Posts
Showing posts from October, 2018
E nyela Igwe ọhụrụ abụọ akwụkwọ ikike n'Anambra
- Get link
- Other Apps
AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ enyela igwe abụọ a họpụtara ọhụụ asambodo na steeti ahụ iji wee malite ọlụ ozigbo dịka eze ọdịnala obodo ha dị iche iche. Mmemme inye asambodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị e ji okwu ha àgbá ìzù na steeti, ndị obodo eze ọdịnala abụọ ahụ, nke dịgbàdò n’okpuru ọchịchị Ọgbaru, tinyere ndị enyi na ndị na-echere ha ezi echiche. N’okwu ya dịka ọ na-enye ha àsàmbódò ahụ, Gọvanọ Obianọ tụụrụ ndị eze ọdịnala abụọ ahụ mmamma, bụ Igwe Fidelis Nsọfọr nke obodo Ụmụnankwọ na Igwe Lawrence Ọgụgụọ nke obodo Akịlị ọzịzọ, maka ịbụ ndị a hụtara dịka ndị tozùrú òkè idu obodo abụọ ahụ, ma kọwaa nhọpụta ahụ dịka nke a tụrụ anya na ọ ga-ewèta udo tọrọ àtọ n’ime obodo ha. Ọ kọwaara ha bụ ndị eze ọdịnala mkpa ọ dị ịdị na-atụpụta atụmatụ dị iche iche maka ịkwàdò na ịkwàlìtè ndị ntorobịa n’obodo ha iji wee nyere ọchịchị steeti ahụ aka n’ezi mbọ ahụ ọ na-agba ugbu a iji hụ na onye ntorobịa ọbụla na steeti
Bishọọpụ Ibezim akwọọla ndị nga aka n'isi
- Get link
- Other Apps
DỊKA otu ụzọ n’iburu oziọma gamie n’ebe dị iche iche, bishọọpụ ụka Anglịkan na dayọsiisi Awka, bụ ‘Rt. Rev.’ Alexander Chibuzọ Ibezim emeela njèm ọzụzụ atụrụ n’ụlọ mkpọrọ ala anyị dị n’Awka. Ya bụ njèm oziọma bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ekpere ‘Chapel of Compassionate’ dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nwee òfùfè nrò pụrụ iche, nke e sitere na ya wee kwọọ mmadụ iri atọ na ise aka n’isi, bụ ndị a tụrụ nga n’ụlọ mkpọrọ ahụ. N’okwuchukwu ya n’ofùfè nrò ahụ, Bishọọpụ Ibezim kọwara mmadụ ịbịakutè Chineke dị ka ụzọ pụtakarịchara ìhè e si enweta mnwere onwe na nzọpụta. O chetaara ha na ike dị n’ekpere, bụ nke Paul n’ime akwụkwọ nsọ na onye òtù ya bụ Banabas siri na ya wee nweta mmeri n’ime ụlọ mkpọrọ, dịka ọ dị n’akwụkwọ nsọ. Bishọọpụ Ibezim gara n’ihu kpọkuo ha ka ha makụọ Chineke, ọ bụnadị dịka ọdụrụ ha ka ha ghara ịhụta ọnụnọ ha n’ụlọ mkpọrọ ahụ dịka ihe igbú mmụọ, kama ka ha hụta ya dịka oge iji nwògharịa ha ma kụnyekwa echiche ọhụụ n’ime ndụ ha. Ọ dụzịrị ha ka ha bịaruo Ch
Uru agụmagụ ọdịnala bara
- Get link
- Other Apps
AGỤMAGỤ ọdịnala bụ agụmagụ si n’aka fere aka. Ọ bụ agụmagụ dị ọkpụ nke si n’aka nna nna anyị ha wee rute anyị aka. Ọ na-esi n’otu ọgbọ gafere n’ọgbọ ọzọ. O nweghị otu onye a ga-asi na ọ bụ ya nwe udị agụmagụ ọdịnala ọbụla n’ihi na mgbe e chepụtara ha, edeghị ya ede. Agụmagụ ọdịnala dịka anyị maara gụnyere akụkọ ifo, ilu, agwụgwa, akpaalaokwu, w.d.g. N’ihi na edeghị ya ede oge e chepụtara ya, ọ na-enwe mgbanwe. Ọ na-enwe ntinye ma ọ bụ nwepụ n’ebe ụfọdụ. Iji maa atụ, ọtụtụ akụko ifo na-abụ otu mana otu e si akọ ha na-adị iche iche. Ihe kpatara nkea bụ n’ihi na ebe ọ bụ site n’ọnụ fere n’ọnụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-eme ntinye ma ọ bụ mwepụ na ha. Agụmagụ ọdịnala na-ebu ndị a na-ewepụtara ya n’obi. Iji maa atụ, n’ihi akụkọ ifo bụ maka ụmụaka kpọmkwem, asụsụ e ji akọ ya na-adị mfe; agwa ndị na-abata na ya na-adị olemole. A bịa n’egwu mọọbụ abụ, a na-ebupụtara ọhaneze, tụmadi ndị katarala ahụ, mgbe ụfọdụ ọ na-ebu ὶkpè nke ilu na ụkabụilu na-ejupụta na ya. N’oge mbụ, anaghị ede agụmagụ ọdịnala e
Shọnekan anwụbeghị –Gọọmenti Ogun
- Get link
- Other Apps
DỊKA a sị na ọ na-abụ àsịrị fo chi, o yie ezi okwu, gọọmenti steeti Ogun akagbuola kpamkpam, asịrị ahụ na-efegharị ugbu a na nwa amadi ahụ chịbụrụ ala Nigeria n’oge gara aga, bụ Ernest Shonekan anwụọla, ma kọwaa nke ahụ dịka asị ọcha na akụkọ ndị ọnọ n’ụlọ mara ihe zụrụ n’ahịa. Akụkọ bànyere ọnwụ nwa amadi ahụ bụ nke malitere wusàba nso nso a n’usoro mgbasa ozi, ma bụrụ nke kọwara na ya bụ nwoke gbara afọ iri asatọ na abụọ nwụrụ ka ọ rịachara obere ahụ. Ozi e nwetara na-akọwa na n’ihi asịrị ahụ, na isi ọchịchị steeti ahụ akpọtụrụla isi ụlọ otu jikọtara ndị mgbasa ozi bụ N.U.J. iji gwa ha na nwa amadi ahụ dị ndụ, na ọ nwụghị anwụ ọbụla dịka ndị ahụ eziokwu gwụgoro n’ọnụ si akọsasị Ha kpọkuzịkwara ndị nta akụkọ na ndị ọzọ na-efesàsị akụkọ ahụ, ka ha sepụ ọnụ na asịrị ahụ ma were oge ha mere ihe, tupu mmadụ arahụọ ebe o kwesighị ịrahụ.
