Posts

Showing posts from August, 2018

Ndị Ebenatọ eriela ji ọhụrụ

Rịọ enyemaka gọọmenti maka mbize ha Izunna Okafor Ọ BỤ nnọọ ụwa bịa kirie ụbọchị Tuzdee gara aga, dịka ndị obodo Ebenatọ dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018. Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ dị n’Ụmụnnama Ebenatọ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ sitere n’ime obodo ahụ na mpụga ya. N’okwu ya n’oke mmemee ịwa ji ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Edwin Chinaewubeze Ezejiburu (Obi nke mbụ n’Ebenatọ), kọwara iri ji ọhụụ dịka otu n’ime mmemme pụrụ iche e jiri mara Igbo niile nakwa dịka ihe mbụ a na-eme n’obodo tupuu ndị obodo ahụ amalite iri ji ọhụụ n’ezinaụlọ ha dị iche iche. O toro Chineke onye mere ka ha dị ndụ wee gwuputa ji ha tinyere n’ala, ma kpekwazie ekpere maka ogologo ndụ, ahụ isi ike na ọganihu nke ụmụafọ obodo ahụ, ndị Igbo na ala Nigeria n’izùgbe. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya na mmemme ahụ, otu nwa amadi na-esonyesi ike n’ihe a na-eme n’obodo ahụ ma bụrụkwa onye e chiri echichi dịka Ọnwa Ebenat

Fidelity Bank esonyerela gọọmentị Anambra n’ịkwalite asụsụ na omenala Igbo

Image
Chinwendu Uzoatu   ỤLỌ ọba ego ‘Fidelity Bank’ etinyela aka n’akwụkwọ isonyere gọọmentị steeti Anambra site n’ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcasting Service (ABS)’ wee kwalite asụsụ na omenala Igbo. Nke a ga-abịa site n’ihe omume onyoonyo ‘television series’ nke isiokwu ya ga-abụ ‘Nduka,’ nke a ga-eji asụsụ Igbo wee na-eme n’ụlọ mgbasa ozi nke steeti ahụ. Ihe omume a ga-eleba anya n’okwu a kpụ n’ọnụ na asụsụ Igbo na-anwụ anwụ nke a na-akụ n’ekwe eri oge. Onye isi ụlọ ọlụ ABS bụ Maazị Uche Nworah, gwara ndị nta akụkọ na nke a ga-agba ọtụtụ omenala ndị Igbo nke ụmụ na-eto eto amaghị n’anwụ. O kwuru na ya bụ ihe omume bụ nke ezinaụlọ nile ga-anabata n’agbanyeghị afọ ole onye dị. O kwuru sị; “a ga na-eme ya n’Igbo, ọ ga-adabakwara onye ọbụna n’agbata afọ ọbụna ọ dị.” Dịka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu, onye nnọchite anya ‘Fidelity Bank,’ Maazị Charles Aigbe, kwuru sị na ọ dị ọtụtụ ihe ha ji bagide amụma a. “Anyị ji obi añụrị wee na-esonyere ụnụ. Ihe gbasara onyoonyo ‘movie industry’ bụ otu n’

Ị gbochi ndị ntorobịa ịlụ ọlụ akpụobi oge ndọrọndọrọ ọchịchị

Uchenwa Mba N’AFỌ na-abịa, ala anyị Nigeria ga-ahọpụta onye ga-achị ha n’afọ anọ ọzọ. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị niile ga-achọ ka ọ bụrụ otu nke ha ga- enweta mmeri. N’ihi na igwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị n’ala anyị bụ nke ndị nọ n’ime ya na-emekari ya n’ụzọ tigbuo zogbuo, ihe nwute dị n’okwu a bụ na ndị anya ha dị ọkụ ka ha rigoro n’oche ọchịchị a ma ọ bụ ka otu nke ha nweta mmeri a, adighị akpọpụta ụmụ ha. Ụfọdụ n’ime ha na-akpọpụ ụmụ ha obodo oyibo ha a na-agụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ dị mma, ndị nke ụmụ ha togworo eto a na-alụ ọlụ dị mma. Ndị a anya dị ọkụ na-abịazị, kpọrọ ndị ntorobia ndị ọzọ, mee ha ndị akpụ obi na ndị ha ji a lụso ndị out  ndọrọndọrọ ọchịchị ibe ha agha. Ụmụ ntorobia ndị a – n’ihi na ọtụtụ n’ime ha enweghị ọlụ ha na-alu, ngwangwa e chere ha ego n’iru, ma ọ bụ kwe ha nkwa ego, ha esobe ha ma kwetakwa ihe ọ bụla e ziri ha mee. Akwụkwọ nsọ kwuru na ego bụ mgborogwu ihe ọjọo niile ma ọ bụrụ na mmadụ ejighị uche zuru oke soo ya.Ha na-ekwu sị, kama ha a gaghị enweta mmeri, ha

