Obiagbaọsọ Enukeme agbaala ahọ iri asaa na anọ
IZUNNA OKAFOR OBODO juru nnọọ gbịm ụbọchị ụka, ebe ọñụ rịkwara ibe yaelu, dịka nwafọ steeti Anambra e jiri azụm ahịa wee mara bụ Chiifu Anthony Obiagbaọsọ Enukeme merubere n’ụzọ pụrụ iche mmemme ịgba ahọ iri asaa na anọ ya. Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị ụka gara aga n’ụlọ nkwari akụ “White Castle” dị n’obodo oke nwa amadị ahụ bụ Neni n’okpuru ọchịchị Anaọcha nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke e jiri ofufe nru pụrụ iche wee malite, bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ụka St. James na Neni. N’okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ kelere ndị Neni maka nkwado ha nye ọchịchị ya na out pati APGA na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere n’abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ 2017, ma tokwa ha maka ịtụnyere otu pati ahụ nakwa Mazị Victor Umeh, bụ onye jiri ya wee zọọ ọkwa ;’senate’ n’ọgbọ nta nkwado Anambra central n’abalị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị ahọ a, bụ nke mere ka ha nweta mmeri dara ụda. Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi ọrụ na steeti