Posts

Showing posts from November, 2018

Nwaada Anambra eturula ugo dịka 'Miss Nigeria’

CHIDINMA Aaron, nwaafọ steetị Anambra gbara afọ iri abụọ na ise eturula ugo dịka nwaada kacha mma n’ala Nigeria (Miss Nigeria). Chidinma bụ onye nọchitere ndị South East ma bụrụ onye ji asambodo ihe ọmụmu ‘Business Administration’ na mahadum Ibadan bụzị onye mmeri n’asompi ‘Miss Nigeria Beauty Pageant’ agba nke iri anọ na abụọ. Asompi a were ọnọdụ n’ụlọ oriri na ọñụñụ ‘Eko Hotels and Suites, Victoria Island, Lagos. Chidinma gbara onye nke mbụ ma merie mmadụ iri na asaa ndị ọzọ. O ritere ihe onyinye gụnyere nde naira atọ, ọmaricha ụlọ na ụgbọala. Ndị sotere ya na ya bụ asompi bụ Chisom Dunu na Ameh Munirah. N’okwu ya na mmemme ahụ nke afọ a, onyeisioche ‘Folio Media Group’ Maazị Fidelis Anosike, toro mbọ ndị na-achịkọba ya bụ mmemme. O kwuru sị, “ndị nchikọba mmemme a na-eleba anya n’ime karịa sọ mma elu ahụ n’ebe ndi na-asompi a nọ. Ha na-eleru anya n’ime bụ nke dị oke mkpa.” Onye bụ ‘Miss Nigeria 1979,’ Helen Priest, rụtụrụ aka na ihe isii dị oke mkpa mgbe a na-eme nhọpụta a gụnyere;

NUJ amalitela izu ụka ndị nta akụkọ n'Anambra

ÒTÙ jikọtara ndị nta akụkọ n’ala Nigeria bụ ‘Nigeria Union of Journalists (NUJ)’, ngàlàba  nke steeti Anambra, amalitela otu nnukwu mmemme omenafọ ha, bụ nke a kpọrọ izuụka ndị nta akụkọ. Mmemme ahụ bụ nke a malitere n’isi mbido izu ụka a site n’ofufe nro pụrụ iche e nwere n’ụlọ ụka ‘Cathederal Church of St. Faith, Awka’, ma bụrụkwa nke na-ewere ọnọdụ n’isi ụlọ ọlụ ndị otu ahụ na steeti ahụ, bụ ‘Godwin Ezemo International Press Centre’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra. N’okwu ya dịka ọ na-agbape mmemme ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nkè onye nọchitere anya ya bụ kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhanaeze ihe ha kwèsìrì ịma, bụ C-Don Adịnụba kọwara ndị nta akụkọ dịka ndị bara oke uru na ndị nwere ọtụtụ ọlụ chere ha n’ihu n’ime ka ọnọdụ ala anyị kawanye mma. Ọ kpọkuru ndị nta akụkọ ka ha na-agbaso iwu na-achị ọlụ mgbasa ozi, kpachapụ anya n’otu ha si ebu akụkọ, ma zèéré ịgbasa ozi ụgha na ozi pụrụ iduhie ọha mmadụ, n’ihi ihe egwu dị iche i

Emume Ekeresimesi ugbua na mgbe ochie

N’OGE Ekeresimesi ọ dị ikuku ọma na- adị eku. A na-agụ egwu dị iche iche iji gosipụta oge ekeresimesi. Obi añụri na-ejupụta ebe nile, ọkachasi na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala anyị. N’ihe dịka ọgụ afọ abụọ gara aga, ezinaụlọ ọ bụla na-ejikere maka Ekeresimesi. Ụmụagbọbịa na-akpa nkụ edebe maka isi nri Ekeresimesi. Ọtụtụ obodo na-amụ egwu dị iche iche iji kwadobe ya bụ Ekeresimesi. Ọ dị ọtụtụ ihe mere ka Ekeresimesi dị iche n’oge ugbua. Mgbe gboo, adịghị egoro ụmụaka akwa na akpụkpụ ụkwụ oge ekeresimesi ọbụla, adịghị esi osikapa oge ọbụla bụ ekeresimesi. N’oge ahụ, ndị nọ n’obodo mepere emepe na-agba mbọ alota obodo ha. Ọ na – atọ ụmụaka ụtọ na ha na-ala ụlọ oge ekeresimesi. Ndị nọ n’ime obodo  na-añụrị ma ndị nke ha lotara obodo maka ekeresimesi. Ọ bụ ezie na ego adịghị  mana oge ekeresimesi ruo, ọñụ pụrụ iche na-adi. Ma ugbua, ọ dị ọtụtụ ihe mere na ọñụ adịchaghị ka ọ na -adị na mbụ. Ọ bụ ezie na ndụ dịịrị ọtụtụ mmadụ mana ihe isiike dị na ya karịrị nke mere n’oge ahụ rube, obi mmiri a n

Ihe ahịa zụrụ dịka a na-abanye ọnwa Ekeresimesi

EMUME Ekeresimesi bụ emume a na-eme afọ ọbụla nke e ji echeta ọmụmụ onye nzọpụta. Ọ bụ ma ọnwa Disemba dị n’abalị iri abụọ na ise ka a na-eme ya. Ọ bụ emume na-ewe otu izuụka zuru ezu n’ihi ihe ndị ọzọ a na-agbakwunye na ya dịka nzukọ, ịgba nkwụ, ịgba akwụkwọ, idu obi/ụlọ, imepe ụlọ, w.d.g. Ọ bụ n’ihi nke a ka ọnwa Disemba ji bụrụ ọnwa mmemme tinyekwara ọnwa e ji eri ego. Maka nke a, ahịa na-ekwo ekwo ebe ndị mmadụ na-agbakeri ala azụkọ ihe ha ji agba ya bụ Ekeresimesi. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ejikwa ohere ahụ ala ụlọ. Ị gaa n’ahịa na nso nso a, ndị na-ere ere na-ebe ndị na-ego ego na-ebe. Isiokwu wee bụrụ na isi akwa adịghịkwa ebe a fanyere ya. Ndị mmadụ na-eti mkpu n’ihe siri ike nke ukwuu. Ọnụ ahịa rịrị arị karịa ka ọ dị na mbụ. Mana emere elu, emere ala, a ga na-azụ ahịa, ọkachasi oge ugbua n’ihi na e tere ụgba, e tere ogiri, a ga-agbarịrị Ekeresimesi. Nwokorobịa aha ya bụ Chidi, nọ n’ahịa Eke Awka ere akwa obube kwuru na ha anaghị ere ahịa otu o kwesịrị. Ọ kọwara na ihe kpatara nke a b

A dụọla ndị obodo ka ha na-echekwa ihe gọọmenti rụụrụ ha

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị obodo dị iche iche ka ha na-echekwaba ihe dị iche iche gọọmenti rụnyere na mpaghara ha nà ngwongwo ndị ọzọ bụ ihe gọọmenti dị na mpaghara ha. Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndụmọdụ a ma kpọkwa oku a oge ọ gara ịgbape ụfọdụ ihe  ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ rụrụ n’ime-ime obodo dị iche iche. Ọrụ ndị ahụ a gbapere gụnyere ebe nlekọta ahụ ike a rụrụ n’ụlọ mmụta ‘Anambra State Polytechnic’ dị na Mgbàkwụ n’okpuru ọchịchị Awka North, ụlọ ezumeezu a rụrụ n’Enugwu-Ukwu n’okpuru ọchịchị Njikọka, ụlọ nlekọta ahụ ike dị na Nrì n’okpuru ọchịchị Anaọcha, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a rụrụ n’okpuru amụma agba nke abụọ nke inye obodo ọbụla nde naịra iri abụọ ka ha wee họrọ ma rụọ ihe bụ mkpa ha. N’okwu ya dịka ọ na-agbape, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere ya bụ onye ndụmọdụ ya pụrụ iche n’ihe gbasaara ọlụ ime-ime obodo, bụ Maazị Okey Ezeobi kọwara ọlụ ahụ a na-alụ dịka nke dabàrà adaba n’usoro na ebumnobi nke ọchịchị ya n’ịhụ na e nwere mm