Nnewi South emeela mmemme ọgbụgba afọ iri abụọ na asaa

Chie Obianọ Ebubeagụ   Izunna Okafor, na Iyke Ọkpankụ N’IHI na e kwuru na ezi ihe dị mma nchèta, nnukwu ọñụ dara nnọọ ụbọchị Mọnde n’okpuru ọchịchị Nnewi South, dịka obodo iri mejupụtara okpuru ọchịchị ahụ nuputara nnọọ n’ìgwè wee merube oke mmemme iji wee cheta na okpuru ọchịchị ahụ agbàala ahọ iri abụọ na asaa. Ya bụ mmemme, bụ nke weere ọnọdụ n’Ụkpọr bụ isi obodo okpuru ọchịchị ahụ, dọtara imirikiti ụmụafọr sitere obodo niile mejupụtara ya bụ okpuru ọchịchị, ndị ọrụ gọọmenti, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, ndị nwere ụlọ mmepụta ngwaahịa, ndị isi ụlọ ọrụ dị iche iche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na na mpụga ya. N’okwu ya na mmemme ahụ, nwa amadi haziri ya bụ ọgbakọ, ma bụrụkwa onyeisi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ bụ Maazị Felix Odụmegwu (Omus Kakaka) mere ka a mara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji wee ñụrịa maka na okpuru ọchịchị ahụ agbaala ahọ iri abụọ na asaa e jiri kepụta ya, dịka o so n’otu n’ime okpuru ọchịchị dị iche iche e kewapụtara n’ab

Aguluezechukwu eriela ji ọhụrụ

Chinwendu Uzoatu   DỊKA a nọ n’emume iri ji ọhụrụ ugbua, ndị Aguluezechukwu, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra nọ na Satọdee gara aga mee emume iri ji ọhụrụ. Nkea kpọlọtara ndị Aguluezechukwu nile ụlọ ka ha zukoo wee rie ji ọhụrụ dịka ụmụnne. Igwe Aguluezechukwu bụ Igwe Felix Ebelendu, kelere Chineke ma gozie ndị obodo ahụ nile. Ọ gọrọ ọfọ sị ka ọ dịrị ha na mma ma gọtakwara ndị obodo ya ndụ, nka na uju amara. Ka Igwe gọchara ọfọ, ọ wara ji, ebe ndị mmadụ ji ọñụ, itu ụzụ na ịkụ aka wee na-añụrị. ‘President General’ otu Iganihu Aguluezechukwu bụ Ifedi Okoye, ji ịhụnanya na obioma wee nabata ọha na eze, ndị gụnyere ndị obodo ahụ na ndị si mba ndị ọzọ dị iche iche wee bịa. Otu onye so na ndị e ji okwu ha agba izu n’Aguluezechukwu bụ Nze Godwin Ezeuko  kwuru sị, “obi juputara m n’ọñụ n’ihi iri ji nke afọ a. A na m ekwu sị na nke afọ ọzọ, 2019, ga-aka nke afọ a mma. Ihe dịrị onye ọbụna mma. Ka Chukwu gozie mmadu nile.” Ndị mmadụ bupụtachara ji ha kọrọ bụ ndị buru nnukwu ibu k

E mechiela ụlọ ọlụ na-emepụta osikapa n’Abakaliki

Chinwendu Uzoatu   GỌỌMENTỊ Ebonyi Steeti emechiela ụlọ ọlụ na-arụpụta osikapa nke a maara aha ya bụ ‘Abakaliki Rice Mill’ oge a chọpụtara ihe na-egbu mmadụ ya na osikapa adigboroja. Onye kwuputara mmechi a e mechiri ụlọ ọlụ osikapa ahụ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ David Umahi n’ihe gbasara nchekwa ime obodo, Dr Kenneth Ugbala ka a nọ na ‘State Executive Council Chambers’ n’obi gọọmentị dịka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu gbasara ihe e metere na ya bụ nzụkọ ndị isi goomenti steeti ahụ. O kwuru si na  gọọmentị mere nkea n’ihi ama nke si n’aka ngalaba na-ahụ maka gburugburu ‘Ministry of Environment’ nke kwuru na osikapa adigboroja na nsị dị n’osikapa a na-eresi ndị mmadụ. Ọ gara n’ihu kwuo na a ga-emeghekwa ya ma e mechaa nnyocha ma kpọchapụ ihe ndị ahụ dị njọ.