A na-akpọrịrị oku ka a tọhapu Leah Sharibu
- Get link
- Other Apps
ONYE jibu ọkwa dịka onye isi oche ndị bịshọọpụ ụka Katolik na Nigeria ‘Catholic Bishop’s Conference of Nigeria (CBCN)’, bụ Achịbishọọpụ Ignatius Kaigama, arịọla ndị Boko Haram ka ha tọhapụ ndị nile ha ji nke gụnyere Leah Sharibu. Gbasara ogbugbu e gburu onye ọlụ enyemaka ọzọ nke ICRC site n’aka otu ọjọọ ahụ bụ Boko Haram, ya bụ Achịbịshọọpụ nke dayọsis Jos kwuru na ọ gbagwojuru anya ihe otu ahụ ji aga n’ihu ịla ndị mmadụ n’iyi. Ọ gara n’ihu kwuo na ọbụghị uche Chineke mmadụ imegide ibe ya. O kwuru si na nke ahụ abụghị mmadụ ika ụka. O kwuru na ọ na-ewute na a naghị asọpụrụ ndụ mmadụ. Dịka o siri kwuo; “Anyị nwere olile anya ma na-ekpekwa ekpere na ọ ga-akwụsị. N’aha ndụ mmadụ (humanity) na n’aha Chineke, onye ji ike nile, onye okike, ana m ekpe ekpere na ha ga-atọhapụ ndị nile ha ji.” Achịbishọọpụ a gara n’ihu ịkwa arịrị maka ya bụ njide e ji Leah Sharibu na ndị ọzọ. O kwuru na ọ bụ nnukwu mmegide n’ebe mmadụ nọ. O kwukwara na mmeri ga-adị n’ihi na ndị nile e ji ga-alakwuru ezinaụlọ h
E duola ụmụakwụkwọ UNIZIK tuuru ugo na-imepụta ọgwụ n'iyi ọlụ
- Get link
- Other Apps
MAHADUM Nnamdi Azikiwe dị n’Awka (UNIZIK), ngalaba na-ahụ maka ịlụpụta ọgwụ ‘Faculty of Pharmaceutical Sciences’ emeela emume nturu ugo na ịñụ iyi nke afọ. Nke a bụ nnukwu mmemme nke a nọ n’ụlọ ezumezu ha ‘JUHEL Auditorium’ n’Agulu ebe ngalaba ahụ dị wee mee. Onye isi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ọkammụta Joseph Ahaneku kelere ụmụakwụkwọ ahụ maka nturu ugo ha. O kwuru sị; “obi bụ m sọ añụrị ịhụ ụmụakwụkwọ a ituru ugo mmeri. N’aha UNIZIK, ana m ekele ndị ọlụ nke ngalaba a, ‘Pharmaceutical School’, maka ịzụpụta nnukwu ụmụnwoke na ụmụnwanyị ndị a. Chetwakwanụ ụlọakwụkwọ unu; tinyere nne na nna na ngalaba unu gụrụ akwụkwọ. Kpacharanụ anya soo nzọ ụkwụ Nnamdi Azikiwem, onye bụ onye mbụ n’ala Nigeria, ma bụrụkwa onye mbụ n’amamihe. Ka mmụọ nke Zik na-ekwu okwu n’ime unu. Unu emebikwana ọlụ unu; unu nwere ọlu dịịrị unu nke bụ ime mma mgbe nile.” Ọkammụta Ahaneku gara n’ihu ikele ndị Agulu maka iwepụta obosara ala ahụ, ọkachasi Dọkịnta Eric Okoye (JUHEL); ndị zụpụtara ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nile nyere ak
Kwụsịnụ ịkpọta ndị ara n'Anambra – Gọọmentị
- Get link
- Other Apps
GỌỌMENTỊ Anambra adọlaa aka na ntị wee gwa steetị ndị ọzọ gbara ya gburu gburu ka ha ghara ịdị na-eduru ndị ara na ndị uche ezuchaghi oke na-ekposa ha n’ Anambra. Ọ bụ komishọna na-ahụ maka ụmụaka na ụmụnwaanyi n’Anambra steeti bụ Oriaku Ndidi Mezue bụ onye mere ka a mata nke a mgbe o kwuru na gọọmentị Anambra elekọtala ma zụọ ịhe karịrị otu narị mmadụ bụ ndị nwere isi mgbaka na ndị uche n’ezughị oke. Ọ gara n’ihu kwue n’obodo ndị gbara Anambra gburu gburu ahụla na Anambra steetị nwere ogige na-ahụ maka nlekota ndị ara na ndị enweghị ebe obibi, tinyere ndị uche ezuchaghi oke, ha were maka ya were na-ekpote ha ka igurube na steetị ahụ. Oriaku Mezue gara n’ihu kọwaa na ndị ara ahụ tinyere ndị arịrịọ bụ ndị mmadụ na-esi ebe dị iche iche were kpọbata n’Anambra na nzuzo. O kwuru na ‘Ministry’ ya akpọpụla ndị ara na ndị arịrịọ, tinyere ndị niile isi n’ezughị oke n’uzo niile dị n’Anambra. Ọ kwuru na ha na-ewetere Anambra aha ọjọọ n’ihi na ha na- agagharị ka atụrụ enweghị ndị nche ma na- arị
Ụlọelu okpukpu atọ adaala, gbuo mmadụ atọ na Nnewi
- Get link
- Other Apps
OTU ụlọelu nwere okpukpu atọ adaala n’Okpuno, Otolo Nnewi n’okpuru ọchịchị Nnewi North na steeti Anambra ma gbuo ndi ọlụ mmadụ atọ; ebe mmadụ asatọ nwetere mmerụ ahụ. Ụlọelu ahụ, nke onye nwe ya bụ Maazi Avoji Collins, bụ nke e kwuru na ọ dara mgbe enweghị onye lebere anya n’ihi na o nweghị ka o siri gosi na o nwere nsogbu n’ụzọ ọbụla. Onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti Anambra bụ SP Haruna Mohammed, bụ onye kwetara na nke e mere eme, kọwara na ndị uweojii gbatara ọsọ enyemaka na ya bụ ọdachi. Dịka o siri kwu, igwe ndị uweojii ‘Police Patrol team’ nke onye ndu ha bụ onye kọmanda n’ebe ahụ ‘Nnewi Police Area Commader,’ ACP Nnaama Amah na ọtụtụ ndị enyemaka ndị ọzọ wụchara ebe ahụ ma zọpụta mmadụ iteghete n’ime ndị ọlụ iri na otu bụ ndị ụlọ ahụ dagidere. Otu n’ime mmadụ iteghete ahụ ka e kwuru na o mechaara nwụọ n’ụlọọgwụ, nke mere ka ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ dịzịa atọ. Ndị ahụ ụlọ dagidere ka e kwuru na ha tọrọ n’ebe ahụ ruo ihe dịka awa iri na abụọ tupu ha enweta
A kpọkuela ndị Igbo ka ha chètá ebe ha sì
- Get link
- Other Apps
Ọ BỤ nnọọ oge ntụgharịkọta uche na oge ichegharị echiche, dịka òtù a kpọrọ ‘Association of Professional Bodies of Nigeria’, bụ òtù jikọtara ndị ọkachamara n’ala Nigeria, ngalaba ya nke steeti Anambra nwere nnukwu ọgbakọ omenahọ ha nke afọ 2018. Ya bụ nnukwu ọgbakọ wééré ọnọdụ n’Awka bụ nke dọtara ọtụtụ ndị ọkachamara na ngalaba ọmụmụ na ngalaba ọlụ dị iche iche, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụlee ma tụgharịa uche n’ọnọdụ ndị Igbo n’ala Nigeria, dịka o siri metụta mnwere onwe ala anyị. N’okwu ya dịka ọ na-enye nkuzi n’ọgbakọ ahụ nke isi okwu ya bụ “Nigeria Kemgbe Mnwere Onwe: Nke A Gàgòrò Aga, Kedu Ka O Siiri Gbata Kwụrụ, Maka Ndị Igbo?”, eze ọdịnala Ifitedunu, bụ Igwe Alex Emeka Iloụnọ (Ezedunu n’Ifitedunu) kọwara ndi Igbo dịka ndị na-agbasi mbọ ike, ndị nwere ntachi obi na ndị nwere ọgụgụ isi bụ ịgbà, ọ bụnadị dịka ọ rụtụrụ aka n’ọtụtụ ọmụma atụ dị iche iche ebe ndị Igbo gosiputagoro ọmarịcha ọnatarachi ndị a n’ụzọ dị iche iche. Ọ kọwara akparamagwa na ọnatarachi ndị ahụ dịka ndị
E suola mmadụ atọ ọkụ na ndụ n'Akwa Ibom
- Get link
- Other Apps
