Igwe ehi a wakpo ọdụ ụgbọ elu n'Akure
Izunna Okafor Ọ BỤ nnọọ ejìje tụrụ ụwa anya dịka igwe ehi nọrọ n’isi ngwụcha izu ụka gara aga wee wụchaa n’ọdụ ụgbọ elu n’Akure na steeti Ondo, wee gbochie ụgbọ elu ọbụla ịda ada ma ọ bụ felie efelie n’ọdụ ụgbọ elu ahụ. Ya bụ mwakpo bụ nke weere ọnọdụ n’elekere iri na abụọ nke ehihe ụbọchị ahụ, ma bụrụkwa nke mezịrị ka ndị ọrụ ‘Federal Airport Authority of Nigeria’ na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ dị iche iche tinye aka n’ọrụ iji wee mee ka ohere dị, ọ kachasị maka ụgbọ elu ‘Air Peace’ bụ nke kwụ n’elu kemgbe wee na-achọ ebe ọ ga-adà. Otu onye ọnọ mgbe o mere, bụ Gọvanọ Ayodele Fayose, nke steeti Ekiti, kọwara na ọ nọ ebe ahụ na-eche ịbà ụbgọ elu na-aga Lagos, wee ruo mgbe ya bụ ihe mere. Ọ katọrọ kpam kpam otu ehi siri weghara ọnọdụ n’ọdụ ụgbọ elu, ma kwuo hooha na e nwere ụfọdụ ihe na-asọ oyi ịnụ anụ na nti ma ọ bụ ịhụ ahụ n’anya, bụ ihe na-emegasị n’ala anyị. O kelere onyeisi ụgbọ bụ Capt. Iyang maka ịzọpụta na ịhụ na o nweghị ihe mwute ọbụla dakwasịrị ụmụ mmadụ na-eme njem site n’ọdụ