A kpọkuo gọọmenti etiti ka ọ kwụọ Anambra ụgwọ o ji ya

ỌCHỊCHỊ steeti Anambra akpọnwèéla gọọmenti  etiti ka ọ kwụọ ya ego karịrị ijèri naịra iri anọ o ji ya n’ụgwọ, bụ ego e jiri dozigharịsị ụfọdụ ụzọ gọọmenti etiti dị na steeti ahụ. Aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ kpọrọ oku a ọzọ oge ọ gara ileta ka ọlụ si aga n’okporo ụzọ Ezira–Ụm’ụọmakụ– Enugwu–Ụmụọnyịa–Achịna, bụ nke dị kilomita iri na abụọ. O mere ka a mara na ụlọ ọlụ ji ya bụ ọlụ ngó ekwuola na ọ ga-arụchapụ ya bụ ụzọ tupuu isi ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ na-abịa abịa, ma kwuo na ego ahụ gọọmenti etiti ji ya n’ụgwọ ga-enye aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ịrụchapụ ya bụ ọlụ, bụzị nke mere o ji akpọku ya ka ọ kwụọ steeti ahụ ya bụ ụgwọ. O gosipụtara afọ ojuju ya banyere ogoogo e ji alụ ya bụ okporo ụzọ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka kwàlite ọnọdụ mmepe, ezi ọnọdụ obibi ndụ na ọnọdụ akụnụba obodo abụọ ahụ, ma kpọkùkwazie ụmụafọ obodo ahụ ka ha gaa n’ihu ịkwàdò ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ na ọlụ ọma dị iche iche o ji n’aka. Na ntụnye nke ha n’otu n’otu, onyeisi ụlọ ọlụ na-ahụ m

Ndị Katolik emeela mmemme Kristi Bụ Eze

EMUME Kristi bụ eze bụ nnukwu emume nke zuru ụka Katolic ọnụ n’ụwa nile.Ọ bụ ụbọchị ụka gara aga ka ọ kpọtụrụ ma zụọ azụọ. Ha na-eme emume a iji kwanyere Kristi ugwu dịka eze na-achị ụwa nile ma gbaara ya ọfala dịka o kwesiri. A bịa n’Awka, isi obodo steetị Anambra, ụlọ ụkka dị iche iche kara ụka n’ụlọụka ha ma mechaa gbara egwu wee zukọta n’obi Chukwu, ‘St Patrick Cathedral, Awka. N’aja maasị ekelere iri nke a kara na ‘St Patrick’s’, Rev Fr Mathew Attansey, bụ onye isi ebe ahụ ‘Cathedral administrator’ kọwara ụbọchị ahụ dịka oke ụbọchị. O kwuru si; “Taa bụ ụbọchị añụrị n’ihi na eze anyị na-agba ọfala. Ọ dị mkpa ịmata na eze anyị bụ eze eziokwu, eze udo, onye jiri onwe ya chụọ aja ka o wee zọpụta anyị. O kwesịrị ka anyị ñomie ya, n’ihi na ọ bụ maka ịhụnanya ya ka o ji were ọbara ya nụchaa anyị. O kwesịrị ka anyị gbaara ya osiari; ya mere ka anyị bido taa mebe ihe dị mma.” Umụ nwoke ndị gụrụ akwụkwọ na ‘Christ The King College (C.K.C), Onitsha’ bụ ndị nọ n’Awka tụkwaara Chineke mmamma n

Gọọmentị enyela Igwe Utuh, Lilu akwụkwọ ikike

OBODO jupùtara nnọọ n’añụrị ụbọchị Tuzdee dịka aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndị eze ọdịnala abụọ asambodo maka ịbụ igwe obodo ha dị iche iche. Ndị a bụ eze ọdịnala Utuh dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South na eze ọdịnala obodo Lilu dị n’okpuru ọchịchị Ihiala. Ya bụ mmemme inye àsàmbodo  bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị e ji okwu ha agba ìzù, nke gụnyere ndị ọlụ gọọmenti, ndị eze ọdịnala, ndị omebe iwu, ndị enyi, ikwu na ibè na ndị òbòdò abụọ ahụ. N’okwu ya dịka ọ na-enye ha asambodo ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ kọwara ndị eze ọdịnala dịka ndị bara oke úrù na ndị nwere nnukwu ọlụ na ntụnye pụrụ iche n’ịkwàlite udo n’obodo. O kwuru na ọ bụ mmasị ọchịchị ya ịkwàlite ezi mmepe tọrọ àtọ n’ime-ime obodo dị iche iche, kpọpụtasịa ọtụtụ ụzọ dị iche iche o sigòrò mee nke ahụ, nke gụnyere inye obodo ọbụla nde naịra iri abụọ ugboro abụọ, ka ha wee họrọ ma rụọ ihe bụ mkpà ha, ma kpọkùkwazie ndị eze ọdịnala ahụ ka sonyesie ik

Ndị Red Cross enyela ndị ide mmiri chupụrụ n'ụlọ ihe onyinye

NDỊ ọlụ na-eleba anya maka ọdị mma mmadụ ‘The Nigerian Red Cross Society’ site na njikọ nke ndị otu ahụ, ngalaba ofesi azala oku gọọmentị steeti Anambra site n’ịgbatara ndị ide mmiri chụpụrụ n’ụlọ ọsọ enyemaka. Ha butere ihe onyinye gburu ego karịrị nde naira ise. E kere ihe onyinye ndị ahụ n’obodo dị iche iche mmiri chụpụrụ n’ụlọ. Mgbe a na-enyefe ihe onyinye ndị a n’aka ndị okpuru ọchịchị Anambra ‘West’ na ‘Bishop Crowder Holding Centre, Onitsha’ ka osote onyeisioche otu ‘Nigerian Red Cross’ bụ Ọkammụta Peter Katchy, kwuru na ya bụ ihe onyinye nke ndị ‘European Union’ kwadoro bụ iji nye aka maka mkpa mkpa ide mmiri kpara. Ọ kọwapụtara na otu ha, nke bụ maka ọdị mma mmadụ ga na-aga n’ihu n’igbata ọsọ enyemaka na steeti Anambra. N’akụkụ nke ya, ode akwụkwọ otu ahụ bụ Kingsley Okoye dụrụ ha ọdụ ka ha were ihe onyinye ndị ahụ mee ihe dịka o kwesiri. Otu nwanyị dị ime aha ya bụ Blessing Ojadi na Christopher Nwayibe, bụ  kwuru na ha tufuru ihe nile ha nwere n’aka ide mmiri gosiri afọ ojuju

A màlitela ijide ndị ji ụmụaka arịọ arịrịọ n'Anambra

N’AGBAM mbọ ahụ ọ bagidere iji kpochapụ ịtụ mgbere ụmụaka, inye ụmụaka ọlụ karịrị ha na iji ụmụaka eme ihe ọjọọ dị iche iche, kọmishọna steeti Anambra na-ahụ maka ọdịmma na ihe metụtara ụmụnwaanyị na ụmụ ntakịrị, bụ Oriakụ Ndidi Mezue anapụtala ụfọdụ ụmụaka e ji arịọ arịrịọ n’ụfọdụ ebe dị iche iche na steeti ahụ, ọ kachasị n’Awka. Ya bụ nnapụta bụ nke kọmishọna ahụ mere dịka ọ bagidere njem ngagharị n’ụfọdụ ebe dị iche iche ndị ahụ na-arịọ arịrịọ, bụ nke o sitere na ya wee chọpụta na ọtụtụ ụmụaka ahụ ụfọdụ ndị mmadụ ji arịọ arịrịọ abụghị ndị ahụ mụrụ ha n’afọ ha, ebe ụfọdụ ndị ahụ na-eme na ha kpùrù isi bụcha ndị na-ahụ ụzọ na ndị ahụ zùrù òkè n’ezie. Dịka akụkọ siri kọọ, ụfọdụ ụmụaka ahụ e ji arịọ arịrịọ ahụ bụ ndị a chọpụtara na ha apụghị ịkọwatanwu ebe ndị bụ nne na nna ha n’ezie nọ, ma bụrụkwa ndị e kwùrù na a na-egoro ha n’ọnụ otu puku Naịra kwà ụbọchị (site na aka ndị abụghị nne na nna ha) maka iji ha ga rịọ arịrịọ n’ebe dịgasị iche iche. Kọmishọna Mezue gbarụrụ ihu bànyere ajọ ọ