ỤZỤ tụrụ nnọọ n’obodo Uruk Usung dị n’okpuru ọchịchị Obot Akara nke steeti Akwa Ibom, dịka ndị ntorobịa iwe juru obi jidere mmadụ atọ bụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ohi, tie ha gwoo gwoo ma sunye ha ọkụ na ndụ, ha wee ree pịata ka akwụkwọ ụkpaka. Mmadụ atọ ahụ e suru ọkụ na ndụ ka e kwuru na o tèéla ha jiri yibe ndị bi na mpaghara ahụ egwù, ma na-ezu ha kpataa, wee ruo ụbọchị ahụ mụọ kere ha bụrụ ha ọnụ, ndị ntorobịa ahụ wee nwụchikọọ ha na ndụ, oge ha gachara obere ‘ọlụ’ na mpaghara ahụ. Nke a na-eme dịka ọ gachara mkpụrụ ụbọchị ole na ole e jiri suo otu onye ohi ọzọ gbara afọ iri atọ ọkụ n’Urua Ekpa dị n’Uyo n’otu steeti ahụ, bụ onye e kwuru na o zuru ọgbatumtum mmadụ ma chọọ ka ọ larie. Mmadụ atọ a kpọchara ka ewu bụ ndị e kwuru na ha ga-anọ n’agbata afọ iri abụọ na abụọ wee ruo n’afọ iri atọ. Oge a kpọtụụrụ ya, onye okwuputa okwu ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ DSP MacDon Odiko, kwuru na ya ka na-aña ntị ka ya nata ozi site n’aka onye ‘Divisional Police Officer’ nke mpaghara ebe
South Korea a maala ọkwa maka ọgwụ ndị China ji ahụ mmadụ lụọ
- Get link
- Other Apps
MGALABA na-ahụ maka erimeri na ọgwụ na South Korea, a maala ọkwa ma dọọ ndị Nigeria aka na ntị ka ha ghara ịnabata ọgwụ nke e si China ebubata n’ịhị na ha nwere ịke ịnwe anụ ahụ mmadụ n’ime ha. Ngalaba ahụ dọrọ aka na ntị a site n’edemede ‘memo’ nke ha ziteere ngalaba di iche iche n’ala Nigeria bu ndi na-ahu maka ndụ na ahụike dịka ndị Nigeria Intelligence Agency (NIA); Ngalaba na-ahu maka ahụ ike; NAFDAC; NDLEA na ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụ ka ọnwa ọktoba dị na mkpụrụbọchị iri na abụọ ka ha zitere ozi a. Ha kwuru sị na ọgwụ ndị e si China ebubata Nigeria nwere anụ ahụ mmadụ n’ime ha. Nke a pụtara na ọ bụ anụ ahụ mmadụ ka e jiri lụọ ogwụ ndị ahụ. Dịka ha siri kwu, ọgwụ ndị ahụ bụ nke a na-ekwu na ha ga-eme ka mmadụ gbasie ike ma na-agwọkwa orịa dika, ‘cancer’ na ọrịa mamịrị bụ ‘diabetes’. Ha gara n’ihu kọwaa site n’ozi ahụ na ‘South Korea Ministry’ chọpụtara na ọgwụ ndi ahụ nwere nde kwuru nde nje nke ga-ebute nnukwu mmebi n’ahụ ịke mmadu. Ha si otu a gwa ndị ahụ ọ dị n’aka na Nigeria ka ha
Mba ụwa echeta umụnwanyị bi n'ime obodo
- Get link
- Other Apps
ỤMỤNWANYI bi n’ime obodo na mba ụwa nile ka echetara ha na ọlụ ha ụbọchị Monde bụ abali iri na ise nke ọnwa a. Na ncheta nke afọ a, isi okwu e ji mee mmemme a bụ ‘Sustainable Infrastructure, Service and Social Protection for Gender Equality and Empowerment of Rural Women and Girls’. Isi okwu nke ewepụtara n’afọ a metụtara ịkwado ụmụnwanyị na ụmụagbọhọ. N’ezie, ụmụnwanyị nọ na ime-ime obodo na mba ụwa nile na-ata ahụhụ n’ihi na ọ bụ ha ka ọlụ nile na adakari n’isi. Ọ bụ ụmụnwanyị n’alụkari ọlụ ụgbọ ma ọ bụ ịzụ ahịa, ha na ụmụ ha ndị nwanyị, ebe ndị nke nwoke adịghị ekwe esokari nne ha eje ọlụ ma ọ bụ ahịa n’ime obodo. Ị gaa n’ime obodo ụfọdụ, ọ bụ ụmụnwanyị ji aka ha akọ ọlụ ugbo ha, lụchasia ahịhịa dị n’ubi ahụ. Ihe ndị a nile ha na-akọ dịka ji, akpụ, ede, osikapa, nduku, unere, okro, akwụkwọ nri, egwusi na ine ndị ọzọ.Ọ bụkwa ha na-ewepụta ihe ha na-akọpụta ta ya ma oge iwepụta ya ruo. Ọ bụkwa ha na ụmụ ha ndị nwanyị ga-ebu ya gaa ahịa. Ebe ụfọdụ ezigbo ụzọ adịghị, ọ bụ isi ka ha ga
Iju Mmiri: Mmadụ iri na asaa amụọla ụmụ n'ebe e weputaara ndị mmiri chụpụrụ be ha
- Get link
- Other Apps
KỌMISHỌNA na-ahụ maka ahụ ike na steeti Anambra, Dọkịta Josephat Akabuike, emeela ka a mara na ihe ruru ụmụnwaanyị iri na asaa amụọla ụmụ n’ebe dị iche iche e wepụtara maka ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha. Kọmishọna Akabụike kwuru nke a oge ọ na-anabata ndị otu ‘Nigerian Medical Association’ (NMA), ngalaba nke steeti Anambra, bụ ndị bagidere n’ọlụ ahụike nso nso a n’ogige ebe ahụ e wepụtara maka ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha na Agụleri dị n’okpuru ọchịchị Anambra East na Atanị dị n’okpuru ọchịchị Ọgbaru. O kwuru na n’ime ụmụnwaanyị ndị nọ n’ogige ahụ nke dị n’Atanị, na abụọ n’ime ha amụọla ụmụ, n’ụlọ ahụike ‘Comprehensive Health Centre’ (CHC) dị n’obodo ahụ, ma kwuo na ọchịchị steeti ahụ etinyesiela atụmatụ dị iche iche ga-enye aka ịhụ na ụmụnwaanyị dị ime nọ n’ogige niile e nwere na steeti ahụ maka ndị iju mmiri chụpụrụ na be ha ga-enwe ezi nchekwaba ma nọrọkwa n’ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà. N’okwu nke ya, onye ji ọkwa ‘State Hospital Director’, na steeti ahụ bụ Dọkịta Richmond A
Mbize: Ndị Ọrọfịa Abagana akpọkuo gọọmenti
- Get link
- Other Apps
NDỊ Orofịa Abagana, n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra akpọkuola gọọmenti steeti ahụ ka o mee ngwa ngwa gbatara ha ọsọ enyemaka n’ebe ahụ mbize na-akwado ịchụpụ ha na mpaghara ahụ. Ya bụ mbize, bụ nke dị n’okporo ụzọ Anyansị ka e kwuru na ọ dị Kilomita anọ n’ogologo, dị fiiti isii n’ímì, ma bụrụkwa nke gbasawanyere n’afọ a n’ihi oke mmiri ozuzo ahụ weere ọnọdụ. N’okwu ya dịka ha na-akpọgharị ndị nta akụkọ na mpaghara ebe ahụ, otu onye n’ime ndị mbize ahụ na-enye ụlọ ya nsogbu, bụ Maazị Matthew Okeke mere ka a mara na ya bụ mbize bụzị ihe iche aka mgba nyegara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ na osisi ụfọdụ bara oke uru dị na mpaghara ahụ. O kwuru na ndị obodo ahụ agbaala mbọ dị iche iche iji gbochie mbize ahụ ịgbasawanye, site n’igwu olulu nghọ mmiri na mpaghara ebe ahụ, bụ nke ọ sịrị na ọ mịtaghị mkpụrụ ọma dịka a tụrụ anya. Na ntụnye nke ya, onyeisi oche nke ‘Ọrọfịa Village Association’, bụ Maazị Sebastian Anyansi, kwuru na ebe ahụ mbize ahụ na-enye nsogbu bụ okporo ụzọ jikọrọ ndị ógbè a
A tụla nwokorobịa goro ekwentị e zutara n'ohi nga
- Get link
- Other Apps
A TỤỌLA otu nwata nwoke gbara afọ iri na asatọ nga ọnwa atọ maka igoro ekwenti ‘Nokia’ nke e zuru n’ohi. Ọ bụ n’ụlọikpe Karu Grade I Area Court, Abuja, ka a nọ kpee nwata nwoke a, nke aha ya bụ Abdulkudus Shuaibu ikpe ma tụọ ya nga. Ya bụ nwata nwoke kwetera na ya mehiere ma rịọ ka e meere ya ebere. Onye ọkaikpe bụ Sani Mohammed tụrụ ya nga ọnwa atọ ma nyekwa ya ohere iji ego wee gbara isi onwe ya. Ego ahụ bụ puku naira anọ. Na mbụ onye ọkaikpe kwuru na Shuaibu gotara ya bụ ekwentị e zuru ezu puku naira abụọ na narị naịra ise.
