Posts

Showing posts from December, 2018

Ihe ahịa zụrụ dịka a na-abanye ọnwa Ekeresimesi

EMUME Ekeresimesi bụ emume a na-eme afọ ọbụla nke e ji echeta ọmụmụ onye nzọpụta. Ọ bụ ma ọnwa Disemba dị n’abalị iri abụọ na ise ka a na-eme ya. Ọ bụ emume na-ewe otu izuụka zuru ezu n’ihi ihe ndị ọzọ a na-agbakwunye na ya dịka nzukọ, ịgba nkwụ, ịgba akwụkwọ, idu obi/ụlọ, imepe ụlọ, w.d.g. Ọ bụ n’ihi nke a ka ọnwa Disemba ji bụrụ ọnwa mmemme tinyekwara ọnwa e ji eri ego. Maka nke a, ahịa na-ekwo ekwo ebe ndị mmadụ na-agbakeri ala azụkọ ihe ha ji agba ya bụ Ekeresimesi. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ejikwa ohere ahụ ala ụlọ. Ị gaa n’ahịa na nso nso a, ndị na-ere ere na-ebe ndị na-ego ego na-ebe. Isiokwu wee bụrụ na isi akwa adịghịkwa ebe a fanyere ya. Ndị mmadụ na-eti mkpu n’ihe siri ike nke ukwuu. Ọnụ ahịa rịrị arị karịa ka ọ dị na mbụ. Mana emere elu, emere ala, a ga na-azụ ahịa, ọkachasi oge ugbua n’ihi na e tere ụgba, e tere ogiri, a ga-agbarịrị Ekeresimesi. Nwokorobịa aha ya bụ Chidi, nọ n’ahịa Eke Awka ere akwa obube kwuru na ha anaghị ere ahịa otu o kwesịrị. Ọ kọwara na ihe kpatara nke a b

A dụọla ndị obodo ka ha na-echekwa ihe gọọmenti rụụrụ ha

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị obodo dị iche iche ka ha na-echekwaba ihe dị iche iche gọọmenti rụnyere na mpaghara ha nà ngwongwo ndị ọzọ bụ ihe gọọmenti dị na mpaghara ha. Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndụmọdụ a ma kpọkwa oku a oge ọ gara ịgbape ụfọdụ ihe  ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ rụrụ n’ime-ime obodo dị iche iche. Ọrụ ndị ahụ a gbapere gụnyere ebe nlekọta ahụ ike a rụrụ n’ụlọ mmụta ‘Anambra State Polytechnic’ dị na Mgbàkwụ n’okpuru ọchịchị Awka North, ụlọ ezumeezu a rụrụ n’Enugwu-Ukwu n’okpuru ọchịchị Njikọka, ụlọ nlekọta ahụ ike dị na Nrì n’okpuru ọchịchị Anaọcha, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a rụrụ n’okpuru amụma agba nke abụọ nke inye obodo ọbụla nde naịra iri abụọ ka ha wee họrọ ma rụọ ihe bụ mkpa ha. nlekọta ahụ ike dị na Nrì n’okpuru ọchịchị Anaọcha, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a rụrụ n’okpuru amụma agba nke abụọ nke inye obodo ọbụla nde naịra iri abụọ ka ha wee họrọ ma rụọ ihe bụ mkpa ha. N’okwu ya dịka ọ na-agbape, Gọvanọ Obianọ, nk