Otu Ogboada eriela ji ọhụrụ, mechie afọ n’añụrị

ỤBỌCHỊ bụ nnọọ sọ ọñụ dịka òtù a kpọrọ ‘Ogboada Welfare Association’ jiri obi ụtọ wee merùbe mmemme iri ji ọhụrụ ha nke afọ 2018, wee mechikwa afọ n’ótù. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị òtù ahụ, ndị enyi ha, ndị ezinaụlọ ha na ndị na-echere ha ezi echiche. Na nkuzi pụrụ iche o nyere na ya bụ ọgbakọ, Ọkammụta Gọdwin Onyekaọnwụ kọwara ji dịka nnukwu ihe nakwa nri pụrụ iche na-ejikọta obodo ọnụ ma wetekwa udo. O mere ka a mara na ji bụ eze ihe a kụrụ n’ubi nakwa nri a na-akwanyere ugwu pụrụ iche n’ala Igbo, ma sị na mmemme iri ji ọhụụ bụ oge iji nye Chukwu Abịama òtùtó maka ònyìnye ndụ, ọganihu na ahụ isi ike. N’okwu nke ya dịka ọ na-awa ji ọhụụ ahụ a hụrụ ahụ, onye nọ dịka nnukwu nna nyere ndị òtù ahụ, bụ Dọkịta Ernest Ifebi, tòrò Chineke  maka ndụ na ahụike nke o jiri chọọ ndị òtu ahụ mma ma kpekwa ekpere maka ogologo ndụ na udo. N’okwu nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n’ụlọ ọgbakọ sine

Otu ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ akwanyerela Achebe ugwu n'Awka

OTU ụmụ Nigeria na-etolite etolite bụ ndị na-ede akwụkwọ a kpọrọ ‘ The Society of Young Nigerian Writers’, ngalaba steetị Anambra e meela emume ome n’afọ nke ha ji echeta Ọkammụta Chinua Achebe bụ a kwaa akwụrụ n’ihe gbasara edemede. Nke a weere ọnọdụ ụbọchị Fraidee gara aga bụ ụbọchị e ji echeta ọmụmụ Achebe. Emume ahụ kpọtụrụ akpọtụ n’ ụlọ ọba akwụkwọ steeti Anambra ‘Prof Kenneth Dike Central E-Library, Awka’. Isiokwu nke afọ a bụ 2018 bụ ‘Remembering Chinua Achebe: A celebration of Literary Star’. Onyeisi ndị otu ahụ na steetị Anambra bụ Izunna Okafor ji obi añụrị wee nabata mmadụ nile. O toro Ọkammụta Chinua Achebe maka ike ọ kpara n’edemede. Ọ kọwara ọtụtụ ihe o mere tinyere ụzọ dị iche iche o si gbaa mbọ na ndụ ya. O kwuru na o kwesiri ka a na-echeta ya mgbe nile. N’ikpeazụ, ọ rụtụrụ aka na mkpa ọ dị ime aha ya ka ọ dị ọkpụtorokpụ. Ọtụtụ ndị maara ihe ekwe na-akụ maka mmụta, tinyere ụmụakwụkwọ si ebe dị iche iche biara wee soro ndị otu ahụ cheta ọka ibe n’edemede bụ Achebe. Ọkamm

Fada Anulunko etoola Chineke maka afọọma ya

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ na nso nso a  n’ụlọ ụka St Martin’s Catholic Church, Igboukwu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata. Ụbọchị ahụ bụ oke ụbọchi na ndụ Very Rev Fada Emmanuel Chukwunalu Anulunko dịka ọ tụụrụ Chineke mmamma maka ịgba afọ iri asaa n’elu ụwa a tinyekwara afọ iri anọ ọ jị buru ụkọchukwu. Nke a bụ nnọọ mmemme ikele Chineke n”eziokwu n’ihi na ụmụ mmadu si n’ugwu na ndịda wee bịa soro Fada Anulunko wee ñurịa. E ji aja maasi elekere iri wee malite ya ebe Fada Anulunko no wee kelee Chineke n’ebe ọ dị ukwuu. O kwuru si na ọ bụ site n’amara Chineke ka ya jị wee dị ndụ ma na-alụkwa ọlụ ya. O kwuru si: “Abụ m Fada Emmanuel Anulunko, nwa Jonas na Susanna Anulunko n’Achalla Umuchu. Ana m ekele Chineke, aja maasi a ka m ji kele ya. Agaghị m ekelekata ya kwusi, ana m ekenekwaa ununwa biara abịa.” Fada Anulunko gakwara n’ihu kenee ndị St Martin’s Igboukwu na ndị Igboukwu nile n’ihi na ọ bụ n’Igboukwu ka o malitere ọlụ mgbe ọ chichara Fada n’afọ 1978, mgbe obodo dị iche iche dị na ‘Our Lady of Fa

Uru ụlọ mposi bara

N’OGE gara aga, adịghị enwe ụlọ pụrụ iche maka ịnyụ nsị. Ọ bụ n’ọhịa na ụzọ ka a na- anyụ nsị. Ị na- aga n’ụzọ, ebe nile a na – esi sọ nsị nsị. Mmiri zoo, ide mmiri eburu nsi nile ahụ budaa na mmiri. Ọ bụkwa nke a mere ọrịa dị iche iche ji jupụta ebe nile, ọkachasi ọrịa afọ osisa nye ụmụaka na okenye. Ma mgbe amalitere lụba ụlọ ebe a na- aga mposi n’ime ya, ihe mgbanwe wee dịba na ndụ ụmụaka na okenye. Ụlọ mposi ahụ mere ka ihe ndị ahụ ide mmiri na- ebuba na mmiri belata. Ọzọkwa bụ mmiri ọñụñụ a gbapugasịrị ebe nile. N’ihi na ọtụtụ mmadụ agụbago akwụkwọ, amamihe sikwa otu a baa ụba. Onye jee mposi, ọ kwoo aka ya iji gosi  na- mmadụ ịdị ọcha bụ ahụ ike. N’oge udummiri, okwesiri ka ndị ọlụ na-ahụ maka gburugburu na- aga n’ogbe nile na- elebe anya otu ndị mmadụ si eme n’ihi n’agbanyeghị mkpu nile ndị ọlụ ahụ ike na – eti, ụfọdụ ka na- eru ịnyị. Ụfọdụ ka na – eje mposi, ekechi, etufu n’ụzọ dị iche iche. N’ihi nsogbu na ọghọm a na- enwe n’ ije mposi n’ezi na ụzọ nile, nke a mere ka e nwee n

A kpọọla oku maka njikọ aka gọọmenti na ndị nnọrọ onwe

DỊKA ọ bụ e tikọọ mkpu ọnụ, a nụ ụdà ya; a kpọọla oku maka ezi njikọ aka ọnụ nke gọọmenti na ndị otu nnọrọ onwe dịkà ụzọ pụtara ìhè a pụrụr isi kwàlite ezi ọnọdụ ahụike na mmepe obodo. Osote aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịta Nkem Okeke kọwara mkpa nke a dị, ma kpọkwa oku a oge ọ gara ịmara ka ọlụ si aga na mwulite ahụ a na-ewulite ụlọ ahụike ọhaneze dị n’Enugu-Ukwu n’okpuru ọchịchị Njikọka steeti Anambra. Ọ kọwara ezi ọnọdụ ahụike dịka otu n’ime ihe kachasị dị mkpa na ndụ mmadụ, maka na ọ bụ ndụ dị, e wee chụba àkụ, ma kọwaa na ọ bụ nkwenye ahụ mere ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ ji agbasi mbọ ike n’ịkwalite ọnọdụ ahụ ike ụmụafọ steeti Abambra, site na njikọ aka ọnụ ha na ntụnye nke otu nnọrọ onwe dị iche iche. Dọkịta Okeke, onye kwuputara afọ ojuju ya banyere otu ọrụ ahụ si aga ebe ahụ gakwazịrị n’ihu gosipụta njkere nke gọọmenti steeti ahụ iweputa ego iji rụchapụ ya bụ ọrụ, na-agbanyeghị na ego so n’otu ihe na-eweta ‘agakata akwụsị’ n’ebe ọrụ ngó dị. Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọ ọr