Ndị mmadụ ka na-anwụrịrị maka ọkụ ọgbụgba ahụ dapụtara n' Abia
- Get link
- Other Apps
E KWUOLA na ọnụọgụ ndị nwụrụ na ya bụ ọkụ ọgbụgba dapụtara na steetị Abia n’izuụka gara aga eruola otu narị mmadụ na iri ise. Ọ bụ Eze Ikechukwu Chiavoghilefu, onye isi oche ndị eze ọdinala n’okpuru ọchịchị Osisioma, ebe ya bụ ọkụ ọgbụgba ‘pipeline explosion’ dapụtara kwuru nke a. Dịka Eze Chiavoghilefi siri kwu, imirikiti ndị mmadụ, ndị meruru ahụ n’ihi ọkụ ọgbụgba ahụ na-anwụ n’ike n’ike. Ọ rụtụrụ aka na n’ime otu ụlọ ahụ ike e bugara mmadụ ruru iri asaa, mana n’ime awa iri abụọ na anọ (otu ụbọchị) mmadụ karịrị iri atọ n’ime ha nwụrụ. Onye eze a kwuru nke a oge onye na-anọchite ha n’ụlọ nzukọ sineti bụ Theodore Orji wụchara n’ebe ahụ iji kasie ndị nke a metụtara obi. Eze ahụ kwuru si, “ihe dịka mmadụ iri asaa bụ ndị ọkụ gbara ka e bụgara n’ụlọ ahụike dị n’akụkụ ụlọ m n’ụbọchị mbụ ya bụ ihe mere mana ugbua, ha nile a bụrụla ndị nwụrụ anwụ. Ihe ruru otu narị mmadụ na iri ise anwụọla ka ọ dị ugbua.” Ọ gara n’ihu kwuo na ha nọ n’ọgba aghara n’ihi ọnwụ ahụ nke ka na-agarịrị n’ihu n’ihi ok
ATMA amalitela ime ka ohere dị n'okporo ụzọ dịgasị n'Onitsha
- Get link
- Other Apps
A DỤỌLA ndị na-akwọ ụgbọala na ndị na-azụ ahịa n’okporo ụzọ dị iche dị n’Ọnịtsha na okirikiri ebe ahụ ka ha kwụsị ịnọchisi ụzọ ebe ụgbọala na ndị mmadụ si aga, iji wee gbochie ihe nhịa ahụ ma ọ bụ ihe mberede okporo ụzọ. Onyeisi ụlọ ọlụ Anambra Traffic Management Agency, bụ Maazị Chris Ụzọechina nyere ndụmọdụ a ma dọọ aka na ntị a oge ya na ndị òtù ọlụ ya gara ọlụ ịchụsịsị ndị na-adọchi ụzọ na ime ka ohere dị n’okporo ụzọ dị iche iche dị n’Onịtsha na gburugburu ya. Ya bụ ọlụ bụ nke ha màlitèrè n’okporo ụzọ gara Owerri, buru ya gaa mpaghara Upper Iweka, wee pụta n’okporo ụzọ Oguta na mpaghara ebe ahụ e si abanye ime Ọchanja. Ọ sị na ebumnobi nke ahụ bụ iji wepụsịa ihe dị iche iche na-egbochi ụzọ, mee ka ụzọ na-aga siriri werere na steeti ahụ ma belatakwa ndapụta nke ihe mberede okporo ụzọ. Ọ kpọkuzịrị ndị dị iche iche na-etinye aka n’idochi okporo ụzọ ka onye ọbụla sepu aka na ya maka ọdịmma nke onye ahụ n’ihi na ndị òtù ahụ agaghị emekwara onye ọbụla a hụrụ na nke ahụ ebere, ma ya fọdụ
Anyi na-akwalite mmekorịta n'etiti ndị isi ụlọ akwụkwọ na otu ụmụakwụkwọ - Igwebuike
- Get link
- Other Apps
NDỊ ọchịchị ụmuakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe, (Students Union Government) dị n’Awka bịara n’ụlọ ọlụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa bụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) maka nkwanye ugwu nke ha nyere onye isi ụlọ ọlụ ahụ bụ Chuka Nnabuife. A nọrọ na ya gbaa onye isi ha bụ Igwebuike Ikenna ajụjụ ọnụ. Otu a ka o si ga: Olee otu isi hụta ọlụ a si aga kemgbe ị malitere ọchịchị? Ọ dịghị mfe mana site n’amara Chineke, a na m alụ ya site n’enyemaka ndị otu m na ndị ọlụ nke ụlọakwụkwọ anyị. Olee mgbe I malitere ọlụ a? Amalitere m ọlụ a ka ọnwa Jenuarị dị na mkpụrụbọchị iri na isii n’afọ a bụ 2018. Olee mgbanwe ị weterela na ndị I ka na-akwadebe iwebata? E nweziri ezi mmekọrịta n’etiti ndị ochịchị ụmụakwụkwọ (SUG) na ndị ọchịchị/ndị isi ụlọakwụkwọ. Anyị na-ahazi ihe mmemme dị iche iche dịka aka ọlụ, nkuzi semina, iso mpi, w.d.g. Onye turu ugo n’asumpi a, na-enye ya ego iji malite ihe ọ ga-eme. Anyị na kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na-alụkọkwa. Gwa
Gọọmenti Anambra egosila njikere ya ịkwàdò ndị ntorobịa
- Get link
- Other Apps
ỌCHỊCHỊ steeti Anambra ekwuputanwòóla njikere ya ịkwàlite otútó, mmepe na ọdịmma nke ndị ntorobịa steeti ahụ site n’ịga n’ihu n’ịtụpụta atụmatụ mwulite dị iche iche metụtara ha. Osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara nke a n’Awka, oge ndị ndu nke otu Nigeria Youth Council of Nigeria, ngalaba mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ Nigeria bịara kpọtụrụ ya n’ụlọ ọlụ ya dị n’obi gọọmenti. Dịka ọ na-anabata ndị otu ahụ n’aha aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ, Dọkịta Okeke mere ka a mara mkpà ọ dị, bụ ime ka ezi mmekọrịta na mkparịta ụka dị n’etiti gọọmenti na ndị ntorobịa, bụ ndị o kwuru na o kwesiri ka a na-akwàdo oge ọbụla, iji mee ka ha soro na ndị e ji okwu ha agba ìzù na ndị a na-elegara anya n’ogoogo mba ụwa. O kwere nkwà nkwàdo nke ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ nye ndị ntorobịa, ma kpọkuo ha ka ha were ọmarịcha ọnatarachi dị iche iche Chineke jiri gọzie ha wee bàárá onwe ha na obodo ha úrù. Na mbụ n’okwu ya, osote onyeisi oche ndị òtú ahụ na mpaghara
A dụọla ndị nne na nnà ka ha zụlite ụmụaka ha n'egwu Chineke
- Get link
- Other Apps
A KPỌKUOLA ma dụọ ndị nne na nna ka ha gbaa mbọ na-azụlite ụmụ ha n’egwu Chineke ma na-akụnyekwa ezi mkpụrụ n’ime ha màlite oge ha dị na nwata n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ na-eweta. Bishọọpụ enyemaka nke ụka Katọliiki na Dayọsiisi Ọnịtsha, bụ ‘Most Reverend’ Dennis Isizọh, kpọrọ oku a n’ụlọ ụka ‘Saint Mary’s Catholic Church’, Àlọr, dị n’okpuru ọchịchị Idemmili South nke steeti Anambra n’ofufe nrò ịkwọ aka n’isi nke e mere na ya bụ ụlọ ụka. Ofufe nro ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee kwọọ mmadụ ótù narị, iri ise na abụọ aka n’isi, bụ nke e mere site n’aka ya bụ bishọọpụ. Na nkenke okwuchukwu ya n’ofufe nrò ahụ, Bishọọpụ Isizọh mere ka a mara na nwata a zụlitere n’egwu Chineke adịghị abara naanị onwe ya uru, kama ọ na-abara nne nna ya ma bakwara obodo ya n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. O kwuru na ụmụaka bụ ọdịnihu nke ala anyị, ma sị na ihe ha ga-abụ n’ọdịnihu ga-adabere n’otu e siri zụlite ha n’ihi na mmadụ adịghị egbute unèrè n’ebe ọ kụrụ ụkpaka. N’ịrụtụ aka n’ihe gbasaara ekpere, o mere k
Ọkụ latrik a dọgbuela nwata akwụkwọ na Calabar
- Get link
- Other Apps
ỌNWỤ nwa dị afọ iri na otu ọkụ latrik gbagbulu , nke ụlọakwụkwọ Government Secondary na Calabar, Cross River Steeti, etinyela ezinaụlọ ya n’ ihe mgbu. Nwata ahụ, a maara dịka Isaac Sunday Okon, bụ onye ọkụ dọgburu ka ihe eriri na -ebu ọkụ latrik aga jidechara ya mgbe o ji nkeji iri atọ gafee elekere nke mbụ n’ ehihie ụbọchi Fraịdee, ka ụlọakwụkwọ nọzi na nchịkọta. E kwuru na nwa a nwụrụ anwụ bụ naani otu nwa nwoke nne ya bụ Oriakụ Happiness Sunday Okon bụ onye na-azụ ahia ji. E kwuru na ihe mberede a mere mgbe ndị nkuzi gwara ya ka ọ tụtụọ ahihia dị n’okirikiri ụlọakwụkwọ tupu ọ laa. N’amaghi ama, o wee zọnye ụkwụ n’ eriri na -ebu ọkụ latrik aga, o wee dogbuo ya. E tinyere ozu ya n’ebe a na-echekwa ozu nke dị na ‘University of Calabar Teaching Hospital (UCTH).