Nwa okorobịa akwụọla ụdọ n'ihi anwụrụ ike ọñụfere oke

Chris Anyichie   NdỊ uwe ojii n’ Enugu steeti ebidola ime nyocha maka ihe mberede mere nwa nwoke di afọ iri abụọ na anọ ịkwugbu onwe ya ka ọñụfechara anwụrụ ike oke. Onye nkwupute okwu ndị uwe ojii n’Enugu Steeti,bụ Ebere Amariazu, kwupụtara nke a n’ okwu ya n’ụbọchị monde n’ Enugu.O kwuru na ihe mberede a mere na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na anọ nke onwa Ọgọọst na Ameke na Enu-oduma dị n’ Enugu Steeti. Amariazu kowaputara aha nwa nwoke a nwụrụ anwụ dịka Ebube Chukwu. O kwuru na Ebube Chukwu bụ onye ekwupụtara n’ọkwụgburu onwe ya ka ọṅụchara ihe ọ na añụribu na mbụ bụ anwụrụ ike, nke a maara dịka ‘Igbo’. Ozi e nwetere na – ekwu na onye ihe a mere amaghịkwa onwe ya, nke mere o jị kwụgbuo onwe ya n’ elu osisi n’ime ọhia n’ Obokolo, nke di n’etiti Amorji na Ameke Oduma. “Achọpụtakwara na nwoke a bụ onye na- anụ anwụrụ ike mgbe ọbụla nke kpatara ihe mberede a.

N’Anambra, ATMA ga-amalite ịkpụrụ ụgbọala adọchiri ụzọ

Izunna Okafor   E MEELA ka a mara na malite ugbu a dịrị gaba, na a ga na ịnwụchikọ ụgbọala ọbụla a dọbara  n’ebe ekwesighị ekwesi n’okporo ụzọ ọbụla na steeti Anambra. Onyeisi ụlọ ọrụ Anambra ‘Traffic Management Agency'(ATMA)  bụ Maazị Chris Ụzọechina mere ka a mara nke a dịka o mere ngagharị n’ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, I ji mara ka ọnọdụ agbakata a kwụrụ siri dị n’ụzọ ahụ. Ọ sịrị na ebumnobi nke a bụ iji wee bèlata ihe mberede okporo ụzọ, chụsịa ndị mmadụ na-anọchisi ụzọ ma mekwa ka éfè dị n’okporo ụzọ ọbụla, dịka ọ bụ otu n’ime ọchịchọ Gọvanọ Willie Obianọ. O mere ka a mara na ihe ndị ahụ so n’ihe na-ebutere ọtụtụ ndị mmadụ ihe mberede okporo ụzọ ma na-ewetakwa ọnwụ erughị eru nye ọtụtụ mmadụ, n’ihi na mgbe ụzọ chiere, ebe onye ụgbọala hụzịrị, o sukanye isi ya, na-agbanyegị ihe ọ ga-ewe. Ọ gakwara n’ihu kpọkuo ndị na-akwọ ụgbọala ka ha na-erubere ọkụ a gbakata a kwụrụ isi, ya na iwu ndị ọzọ na-achị okporo ụzọ, ma kwuo na onye ọbụla dara ya bụ iwu ga-enweta ntara

Ewepụtala ndị isi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ụfọdụ n'Anambra

Izunna Okafor   A  NABATALA, mmadụ ise bụ ndị ga-ebughara oche dịka ndị isi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị Anambra West, Anambra East, Orumba North, Awka North na Onitsha North n’otu n’otu. Nke a bụ nke e mere site n’aka ndị ụlọ omebe iwu steeti Anambra n’ọgbakọ ha nwere n’isi ụlọ ọrụ ha dị n’Awka, bụkwa nke ha nọrọ na ya wee tụlee ma lebaa anya n’ụfọdụ ihe ndị ọzọ chere ha n’ihu dịka ndị omebe iwu steeti ahụ. N’okwu ya dịka ọ na-ekwuwa nnabata ahụ, onye okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, bụ Ọkaiwu Rita Madụagwụ, kọwara ndị ahụ dịka ndị e nyochagoro ma chọpụta na ha tozuru òkè iji ya bụ ọkwa, dịka aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ siri wee họpụta ha ma zitere ha ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ. Madụ ise ndị ahụ a nabatara na okpuru ọchịchị ha gụnyere: Maazị Sylvester Okafor (Anambra West); Maazị Pius Ifeadị (Anambra East); Oriakụ Ify Obinabọ (Orumba North); Ferdinand Ọnwụje (Awka North), tinyere Patrick Aghamba (Onitsha North) N’ozi ekele ha, mmadụ ndị ahụ toro Gọvanọ