Iju mmiri afọ a metụtara mmadụ narị puku anọ na Anambra – NEMA

ỤLỌ ọlụ ahụ na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadụ n’ala anyị, bụ ụlọ ọlụ National Emergency Management Agency (NEMA) ekwuola na ndị iju mmiri metụtara na steeti Anambra n’ime afọ a ruru mmadụ narị puku atọ na iri asaa na ise, otu narị na iri anọ na abụọ, bụ ndị sitere okpuru ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ. Onye ji ọkwa ịhụ maka ihe mere eme n’ụlọ ọlụ ahụ, ngalaba ya nke Awka, bụ Maazị Idris Abubarkar mere ka a mara nke a n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Awka nso nso a, bụkwa nke ọ nọrọ na ya wee kọwaa na mmadụ ruru puku iri na asatọ, otu narị na iri anọ na anọ (18,144) bụ ndị ya bụ iju mmiri metụtara n’ụzọ itinye ha n’ọnọdụ ịnọ na mkpa, ebe mmadụ ruru narị iteghete na iri asaa na atọ (973) bụ ndị ọ metụtara site n’itinye ha n’ọnọdụ mmerụ ahụ ma ọ bụ ọrịa. Ọ sị na, site n’ihe ndekọ ha, na ọ bụ n’okpuru ọchịchị Ọgbaru ka a kachara nwee ndị ya bụ ajọ ọnọdụ metụtara, nke ọnụ ọgụgụ ha ruru otu narị puku na iri atọ na otu, otu narị na iri asaa na ise (131, 175), nke ndị na esote ha bụ ndị sitere n’okp

A ga-arụcha ụzọ sịrị Ugwuorie ruo Ezinifite tupuu mmemme Ekeresimeesi – Obianọ

DỊKA oge udummiri kwakọrọgoro ngwóngwó ya pụọ, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ emeela ka a mara na a ga-amalitekwa ọlụ n’okporo ụzọ dịgasị iche iche na steeti ahụ. Gọvanọ Obianọ kwuru nke a oge ọ gara ịmara ka ọlụ si aga na ya bụ okporo ụzọ dị kilomita ise na ụma iri asatọ na atọ bụ nke dị n’Ụkpọr n’okpuru ọchịchị Nnewi South, ma bụrụkwa nke ọ sị na a ga-arụchapụ o pekata mpe, otu kilomita n’ime ya, tupuu oge mmemme ekeresimeesi ahọ a ebìnwuru ọkụ. Ọ kọwara ya bụ ụzọ dịka nke jikọtara ime-ime ógbè na obodo dị iche iche, ma kwuo na ọ bụkwa nke ga-abà oke uru ma ọ bụrụ na a rụchaa ya. Na ntụnye nke ya, dịka o siri gbasò ntụzi aka Gọvanọ Obianọ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọlụ, bụ Maazị Marcel Ifejifọr nyere ndị niile ji ọrụ ngo dị iche iche na steeti ahụ iwu ka ha bukọrọ ngwongwo ha lachigha azụ n’ihu ọrụ ha ozigbo ozigbo ma màlitekwa ọlụ n’ihi na oge udu mmiri agafeela. O kwuru na onye ji ya bụ ọrụ ngo okporpo ụzọ Malinze-Ugwuorie-Ụmụike-Ezinifite gachighara n’ih

Anambra adọtala mba China maka iwulite njem nlegharị anya

ỌCHỊCHỊ steeti Anambra na mbà China ezukọtala ịbụ ọgọ n’ihe gbasaara ịkwàlite njem nlegharị anya. Nzukọta a na nkwekọrịta ‘ịgọ ọgọ’ a bụ nke pụtara ihe site na nkwà mba China kwere iwunye na igùzòbè ụlọ ọgbakọ égwú na steeti ahụ. Ya bụ nkwupụta bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ihe e ji aka eme, ihe na-eme na mba ofesi, omenala na njèm nlegharị anya, bụ Ọkaiwu Sally Mbànefo, n’okwu ya na nzukọ isi ọchịchị steeti ahụ nwere n’Awka nso nso a. Ọ kọwara ya bụ ndọta dịka nke magburu onwe ya, metụsịa aka n’ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-eweta, ọ kachasị dịka o siri metụta ịkwàlite ọnụ ego steeti ahụ na iwulite ọnọdụ mmepe nke steeti ahụ. Kọmishọna Mbanefo gara n’ihu kpọpụtasịa ọtụtụ ihe nrita dị iche iche na onyinye nkwanye ùgwù steeti ahụ nwetara nso nso a, nke gụnyere nturu ugo ahụ Gọvanọ Obianọ nwetara nso nso a dịka gọvanọ kacha akwàlite njem nlegharị anya, bụ nke o nwetara site n’aka ndị nnọrọ onwe; National Council for Arts and Culture’; tinyere ọtụt

Enyela Obianọ nzèré ọzọ maka nchekwa obodo

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ anatala onyinye nkwanye ùgwù ọhụrụ ahụ o nwetara nso nso a dịka gọvanọ kacha eme nke ọma n’atụmatụ nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala anyị, ma kọwaa ya dịka nnukwu ihe mwulite mmụọ na ihe agbam ume iji sị ya jisie ike n’ọrụ. Gọvanọ Obianọ mere ka a mara nke a n’Awka oge ọ natara ya bụ onyinye nkwanye ùgwù site n’aka osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke, bụ onye nọchitere anya ya ụbọchị ụbọchị e mere mmemme inye ya ihe nturu ugo ahụ, bụ nke e mere na Banjul nke mba Gambia. N’okwu ya dịka ọ na-enyefe onyinye nkwanye ùgwù ahụ n’aka gọvanọ, Dọkịta Okeke kọwara na nke ahụ bụ nnọọ ihe ịgba akaebe na mba ụwa na-ahụta ihe dị iche iche Gọvanọ Obianọ na-eme n’iji nwògharị ngalaba niile nke steeti ahụ. O kwuru na ya bụ mmemme weere ọnọdụ kpọmkwem na mba Gambia dọtara ọtụtụ ndị sitere ebe dị iche iche na mba ụwa  wee bịa ụbọchị ahụ, ma bụrụkwa nke aka na-achị steeti Abịa bụ Dọkịta Okezie Ikpeazụ nyere nkuzi na ya, ebe onyeisi ndị uwe ojii na steeti ah

Aka akparala nwoke ji akụkụ ahụ nwatakịrị o gburu gaa ịgwọ ọgwụ ego

AKA akparala otu nwoke aha ya bụ Sunday Onwe bụ onye dị afọ iri na iteghete ka o ji akụkụ ahụ mmadụ dị iche iche wee wụchaa n’ogige ‘Centre for Psychic and Health Administration (CPHA) nke dị n’azụ obi gọọmentị steetị Anambra  n’ Awka. Onwe bụ onye Ezzamgbo, nke dị n’okpuro ọchịchị Ohaukwu na steetị Ebonyi ji ụzọ ụtụtụ ụbọchị Tọọzdee izuụka gara aga wee bịa na CPHA ma jidekwa akụkụ ahụ mmadụ nke gụnyere amụ, mkpisiaka iri na ọbara nke o kwuru na ọ bụ nke nwata nwoke gbara afọ anọ nke o gburu ụbọchị gara aga. Ebenebe gburu ebe ahụ ozugbo n’ihi na onye isi ụlọ ọlụ CPHA bụ Oriakụ Flora Nkemakonam Ilonzo anaghị alụ ụdị ọlụ ọjọọ ahụ. Ya mere, ya bụ odogwu nwanyị tikuru ndị ọlụ nchekwa ka ha bịa jiri anya ha lere ọdụm na ihe ọ dụdụ. Oge a tụrụ ya ịga n’aka na ụkwụ ma kpọgharịa ya n’ogige ebe ahụ ka o mepere ọnụ wee kwuo na ọ bụ otu enyi ya bụ Blessing Eze tụnyere ya atụmatụ ahụ nke mere o ji zolie njem ọjọọ site n’Ebonyi steetị wee bịawa Awka. Onwe kwuru si, ‘Blessing kpọtara m Awka ka m hụ

Anambra ejikerela ịchụpụ ndị ọlụ adịgboroja – Adinuba

OTU na-ebu agha emegide adịgboroja n’ala anyị nke a kpọrọ ‘Anti-Piracy Society of Nigeria’ emeela emume nke ha na-eme afọ ọbụla iji busoo ya bụ arụ agha nke afọ 2018. Isiokwu bụ ‘Envolving Challenges, Innovative Responses’. E mere mmemme a n’ogige ụlọ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra’. Kọmishọna na-ahụ maka mmụta na ịkụzịrị ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma bụ C. Don Adinuba bịara ma nye ha nkwado. O kelere ndị otu ahụ, tinyere ọha mmadụ juru ebe nile. O toro aka na-achị steeti Anambra Gọvanọ Willie Obiano maka ọlụ ọma na nkwado ya tinyere ịkwalite asụsụ na omenala Igbo. O kelere onyeisi ụlọ ọlụ ANPC bụ Sir Chuka Nnabuife maka ịgba mbọ ya nke mere ka ogige ahụ bụrụ ịgba. Kọmishọna Adinuba kọwara na ibu agha megide adịgboroja bụ ọlụ dịịrị onye ọbụna n’ala Nigeria. O kwuru na o kwesịrị ka mmadụ rie ma ọ lusia ọlụ. “Ọtụtụ ndị mmadụ na-etinye ego bipụta akwụkwọ, bipụta egwu na ọtụtụ ihe ndị ọ