Aka akparala nwoke tọọrọ nne enyi ya nwanyị
- Get link
- Other Apps
AKA ndị uweojii akparala otu nwoke gbara afọ iri abụọ na anọ aha ya bụ Chinedu Innocent, maka itinye aka n’itọrọ nne enyi ya nwanyị. Nke a mere n’okpuru ọchịchị Ukwa West na steeti Abia. Innocent na mmadụ atọ ndị ọzọ bụ Ekendu Chidiebere, Tochukwu Samuel na Ikechukwu Nwankwo gbara izu ime ihe ọjọọ ahụ. Anwụchịkọrọ ha n’Abuja abali olemole ha natachara puku narị naịra atọ (N300,000) site n’aka ikwu na ibe nwanyị ahụ. Ozi e nwetara n’aka ndị uweojii kọwara na ndị ntọrị ahụ bụ ndị nọzi na ‘Force Headquarters’, Abuja, bụ ndị e jidere n’ihi nkpesa nke otu onye ikwu na ibe nwanyị ahụ bụ Agnes Semion kpesaara onye isi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris. Otu onye kọkwara na Innocent bụ onye nke e buuru ya na nwanyị ahụ wee pụọ ụbochị a tọọrọ ya n’Aparazu Ogwu na steeti Abia maara ụzọ ya bụ mmiri siri baa n’opi ụgbogụrụ. E kwuru na Innocent nọ na be nwanyị ahụ mgbe ndị ntori ahụ bịara; ha buuru ha abụọ pụọ. Ka a hapụchara nwanyị ahụ ka ọ laa, Innocent gara n’ihu na-agwa ya ka o mee ka ezinaụlọ ya kw
Obiano eturula ugo maka ọchịchị onyekwue uche ya n’ USA
- Get link
- Other Apps
N’IHI na a sị na okpu na-aka mma n’isi onye o kwesiri, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ abụrụla onye a nọrọ na nso nso a wee nye nkwanye ugwu pụrụ ichè dịka ‘ọka ibe nke ọchịchị onye kwùó úchè ya’ (Champion of Democracy) n’ala Nigeria. Ya bụ nnukwu nkwanye ùgwù bụ nke e nyere ya na mbà Boston n’isi ngwụcha izuụka gara aga, site n’aka òtù a kpọrọ ‘Nigerian American Multi-Service Association (NAMSA)’, bụ òtù jikọtara ụmụafọ ala Nigeria bi nà Massachusetts nke mbà US, ma bụrụkwa òtù na-agbasi mbọ ike ịkwàlìtè omenala na ọnatarachi nke ala Nigeria na mbà Africa. Mmemme inye nkwanye ùgwù ahụ dọtara ọtụtụ ụmụafọ ala Nigeria bi na mbà ahụ, ma bụrụkwa otu n’ime ihe ndị mere ka njèm nlegharị anya nke Gọvanọ Obianọ gara na mbà Boston kpòghara ọkụ ma magbukwa onwe ya. N’okwu ya dịka ọ na-enye ya nkwanye ùgwù ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Godwin Nnanna, tòrò ya bụ gọvanọ n’ihi ihe dị iche iche o mepụtagoro nà mbọ pụtara ìhè ọ gbagoro iji gosi na ezi ọchịchị bụ ihe kwere omum
Obi Onitsha agbaala Ọfala nke iri na asaa
- Get link
- Other Apps
N’IHI na a sị na ihe emeghị n’izu, o mee n’ọnwa; eze ọdịnala Ọnịtsha, bụ Obi Nnaemeka Alfred Achebe, ewerela oke ọñụ dara ụda wee merùbe mmemme ịgba ọfala ya, àgbà nke iri na asaa ya. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ na mpaghara Ime Obi na Awka Road dị n’Ọnịtsha, ma bụrụkwa nke a kwàdòrò site n’aka ụlọ ọlụ ‘Globacom Nigeria Limited’ (GLO), bụ ụlọ ọlụ mbụ ala nke Nigeria na-eme ihe gbasaara nzikọrịta ozi ekwentị. Óké mmemme ahụ dọtara imrikiti ndị mmadụ sitere na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria na mpụga ya, nke gụnyere ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti, ndị eze ọdịnala, ndị nnọchi anya ala Nigeria, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, tinyere ndị otu dị iche iche. N’okwu ya na mmemme ahụ, Igwe Achebe, bụ onye ọñụ juputara óbì, kelere Chineke n’ihi ndụ, ngọzị na ọganihu, nke o jigoro chọọ ya onwe ya na ndị ọ na-achị achị mma, ma kelekwazie òtù dị iche iche bịara isonyere ya na ya bụ oke mmemme, bụ nke ọ kọwara dịka otù n’ime omenala e jiri mara ndị obodo ahụ. Ọ kwara arịrị banyere ajọ ọnọd
Ụmụakwụkwọ UNIZIK enyela Nnabuife onyinye nkwanye ùgwù maka ngbasa ozi
- Get link
- Other Apps
Ndị ọchịchị ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe, ‘Students Union Government, Nnamdi Azikiwe University (UNIZIK)’, Awka, wụchara n’ụlọ ọlụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa bụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’,nwanne ụnyahụ, weta onyinye nkwanye ugwu nye onye isi ụlọ ọlụ ahụ (Managing Director), bụ Sir Chuka Nnabuife. Nkwanye ugwu a, nke a kpọrọ ‘Media Icon Award’, bụ nke ha kpebiri inye ya maka mbọ ya nile n’ọlụ mgbasa ozi. Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ha mere nkea n’ihi ncheta afọ iri abụọ na ise nke mahadum ahụ. Onye ndu ma bụrụkwa onye isi ha bụ Ikenna Igwebuike, bụ onye ọchịchị ụmụakwụkwọ nke iri abụọ na ise, kwuru sị na dịka ha mere ncheta ahụ, ha kpebikwara icheta na ịkwanyere ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu ugwu. “Otu osisi anaghị emebe ọhịa. Dịka anyị na-akwanyere onye isi ụlọ ọlụ a ugwu, anyị echefughị ndị ọlụ ya maka mbọ ndị ha na-agba.” Ya mere n’aha ụmụakwụkwọ UNIZIK, ha nyere Sir Chuka onyinye nkwanye ugwu ahụ ‘award’ maka otito nke Chukwu.
Ndị ọlụ ugbo ebee akwa maka mkpamkpa oke ide mmiri
- Get link
- Other Apps
OKE iji mmiri nke gbara n’afọ a, ewerela ebe ndị mmadụ bi na ebe a na-akọ ọlụ ubi,mebie akụ na ụba nke a na pụghị ikwu ọnụ ahịa ya . Ndị ihe ndịa kasi njọ bụ ndị ọlụ ugbo na ndị bị nso na akụkụ osimiri Niger na osimiri Benue na Nigeria. Ihe butere oke iji mmiri nke a bụ na mmiri gafere akụkụ osimiri abụọ ahụ wee kwonye n’ebe ndị mmadụ bi na n’ebe a na-akọ ọlụ, wee mebie akụ na ụba obodo. Otu mmiri siri wee rie obodo ndị bị n’akụkụ osimiri, ụlọ dị n’ime ha, bụ oke ihe ịtụ n’anya n’ihi na e jisike ahụ ụlọ ụfọdụ anya. Ihe nile nke dị n’ime ụlọ ndị a abugoro ihe mebiri emebi. Ihe nile eji ebi n’ụlọ dịka akwa, ite, oche na nri dị iche dị n’ime ụlọ ahụ emebiela, o wee bụrụ oke ihe ọghọm n’ebe obodo ndị a na ezinaụlọ dị n’ime ha. Na steeti anyị bụ Anambra, gọọmentị ime obodo o metụtara bụ Ogbaru, Anambra West, Anambra East, Onitsha North, Onitsha South, Ayamelum na Awka North. Obodo nile nke dị n’ime Anambra West abụgoro ihe mmiri tochiri nke mere na gọọmentị etiti zitere osote onye isi ala N
Ide mmiri awakpola obi eze Umueri
- Get link
- Other Apps
ONYE eze odinala nke Umueri n’okpuru ọchịchị Anambra ‘East’ na steetị Anambra bụ Igwe Bennett Chukwuemeka, akwaala arịrị maka nsogbu ide mmiri na-akpa be ya. O kwuru n’otu ụlọ na be ya abụrụla nke ide mmiri tokporo. Ọ gara n’ihu kwue na ndị Umueri nile bi n’akụkụ mmiri bụkwazi ndị nke ahụ metụtara tinyekwara na mmiri tokpokwara ubi, ụlọ na ọtụtụ ihe ndị dị iche iche. Onye eze ahụ, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, kọwara na ide mmiri tochiri ala ubi karịrị otu narị na iri isii bụ ebe a kọrọ akpụ; mebikwaa ala ubi ebe a kọrọ osikapa. O kwuru na ya akpọkuola ndị ọ dị n’aka bụ ‘Anambra State Emergency Management Agency (SEMA)’ gbasara ya bụ ike ide mmiri na-akpa mana ka ihe siri gbata kwụrụ, na ya ahụbeghị ha. Igwe Chukwuemeka gakwara n’ihu kwuo na gọọmentị steetị Anambra ewepụtala ọtụtụ ebe dị iche iche n’okirikiri ahụ bụ ebe ndị ide mmiri chụpụrụ n’ụlọ ga-agbaga ọsọ ndụ, mana dịka ọnọdụ ebe ahụ siri dịrị, ndị mmadụ achọghị ịnọ na ya. Ọ rịọrọ gọọmentị steetị Anambra ka o mepee ebe ọzọ n’Ama