Otu nwaanyị eleela nwa izu ụka isii, zụta ekwentị

Chris Anyichie   NDỊ uwe ojii nke Edo steeti ebidola nyocha maka orire erere nwa dị naani ịzụ ụka isii site na aka nne ya bụ Miracle Johnson, onye nke dị afọ iri abụọ na atọ. Kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ bụ Maazi Johnson Kokumo,bụ onye gbara aka ebe ihe mberede a, kwuru na ọ bụ nnukwu ịwu ka ọ dara. Site n’akụkọ ndị ekpokọbara, a chọpụtara na Miracle rere nwa ahụ bụ ‘Greatness’ na ebe ndị na enweghị nne na nna na-anọ na Onitsha, Anambra steeti O rere ya naani puku naarị naịra na iri abụọ. Achọpụtara na nwaanyị na eledoro ya nwa anya bụ onye Agenebode na Etsako East dị n’okpuru ọchịchị Edo Steeti bụ onye kwụnyere ego ya ozigbo. Ekwuru na o ji ụfọdụ ego o nwetara n’ime nwa ahụ were zụta ekwenti. Mana Miracle, bụ nne ụmụ abụọ, tara onwe ya ụta maka ihe omere n’ihi ngharipu di ya nakwa n’ihi na di ya enweghi ike ilekọta ya na ụmụ ya anya. Okwuru sị na ọ bụ Mama Joy bụ onye kwagidere ya ka oree nwa ya were  ego onwetara nye di ya ka o were bido ahia. Okwuru na ya mụrụ nwa a na mkpụr

Ugo Taa

Image

Bishọọpụ Ezeokafor agozie ngwaọlụ ‘Visitation Hospital' Umuchu

Chinwendu Uzoatu   Ọ BỤ nnukwu ihe ọñụ n’ụlọọgwụ ndị ụka bụ ‘Visitation Hospital’ dị n’Umuchu, n’okpuro ọchịchị Aguata na steeti Anambra dịka Bịshọọpụ ụka Katọlik Dayọsis Awka bụ ‘Most Rev. Dr Paulinus Chukwuemeka Ezeokafor wụchara na ya, nke bụ njem mbụ ya n’ọlụ ozioma n’ụlọọgwụ ahụ. E ji aja maasị dị asọ wee malite mmemme a. Bishọpụ kelere ndị isi na ndị ọlụ nọ n’ụlọọgwụ ahụ, gozie ma gbapee ọtụtụ ihe n’ụlọọgwụ ahụ ndị gunyere mmiri ọñụñụ ‘borehole’, igwe na-enye ọkụ nke ọgbara ọhụrụ, nke ya bụ bishọọpụ nyere aka wee zụta. Ọ gakwara n’ihu gozie ụlọ ebe a na-edebe ọgwụ tinyekwara ụlọ ebe a na-agba ọgwụ mgbochi na ebe obibi ndị ọlụ. O letara ma kpekwaara ndi ọrịa ekpere ma nọrọkwa n’elu ya kwụọrọ otu nwoke aha ya bụ ThankGod ụgwọ ụlọọgwụ. Ọ gozikwara ụlọ ekpere ‘Chapel of Divine Mercy’ bụ ebe ndị ọrịa na mmadụ nile ga na-ekpe ekpere. Onye nlekọta (manager) ụlọọgwụ ahụ bụ ‘Rev Fr’ Barnabas Okafor kelere Bishọọpụ Ezeokafor maka ihunanya ya dịka ọ gara n’ihu kelee mmadụ nile. O gosikwara