Otu na-ebu agha megide adigboroja awụchaala na ANPC

OTU a kpọrọ ‘Anti Piracy Society of Nigeria (APSON)’ wụchara n’ụlọ ọlụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), ndị na-emepụta akwụkwọ akụkọ National Light, Sports Extra na Ka Ọ Dị Taa na Tuzdee, maka ezi mkparịtaụka otu ha ga-esi nyụkọọ mamiri ọnụ ka o wee gbaa ụfụfụ. Otu a bụ ndị na-ebu agha megide adịgboroja, dịka ịlughari aka ọlụ onye ọzọ (piracy) ma na-eri uru dị na ya. Onye isi ndị otu ahụ bụ Frank Uduonu kọwara na njem ha bụ ka ha na ndị ANPC jikọọ aka ọnụ wee lụọ ya bụ agha ka obodo anyị wee dị mma tinyekwara na ha na-akwado ime mmemme n’Awka n’ọnwa a bụ Novemba. Onye isi ụlọ ọlụ (Managing Director) ANPC bụ ‘Sir’ Chuka Nnabife nabatara ha ma jakwaa ha ike n’ihi mbọ ha. Sir Chuka kọwara na ọ dị njọ bụ ụzọ dị iche iche e si egbu aka ọlụ mmadụ site n’ịlụgharị ya. Ọ gara n’ihu gwa ha ka ha gbaa mbọ na-agbasa ozi ha iji mee ka ndị mmadụ mata ebumnuche ha. Ọ kwukwara na mmemme ahụ ha ga-eme bụ ohere ọma ha ga-eji gbaa ozi ha n’anwụ. Mmadụ ise ndị otu ahụ biaranụ aha ha bụ

Onye Nigeria adaala nwụọ ka ọ na-agba bọọlụ na Turkey

NWATA nwoke Nigeria na-agba bọl aha ya bụ Ekundayo Ebenezer Mawoyeka anwụọla ka ọ na-agba bọl ubochi Satọdee na Turkey. Ekundayo, onye gbara afọ iri abụọ na atọ bụ onye na-agbara Saraykoyspor na ‘Super Amateur League’ koropụrụ ma daa ka a gbara bọl nkeji iri atọ na ise n’ama egwuregwu ‘Servegazi Stadium’. Mgbe e buuru ya gaa ụlọọgwụ, ‘Servergazi State Hospital’ ka e kwuru na ọ nwụọla. E kwuru na a kwusịrị ya bụ egwuregwu bọl ozugbo maka ọdachị ahụ. Onye isi ‘Denizli Amateur Sports Clubs’ bụ Feyyaz Cesen kwuru na ọnwụ nwata nwoke ahụ bụ ihe nwute n’ebe ha nọ.

Agwala ndị na-ekpo aja n'Oko ka ha kwụsi

GỌỌMENTI steeti Anambra adọọla ndị niile na-ekpo aja n’ụzọ ezighị ezi n’Oko dị n’okpuru ọchịchị Orumba South aka na ntị ka ha were ọsọ were ije sepu aka na nke ahụ kpam kpam tupuu ihe mere nwaafọ eme ha n’ụla eke. Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka gburugburu, ihu igwe na ịchọ gburugburu mma, bụ Maazị Mike Okonkwọ nyere ndụmọdụ a n’ụlọ ọlụ ya dị n’Awka oge ndị isi ọchịchị otu jikọtara ụmụnwaanyị Oko gara kpọtụrụ ya n’ihe gbasaara ọnọdụ gburugburu obodo, dịka o siri metụta mbize na ikpo aja. O kwuru na ụbara ala steeti Anambra ebughị ibu nke otu ahụ, tinyekwuziere na mbize dị n’ọtụtụ ebe dị iche iche emekwuola ya ka ọ kawanye njọ, nke pụtara na mmadụ ikpo aja n’ebe ma ọ bụ n’ụzọ ezighị ezi n’obodo ọbụla na steeti ahụ bụ nke jọgburu onwe ya ma bụrụkwa onye ahụ ịchọ gọọmenti steeti ahụ okwu, maka na ọ bụ ihe dị otu ahụ na-eme ka mbize na-abasàwanye ma mekwa ka ọnọdụ gburugburu kawanye njọ. Kọmishọna Okonkwọ mere ka a mara na ya agaala Oko ahụ wee hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ, nke mezịrị ka

Ndị 'Knight' St. Mulumba eletala ndị iju mmiri chụpụrụ n'Ọgbaru

DỊKA a sị na òméré onye bụ òméré chi ya, ndị ‘Knight’ nke St. Mulumbà agaala leta ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha n’ebe dị iche iche n’okpuru ọchịchị Ọgbaru nke steeti Anambra. Nleta ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’isi mmàlite izuụka a n’ọtụtụ ogige ebe dị iche iche a na-atụkọtara ndị iju mmiri chụpụrụ na be ha ihe, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee bunye ndị ahụ ọtụtụ ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị iche iche e ji enyere ndụ aka, nke gụnyere akpa osikapa, ákwà, ji, mmanụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’okwu ya dịka ọ na-ahafè ihe ndị ahụ n’aka ndị nlekọta ogige ndị ahụ, n’aha ndị òtù ahụ, otu nnukwu nna nke òtù ahụ, bụ  Dọkịta Gabby Nwankwọ, kọwara na ha nwere mmetụta n’ọnọdụ na ihe ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ be ha na-agabiga, bụzị nke mere ha jiri sị ka ha bịaruo abịaruo maka na nleta ka mkpesa. O toro mbọ niile aka na-achị steeti ahụ, bụ gọvanọ Willie Obianọ, ọtụtụ mmadụ, ndị òtù na ụlọ ọlụ dị iche iche gbàgòrò iji bèlata ihe nhịa ahụ ndị ahụ na-agabiga na ime ka ọnọdụ kawanyere ha mma, ma kpekwazie

ANPC amalitela inye ndị ọlụ ọzụzụ maka ịgbasa ozi n'ịnteneti

Image
ỤLỌ ỌLỤ Anambra Newspaper and Printing Corporation, bụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra amalitela inye ndị ọlụ ya nkuzi na ọzụzụ pụrụ iche n’usoro mgbasa ozi ọgbara ọhụụ. Ya bụ ọzụzụ bụ nke ga-ewe mkpụrụ ụbọchị atọ ma bụrụkwa nke ga-akụrụ ọnụ echi bụ Frayịdee. N’okwu ya na nkenke ọgbakọ a chịkọbara iji gbapee amụmà inye ọzụzụ ahụ, onyeisi ụlọ ọlụ ahụ, bụ Maazị Chuka Nnabụife, kọwara nke ahụ dịka otu n’ime atụmatụ dị iche iche e ji n’aka ugbu a iji nwògharịa ya bụ ụlọ ọlụ ka ọ bụrụzie eji ama atụ. O mere ka a mara na ihe na-ewuzị ugbu a na ngalaba mgbasa ozi bụ usoro dijitaalụ, bụ ụzọ ọgbara ọhụụ e si agbasazị ozi ugbu a, ma kọwaa na ụlọ ọlụ ọbụla na-esonyeghị ma ọ bụ banye na nke ahụ ozigbo ozigbo, ị mara na ahịa èkpùdola ya, maka na ọ gaghị achịtazị aja na ngalaba ahụ ọzọ, dịka o siri metụta urù ahịa. Maazị Nnabụife mekwazịrị ka a mara na ụlọ ọlụ ọbụla apụghị ito ma ọ bụrụ na ndị na-alụ na ya etoghị, bụzị nke mere e jiri chepụta ma hazie

Nigeria amalite ibugara ndị Mexico ihe ọñụñụ zobo

NDỊ Nigeria ga-amalitekwa ibugara ndị Mexico akwụkwọ ‘hibiscus’ nke a maara dịka zobo. Ọ bụ Dr Vincent Isegbe, onye isi; ‘Coordinating Director, The Nigeria Agricultural Quarantine Service (NAQS)’ bụ onye kwuputara nke a na mkparịtaụka nke ya na ndị ‘News Agency of Nigeria’ nwere n’Abuja. O kwuru si na n’afọ 2017 ndị Nigeria bugaara Mexico akpati kontena zobo dị 1,983 ma nweta nde dollar iri atọ na is ($35million) n’ime ọnwa iteghete afọ ahụ. Ọ gakwara n’ihu kwuo na NAQS ka kwụsiburu ibupu ya n’ihi na a chọpụtara ụfọdụ ihe ndị na-atapịa ihe e chekwara echekwa na ya bụ ibu si Nigeria. O kwuru si; “ka ọ dị ugbua, elebago ya bụ nsogbu anya. Ọ  bụ ya ka anyị ji amalitekwa ibupu ya ọzọ.” Ọ kọwara na Nigeria dị njikere ị malite ibugara ndị Mexico akwụkwọ zobo. Ọzọ dịka ibe ya wee bụrụ na nke a bụ ohere ọma iji kwalite akụ na ụba Nigeria. Isegbe kpọkuru ndị ọlụ ugbo ka ha tinye uchu n’ikọpụta zobo iji wee kwalite akụ na ụba ha.