Gọọmenti Anambra amalitela ịrụ ụlọ ezumeezu ogoogo mbà ụwa

ỌCHỊCHỊ steeti Anambra amalitela ịlụ ụlọ ezumeezu mba ụwa, bụ nke ga na-erite mmadụ ruru puku iri ise n’ọnụ ọgụgụ na steeti ahụ, ma kwuo na a ga-arụchapụ ya n’afọ na-abịa abịa. Aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara nke a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ oge ọ gara gbapee ya bụ ọlụ, bụ nke o kwùrù na a gà-anọ na mpaghara ebe ọbụla n’Awka wee na-ahụ gbamgbam ya ma ọ bụrụ na a rụchaa ya. Gọvanọ Obianọ, dịka ọ na-agbape ọlụ ahụ, mèrè ka a mara na ya bụ ụlọ ga-enwe òkpùkpù iri, nwee gbamgbam ogo ya ga-eru mità iri na asatọ, ma nwekwa ebe a na-atụ ndụ mmanụ nakwa ọtụtụ ime ụlọ ọgbakọ ezumeezu n’ime ya, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọ kọwara nke ahụ dịka ótù n’ime nnukwu ọrụ dị iche iche ọchịchị ya bàgìdègòrò na ya nso nso a, gosìputa ezi olile anya o nwere na onye ji ya bụ ọrụ ngo ga-arụchapụ ya n’oge a tụrụ anya, ma keleziekwa ụlọ nzùkọ omebe iwu steeti ahụ maka ịnabata na ịkwàdò amụmà ego ọrụ nke afọ 2019 o zìtèère ha na-egbughị oge, bụ nke o kwuru na ọ ga-enyekwa aka n’

Aka akparala nwoke buuru ụgbọala nne ya ukwu gbafue

AKA akparala otu nwoke aha ya bụ Solomon Okon, bụ onye buuru ụgbọala nne ya ukwu wee gbalaga. Oriakụ Olufunke Obaba kwuru na ya were Okon n’ọlụ dika ọkwọ ụgboala ya ‘private driver’ mana o rughi otu ọnwa, o zuru ụgboala ahụ gbapụ. Oriaku Obaba kwuru na o bugara ya ụlọgwụ ebe ọ gara inyocha ahụike ya, ma si ebe ahụ fuo. O kwuru sị: “Anyi ruru ụlọgwụ n’ihe dika elekere asatọ na ọkara nke utụtụ. Ebe ihe dịka awa abụọ na ọkara gachara, apụtara m, ahụghikwa m ụgbọala m ebe a kwụbara ya. Akpọrọ m ya n’ekwentị ya nile ma onweghi nke gara aga. Akpọzịrị m di m, o wee bịa, bughachi m azụ n’ofiisi. Echere m na Okon bu ugboala ahụ gaa mkpagharị, ma mgbe o ruru n’etiti elekere nke atọ na anọ nke mgbede ma anyi ahụghị ya, anyị gara kpesara ndị uweojii”. Dika kọmishona Uweojii na Steeti Oyo bụ Abiodun Odude si kwu mgbe a na-akpọgharị onye ohi ahụ n’isi obodo ahụ; o bụ site na mbọ ndị uweojịị mgbe ha nwetechara ozi site n’aka nwanyị nwe ụgbọala n’Ibadan ka ha ji nwụchikọọ onye ohi ahụ n’Akwa Ibom

Ndị ụka etoola Fada Nkeanyimụọ maka ọrụ ọma

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ụbọchị ụka na ‘Arch-Bishop A.K. Obiefuna Retreat, Pastoral and Conference Centre, Okpuno’, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’ n’ịhị nnukwu mmemme oriri na oñuñu ‘Christmas Party,’ nke ha mere ma nọrọkwa na  ya kelee Rev. Fr. Johnbosco Nkeanyimụọ maka ọlụ ọma ya. Fr Nkeanyimụọ lụrụ ọlụ n’ebe ahụ mana ka ọ dị ugbu a, ọ nọzị n’ebe ọzọ na – akọkwa n’ugbo Chineke. N’okwuchukwu n’aja massi, Fr Nkeanyimụọ, bụ ụkọchukwu nọrọ n’isi emume kọwara ụbọchị ụka ahụ dịka ụbọchị añurị n’ihi na ụka wepụtara ya dịka ụbọchị ụka añụrị ‘Happy Sunday’. O kwuru na añụrị  amaka ma kọwakwaa na añụrị di iche n’ụtọ, ya ka ndị Igbo jị kwu na ihe na-atọ nwa ewu ụtọ na egbu nwa ewu egbu. O kwuru si: “Juọ onwe gị ajụjụ ndị a: Gịnị na-ewepụ añụrị m? ọ bụ gịnị na-enye m añụrị? Gịnị ka m ga-eme ka m wee nwee añụrị n’ime onyenweanyi? Ọ bụ ego na ihe ndị ọzọ uwa na-achọ na-enye gị anụrị? Ihe ndị ahụ anaghi adigide. Añụrị nke Chineke anọghi na ya enweghi isi. ọ bụ n’ime Kraist ka a na-amụnwo añụrị ọhụrụ