Atọhapụla nwoke jere nga maka ikpọga agbataobi ya ụlọọgwụ

Chris Anyichie   OTU nwoke nke a na-ebochị ọnụ ma tụkwa ya ñga maka ịgbu agbataobị ya ka ọkpọgachara ya n’ụlọ ọgwụ abụrụla onye nweere onwe ya ka afọ abụọ gasiri. Nwoke a bụ Maazị Chidiebere Onwumere, bụ onye Umuagbaghagha n’okpuru ọchịchị Osisiọma nke Abia Steeti ka a kpọchiri ka ebochichara ya ọnụ na ọ bụ ya gburu agbata obi ya, bụ Uzochi Chinyere, bụ onye nke bikwa otu ebe ahụ nwoke a bi na ya. Ka ọ na-akọwara ndị obodo Umuagbaghagha n’Osisioma Abia Steetị, ihe mere mgbe akpọpụtachara ya n’ụlọ nga nke dị n’Afara, Umuahia, n’ubochị Tuzdee, Maazi Chidiebere, bụ onye abụ otuto juputara n’ọnụ nokwa na-ekele Chineke maka ịnapụta ya n’ahụhụ ọtara afọ abụọ n’ihi ịhe ọ maghị ihe gbasara ya. O kwuru na ọ bụ ebe ọchọrọ ka ọ zọpụta agbataobi ya ka o ji wee nata ntaramaahụhụ a. Maazi Chidiebere kwuru okwu si, “aloghachirim ebe m bi n’Umujiji Isiala Osisioma n’ ebe elekele nke isii na mgbede ka izu ụka abụọ gara aga n’obodo m ebe m gara ịgbukota nakwa ime mkpụrụ akwụ ka m hụrụ agbataobi m ka o d

Buhari ziga ndị agha ka ha ga kọba ugbo – Ohaneze

Chinwendu Uzoatu   OHANEZE Ndigbo akpọkuola Gọọmentị Etiti ka ha ziga ndị agha  ka ha ga kọba ugbo ya na ebe a na-alụ ụzọ dị iche iche; tinyekwara iji ha chọọ obodo mma ma ọ bụrụ na o nwezighi ọlụ nchekwa nke ha ga-alụ karịa  I ji ha eyi ndị mmadụ egwu. Onye okwupụta okwu Ohaneze, Chuks Ibegbu, bụ onye kwuru nke a maka atụmatụ egwu eke ‘Operation Python Dance 3’ na ‘South-East, kọwara na ọ gbagwojuru ya anya ihe kpatara nke a ebe ọ bụ na mpaghara ahụ nọ n’udo. O dọrọ aka na ntị banyere I ji usoro ọbụna na-eyi ndị mmadụ nọọrọ onwe ha egwu. O kwuru sị “Ndị agha ala Nigeria kwesịrị ịnọ ugbua na-emepụta ngwa agha bụ nke Nigeria na-etinye nnukwu ego nke e kwesiri iji mepee obodo a karịa ma imepụta sọọsọọ nnu na ngwa agha ndị dị mfe na ‘DICON’ ma were oge ndị ọzọ na-eyi ụmụ Nigeria na-achọghị nsogbu egwu. “Anyị chọrọ ndị agha na ndị nchekwa nke ndị mmadụ chọrọ, ọ bụghị ndị na-eyi egwu. Ka ndị agha gaa rụpụta ihe oriri maka ndị ọlụ ha n’ugbo ya na ndị agha ma resị ụmụ Nigeria ndị fọrọnu.” Gba

A dụọla ụmụakwụkwọ ka ha na-akwàlite njirimara Igbo

Izunna Okafor   E MEELA ka a mara mkpa ọ dị ịkwàlite njirimara na omenala ndị Igbo, ọ kachasị n’etiti ụmụakwụkwọ. Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ọkpụkpọ oku a n’otu nnukwu mmemme a chịkọbara site n’aka ndị otu jikọtara ụmụakwụkwọ niile bụ ndị steeti Anambra, bụkwa nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka. N’okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nyere ya n’ihe gbasaara iwulite ndị ntorobịa na ọrụaka n’usoro ọgbara ọhụụ digitalụ, bụ Maazị Ifeanyị Anịagọ, mere ka a mara na ọ dị mkpa ka mmadụ ọbụla na-echeta ebe o si oge niile, ma na-agbasikwa mbọ ike ịkwàdò njirimara obodo ya. Ọ gara n’ihu kpọkuo ụmụakwụkwọ steeti ahụ nọ n’ogoogo dị iche iche, ọ kachasị ndị nọ n’ogo mahadum n’ebe dị iche iche, ma dụọ ha ka ha ghàra iji maka na ha nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu wee gbakụta asụsụ, ejiji na omenala ndị Igbo azụ. O mekwara ka ha mara nzọpụ ụkwụ dike na ịgba dị iche iche dagoro ụda nke ọchịchị