Iju mmiri àgbàgbuola onye ọzọ, tokpò ụlọikwuu n'Igbariam
- Get link
- Other Apps
DỊKA akụkọ banyere mkpá mkpá iju mmiri na-àkpá na-agbasawanye, akụkọ ndị ọhụrụ gara n’ihu na-apụtawanye, dịka ya bụ iju mmiri gbàgburu otu onye ọzọ n’Ịgbarịam dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’, ma tokpòkwa Ụlọikwuu Izuzu (Izuzu Camp). Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ ndị obodo ahụ, dịka ha kpọgharịrị ndị nta akụkọ n’ebe ahụ iji gosi ha mkpa mkpa iju mmiri ahụ kpàgoro na ya bụ obodo. Iju mmiri ahụ bụ nke e mere ka a mara na o mebiela ọtụtụ ihe dị iche iche ma bibiekwa akụnụba gburu ego ruru nde kwùrú nde Naịra. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ dịka ọ na-akpọgharị ha ebe ahụ, onyeisi oche nke ụlọikwuu ahụ, bụ Maazị Anthony Okafor, kwàrà arịrị banyere ya bụ ajọ ọnọdụ, ma meekwa ka a mara na ya bụ iju mmiri wakporo ma tochiekwa mpaghara ebe ahụ niile kemgbe ihe dịka otu ọnwa, we mezie ka ha bụrụ ndị bu ọnụ nri na ndị enweghị ebe obibi. Ọ kpọkuzịkwara gọọmenti n’ogoogo dị iche iche ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka iji zọọ ha ndụ n’ihi na ya bụ ajọ ọnọdụ iju mmiri na-abawanyezịkwa ụba n’og
A mala onye uweojii ikpe ọnwụ maka ịgbagbu nwata nwoke na Bayelsa
- Get link
- Other Apps
ỤLỌIKPE ukwu Bayelsa Steetị, nke dị na Yenagoa, a mala Vincent Olama, bụ onye uweoji ikpe ọnwụ maka igbu nwata nwoke gbara afọ iri na asaa nke aha ya bụ Innocent Kokorifa. Justice E. Eradiri, bụ onye lebara ya bụ ikpe anya mara Olama ikpe maka ịgbu ya bụ nwata nwoke ka ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụbọchị iri na asatọ n’afọ 2016, n’Okada, nke dị na Yenagoa, bụ isi steetị ahụ. Dịka o si kọwaa, onye na ekwuru ndị nyere mkpesa kpọtara ndị akaebe iri ma nwekwaa ihe ngosi (exhibits) iri na isii iji kwado ihe ọ na-ekwu, ebe onye na-azọ onye eboro ebubo nwere sọọsọ otu onye aka ebe nke bụ ya bụ onye e boro ebubo. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ihe atọ e jidere aka wee maa ya ikpe ọnwụ bụ na ya bụ onye nwụrụ anwụ, ọzọ wee bụrụ na ọ bụ onye ahụ e boro ebubo kpataara ya ọnwụ; nke atọ wee bụrụ na ya bụ onye kpachara anya wee mee ihe o mere nke kpatara onye nwụrụ anwụ ji wee nwuo ebe ọ maara na ihe na-eso ụdị agwa ahụ ọ kpara bụ ọnwụ ma ọ bụ imeru onye ahụ nnukwu ahụ. N’ikpeazụ, ya bụ onye ọka ikpe mara Olama i
Chimamanda Adichie enwetala onyinye nkwanye ugwu ọzọ
- Get link
- Other Apps
NWADA Igbo nke Nigeria nke ụwa nile maara make ide akwụkwọ bụ Chimamanda Ngozi Adichie e nwetala nkwanye ugwu site n’aka otu a kpọrọ Global Hope Coalition (GHC). O tutere ugo a dịka ndị GHC mere emume ome n’afọ ha nke e mere n’obodo New York. Dịka ndị chịkọbara emume ahụ siri kwu, a kwanyeere Adichie ugwu a n’ihi mbọ ya n’edemede. Nke a bụ nnọọ iji kwado ilu Igbo nke kwuru na akwụkwọ juru ọhịa mana a bara na ya chọba ọkazị. A nọkwa na mmemme ahụ sọpụrụ mmadụ ise si mba Tanisia, Denmark, France, Sudan na Mali n’akụkụ nke ha. Ha jikwara ohere ahụ wee too ndị ndu dị iche iche bụ ndị gbatara ndị gbapụrụ n’obodo ha na mba ụwa dị iche iche maka nsogbu ọsọ enyemaka.
Agụ adọgbuola otu onye ọlụ n'ebe a na-azụ anụmanụ na Japan
- Get link
- Other Apps
AKỤKỌ e siri mba offesi nweta na-akọwa na agụ adọgbuola otu onye na-alụ ọlụ n’ụlọ ebe a na-azụ ụmụanụmanụ (zoo) nke dị na Southern Japan. Onye uweoji gwara ndị nta akụkọ sị, “onye nlekọta ụmụanụmanụ n’ebe a na-azụ ha ka a hụrụ ka ọ tọgbọrọ n’ime ọgba (cage) na-agba ọbara.” Ọ gakwara n’ihu kwuo na-ebugara nwoke ahụ ụlọọgwụ ebe a nọrọ kọwaa na ọ bulaala akwụkwọ nke pụtara na ọ nwụọla. Akira Furusho, bụ onye ahụ nwụrụ anwụ nke gbara afọ iri anọ, bụ onye achọpụtara na ọ na-agba ọbara n’olu
Atụmatụ Otu Onye Ntorobịa, Otu Ọlụ Aka ebidola n'Anambra
- Get link
- Other Apps
N’IMEZUPỤTA ezi ebumnobi ya nyégárá ndị ntorobịa na steeti ahụ, ọchịchị steeti Anambra agbapeela atụmatụ ‘ótù onye ntorobịa, ótù ọlụ aka’, bụ atụmatụ gbakwàsàrà ụkwụ n’imezupụta ezi ebumnobi nke aka na-achị ya bụ steeti, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, na nkwa ahụ o kwere ịzụpụta ndị ntorobịa dị púkú iri n’ọnụ ọgụgụ na steeti ahụ, kwà afọ ọbụla. Mmepe ịgbape atụmatụ a bụ nke e mere ụbọchị Tuzdee n’ogige ụlọ ọrụ minịstịrị na-ahụ maka nkwàlitè ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụta, dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ. N’okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, Dọkịta Nkem Okeke, kọwara atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya na nke bịara n’oge ya, ọ kachasị n’ihi nsogbu enweghị ọrụ ahụ dị n’ala Nigeria ugbu a. O kwupụtara ezi olile anya o nwere na site n’ụdị atụmatụ dị otu ahụ, na a gà-ebelata ya bụ nsogbu, mee ka ndị ntorobịa bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma kpọkùkwazie ndị ntorobịa ndị ga-eso rita úrù na ya bụ atụmatụ k
A tụọla otu nwoke nga maka ịtụba nwa ya nwanyị ime na Benin
- Get link
- Other Apps
A TỤỌLA otu nwoke ji ọgbatumtum akpa ihe ọ na-eri (ọkada) nga afọ iri na anọ maka ịtụba nwa ya nwanyị dị afọ iri na atọ ime. Nwoke ahụ bụ Friday Moses, ka a tụrụ nga, tinyekwara na ọ ga na-alụ ọlụ ike na ya. E nyeghị ya ohere iji ego wee gbara onwe ya n’ihi ya bụ arụ o mere site n’idakpo ma tụba nwa ọ mụrụ amụ ime. Majie kpere ikpe ahụ bụ Chief Magistrate J.O Ejale n’ụlọ ikpe Evbuoriaria ‘Magistrate Court Benin City na steeti Edo. Moses, onye nke a tụrụ nga gbara afọ iri anọ na abụọ ma bụrụ onye Cross River bị n’Edo. A kpọtara ya ụlọikpe maka ịdakpo nwa ya nwanyị kemgbe afọ ise gara aga nne nwa ahụ nwụrụ. Majie ahụ kwuru na nga a tụrụ Moses bụ iji wee kuziere ya ihe tinyekwara ndị ọdị ka ọ dị ya ndị ọzọ. Nwata nwanyị ahụ bụ nwa akwụkwọ ‘primary’ nke isii, bụ onye dị ime ọnwa ise na izuụka abụọ ugbua. Nne na nna ha mụtara ha atọ, ya bụ nke izizi. Ka ọ dị ugbua, ọ nọzị n’aka nchekwa nke ngalaba na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwanyị ‘Ministry of Women Affairs and Social Development’ maka ileta ya
E zuola anya nwa nwụrụ anwụ n’ụlọ nchekwa ozu UPTH
- Get link
- Other Apps
NA ‘University of Port Harcourt Teaching Hospital’ (UPTH), onye na-elekọta ebe a na-echekwa ozu abụrụla onye a na-atụ aka na ọ wepụrụ anya nwata nwụrụ anwụ, bụ ejima dị ọnwa iri na asatọ a kpọrọ Chuma,onye ọria akpọrọ ‘Anaemia’ gburu n’ụlọọgwụ ebe ụmụaka na-anọ n’ọnwa Ọgọọstụ na mkpụrụ ụbọchị atọ n’afọ 2018. Nna nwa a nwụrụ anwụ, bụ onye gaghachiri ịkwụ ụgwọ ebe ana etinye ozu ka ịzụ ụka abụọ gachaara, chọpụtara na ozu ha butere ya abụlụgo ihe ewepụrụ ihe na ya, ma ndị na-ahụ maka ịchekwa ozu na UPTH enweghị ike inye aziza banyere etu, mgbe ma ọ bụ ihe kpatara ụfọdụ ahụ ya ji bụrụ nke a na-achọ-achọ. Nna nwa a nwụrụ anwụ, na nkọwa ya, kwuru na, “mgbe nwa a ka na-eku ume, otu nwanyi nọọsụ bịakwutere m gwa m ka m kwụọ puku naira atọ iji lie nwa ahụ ebe ọzọ. Nke a mere ka iwe wee m. Site n’oge ahụ, ha bidoro mewe omume na-egosi na ọgbasaghị ha wee dobe ahụ na ha na-eche ọbara rue mgbe nwa a nwụrụ”. E kwuru na di na nwunye a emeela njem gaa Ugheli, ebe ndị ezinaụlọ ha gbara ha ume ka ha bu