A tụọla otu onye isi ụka nga maka imetọ ụmụ ejima nwanyị abụọ

Ụlọ ikpe ‘Ikeja Magistrate Court’ a tụkpụọla otu onye isi ụka aha ya bụ Michael Olise, nke ụlọ ụka ‘Anointing Chosen Vessel, Governor’s Road Iketun, Lagos’, n’ụlọ itiri maka imetọ ụmụ ejima nwanyị abụọ. Onye isi ụka ahụ (Olise) gbara afọ iri ise na anọ bụ enyi nna ụmụejima ahụ, ndị dị afọ iri na abụọ. Onye uweojii okwu di n’aka bụ Raphael Dony kwuru na nwoke ahụ kpara aka ala ahụ n’onwa gara aga n’ụlọ nna ụmụaka ahụ nke dị n’Okota, Lagos. Olise metọrọ ejima nke mbụ ka ọnwa Novemba dị n’ụbọchị iri na ise; ma nọrọkwa n’otu onwa Novemba ahụ metọkwuo ejima nke ọzọ site n’itinye aka n’ihe o jiri bụrụ nwanyị. E kwuru na ụmụ ejima ahụ na nne na nna ha bi mana Olise mere arụ ahụ oge nne ha mere njem na mba ofesi, ebe nna ha gara ọlụ. Ka ihe si gbata kwụrụ, Magistrate Osunsanmi anabataghị arịrịo nwoke ahụ. E yigharịrị ikpe ma ọnwa Jenuarị dị n’ubọchị iri abụọ na atọ.

E butela ozu otu Nwanyi n'ụlọ oriri na ọñụñụ di n'Abakaliki

NDI Uweojii nke Steeti Ebonyi na-enyocha ihe banyere ọnwụ otu nwanyị nke a hụrụ ozu ya n’otu ụlọ oriri na ọñụñụ nke di n’Afikpo ‘Road’ Abakaliki. Ozi e nwetara n’Abakaliki site n’aka onye okwuputa okwu bụ Lovet Odaa na-akọwa na ozu nwanyị ahụ nwere ọnya n’obi ya na n’olu ya; ma na-ekwu na ndị ọlụ ụlọ oriri na ọñụñụ ahụ amaghị mgbe nke ahụ mere n’ihi na ọ bụ mgbe ozu ahụ bidoro sibe isi ka e ji chọpụta. Odaa kwuru sị: “Amatabeghị onye nwanyị ahụ bụ nke a na -amata onye gburu ya mana a na-eme nnyocha ugbu a. A ga-ata ndị ọlụ ụlọ oriri na ọñụñụ ahu ụta n’ihi elerughị anya makana achọpụtaghị igbu ọchụ ahụ ozigbo. A chọpụtara nke a ka abali ole na ole gachara”. Ọ rịọrọ ọha na eze ka ha nye aka weta ozi nke a ga-eji nwuchikọọ onye kpara arụ ahụ ma kwekwa nkwa na ndị uweojii ga-ahụ isi ya bụ okwu. O kwukwara na ka ọ di ugbu a, ndi ọlụ ụlọ oriri na ọñuñụ ahụ bụ ndi a na-agbazi ajụjụ maka ya bu ọdachi. Otu onye achọghi ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ mgbe isi ọjọọ ji pụtawa n’ọnụ ụlọ ahụ ka ndi