A kpọọla oku ka a rụchapụ ụzọ dị iche iche n'Anambra

Izunna Okafor A KPỌKUOLA aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ka ọ nye ntụzi aka ka ụlọ ọrụ ngo ji okporo ụzọ dị iche iche na steeti ahụ mee ngwa ngwa rụchapụ ya n’ihi ajọ ọnọdụ nke ahụ na-eweta. Oku a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ ndị omebe iwu steeti Anambra n’isi ngwụcha izuụka gara aga dịka ndị otu ahụ nwere ọgbakọ ha n’Awka. N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Ọgbaru nke mbụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, bụ Maazị Benson Nwawulu kpọkuru ya bụ aka na-achị achị ka o mee ka onye ji ọrụ ụzọ G.M.O. Ogbuagu-Mgbuka-Amaizu dị uchu n’ọlụ ya . Maazị Nwawulu kpọrọ oku a dịka ọ kwara arịrị otu idè mmiri siri gbàgbuo ụmụaka atọ nso nso a n’Okpoko, ma mee ka a mara na e kwesiri ịkapị ọrụ ahụ ọnụ ngwa ngwa iji gbochie ụdị ihe ize ndụ ahụ ịdapụtakwa ọzọ. N’okwu dịkwa ka ya, onye nke na-anọchite anya Orumba Nọọtụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, bụ Maazị Romanus Obi nọkwara n’ọgbakọ ahụ kpọkuokwa Gọvanọ Obianọ ka o nye onye ọrụ ngo ahụ ji ọrụ okporo ụzọ Awgbu-Amaetiti-U

Osodieme achịkọtala ngagharị ime-ime obodo

Izunna Okafor   NNUKWU ọñụ dara nnọọ ụbọchị Satọdee dịka nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ chịkọtara njem ahụ ọ bagidere ịgazu n’okpuru ọchịchị niile dị e nwere na steeti ahụ, bụ nke ọ malitere n’abalị asatọ nke ọnwa a. N’okwu ya n’Awka n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’, bụ nke so n’okpuru ọchịchị ikpeazụ ọ gara, Oriakụ Obianọ kọwara na isi sekpụ ntị na ya bụ njem bụ iji wee kpọtụrụ ndị bi n’ime ime obodo, nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ n’ime ha aka, kwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ, ma mekwa ka ndị enweghị olile anya nwee olile anya, bụkwa nke ọ na-eme site n’otu enyemaka ya ahụ a kpọrọ CAFÉ. O mere ka a mara mkpa ọ dị icheta ndị nọ n’ime ime obodo na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nakwa inye ha nkwàdo oge niile, ma kpọkukwazie ndị aka ji akụ ka ha were akụ ha na-eleta ndị ụwa na-atụ n’ọnụ. Oriakụ Obianọ gakwara n’ihu kpọkuo ndị ndu obodo dị iche iche ka ha gbaa mbọ ịhụ na akụrụngwa dị iche iche, ọ kachasị ebe nlekọta ahụike a rụnyere n’obodo ha na-arụ ọrụ nke ọma na o

Akụlueunọ dị oke mkpa n'Anambra

Chinwendu Uzoatu   AKA na-achị steeti Anambra bụ Chief Willie Obiano,ọtụtụ oge, akpọkuela ụmụ Anambra ka ha leruo anya n’ụlọ. Ọ bụ nke a ka o jiri hiwe isiokwu nke ọ kpọrọ ‘Akulueụlọ’. Ọ bụrụ n’anyị tụlee ya, anyị ga-aghọta na steeti a bụ Anambra bụ steeti Chineke ji ọtụtụ ihe wee chọọ mma, nke bụ na ndị nọ na ya anaghị achọ ihe ọma achọ na ndụ ha. Abịa n’ọlụugbo, Anambra bụ eji ama atụ. Chineke gọziri ala anyị nke bụ na ihe a kọrọ n’ubi na-eme eme. Anambra na-alụpụta ihe dị iche iche site n’ịkọ ọlụ. Ka ọ dị ugbua, e jizi osikapa wee mara steeti a, e nwere osikapa Anambra,osikapa Coscharis,osikapa Naira,osikapa Ihiala wdg. E wezụgakwa osikapa, Anambra na-akọkwa akpụ, ji, akwụkwọ nri na ọtụtụ erimeri ndị ọzọ. Abịakwa n’ikpa ụmụanụmanụ dịka ọkụkụ, Anambra nwere ọtụtụ ụlọọlụ na-eme nke a nke bụ agụkata agba awaa. A bịa n’ọlụaka, nke bụ ihe e ji aka alụpụta, a ga akpọ Anambra ‘Japan’ nke Afrika n’ihi na ha na-agbo ihe ewu na-eri. Akụrụngwa ụgbọala nke adịghịkwa n’ahịa, ị bịa n’Anambra, a g

