Posts

UNDP na Anambra enweela nkwekọrịta ịkwàlìtè mmepe obodo

Image
Izunna Okafor dere akụkọ ndị a   Ọ NA-ABỤ e jikọọ aka ọnụ nyụọ mamịrị, ọ gbọọ ụfụfụ.   Ọ bụ n'ịgbaso nke a ka gọọmenti steeti Anambra na ụlọọrụ United Nations Development Programme (UNDP) jiri binye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ijikọ aka ọnụ, iji kwalite ọnọdụ mmepe na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ.   Mmemme ibinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo bìnyere aka n'aha steeti Anambra, ebe onye nnọchiteanya ụlọọrụ United Nations Development Programme, bụ Maazị Mohammed Yahaya binyere n'aha ụlọọrụ ahụ.   Ka ọ na-ekwu okwu tupu mbinye aka ahụ,   Gọvanọ   Soludo kèlèrè ụlọọrụ 'United Nations Development Programme maka ya bụ njikọaka, ma tokwa ya bụ ụlọọrụ dịka ndị nọ n'ezi ihu n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe n'ime steeti ahụ.   O mere ka a mara na onye ọbụla nwere ntụnye dị icheiche ọ ga-emenwu n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ,

APGA enweela isi ụlọọrụ ọhụrụ n'Anambra

Image
  Izunna Okafor dere akụkọ ndị a   Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ ụbọchị Tuzdee, dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance (APGA)' gbapere isi ụlọọrụ ọhụrụ ya n'ime steeti Anambra. Ya bụ ụlọọrụ ọhụrụ bụ isi ụlọọrụ òtù ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria ma bụrụkwa nke a weputara aka wee rụọ.   Isi ụlọọrụ ahụ, nke dị n'akụkụ okporoụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha bụ nke a kpọrọ 'APGA Regional Secretariat Complex' ma bụrụ nke nwere ihe dị icheiche ga-eme ka ọrụ dị mfe n'ebe ahụ.   N'okwu ya na mmemme ịgbape ụlọọrụ ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo kwuru na òtù ndọrọndọrọ APGA   jiri eziokwu, idinotu, na ọganihu wee hiri isi; ma kwuo na ya bụ otu ndọrọndọrọ egisipụtala n'ezie na ọ kwụnyesiri ike ma gbanyesie mgbọrọgwụ ike n'ala Nigeria.   Gọvanọ Soludo, onye bụkwa Onyendu APGA n'ala Nigeria kọwakwàrà na otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA bụ otu ndọrọndọrọ na-arụkọ ọrụ ọnụ oge niile,

N'Osun, ụmụakwụkwọ ekoropula ka ha kutere ikuku mmụọ ndị uweojii gbara

 Chinwendu uzoatu dere akuko a   NJINJI jiri n'otu ụlọakwụkwọ dị na steeti Osun, Fakunle Unity High School, Osogbo, ka ọtụtụ ụmụakwụkwọ koropuru ka ha kutere ikuku mmụọ 'teargas' nke ndị uweojii Mopol 39 Base dị na ncherịta ihu ụlọakwụkwọ ahụ gbara. Nke a mere ka e mechie ụlọakwụkwọ ahụ ozigbo.   Otu onye si n'ụlọakwụkwọ ahụ ma bụrụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị ntaakụkọ na ụmụakwụkwọ abachaala na klaasị ha dị iche iche, tupu ha wee kute ikuku mmụọ ndị uweojii ahụ gbara ka ha na- eme emume   ụtụtụ ha na-eme 'drills'. N'ihi ya, ọtụtụ ụmụakwụkwọ koropuru nke mere ka e buga ha otu ụlọọgwụ nnọọrọonwe dị nso, ebe e buuru ndị ọzọ gaa Osun State University Teaching Hospital, Osogbo.   Oge ndị ntaakụkọ jiri ru n'ụlọakwụkwọ ahụ, sọọsọ ndị nkuzi ka a hụtara n'ihi na a gbasara akwụkwọ n'ike ka nsogbu ọzọ ghara ịdapụta.   Onweghị onye nkuzi kwuru okwu, ma otu onye nna nyere aha ya ka Gideon kwuru na a gwara ya ka ọ ga chọọ nwa ya nwaanyị ya

Anambra ga-aga n'ihu ịkwàlìtè ọdịmma ụmụaka – Soludo

Image
  Izunna Okafor dere akuko a AKA na-achị steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ekwuputela ezi nkwadobe ọchịchị ya dị ịga n'ihu na-akwàlite ọdịmma nà ezi ọnọdụ obibindụ na agụmakwụkwọ ụmụafọ steeti ahụ.   Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a na mmemme Ụbọchị Ụmụaka (Children's Day) nke afọ 2022 e mere na steeti ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'amaegwuregwu 'Ekwueme Square' dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.   Dịka ọ na-ekwupụ̀ta ozi ekele ya nyegara ụmụaka Steeti ahụ maka oke ụbọchị ahụ, ya bụ Gọvanọ kwupụtakwàzịrị na ọchịchị ya agaghị anabata ihe ọbụla bụ otu nzuzo, izu ohi n'ule, ịkpọ ọgwụike, maọbụ ụdị arụrụala ndị ọzọ n'ụlọakwụkwọ ọbụla na steeti ahụ; ma dụọ ụmụakwụkwọ ka ha zeere ihe dị etu ahụ.   O kwuru na ọchịchị ya na-agba ezi mbọ iji hụ na ụmụaka steeti ahụ nwèrè ezi nkwàdó na ezi ohere iji gosiputa onyinye amara pụrụ iche ha nwere, bụrụ ihe Chineke kèrè ha ka ha bụrụ, ma bụrụ ndị bara uru n'obodo ma tụnyekwa ụtụ nke ha n'ịkwàlite m

Ọghọm dị n'ịga mposi ọhịa na ụzọ (II)

Image
 Chinwendu Uzoatu dere akuko a ISIOKWU a nke anyị malitere n'izuụka gara aga bụ a gụkata agba awaa. Ihe ọjọọ na-esite na ya karịrị akarị.   E wepukwarị na a na-esite n'ịnyụ nsị ebe ekwesịghị ekwesị kesaara ndị aka ha dị ọcha, bụ ndị amaghị ebe a nọ nyụọ nsị ndị ahụ ọrịa; ndị ahụ n'onwe ha na-arụ arụrụala ahụ na-esite na ya bunyekwa onwe ha ọrịa. Oge ụfọdụ ka mmadụ na-etukwuru ebe a nyụburu nsị, si otu ahụ bute ọrịa. Ha na-etinyekwa ike ha n'ebe adịghị ọcha, nke nje dị iche iche juputara ma sitekwa n'ụzọ dị otu ahụ bute ọrịa. Yaabụ ka ha na-esite n'arụrụala ekesa ọrịa, ka ha na etinyekwa onwe ha na nsogbu. Imirikiti na-etinye ike ha n'ọwa mmiri, ebe atịtị juputara, nje esite n'ike baa ha ahụ. Mgbe nsogbu ndị a ga-eselite isi, ha agaghị aghọta ebe o siri bịa, otu ahụ ka ọ dịkwa ndị ọzọ ha kesara ọrịa.   Ọghọ m ọzọ a na-ahụta na mmadụ ịkpa agwa ọjọọ a nke gụnyere ịba n'ime ọhịa anyụ nsị gụnyere izute ihe ike. Ọtụtụ ka agwọ tụrụ, ọtụtụ ụmụnwaanyị