Gọọmentị Anambra agabala n'ihu na-enyere ndị iju mmiri wakporo aka

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwupùtala njikere ọchịchị steetiahụ dị ịgbata ọsọ enyemaka nyegara ndị ahụ ajọ ọnọdụ iju mmiri wakpórò na steeti ahụ aka ka ha wee nọrọkwa n’ezi ọnọdụ karịa ka ha nọ na mbụ. Nke a bụ nke gọvanọ mere ka a maran’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, na mmemme ịgbape kpọmkwem amụmà Mgbata Ọsọ Na Enyemaka Nye Ndị Nsogbu Iju Mmiri Wakpòrò Na Steeti Ahụ Nke Afọ 2018, bụ nke e mere n’okpuru nkwàdo ndị “Bright Vision Health Foundation” (BVHF) na njikọ aka ndị “Church of Jesus Christ of Latter-Days Saints” Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, Dr. Nkem Okeke, mèrè ka a mara na ọchịchị steeti ahụ, site n’aka ụlọ ọlụ steeti ahụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụgbanụ, bụ Anambra State Emergency Management Agency (SEMA) agaala n’ihu n’inyere ndị ahụ iju mmiri wakporo aka kemgbe ya bụ ihe jiri mee, ma sịkwazie na ọchịchị ya agaghị ada mbà n’ime nke ahụ. Ọ kọwara mgbata ọsọ enyemaka ahụ dịka nke bịara n’oge dabara adaba, ọ kachasị ugbu a oge mmemme e

Bịshọpụ Katọlịkị eyinyela mmadu iri na asaa na-achọ ichi ụkọchukwu akwa ọcha n’Awka

A NỌ na Holy Family Spiritual Year Seminary, Okpuno, nke di n’okpuru ọchịchị Awka South na nso nso a wee yinye ụmụokorobia iri na asaa na-achọ ichi fada akwa ọcha. A kporo nke a ‘2018 Investiture’. Dika o si dị, emume ahụ bụ ome n’afọ nke a na-eme n’ụlọakwukwọ ahụ. N’okwuchukwu ya n’aja maasi dị asọ; bishọpụ ụka katolik nke Awka dayọsis bụ ‘Most Rev’ P.C. Ezeokafor gwara ha ka ha kee ajị n’ụme wee nabata ọzụzụ a na-enye ha. O kwuru sị na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e jị echeta itụ ime Marịa di asọ n’ejighị njọ ọbụla. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha nabata ọzụzụ nke a na-enye ha maka ịbu ụkọchukwu dika Maria si nabata ịbụ nne nke Chukwu.  Ọ gwara ha sị: “Onye mekata ihe ọma, ahụ ya abụrụ ihe ọma. A na-ebido n’oge ebi ezigbo ndụ makana anaghi amụ aka ekpe na nka. Onye ga-abụ fada ga-abụ ezigbo mmadu n’ihi na onye isi anaghị edu onye isi. Ọ dị mma ka mmadụ yie aha a gụrụ ya”. Bishọpụ Ezeokafor gakwara n’ihu gwa ha ka ha jiri oge a kpọrọ ihe na ihe ndị uka chọrọ n’aka ụkọchukwu bụ okwu nke Chineke na sakaram

Mkpa ọ di ibelata ihe mberede n'oge Ekeresimesi

OGE ekeresimesi bụ oge e ji eme njem nke ukwu. Nke a mere na ụgbọala na-eju n’okporo ụzọ tinyere ọkada na ihe ọnyịnya ndị ọzọ. A chọpụtara  na ihe mberede na-adapụtaba n’oge a n’ihi ihe olemole. Ọtụtụ ndi na-akwọ ugbọala anaghị enwe ọzụzụ tupu ha eburu ụgbọala pụta n’okporoụzọ. Mgbe mmadụ amụghị ihe otu ibe ya si mụ, ihe ọzọ na-eso ya bụ ọghọm. A na-ekwu na ha enweghị ọzụzụ ha a na-anyakwa ọgbasara m site n’ịnya waa waa waa. Otụtụ n’ime ha anaghị eleru anya were na-anya, ọ bụrụ na ndị na-akwọ ụgboala ga na-enwecha ọzụzụ ma na-eleru anya ala, a ga-egbochinwu ọtụtụ ihe mberede na-eme n,okporoụzọ anyi. Ihe ọzọ dị ka ibe ya bu na ụfọdụ anaghị alụ ụgbọala ha ọlụ bido n’afọ ruo n’afọ. Mgbe ufọdụ ka ọkwọ ụgbọala ga-ama na ụgbọala ya adịghị mma ma buru ya pụta n’okporoụzọ. O bụrụ na a na-alụ ụgbọala ọlụ otu o kwesịrị, ọ ga-ebelata ihe mberede. Iji ma atu, ọ bụrụ na ụgbọala enweghị ọkụ o ji ahụ ụzọ, ahapụ ibu ya pụta n’abalị, ọ gaghi akpata ihe mberede. Ihe ọzọ ga-enye aka ibelata ihe mberede n