Ndị gọvanọ akatọọla ọlụ gọọmentị etiti na ‘S’East’

Chinwendu Uzoatu   NDỊ Gọvanọ ‘South East’ ala anyị ekwuola hoo haa na Gọọmentị Etiti amaala afọ n’ala n’imejupụta nkwa o kwere maka ọlụ ‘2017 budget’. Ndị gọvanọ a kwuru na ha dị na mbụ nwee mmasị maka usoro ọlụ 2017 ahụ n’ihi na ọ gara n’usoro ọlụ na amụma nke ọchịchị ugbua site n’afọ 2017 ruo 2020. Mana e mesia n’ikpeazụ, otu abụghị n’ezi. Ndị gọvanọ a kwuputara ebumnobi ha site n’aka onye ‘Director General of South East Governors Forum’ bụ Ọkammụta Simon Otunaya, bụ onye nke gosipụtara ihe a chọpụtara na ‘monitoring report’ atụmatụ ọlu ‘2017 Federal Capital Budget’ na ‘South East’.   Otunaya kwuru sị,“Atụmatụ ọlụ 2017 agaghị nke ọma ma ncha na steeti ndị ‘Sout East’. “Okporo ụzọ nile adịghị mma; ka Gọọmentị Etiti mee nke ka mma na 2018; anyị nwere olile anya na Gọọmentị Etiti ga-eme ya.” Dịka otu hụrụ maka nchọpụta siri kwu, ha nyochara ka atụmatụ ọlụ 2017 si aga n’obodo dị iche iche na steeti Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo site na nkwado ndị obodo. Ha kwukwara na ha chọpụtara

Nanka e riela ji ọhụrụ

Chris Anyichie   IHE mmemme iri ji ọhụụ nke ndị Nanka n’okpuru ọchịchị Orumba ‘North’ nke Anambara Steeti ka e mere n’izu ụka gara aga n’Obi Igwe Godwin dị na Nanka. Ihe mmemme a dotara ọtụtụ igwe ndị ọzọ, ndị na-akwado omenala,ndị ọlụ gọọmentị,ndị isi ụlọ ọlụ dị iche iche,ndị ụka,ndị echichi na otụtụ mmadụ. Na mmemme a, lgwe Ezeilo kpọkuru ndị gọọmentị n’ogogo ọbụla ka ha na etinye uchu n’ọlụ ugbo ka e nwee ike hụ na nri dị na ala anyi.Igwe Ezeilo gwara ndị ntorobịa ka ha makụọ ọlụ ugbo ka ha wee nwee ike kwudo n’onwe ha. Ọ kenekwara Gọvanọ Willie Obiano maka mbọ nile ọ na-agba maka itụghari ọnọdụ ọlụ ugbo n’ebe ọ dị ukwuu. Ọ kpọrọ ndi Igbo ka ha si na omume nwere ike ighasa omenaala ha pụọ, kọwaa na omenaala bụ etu ndị si ebi ndụ. Na mbụ n’okwuchukwu n’ụka e ji malite mmemme a, ‘Rev Fr’.Christian Umeojilinnaka bụ ụkọchukwu n’elekota ụlọụka”Saint Anthony’s Catholic Church,’Nanka, kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka ohere ndị mmadụ ji e gosi chineke obi aṅụri maka nnukwu owuwe ihe ubi o nye