Ochanya Ogbanje: Ọnwụ obere nwata nwaanyị a e metọrọ bunye ọya akpasuela ndị Benue iwe

IGWE mmadụ ọnụma juru obi na-egosipụta iwe ha site n’ime ngaghari ịwe maka onwụ nwata nwanyị gbara afọ iri na atọ bụ Ochanya Elizabeth Ogbanje, bụ onye zutere ọnwụ ya n’oge erughị eru n’ihi mmetọ na ndakpo nke si n’aka otu nwoke aha ya bụ Andrew Ogbuja na nwa ya nwoke, Victor. Ochanya Ogbanje,onye e liri ozu ya abali ole na ole gara aga bụ nwata akwụkwọ na Federal Government Girl’s College, Ugbokolo na Steeti Benue. Ọ bụ mgbe ọ dị afọ asato ka e bidọrọ na-emetọ ya ma na-akwa ya ịkọ n’ike aghara aghara nke kpataara ya ọrịa ojọọ nke a kpọrọ ‘Vesico-vaginal fistula (VVW) ka ọ gbara afọ ịrị na atọ. Ndị mere arụ ahụ bụ Andrew Oguja, onye nkuzi dị afọ iri ise  ji okwa dika onye isi ngalaba ihe omumụ ‘Catering and Hotel Management, Benue State Polytechnic’, ma bụrụkwa onye agha nke okwukwe ‘knight’ n’ụka Katolic na nwa ya nwoke bụ Victor, onye nọ n’afọ nke ikpeazụ na ‘Federal University of Agriculture, Makurdi. Dịka nwata nwayị ahụ lara mmụọ si kwu, ọ bụ Victor bụ onye mbụ metọrọ ya, ma mgbe

E butela ozu mmadụ abụọ idè mmiri gbàgbùrù n'obosi

DỊKA a sị na chi na-abọ, ihe ọma na ihe ọjọọ ana-abọ, ndị uwe ojii na mpaghara Obosi nke steeti Anambra ahụla ma bute mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ide mmiri gbàgbùrù na mpaghara Odume nke Obosi dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti ahụ. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Garba Umar, bụ nke ọ nọrọ na ya wee kọọ na a hụrụ mmadụ abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị ka ha tọgbọ na mpaghara Odume ahụ, nke mezịrị ndị ọlụ uwe ojii na mpaghara Obosi ahụ jiri gbara gaba ebe ahụ ozigbo ozigbo. Dịka o siri kwuo, ngwa ngwa ahụ, ha buuru mmadụ abụọ ahụ gaba n’ụlọ ahụike ‘Unity Hospital’, bụzị ebe dọkịta nọ wee lelechaa ha ahụ, ma fechaa isi, sị na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya. O kwuru na site n’obere nnyocha e megoro, na a achọpụtara na ọ ga-abụ idè mmiri gbàgbùrù ndị ahụ n’ihi oke mmiri ozuzo ahụ  kwọsịrị n’ebe ahụ ụbọchị Satọdee, bụkwa nke gbara oke ide mere mkpamkpa na mpaghara ebe ahụ niile ụbọchị ahụ. Maazị Ụmar jizịkwara ohere ahụ kpọk

Aka otu nwoke atọla n'ime ùdù mmanụ ụgbọala ebe ọ gara ohi n'Awka

NJINJI jiri n’Umudioka Awka nke dị n’okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra na Tọzdee izuụka gara aga ebe aka otu nwoke tọrọ n’ime tankị mmanụ ụgbọala ebe ọ gara ohi mmanụ ‘diesel’. Nwoke ahụ, aha ya bụ Anayo Igwendu, ma bụrụ onye gbara afọ iri abụọ na isii bụ onye steetị Enugu. Ọ bụ n’elekere nke abụọ ụzọ ụtụtụ (2am) ka ọ gara n’ebe ụgbọala ahụ dị wee malite iku mmanụ ụgbọala. Otu onye ọnọ ka o mere kwuru na ọ bụ mgbe o kutechara mmanụ ma chọzia ka o were ihe ‘foam’ hichatachaa mmanụ ahụ nke ọma ka aka ya ji tọkiri n’ime tankị ahụ. Mgbe ọ nwara oko ya ka o wepụta aka ya ma okweghị ya ka o jiri gbaa onwe ya ama site n’itiku ọha na eze ka ha bịa zọpụta ya. Ọ gara n’ihu kwuo wee sị; “Anyị nụrụ mkpu ọ na-eti wee gbara bịa wee hụ ebe eke na ihe o loro wụsa. Otu onye n’ime anyị wetere akọrọngwa e ji alu ụdị ọlụ ahụ ‘chisel’ nke anyị ji wee bepụta tankị ahụ n’ụgbọala, nke mere ka o buru aka ya na akụkụ tankị ụfọdụ na-agagharị.” E mechaara kpọrọ onye ohi ahụ gaa n’ụlọ ezumezu obodo ahụ e

Anambra ewubela amụmà nchekwa obodo maka ọnwa 'mber’

STEETI Anambra eguzobela amụma ọlụ nchekwa pụrụ iche maka ọnwa ‘mber’ iji hụ na e nwere nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ n’ime ọnwa ‘mber’ a nọ n’ime ya. Mmemme igùzòbe ya bụ amụma ọlụ nchekwa bụ nke  weere ọnọdụ ụbọchị Mọndè, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu na ngalaba ọlụ nchekwa na steeti ahụ. N’okwu ya, dịka ọ na-egùzobe amụmà ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara na ebumnobi nkè ahụ bụ iji wèta ezi nchekwa na gburugburu niile nke steeti ahụ, site na ngagharị ndị ọlụ nchekwa n’ebe dị iche iche oge ọbụla, inyochasị ihe na ebe kwesiri na ebe dị àñaa, ma na-etinyekwa atụmatụ ọlụ nchekwa dị iche iche n’ọlụ, ọ kachasị ugbu a oge ekeresimeesi na-akpụdòbe nso. O mere ka a mara na ọchịchị ya amalitela itinyesi akụrụngwa nchekwa bụ CCTV karịrị puku iri ise n’ọnụ ọgụgụ n’ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti ahụ, nke a ga na-eleru anya site n’aka ndị ọkachamara, bụkwa nke ga-enye aka inyòpù na igbòchi mpụ na arụrụ ala. Ọ kpọkuzịrị ụmụafọ steeti

Ugo Taa

Image

Ụlọ akwụkwọ Igwebuike agbaala afọ iri isii

N’IHI na a sị na ụsụ gbara afọ abụghịzị nwa ụsụ, ụlọ akwụkwọ ‘Igwebuike Grammar School’ dị n’Awka emeela mmemme ọgbụgba afọ isii o jiri màlite. Nnukwu mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche gụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ ndị bịara isonyere ya bụ ụlọ akwụkwọ wee ñụrịa nakwa igosipụta nguzosi ike ha n’inye ya bụ ụlọ akwụkwọ nkwàdo. Dịka ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị gụbụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ ndị a maara dịka ‘Old Boys Association’, bụ Maazị Emmanuel Nwobu, kọwara mmemme ahụ dịka oge ịñụrị ọñụ na oge mbịakọta ọnụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka n’ịkwalite mmekọrịta ha na ụlọ akwụkwọ ahụ n’ụzọ ga-eweta ezi ọdịmma nke ụlọ akwụkwọ ahụ ma mekwa ka ùgwù ya ahụ e jiri mara ndị gụrụ ebe ahụ n’oge mbụ guzosikwa ike n’ebe ndị na-agụ ebe ahụ ugbu a nọ. Ọ kpọrọ oku maka enyemaka gọọmenti n’ụfọdụ mkpa dị iche iche ụlọ akwụkwọ ahụ nọ na ya, nke gụnyere ịgba ogige na enweg

