọ ‘World Interfaith Harmony Week’. A na-eme nke a afọ ọ bụla, ya mere kemgbe otu izuụka ka a na-eme ya wee ruo taa. Ọ bụ ka ọnwa Oktoba dị n’abalị iri abụọ n’afọ 2010 ka e kpebiri ime ya. Na mkpebi ahụ ka a rụtụrụ aka na ezi nghọta na mmekọrita dị n’etiti okpukperechi dị iche iche na-akwalite udo. Ọ bụ ya ka ha ji hibe otu izuụka maka nke a iji wee kwalite mmekọrịta n’etiti mmadụ nile n’agbanyeghị okpukperechi na nkwenye ha. N’ihi uru ọ bara bụ nnọkọ na mkparịta n’etiti ndị nwere okwukwe dị iche iche tinyekwara okpukperechi iji nwe ezi mmekọrịta ndị otu ‘General Assembly’ na-agwa steeti nile ka ha gbasaa ozi a ụwa nile; site n’ụlọụka, ‘Mosques, Synagogues’ na ebe dị iche iche ndị mmadụ na-ekpere chi ha. O kwesịrị ka mmadụ hụ ibe ya n’anya ma na-akwado ya. E wepu udo na ihunanya, ụwa agaghị ekwe obibi. Ọ na-abụ ihe

CAN etoola Chineke maka ịzọpụta Osinbajo

NDỊ isi ‘Christian Association of Nigeria (CAN)’ añụrịala n’ihi ihe ọma mere osote onyeisiala Nigeria bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo, onye nke pụtara n’ihe mberede helikọpta kpọtụrụ na Satọdee gara aga na Kabba nke dị na steeti Kogi. Onyeisioche otu ahụ bụ Rev Samson Ayokunle n’ozi ya n’Abuja nke sitere n’aka onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasa ozi bụ Pastor Adebayo Oladeji kelekwara Chineke maka ịzọpụta Osinbajo. O kwuru si “Ndị isi CAN na-ekele Chineke ma sorokwa gọọmentị etiti na Osinbajo na-añụrị. Anyị na-enye Chineke otito maka ichekwa ndụ osote onyeisiala na ndị otu ya site n’ihe mberede helikọpta ka ha na-agbagharị maka inweta ndị nkwado nye otu ndọrọndọrọ ọchịchị  ha n’ihi ‘election’ nke na-abịa abịa. Onye ụkọchukwu ahụ chetara na osote onyeisiala nwere ụdị ọgbatauhie ahụ n’afọ 2018 mgbe ọ na-aga njem na ‘Nigeria Customs College’ nke dị na Gwagwalada, Abuja. Ọ gakwara n’ihu kpee ka Chineke na-aga n’ihu na-echekwa ya na ndị isi ọlụ gọọmentị ndị ọzọ. Ọ dọro ndị ọ dị n’aka ịlụ na idozi

E liela ozu Oriakụ Comfort Okonkwo n'Ihite Orumba

Dịka a sị na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya, ọ laa, e liela ozu Oriakụ Comfort Madụbom Okonkwọ n’ezinaụlọ be di ya dị n’ime ogbè Ụmụọkparukwu dị n’obodo Ihite n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra. Mmemme akwamozu ahụ bụ nke a màlitere site n’ụka onye nwụrụ anwụ a kaara ya bụ agụ nwaanyị n’ụlọ ụka ‘St James Anglican Church, Ihite’ ma bụrụkwa nke bishọọpụ ụka Anglikan na dịyọsiisi Agụata, bụ, Bishọọpụ Samuel Ezeọfọr nọ n’isi ya. N’okwuchukwu ya n’ofufe nro ahụ, Bishọọpụ Ezeọfọr kọwara ọnwụ dịka ụgwọ onye ọbụla dị ndụ ji n’ụwa ma bụrụkwa nke a na-akwụ naanị otu ugboro, nke, mgbe ọ gasịrị, ikpe esochie ya azụ. O mere ka a mara na n’ụbọchị ikpeazụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ bànyere otu o siri bie ndụ ya, ma kpọkuzie, dụọ onye ọbụla ka ọ hazie ndụ ya ma kwadoo onwe ya nke ọma, n’ihi na o nweghị onye ma ahọ, ụbọchị ma ọ bụ oge òkù ọnwụ nke ya ga-akpọ ya, e wee chịkọta ije ozi ya ma nyekwa ya ụgwọ ọrụ ruuru ya site n’aka onye kere ụwa. Mmemme akwamozu ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị s

Obianọ eguzobela òtù nhazi ọhụrụ nke ụlọ ọrụ PPSSC na ASUBEB

AKA na-achị steeti Anambra bụ Willie Obianọ ègùzobela òtù nhàzi ọhụụ maka ụlọ ọrụ ‘Anambra State Universal Basic Education Board’ (ASUBEB) na ụlọ ọrụ ‘Post Primary Schools Service Commission’ (PPSSC), ma gwa ha ka ha tinye uchu ma were obi ha rụọ ọrụ. Ngùzobe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee duo ndị ọhụụ ahụ n’iyi ọrụ, bụ ndị ga-anọ n’isi ụlọ ọrụ abụọ ahụ malite ugbu a wee ruo n’ahọ ise na-abịa abịa. N’okwu ya dịka ọ na-egùzobe ndị ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ dụrụ ha ka ha jigidesie ike, ezi nzọ ụkwụ na agbam mbọ ndị nke rịturu arịtu n’ọkwa, ma mee karịa ka ha mere, dịka o mere ka ha mara na gọọmenti steeti ahụ akwụchaala ụgwọ niile maka ọrụ na ihe ndị ọzọ na-aga n’ihu n’usoro agụm akwụkwọ steeti ahụ, ma dọọkwa ha aka na ntị ka ha wèré ọrụ ha kpọrọ ihe. O chetaara ha na ọkwa ahụ abụghị ihe nrita ha, nke bụ na a pụkwara ịnapụ ha ya ma ọ bụrụ na a nụ akụkọ ọjọọ ma ọ bụ chọpụta ihe ọbụla na-adịghị aga nke ọma banyere otu h