E meela ụbọchị ndị ọlụsị n'Anambra

Image
OGIGE nlekọta ndị ọlụsị, ndị kara nka na ndị ahụ esichaghị ike, bụ “Rehabilitation Center for Disabled, Old and Tramps” (RECDOT) dị n’Ọzụbụlụ akpọkuola ma rịọ enyemaka na mgbata ọsọ ọhanaeze, gọọmenti na otu dị iche iche n’ọlụ ha ji n’aka nà mbọ ha na-agba ilekọta ndị ọlụsị na ndị ọzọ nwere nsògbu ahụ dị iche iche. Onyeisi chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi ogige nlekọta ahụ, bụ Oriakụ Rosemary Odunukwe kpọrọ oku a n’okwu ya na nnukwu mmemme ndị òtù a chịkọbàrà iji mee ncheta ụbọchị ndị ọlụsị na ndị ahụ ezuchaghị oke na mba ụwa, nke afọ 2018, bụ nke weere ọnọdụ n’isi ogige ahụ dị n’Ọzụbụlụ n’okpuru ọchịchị Ekwusigo nke steeti Anambra. Oriakụ Ọdụnukwe, onye kọrọ otu ya bụ ogige siri wee màlite mèrè ka a mara na ebumnobi ha n’ịchịkọba ya bụ ọgbakọ bụ ka ha site na ya wee kụziere ndị mmadụ mkpà ọ dị ịkpọta ndị ọlụsị, ndị ara, ndị agadi na ndị ọzọ ahụ ezuchaghị okè n’ogige ahụ, ma sitekwa na ya rịọ enyemaka gọọmenti na ọhanaeze n’ịnye ogige ahụ nkwàdo iji wee gaa n’ihu n’ilekọta ndị ahụ anya, ma

Obianọ atọhapụla ndi nga iri n'Ekwulọbia

AKA na-achị Steet Anambra bụ Govanọ Willie Obiano atọhapụla ndi nga mmadụ iri bụ ndị nọ n’ụlonga ‘Aguata Prisons’ nke di n’Ekwulobia n’okpuru ọchịchị Aguata nke Steeti ahụ. Obianọ mere nke a mgbe o sonyere n’aja maasi di aso nke ọ bụ ‘Most Rev’ Jonas Benson Okoye ‘Auxilliary Bishop’ ụka Katọlik dayosis Awka nọ n’isi ya, ma bụrụ nke e merubere n’ogige ụlọnga ahụ. Ndị nga ndị ahụ a gbaghaara ma tọhapụ bụ Ebuka Eze, Monday Oweh, Chinedu Nwigwe, Onyeka Obi, Emeka Ezechukwu, Obinna Nwankwo, Emmanuel Onyenwusi, Chigozie Nwankwo, Chukwuebuka Okonkwo na Ogechi Onyeanwụsị. Ndị nga ndị ahụ bụ ndị a tụrụ nga n’ihi izu ohi na igwu ojoro ma bụrụkwa ndị nọrọla site n’agbata ọnwa isii wee ruo afọ abụọ n’ụlọnga. Govanọ Obiano kwuru na ha ga-aputa n’ụlọ nga ma ya binyechaa aka n’akwụkwọ dịka o kwesịrị. O dọkwara ha aka na ntị ka ha gbanwoo agwa ha mgbe ha banyere n’obodo. O gwakwara ndị nke ka nọ na nga ka ha na-aga n’ihu n’ikpa agwa ọma ma rụtụkwa aka na n’ime mmadu narị abụọ na iri na asatọ nọ n’ụlọn