Ụmụnwaanyị Oko ebekuela gọọmentị maka ndị na-ekpo aja n'obodo ahụ

DỊKA a sị na onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; ụmụnwaanyị obodo Oko dị n’okpuru ọchịchị Orumba North nke steeti Anambra ehorola ntùtù taa, sị na ha ga-akwapụ n’obodo ahụ kpamkpam ma ọ bụrụ na gọọmenti na ndị ọchịchị  amàchighị ikpo aja ahụ a na-ekpo na mpaghara ahụ ma ọ bụ nwụchikọọ ndị niile na-ekpo ya bụ aja. Nke a bụ nke ụmụnwaanyị a mere ka a mara site na ngagharị iwe ha mere n’obodo ahụ nso nso a, bụ nke ha nọrọ na ya wee kpọọ ganị ganị n’ụdị dị iche iche wee katọọ ma megide ya bụ ikpo aja na-ewu èwù a na-ekpo n’obodo ahụ. Ya bụ ngagharị iwe bụ nke ha nọ na ya wee gụọ ọtụtụ egwu dị iche iche megide ya bụ okwu a kpụ n’ọnụ, ebe ụfọdụ n’ime ha bugasịkwa akwụkwọ e dere ihe dị iche iche, dịka “Kwụsị nụ Ikpo Aja n’Obodo Ayị”, “Ụmụ Anyị Enweghịzị Ebe Ha Ga-Ebi” “Ikpo Aja na Idè Emebichaala Ala Oko”, “Ikpo Aja Emeela Ka Ala Dị Oke Ọnụ Ahịa n’Oko”, “Ala Adịghịzị n’Oko” tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e degasịrị n’akwụkwọ ha bù. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, onye ndu ụmụnwaa

Asompi ukwe e mere n'Amichi abiala na njedebe

ASOMPI onye bụ ọka ibe n’abụ, nke a kpọrọ ‘I Can Sing Gospel Music Talent Hunt 2018’ a biala n’isi njedebe. E mere nke a na ‘Cathedral Church of St Andrews, Amichi,’ nke dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South na steeti Anambra; ebe nwata nwoke gbara afọ iri na atọ, aha ya bụ Udochukwu Okereke tuuru ugo ma rite ihe onyinye mara abụba. Udochukwu bụ onye Ndikelionwu ma nọrọ na ogo akwụkwọ sekọndịrị nta ‘JSS 2’ n’ụlọakwụkwọ ‘Union Secondary School, Ufube, Amichi. Onye sotere ya bụ Okonkwo Onyebuchi, ebe onye nke atọ bụ Decency Ifeanyi Umeokoli, onye Igboukwu, okpuro ọchịchị Aguata. Ifeanyi bụ nwa akwụkwọ na-agụ maka ikpe na ‘National Open University’. Obere nwaada dị afọ iteghete aha ya bụ Nzubechukwu nọkwa na mmemme a rite elele ịgụ akwụkwọ n’efu n’ihi ịgba mbọ ya. Onye isi oche mmemme ahụ, onye jibu ọkwa dịka onye isi oche ‘Transition Committee Chairman, Orumba North,’ Emeka Aforka, gosipụtara afọ ojuju o nwere n’ebe ndị ukwe ahụ nọ. O tokwara ndi tuuru ugo na mmemme ahụ n’afọ 2016 na 2017 bụ C

ANPC amalitela ọmụmụ ihe gbasara ịgbakọ ego ndị lagoro ezumike

ONYE isi ụlọ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’ bụ Sir Chuka Nnabuife, ndị isi ngalaba ọlụ, enyemaka gọvanọ na ANPC bụ Fanny Oguine nakwa ụfọdụ ndị ọlụ nọ na nso nso a mee  mmemme iguzobe ngalaba ọgbakọ ọmụmụ ihe na nkuzi gbasara otu e si alụ ego ma mmadụ laba ezumike nka n’ọlụ oyibo. Onye isi ụlọọlụ a bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife kwuru n’ọgbakọ ahụ bụ maka ọzụzụ na nkuzi nye ụfọdụ ndị ọlụ ANPC, otu ha ga-esi na alụ ego ndị na-ala ezumike nka. Ọ gara n’ihu kwuo n’ọzụzụ a ga-ewe otu ọnwa. O kwuru na Gọvanọ Willie Obiano wepụtara akatamkpo ego iji kwado ndị ọlụ ANPC na ABS lagworo ezumike ọlụ kemgbe ọtụtụ afọ. “Nsogbu anyị nwere ugbua bụ otu a ga-esi kwụba ndị nile lagworo ezumike nka ụgwọ. Anyị erugo ogo ịma otu a ga-esi na-alụ ego ndị a lagoro ezumike ọlụ, marakwa ego ole a ga-akwụ onye ọbụla mana anyị enweghị ndị maara ka a ga-esi lụọ ma gbakọkwa ihe onye ọbụla dịka ogogo ya si dị. Ndị e nyere ọzụzụ maka ịgbakọ na ịlụ ego dị otu a enyefenwughị ọzụzụ ahụ n’aka ndị ọzọ

Ọrịa kánsà: A dụọla ụmụnwaanyị ka ha na-eleta ara ha oge ọbụla

A KỌWAALA mmadụ inyocha ara ya na akụkụ ahụ ya ndị ọzọ nke ọma na oge ọbụla dịka ụzọ pụtakarịchara ìhè a pụrụ isi gbochie ọrịa nrechasị ahụ bụ ọrịa kansa ka ọ ghara ịgbasàwànyè. Nke a bụ nke e mere ka a mara n’ọgbakọ nkuzi otu ụbọchị a chịkọbara maka ụmụ agbọghọ na ụmụ akwụkwọ ụmụnwaanyị, bụ nke a kpọrọ “Onyebuchi Chris Ifediora Foundation Health Symposium”, agba nke abụọ ya, bụkwa nke weere ọnọdụ n’ụlọ akwụkwọ ‘Stella Maris Secondary School’ dị n’Umueri ,n’okpuru ọchịchị Anambra East nke steeti Anambra. Ya bụ ọgbakọ nkụzi, nke isi okwu ya gbakwasara ụkwụ n’igbòchi ọrịa nrechasị ahụ bụ kansa, dọtara ụmụakwụkwọ nọ n’ogo dị elu site n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị niile nke gọọmenti dị na mpaghara Otuọcha, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tọsàá ma kọwasịara ha ihe dị iche iche iche mmadụ kwesiri ịma banyere ọrịa nrechasị ahụ, ihe na-akpata ya, otu e si ama ya, na otu a pụrụ isi gbanarị ya. N’okwu ya n’ogbakọ nkuzi ahụ, nwunye aka na-achị steeti ahụ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ, nke onye nọchiter

Ọkụ agbagwòóla ụgbọala iri na iteghete n'Obosi

ANYAMMIRI tasịrị nnọọ n’Awada dị n’Obosi na steeti Anambra ụbọchị Frayịdee gara aga, dịka ọkụ ọgbụgba binwuuru n’otu ebe a na-edozi ụgbọala na mpaghara ahụ wee gbarikọọ ụgbọala ruru iri na iteghete n’ọnụ ọgụgụ. Ya bụ mkpamkpa bụ nke e kwuru na ọ malitere n’elekere abụọ nke ime abalị ma bụrụ nke a chọpụtabèghị ihe kpatara ya, ruo ugbu a, na-agbanyeghị na ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ọkụ latiriiki kpatara ya. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ bànyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed kwuru na ya bụ ọkụ metụtara ụgbọala ruru iri na iteghete n’ọnụ ọgụgụ, bụ nke ọtụtụ n’ime ha gbara pịataa, ebe ụfọdụ ndị ọzọ nwechara àpà ọkụ. Ọ sị na e mechaara menyụsịa ya bụ ọkụ site n’aka ndị bi n’okirirkiri Amanatọr Awada ahụ, bụ ebe ya bụ ihe nọrọ wee mee, ma sịkwazie na ndị ọlụ uwe ojii na mpaghara ebe ahụ gbaara gaba ebe ahụ ozigbo iji wee chekwaa ebe ahụ, tupu ụfọdụ ndị arụrụ ala amalite ịchọ ka ha ga-esi rita uru n’ajọ ọnọdụ ahụ. O kwuru na ya b