Otu onye agha egbuola onwe ya ka o gbuchara nwunye ya

OTU onye agha nke Cambodia egbuola onwe ya ka o gbagbuchara nwunye ya dị afọ iri na isii n’ihi na ọ choghi ka e kewaa alumdi na nwunye ha dịka nwanyị ahị si chọ. Onye uweojii Captain Chuon Narong gwara ndị nta akụkọ si “Second Lt. Vong Tol, onye dị afọ iri atọ na abụọ gbara nwunye ya, Uy Sokhom egbe n’obi n’ụlọ ha nke dị na ‘Northern Province’ nke ‘Preah Vihear’ tupu ọ gbaa onwe ya n’isi. Ọ na-ewere nwunye ya iwe n’ihi na ọ chọrọ ịgba ya alụkwaghị m.” Narong kwukwara na ndị agbataobi nụrụ ka di na nwunye ahụ na-agbagha mgbagha n’ụtụtụ ụbọchị ụka ahụ ebe Tol nọ na-ebo ya ebubo na ọ na-eso onye ọzọ mana nwunye ya nọ na-ekwu na aka ya dị ọcha. Ọ kọwara si: “Ndị agbataobi ahụ agbataghị ọsọ enyemaka n’ihi na ha na-anụkarị ka ha na-alụ ọgụ. Di na nwunye ahụ lụrụ dị ihe dịka otu afọ; ha amụtaghị ụmụ.” A na-akọwa na afọ iwu na-achị Cambodia debere maka ịlụ di na nwunye bụ afọ iri na asatọ mana otu o sila dị, ụmụaka ruru afọ iri na isii nwere ike ilụ site na nkwado nke nne na nna ma ọ bụ onye n

Ejidela nwoke Delta chịịrị ọbante nwunye nwanne ya

E JIDELA otu nwoke gbara afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Ojo ka ọ chịịrị ọbante nwunye nwanne ya nwoke tọrọ ya. O mere nke ahụ n’Ogbe-Ogume nke di n’okpuru ọchịchị Ndokwa West na Steeti Delta. Onye uweojii na-ahụ maka ọdị mma ndi mmadụ na ndị uweojii na Steeti ahụ bụ DSP Andrew Aniamaka onye kwetere na nwoke ahụ nọzị na nke ndi uweojii kwuru na e nyefeela okwu ahụ n’aka ndi na-ahụ maka ya bụ ‘State Criminal Investigation Department’ maka inyocha ya nke ọma. Ọ kwukwara na a ga-ahafe ya bụ onye n’ụlọ ikpe ma e mechaa nnyocha ahụ. Dịka otu onye obodo ahụ si kwu; nwoke ahụ jiri nzuzo baa n’ọnụ ụlọ nwaanyi ahụ ebe ọ gbasara ọbante ya ka ọ sụchara ya, wee chịrị ya pụọ. Onye ahụ kwuru sị na nwaanyi ahụ kpọkuru ndị mmadụ oge ọ chọpụtara na ọbante ya adịzighị ebe ọ gbasara ya. O kwuru si. “Ka ọ na-ekpesa maka ọbante ya ọ na-achọ achọ, otu onye agbataobi gwara ya na ọ hụrụ mgbe nwanne di ya banyere n’ime ụlọ ya. Mgbe ha gakwuuru nwanne di ya ahụ, ọ gọrọ agụgọ si na ya ahụghi ọbante ahụ mana e mech

Obianọ agaala leta ka ọrụ sị aga n'okporo ụzọ dị iche-iche

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ agagharịala n’ụfọdụ ebe dị iche iche e ji ọlụ n’aka na steeti ahụ iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ndị ahụ. N’okwu ya dịka ọ gara ileta ọrụ ngo okporo ụzọ ahụ siri Umueje gaa Agụleri, Gọvanọ Obianọ kwuputara afọ ojuju ya banyere otu ya bụ ọrụ si aga nakwa ogoogo e ji arụ ya. Ọ kọwara ụzọ ahụ dịka nke ga-enye aka n’ịkwàlite mmepe na ọnọdụ akụnụba nke ndị mpaghara ahụ na mpaghara Ọmambala niile n’izugbe ma a rụchaa ya, ma tòkwazie ndị obodo abụọ ahụ ndị nuputara n’ìgwè ịbịa nabata ya na mpaghara ha, ọ bụnadị ka ọ rịọrọ ha ka ha kwàdo ma tụnyere ndị dị iche iche ji aha otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ apụta ịzọ ọkwa dị iche iche na mpaghara ahụ na nhọpụta ahụ na-abịa n’ihu n’ala anyị. N’okwu nke ya, otu n’ime ndị sonyere ya na njem ahụ, ma bụrụkwa kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr gwara ndị obodo abụọ ahụ na ya bụ ụzọ, bụ nke dị kilomita iri na otu na ụma asaa ma nweekwa àkwà mmiri,