Ndị omekome a gbaala ụlọikpe abụọ ọkụ n'Imo

Chinwendu Uzoatu   NDỊ omekome e kwuru na ha ga-adị ihe dịka iri na ise n’ọnụọgụ etinyela ọkụ n’ụlọikpe majie (Magistrate Courts) abụọ n’ọkpụrụ ọchịchị Orlu na steeti Imo. Ọkụ a repịara akwụkwọ niile e ji edekọ ihe nke dị n’ụlọikpe ndị ahụ. Ụlọikpe ndị ahụ bụ ‘Chief Magistrate Court 1’ na ‘Senior Magistrate Court 2’ ma bụrụkwa ụlọikpe e wunyere n’ogige ụlọikpe ukwu ‘Orlu High Court’. Otu onye ọlụ n’ụlọikpe ukwu ahụ dị n’Orlu bụ onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị nta akụkọ na ndị omekome ahụ bụ ndị nke ji egbe wee wakpo ndị nche ụlọikpe ukwu ahụ, ma were ike ha nile banye n’ime ụlọikpe abụọ ahụ, bupụta akwụkwọ nile e ji edekọ ihe nile mere n’ụlọikpe ndị ahụ ma mụnye ha ọkụ. Onye ọgba ama a gara n’ihu kọwaa na ndị ọchọnganoko ahụ riri mbọmbọ nani mgbe ha hụrụ na akwụkwọ ahụ nile, tinyekwara ọtụtụ ngwa ọlụ ụlọikpe ahụ agbariena ọkụ pịata pịata ma ghọrọ ntụ. Dịka o siri kwuo, ndị nche ahụ bụ ndị nke mmiri juru ọnụ nọ ebe ahụ n’amaghị ihe ha ga-eme mgbe ndị ọjọọ ahụ jiri laa. O kwur

2019: APGA ga-ewepụta onye ga-azọ ọkwa onyeisi ala

Izunna Okafor   DỊKA nhọpụta izugbe nke ahọ 2018 n’ala Nigeria na-akpụdobe nso, isi ọchịchị otu ndọrọ ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) emeela ka a mara na ha ga-eweputa onye ga-eji aha otu ndọrọ ndọrọ ahụ wee zọọ ọkwa onyeisi ala. Isi ọchịchị otu a mere ka a mara nke a n’ọgbakọ pụrụ iche ha nwere n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma sịkwa na onye nke ga-azọ ọkwa onyeisi ala ga-esite mpaghara mgbago ugwu ala anyị, ebe osote ya ga-esite mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ. Dịka ozi na nkwekọrịta e mere na mmemme ahụ siri kwuo, a nọrọ na ya bụ mmemme wee kpaa banyere ọdịnihu na ọdịmma nke otu ndọrọ ndọrọ ahụ, tụọ aro pụrụ iche maka nhọpụta izugbe na-abịa abịa nakwa nhọrọ na ihe ndị ọzọ cheere ha n’ihu. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka ọgbakọ ahụ gachara, ode akwụkwkọ isi ọchịchị otu ahụ, bụ Alhaji Sani Shinkafi mere ka a mara na ọ bụ ka ha tụlechaara ọtụtụ ihe banyere nhọpụta izugbe ahụ ka ha jiri wee kpebie na ọ ga-amagbu onwe ya ma ha weputa mmadu abụọ sitere mpaghara mgbago ugwu

Anambra a gbaala afọ iri abụọ na asaa

Uchenwa Mba na Chris Anyichie ABALỊ iri abụọ na asaa nke ọnwa asatọ n’afọ ọbụla kemgbe 1991 bụ ụbọchị pụrụ iche nye ndị Anambra na ndị nile bi na ime ya. Ọ bụ ụbochị a mụrụ nwa ọhụrụ  bụ steeti Anambra. Ọ na-abụrụ ndị nile nọ mgbe a mụpụtara ya ihe oke ọñụ oge nile ha chetara ya. N’ezie, ọtụtụ ihe ka emegoro ka Anambra wee maa mma dịka nwagbọghọ a na-alụ ọhụrụ site na ezinaụlọ ruo otu ọ si gbasara ọchịchị gọọmenti steeti. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ọma nke Chineke jigworo ọtụtụ ndị chigworo Anambra mee. Site na nkewapụta na nkwupụta onye na-achị n’oge ahụ bụ General Ibrahim Badamosi Babangida, Joseph Abulu bụ onye  ‘Nigeria Navy’  bụ onye mbụ akpolitere ịbụ onye ndu nwa ọhụrụ a bụ Anambra. Onye nke abụọ ma bụrụ onye nkiti izizi chiri Anambra bụ Dọkịnta Pius Ezeife. Ọchịchị ya malitere ka ọnwa mbu n’afọ 1992 dị n’abali abụọ wee ruo ka ọnwa iri na otu dị n’abali iri na asaa n’afọ 1993. Onye  uwe ojii aha ya bụ Dabo Aliyu wee bata na ọchịchị dịka ndị agha  weghara ọchịchị n’aka ndị nkiti. Ọchịchị