Ide mmiri agbagbuola nwata nwoke ọzọ n'Anambra

IDE mmiri eriela nwata nwoke gbara afọ iri abụọ n’Ogbetiti Odoekpe dị n’okpulo ọchịchị Ogbaru, nke aha ya bụ Ifejika Umuiza. Onyeisioche ‘Transition Committee’ nke okpuru ọchịchị Ogbaru, Arinzechukwu Awogu, kwupụtara nkea n’Awka na Tuzdee. Awogu kwuru na mmiri buuru Ifejika tunye ya n’ime nnukwu ọdọ mmiri nke dị n’akụkụ ezinaụlọ ha nke dị n’Ochuche Umuodu, Ogbetiti Odaekpe, ebe ha bi. Ya bụ onyeisioche kwuru na ya na ndị ọzọ gọọmentị họpụtara akpọtụrụla ezinaụlọ ahụ ma tie ha aka n’obi maka ya bụ ọdachi. O wutere ya na ha atufuola ọtụtụ ndụ n’ebe ahụ maka ide mmiri. Ọ gara n’ihu kwuo na ọnụọgụ ndị tufuru ndụ ha n’ọnọdụ ahụ dịzi iri na otu. O kwuru si, “mmiri riri Ifejika n’akụkụ ezinaụlọ ya ebe ide mmiri dị n’azụ ụlọ ha buuru ya tunye n’ime ọdọ mmiri dị ebe ahụ. Nke a mere n’Ochuche Umuodu. “Ọnwụ Ifejika wetara ọnụọgụ ndị mmiri rigworo kemgbe afọ 2018 nsogbu a bidoro n’ogo iri na otu.”

Ụmụnwanyị Delta emeela ngagharị iwe maka ndakpo ndị na-achi ehi na-adakpo ha n'ike

ỤZỌ agaghị ụbọchị Monde,abalị atọ gara aga n’okpuru ọchịchị Ughelli South nke steeti Delta dịka ụmụnwanyị mere ngagharị iwe maka ndakpo nke ndị e chere na ha bụ ndị na-achị  ehi na-aga n’ihu na-adakpo ha n’ike oge nile. Ụmụnwanyị ndị a bụ ndị Ewu-Urhobo, pụtara n’igwe n’ụzọ ụtụtụ ebe elekere nke ise wee na-agụ egwu ma na-agagharị nke mere ka ndị ji ụgbọala eme njem nọdụ n’aga aga, ala ala. Ha na-agụ egwu dịka: “Anyị agaghị ekwe, Fulani ga-alarịrị, ike agwụla anyị ebe ndị Fulani ji adakpo anyị ganye n’ọnwụ. Ha gakwara n’ihu kwuo na ndị Fulani akpakọrọla ala ubi ha. Onye isi ụmụnwanyị ahụ bụ Oriaku Queen Dieseruvwe, kwuru sị, “Anyị na-eme ngagharị iwe megide ndị Fulani na-achi ehi bụ ndị na-adakpo umunwanyị anyị n’ike n’ubi , ma na-echebirikwa ndị na-aga ahịa na ndi na-aga mọọbụ na-alọta n’ubi. Ha na-adakpo ha, ndi nwara anwa jụ, ha na-egbu ha mma. “Ndị Fulani na-achi ehi na-aga n’ubi anyị, bụpụta akpụ anyị ma laa ya n’iyi; ma rue mgbe ndị Fulani chịịrị ehi ha hapụ obodo anyị, anyị agagh

Ndị ọlụ ahụike si India ebunyela ulọ ọgwụ COOU ọtụtụ akụrụngwa ọlụ

NDỊ òtù ahụ ike nke mbà India, n’okpuru Rotary International, District 3170 ebunyela ụlọ nkuzi ahụ ike nke mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n’Awka ọtụtụ akụrụngwa e ji alụ ọlụ ahụ ike dị iche iche, bụkwa nke ọnụ ego ya ruru ndé kwùrú ndé naịra. Onyinye afọ òfùfò a bụ nke e nyere n’isi ngwụcha izù ụka gara aga, ma bụrụkwa ótù n’ime atụmatụ ọlụ ahụ ike ndị òtù ahụ ji n’aka na steeti ahụ ugbu a, bụ nke mmadụ ruru nàrị atọ n’ọnụ ọgụgụ sitere na ya wee na-anarakwa ọgwụgwọ n’efu ugbu a. Ihe ndị ahụ e butere gụnyèrè igwè e ji enyòcha ahụ, nkè e ji adọ ma ọ bụ na-amịsịsị ihe ezighị ezi n’ahụ mmadụ, tinyere ọtụtụ akụrụngwa ndị ọzọ. N’okwu ya dịka ọ na-enyefè ihe ndị ahụ, onye duru ndị òtù ahụ wee bịa ya bụ ijè, bụ Dọkịta Jorson Fernandes, kọwara nke ahụ dịka ótù n’ime ntụnye nke ndị otu ahụ nà atụmatụ ha ji n’aka iji kwàlite ezi ọnọdụ ahụ ike ụmụ mmadụ. O mere ka a mara na òtù ahụ bụ ‘Rotary International’ nwèrè ụzọ isii pụtakarịchara ìhè ha si agbata ọsọ enyemaka na mba ụwa na ngàlàba dị

Aka akparala nwoke kwasara nwamba iko n'ike na South Africa

OTU nwoke ka e jidere ebe ọ na-adakpo nwa ologbo (cat) onye agbataobi ya na South Africa. Onye nwe nwamba ahụ chọpụtara nke a ka ọ nụrụ ebe nwamba ya na-eti mkpu na-ebe akwa, nke mere na ọ chọrọ ya n’ụlọ onye agbataobi ya wee hụ ka o na-akwasa ya iko n’ike. Onye okwupụta okwu otu ndị ọlụ nchekwa nnọọrọ onwe ‘Reaction Unit South Africa’ bụ Prem Balram, onye ndị ọlụ ha zara ya bụ oku kwuru na nwoke ahụ na-agba mbọ iyinye akwa ya oge ndị ọlụ ha bịara. O kwuru si “Ndị ọlụ nchekwa batara n’ụlọ ahụ ma jide nwoke ahụ ka ọ na-eyinye akwa ya,ebe ajị nwamba jupụtara n’ọbante (pant) ya. A kpọpụrụ nwoke ahụ na ya bụ ebe n’ihi mkpesa ndị agbataobi nyere maka ọdị mma nke ụmụ ha.” Ọ gakwara n’ihu kwuo na adịla na mbụ jide nwoke ahụ ebe ọ na-akwasa nkịta na ụmụ nwamba iko n’oge gara aga mana e meghị mkpesa obala n’aka ndị ọ dị n’aka n’ihi arịrịọ enyi ya nwaanyị rịọrọ.    

Ejidela onye Uweojii gbara onye ọkwọ ụgbọala egbe n'Anambra

AKA akparala otu onye uweojii maka ikpachara anya gbaa otu onye ọkwọ ụgbọala bọọsụ egbe maka na  ọ jụrụ inye ya ngarị naịra iri ise. Njinji a jiri n’Isuaniocha, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka North na steeti Anambra. Ọkwọ ụgbọala ahụ bụ Udoka Ezeme, ka e kwuru na a gbara ya egbe ahụ n’ihe dịka elekere mbụ na okara (1:30pm) nke ehihie n’ebe ndị uweojii na-anọ n’ebe ahụ, mgbe o si Mgbakwu buru ndị mmadụ na-aga ‘UNIZIK Tempsite’ dị n’Awka. Onye ọnọ ka omere, ma bụrụkwa onye achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na a gbara ya egbe ahụ ozigbo ọ kwụsichara n’akụkụ ụzọ ịza ha ajụjụ kama inye ha naira iri ise. O kwuru si; “ozigbo nke a mere, ndị uweojii ahụ mabanyere n’ime ụgbọala ‘Hilux truck’ ha, rie mbọmbọ ọsọ ma hapụ ya bụ nwoke n’ọdọ ọbara ya.” Ka ndị mmadụ buuru ya gaa ụlọọgwụ, a jụrụ ịnabata ya n’ihi na ndị ụlọọgwụ chọrọ akwụkwọ ikike nke ndị uweojii. Nke a mere ka ndị mmadụ wee iwe. Ezeme sitere n’akwa ụlọọgwụ  kwuo okwu wee sị na ya emeghị mgbagha ọbụna n’ebe ndị uweojii nọ nke ga-ebute ịgba y