Gọọmenti ga-ewerezị ụlọ ọbụla dara n'Anambra – Ifejiọfọr
- Get link
- Other Apps
N’IHI akụkọ banyere ụlọ ọdịda ahụ a na-anụzị oge ọbụla, e meela ka a mara na gọọmenti steeti Anambra ga-amalitezị iwèghara ụlọ ọbụla dara ada na steet ahụ. Kọmishọna na-ahụ maka ọlụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr, mere ka a mara nke a oge ya na ndị òtù ọlụ ya gbara gaa n’ebe ahụ nnukwu ụlọ elu nwere òkpukpù atọ dàrà n’Ifite Awka, dị n’okpuru ọchịchị ‘Awka South’. Ka ọ bịaruru ebe ahụ ya bụ ebelebe nọrọ wee gbuo, Maazị Ejiọfọ kwara arịrị bànyere otu e si anụ akụkọ ụlọ ịda kwa mgbe kwa mgbe n’ebe dị iche iche na steeti ahụ, bụ nke o kwuru na o na-esitekarị n’aka ndị ọlụ ụlọ na-amaghị nke ekwe na-akụ n’iwu ụlọ. O mere ka a mara na gọọmenti pụrụ isi n’ụzọ dị otu ahụ naghara ụfọdụ ndị mmadụ àlà na ụfọdụ ihe ndị ọzọ, ma kpọkuziekwa ndị na-alụ ụlọ ka ha zèéré ndị adịgbòlója ma hie asaa n’anya tupu ha ahọrọ onye ha ga-enye ọlụ ngö iwuru ha ụlọ. Ọ dụkwara ha ka ha gbaa mbọ hụ na e nyòchàrà ma nabata atụmatụ, aja na akụrụngwá ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ, site n’aka ụlọ ‘Material Testing Labo
E hibela otu 'Holy Childhood' n'ụlọ ụka St Gabriel, Okpuno
- Get link
- Other Apps
ỤBỌCHỊ ụka gara aga bụ oke ụbọchị n’ụlọụka ‘St Gabriel’s Parish’ Okpuno, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’ na steeti Anambra. Ha nọrọ ụbọchị ahụ hibe otu ụmụaka ‘Holy Childhood Association’. Ụkọchukwu Fidelis Izuakor, bụ onye nlekọta otu ahụ na dinarị I Awka ma bụrụkwa ụkọchukwu na-alụ ọlụ n’ụlọụka ahụ nọrọ n’isi emume n’aja maasị dị asọ nke kpọkụlọtara ọtụtụ ndị mmadụ n’ụlọụka ahụ nke gụnyere ‘Rev Sr’ Makuochukwu Okafor, bụ onye na-ahụ maka otu ahụ na dayọsis Awka. N’okwuchukwu, ‘Fr’ Izuako gwara ụmụaka ka ha na-erube isi dịka Samuel n’akwụkwọ nsọ nke bụ ihe ọgụgụ izizi a gụrụ. Ọ dụkwara ndị nne na nna ọdụ ka ha gbaa mbọ ịzụ ụmụ ha nke ọma ma rụtụrụ ha aka etu Chineke si taa Eli ahụhụ n’ihi na ọ lụghị ọlụ ya nke ọma dịka nna n’ebe ụmụ ya nọ; ma gwakwa ha ka ha hapụ ị na-eduhie ụmụ ha ụzọ. Ọ gakwara n’ihu kwuo sị, “otu a ‘Holy Childhood Association’ malitere na mba France otu narị afọ na iri asaa na ise gara aga, ka ụmụaka wee na-enyere ụmụaka ibe ha aka, ka anyị kwado ha. Nwata ọbụ
Ndị Awà emeela Otute Awanigbo
- Get link
- Other Apps
NNUKWU ọñụ juru nnọọ n’obodo Awà, dị n’okpuru ọchịchị Orumba ‘North’ nke steeti Anambra ka ndị obodo ahụ nuputara n’ìgwè wee merùbe mmemme Otute Awanigbo nke ahọ 2018. Nke ahụ bụ otu n’ime oke mmemme e jiri mara mba ahụ. Nnukwu mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi Oloowu ndị obodo ahụ, bụ Mazị Israel Ezue. Nnukwu mmemme ahụ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ selitere isi na steeti ahụ, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee nyekwa ọtụtụ ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntorobịa ruru iri na asaa ihe nkwàdo dị iche iche, nke gụnyere ụgbọala e ji ebu ndị njem, ihe ọnyịnya Keke Na Pep, nnukwu ụgbọala e ji ebu ájä, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ, bụ nke e mere site n’aka ya bụ Oloowu obodo ahụ, n’okpuru òtù enyemaka ya, bụ “Chief Israel Ezue Foundation”. N’okwu ya dịka ọ na-enyefe ha ihe nkwàdo ndị ahụ, Chiifu Ezue kọwara nke ahụ dịka otu n’ime ụzọ o si atụnye ụtụ nke ya n’ịkwàlite ụmụ mmadụ, ime ka ndị ntorobịa nwee ihe ha na-eme, na ibèlàtà nsogbu enweghị ọrụ n’ala anyị. Na ntụnye nke ya dịka ọ na-ekpe ekpere maka ihe nkwàdó ndị
Ịgba alụkwaghị m di na nwunye
- Get link
- Other Apps
ỊGBA alukwaghịm bụ ihe na-adapụta na ndụ. N’ebe di na nwunye nọ, nwoke nwere ike ịgba nwanyị alụkwaghị m, nwanyị nwekwara ike ịgba nwoke alụkwaghị m. A na-eme nke a ma ọ bụrụ na ọ kwekaghị di na nwunye omume. N’oge mbụ, o nwere usoro e si eme ya, nke a mere na ọ bụghị ihe na adapụta mgbe ọbụna. Mana n’oge ugbua, ịgba alụkwaghị m di na nwunye tọpụrụ ogọdọ gbara ọtọ. Nke bụzi ma n’ụzọ omenala Igbo, ma n’ụlọ ụka, tinyekwara ụlọ ikpe, alụkwaghị m na-arị ibe ya elu. Ihe na-ewuzi n’ọhịa na ụzọ bụ a lụọ taa, a gbasaa echi. Otu onye ụkọchukwu, mgbe ọ na-akụzi nkuzi nke okwukwe n’ụlọụka kwuru na ihe na-akpata mgbasa di na nwunye bụ elerughị anya tupu abanye n’alụm di. O kwuru na ọ na-adị ndị mmadụ ọsọ ọsọ ịbanye n’alum di ebe ha amaghị na ọbụghị ihe e ji ọsọ abanye. O nyere ọmụmaatụ otu nwokorobia si chọọ ịlụ nwanyị, ka ọ gwachara onye ahụ na ọ chọrọ ịlụ ya, ọ hụkwa nwanne nwanyị ahụ nke obere, hapụzịa onye nke mbụ, lụbazịa nke obere ahụ. Ọ karịghị otu afọ, ha gbasaa, o fochaa ha n’anya. Ọ dụk
E meela nchèta ụbọchị nwere onwe Nigeria n'Awka
- Get link
- Other Apps
DỊKA ala Nigeria mere mmemme icheta na o nwerela onwe ya, ya bụ oke mmemme bụ nnọọ nke kporo ọkụ ma gakwa siriri werere n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Nnukwu mmemme ahụ bụkwa nke a nọrọ na ya wee mee ncheta ọgbụgba ahọ iri ise na asatọ nke ala Nigeria, ma bụrụkwa nke dọtara ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ na mpụga ya, nke gụnyere ndị ọchịchị, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, ndị isi ụka, ndị eze ọdịnala, ụmụ akwụkwọ, tinyere ndị ọrụ uwe dị iche iche n’ala anyị. N’okwu ya na mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara mmemme ahụ dịka oge kwesiri iji tụgharịa uche n’ọnọdụ ala Nigeria, ihe dị iche iche na-eme n’ime ya oge ugbu a na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ala anyị n’ahọ 2019. O mere ka a mara na ala Nigeria agabigala ọtụtụ ihe, ma ka na-agabigakwa ruo ugbu a, ma sị na ụfọdụ ihe ndị ahụ bụkwa nnọọ nke ụfọdụ mbà ndị ọzọ dị iche iche gabìgàgòrò, ọ bụnadị dịka o kwuputara ezi olile anya o nwere na
Ndị eze akpọọla oku maka ịkwụsị osu na steeti Imo
- Get link
- Other Apps
NDỊ eze ọdịnala na steeti Imo akpọọla oku maka ịkwụsi osu kpamkpam. Ha kwuru sị na ya bụ ihe nke dị kemgbe n’ala Igbo bụ mmegide nyere mmadụ, ma kwuo na ọ na-eweta nkewpaụ. Ndị eze iri abụọ na anọ n’okpuru ọchịchị Oguta, na steeti Imo, ebinyela aka ịkwụsị ihe a kpọrọ osu iji wee zọpụta ndị nke a metụtara site na mkpachapụ. Ya bụ ihe nke dịbara gboo gboo bụ nke a maara n’ọtụtụ akụkụ ala Igbo dịka osu, ohu, ume, ebe a na-ewe ụfọdụ na ọ bụ ndị mmadụ ma ọ bụ alụsị nwe ha. Ndị eze ọdịnala ahụ kwuru na nke a ebutela nkewa na mmegide, ma n’alumdi.