Obiano ekwela nkwa ịrụtọpụ okporo ụzọ jikọtara Ogbaru na Ihiala

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agaala leta ka ọnọdụ sìrì gbata kwụrụ na otu ọlụ si aga n’okporo ụzọ ahụ siri Umụnankwọ gaa Mpụtụ wee pụta Ogwụaniọcha. N’okwu ya n’ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ gosìpụtara afọ ojuju ya bànyere otu ya bụ ọlụ sì aga n’okporo ụzọ ahụ dị kilometer iri na anọ na ụma isii; ma nyekwazie ụlọ ọlụ ji ya ntụzi aka, ka a gbàkwụnye àkwà mmiri ga-ejikọta Ihiala na mpaghara okpuru ọchịchị Ọgbarù ahụ. O mere ka a mara na ọchịchị ya bàgìdèrè na ya bụ ọlụ iji hụ na e nwere ezi okporo ụzọ n’ime obodo ndị ahụ, dịka ọ dị n’ụfọdụ ime obodo ndị ọzọ dị ichè ichè na steeti ahụ; ma kpọkùkwazie ụlọ ọlụ ji ya bụ ọlụ ka ọ gbasie mbọ ike ịhụ na a rụchapụrụ ya bụ ọlụ n’oge a tụrụ anya. N’okwu nke ya na  njèm ahụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọlụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọ kwuru na ya bụ ọlụ na-aga nke ọma nakwa n’ogoogo dị elu, ma sịkwa na onye ji ya bụ ọlụ ngo emeela ka a mara na a ga-awụrú ya bụ ụzọ n’obi eze ọdịnala obodo Ogwụaniọcha tupu oge mmemme Ekeresimeesi er

2019: Otu nnọrọ onwe arịọla ka akwado Buhari

ÒTÙ a kpọrọ “Good Governance Ambassadors of Nigeria” (GOGAN), bụ òtù nnọrọ onwe akpọkuola ụmụafọ Nigeria ka ha kwàdo onyeisi ala, bụ Maazị Muhammadụ Buharị maka ọchịchị ya nke ugbòrò abụọ. Onyeisi ndị otu a na steeti Anambra bụ Maazị Johnbosco Ọnụnkwọ kpọrọ oku a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị otu ahụ karịrị puku abụọ n’ọnụ ọgụgụ nuputara n’igwè wee mee ngagharị iji gosìpụta nkwàdo ha nye onyeisi ala Buharị, bụkwa nke ha nọrọ na ya wee malite nhazi achụm nta nkwàdo a kpọrọ ‘Buhari Unity Band’. Ọ kọwara Buharị dịka nwoke maara nke ekwe na-akụ n’ihe gbasaara ọchịchị obodo, kwuo na o wulitela ọnọdụ mmepe ala anyị n’ụzọ pụtara ihe, kwàlite ọnọdụ akụnụba ala anyị, ma mepùtela ọtụtụ ihe a hụrụ anya n’ala n’ime ihe erubeghị afọ anọ o jiri bànye n’ọkwa ọchịchị. Maazị Ọnụnkwọ mere ka a mara na ala Nigeria nọ n’ajọ ọnọdụ tupuu ọchịchị Buharị wee bàta n’ọgbọ, mana ugbu a, ya bụ onyeisiala egosila n’ezie na ọ bụ ọka ibè n’ịhe gbasaara ịchị ezi ọchịchị na ịhazi ọnọdụ akụnụba. Ọ kpọpụtasịrị

Akwaihedị ahọpụtala ụmụada 2019 ọhụrụ

NDỊ obodo Akwaihedị dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra eweputala ma gosi ọhanaeze ọmarịcha ụmụ agbọghọ atọ tuuru ugo n’asọmpi mma a chịkọbara n’ọdị nso a maka ụmụ agbọghọ obodo ahụ, bụkwa ndị ọhụrụ a họpụtara dịka ụmụada obodo ahụ maka afọ 2019, site n’asọmpi nwaada kacha mma n’obodo ahụ. Nke a bụ nke e mere ka a mara site na mpụtara e wepụtara nso nso a n’asọmpi mmä ahụ a chịkọbara, bụ ótù n’ime asọmpi kacha ewu ewù na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ nke ala Nigeria. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ oge ọ kpọpụtachara mpụtara ahụ, onyeisi otu chịkọbara ya bụ asọmpi, bụ Maazị Chidi Okoli, kọwara na nke ahụ màlitere n’afọ 2016 ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ ijikọta ndị ntorobịa obodo ahụ ọnụ, iji wee kwàlite udo na ọnọdụ mmepe nke obodo ahụ, ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo, tinyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya. O kelere obodo Akwaihedị, ndị sonyere na ndị tụnyere ụtụ n’ụzọ dị iche iche na ya bụ asọmpi, ndị ikpe, nke Dọkịta Oriakụ Hope Wobikeze nọ n’isi ya, nakwa ndị òtù