Aga m etinye ndụ m ịhụ na m nkwere Nwosu n'aka dịka gọvanọ – Okorocha
- Get link
- Other Apps
GỌVANỌ Imo steeti bụ Rochas Okorocha e kwula na ya ga-etinye ndụ ya na ọbara ya, ịhụ na ya kwere Uche Nwosu n’aka dịka onye gọvanọ na-abata ọhụrụ. Okorocha kwuru nke a n’ụlọ gọọmenti dị na Imo steeti, ka ana-eme mmemme idu n’iyi ọlụ nke Maazi Mark Uchendu, dịka onye ode akwụkwọ ọhụrụ nke gọọmenti Imo steeti,ndị ode akwụkwọ iteghete nakwa ndị ọzọ site n’aka onye ọlụ ‘Solicitor, Ministry of Justice’, bụ onye nọchịtere anya ‘Attorney General’ nke Imo steeti. “Taa Uche Nwosu bụ onye isi ndị ọlụ (Chief of staff), ana m ekpe ekpere na otu ụbọchị, aga m ekwe gị n’aka dịka gọvanọ nke Imo steeti.” “Ọ bụrụ na-anyị eweputaghị Nwosu, anyị emebeghi ịhe kwesịrị ka anyị mee nyere ndị choro nnapụta”. “Aga m aluzi ụlọakwụkwọ nile na steeti a, a na m emekwara ọtụtụ n’ime unu ebere bụ ndị kwuru na m emebisiela ụzọ nile. Ọ bụ maka mmiri ozuzo mmadu agaghị akọwanwu. “Ọ ka na agbagwoju m anya ma mmiri a ọ bụ ịhe mmerụ ahụ asiidi.A na m ekwe unu nkwa na-aga ahazi ịhe ndi a nile. Ịhe m na-eme bụ ka m tọọ
Abia ga-emepe ụlọakụ SME Microfinance
- Get link
- Other Apps
GỌỌMENTỊ Abia steeti ekwuola na ha ekpebiela ịwepụta atụmatụ ịmepe ụlọakụ nke’Small and Medium Enterprise (SME) microfinance’ na onwa a iji kwalite ndị na-azu obere ahia na steeti ahụ. Maazi Gabriel Igboko,komishona SMEs,kwuru nke a mgbe ndị nta akụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na Umuahia. Otu a nyere ndị ụlọakwụkwọ akwụkwọ e ji ede ihe,ha kwekwara nkwa ịlụ ebe a na-agụ akwụkwọ bụ ‘library’. O kwuru na ụlọakụ a bụ otu n’ime ihe mmemme atọ nke ngalaba ọlụ ugbo SME nke gọọmenti steeti ahụ kwadoolu site n’aka ndị ‘Central Bank of Nigeria’. Kọmishona kọwara na gọọmentị, site n’ọba ego, nyere ngalaba SME ndị ọzọ ego ka ha nwee ike ịgbazite ego bụ nke enweghị ike igbazite na ‘Commercial Banks’. O kwuru sị, n’ọnwa Okutoba, anyi ga emecha ihe nile anyi kwesịrị ime, iji hụ na emepere ụlọakụ ‘SME microfinance’. Gọvanọ ebinyela aka n’akwụkwọ ma nyekwa nkwado ya ilụ ya bụ ụlọakụ. Anyi a gaala CBN ma anyi ahụla ihe nile ekwesiri ime. Anyi na-agba mbọ ịchịkọ akwụkwọ ịkike nile.Ha kwuru na ụlọakụ ‘microfin
Ụmụawụlụ ewere ọñụ rie ji ọhụụ
- Get link
- Other Apps
DỊKA a sị na omenala bụ ọdịbendị, ndị obodo Ụmụawụlụ dị n’okpuru ọchịchị Awka Sawụtụ na steeti Anambra ewerela oke ọñụ na èkèlé rie ji ọhụụ ha nke ahọ 2018. Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Joel Egwuọnwụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche selitere isi na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ, malite na ndị ji ọkwa gọọmenti, ruo na ndị na-azụ ahịa, ndị eze ọdịnala na imirikiti mmadụ ndị ọzọ sitere n’ime na na mpụgá steeti ahụ. N’okwu ya na mmemme ahụ, otu nnukwu onye ọbịa pụrụ iche, ma bụrụkwa aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke ọnye nọchitere anya ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nyere ya n’ihe gbasaara echichi ọdịnala na ọchịchị ime-ime obodo, bụ Oriakụ Vera Okonkwọ tòró eze ọdịnala obodo ahụ maka ezi odúdú ya n’obodo ahụ na mbọ ya ịchekwaba na ịkwalite njirimara na omenala ndị Igbo, ma kwe nkwà na ọchịchị ya kwụ ya n’azụ n’inye ya nkwàdo zuru òkè. Na mbụ n’okwu ya dịka ọ na-eme omenala ịwa ji kpọnkwem, Igwe Egwuọnwụ
E nyela otu onye isi ụlọakwụkwọ ụlọntakịrị oche azụ maka imetọ ụmụakwụkwọ anọ n'Enugu
- Get link
- Other Apps
ONYE isi ụlọakwụkwọ ‘Migrant Farmers Children School,’ Aguibeje, Enugu Ezike na steeti Enugu bụ Nathaniel Idoko, abụrụla onye e nyere oche azụ n’ọlụ site n’aka ndị na-ahụ maka agụmakwụkwọ ‘Enugu State Universal Basic Education Board (ENSUBEB)’, maka ịdakpo na imetọ ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị anọ n’ụlọakwụkwọ ya. Ọ bụ n’ọnwa Ọgọstụ ka Idoko, onye nke gbara afọ iri ise jiri aghụghọ kpọrọ ụmụaka anọ nọ n’ụlọakwụkwọ ya bụ ndị dị agbata afọ anọ ruo n’afọ isii, wee baa n’ime ọhịa ebe ọ nọ wee metọọ ha. Onye isi oche otu ENSUBEB bụ Ikeje Asogwa, kwuru sị; “anyị enyela ya oche azụ n’ọlụ, e nwekwara ike ịchụ ya achụ. Ọ bụ ihe ihere site n’aka onye kwesiri ichekwa ụmụaka ahụ. Anyị anaghị anabata ụdị agwa a.” N’otu aka ahụkwa, onye kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Ọkammụta Pat Eze kwuru na ya bụ ihe bụ arụ nke kwesịrị ntaramahụhụ. Ọ gara n’ihu kwuo na ntị anụbeghị ụdị ihe dị otu ahụ. Ọ bụ otu onye nne ụmụaka ahụ Idoko metọrọ chọpụtara nke a nke mere ka ụwa mata arụ ahụ. Nwanyị ahụ ka
Anambra na Enugu ezutela maka ikpezi nsogbu ókè àlà ha
- Get link
- Other Apps
N’IHI nsogbu ahụ na-adapụta oge ụfọdụ n’etiti steeti Anmbra na steeti Enugu bànyere ókè àlà, steeti abụọ ahụ ezutela ọzọ iji wee kpezie ma wetakwa ya bụ esemokwu n’isi njedobe. Nzukọ ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti steeti Enugu, dọtara ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti abụọ ahụ, tinyere osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke na osote aka na-achị steeti Enugu bụ Ọkaiwu Cecilia Ezeilo, bụkwa ndị isi oche nke otu na-ahụ maka ihe gbasaara ókè àlà na steeti abụọ ahụ n’otu n’otu. N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, osote aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara na òtù ahụ ná-ahụ maka ihe gbasaara ókè ala n’ala anyị, bụ ‘National Boundary Commission’ anaghị àkpá oke àlà iji wee bute ọgba aghara, kama na ọ bụ iji kwàlite mmepe na udo tọrọ àtọ n’etiti obodo na ibè ya. Ọ gara n’ihu kọwaa oke mkpà nzukọ ahụ dị n’ihi nsogbu dị iche iche ịzọ ókè ala ahụ wètagòrò, ma gosipụta ezi olile anya o nwere na mkparịta ụbụbọ ahụ ga-eweta ùdó tọrọ àtọ nyere ọnọdụ ahụ.
Anambra ewepụtala ebe a ga na-atụkọta ihe maka ndị iju mmiri chụpụrụ be ha
- Get link
- Other Apps
ỌCHỊCHỊ steeti Anambra eweputala ebe dị iche iche a ga na-anakọ ma ọ bụ na atụkọtakwa ihe dị iche iche maka ndị ahụ ìjú mmiri chụpụrụ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ. Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’aka kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkọwatara ọhanaeze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adịnụba, site n’ozi ọ kụpụrụ nso nso a, bụkwa nke gara n’ihu kọwaa na ndị ahụ ìjú mmiri chụpụrụ na be ha chọrọ ọtụtụ ihe enyemaka dị iche iche ugbu a, nke gụnyere ihe oriri na ihe ọñụñụ, àkwà edina, úté, ákwà, ihe e ji esi nri nakwa ọtụtụ ihe enyemaka ndị ọzọ e ji akwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ndị ahụ. Dịka ya bụ ozi siri wee kọwaa, ebe ndị ahụ e wepụtara maka ịnakọ ihe ndị ahụ gụnyere: isi ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadị, bụ ụlọ ọrụ “Anambra State Emergency Management Agency” (SEMA) dị n’Awka, n’okporo ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịsha. Ebe ndị ọzọ bụzị n’isi obodo okpuru ọchịchị Ayamelụm, ‘Anambra East’, ‘Anambra West’, Ọgbaru, ‘Ọnịtsha South’, ‘Ọnịt