A tụọla otu nwoke nga maka ịkwasa nwa afọ anọ iko n'ike

OTU ụlọikpe nke dị na kasuwan Nama na Jos, isi obodo Steeti Plateau, atụla otu nwata nwoke gbara afọ iri na anọ nga afọ atọ maka ịma nwata nwanyi gbara afọ anọ elu n’ike. Onye ọkaikpe bụ Lawal Suleiman, tụrụ ya bụ nwata nwoke nga n’enyeghị ya ohere ije ego wee gbanahụ ịga nga. Suleiman kwuru na ya bụ ntaramahụhụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị n’ebe ndị ọzọ ga-achọ irụ ụdị arụrụala ahụ nọ. Ozi e nwetara site n’aka ‘Inspector’ Yakubu Audu gwara ụlọikpe ahụ na nna nwata nwanyị ahụ bu Ezekiel Jatau, nke si n’okpuru ọchịchị Riyom, nke dị na Bauchi kwuru na nwoke ahụ jị ụzọ aghụghọ kpọrọ nwa ya nwanyi baa n’ime ọhịa ebe ọ nọrọ maa ya elu n’ike.

Gọọmenti Anambra enyela ndị ntorobịa nkwàdo n'ọlụ aka dị iche iche

OBODO juputara nnọọ n’ọñụ ụbọchị Mọnde na steeti Anambra dịka gọọmenti steeti ahụ nyere ndị ntorobịa karịrị iri ise na steeti ahụ nkwàdo na akụrụngwa dị iche iche iji wee malite ọlụ aka dị iche iche ha mụrụ. Nke a bụ nke e mere site n’okpuru ministịrị steeti ahụ na-ahụ maka nkwàlitè ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụta; n’ịgbaso mmezupụta nke atụmatụ “otu onye ntorobịa, otu ọlụ aka”, bụ ọmarịcha atụmatụ aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ ji n’aka ugbu a, ịhụ na onye ntorobịa ọbụla na steeti ahụ nwere, o pekata mpe, otu ọlụ aka. N’okwu ya dịka ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n’aka ndị ntorobịa ahụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka nkwàlitè ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụta, bụ Maazị Bonaventure Enemali kọwara nke ahụ dịka nke dabàrà adaba na nkwà ahụ Gọvanọ Willie Obianọ kwèrè ikwàdo ndị ntorobịa puku iri na steeti ahụ kwa afọ ọbụla ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma mee ka a mara na e nyebuọla ndị ntorobịa ruru narị abụọ na iri ise nkwàdo n’oge gara aga, n

APGA azọpula ụkwụ ije siri ike maka ndọrọ-ndọrọ ọchịchị 2019

OTU ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance APGA agbapeela achụm nta nkwàdo ya maka ndị ga-eji aha ya wee zọọ ọkwa onyeisi ala, ọkwa sineeti, ọkwa ndị ụlọ nnọchi anya etiti na ụlọ omebe iwu steeti na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ala anyị n’ahọ 2019. Mgbape achụm nta nkwàdo ahụ bụ nke isi okwu ya bụ “Ka Anyị Wúó Nigeria Ọhụụ” ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na ya bụ òtù ndọrọ ndọrọ ahụ nakwa ndị ji ya apụta ịzọ ọkwa dị iche iche n’ala Nigeria gbaa gburugburu. N’okwu ya na mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra; gọvanọ Willie Obianọ, bụkwa onyeisi oche òtù “Board of Trustees” nke otu ndọrọ ndọrọ ahụ kọwara ya dịka otu ndọrọ ndọrọ nwere ihe ọ ga-ewe iji nwògharịa ala Nigeria ma kwàlitekwa ezi ọchịchị. O mere ka a mara ụzọ dị iche iche ọchịchị nọ ugbu a na steeti Anambra n’okpuru otu ndọrọ ndọrọ APGA sìgòrò wee nwògharịa ya bụ steeti ka ọ bụrụ e ji ama atụ na mba ụwa, kwuo na ọ bụ otu